NKEBI NKE ABỤỌ
Mata Onye Jehova Bụ ma Jeere Ya Ozi
Gịnị dị n’akwụkwọ iri na abụọ ahụ ndị amụma dere nke ga-eme ka anyị chọọ ịmata Jehova nke ọma karị? N’ihi gịnị ka ozi Jehova bụ́ nke ndị amụma ahụ ziri ji baa nnukwu uru n’oge a? Ka ị na-atụle Isi nke Anọ ruo n’Isi nke Asaa n’akwụkwọ a, ị ga-ahụ ihe ndị e kwuru banyere otú i kwesịrị isi na-efe Chineke ma na-etinye ụkpụrụ ya n’ọrụ. Dị ka ihe atụ, olee otú ọ na-atụ anya ka i si na-egosi ikpe ziri ezi ná mmekọrịta gị na ndị ọzọ? N’ezie, ị ga-achọpụta na akwụkwọ amụma iri na abụọ a pụrụ ime ka ndụ gị ka mma taa.