Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g18 nke 2 p. 14
  • 11 Na-arụsi Ọrụ Ike

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • 11 Na-arụsi Ọrụ Ike
  • Teta!—2018
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • IHE Ọ PỤTARA
  • IHE MERE O JI DỊ MKPA
  • IHE I NWERE IKE IME
  • Gịnị Ka Ị Ga-eme Ka Ịrụsi Ọrụ Ike Na-atọ Gị Ụtọ?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2015
  • Ọrụ
    Teta!—2015
  • Na-ahụ Ihe Ọma n’Ihi Ịrụsi Ọrụ Ike Gị
    “Nọrọnụ n’Ịhụnanya Chineke”
  • Ụzọ Isi Zụlite Echiche Kwesịrị Ekwesị Banyere Ọrụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2003
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—2018
g18 nke 2 p. 14
Ebe otu nwa agbọghọ na-emega ahụ́

Ịrụsi ọrụ ike dị ka imega ahụ́, ọ ga-abara gị uru ugbu a nakwa n’ọdịnihu

MAKA NDỊ NA-ETO ETO

11 Na-arụsi Ọrụ Ike

IHE Ọ PỤTARA

Ndị na-arụsi ọrụ ike anaghị agbara ọrụ ọsọ. Kama, obi na-atọ ha ụtọ ịrụsi ọrụ ike iji nweta ihe ndị ha ga-eji gboo mkpa ha, nakwa iji nyere ndị ọzọ aka ọ bụrụgodị na ọrụ ha na-arụ bụ ọrụ a na-eleda anya.

IHE MERE O JI DỊ MKPA

Nke bụ́ eziokwu bụ na e nwere ọtụtụ ihe mmadụ kwesịrị ime ná ndụ ma ọ̀ chọrọ ya ma ọ chọghị ya. N’ụwa a ọtụtụ ndị na-anaghị enwe mmasị ịrụsi ọrụ ike, ịrụsi ọrụ ike ga-abara gị uru.—Ekliziastis 3:13.

Otu nwoke aha ya bụ Reyon kwuru, sị: “Ahụla m na ọ bụrụ na mmadụ ana-arụsi ọrụ ike, ọ ga na-enwe obi ụtọ. M na-enwekwa ụdị obi ụtọ a n’ihi na m na-arụsi ọrụ ike. Mmadụ iji ọrụ ya kpọrọ ihe na-emekwa ka ndị ọzọ na-akwanyere ya ùgwù.”

IHE BAỊBỤL KWURU: “Mmadụ na-erite uru ma ọ bụrụ na ọ na-arụsi ọrụ ike.”—Ilu 14:23.

IHE I NWERE IKE IME

Ime ihe ndị na-esonụ ga-enyere gị aka ịna-ele ọrụ anya otú kwesịrị ekwesị.

Mee ka ịna-eme ihe nke ọma mara gị ahụ́. Ma ị̀ na-arụ ọrụ dịịrị gị n’ụlọ ma ị̀ na-eme ihe omume e nyere gị n’ụlọ akwụkwọ ka i mee n’ụlọ ma ị̀ na-arụ ọrụ i ji akpa afọ gị, jiri obi gị niile na-arụ ya. O nwee ihe ị mụtara otú e si eme ya, chọọ otú ị ga-esi na-emekwu ya nke ọma. Dị ka ihe atụ, otú ị ga-esi na-eme ya ngwa ngwa ma ọ bụ otú ka mma. Ka ị na-arụkwu ọrụ gị nke ọma, ka ọ ga na-atọkwu gị ụtọ.

IHE BAỊBỤL KWURU: “Ọ bụrụ na mmadụ ma ọrụ ya nke ọma, ọ ga-eguzo n’ihu ndị eze. Ọ gaghị eguzo n’ihu ndị nkịtị.”—Ilu 22:29.

Na-eche gbasara ndị ọzọ. Ọtụtụ mgbe, ọ bụrụ na ị na-arụ ọrụ gị nke ọma, ọ na-abara ndị ọzọ uru. Dị ka ihe atụ, ị na-arụ ọrụ dịịrị gị n’ụlọ nke ọma, ọ ga-eme ka ihe dịrị ndị ezinụlọ unu mfe.

IHE BAỊBỤL KWURU: “A na-aka enwe obi ụtọ n’inye ihe karịa ka a na-enwe n’ịnara ihe.”—Ọrụ Ndịozi 20:35.

Na-eme karịa ihe a tụrụ anya n’aka gị. Kama ịna-arụ ọrụ e kenyere gị naanị iji mezuo iwu, gbalịa na-eme karịa ihe a tụrụ anya n’aka gị. Ọ ga-egosi na i ji obi gị niile na-eme ya, ọ bụghị n’ihi na a manyere gị amanye.—Matiu 5:41.

IHE BAỊBỤL KWURU: “Ka ọ ghara ịbụ na m manyere gị ka i meere m ihe ọma, kama, ka ọ bụrụ na i ji obi gị niile mee ya.”—Faịlimọn 14.

Arụgbula onwe gị n’ọrụ. Ndị na-arụsi ọrụ ike anaghị adị umengwụ, ha anaghịkwanụ arụgbu onwe ha n’ọrụ. Ha na-arụsi ọrụ ike, ma ha na-ewepụtakwa oge ha ji ezuru ike.

IHE BAỊBỤL KWURU: “Mmadụ izurutụ ike dị mma karịa mmadụ ịrụgbu onwe ya n’ọrụ na ịchụ ifufe.”—Ekliziastis 4:6.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya