Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g18 nke 2 p. 11
  • 8 Na-eme Ihe Ị Na-akụziri Ụmụ Gị

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • 8 Na-eme Ihe Ị Na-akụziri Ụmụ Gị
  • Teta!—2018
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • IHE Ọ PỤTARA
  • IHE MERE O JI DỊ MKPA
  • IHE I NWERE IKE IME
  • Bible Ọ̀ Pụrụ Inyere Gị Aka Ịzụ Ụmụ Gị?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2004
  • Ndị Nne na Nna, Nyerenụ Ụmụ Unu Aka Ka Ha Hụ Jehova n’Anya
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2022
  • Olee Ụzọ Kacha Mma Isi Kụziere Ụmụaka Banyere Chineke?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2011
  • Ndị Nne na Nna—Jirinụ Ịhụnanya Na-azụ Ụmụ Unu
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2007
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—2018
g18 nke 2 p. 11
Ebe otu nwatakịrị nwaanyị na-eso nzọụkwụ papa ya na-aga ije na snoo

Olee ụdị nzọụkwụ ị na-egosi ụmụ gị ka ha na-eso?

MAKA NDỊ NNE NA NNA

8 Na-eme Ihe Ị Na-akụziri Ụmụ Gị

IHE Ọ PỤTARA

Ndị nne na nna kwesịrị ịna-eme ihe ha na-akụziri ụmụ ha ka ha na-eme. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na mmadụ abịa n’ụlọ unu, gị asị nwa gị gwa onye ahụ na ị nọghị ya, i kwesịghị ịtụ anya na nwa ahụ ga na-ekwu eziokwu.

Otu nwoke aha ya bụ David kwuru, sị: “Ndị mmadụ na-ekwukarị, sị, ‘Soro okwu ọnụ m, esola omume m.’ Ma, ejikwala aka ahụ azụ ụmụaka. Otú ahụ fom e tinyere ná mmiri si amịkọrọ mmiri, ụmụaka na-eme ihe ọ bụla anyị kwuru ma ọ bụ mee. Ha ga-agwadị anyị na ihe anyị na-akụziri ha abụghịzi ihe anyị na-eme.”

IHE BAỊBỤL KWURU: “Gị onye na-ekwusa ‘Ezula ohi,’ ị̀ na-ezu ohi?”—Ndị Rom 2:21.

IHE MERE O JI DỊ MKPA

Ụmụaka na ndị na-eto eto na-emekarị ihe ha hụrụ ndị mụrụ ha na-eme karịa ihe ha hụrụ ma ndị ọgbọ ha ma ndị ọzọ na-eme. Ọ pụtara na ọ bụ gị kwesịrị ịkụziri nwa gị ụzọ ọ ga-eso, ọ bụrụhaala na ị na-eme ihe ị na-akụziri ya.

Otu nwaanyị aha ya bụ Nicole kwuru, sị: “Anyị nwere ike ịgwa nwa anyị ihe ọ ga-eme ugboro ugboro, na-eche na ọ naghị ege ntị, ma, naanị otu ugboro anyị na-emeghị ihe anyị kwuru, nwa ahụ ga-agwa anyị na anyị emeghị ihe anyị kwuru. Ụmụaka na-ahụ ihe niile anyị na-eme, ma mgbe anyị chere na ha anaghị ahụ anyị.”

IHE BAỊBỤL KWURU: ‘Amamihe nke si n’eluigwe na-eme ka mmadụ ghara ịdị ihu abụọ.’—Jems 3:17.

IHE I NWERE IKE IME

Chebara ihe ndị ị na-eme echiche. Olee ụdị ihe ị na-ele ma ị chọọ ịtụrụ ndụ? Olee otú ị na-esi emeso di gị ma ọ bụ nwunye gị, nakwa ụmụ gị ihe? Olee ụdị ndị bụ enyi gị? Ị̀ na-echebara ndị ọzọ echiche? Ihe a na-ekwu bụ ma ị̀ bụ ụdị mmadụ ị chọrọ ka ụmụ gị bụrụ?

Otu nwaanyị aha ya bụ Christine kwuru, sị: “Mụ na di m anaghị agwa ụmụ anyị ka ha mee ihe anyịnwa na-anaghị eme.”

Rịọ mgbaghara maka ihe i mejọrọ. Ụmụ gị ma na i zughị okè. Ọ bụrụ na i mejọọ di gị ma ọ bụ nwunye gị ma ọ bụkwanụ ụmụ gị, sị ha: “Biko, gbaghara m.” Ụmụ gị ga-amụta ịna-ekweta ihe ha mejọrọ, na-adịkwa umeala n’obi.

Otu nwaanyị aha ya bụ Robin kwuru, sị: “Ụmụ anyị kwesịrị ịnụ ka anyị na-ekweta ma na-arịọ mgbaghara maka ihe anyị mejọrọ. Ọ bụrụ na anyị anaghị eme ya, hanwa agaghịkwa na-eme ya.”

Otu nwaanyị aha ya bụ Wendell kwuru, sị: “Ụmụ anyị na-emekarị ihe ha hụrụ anyị na-eme. Àgwà anyị bụ ihe kacha mma anyị ga-eji akụziri ụmụ anyị ihe n’ihi na ha na-ahụ ihe anyị na-eme mgbe niile. Àgwà anyị dị ka akwụkwọ ụmụ anyị si na ya na-amụta ihe mgbe ọ bụla.”

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya