Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g 11/14 p. 10-11
  • Otú Ị Ga-esi Kwụsị Ịna-ebu Iwe n’Obi

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Otú Ị Ga-esi Kwụsị Ịna-ebu Iwe n’Obi
  • Teta!—2014
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • IHE BỤ́ NSOGBU
  • 4 Na-agbagharanụ Ibe Unu
    Teta!—2018
  • Ihe Ga-enyere Di na Nwunye Aka Ịna-agbaghara Ibe Ha
    Teta!—2013
  • À Pụrụ Ikpezi?
    Teta!—1999
  • Mgbe Iwe Na-ewe Anyị n’Ihi na Anyị ‘Nwere Ihe Mere Anyị Ga-eji Mee Mkpesa’
    Lọghachikwute Jehova
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—2014
g 11/14 p. 10-11
Nwaanyị buuru di ya iwe n’obi

IHE NDỊ GA-ENYERE EZINỤLỌ AKA | DI NA NWUNYE

Otú Ị Ga-esi Kwụsị Ịna-ebu Iwe n’Obi

IHE BỤ́ NSOGBU

O nwere ike ịbụ na okwu ọjọọ di gị ma ọ bụ nwunye gị gwara gị ma ọ bụ ihe ọjọọ o mere gị ekweghị apụ gị apụ n’obi, mgbe ọ bụla i lere ya anya, gị echeta ihe ahụ. Ya emezie ka ị na-eburu ya iwe n’obi. Ọ dị gị ka e nweghị ihe ị ga-emeli ka unu na-ebi n’udo. Ị na-ewesakwa ya iwe maka na unu anaghị ebi n’udo.

Nke bụ́ eziokwu bụ na unu ga-ebili n’udo. Ma, ka anyị buru ụzọ ghọta ihe ụfọdụ ibu iwe n’obi nwere ike ịkpata.

IHE I KWESỊRỊ ỊMA

Di na nwunye ígwè ha nọ na ya na-anaghị aga aga n’ihi ihe konyere na ya

Iburu di gị ma ọ bụ nwunye gị iwe n’obi na-eme ka ihe ghara ịna-aga aga n’ezinụlọ

Ibu iwe n’obi nwere ike itisa ezinụlọ. Maka gịnị? Maka na onye buuru di ya ma ọ bụ nwunye ya iwe n’obi agaghị ahụ ya n’anya, ọ gaghị atụkwasị ya obi, ọ gaghịkwa na-emere ya ihe ọma. Ị manụ na ọ bụ ihe ndị a na-eme ka ezinụlọ ghara isi ike. Mmadụ iburu di ya ma ọ bụ nwunye ya iwe n’obi bụ nnukwu nsogbu n’ezinụlọ. Ọ bụ ya mere Baịbụl ji sị: “Wepụnụ obi ilu niile na iwe . . .  n’etiti unu.”—Ndị Efesọs 4:31.

Onye na-ebu iwe n’obi na-emerụ onwe ya ahụ́. Ibu iwe n’obi dị ka ebe mmadụ na-ama onwe ya ụra na-atụ anya na ọ bụ onye ọzọ ka ntì ga-afụ ụfụ. Otu ọkachamara aha ya bụ Mark Sichel kwuru na onye ahụ ị na-eburu iwe n’obi nwedịrị ike na-enwere onwe ya obi ụtọ, ghara ịchọ ịma ihe na-eme gị. Ihe ọ pụtara bụ na onye na-eburu di ya ma ọ bụ nwunye ya iwe n’obi na-emerụ onwe ya ahụ́.

Ibu iwe n’obi dị ka ebe mmadụ na-ama onwe ya ụra na-atụ anya na ọ bụ onye ọzọ ka ntì ga-afụ ụfụ

Ihe ị ga-eme dị gị n’aka. Ụfọdụ ndị nwere ike ha agaghị ekweta ihe a. Ha nwere ike ịsị, ‘Ọ bụ di m ma ọ bụ nwunye m mere m ji eburu ya iwe n’obi.’ Iche otú ahụ ga-eme ka mmadụ chewe na ọ gaghị akwụsịli iburu onye nke ọzọ iwe n’obi ebe ọ bụ onye ahụ kpasuru ya iwe. Ma, Baịbụl gwara anyị ihe anyị kwesịrị ime. Ọ sịrị: “Ka onye ọ bụla nwapụta ọrụ ya.” (Ndị Galeshia 6:4) Ọ bụghị anyị ga-ekpebiri ndị ọzọ ihe ha ga-ekwu ma ọ bụ ihe ha ga-eme. Ma, ọ bụ anyị ga-ekpebi ihe anyị ga-eme ma ha kpasuo anyị iwe. E nwere ihe ndị ọzọ anyị nwere ike ime ma e wezụga ibu iwe n’obi.

IHE I NWERE IKE IME

Kpebie ihe ị ga-eme. Ihe mbụ ga-agbata gị n’obi nwere ike ịbụ ịta di gị ma ọ bụ nwunye gị ụta. Ma, cheta na i nwere ike ikpebi iburu di gị ma ọ bụ nwunye gị iwe n’obi ma ọ bụ ịgbaghara ya. I nwere ike ime ihe a Baịbụl kwuru. Ọ sịrị: “Anọkwala na-ewe iwe ruo mgbe anyanwụ dara.” (Ndị Efesọs 4:26) Ọ bụrụ na ị na-agbaghara di gị ma ọ bụ nwunye gị, unu ga-enwe ike ịna-edozi ihe ọ bụla na-esere unu okwu.—Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: Ndị Kọlọsi 3:13.

Gwa onwe gị eziokwu. Baịbụl kwuru na e nwere ndị “na-ewekarị iwe.” (Ilu 29:22) Ọ̀ bụ otú ahụ ka i si eme? Jụọ onwe gị, sị: ‘M̀ na-ewekarị iwe? Obere ihe ọ bụla mmadụ mere ọ̀ na-ewe m iwe?’ Baịbụl kwuru na ‘onye na-ekwu banyere otu ihe mgbe niile na-ekewa ndị ha na ibe ha dị ná mma.’ (Ilu 17:9; Ekliziastis 7:9) Ụdị ihe a nwekwara ike ime n’ezinụlọ. N’ihi ya, ọ bụrụ na ị na-ebukarịrị di gị ma ọ bụ nwunye gị iwe n’obi, jụọ onwe gị, sị, ‘M̀ nwere ike ịna-enwere ya ndidi?’—Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: 1 Pita 4:8.

Mara mgbe ị ga-ekwu okwu na mgbe ị gaghị ekwu okwu. Baịbụl kwuru na e nwere “oge ịgbachi nkịtị na oge ikwu okwu.” (Ekliziastis 3:7) Ọ bụghị ihe ọ bụla di gị ma ọ bụ nwunye gị mere gị ka unu kwesịrị ịkpara isiokwu. Oge ụfọdụ, i nwere ike ‘kwuo ihe ị chọrọ ikwu n’ime obi gị, n’elu ihe ndina gị, ma gba nkịtị.’ (Abụ Ọma 4:4) Di gị ma ọ bụ nwunye gị mee ihe were gị iwe, chere ka obi gị dajụọ tupu ị gwawa ya banyere ya. Otu nwaanyị aha ya bụ Beatriz sịrị na di ya kpasuo ya iwe, ọ na-ebu ụzọ chere ka obi ya dajụọ. E mechaa ọ na-achọpụta na ihe ahụ were ya iwe mgbe ahụ e nweghị ihe ọ bụ. Ọ na-ewetuzi obi gwa di ya otú obi dị ya.—Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: Ilu 19:11.

Ghọta ihe ịgbaghara mmadụ pụtara. Okwu Hibru ma ọ bụ Grik e si sụgharịta “mgbaghara” pụtara ịhapụ ihe. N’ihi ya, ịgbaghara mmadụ apụtaghị na ị ga-eme ka à ga-asị na e nweghị ihe onye ahụ mere gị. Kama, ọ pụtara na ị ga-ahapụwa ihe ahụ o mere maka na ibu iwe n’obi nwere ike ịkpatara gị ọrịa ma ọ bụ tisaa ezinụlọ gị.

AMAOKWU BAỊBỤL NDỊ Ị GA-ECHEBARA ECHICHE

  • “Na-ediri ibe unu ihe ma na-agbaghara ibe unu kpamkpam.”—Ndị Kọlọsi 3:13.

  • “Ịhụnanya na-ekpuchi ọtụtụ mmehie.”—1 Pita 4:8.

  • “Nghọta mmadụ nwere na-eme ka ọ ghara iwe iwe ọsọ ọsọ, ileghara mmejọ anya bụkwaara ya ịma mma.”—Ilu 19:11.

MEGODỊ IHE A

Malite ugbu a ruo n’izu ọzọ, chọpụta àgwà atọ dị mma di gị ma ọ bụ nwunye gị na-akpa. Dee ha n’akwụkwọ. Ná ngwụcha izu, gwa ya ihe mere àgwà ndị ahụ ji dị gị mma. Iche banyere ihe di gị ma ọ bụ nwunye gị na-emeta ga-eme ka ị ghara ịna-eburu ya iwe n’obi.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya