Nwee Ọṅụ ná Ndụ Ezinụlọ
Ezinụlọ dị iche iche hà pụrụ n’ezie inwe obi ụtọ?
Olee otú ọ pụrụ isi kwe mee?
Ọ̀ dị ezinụlọ ndị ị maara dị n’otu ma nwee obi ụtọ dị ka ndị a na-ahụ na traktị a? Ezinụlọ dị iche iche n’ebe nile na-adakpọsị. Ịgba alụkwaghịm, mmadụ ejighị ọrụ ọ na-arụ n’aka, ọnọdụ amaghị ihe a ga-eme eme nke nne ma ọ bụ nna nanị ya na-azụ nwa, ndakpọ olileanya—ihe a nile na-eso akpata nsogbu a. Otu ọkachamara ná ndụ ezinụlọ kwara arịrị, sị: “Ka ọ dị ugbu a, onye ọ bụla maara nke ọma amụma ndị e buru banyere ndakpọ nke ezinụlọ.”
N’ihi gịnị ka ezinụlọ dị iche iche taa ji na-enwe oké nsogbu ndị dị otú ahụ? Olee otú anyị pụrụ isi nwee ọṅụ ná ndụ ezinụlọ?
Otú Ezinụlọ Si Malite
Iji zaa ajụjụ ndị a, ọ dị anyị mkpa ịmara mmalite nke alụmdi na nwunye na ezinụlọ. N’ihi na ọ bụrụ na ha nwere Onye Malitere ha—Onye Okike—ndị òtù ezinụlọ kwesịrị ilegara ya anya maka nduzi, ebe ọ bụ n’ezie na ọ ga-ama ụzọ kasị mma anyị pụrụ isi nwee ọṅụ ná ndụ ezinụlọ n’ụzọ zuru ezu.
N’ụzọ na-adọrọ mmasị, ọtụtụ ndị kweere na ndokwa ezinụlọ enweghị Onye Malitere ya. Akwụkwọ bụ́ The Encyclopedia Americana na-ekwu, sị: “Ụfọdụ ndị ọkà mmụta na-adị akọwa na alụmdi na nwunye malitere ná ndokwa oké na nne nke dị n’etiti anụmanụ ndị dị ala karịa mmadụ.” Otú ọ dị, Jisọs Kraịst kwuru okwu banyere okike nke nwoke na nwanyị. O hotara ihe ndekọ oge gboo nke Bible dị ka ihe ndabere wee sị: “Ihe Chineke kekọtara, mmadụ atọsala.”—Matiu 19:4-6.
Ya mere ihe Jisọs Kraịst kwuru ziri ezi. Chineke bụ́ onye nwere ọgụgụ isi kere ụmụ mmadụ mbụ ma mee ndokwa maka ndụ ezinụlọ obi ụtọ. Chineke jikọtara nwoke na nwanyị mbụ n’alụmdi na nwunye wee sị na nwoke ahụ ‘ga-arapara n’ahụ nwunye ya: ha ewee ghọọ otu anụ ahụ.’ (Jenesis 2:22-24) Ya bụrụ otú ahụ, ọ̀ pụrụ ịbụ na nsogbu ndị dị n’ezinụlọ taa bụ n’ihi ịchụso ụzọ ndụ ndị na-emebi ụkpụrụ ndị Onye Okike setịpụrụ n’Okwu ya, bụ́ Bible?
Olee Ụzọ nke Na-eweta Ihe Ịga nke Ọma?
Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ị maara na ụwa nke oge a na-akwalite ọdịmma onwe onye na afọ ojuju onwe onye. “Anyaukwu bụ ihe ziri ezi,” ka otu onye ọrụ ego gwara otu klas na-agụsị akwụkwọ n’otu kọleji na United States. “Ị pụrụ ịdị anyaukwu ma ka nwee echiche dị mma banyere onwe gị.” Ma ịchụso ihe onwunwe adịghị eduga n’inwe ihe ịga nke ọma. N’ezie, ịhụ ihe onwunwe n’anya bụ otu n’ime ihe ndị kasị eyi ndụ ezinụlọ egwu n’ihi na ọ na-egbochi mmekọrịta mmadụ na ibe ya ma na-erikpọ oge na ego ndị mmadụ. N’ụzọ megidere nke a, tụlee otú nanị abụọ n’ime ilu ndị dị na Bible si enyere anyị aka ịhụ ihe dị mkpa maka inwe obi ụtọ.
“Ọ dị mma gị na ndị ị hụrụ n’anya iri akwụkwọ nri karịa iri anụ kasị mma n’ebe e nwere ịkpọasị.”
“Ọ dị mma iji udo nke obi rie otu ibe achịcha kpọrọ nkụ karịa iri oké oriri n’ụlọ jupụtara ná nsogbu.”
Ilu 15:17; 17:1, “Today’s English Version.”
Okwu ndị a magburu onwe ha, ọ́ bụghị ya? Cheedị nnọọ otú ụwa ga-esi dịrị iche ma ọ bụrụ na ezinụlọ ọ bụla agbasoo ihe ndị a e kwesịrị idebe n’ọnọdụ mbụ! Bible na-enyekwa nduzi bara uru n’ụzọ ndị òtù ezinụlọ kwesịrị isi na-emesorịta onwe ha. Tụlee nanị ole na ole n’ime okwu nduzi ndị ọ na-enye.
Ndị Bụ́ Di: ‘Na-ahụnụ nwunye nke aka unu n’anya dị ka unu hụrụ ahụ nke onwe unu n’anya.’—Ndị Efesọs 5:28-30.
Ọ dị mfe, ma dị irè! Bible na-enyekwa onye bụ di iwu ka ọ ‘na-ekenye nwunye ya nsọpụrụ.’ (1 Pita 3:7) Ọ na-eme nke a site n’ilebara ya anya n’ụzọ pụrụ iche, tinyere ịdị nro, nghọta, na imesi ya obi ike. Ọ na-ejikwa echiche ya akpọrọ ihe, na-egekwa ya ntị. (Tụlee Jenesis 21:12.) Ì kwetaghị na ezinụlọ ọ bụla ga-erite uru ma o bụrụ na onye bụ di ejiri nchebara echiche na-emeso nwunye ya, dị ka ya onwe ya ga-achọ ka e mesoo ya?—Matiu 7:12.
Ndị Bụ́ Nwunye: ‘Nweenụ nkwanye ùgwù miri emi maka di unu.’—Ndị Efesọs 5:33, NW.
Nwunye na-enye aka ime ka obi ụtọ dị n’ezinụlọ site n’inyere di ya aka ibu ibu ọrụ ya dị arọ. Nke a bụ ihe e zubere, ebe Chineke nyere onye bụ nwunye ịbụ “onye inyeaka kwesịrị ya.” (Jenesis 2:18) Ị̀ pụrụ ịghọta ngọzi ọ ga-eweta ná ndụ ezinụlọ mgbe onye bụ nwunye na-akwanyere di ya ùgwù site n’ịkwado mkpebi ya na ikwenyere ya iji ruo ihe mgbaru ọsọ nke ezinụlọ?
Ndị Bụ́ Di Ma Ọ Bụ Nwunye: “Ndị bụ́ di na ndị bụ́ nwunye aghaghị ikwesị ntụkwasị obi nye ibe ha.”—Ndị Hibru 13:4, TEV.
Mgbe ha na-eme otú a, ọ ghaghị ịbara ndụ ezinụlọ uru n’ezie. Ọtụtụ mgbe, ịkwa iko nke onye bụ di ma ọ bụ nwunye na-etisa ezinụlọ. (Ilu 6:27-29, 32) N’ihi ya, n’ụzọ amamihe dị na ya, Bible na-agba ume, sị: “Nwee obi ụtọ n’ebe nwunye gị nọ, nwetakwa ọṅụ na nwa agbọghọ ị lụrụ . . . N’ihi gịnị ka ị ga-eji nye nwanyị ọzọ ịhụnanya gị?”—Ilu 5:18-20, TEV.
Ndị Mụrụ Ụmụ: ‘Zụlitenụ ụmụ unu dị ka ụzọ ha si dị.’—Ilu 22:6.
Mgbe ndị mụrụ ụmụ na-enye ụmụ ha oge na nlebara anya, ndụ ezinụlọ ga-adịwanye mma n’ezie. N’ihi ya, Bible na-agba ndị mụrụ ụmụ ume ịkụziri ụmụ ha ụkpụrụ ndị ziri ezi ‘mgbe ha na-anọdụ n’ụlọ ha, na mgbe ha na-eje ije n’ụzọ, na mgbe ha na-edina ala, na mgbe ha na-ebili ọtọ.’ (Deuterọnọmi 11:19) Bible na-ekwukwa na ndị mụrụ ụmụ kwesịrị igosi na ha hụrụ ụmụ ha n’anya site n’inye ha ọzụzụ.—Ndị Efesọs 6:4.
Ụmụ: “Ụmụ, na-aṅanụ ntị okwu ndị mụrụ unu n’ime Onyenwe anyị.”—Ndị Efesọs 6:1.
N’ezie, n’ụwa mmebi iwu a, ọ naghị adị mfe mgbe nile irubere ndị mụrụ gị isi. Otú ọ dị, ọ̀ bụ na i kwetaghị na ọ bụ ihe amamihe dị na ya ime ihe Onye Malitere ezinụlọ gwara anyị? Ọ maara ihe kasị mma iji mee ka obi ụtọ dịrị ná ndụ ezinụlọ anyị karị. Ya mere gbalịsie ike irubere ndị mụrụ gị isi. Kpebisie ike izere ọtụtụ ọnwụnwa nke ụwa nke ime ihe ọjọọ.—Ilu 1:10-19.
Ruo n’ókè onye ọ bụla so n’ezinụlọ na-etinye ndụmọdụ Bible n’ọrụ, ókè ahụ ka ọ ga-abara ndụ ezinụlọ uru. Ọ bụghị nanị na ezinụlọ ga-enwe ndụ ka mma ugbu a kama ọ ga-enwe olileanya nke ọdịnihu dị ebube n’ime ụwa ọhụrụ ahụ Chineke kwere ná nkwa. (2 Pita 3:13; Mkpughe 21:3, 4) Ya mere, meenụ ka ịmụkọ Bible ọnụ bụrụ ihe a na-emechi anya n’ezinụlọ unu! Ọtụtụ nde ezinụlọ gburugburu ụwa achọpụtawo nduzi dị n’akwụkwọ bụ́ Isi Ihe Na-akpata Obi Ụtọ Ezinụlọ ịbụ nke bara ezi uru.
Ọ gwụlakwa ma e gosịrị nsụgharị ọzọ, nhota Bible nile e mere sitere na Bible Nsọ nke Union Version, na-asụpe okwu nile n’ụdị e ji eme ihe n’oge a. N’ebe e dere NW ka ọ na-eso nhota okwu, ọ na-egosi na nsụgharị ahụ sitere na New World Translation of the Holy Scriptures—With References nke dị n’asụsụ Bekee.