Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g19 nke 2 p. 12-13
  • Uru Onye Toro Eto Ịkụziri Nwatakịrị Ihe Bara

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Uru Onye Toro Eto Ịkụziri Nwatakịrị Ihe Bara
  • Teta!—2019
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • OLEE NDỊ TOROLA ETO GA-AKỤZIRI NWATAKỊRỊ IHE?
  • GỊNỊ MERE ONYE TOROLA ETO ỊKỤZIRI NWATAKỊRỊ IHE JI DỊ MKPA?
  • OTÚ Ị GA-ESI KỤZIERE ỤMỤ GỊ IHE
  • Otú Ị Ga-esi AkụziriNwa Gị Ihe—Mgbe Ọ Ghọwara Dimkpa
    Teta!—2011
  • Ntụziaka Bụ́ Ịgba Maka Ịzụ Ụmụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2006
  • Ajụjụ Ndị Nne na Nna Na-ajụ
    Ajụjụ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ—Azịza Ndị Na-adị Irè, Nke 1
  • Ịmụta Ikwe Ka A Pụọ
    Teta!—1998
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—2019
g19 nke 2 p. 12-13
Ebe otu nwaanyị na-egosi otu nwatakịrị foto ochie ya

IHE NKE 5

Uru Onye Toro Eto Ịkụziri Nwatakịrị Ihe Bara

OLEE NDỊ TOROLA ETO GA-AKỤZIRI NWATAKỊRỊ IHE?

Ụmụaka kwesịrị inwe ndị toro eto ga na-akụziri ha ihe ma na-eduzi ha. Ọ bụrụ na ị bụ nne ma ọ bụ nna, ọ bụ gịnwa ga-akacha arụ ọrụ a nke ọma. N’eziokwu, ọ bụ ọrụ dịịrị gị. Ma, ndị ọzọ torola eto nwekwara ike inye aka kụziere ụmụaka gị ihe.

GỊNỊ MERE ONYE TOROLA ETO ỊKỤZIRI NWATAKỊRỊ IHE JI DỊ MKPA?

N’ọtụtụ obodo, ụmụaka na ndị torola eto anaghị emekọcha ihe. Dị ka ihe atụ:

  • Ụmụaka na-anọ ọtụtụ awa n’ụlọ akwụkwọ bụ́ ebe ndị nkụzi na ndị ọzọ torola eto dị ole na ole.

  • Ụfọdụ ụmụaka lọta akwụkwọ, o nweghị onye ha na-ahụ n’ụlọ n’ihi na nne ha na nna ha agaala ọrụ.

  • Otu nchọpụta e mere gosiri na n’Amerịka, ụmụaka ndị nọ n’agbata afọ asatọ na afọ iri na abụọ na-eji ihe dị ka awa isii ele tiivi, ege egwú ma ọ bụ egwu egwuregwu vidio kwa ụbọchị.a

Otu akwụkwọ aha ya bụ Hold On to Your Kids kwuru, sị: “Ụmụaka na-ahapụ ndị nne na nna ha, ndị nkụzi ha na ndị ọzọ torola eto na-agakwuru ndị ọgbọ ha ka ha nye ha ndụmọdụ, kụziere ha ihe ma duzie ha.”

OTÚ Ị GA-ESI KỤZIERE ỤMỤ GỊ IHE

Gị na ụmụ gị na-anọrị.

IHE BAỊBỤL KWURU: “Zụlite nwata dị ka ụzọ kwesịrị ya si dị; ọbụna mgbe o mere okenye, ọ gaghị ahapụ ya.”—Ilu 22:6.

Ụmụaka na-achọkarị ka ndị mụrụ ha na-eduzi ha. Ụfọdụ ndị ọkachamara kwụdịrị na ụmụaka ndị rurula afọ iri na atọ na-achọkarị ige ndị mụrụ ha ntị karịa ndị ọgbọ ha. Otu nwoke aha ya bụ Dr. Laurence Steinberg kwuru n’akwụkwọ bụ́ You and Your Adolescent, sị: “Ọ bụ ihe ndị nne na nna na-eme ka ụmụ ha na-akacha eṅomi mgbe ha dị afọ iri na ụma na mgbe ha ruwere afọ iri abụọ.” O kwukwara, sị: “Ndị na-eto eto na-achọkarị ịma ihe ndị nne na nna ha na-eche, ha na-egekwa ihe ha na-ekwu, ọ bụ eziokwu na ha anaghị ekwetacha ihe niile a na-agwa ha.”

Ebe ọ bụ na ụmụ gị ga-enwe mmasị ka ị na-eduzi ha, gbalịa na-eduzi ha. Gị na ha na-anọ, na-akọrọ ha otú i si ele ihe anya, ihe ndị na-amasị gị, na ihe ndị merela ná ndụ gị.

Mee ka ha nwee onye ha ga na-eṅomi.

IHE BAỊBỤL KWURU: “Onye ya na ndị maara ihe na-eje ije ga-ama ihe.”—Ilu 13:20.

Ò nwere onye torola eto ị maara ị ga-achọ ka nwa gị na-eṅomi? Lee ma ị̀ ga-agwa onye ahụ ka ọ bịa na-enyere nwa gị aka. Ma, ọ pụtaghị na ị ga-ahapụrụ ya nwa gị ka ọ na-azụ. Ndụmọdụ onye torola eto ị tụkwasịrị obi na-enye nwa gị na nke gịnwa na-enye ya nwere ike inyere ya aka ịna-emekwu nke ọma. Baịbụl kwuru na Timoti na Pọl onyeozi bụ enyi, ọbụbụenyi ha baara Timoti ọtụtụ uru, n’agbanyeghị na ọ ghọọla dimkpa. Ọ bakwaara Pọl uru.—Ndị Filipaị 2:20, 22.

N’ime otu narị afọ gara aga, ọtụtụ ezinụlọ ebikọghịzi ọnụ n’ihi na ndị ikwu ha bicha ná mba ọzọ. Ọ bụrụ na ọ bụ otú ahụ ka ọ dị gịnwa, mee ka ụmụ gị nwee onye torola eto na-akpa ụdị àgwà ndị ị ga-achọ ka ha na-akpa ka ha nwee ike ịmụta àgwà ndị ahụ.

a Nchọpụta ahụ e mere gosikwara na ụmụaka ndị nọ n’agbata afọ iri na atọ na iri na itoolu na-eji ihe dị ka awa itoolu ele tiivi, ege egwú ma ọ bụ egwu egwuregwu vidio kwa ụbọchị. Oge ha na ụmụaka ndị nke ọzọ ji aga n’Ịntanet mgbe ha nọ n’ụlọ akwụkwọ na oge ha nọ ebe ahụ na-eme ihe omume esoghị n’awa ndị a e kwuru.

Ebe otu nwaanyị na-egosi otu nwatakịrị foto ochie ya

BIDO UGBU A KỤZIWERE NWA GỊ IHE

Ọ ga-adịrị nwatakịrị nwere ndị torola eto o si n’aka ha na-amụta ihe mfe inwe amamihe ma na-akpa ezigbo àgwà ma o too

Na-eme Ihe Ndị Ị Na-akụziri Nwa Gị

  • Àna m akpa ezigbo àgwà m ga-achọ ka ụmụ m na-akpa?

  • M̀ na-eme ka ụmụ m mata na mụnwa na-amụtakwa ihe n’aka ndị ọzọ ka m mara ihe?

  • M̀ na-ewepụta oge ka mụ na ụmụ m na-anọrị ka ha mata na m ji ha kpọrọ ihe?

Ihe Anyị Mere . . .

“Mgbe ụfọdụ, nwa m nwaanyị na-abịakwute m mgbe m ji ọrụ n’aka sị m na o nwere ihe ọ chọrọ ịgwa m. M na-ebukarị ụzọ ege ya ntị. Mgbe ụfọdụ, m na-asị ya chetụ ntakịrị ka m metọpụ ihe m na-eme ka m nwee ike ige ya ntị nke ọma. Mụ na nwunye m na-agbalịkwa na-akpa ezigbo àgwà ka nwa anyị ghọta na anyị na-emekwa ihe ndị ahụ anyị na-akụziri ya.”—David.

“Mgbe anyị mụrụ nwa anyị nwaanyị, mụ na di m kpebiri na mụ agaghị na-aga ọrụ, kama na m ga na-anọ n’ụlọ na-elekọta nwa anyị. Anaghị m akwa ụta maka mkpebi ahụ anyị mere. Ọ dị mkpa ịgbalịsi ike nọrọ nwatakịrị nso mgbe ahụ ọ ka dị ntakịrị ka o nwee onye ga-eduzi ya ma kụziere ya ihe. Nke ka nke bụ na ọ ga-eme ka nwa ahụ mata na a hụrụ ya n’anya.”—Lisa.

ISO NDỊ TOROLA ETO NA-ANỌ

“Ụmụ m toro n’ebe ọtụtụ ndị torola eto nọ. Ha mụtara ọtụtụ ihe n’aka ha. Dị ka ihe atụ, ọ tụrụ ha n’anya mgbe nne nne m gwara ha na mgbe ọ dị ntakịrị, ọ bụ ezinụlọ ha bụ ndị mbụ nwetara ọkụ eletrik. Ọ gwara ha na ndị agbata obi ha na-abịa n’ụlọ ha nọrọ n’akụkụ ebe ha na-esi nri na-ele anya naanị ka ha hụ ka anyị na-agbanye ọkụ ma na-agbanyụ ya. Akụkọ ahụ mere ka ụmụ m mata otú ihe dị n’oge ahụ. Ihe ha mụtara n’aka nne nne m mekwara ka ha na-akwanyere ya na ndị agadi ndị ọzọ ùgwù. Ụmụaka na ndị torola eto na-anọ ọtụtụ mgbe, kama ha na ụmụaka ibe ha ịna-anọkarị, ọ ga-eme ka ha mụta ọtụtụ ihe ga-abara ha uru ná ndụ.”—Maranda.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya