Ì Ga-achọ Ịmatakwu Banyere Bible?
N’ihi Gịnị Ka A Ga-eji Gụọ Bible?
BIBLE adịghị ka akwụkwọ ọ bụla ọzọ—o nwere ntụziaka ịhụnanya sitere n’aka Chineke. (1 Ndị Tesalọnaịka 2:13) Ọ bụrụ na i tinye ihe Bible na-akụzi n’ọrụ, ị ga-erite uru dị ukwuu. Ị ga-eme ka ịhụnanya i nwere n’ebe Chineke nọ bukwuo ibu ma bịaruo ya nso, bụ́ Onye Na-enye “ezi onyinye ọ bụla na ihe ọ bụla zuru okè nke e nyere enye.” (Jemes 1:17) Ị ga-abịa mata otú ị pụrụ isi gakwuru ya n’ekpere. N’oge ihe isi ike, ị pụrụ inweta enyemaka Chineke. Ọ bụrụ na i mee ka ndụ gị kwekọọ n’ụkpụrụ ndị e setịpụrụ n’ime Bible, Chineke ga-enye gị ndụ ebighị ebi.—Ndị Rom 6:23.
Eziokwu ndị na-enye nghọta dị n’ime Bible. A na-atọhapụ ndị nwetara ihe ọmụma Bible n’echiche na-ezighị ezi nke na-achịkwa ndụ ọtụtụ nde ụmụ mmadụ. Dị ka ihe atụ, ịmata ihe bụ́ eziokwu banyere ihe na-eme mgbe anyị nwụrụ na-eme ka anyị ghara ịdị na-atụ ụjọ na ndị nwụrụ anwụ pụrụ imerụ anyị ahụ ma ọ bụ na ndị ikwu na ndị enyi anyị nwụrụ anwụ na-ata ahụhụ. (Ezikiel 18:4) Ihe Bible na-akụzi banyere mbilite n’ọnwụ na-enye ndị ndị ha hụrụ n’anya nwụnahụrụ nkasi obi. (Jọn 11:25) Ịmata ihe bụ́ eziokwu banyere ndị ajọ mmụọ na-eme ka anyị mata ihe ize ndụ dị ná mgbaasị, ọ na-enyekwara anyị aka ịghọta ihe mere e ji nwee ọtụtụ nsogbu n’ụwa.
Ụkpụrụ omume Chineke nyere bụ́ ndị dị n’ime Bible na-egosi anyị otú anyị pụrụ isi dị ndụ n’ụzọ ga-abara anyị uru n’ụzọ nkịtị. Dị ka ihe atụ, “imeru ihe n’ókè” na-atụnye ụtụ n’ime ka e nwee ezi ahụ ike. (1 Timoti 3:2, NW) Site ‘n’ịsachapụ n’onwe anyị mmerụ nile nke ahụ na nke mmụọ,’ anyị na-ezere ibibi ahụ ike anyị. (2 Ndị Kọrint 7:1) Itinye ndụmọdụ Chineke nke dị n’ime Bible n’ọrụ na-emekwa ka e nwee obi ụtọ n’alụmdi na nwunye nakwa ùgwù onwe onye.—1 Ndị Kọrint 6:18.
Ọ bụrụ na ị na-etinye okwu Chineke n’ọrụ, ị ga na-enwe obi ụtọ karị. Ihe ọmụma sitere na Bible na-enyere anyị aka inwe udo nke uche na afọ ojuju ma na-eme ka anyị nwee olileanya. Ọ na-enyere anyị aka ịzụlite àgwà ndị dị mma dị ka ebere, ịhụnanya, ọṅụ, udo, obiọma na okwukwe. (Ndị Galetia 5:22, 23; Ndị Efesọs 4:24, 32) Àgwà ndị dị otú ahụ na-eme ka anyị bụrụ di ma ọ bụ nwunye, nna ma ọ bụ nne, nwa nwoke ma ọ bụ nwa nwanyị ka mma.
Ì chetụla echiche banyere ọdịnihu? Amụma ndị dị na Bible na-egosi na anyị na-ebi n’oge dị mkpa n’akụkọ ihe mere eme nke mmadụ. Ọ bụghị nanị na amụma ndị a na-akọwa ọnọdụ ụwa taa kama ha na-egosikwa na n’isi nso Chineke ga-agbanwe ụwa ịghọ paradaịs.—Mkpughe 21:3, 4.
Enyemaka Iji Ghọta Bible
Ma eleghị anya ị gbalịwo ịgụ Bible ma o siere gị ike ịghọta ya. Ọ pụrụ ịbụ na ị maghị ebe ị pụrụ ịchọta azịza nye ajụjụ gị n’ime Bible. Ọ bụrụ otú ahụ, ọ bụghị nanị gị ka ọ dị otú a. Anyị nile chọrọ enyemaka iji ghọta Okwu Chineke. Ndịàmà Jehova na-akụziri ọtụtụ nde mmadụ Bible n’efu n’ihe dị ka ala 235. Ha ga-enwekwa obi ụtọ inyere gị aka.
Ọ na-akasị mma iji nwayọọ nwayọọ na-amụ Bible malite n’ozizi ndị bụ́ isi. (Ndị Hibru 6:1) Ka ị na-amụ ihe na-aga n’ihu, ị ga-enwekwu ike iri “nri siri ike”—ya bụ, eziokwu ndị dị omimi karị. (Ndị Hibru 5:14) Bible bụ o kwuchaa o bie. Akwụkwọ ndị dabere na Bible dị ka broshuọ bụ́ Gịnị Ka Chineke Na-achọ n’Aka Anyị?, ga-enyere gị aka ịghọta ebe dị iche iche e zoro aka na ha n’Akwụkwọ Nsọ n’isiokwu dị iche iche.
Ị̀ Dị Njikere Iwepụta Oge Kwa Izu Iji Ghọta Bible?
Dị ka ọ na-adịkarị, a pụrụ ịhazi ọmụmụ Bible n’oge na n’ebe ga-akara gị mma. Ọtụtụ ndị na-amụ ihe n’ebe obibi ha nanị ha. Ụfọdụ ọbụna na-eji telifon na-amụ ihe. Usoro ọmụmụ ihe ahụ abụghị ọmụmụ ihe nke ọtụtụ ndị na-eso na ya kama, ndokwa onwe onye nke e mere n’ikwekọ n’otú ọnọdụ gị dị, gụnyere ókè i nweruru ihe ọmụma na ókè ị gụruru akwụkwọ. Ọ dịghị ule ọ bụla a na-ele, a gaghịkwa emenye gị ihere. A ga-aza ajụjụ ndị i nwere banyere Bible, ị ga-amụtakwa otú ị pụrụ isi bịaruo Chineke nso.
Ị gaghị akwụ ụgwọ maka ọmụmụ Bible dị otú ahụ. (Matiu 10:8) A na-eduziri ya ndị nọ n’okpukpe nile nakwa ndị na-enweghị okpukpe ha na-ekpe ma ha nwere mmasị n’ezie ime ka ihe ha maara banyere Okwu Chineke bukwuo ibu, n’efu.
Ònye pụrụ ikere òkè ná nkwurịta okwu ahụ? Ndị ezinụlọ gị nile. Ndị enyi gị ọ bụla i kpebiri ịkpọ pụkwara ikere òkè. Ma ọ bụkwanụ, ọ bụrụ na ị chọọ, a pụrụ iso nanị gị na-enwe nkwurịta okwu ahụ.
Ọtụtụ ndị na-ewepụta otu awa kwa izu iji mụọ Bible. Ọ bụrụ na ị pụrụ iwepụtakwu oge ma ọ bụ ọ bụrụ na ị pụrụ iwepụta nanị oge dị ntakịrị karị kwa izu, Ndịàmà ga-ewepụta onwe ha inyere gị aka.
Òkù Ịmụta Ihe
Anyị na-akpọ gị òkù ka ị kpọtụrụ Ndịàmà Jehova. Otu ụzọ ị pụrụ isi mee nke a bụ site n’ideta akwụkwọ n’adres dị n’okpuru. Mgbe ahụ a ga-eme ndokwa ka otu onye duziere gị ọmụmụ Bible ebe obibi n’efu.
□Ọ ga-amasị m inweta broshuọ bụ́ Gịnị Ka Chineke Na-achọ n’Aka Anyị?
□Biko kpọtụrụnụ m maka ọmụmụ Bible ebe obibi n’efu.
Ọ gwụlakwa ma e gosiri nsụgharị ọzọ, nhota Bible nile sitere na Bible Nsọ nke Union Version, na-asụpe okwu nile n’ụdị e ji eme ihe n’oge a. N’ebe e dere NW ka ọ na-eso nhota okwu, ọ na-egosi na nsụgharị ahụ sitere na New World Translation of the Holy Scriptures nke dị n’asụsụ Bekee