Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g16 nke 6 p. 4-6
  • Otú Ị Ga-esi Zere Ihe Ndị Na-akpata Ọrịa

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Otú Ị Ga-esi Zere Ihe Ndị Na-akpata Ọrịa
  • Teta!—2016
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • 1 MMIRI
  • NRI
  • 3 ỤMỤ AHỤHỤ
  • 4 ỤMỤ ANỤMANỤ
  • 5 NDỊ MMADỤ
  • Ihe Ndị Ị Ga Na-eme Ka Ahụ́ Na-adị Gị Mma
    Teta!—2015
  • Nke 4—Na-eme Ihe Ndị Ga-eme Ka Ị Ghara Ịrịa Ọrịa
    Teta!—2011
  • N’ihi Gịnị Ka Ha Ji Bịaghachi?
    Teta!—2003
  • Ụzọ Isii Isi Chebe Ahụ Ike Gị
    Teta!—1997
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—2016
g16 nke 6 p. 4-6

ISIOKWU TETA A | IHE ANYỊ GA-EME KA ANYỊ GHARA ỊNA-EBUTEKARỊ ỌRỊA

Otú Ị Ga-esi Zere Ihe Ndị Na-akpata Ọrịa

ỌTỤTỤ obodo n’oge ochie na-enwe nnukwu mgbidi ha na-eji agba obodo ha gburugburu ka o chebe ha. Ọ bụrụ na ndị iro akwatuo otu mpaghara mgbidi ahụ, obodo ahụ niile na-anọzi n’ihe ize ndụ. Ahụ́ gị dị ka obodo e ji mgbidi gbaa gburugsaburu. Ọ bụrụ na ị na-elekọta ya nke ọma, ọ ga-eme ka ahụ́ sie gị ike. Ka anyị tụlee ihe ise nwere ike ime ka i bute ọrịa nakwa ihe ị ga-eme iji chebe onwe gị.

Ebe otu nwaanyị na nwa ya nwaanyị si n’ahịa na-agafe

1 MMIRI

NSOGBU: Nje nwere ike isi ná mmiri na-adịghị ọcha banye mmadụ n’ahụ́.

IHE Ị GA-EME: Ihe kacha mma ime bụ ịgbalị hụ na nje adịghị n’ebe i si ekute mmiri. Ọ bụrụ na ị ma na mmiri i kutere adịchaghị ọcha, i nwere ike iji aka gị mee ka ọ dị ọcha.a Na-ekwuchi ihe i ji agbanye mmiri ekwuchi, jirikwa ihe dị́ ọcha na-ekuru ya ma ọ bụ gị arụnye ya pọọmpụ mmiri ga-esi na-agbapụta. Amanyekwala aka n’ime ya. O kwe mee, gbalịa biri n’obodo ebe mposi ha na-anaghị abanye n’ebe ha si enweta mmiri.

NRI

NSOGBU: Nje nwere ike ịdị ná nri anyị na-eri.

IHE Ị GA-EME: Nje nwere ike ịdị n’ime nri anyị chere na ọ dị mma. N’ihi ya, mee ka ịsa mkpụrụ osisi na akwụkwọ nri gị mmiri nke ọma mara gị ahụ́. Gbalịa hụ na arịa ndị i ji esi nri, ebe ị na-anọ esi nri, na aka gị na-adị ọcha mgbe ị na-esi nri ma ọ bụ na-enye ndị mmadụ nri. O nwere ụfọdụ nri ọ ga-adị mkpa ka e sie n’ọkụ nke ọma iji gbuo nje dị na ha. Erila nri ụcha ya, ìsì ya ma ọ bụ ụtọ ya gosiri na o mebiwela, n’ihi na nje nwere ike ịdị na ya. Tinye nri fọrọ afọ na friji. Esirila ndị mmadụ nri mgbe ahụ́ na-adịghị gị.b

3 ỤMỤ AHỤHỤ

NSOGBU: Ụmụ ahụhụ ụfọdụ nwere ike ibunye mmadụ nje ndị ha bu.:

IHE Ị GA-EME: Ekwela ka ụmụ ahụhụ ndị nwere ike ibunye mmadụ ọrịa taa gị. I nwere ike ịbanye n’ime ụlọ, ma ọ bụ yiri efe ndị ga-ekpuche gị ahụ́ nke ọma ka ha ghara ịta gị. Jiri ákwà mgbochi anwụnta na-ehi ụra, na-etekwa ihe na-achụ ha. Hụ na e nweghị ihe ọ bụla mmiri dị na ya na gburugburu ụlọ gị anwụnta nwere ike ịnọ na-amuba.c

4 ỤMỤ ANỤMANỤ

NSOGBU: Nje ndị bi n’ahụ́ ụmụ anụmanụ nwere ike ịkpatara anyị ọrịa. I nwere ike ibute ọrịa ma ọ bụrụ na anụ ụlọ gị ma ọ bụ anụmanụ ọzọ ataa gị, gaa gị mbọ, ma ọ bụ ya enwee otú nsị ya si banye gị n’ọnụ.

IHE Ị GA-EME: Ọtụtụ ndị anaghị ekwe ka anụmanụ ha bata n’ime ụlọ ha ka ọ ghara ibunye ha ọrịa. Kwọọ aka gị mgbe ọ bụla ị metụrụ anụ ụlọ gị aka. Emetụkwala anụ ọhịa aka. Ọ bụrụ na ha ataa gị ma ọ bụ gaa gị mbọ, saa ebe ahụ ha merụrụ gị ahụ́ mmiri nke ọma, gaakwa hụ dọkịta.d

5 NDỊ MMADỤ

NSOGBU: Ụfọdụ nje nwere ike isi n’ụkwara ma ọ bụ uzere mmadụ mara banye gị n’ahụ́. Nje nwekwara ike banye gị n’ahụ́ ma i kwee onye bu ya n’aka ma ọ bụ makụọ ya. Nje si ndị ọzọ n’ahụ́ nwekwara ike izo n’aka ụzọ, ihe a na-ejide aka na stepụ, telefon, ma ọ bụ kọmputa.

IHE Ị GA-EME: Gị na onye ọzọ ejila otu ágụbá eme ihe ọ bụla. Gị na onye ọzọ ejikwala otu brọsh e ji asa ezé asa ezé ma ọ bụ jiri ákwà e ji ehicha ahụ́ ehicha ahụ́. E kwela ka ọbara ma ọ bụ ọsụsọ na ihe ndị ọzọ si n’ahụ́ ndị ọzọ ma ọ bụ n’ahụ́ anụmanụ metụ gị. Ejikwala ịkwọ aka mgbe niile na ịkwọ ya nke ọma egwu egwu. E nwere ike ikwu na ọ bụ ụzọ kacha mma i nwere ike isi gbochie ikesa ọrịa.

O kwe mee, nọrọ n’ụlọ mgbe ị na-arịa ọrịa, ka ị ghara ibunye ya ndị ọzọ. Ụlọ Ọrụ Na-ahụ Maka Ịchịkwa na Igbochi Ọrịa n’Amerịka kwuru na ọ ka mma iji ákwà kpuchie imi ma ọ bụ ọnụ gị mgbe ị na-akwa ụkwara ma ọ bụ na-ama uzere, kama iji aka gị.

Otu okwu amamihe dị na Baịbụl, sịrị: “Onye maara ihe bụ onye hụrụ ọdachi gaa zoo.” (Ilu 22:3) Ihe a ebe a kwuru baara anyị ezigbo uru taa, nke ka nke n’ụwa ọjọọ anyị a ọtụtụ ọrịa jọgburu onwe ha jupụtara na ya. N’ihi ya, na-agakwuru ndị ụlọ ọgwụ mgbe niile ka ị mata ihe ị ga-eme, gbalịakwa na-eme ọcha. Mee ihe niile i kwesịrị ime ka ị ghara ịna-ebutekarị ọrịa.

a Ngalaba Òtù Mba Ụwa nke Na-ahụ Maka Ahụ́ Ike kwuru ụzọ dị iche iche anyị ga-esi na-eme ka mmiri dị ọcha. Ha kwuru na e nwere ike itinye ya klorin, gbaa ya n’anwụ, zaa ya aza, ma ọ bụkwanụ sie ya n’ọkụ.

b Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmatakwu otú i ga-esi gbochie irite ọrịa ná nri, gụọ Teta! Julaị 2012, peeji nke 3-9.

c Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmatakwu ihe ị ga-eme iji gbochie ịba, gụọ Teta! Septemba–Ọktoba 2015, peeji nke 12-13.

d Anụmanụ nwere elò taa gị, i kwesịrị ịga ụlọ ọgwụ ozugbo.

Ihe I Nwere Ike Ime Ka Ị Ghara Ibute Orịa Na-efe Efe

Ebe otu nwaanyị na-akwọ aka

N’afọ 2014, otu ọrịa a na-akpọ Ebola bidoro ịkpa mkpamkpa n’ebe Ọdịda Anyanwụ Afrịka, bụrụkwa okwu akpụ n’ọnụ n’ụwa niile. Alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova dị́ n’ebe ndị ahụ ihe a mere bidoro ịgwa ndị mmadụ ihe ndị ga-enyere ha aka ịghara ibute ọrịa ahụ. Lee ihe ndị na-anọchite anya Ndịàmà Jehova sịrị na ha mere n’oge ahụ:

  • Ebe otu nwoke na-akụziri ndị ọzọ ihe

    Olee otú unu si nyere ndị mmadụ aka ịma na agwọ nọ n’akịrịka?

    Anyị gwara ndị mmadụ ihe ndị ga-eme ka ha ghara ịtụ ụjọ, kọwaakwara ha otú nje ahụ si agbasa nakwa ihe ndị ha ga-eme ka ha ghara ibute ya.

  • Ebe mmadụ na-akwọ aka

    Gịnị ka Ndịàmà Jehova mere ka ha ghara ibute ọrịa a?

    Anyị ji ihe e ji enyocha ahụ́ lee ndị niile bịara ọmụmụ ihe anyị ahụ́. Onye ọ bụla kwụsịrị ikwe ibe ya n’aka, kwụsịkwa ịmakụ ibe ya, malitekwa ịna-akwọ aka mgbe niile. Anyị dosara mmiri e tinyere ihe na-egbu nje ahụ n’ebe dị iche iche n’obodo, ka ndị mmadụ nwee ike ịna-akwọ aka ha mgbe niile.

  • Telefon dị n’ime ụlọ

    Gịnị ka unu mere iji nwee ike ịna-enwe ọmụmụ ihe unu, na-ezikwa oziọma?

    Gọọmenti machiri ndị mmadụ ịgagharị n’obodo ụfọdụ, n’ihi ya, anyị ezukọghị nwee ọmụmụ ihe n’ebe ndị ahụ. Kama, ezinụlọ ọ bụla bidoro inwe ọmụmụ ihe nke ha n’ụlọ ha. Ụfọdụ ji ekwentị mụọrọ ndị mmadụ ihe, ka ha na ndị ahụ ghara ịmetụ ahụ́.

  • Kalenda

    Gịnị ka unu na-eme ma mmadụ bido rịawa ahụ́?

    Anyị na-agwa ndị ụlọ ọgwụ. Onye ọ bula metụrụ onye bú ebola aka, ma ọ bụ gaa ebe a na-eli onye bú ebola, ma o bụ rịawa ahụ́, ga-anọpụ iche ruo mgbe abalị iri abụọ na otu gafechara. Ọ bụ abalị iri abụọ na otu ka ndị ọkacha mara kwuru na ebola na-anọ tupu ya apụta ìhè.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya