Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g16 nke 2 p. 16
  • Akụkọ Gbasara Mmekọrịta Mmadụ na Ibe Ya

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Akụkọ Gbasara Mmekọrịta Mmadụ na Ibe Ya
  • Teta!—2016
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • INDIA
  • DENMAK
  • AMERỊKA
  • Ịkwadebe Maka Alụmdi na Nwunye Na-aga nke Ọma
    Isi Ihe Na-akpata Obi Ụtọ Ezinụlọ
  • Gịnị Ka Baịbụl Kwuru Gbasara Nwoke na Nwaanyị Ibikọ Ọnụ n’Alụghị Alụ?
    Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
  • Ànyị Kwesịrị Ibiri Tupu Anyị Alụọ Di na Nwunye?
    Ihe Ndị Ga-enyere Ezinụlọ Aka
  • Ọ̀ Dị Mma Nwoke na Nwaanyị Ibu Ụzọ Biri Tupu Ha Alụọ?
    Teta!—2010
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—2016
g16 nke 2 p. 16
Ebe otu nwoke na otu nwaanyị na-ese okwu

IHE NDỊ NA-EME N’ỤWA

Akụkọ Gbasara Mmekọrịta Mmadụ na Ibe Ya

Ị chọọ ịma otú dị́ mma mmadụ na ibe ya ga-esi na-emekọ ihe, ọ̀ bụ Baịbụl ka ị ga-ebu ụzọ gụọ, ka ọ̀ bụ mgbe ị chọchara enyemaka n’ebe ndị ọzọ ka ị ga-echeta Baịbụl? Ka anyị tụlee otú ihe ndị a chọpụtara na nso nso a si daba n’ihe ndị e kwuru na Baịbụl kemgbe.

INDIA

Nchọpụta e mere n’obodo a n’afọ 2014 gosiri na e kee ndị na-eto eto niile nọ n’agbata afọ iri na asatọ na iri abụọ na ise ụzọ abụọ, ihe karịrị otu ụzọ n’ime ha kwetara na mmadụ inwe mmekọahụ tupu ọ lụọ di ma ọ bụ nwunye adịghị njọ. Otu dọkịta bi na Mumbaị gwara ndị nta akụkọ na ihe mere nwa okorobịa na nwa agbọghọbịa ji akpa abụghị maka na ha chọrọ ịbụ di na nwunye, ya sọkwa ya ya bụrụ na ọ bụ otu abalị ka ha kpara, ọnwa ole na ole ma ọ bụdị na ha abụọ bi ebi.

IHE Ị GA-ECHEBARA ECHICHE: Ndị na-ebute ọrịa na ndị obi na-anaghị eru ala ọ̀ bụ ndị na-enwe mmekọahụ tupu ha alụọ di ma ọ bụ nwunye ka ọ̀ bụ ndị nke ha na di ha ma ọ bụ nwunye ha na-enwe mmekọahụ?—1 Ndị Kọrịnt 6:18.

DENMAK

Ọ bụrụ na mmadụ na ndị ezinụlọ ya na-esekarị okwu, o nwere ike ime ka onye ahụ nwụchuo ọnwụ. Ndị na-eme nchọpụta na mahadum dị́ na Kopenhegin ji afọ iri na otu leba anya n’otú ihe ga-adịrị ihe fọrọ obere ka ọ bụrụ puku mmadụ iri bí n’obodo a bụ́ ndị nọ n’agbata afọ iri atọ na ise na iri afọ ise. Ihe ha chọpụtara gosiri na ndị nke ha na ndị ezinụlọ ha na-esekarị okwu nwere ike ibu ndị nke ha na ezinụlọ ha na-anaghị esekarị okwu ụzọ anwụ. Onyeisi ndị mere nchọpụta ahụ kwuru na ihe nwere ike inye aka belata ọnụ ọgụgụ ndị na-anwụchu ọnwụ n’obodo a bụ ezinụlọ ọ bụla ịgbalị na-edozi esemokwu ha.

BAỊBỤL KWURU, SỊ: “Onye ọ bụla nke na-adịghị ekwu ọtụtụ okwu maara ihe, mmụọ nke onye nwere nghọta na-adị jụụ.”—Ilu 17:27.

AMERỊKA

Na Luwiziana, e lebara anya n’otú ihe si na-aga na narị ezinụlọ ise na iri isii na anọ. Ihe a chọpụtara gosiri na ọ bụrụ na nwoke na nwaanyị gbasara mgbe ha nọ na-akpa, ha mechaa lụọ, ha nwere ike ịgbasa ọzọ n’ime afọ ise mbụ ha lụrụ. Ha nwere ike ịna-esekarị okwu, ha agaghịkwa na-enwe obi ụtọ.

BAỊBỤL KWURU, SỊ: “Ihe Chineke kekọtara, mmadụ ọ bụla atọsala ya.”—Matiu 19:6.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya