Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g 1/15 p. 3
  • Ihe Ndị Na-eme n’Ụwa

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ihe Ndị Na-eme n’Ụwa
  • Teta!—2015
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ekwedọ
  • Japan
  • Zimbabwe
  • Ọstrelia
  • Ihe Ngwọta nke Ọrịa AIDS—A Chọrọ Ya Ngwa Ngwa!
    Teta!—2004
  • Ọganihu Ndị E Nwere n’Ọgụ A Na-alụso Ọrịa AIDS
    Teta!—2004
  • Ọrịa AIDS—Ụzọ Isi Lụso Ya Ọgụ
    Teta!—1998
  • Ihe Mere Ọtụtụ Ji Na-ajụ Ọbara
    Teta!—1998
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—2015
g 1/15 p. 3

IHE NDỊ NA-EME N’ỤWA

Ekwedọ

Ọhịa Amazọn

N’afọ 2007, gọọmenti Ekwedọ kwuru mbọ a na-agba ka e chebe oké ọhịa Amazọn. Kama igwu mmanụ na ya, ha kwuru na ha ga-achọ inweta ego a ga-eji na-elekọta ya. Atụmatụ ahụ kụrụ afọ n’ala n’ihi na e nweghị ndị kwere eweta ego. Oké ọhịa Amazọn a bụkwanụ otu n’ime ọhịa ndị e nwere ụdị ụmụ anụmanụ dị iche iche.

Japan

Dọkịta bu akpa ọbara

Otu akwụkwọ akụkọ kwuru na ọ na-esi ike ịchọpụta ọrịa niile dị n’ọbara a chọrọ ịmịnye mmadụ. Akwụkwọ akụkọ ahụ kwuru ihe a mgbe a chọpụtara n’afọ 2013 na otu nwoke karịrịla iri afọ isii butere ọrịa o biri n’ájá ọcha n’ọbara a mịnyere ya. Ị manụ na ọ bụrụ na ọ dịbeghị anya mmadụ butere ọrịa o biri n’ájá ọcha, e legodị ya ahụ́, a gaghị achọpụta na o bu ya.

Zimbabwe

Onye bọmbụ e liri n’ala bepụrụ ụkwụ na Zimbabwe

N’agbanyeghị na ọ karịala afọ iri atọ ndị na-agba ndị ọchịchị mgba okpuru kwụsịrị agha n’ókè Zimbabwe na Mozambik, bọmbụ e liri ebe ahụ ka na-egbu ndị mmadụ, na-akwarụkwa ọtụtụ. Ndị Red Krọs kwuru na kemgbe afọ 1980, bọmbụ ndị ahụ egbuola ihe karịrị otu puku mmadụ na narị ise nakwa ihe karịrị otu narị puku anụmanụ na puku iri abụọ. Ha kwukwara na bọmbụ ndị ahụ akwarụọla ihe karịrị puku ndị Zimbabwe abụọ.

Ọstrelia

Nkịta nọ n’etiti di na nwunye na-ese okwu

Otu nchọpụta e mere na-egosi na ihe na-esere ọtụtụ di na nwunye gbarala alụkwaghịm okwu bụ onye anụ ụlọ ndị dị ka nkịta ga-abụ nke ya. E wezụga ụlọ na ala, ego na ngwongwo, ihe ọzọ ha na-azọ azọ bụ anụ ụlọ.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya