Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g21 nke 3 p. 3
  • Gịnị Ga-enyere Gị Aka Ịma Ihe Ị Ga-ekpebi?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Gịnị Ga-enyere Gị Aka Ịma Ihe Ị Ga-ekpebi?
  • Teta!—2021
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Onye Okike Pụrụ Ime Ka Ndụ Gị Nwee Nzube
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
  • Mee Ka Okwukwe Gị Sie Ike na E Nwere Onye Kere Ihe Niile
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2021
  • Olee Otú Ihe Ndị Dị Ndụ Si Malite Ịdị?
    Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi—Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịmụ Baịbụl
  • Onye Okike Gị—Mụta Ihe Ọ Dị Ka Ya
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—2021
g21 nke 3 p. 3
Ebe otu nwaanyị na-ele onye pastọ ji Baịbụl na onye ọkà mmụta sayensị nke ji ihe yiri DNA anya, n’amaghị nke ọ ga-eso eso.

Gịnị Ga-enyere Gị Aka Ịma Ihe Ị Ga-ekpebi?

“Eluigwe na ụwa ga-ejili aka ha kee onwe ha.” ​—Ihe Stephen Hawking na Leonard Mlodinow, bụ́ ndị mụrụ gbasara fiziks, kwuru n’afọ 2010.

“Chineke kere eluigwe na ụwa.”​—Ihe Baịbụl kwuru na Jenesis 1:1.

Ọ̀ bụ Chineke kere eluigwe na ụwa na ihe ndị dị ndụ dị na ha, ka hà nọkatara dịrị? Ihe ndị fiziks abụọ ahụ zara ná mmalite isiokwu a dị nnọọ iche n’ihe Baịbụl zara. Azịza nke ọ bụla nwekwara ndị na-akwadosi ya ike. Ma, ọtụtụ ndị amaghị nke ha ga-ekwere ekwere. Ọtụtụ ndị arụọkwala ụka banyere ya n’akwụkwọ ndị kacha aga ahịa nakwa na tiivi.

O nwere ike ịbụ na ndị nkụzi unu gwara unu na eluigwe na ụwa ji aka ha dịrị, na o nweghị onye kere ha. Ma, hà gwara unu ihe gosiri na o nweghị onye kere ha? O nwekwara ike ịbụ na ị nụla ebe ndị isi chọọchị na-akụzi na e nwere onye kere ihe ndị a. Ma, hà gwara gị ihe gosiri na e nwere onye kere ha? Ka hà gwara gị jiri “okwukwe” nabata ihe ha kwuru?

O doro anya na i chebarala ajụjụ a echiche. Ma, o nwere ike ịdị gị ka o nweghị onye ma ma è nwere Onye kere ihe niile n’eziokwu. I nwekwara ike ịna-ajụ onwe gị ma ịmata azịza ajụjụ a ọ̀ dịkwanụ mkpa?

N’akwụkwọ a, anyị ga-ebu ụzọ kwuo ihe ụfọdụ mere ka ọtụtụ ndị kweta na e nwere Onye kere ihe niile. Anyị kwuchaa ya, anyị ekwuzie ihe mere o ji dị mkpa ka anyị mata otú ihe ndị dị ndụ si malite n’ụwa.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya