Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • yp2 isi 11 p. 99-104
  • Ọ̀ Dị Njọ Imeta Ndị Enyi n’Ịntanet?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ọ̀ Dị Njọ Imeta Ndị Enyi n’Ịntanet?
  • Ajụjụ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ—Azịza Ndị Na-adị Irè, Nke 2
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Chebara Nsogbu Ndị Dị na Ya Echiche
  • “Ndị Na-ezochi Ihe Ha Bụ”
  • Otú Ị Ga-esi Ezere Nsogbu
  • “Mgbalị I Mere Bara Uru!”
  • Nyere Nwa Gị Aka Ka Ọ Kpachara Anya n’Ịntanet
    Teta!—2014
  • Ole Ndị Bụ Ndị Enyi Gị n’Ịntanet?
    Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2022
  • Jiri Ihe Dị n’Ebe Anyị Na-edewe Ihe n’Ịntanet Na-amụ Ihe
    Ozi Alaeze Anyi—2012
  • Gịnị Ka M Kwesịrị Ịma Gbasara Ịkparịta Ụka n’Ịntanet?—Nkebi nke Abụọ
    Teta!—2012
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ajụjụ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ—Azịza Ndị Na-adị Irè, Nke 2
yp2 isi 11 p. 99-104

ISI NKE 11

Ọ̀ Dị Njọ Imeta Ndị Enyi n’Ịntanet?

Olee ụdị nkwurịta okwu na-amasị gị?

□ Nke a na-ekwu ihu na ihu

□ Nke a na-ekwu n’ekwe ntị

□ Nke a na-eji kọmputa ekwurịta

Olee ndị ọ na-akacha adịrị gị mfe gị na ha ikwurịta okwu?

□ Ụmụ klas unu

□ Ndị ezinụlọ unu

□ Ndị Kraịst ibe gị

Olee ebe i chere ahụ́ na-aka eru gị ala ma ị na-ekwu okwu?

□ N’ụlọ akwụkwọ

□ N’ụlọ

□ N’ọmụmụ ihe ọgbakọ

LEE anya n’ihe ị zara n’ajụjụ nke mbụ ahụ. Ị̀ zara na iji kọmputa agwa mmadụ okwu na-akara gị mma karịa ịgwa mmadụ okwu ihu na ihu? Ọ bụrụ otú ahụ, ọ bụghị naanị gị. Ọtụtụ ndị na-eto eto na-emeta ndị enyi n’Ịntanet, na-agbalịkwa ka ha ghara itisa. Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Elaine kwuru, sị: “Ọ na-atọ ndị mmadụ ụtọ ịmata ndị nọ ebe dị iche iche n’ụwa, ya bụ, ndị ha na-enweghị ike ịmata ma a sị na Ịntanet adịghị.” Nwa agbọghọ ọzọ dị afọ iri na itoolu aha ya bụ Tammy kwuru ihe ọzọ mere o ji atọ ndị mmadụ ụtọ ịmata ndị mmadụ n’Ịntanet. O kwuru, sị: “N’Ịntanet, ụdị onye ị gwara ndị mmadụ na ị bụ ka ha ga-ewere. Mgbe gị na ha na-ekwu okwu ihu na ihu, ọ bụrụ na otú ị dị adịghị ha mma, ọ dịghị ihe i nwere ike ime banyere ya.”

Ugbu a, lee anya n’ihe ị zara n’ajụjụ nke abụọ na nke atọ. Ya ejula gị anya ma ọ bụrụ na ahụ́ na-eru gị ala mgbe gị na ụmụ klas unu na-ekwurịta okwu karịa mgbe gị na Ndị Kraịst ibe gị na-ekwurịta okwu n’ọmụmụ ihe. Otu nwa agbọghọ dị afọ iri na asatọ aha ya bụ Jasmine kwuru, sị: “N’ụlọ akwụkwọ, i nwere ike ịhụ ndị ọ dị otú ọ dị gị. Ọ ga-eme ka ahụ́ ruo gị ala mgbe gị na ha na-ekwurịta okwu.”

Mgbe i chebachaara ihe ndị ahụ niile e kwuru echiche, i nwere ike iche na ọ kacha mma ka gị na ụmụ akwụkwọ ibe gị na-ekwurịta okwu n’Ịntanet. Tammy kwuru na ya emetụla ụdị ihe ahụ. O kwuru, sị: “Ụmụ akwụkwọ ibe m niile na ndị enyi ha na-ekwurịta ọtụtụ ihe n’Ịntanet, achọghị m ịdị iche.”a Otu nwa agbọghọ dị afọ iri abụọ aha ya bụ Natalie mepere ebe ya na ndị enyi ya ga na-ekwurịta okwu n’Ịntanet. O kwuru, sị: “Nkà na ụzụ na-agbalị. E nweela ụzọ ọhụrụ ndị a na-esi ekwurịta okwu. Nke a bụ otu n’ime ha, ọ na-atọ m ụtọ.”

Chebara Nsogbu Ndị Dị na Ya Echiche

O doro anya na ọ na-akara ụfọdụ ndị mma imeta enyi n’Ịntanet ma na-agbalị ka ha ghara itisa. Natalie kwuru, sị: “Ikwu okwu n’Ịntanet na-eme ka mmadụ nwee ụdị obi ike ọ na-agaghị enweli ma ya na onye ọzọ na-ekwu okwu ihu na ihu. Tammy kwetara na ọ bụ eziokwu. O kwuru, sị: “Ọ bụrụ na ị bụ onye ihere, ị ga-ebu ụzọ hazie ihe ị chọrọ ikwu tupu gị na mmadụ ekwuwe okwu n’Ịntanet.”

Ma ọtụtụ nsogbu dị n’ikwurịta okwu n’Ịntanet, ọ ga-abụkwa iberiibe ma i leghara ha anya. Dị ka ihe atụ: Ị̀ ga-emechi anya na-aga n’okporo ámá e nwere ihe ndị na-emerụ ahụ́? Ọ bụrụ na ị gaghị eme otú ahụ, gịnịzi mere ị ga-eji na-awagharị n’Ịntanet n’achọghị ịma nsogbu ndị dị na ya?

Chegodị echiche nsogbu dị n’ịchọ imeta ndị enyi n’Ịntanet. E nwere otu nwa agbọghọ aha ya bụ Elaine. Ọ na-atọbu ya ụtọ ya na ndị ọ na-amaghị ikwurịta okwu n’Ịntanet. O kwuru, sị: “Ọ dị nnọọ mfe imeta ndị aghụghọ enyi n’Ịntanet. Mgbe ụfọdụ, gị na mmadụ nwere ike ikwu okwu naanị nkeji ole na ole, ya ekwuwe okwu rụrụ arụ ma ọ bụ jụwa gị, sị: ‘Ị̀ marala nwoke ma ọ bụ nwaanyị? Ì jitụla ọnụ nwee mmekọahụ?’ Ụfọdụ na-amalitedị ịkọwara gị ihe banyere mmekọahụ iji kpalie mmasị gị.”

Ọ́ bụrụkwanụ na onye ahụ gị na ya na-ekwurịta okwu bụ enyi gị ị tụkwasịrị obi? Ya bụrụgodị enyi gị, i kwesịrị ịkpachara anya. Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Joan kwuru, sị: “Gị na onye na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwaanyị ibe gị nwere ike ikwugide okwu ruo ọtụtụ awa, ọ bụrụgodị na o nweghị ihe jikọrọ unu. Ka ị na-etinyekwu oge n’izigara onye ahụ ozi, otú ahụ ka unu na-aghọkwu enyi. O nwere ike ime ka okwu unu bawa ime.”

“Ndị Na-ezochi Ihe Ha Bụ”

Eze Devid maara nke ọma na mmadụ izere ndị enyi ọjọọ bara ezigbo uru. O dere, sị: “Mụ na ndị ụgha adịghị anọkọ; mụ na ndị na-ezochi ihe ha bụ adịghị akpakọrịta.”—Abụ Ọma 26:4.

N’Ịntanet, ị̀ hụtụla ụdị ndị ahụ Devid kwuru banyere ha? Olee mgbe ndị mmadụ “na-ezochi ihe ha bụ” n’Ịntanet? ․․․․․

N’aka nke ọzọ, ọ̀ ga-abụ na ị na-ezochi ihe ị bụ mgbe gị na ndị mmadụ na-ekwurịta okwu n’Ịntanet? Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Abigail, bụ́ onye ya na ndị mmadụ na-akparịta ụka n’Ịntanet, kwuru, sị: “Mgbe mụ na ndị mmadụ na-ekwurịta okwu, ana m eme ka m̀ bụ ụdị onye a na-ekwu banyere ya.”

Nwa agbọghọ ọzọ aha ya bụ Leanne nwere ụzọ ọzọ o si aghọgbu ndị mmadụ. O kwuru, sị: “Mụ na otu nwata nwoke nọ n’ọgbakọ dị nso na-ekwurịta okwu n’Ịntanet mgbe niile. N’oge na-adịghị anya, anyị malitere ikwu ihe dị ka ‘ahụrụ m gị n’anya.’ Papa m ma ọ bụ mama m gafewa, ana m ewepụ ebe anyị dere ozi, n’ihi ya, o nweghị otú ha si mara ihe na-aga. Echeghị m na ha nwere ike iche n’ụwa a na nwa ha nwaanyị dị afọ iri na atọ na-edere nwata nwoke dị afọ iri na anọ ozi ịhụnanya. O nweghị mgbe ha chetụrụ ya n’echiche.”

Otú Ị Ga-esi Ezere Nsogbu

N’eziokwu, e nwere mgbe ikwurịta okwu n’Ịntanet na-adịghị njọ. Dị ka ihe atụ, ọtụtụ ndị na-esi n’Ịntanet ezigara ndị enyi ha ozi mgbe niile. Ndị toro eto na-emekwa otú ahụ. Ọ bụrụ na ị na-esi n’Ịntanet ezigara ndị enyi gị ozi, ò nwere ihe ndị i kwesịrị ịkpachapụ anya na ha? Tụlee ihe ndị a.

● Mara awa ole ị na-anọ n’Ịntanet, ekwekwala ka o rie oge ị ga-eji mee ihe ndị ka mkpa, ma oge i ji arahụ ụra. Otu nwa okorobịa aha ya bụ Brian kwuru, sị: “Ụfọdụ ụmụ akwụkwọ ibe m kwuru na ha na-anọgide n’Ịntanet ruo n’elekere atọ nke ụtụtụ.”—Ndị Efesọs 5:15, 16.

● Ka ndị gị na ha na-ezirịta ozi bụrụ naanị ndị ị maara nke ọma ma ọ bụ ndị i nwere ike ịmatali ndị ha bụ. Ndị ọjọọ na-agakarị n’Ịntanet achọ ụmụaka na-amachaghị ihe ha ga-aghọgbu.—Ndị Rom 16:18.

● Mgbe gị na ndị mmadụ na-emekọ ihe ego, kpachara anya. Kpachara ezigbo anya mgbe ị na-agwa ndị mmadụ banyere onwe gị. Ma ọ́ bụghị ya, e nwere ike igwu gị wayo, ma ọ bụ mee gị nke ka njọ.—Matiu 10:16.

● Mgbe ị na-ezigara ndị enyi gị foto gị, jụọ onwe gị, sị, ‘Otú m dị na foto a ọ̀ bụ otú onye na-efe Chineke kwesịrị ịdị?’—Taịtọs 2:7, 8.

● Dị ka i kwesịrị ime mgbe gị na mmadụ na-ekwu okwu ihu na ihu, ọ bụrụ na mkparịta ụka unu n’Ịntanet agawa ‘n’ihe ndị na-ekwesịghị ekwesị,’ kwụsị ya.—Ndị Efesọs 5:3, 4.

● Na-akwụwa aka gị ọtọ mgbe ọ bụla ị nọ n’Ịntanet. Ọ bụrụ na ‘ị chọrọ izochiri ndị mụrụ gị ihe ị bụ,’ nsogbu dị. Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Kari kwuru, sị: “Anaghị m ezoro mama m ihe ọ bụla. Ana m egosi ya ihe m na-eme n’Ịntanet.”—Ndị Hibru 13:18.

“Mgbalị I Mere Bara Uru!”

Ị chọrọ inwe ndị enyi. Ọ bụghị ihe ọjọọ. E kere ụmụ mmadụ ka ha na ibe ha na-akpakọrịta. (Jenesis 2:18) N’ihi ya, mgbe ọ bụla ọ gụrụ gị agụụ imeta ndị enyi, ọ bụ n’ihi otú e si kee gị! Naanị ihe ị ga-eme bụ ịkpachara anya n’ụdị ndị ị na-emeta enyi.

Ka obi sie gị ike na i nwere ike imeta ezigbo ndị enyi ma ọ bụrụ na i soro ihe Okwu Chineke kwuru. Otu nwa agbọghọ dị afọ iri na ise kwuru, sị: “Ọ dịghị mfe inweta ndị enyi hụrụ Jehova n’anya, hụkwa gị n’anya. Ma mgbe i nwetara ụdị ndị enyi ahụ, ị ga-ahụ na mgbalị i mere bara uru!”

N’ISIOKWU ANYỊ ỌZỌ

Ị̀ ma na okwu nwere ike igbu mmụọ mmadụ? Asịrị nwere ike ịfụ ụfụ ka ebe e ji mma agha maa mmadụ. Olee otú ị ga-esi akwụsị ya?

[Ihe odide ala ala peeji]

a A ga-atụlekwu banyere imeta ndị enyi n’ụlọ akwụkwọ n’Isi nke 17.

AMAOKWU BAỊBỤL

“Mụ na ndị ụgha adịghị anọkọ; mụ na ndị na-ezochi ihe ha bụ adịghị akpakọrịta.”—Abụ Ọma 26:4.

NDỤMỌDỤ

Igbu oge n’Ịntanet anaghị ara ahụ́! N’ihi ya, kwuo mgbe ị ga-anọru. Agafela oge ahụ i kwuru. I nwere ike idewe ihe ga-echetara gị mgbe oge ahụ zuru.

Ị̀ MA NA . . . ?

Naanị ihe ole na ole i dere n’Ịntanet, ma eleghị anya, aha nna gị, aha ụlọ akwụkwọ unu, na nọmba ekwe ntị gị, nwere ike ime ka onye bu ihe ọjọọ n’obi nweta gị.

IHE M GA-EME!

Naanị awa ole m ga na-anọ n’Ịntanet n’izu bụ, ihe ga-enyere m aka ime ya bụ

Ọ bụrụ na mụ na onye m na-amaghị ekwurịtawa okwu n’Ịntanet, ihe m ga-eme bụ

Ihe m chọrọ ịjụ papa m ma ọ bụ mama m banyere okwu a bụ

GỊNỊ KA I CHERE?

● Olee uru na ọghọm dị n’ikwurịta okwu n’Ịntanet ma e jiri ya tụnyere ikwurịta okwu ihu na ihu?

● Gịnị mere o ji adị mfe mmadụ ime ka ọ̀ bụ onye ọzọ mgbe ọ na-ekwu okwu n’Ịntanet?

● Olee ihe ị ga-eme ka ị ghara ịnọ ogologo oge n’Ịntanet?

● Olee ihe ndị bara uru i nwere ike iji Ịntanet na-eme?

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo nke dị na peeji nke 103]

“Mụ na ndị m na-amaghị ma ọ bụ ndị mụ na ha na-enweghị ike ịkpa ihu na ihu anaghị ekwurịta okwu n’Ịntanet.”—Joan

[Foto dị na peeji nke 100 na 101]

Ị̀ ga-emechi anya na-aga n’okporo ámá e nwere ihe ndị na-emerụ ahụ́? Ọ bụrụ na ị gaghị eme otú ahụ, gịnịzi mere ị ga-eji na-awagharị n’Ịntanet n’achọghị ịma nsogbu ndị dị na ya?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya