Okwu Mmeghe Maka Iji Mee Ihe n’Ozi Ubi
Nkọwa: N’ikpebi ụdị okwu mmeghe a ga-eji mee ihe mgbe ị na-ekere òkè n’ozi ubi, ihe atọ kwesịrị ka e jiri nlezianya tụlee ha: (1) Ozi nke e kenyere anyị izisa bụ “ozi ọma nke a nke alaeze eluigwe.” (Mat. 24:14) Ọbụna mgbe ọ na-abụghị ya kpọmkwem ka anyị na-akparịta, anyị kwesịrị iburu n’uche inyere ndị mmadụ aka ịhụ mkpa maka ya, ma ọ bụ ma eleghị anya iwezụga ihe mgbochi ndị na-eme ka ha ghara ịdị njikere ịtụle ya. (2) Ezi nchegbu maka ọdịmma nke ndị anyị zutere ga-enyere anyị aka, dị ka o nyeere Jisọs, iru n’obi ha. (Mak 6:34) A pụrụ igosipụta ezi mmasị dị otú ahụ site n’ịmụmụ ezi ọnụ ọchị na inwe omume enyi, ịdị njikere ịṅa ntị mgbe ha na-ekwu okwu na mgbe ahụ ịgbanwe okwu anyị ka o kwesị ọnọdụ, nakwa anyị iji ajụjụ dị iche iche mee ihe bụ́ ndị na-agba ha ume ikwupụta echiche ha ka anyị wee ghọta ụzọ ha si ele ihe anya nke ọma karị. (1 Kọr. 9:19-23) (3) N’akụkụ ụfọdụ nke ụwa, a na-atụ anya ka ndị ọbịa kelee usoro ekele dị iche iche tupu ha ekwuo ihe ha ji bịa. N’ebe ndị ọzọ onye nwe ụlọ pụrụ ịtụ anya ka onye ọbịa a na-akpọghị akpọ gaa n’isi ihe o ji bịa ozugbo.—Tụlee Luk 10:5.
Okwu mmeghe ndị na-esonụ na-egosi otú ụfọdụ Ndịàmà nweworo ahụmahụ si amalite nkwurịta okwu. Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ị ga-achọ itinye ha n’okwu ndị nke gị. Ọzọ, ị ga-ahụ ya dị ka ihe enyemaka inweta aro ụfọdụ site n’ọnụ Ndịàmà ndị ọzọ nọ n’ọgbakọ gị bụ́ ndị na-enwe ezi ihe ịga nke ọma.
AGHA/UDO
● ‘M na-achọ ndị ga-enwe mmasị ibi n’ụwa nke agha na-adịghị na ya. N’ime narị afọ nke a nanị e nwewo ọtụtụ narị agha, gụnyere agha ụwa abụọ. . . . Ònye pụrụ ime ka e nwee ụwa nke udo dị na ya? . . . (Maịka 4:2-4)’
● ‘Anyị na-achọpụta na ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ onye ọ bụla na-asị na ya chọrọ udo ụwa. Ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ná ndị ndú ụwa na-ekwukwa nke ahụ. Mgbe ahụ, gịnị mere o ji sie oké ike inweta ya? . . . (Mkpu. 12:7-12)’
ALAEZE
● ‘N’iso ndị agbata obi m kwurịta okwu, achọpụtawo m na ọtụtụ na-achọsi ike ibi n’okpuru gọọmenti nke pụrụ n’ezie ịgwọta nnukwute nsogbu ndị anyị na-eche ihu—mpụ na oké ọnụ ahịa nke ihe ndị e ji ebi ndụ (ma ọ bụ ihe ọ bụla ka dị n’uche ọtụtụ ndị mmadụ). Nke ahụ ga-abụ ihe a na-achọsi ike, ọ̀ bụ na i kweghị? . . . È nwere gọọmenti dị otú ahụ taa? . . . Ọtụtụ ndị n’ezie ekpewo ekpere maka gọọmenti nke pụrụ ime ihe ndị a. Ihe ịrụ ụka adịghị ya na i kpewo ekpere maka ya, ma ọ bụghị ọtụtụ ndị na-eche echiche banyere ya dị ka gọọmenti. (Dan. 2:44; Abụ Ọma 67:6, 7; Maịka 4:4)’
● ‘Anyị na-ajụ ndị agbata obi anyị otu ajụjụ. Ọ ga-amasị anyị ịnụ ihe i nwere ikwu banyere ya. Ị ma na Jisọs kụziiri anyị ikpe ekpere ka Alaeze Chineke bịa na ka e mee uche Ya n’ụwa dị ka e si eme ya n’eluigwe. Ì chere na a ga-emesịa zaa ekpere a ka e wee mee uche Chineke n’ezie n’elu ụwa ebe a? . . . (Aịsa. 55:10, 11; Mkpu. 21:3-5)’
● ‘M so ndị agbata obi m na-atụle otu ihe iseokwu nke anyị nile na-aghaghị iche ihu: Ànyị na-akwado gọọmenti nke Chineke, ka ànyị na-ahọrọ ịchịisi ụmụ mmadụ? N’ihi ọnọdụ ndị e nwere n’ụwa taa, ọ̀ dị gị ka e nwere ihe dị anyị mkpa e wezụga ihe ụmụ mmadụ mepụtaworo? . . . (Mat. 6:9, 10; Abụ Ọma 146:3-5)’
AMAGEDỌN
● ‘Ọtụtụ ndị na-enwe nchegbu banyere Amagedọn. Ha anụwo ka ndị ndú ụwa ji okwu ahụ eme ihe n’izo aka n’agha nuklia zuru ụwa ọnụ. Gịnị ka i kwere Amagedọn ga-apụtara ihe a kpọrọ mmadụ? . . . N’ezie, e nwetara aha ahụ bụ Amagedọn site na Bible, ọ pụtakwara ihe dị nnọọ iche pụọ n’ihe a na-ejikarị okwu ahụ akọwa. (Mkpu. 16:14, 16) Bible na-egosikwa na e nwere ihe ndị anyị pụrụ ime n’onwe anyị maka nlanarị. (Zef. 2:2, 3)’
BIBLE/CHINEKE
● ‘Ndewo. M na-eme nleta ga-ewe mkpirikpi oge iji soro gị kerịta otu ozi dị mkpa. Biko rịba ama ihe ọ na-ekwu ebe a n’ime Bible. (Gụọ akụkụ akwụkwọ nsọ, dị ka Mkpughe 21:3, 4.) Gịnị ka i chere banyere nke ahụ? Ọ̀ na-ada ụda ọma ná ntị gị?’
● ‘Anyị na-agwa ndị agbata obi anyị okwu banyere ebe ha ga-enweta enyemaka dị irè iji nagide nsogbu dị iche iche nke ndụ. N’oge gara aga, ọtụtụ ndị lebara anya na Bible. Ma anyị na-ebi n’oge mgbe àgwà dị iche iche na-agbanwe. Olee otú ọ dị gị n’obị? Ì kwere na Bible bụ Okwu Chineke ka ị̀ na-eche na ọ bụ nanị akwụkwọ ọma ụmụ mmadụ dere? . . . Ọ bụrụ na o sitere n’aka Chineke, olee otú i chere mmadụ pụrụ isi jide nke ahụ n’aka?’
[● ‘Obi dị m ụtọ ịchọta gị n’ụlọ. M so ndị agbata obi m na-ekerịta otu echiche na-agba ume sitere na Bible (ma ọ bụ, Akwụkwọ Nsọ). Ọ̀ dịwo mgbe ị jụrụ, sị: . . . ? (Jụọ otu ajụjụ nke ga-eduba n’isiokwu nkwurịta okwu gị.)’]
● ‘Anyị na-agba ndị mmadụ ume ịgụ Bible ha. Azịza ndị ọ na-enye ajụjụ ndị dị mkpa na-ejukarị ndị mmadụ anya. Dị ka ihe atụ: . . . (Abụ Ọma 104:5; ma ọ bụ Dan. 2:44; ma ọ bụ nke ọ bụla ọzọ).’
● ‘Anyị na-eme nleta na-ewe nanị mkpirikpi oge na nke ndị agbata obi anyị taa. Ụfọdụ ndị anyị gwaworo okwu nwere nchekwube na Chineke. Ọ na-esiri ndị ọzọ ike ikwenye na ya. Olee ihe bụ echiche gị? . . . Bible na-agba anyị ume ịtụle ihe eluigwe na ala nkịtị pụtara. (Abụ Ọma 19:1) Onye ahụ nke iwu ya dị iche iche na-achịkwa ihe ndị a dị na mbara igwe ewepụtawokwa ntụzi ndị bara uru nye anyị. (Abụ Ọma 19:7-9)’
EZINỤLỌ/ỤMỤAKA
● ‘Anyị na-agwa ndị nwere mmasị n’ụzọ ka mma anyị pụrụ isi nagide nsogbu nile nke ndụ ezinụlọ okwu. Anyị nile na-agbalị ime ihe kasị mma anyị pụrụ ime, ma ọ bụrụ na e nwere ihe pụrụ inyere anyị aka inwe ihe ịga nke ọma ka ukwuu, anyị nwere mmasị na ya, ọ́ bụghị ya? . . . (Kọl. 3:12, 18-21) Bible na-esetịpụ n’ihu anyị olileanya nke na-enye ezi ọdịnihu maka ezinụlọ anyị nile. (Mkpu. 21:3, 4)’
● ‘Anyị nile chọrọ ka ụmụ anyị nwee ndụ obi ụtọ. Ma ì chere na ezi uche dị n’ịtụ anya ihe obi ụtọ isi ná nsogbu nke ụwa nọ na ya taa pụta? . . . Ya mere, ụdị ụwa dị aṅaa ka i chere ụmụ anyị gaje iche ihu mgbe ha tolitere? . . . Bible na-egosi na Chineke gaje ime ka ụwa a bụrụ ebe dị ebube ibi n’ime ya. (Abụ Ọma 37:10, 11) Ma ma ụmụ anyị hà ga-ekere òkè n’ime ya pụrụ ịdabere n’ọ̀tụ̀tụ̀ dị ukwuu ná nhọrọ nke anyị mere. (Deut. 30:19)’
IHE NDỊ NA-EME UGBU A
● ‘Mgbede ọma. Aha m bụ ․․․․․. Abụ m onye agbata obi gị sitere na (kpọọ aha okporo ámá ma ọ bụ ógbè). Ì kiriri akụkọ a kọrọ na TV n’abalị gara aga? . . . Ihe ahụ a kọrọ banyere (hota otu ihe ka mere eme nke na-eweta nchegbu)—gịnị ka ì chere banyere ya? . . . Ọ bụghị ihe ọhụrụ ịnụ ka ndị mmadụ na-ajụ, Gịnị ka ụwa nke a na-aghọ? Anyị dị ka Ndịàmà Jehova kwenyere na anyị na-ebi n’ihe Bible kpọrọ “mgbe ikpeazụ.” Rịba ama nkọwa nke a zuru ezu na 2 Timoti 3:1-5.’ (Leekwa Reasoning From the Scriptures, peji nke 234-243.)
● ‘Ị̀ gụrụ nke a n’akwụkwọ akụkọ nke izu a? (Gosi ihe kwesịrị ekwesị e bekapụtara ebekapụta.) Gịnị ka i chere . . . ?’
● ‘M ga-achọ ịjụ gị otu ajụjụ. Ọ bụrụ na ị pụrụ ịhọrọ, olee nke n’ime ọtụtụ nsogbu nile na-eche ụwa ihu ugbu a ka ị ga-achọ ka e buru ụzọ dozie? (Mgbe ị matasịrị ihe kasị na-echegbu onye nwe ụlọ, jiri nke a mee ihe dị ka ihe ndabere maka nkwurịta okwu gị.)’
IKPE NA-EZIGHỊ EZI/NHỤJUANYA
● ‘Ọ̀ dịwo mgbe ị jụrụ, sị: Chineke ọ̀ na-eche n’ezie banyere ikpe na-ezighị ezi na nhụjuanya nke ụmụ mmadụ na-enwe? . . . (Ekli. 4:1; Abụ Ọma 72:12-14)’
ỊHỤNANYA/OBI ỌMA
● ‘Anyị achọpụtawo na ọtụtụ ndị nwere nnọọ nchegbu banyere ụkọ nke ezi ịhụnanya n’ime ụwa. Ọ̀ dịkwu gị otú ahụ? . . . Olee ihe mere i ji chee na nke a bụ ihe na-emenụ? . . . Ị̀ matara na Bible buru amụma ọnọdụ a? (2 Tim. 3:1-4) Ọ na-akọwakwa ihe kpatara ya. (1 Jọn 4:8)’
● ‘Aha m bụ ․․․․․. Abụ m otu n’ime ndị agbata obi gị. M naeme nleta dị nnọọ mkpirikpi iji soro ndị agbata obi m tụlee otu ihe nke na-echegbu m nke ukwuu, m jikwa n’aka na ị rịbawokwa ya ama. Obi ọma adịghị efu ihe dị ukwuu, ma o yiri ka ọ dị oké ụkọ taa. Ọ̀ dịwo mgbe i chere echiche banyere ihe mere ọnọdụ ahụ ji dịrị? . . . (Mat. 24:12; 1 Jọn 4:8)’
ỊKA NKÁ/ỌNWỤ
● ‘Ọ̀ dịwo mgbe i chere echiche banyere ihe mere anyị ji aka nká na-anwụkwa anwụ? Mbe mmiri ụfọdụ na-ebi ọtụtụ narị afọ. Osisi ụfọdụ adịwo ndụ ruo ọtụtụ puku afọ. Ma ụmụ mmadụ na-adị nanị 70 afọ ma ọ bụ 80 wee nwụọ. Ì chewo echiche ihe kpatara ya? . . . (Rom 5:12) Ọ̀ dị mgbe ọnọdụ ahụ ga-agbanwe? . . . (Mkpu. 21:3, 4)’
● ‘Ọ̀ dịwo mgbe ị jụrụ, sị: Ọnwụ ọ̀ bụ njedebe ihe nile? Ka è nwere ihe ọzọ mgbe a nwụsịrị? . . . Bible na-aza ajụjụ ọ bụla anyị pụrụ inwe banyere ọnwụ. (Ekli. 9:5, 10) Ọ na-egosikwa na e nwere ezi olileanya maka ndị nwere okwukwe. (Jọn 11:25)’
MGBE IKPEAZỤ
● ‘Anyị bịara iji tụlee ihe ihe ndị na-eme gburugburu anyị n’ụwa taa pụtara. N’etiti ọtụtụ ndị, e nwewo mmasị na-adalata adalata n’ebe Chineke nọ na n’ụkpụrụ ya nile maka ibi ndụ dị ka e setịpụrụ ha na Bible. Nke a emetụtawo àgwà ụmụ mmadụ n’ebe ibe ha nọ nke ukwuu. Biko ka m soro gị kerịta nkọwa nke a e dekọrọ na 2 Timoti 3:1-5, ị ga-agwakwa m ma ì chere na o kwekọrọ n’ụwa nke taa. (Gụpụta) . . . È nwere ezi ihe mere anyị ga-eji tụọ anya ọnọdụ ndị ka mma n’ọdịnihu? (2 Pita 3:13)’
● ‘Ọtụtụ ndị kwenyere na oge na-agwụnarị ụwa nke a ọsọ ọsọ. Ha na-ekwu banyere oge anyị dị ka nke bụ “mgbe ikpeazụ.” Ma ị̀ matara na Bible na-agwa anyị ụzọ anyị pụrụ isi lanarị ngwụsị nke ụwa nke dị ugbu a ma dịrị ndụ n’elu ụwa nke a ga-eme ka ọ ghọọ paradaịs? (Zef. 2:2, 3)’
[Leekwa “Ihe Ndị Na-eme Ugbu A” dị ná ndepụta a nke okwu mmeghe ndị a tụrụ aro ha.]
MPỤ/NCHEBE
● ‘Ndewo. Anyị na ndị mmadụ na-akparịta banyere okwu nke nchebe onwe onye. E nwere ọtụtụ mpụ gburugburu anyị, ọ na-emetụtakwa ndụ anyị. Ì chere na oge ga-abịa mgbe ndị mmadụ dị ka mụ na gị ga-enwe ike ịg̣agharị n’okporo ámá n’abalị ma nwee mmetụta nke ịnọ ná nchebe? (Ma ọ bụ, Ọ̀ dị gị ka e nwere onye nwere ezi ihe ngwọta nye nsogbu ahụ?) . . . (Ilu 15:3; Abụ Ọma 37:10, 11)’
[● ‘Aha m bụ ․․․․․. Ebi m na gburugburu ebe a. Mgbe m na-abịa n’ụtụtụ a, achọpụtara m na onye ọ bụla na-ekwu banyere (hota otu mpụ mere na gburugburu ebe ahụ n’oge na-adịbeghị anya ma ọ bụ ihe ọzọ na-ewetara ndị bi ebe ahụ nchegbu). Gịnị ka i chere banyere ya? . . . Ọ̀ dị ihe i chere ga-enye aka ime ka ndụ anyị nọrọkwuo ná nchebe? . . . (Ilu 1:33; 3:5, 6)’]
NDỤ/OBI ỤTỌ
● ‘Anyị na-eleta ndị agbata obi anyị iji chọta ndị na-enwe nchegbu miri emi banyere nzube nke ndụ. Ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ụmụ mmadụ na-enwetụ obi ụtọ. Ma ha na-echekwa ọtụtụ nsogbu ihu. Ka anyị na-emewanye okenye, anyị na-achọpụta na ndụ dị nnọọ mkpụmkpụ. Ọ̀ gwụla nke a ka e bu n’uche maka ndụ? Olee otú nke ahụ dị gị? . . . (Kwuo okwu banyere nzube mbụ nke Chineke dị ka e gosipụtara ya n’Iden; mgbe ahụ gụọ Jọn 17:3 na Mkpughe 21:3, 4.)’
● ‘Taa anyị na-ajụ ndị agbata obi anyị ihe ha na-eche mgbe ha gụrụ n’ime Bible ha okwu ahụ bụ “ndụ ebighị ebi.” Ọ bụ ihe na-akpasu mmasị pụrụ iche n’ihi na okwu ahụ pụtara n’ime Bible ihe dị ka 40 ugboro. Gịnị ka ndụ dị otú ahụ pụrụ ịpụtara anyị? . . . Olee otú anyị pụrụ isi nweta ya? (Jọn 17:3; Mkpu. 21:4)’
● ‘Anyị na ndị nwere nchegbu n’ezie banyere ụdị ndụ a na-adị taa na-ekwurịta okwu. Ihe ka n’ọnụ ọgụgụ n’ime anyị nwere obi ụtọ ịdị ndụ, ma ọtụtụ na-ajụ sị, Ọ̀ pụrụ ikwe omume inwe ndụ obi ụtọ n’ezie? Gịnị bụ echiche gị banyere nke ahụ? . . . Gịnị ka ị ga-asị bụ ihe mgbochi kasịnụ nye obi ụtọ taa? . . . (Abụ Ọma 1:1, 2; akụkụ akwụkwọ nsọ ndị ọzọ ndị kwekọrọ ná nchegbu nke onye nwe ụlọ)’
ỌDỊNIHU/ỊNỌ NÁ NTỤKWASỊ OBI
● ‘Ị̀ bọọla chi. Olee otú i mere? . . . Anyị na-agbalị isoro ndị agbata obi anyị kerịta otu echiche dị mma banyere ọdịnihu. Ọ̀ bụ otú ahụ ka ị na-anwa isi lee ndụ anya? . . . Ị̀ chọpụtara na ọnọdụ ụfọdụ na-eme ka nke a sie ike omume? . . . Achọpụtawo m na Bible na-enye nnọọ aka n’akụkụ nke a. Ọ na-akọwa n’ụzọ ezi echiche dị na ya ọnọdụ ndị e nwere n’ụbọchị anyị, ma ọ na-akọwakwa ihe ha pụtara ma na-agwa anyị ihe ga-esi na ha pụta. (Luk 21:28, 31)’
● ‘Ndewo. Aha m bụ ․․․․․. Gịnị bụ nke gị? . . . M na-agba ndị na-eto eto dị ka gị ume ka ha tụlee ọmarịcha ọdịnihu nke Bible na-eche n’ihu anyị. (Gụọ akụkụ akwụkwọ nsọ, dị ka Mkpughe 21:3, 4.) Nke ahụ ọ̀ na-ada ụda ọma ná ntị gị?’
ỌMỤMỤ BIBLE EBE OBIBI
● ‘M na-akpọtụrụ gị iji chee n’ihu gị usoro ọmụmụ Bible ebe obibi na-adịghị efu ego. Ọ bụrụ na ị ga-ekwe, m ga-achọ iwere nanị minit ole na ole gosipụta ụzọ ndị mmadụ n’ime 200 mba si atụle Bible n’ụlọ dị ka ìgwè ezinụlọ dị iche iche. Anyị pụrụ iji nke ọ bụla n’ime isiokwu ndị a mee ihe dị ka ihe ndabere nke nkwurịta okwu. (Gosi ndepụta nke ihe ndị dị n’ime akwụkwọ ọmụmụ.) Olee nke masịrị gị karịsịa?’
● ‘Anyị na-egosi ndị agbata obi anyị ihe enyemaka nke a e ji amụ Bible. (Gosi ya.) Ị̀ hụtụwo ya? . . . Ọ bụrụ na i nwere nanị minit ole na ole, m ga-achọ igosipụta ụzọ a pụrụ isi jiri ya na Bible nke gị mee ihe.’
ỌRỤ/ỤLỌ
● ‘Anyị anọwo na-agwa ndị agbata obi gị okwu banyere ihe a pụrụ ime iji jide n’aka na a ga-enwe ọrụ na ụlọ maka onye ọ bụla. Ì kwenyere na ezi uche dị n’ịtụ anya na gọọmenti dị iche iche nke mmadụ ga-emezu nke a? . . . Ma e nwere onye nke maara ụzọ isi gwọta nsogbu ndị a; ọ bụ Onye Okike nke ihe a kpọrọ mmadụ. (Aịsa. 65:21-23)’
[● ‘Anyị so ndị agbata obi anyị na-ekerịta otu echiche banyere ezigbo gọọmenti. Ihe ka n’ụmụ mmadụ ga-achọ inwe ụdị gọọmenti nke na-enweghị mmerụ, nke na-enye ọrụ na ezigbo ụlọ maka onye ọ bụla. Olee ụdị gọọmenti i chere pụrụ ime ihe ahụ dum? . . . (Abụ Ọma 97:1, 2; Aịsa. 65:21-23)’]
MGBE ỌTỤTỤ NDỊ NA-ASỊ: ‘ENWERE M OKPUKPE NKE M’
● ‘Ị̀ bọọla chi. Anyị na-eleta ezinụlọ nile bi na gburugburu ebe a (ma ọ bụ, n’ógbè a), anyị chọpụtakwara na ọtụtụ n’ime ha nwere okpukpe nke ha. Ihe ịrụ ụka adịghịkwa ya na i nwere. . . . Ma, n’agbanyeghị okpukpe anyị, ọtụtụ n’ime otu nsogbu ndị ahụ na-emetụta anyị—oké ọnụ ahịa nke ihe ndị e ji ebi ndụ, mpụ, ọrịa—nke ahụ ọ́ bụghị eziokwu? . . . Ì chere na e nwere ezi ihe ngwọta nye ihe ndị a? . . . (2 Pita 3:13; na ndị ọzọ)’
MGBE ỌTỤTỤ NDỊ NA-ASỊ: ‘EJI M ỌRỤ N’AKA’
● ‘Ndewo. Anyị ji ozi dị mkpa na-eleta onye ọ bụla bi n’ógbè a. Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ị bụ onye ji ọrụ n’aka, ya mere m ga-ebi okwu m nkenke.’
● ‘Ekele oo. Aha m bụ ․․․․․. Nzube m ji bịa bụ isoro gị tụlee ngọzi dị iche iche nke Alaeze Chineke na ụzọ anyị pụrụ isi kere òkè na ha. Ma m pụrụ ịhụ na i ji ọrụ n’aka (ma ọ bụ, na-achọ ịpụ apụ). M̀ pụrụ ịhapụrụ gị otu echiche dị mkpirikpi?’
N’ÓKÈALA A NA-ARỤKARỊ ỌRỤ NA YA
● ‘Obi dị m ụtọ ịhụ gị n’ụlọ. Anyị na-eme nleta anyị na-eme kwa izu n’ógbè a, anyị nwekwara ihe ọzọ anyị na gị ga-ekerịta banyere ihe ndị dị ebube Alaeze Chineke ga-emere ihe a kpọrọ mmadụ.’
● ‘Ndewo. Ọ dị mma ịhụkwa gị ọzọ. . . . Ahụ ọ̀ dịkwa mmadụ nile nọ n’ezinụlọ gị? . . . M kwụsịtụrụ ebe a iso gị kerịta otu echiche banyere . . . ’
[● ‘Ị̀ bọọla chi. Olee otú i mere? . . . Anọwo m na-achọ ohere ọzọ iji soro gị kwurịta okwu. (Mgbe ahụ kwuo otu isiokwu kpọmkwem ị chọrọ ịtụle.)’]