Ụzọ Ị Pụrụ Isi Zaghachi Ndị Pụrụ Ịbụ Ndị Nkwụsị Nkwurịta Okwu
Nkọwa: Olileanya ndụ nke ụmụ mmadụ dabeere n’àgwà ha n’ebe Jehova Chineke na Alaeze ya nke dị n’aka Kraịst Jisọs dị. Ozi nke Alaeze Chineke na-akpali akpali, ọ na-ezokwa aka n’olileanya nanị ya kwesịrị ndabere maka ihe a kpọrọ mmadụ. Ọ bụ ozi nke na-agbanwe ndụ. Anyị chọrọ ka onye ọ bụla nụ ya. Anyị matara na nanị ọnụ ọgụgụ dị nta ga-eji obi ekele nakwere ya, ma anyị matakwara na ma ọ dịghị ihe ọzọ ọ dị ndị mmadụ mkpa ịnụ ya ma ọ bụrụ na ha ga-eme nhọrọ site n’ihe ọmụma. Ma ọ bụghị mmadụ nile dị njikere ịṅa ntị, anyị adịghịkwa anwa ịmanye ha amanye. Ma site n’ụzọ akọ ọ na-ekwekarị omume ịgbanwe ndị pụrụ ịbụ ndị nkwụsị nkwurịta okwu ka ha ghọọ ohere dị iche iche maka inwekwu nkwurịta okwu. Ndị a bụ ụfọdụ ihe atụ nke ihe Ndịàmà ụfọdụ nweworo ahụmahụ jiworo mee ihe ná mgbalị ha ịchọta ndị kwesịrị ekwesị. (Mat. 10:11) Buru isi ihe ahụ n’uche, tinye ya n’okwu ndị nke gị ma kwupụta ya n’ụzọ na-egosipụta ezi mmasị gị n’onye ị na-agwa okwu. Ka ị na-eme nke ahụ, ị pụrụ inwe obi ike na ndị obi ha ziri ezi ga-aṅa ntị ma jiri obi ekele zaghachi n’ihe Jehova na-eme iji dọta ha ná ndokwa ịhụnanya ndị o mere maka ndụ.—Jọn 6:44; Ọrụ 16:14.
‘ENWEGHỊ M MMASỊ’
● ‘Biko ka m jụọ, Ihe ị na-ekwu ọ̀ bụ na i nweghị mmasị na Bible, ka ọ̀ bụ okpukpe n’ozuzu ya bụ ihe na-adịghị amasị gị? M na-ajụ nke ahụ n’ihi na anyị ezutewo ọtụtụ ndị jibu okpukpe kpọrọ ihe ma ha adịkwaghị aga chọọchị n’ihi na ha na-ahụ oké ihu abụọ n’ime ọtụtụ chọọchị (ma ọ bụ, ha na-eche na okpukpe bụ nanị azụmahịa ọzọ nke e ji enweta ego; ma ọ bụ, ha adịghị akwado aka okpukpe na-etinye na ndọrọ ndọrọ ọchịchị; na ihe ndị ọzọ). Bible adịghị akwado ihe omume ndị dị otú ahụ, ọ na-enyekwa ihe ndabere e nwere nanị ya nke anyị pụrụ isi na ya jiri nchekwube lepụ anya n’ọdịnihu.’
● ‘Ọ bụrụ na ị na-ekwu na i nweghị mmasị n’okpukpe ọzọ, m pụrụ ịghọta nke ahụ. Ma o yikarịrị ka i nwere mmasị n’ụdị ọdịnihu anyị pụrụ ịtụ anya ya n’ihi ihe agha meworo ndụ anyị (ma ọ bụ, n’ụzọ anyị pụrụ isi chebe ụmụ anyị megide iji ọgwụ eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi; ma ọ bụ, n’ihe a pụrụ ime banyere mpụ ka anyị ghara ịdị na-atụ egwu ịgagharị n’okporo ámá; na ihe ndị ọzọ). Ị̀ pụrụ ịhụ olileanya ọ bụla maka ezi ihe ngwọta?’
● ‘Nke ahụ ọ̀ bụ n’ihi na i nweworị okpukpe? . . . Gwa m, Ì chere na ọ dị oge anyị ga-ahụ ka mmadụ nile nọ n’otu okpukpe? . . . Gịnị ka o yiri ka ọ bụ ya na-anọchi ụzọ? . . . Ka o wee bụrụ nke bara uru, ụdị ntọala dị aṅaa ga-adị mkpa?’
● ‘M pụrụ ịghọta nke ahụ. Afọ ole na ole gara aga, enwere m otu ụdị mmetụta ahụ. Ma m gụrụ otu ihe n’ime Bible nke nyeere m aka ile okwu anya n’ụzọ dị iche. (Gosi onye ahụ ihe ọ bụ.)’
● ‘Ọ̀ ga-amasị gị ma ọ bụrụ na m nwee ike igosi gị site n’ime Bible ụzọ ị pụrụ isi hụ ndị ị hụrụ n’anya nwụrụ anwụ ọzọ (ma ọ bụ, ihe ezi nzube nke ndụ bụ; ma ọ bụ, ụzọ ọ pụrụ isi nyere anyị aka ịhụ na ezinụlọ anyị dị n’otu; na ihe ndị ọzọ)?’
● ‘Ọ bụrụ na ihe ị na-ekwu bụ na i nweghị mmasị ịzụrụ ihe ọ bụla, ka m mee ka obi ruo gị ala. Anọghị m n’ọrụ azụmahịa. Ma ị̀ ga-enwe mmasị n’ohere nke ibi ndụ n’ime paradaịs n’elu ụwa, nke ọrịa na mpụ na-adịghị na ya, na-enwe ndị agbata obi ndị hụrụ gị n’anya n’ezie?’
[● ‘Ọ̀ bụ otú a ka i si azaghachikarị mgbe Ndịàmà Jehova bịara? . . . Ọ̀ dịwo mgbe i chere echiche n’ezie ihe mere anyị ji nọgide na-abịa ma ọ bụ ihe anyị nwere ikwu? . . . Ná mkpirikpi, ihe mere m ji bịa ịhụ gị bụ na m maara otu ihe nke i kwesịkwara ịmara. Gịnị ma i gee ntị nanị otu ugbo a?’]
‘ENWEGHỊ M MMASỊ N’OKPUKPE’
● ‘M pụrụ ịghọta mmetụta gị. N’ikwu eziokwu, chọọchị dị iche iche adịghị eme ụwa a ịbụ ebe dị ná nchebe karị ibi ndụ na ya, hà na-eme? . . . Ma ì kwere na Chineke?’
● ‘E nwere ọtụtụ ndị nwere echiche gị. Okpukpe enyebeghịrị ha aka n’ezie. Nke ahụ bụ otu ihe mere anyị ji na-abịa—n’ihi na chọọchị dị iche iche agwabeghị ndị mmadụ eziokwu banyere Chineke na nzube ya dị ebube maka ihe a kpọrọ mmadụ.’
● ‘Ma eji m n’aka na i nwere mmasị n’ọdịnihu nke gị. Ị̀ maara na Bible buru amụma ọnọdụ ndị dị kpọmkwem n’ụwa taa? . . . Ọ na-egosikwa ihe ga-esi na ya pụta.’
● ‘Ọ̀ dịwo gị otú a mgbe nile? . . . Olee otú i si ele ọdịnihu anya?’
‘ENWEGHỊ M MMASỊ NÁ NDỊÀMÀ JEHOVA’
● ‘Ọtụtụ ndị na-agwa anyị nke ahụ. Ọ̀ dịwo mgbe i chere banyere ihe mere ndị dị ka m ji na-enyefe onwe ha ịkpọtụrụ ndị mmadụ ọ bụ ezie na anyị maara na ihe ka n’ọnụ ọgụgụ nke ndị nwe ụlọ nwere ike ha agaghị anabata anyị? (Kọwapụta isi ihe dị n’Ezikiel 9:1-11, na-akọwa na, ná ndabere nke mmeghachi omume ụmụ mmadụ nye ozi Alaeze ahụ, a ‘na-aka’ onye ọ bụla “akara” maka nchebe gabiga oké mkpagbu ahụ ma ọ bụ maka mbibi n’aka Chineke.)’
● ‘M pụrụ ịghọta nke ahụ, n’ihi na ọ na-adịbu m otú ahụ. Ma, m kpebiri ige otu n’ime ha ntị, nanị ka a ghara ịsịkwa. M chọpụtakwara na a gwabeghị m eziokwu banyere ha. (Hota otu ebubo ụgha a na-anụkarị, mgbe ahụ kọwaakwa ihe anyị kwere.)’
● ‘N’oge na-adịbeghị anya m gwara otu Onyeàmà bịara n’ụlọ m otu ihe ahụ. Ma tupu ọ hapụ ewelitere m otu ajụjụ doro m anya na ọ pụghị ịzali ya. Ị̀ ga-achọ ịmara ihe ọ bụ? . . . (Dị ka ihe atụ: Olee ebe Ken nwetara nwunye ya?)’ (Maka ndị nwere ahụmahụ dị otú ahụ n’ezie iji ya mee ihe.)
● ‘Ọ bụrụ na ị bụ onye ji okpukpe kpọrọ ihe, m pụrụ ịghọta nke ahụ. Ihe ịrụ ụka adịghị ya na okpukpe gị dị gị n’obi nke ukwuu. Ma echere m na ị ga-ekwere na anyị abụọ nwere mmasị na (kwuo otu isiokwu kwesịrị ekwesị).’
[● ‘Mgbe ahụ ihe ịrụ ụka adịghị ya na i nwere okpukpe nke gị. Biko ì nwere ike ịgwa m okpukpe nke ọ bụ? . . . Ọ na-amasị anyị isoro ndị nọ n’okpukpe gị kwurịta okwu. Olee echiche gị banyere (kwuo isiokwu gị maka nkwurịta okwu)?’]
● ‘Ee, m ghọtara. Ma ihe mere anyị ji bịa bụ na anyị bụ otu ezinụlọ nke ga-achọ ịhụ ka ndị mmadụ na-ebikọ ọnụ n’udo. Akụkọ a na-anụ kwa abalị nke jupụtara n’akụkọ banyere ịlụ ọgụ na nhụjuanya agwụwo anyị ike. Eche m na ọ dịkwa gị otú ahụ. . . . Ma gịnị pụrụ iweta mgbanwe dị mkpa? . . . Anyị achọtawo agbamume ná nkwa dị iche iche nke Bible.’
[● ‘Ọ masịrị m na ị gwara m ihe bụ mmetụta gị. Biko ị̀ pụrụ ịgwa m ihe metụtara anyị nke ị na-enweghị mmasị na ya? Ọ̀ bụ ihe anyị na-egosi gị site na Bible, ka ọ̀ bụ anyị ịbịa leta gị?’]
‘ENWERE M OKPUKPE NKE M’
● ‘Biko gwa m, Okpukpe gị ọ̀ na-akụzi na oge ga-abịa mgbe ụmụ mmadụ hụrụ ezi ihe n’anya ga-ebi n’elu ụwa ruo mgbe ebighị ebi? . . . Nke ahụ bụ echiche na-adọrọ mmasị, ọ́ bụghị ya? . . . Ọ dị kpọmkwem n’ebe a n’ime Bible. (Abụ Ọma 37:29; Mat. 5:5; Mkpu. 21:4)’
● ‘Ekwenyere m na n’okwu a onye ọ bụla aghaghị ime mkpebi nke ya. Ma ị̀ matara na Chineke n’onwe ya na-achọ otu ụdị ndị mmadụ kpọmkwem ka ha bụrụ ezi ndị na-efe ya ofufe? Rịba ama n’ebe a na Jọn 4:23, 24. Gịnị ka ikpere Chineke “n’eziokwu” ga-apụta? . . . Gịnị ka Chineke nyeworo anyị iji nyere anyị aka ịmata ihe bụ eziokwu na ihe na-abụghị? . . . (Jọn 17:17) Rịbakwa ama ụzọ o si dị anyị mkpa n’onwe anyị. (Jọn 17:3)’
[● ‘Ị̀ bụwo onye ji okpukpe kpọrọ ihe ná ndụ gị nile? . . . Ì chere na ihe a kpọrọ mmadụ nwere mgbe a ga-ejikọ ha ọnụ n’otu okpukpe? . . . Echewo m echiche nke ukwuu banyere nke ahụ n’ihi ihe e dekọrọ n’ebe a ná Mkpughe 5:13. . . . Gịnị ka a chọrọ ka anyị wee kwekọọ n’onyinyo nke a?’]
● ‘Enwere m olileanya ịchọta onye dị ka gị bụ́ onye nwere mmasị n’ihe ime mmụọ. Ọtụtụ ndị taa enweghị. Ka m jụọdị gị otú nkwa Bible nke na Chineke ga-ekpochapụ ihe ọjọọ nile ma mee ka ụwa a bụrụ ebe nanị ndị hụrụ ezi omume n’anya ga-ebi dị gị n’obi? Nke ahụ ọ̀ na-adọrọ mmasị gị?’
● ‘Ị̀ na-arụsi ọrụ ike n’ihe omume nile nke chọọchị? . . . Chọọchị ọ̀ na-eju eju nke ọma n’ụbọchị ndị a maka ịka ụka? . . . Ị̀ na-ahụ na ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ndị nọ na ya na-egosipụta mmasị sitere n’obi n’ezie n’itinye Okwu Chineke n’ọrụ ná ndụ ha na-adị kwa ụbọchị? (Ma ọ bụ, Ị̀ na-ahụ na e nwere ịdị n’otu n’echiche n’etiti ndị nọ na ya banyere ihe ngwọta nye nsogbu ndị na-eche ụwa ihu?) Anyị chọpụtara na nkụzi Bible ebe obibi nke onwe onye na-enye aka.’
● ‘Ọ ghaghị ịbụ na okpukpe gị juru gị afọ. Ma ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ụmụ mmadụ enweghị afọ ojuju n’ọnọdụ ụwa. Ma eleghị anya nke ahụ bụ eziokwu n’ebe ị nọkwa; ọ̀ bụ? . . . Gịnị ka ha dum na-eduga na ya?’
● ‘Ị̀ bụ onye na-enwe mmasị ịgụ Bible? . . . Ị̀ na-ewepụta oge ịgụchi ya anya?’
● ‘Ọ masịrị m na ị gwara m nke ahụ. Eji m n’aka na ị ga-ekwenye na, n’agbanyeghị ihe bụ nzụlite okpukpe anyị, anyị nile nwere mmasị nke ukwuu n’udo ụwa (ma ọ bụ, ụzọ dị iche iche isi chebe ụmụ anyị megide mmetụta ọjọọ; ma ọ bụ, inwe ógbè ebe ndị mmadụ hụrụ ibe ha n’anya n’ezie; ma ọ bụ, iso ndị ọzọ nwee mmekọrịta ndị dị mma, nke ahụ pụkwara ịghọ ihe ịma aka mgbe onye ọ bụla nọ n’okpuru nrụgide).’
● ‘Obi dị m ụtọ ịmara na i nwere mmasị n’okpukpe. Ọtụtụ ndị taa ejighị okpukpe kpọrọ ihe. Ọbụna na ụfọdụ na-eche na ọ dịghị Chineke dịnụ. Ma, dị ka ihe a kụziwooro gị si dị, ụdị onye dị aṅaa ka i chere na Chineke bụ? . . . Rịba ama na Bible na-enye anyị aha aka ya. (Ọpụ. 6:3; Abụ Ọma 83:18)’
[● ‘Mgbe Jisọs zipụrụ ndị naeso ụzọ ya ime nkwusa, ọ gwara ha ka ha gaa n’akụkụ ọ bụla nke ụwa, ya mere ha ga-ezute ọtụtụ ndị nwere okpukpe ndị dị iche site na nke ha. (Ọrụ 1:8) Ma ọ matara na ndị agụụ ezi omume na-agụ, ndị akpịrị ya na-akpọkwa nkụ́, ga-aṅa ntị. Gịnị kpọmkwem bụ ozi ahụ nke o kwuru na a ga-ezi n’ụbọchị anyị? (Mat. 24:14) Gịnị ka Alaeze ahụ pụtara nye anyị?’]
‘ANYỊ AGHỌWORỊ NDỊ KRAỊST N’EBE A’
● ‘Obi dị m ụtọ ịmata nke ahụ. Mgbe ahụ ihe ịrụ ụka adịghị ya na unu maara na Jisọs n’onwe ya rụrụ ọrụ dị ka nke a, na-akpọtụrụ ndị mmadụ n’ebe obibi ha, o nyekwara ndị na-eso ụzọ ya ọrụ imekwa ya. Ị̀ maara isiokwu nke nkwusa ha mere nke ọma? . . . Ọ bụ ya ka anyị bịara ikwu banyere ya taa. (Luk 8:1; Dan. 2:44)’
● ‘Mgbe ahụ eji m n’aka na unu ga-aghọta ịdị ike nke ihe Jisọs kwuru n’ebe a n’Ozizi Elu Ugwu ahụ. Ọ na-ekwu ihe doro anya ma bụrụkwa nke ịhụnanya mgbe ọ sịrị . . . (Mat. 7:21-23) N’ihi ya, ajụjụ ọ dị anyị mkpa ịjụ onwe anyị bụ, Ruo ókè hà aṅaa ka m maara uche Nna anyị nke eluigwe nke ọma? (Jọn 17:3)’
‘EJI M ỌRỤ N’AKA’
● ‘Ebe ọ dị otú ahụ m ga-ebi nnọọ okwu m nkenke. M bịara iji soro gị kerịta nanị otu echiche dị mma. (Kwuo isi ihe dị n’isiokwu gị maka nkwurịta okwu n’ihe dị ka ahịrị okwu abụọ.)’
● ‘Ọ dị mma. Ọ ga-amasị m ịbịa n’oge ọzọ, mgbe ọ ga-akara gị mma. Ma tupu m na-apụ, m ga-achọ ịgụ nanị otu akụkụ akwụkwọ nsọ nke na-enye anyị n’ezie otu ihe dị mkpa ichere echiche.’
● ‘M ghọtara. Dị ka onye bụ nne (ma ọ bụ, nwoke na-arụ ọrụ; ma ọ bụ, nwata akwụkwọ) m nwekwara nhazi jupụtara n’ihe omume. Ya mere m ga-ebi okwu m nkenke. Anyị nile na-eche otu ọnọdụ siri ike ihu. Bible na-egosi na anyị nọ nnọọ nso n’oge mgbe Chineke ga-ebibi ajọ usoro ihe dị ugbu a. Ma a ga-enwe ndị lanarịrị. Ajụjụ dị ya bụ, Gịnị ka mụ na gị na-aghaghị ime iji soro n’ime ha? Bible na-aza ajụjụ ahụ. (Zef. 2:2, 3)’
● ‘Leenụ, ọ bụ ya kpọmkwem mere m ji bịa. Anyị nile ji ọrụ n’aka—jiri ọrụ n’aka nke ukwuu nke na mgbe ụfọdụ a na-eleghara ihe ndị dị mkpa n’ezie ná ndụ anya, ọ́ bụghị otú ahụ? . . . M ga-ebi nnọọ okwu m nkenke, ma eji m n’aka na ị ga-enwe mmasị na nanị otu akụkụ akwụkwọ nsọ nke a. (Luk 17:26, 27) Ọ dịghị onye ọ bụla n’ime anyị ga-achọ inweta onwe ya n’ọnọdụ ahụ, ya mere ọ dị anyị mkpa iwepụta oge ná ndụ anyị nke jupụtara n’ihe omume iji tụlee ihe Bible nwere ikwu. (Nyefee akwụkwọ.)’
● ‘Ọ̀ ga-akara gị mma ma m lọghachite azụ n’ihe dị ka n’ọkara otu hour, mgbe anyị letasịworo ụfọdụ ndị agbata obi gị?’
[● ‘N’ihi ya m gaghị egbu gị oge. Ma eleghị anya m pụrụ ịbịa ụbọchị ọzọ. Ma tupu m hapụ, m ga-achọ inye gị ohere inweta akwụkwọ a pụrụ iche. (Gosi akwụkwọ e ji eje ozi n’ọnwa.) Akwụkwọ a nwere usoro ọmụmụ ihe nke ga-eme ka ị mara azịza ndị Bible n’onwe ya na-enye maka ajụjụ ndị dị ka (hota nanị otu ma ọ bụ abụọ).’]
● ‘Ewela iwe na m bịakwutere gị n’oge na-adịghịrị gị mma. Dị ka ị maara, abụ m otu n’ime Ndịàmà Jehova. Achọburu m iso gị kerịta otu echiche dị mkpa site na Bible. Ma ebe ọ bụ na i nweghị oge ige ntị ugbu a, m ga-achọ inye gị traktị nke a, bụ́ nke tụlere (kwuo isiokwu ya). Ọ gaghị ewe oge ịgụ ya, ma ọ ga-amasị gị nke ukwuu.’
[● ‘Nke ahụ esighịrị m ike ịghọta. O yiri nnọọ ka ọ bụ na e nweghị oge zuru ezu ime ihe nile. Ma ọ̀ dịwo mgbe i chere echiche otú ndụ pụrụ isi dị iche ma ọ bụrụ na ị pụrụ ịdị ndụ ebighị ebi? Amaara m na nke ahụ pụrụ ịda gị ka ihe ọhụrụ ná ntị. Ma ka m gosi gị nanị otu amaokwu Bible nke na-akọwa otú ihe dị otú ahụ ga-esi kwe omume. (Jọn 17:3) Ya mere, ihe dị anyị mkpa ime ugbu a bụ ịnara ihe ọmụma a nke Chineke na Ọkpara ya. Ọ bụ ya ka anyị ji na-ahapụrụ gị akwụkwọ a.’]
‘GỊNỊ MERE UNU JI ABỊA ỌTỤTỤ UGBO?’
● ‘N’ihi na anyị kwenyere na anyị na-ebi na mgbe ikpeazụ nke Bible zoro aka na ya. Anyị chere na ọ dị mkpa ka anyị nile chee echiche banyere ihe ga-esi n’ọnọdụ ndị dị ugbu a pụta. (Hota otu ihe ma ọ bụ abụọ mere ọhụrụ ma ọ bụ ọnọdụ ndị e nwere ugbu a.) Ajụjụ bụ, Gịnị ka ọ dị anyị mkpa ime ma ọ bụrụ na anyị ga-alanarị ọgwụgwụ nke usoro ihe dị ugbu a?’
● ‘N’ihi na anyị hụrụ Chineke na ndị agbata obi anyị n’anya. Nke ahụ bụ ihe anyị nile kwesịrị ime, ọ́ bụghị ya?’
‘AMATAWORỊ M ỌRỤ UNU NKE ỌMA’
● ‘Obi dị m ụtọ nke ukwuu ịnụ nke ahụ. Ì nwere onye ikwu dị gị nso ma ọ bụ enyi nke bụ Onyeàmà? . . . Ka m jụọ gị: Ì kwenyere ihe anyị na-akụzi site na Bible, ya bụ, na anyị na-ebi na “mgbe ikpeazụ,” na n’isi nso Chineke gaje ibibi ndị na-eme ihe ọjọọ, nakwa na ụwa a ga-aghọ paradaịs ebe ndị mmadụ pụrụ ibi ndụ ebighị ebi n’ahụ ike zuru okè n’etiti ndị agbata obi hụrụ ibe ha n’anya n’ezie?’
‘ANYỊ ENWEGHỊ EGO’
● ‘Anyị adịghị arịọ ego. Ma anyị na-enyefe ndị mmadụ ohere maka usoro ọmụmụ Bible ebe obibi n’efu. Otu n’ime isiokwu ndị ọ na-atụle bụ (jiri otu isiokwu sitere n’akwụkwọ e bipụtara ọhụrụ mee ihe). Ka m jiri minit ole na ole gosi gị ụzọ e si eme ya? Ọ gaghị efu gị otu peni.’
● ‘Anyị nwere mmasị ná ndị mmadụ, ọ bụghị n’ego ha. (Gaa n’ihu ná nkwurịta okwu ahụ. Gosi ha otu akwụkwọ ma kọwaa ụzọ ọ pụrụ isi baara ha uru. Ọ bụrụ na ha egosi ezi mmasị ma kwee nkwa ịgụ ya, hapụrụ ha ya. Ọ bụrụ na o kwesịrị ekwesị, kọwaa ụzọ e si na-enweta ego maka ọrụ nkwusa anyị na-arụ gburugburu ụwa.)’
MGBE MMADỤ SỊRỊ, ‘ABỤ M ONYE BUDDHA’
● Ekwubila na nkwenkwe onye ahụ bụ otu ihe ahụ dị ka nke ndị Buddha ndị ọzọ nile. Okpukpe Buddha nke Japan dị nnọọ iche n’okpukpe Buddha nke Ebe Ndịda Ọwụwa Anyanwụ Esia. Ndị mmadụ n’otu n’otu dịgasịkwa iche n’ụzọ ha si ele ihe anya. Otú ọ dị, n’ozuzu ha, isi ihe ndị na-esonụ pụrụ inye aka: (1) Okpukpe Buddha ekwenyeghị na Chineke nke na-abụghị n’ime uche, bụ́ Onye Okike dịịrị onwe ya. Ma ọtụtụ ndị Buddha na-efe ihe oyiyi na ihe ọkpụkpụ dị iche iche nke Buddha. (2) Siddhartha Gautama, onye e nyere ùtú aha bụ́ Buddha, bụ onye a malitere ile anya dị ka onye ndị na-eso ụzọ ya ga-achọ ịdị ka ya, onye ha ga-eṅomi. Ọ gbara ume inweta ihe ọmụma site n’ịmụ banyere ihe a kpọrọ mmadụ n’ụzọ mmadụ si ele ihe anya, nakwa iwepụ ihe nile na-akpata nhụjuanya site n’ịchịkwa uche ka o wee wepụsịa ọchịchọ nile nke ụwa. Ọ kụziri na n’ụzọ dị otú a mmadụ pụrụ irute Nirvana, nwere onwe ya pụọ ná mmụgharị ọzọ nke ịlọ ụwa. (3) Ndị Buddha na-efe ndị nna nna ha, n’ihi na ha na-ele ndị a anya dị ka isi iyi nke ndụ ha.
Aro ụfọdụ maka nkwurịta okwu: (1) Mgbe gị na onye Buddha na-ekwu okwu, mesie ya ike na ị bụghị akụkụ nke Krisendọm. (2) Ndị Buddha na-akwanyere “akwụkwọ ndị dị nsọ” ùgwù, ha na-akwanyekarịkwara Bible ùgwù n’ihi otu ihe ahụ. Kama ilekwasị anya ná nkà ihe ọmụma ndị Buddha, zie ozi ọma doro anya nke Bible. Mee ka ha mara na Bible abụghị nkà ihe ọmụma nkịtị nke ụmụ mmadụ kama na ọ bụ Okwu nwere ikike nke Onye Okike nke ihe a kpọrọ mmadụ, bụ́ Jehova Chineke. Jiri obi ọma jụọ ma ị pụrụ igosi ha otu ihe na-adọrọ mmasị n’akwụkwọ a dị nsọ, bụ́ Bible. (3) Ọtụtụ ndị Buddha nwere oké mmasị n’udo na ndụ ezinụlọ ma chọọ ibi ndụ nke omume ọma. (4) Gosi na Bible na-ezo aka n’ọchịchị eluigwe nke ezi omume nke ga-achị elu ụwa dị ka ihe ngwọta bụ ezie nye nsogbu nile na-eche ihe a kpọrọ mmadụ ihu. Ọ na-akọwa ọdịnihu nke ụwa na olileanya dị ebube nke ịdị ndụ ebighị ebi n’ime paradaịs elu ụwa. (5) Ị pụrụ igosipụta na Bible na-akọwa mmalite nke ndụ, nzube nke ndụ, ọnọdụ ndị nwụrụ anwụ na olileanya mbilite n’ọnwụ, ihe mere ihe ọjọọ ji dịrị. Iche eziokwu ndị doro anya nke Okwu Chineke n’ihu mmadụ n’ụzọ obi ọma ga-akpali nzaghachi obi ekele n’obi ndị yiri atụrụ.
A kwadebere akwụkwọ nta bụ́ In Search of a Father karịsịa maka abamuru nke ndị Buddha nwere obi eziokwu.
MGBE MMADỤ SỊRỊ, ‘ABỤ M ONYE HINDU’
● I kwesịrị ịmara na nkà ihe ọmụma ndị Hindu dị mgbagwoju anya nke ukwuu, o kwekọghịkwa n’usoro echiche nkịtị. Ọ pụrụ ịbụ ihe enyemaka iburu isi ihe ndị na-esonụ n’uche: (1) Okpukpe Hindu na-akụzi na chi ahụ bụ́ Brahman nwere ụdị atọ—Brahma Onye Okike, Vishnu Onye Nchebe, na Siva Onye Mbibi. Ma ndị Hindu adịghị eche banyere chi nke bụ onye nke dịịrị onwe ya. (2) Ndị Hindu kwenyere na ihe nile e kere eke nwere mkpụrụ obi nke na-adịghị anwụ anwụ, na mkpụrụ obi na-enwe n’ezie usoro na-adịghị agwụ agwụ nke ịlọ ụwa, na ụdị dị iche iche a na-amụgharị ya na ya bụ nke a na-ekpebi site n’ihe ndị e mere (Karma), na ntọhapụ site “usoro agwụghi agwụ” nke a kwere omume nanị site n’ịbịanyụ ọchịchọ nile nke anụ ahụ, nakwa na ọ bụrụ na e mezuo nke a, mkpụrụ obi gaesonyere mmụọ nke eluigwe na ala. (3) N’ozuzu ha, ndị Hindu na-akwanyere okpukpe ndị ọzọ ùgwù. Ndị Hindu kwenyere na, n’agbanyeghị eziokwu ahụ bụ na ha na-akụzi ozizi ndị na-emegiderịta onwe ha, okpukpe nile na-eduga n’otu eziokwu ahụ.
Kama ịnwa ikwu okwu maka mgbagwoju anya nile nke nkà ihe ọmụma ndị Hindu, gosi eziokwu ndị na-eju afọ a na-achọta na Bible Nsọ. Ndokwa ịhụnanya ndị Jehova mere maka ndụ dịịrị ụdị mmadụ nile, eziokwu ndị doro anya ndị dị n’Okwu ya ga-erukwa n’obi ndị agụụ ezi omume na-agụ, ndị akpịrị ya na-akpọkwa nkụ. Nanị Bible na-enye olileanya gbara ezi mkpọrọgwụ maka ọdịnihu; nanị Bible na-enye azịza ndị na-eju afọ n’ezie maka ajụjụ ndị dị mkpa na-eche ihe a kpọrọ mmadụ ihu. Nye ha ohere ịnụ azịza ndị ahụ. Ọ bụ ihe na-akpali mmasị na isiokwu akwụkwọ ukwe ndị Hindu bụ́ Rig-Veda, 10. 121, bụ “Nye Chi A Na-amaghị Ama.” N’ọnọdụ ụfọdụ ị pụrụ ịhụ ya dị ka ihe kwesịrị ekwesị izo aka ná nke a. (Tụlee Ọrụ Ndị Ozi 17:22, 23.) N’ụzọ na-akpali mmasị, aha chi ndị Hindu bụ́ Vishnu, ma e tinyeghị mkpụrụ akwụkwọ mbụ ya, bụ Ish-nuh, nke pụtara “nwoke ahụ bụ́ Noa” n’asụsụ Chaldee. Gosipụta ihe Bible kwuru banyere ihe Iju Mmiri zuru ụwa ọnụ nke ụbọchị Noa pụtara.
Akwụkwọ nta ndị bụ́ The Path of Divine Truth Leading to Liberation na From Kurukshetra to Armageddon—And Your Survival nakwa broshuọ bụ́ Our Problems—Who Will Help Us Solve Them? bu ihe ọmụma ga-abara ndị Hindu nwere obi eziokwu uru nke ukwuu.
MGBE MMADỤ SỊRỊ, ‘ABỤ M ONYE JUU’
● Buru ụzọ chọpụta otú onye ahụ si ele onwe ya anya dị ka onye Juu. Ole na ole nwere mmasị n’okpukpe. Nye ọtụtụ, ịbụ onye Juu bụ nanị ihe e ji amata agbụrụ.
Ndị a bụ isi ihe ole na ole bara uru iburu ha n’uche: (1) Ndị Juu nwere mmasị n’okpukpe na-ewere ịkpọpụta aha Chineke dị ka ihe megidere iwu. (2) Ọtụtụ ndị Juu na-ewere “Bible” dị ka akwụkwọ ndị Kraịst, ma ọ bụrụ na i zoo aka ‘n’Akwụkwọ Nsọ Hibru,’ “Akwụkwọ Nsọ,” ma ọ bụ na “Torah,” nsogbu ahụ adịghị ebilite. (3) Ozizi e nyere n’aka idebe bụ akụkụ bụ isi nke okwukwe ha, ọtụtụ ndị Juu nwere mmasị n’okpukpe na-elekwa ya anya dị ka nke nwere otu ike ahụ Akwụkwọ Nsọ nwere. (4) Ha pụrụ ijikọ Jisọs Kraịst na mkpagbu obi ọjọọ ndị Juu nwetara n’aka Krisendọm n’aha Jisọs. (5) Ha na-ekwenye mgbe mgbe na Chineke chọrọ ka ndị Juu debe Ụbọchị Izu Ike, nke nkwenkwe ya gụnyere izere imetụ ego aka n’ụbọchị ahụ.
Iji nwee otu ihe e kwekọrịtara na ya, ị pụrụ ịsị: (1) ‘Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ị ga-ekwere na, n’agbanyeghị nzụlite anyị, anyị nile na-eche otu ụdị nsogbu ndị ahụ dị n’ụwa taa ihu. Ì kwenyere na a ga-enwe n’ezie ihe ngwọta na-adịgide adịgide nye oké nsogbu ndị na-eche ọgbọ a ihu? (Abụ Ọma 37:10, 11, 29; 146:3-5; Dan. 2:44)’ (2) ‘Anyị abụghị akụkụ nke Krisendọm, anyị ekwenyeghịkwa n’Atọ n’Ime Otu, kama anyị na-efe Chineke nke Abraham. Anyị nwere mmasị karịsịa n’ihe banyere eziokwu okpukpe. Biko ị̀ ga-agwatụ m ụzọ i si amata ihe bụ eziokwu, karịsịa n’ihi eziokwu ahụ bụ́ na e nwere ọtụtụ nnukwute ọdịiche nke nkwenkwe n’etiti ndị Juu? . . . (Deut. 4:2; Aịsa. 29:13, 14; Abụ Ọma 119:160)’ (3) ‘Anyị nwere oké mmasị ná nkwa Chineke nye Abraham nke na site ná mkpụrụ ya ka a ga-agọzi ndị nke mba nile. (Jen. 22:18)’
Ọ bụrụ na onye ahụ egosipụta enweghị okwukwe na Chineke, jụọ ya ma ò nwewo echiche ahụ ná ndụ ya nile. Mgbe ahụ ma eleghị anya tụlee ihe mere Chineke ji kwere ka ajọ omume na nhụjuanya dịrị. Ncheta nke oké mgbukpọ Nazi emewo ka ọtụtụ ndị Juu nwee nchegbu banyere nke a.
Ọ bụrụ na ị na-atụle ịdị mkpa nke iji aha Chineke eme ihe, buru ụzọ chọpụta echiche onye nke ọzọ ahụ banyere ya. Gosipụta na Ọpụpụ 20:7 machibidoro iburu aha Chineke eme ihe efu, ma ọ machibidoghị iji ya eme ihe n’ụzọ nkwanye ùgwù. Mgbe ahụ tụgharịa uche n’akụkụ akwụkwọ nsọ ndị dị ka Ọpụpụ 3:15 (ma ọ bụ Abụ Ọma 135:13); 1 Ndị Eze 8:41-43; Aịsaịa 12:4; Jeremaịa 10:25; Malakaị 3:16.
Mgbe ị na-atụle Mesaịa ahụ: (1) Buru ụzọ kwuo banyere ngọzi ndị dị n’ihu n’okpuru ịchịisi ya, kama onye ọ bụ. (2) Mgbe ahụ tụgharịa uche n’akụkụ akwụkwọ nsọ ndị na-ezo aka na Mesaịa bụ onye. (Jen. 22:17, 18; Zek. 9:9, 10; Dan. 7:13, 14) (3) Ọ pụrụ ịdị gị mkpa ịtụle ọbịbịa abụọ nke Mesaịa. (Gosi ọdịiche dị n’etiti Daniel 7:13, 14 na Daniel 9:24-26.) (4) Mgbe ị na-ezo aka n’ebe Jisọs nọ, mee otú ahụ n’ọnọdụ na-emesi ike ụzọ nzube Chineke si bụrụ nke na-aga n’ihu. Kwuo na mgbe Jisọs kụziri ihe, oge dị nso mgbe Chineke ga-ekwere ka e bibie ụlọ nsọ nke abụọ, nke ọ na-adịghịkwa mgbe a ga-ewughachi ya. Ma Jisọs mesiri ike mmezu nke Iwu ahụ na Ndị Amụma na ọdịnihu dị ebube nke ndị a ga-adọrọ ndị nwere okwukwe gaa na ya.