Ihe A Na-aga Ịkọ ná Nkebi nke 13
Jizọs bịara n’ụwa ka o jiri ndụ ya chụọ àjà iji gbapụta ụmụ mmadụ na-ezughị okè. Ọ bụ eziokwu na ọ nwụrụ, o meriri ụwa. Jehova ahapụghị Ọkpara ya n’ili, ọ kpọlitere ya n’ọnwụ. Jizọs dị umeala n’obi. O jeere ndị ọzọ ozi ma gbaghara ha mgbe ha mejọrọ ihe. Mgbe a kpọlitechara ya n’ọnwụ, ọ pụtara n’ihu ndị na-eso ụzọ ya. Ọ kụziiri ha otú ha ga-esi arụ ọrụ dị mkpa o nyere ha rụọ. Ọ bụrụ na ị bụ nne ma ọ bụ nna, nyere nwa gị aka ka ọ ghọta na anyị kwesịrị iso rụọ ọrụ a n’oge anyị a.