‘Ha Amaghị’
ILELỊ ịdọ aka ná ntị pụrụ ịkpata ọdachi.
Obodo Darwin, nke dị n’Australia, nọ na-ejike maka ememe oge ezumike n’afọ 1974 mgbe e gburu opi ọkụ ọkụ iji dọọ aka ná ntị banyere ajọ ifufe cyclone na-abịanụ. Ma ajọ ifufe cyclone ebibitụbeghị Darwin n’ihe dị ka afọ 30. Ọ̀ bụzi ugbu a ka ọ ga-ebibi ya? Ihe ka ọtụtụ ná ndị bi n’obodo ahụ eleghị ihe ize ndụ ahụ anya dị ka nke e kwesịrị iji kpọrọ ihe n’ezie ruo mgbe oké ifufe malitere ifekapụ elu ụlọ na ịkwatu mgbidi nke ụlọ ndị mmadụ gbakọtara na ha. Ka ọ na-erule n’ụtụtụ echi ya, obodo ahụ atọgbọrọla n’efu.
Na Colombia na November 1985, otu ugwu gbawara. Snow na ice maliterela ịgbaze agbaze mere ka e nwee apịtị na-asọ asọ nke rikpuru ihe karịrị mmadụ 20,000 bi n’obodo Armero. Á dọghị ha aka ná ntị tupu ihe a emee? Ugwu ahụ amawo jijiji ruo ọtụtụ ọnwa. Otú ọ dị, n’ịbụ ndị ọ maarala ahụ́ ibi n’akụkụ ugwu na-agbọpụta ọkụ, ihe ka ọtụtụ ná ndị bi n’Armero leghaara ya anya. A dọrọ ndị ọchịchị aka ná ntị na mkpamkpa ga-akpa n’oge na-adịghị anya, ma ọ dịkebeghị ihe ha mere iji dọọ ọha na eze aka ná ntị. A mara ọkwa na redio iji mesighachi ndị mmadụ obi ike. E jiri ígwè okwu dị na chọọchị gwa ndị mmadụ ka ha ghara ịtụ ụjọ. N’uhuruchi, e nwere mgbawa abụọ dị egwu. Ị̀ gaara ahapụ ihe onwunwe gị ma gbalaga? Ọ bụ mmadụ ole na ole gbalịrị ime otú ahụ tupu oge agafee.
Ọtụtụ mgbe, ndị ọkà mmụta banyere ala na-ekwu ebe a ga-enwe ala ọma jijiji tupu ya emee, ha na-emezukarịkwa. Ma, ha adịkebeghị ekwu kpọmkwem mgbe ọ ga-ewere ọnọdụ. Na 1999, ala ọma jijiji ndị mere n’ụwa nile gburu ihe dị ka mmadụ 20,000. Ọtụtụ n’ime ndị nwụrụnụ chere na ọ gaghị eme ha.
Olee Otú I Si Emeghachi Omume n’Ịdọ Aka ná Ntị Sitere n’Aka Chineke n’Onwe Ya?
Bible kọwara n’ụzọ doro anya ihe omume ndị ga-aka ụbọchị ikpeazụ akara ogologo oge tupu ha emewe. N’ihe banyere nke ahụ, ọ na-agba anyị ume ịtụle “ụbọchị Noa.” “N’ụbọchị ndị bu iju mmiri ahụ ụzọ,” ndị mmadụ nọ na-eme ihe ndị a na-eme ná ndụ, ọ bụ ezie na obi abụọ adịghị ya na ha nwere nchegbu banyere ime ihe ike nke juru ebe nile. N’ihe banyere ịdọ aka ná ntị Chineke nyere site n’aka ohu ya bụ́ Noa, ‘ha amaghị ruo mgbe iju mmiri ahụ bịara wee kpochapụ ha nile.’ (Matiu 24:37-39) Ị̀ gaara aṅa ntị n’ịdọ aka ná ntị ahụ? Ị̀ na-eme otú ahụ ugbu a?
Gịnị ma ọ bụrụ na i bi na Sọdọm, na nso Oké Osimiri ahụ Nwụrụ Anwụ, n’oge nwoke ahụ bụ́ Lọt, bụ́ nwa nwanne Ebreham? Ime ime obodo ya dị ka paradaịs. Obodo ukwu ya bara ọgaranya. Ndị bi na ya enweghị nchekasị. N’ụbọchị Lọt, “ha nọ na-eri ihe, ha nọ na-aṅụ ihe ọṅụṅụ, ha nọ na-azụ, ha nọ na-ere, ha nọ na-akụ ihe, ha nọ na-ewu ihe.” Ọha mmadụ ha bi n’etiti ya mebigara omume rụrụ arụ ókè. Ị̀ gaara aṅa ntị n’ịdọ aka ná ntị ahụ mgbe Lọt kwuru okwu hoo haa megide ajọ omume? Ị̀ gaara ege ntị mgbe ọ gwara gị na Chineke ekpebiwo ibibi obodo Sọdọm? Ka ị̀ gaara ele ya anya dị ka ihe egwuregwu, dị ka ndị ikom chọrọ ịlụ ụmụ Lọt mere? Ị̀ gaara amalite ịgbapụ ma mesịa lee anya n’azụ, dị ka nwunye Lọt mere? Ọ bụ ezie na ndị ọzọ ejighị ịdọ aka ná ntị ahụ kpọrọ ihe, n’ụbọchị Lọt si na Sọdọm pụta, “ọkụ na sọlfọ sitere n’eluigwe zoo ma bibie ha nile.”—Luk 17:28, 29.
Ihe ka ọtụtụ ná ndị mmadụ n’oge anyị amaghị ihe na-emenụ. Ma, e dekọrọ ihe atụ ndị a n’Okwu Chineke dị ka ihe ịdọ aka ná ntị nye anyị, iji gbaa anyị ume ka anyị NỌRỌ NA NCHE!
[Igbe na Ihe Osise nke dị na peeji nke 22]
È Nwere Iju Mmiri Zuru Ụwa Ọnụ n’Ezie?
Ọtụtụ ndị nkatọ na-asị Ee e. Ma, Bible na-asị Ee.
Jizọs Kraịst n’onwe ya kwuru banyere ya, ọ nọkwa ndụ mgbe o mere, nọrọ n’eluigwe na-ekiri ya.
[Igbe na Ihe Osise nke dị na peeji nke 23]
È Bibiri Sọdọm na Gọmọra n’Ezie?
Nkà mmụta ihe ochie na-agba akaebe na ihe a mere eme.
Akụkọ ihe mere eme kwuru banyere ya.
Jizọs Kraịst gbara akaebe ihe ahụ merenụ, e zokwara aka na ya n’akwụkwọ 14 dị iche iche dị na Bible.