Mach
Fraịdee, Mach 1
N’ịdị nwayọọ n’obi na-ewere na ndị ọzọ ka unu.—Fil. 2:3.
Ò nwere onye nọ n’ọgbakọ unu na-akpasu gị iwe? O nwere ike ịbụ na obi anaghị adị gị mma gbasara onye ahụ. Ọ bụrụ na ị gbanweghị otú i si ele ya anya, ị ga na-eburu ya iwe n’obi. Baịbụl kwuru na ile ọbịa nwere ike ime ka anyị na ndị mmadụ na-adị ná mma, ma ndị iro anyị. (Ilu 25:21, 22) Ile mmadụ ọbịa nwekwara ike ime ka ị kwụsị iburu ya iwe n’obi, meekwa ka gị na ya dịkwuo ná mma. O nwere ike ime ka ị hụ àgwà ọma onye ahụ nwere, nke mere ka Jehova kpọbata ya n’ọgbakọ. (Jọn 6:44) Ọ bụrụ na anyị akpọọ mmadụ ka ọ bịa na nke anyị mgbe ọ na-atụghị anya ya maka na anyị hụrụ ya n’anya, o nwere ike ime ka anyị na ya malite ịdị ná mma. Olee ihe ị ga-eme iji gosi na ihe mere i ji kpọọ ya bụ n’ihi na ị hụrụ ya n’anya n’eziokwu? Otu ụzọ i nwere ike isi eme ya bụ ime ihe e kwuru n’ihe mmụta dịịrị ụbọchị nke taa. Ọ bụrụ na anyị achọpụta ụzọ ụmụnna anyị si ka anyị mma, ọ ga-eme ka anyị hụkwuo ha n’anya, meekwa ka anyị jiri obi anyị lee ha ezigbo ọbịa. Anyị nwere ike ịmụta ihe n’okwukwe ha, ndidi ha, otú ha si akata obi, ma ọ bụkwanụ n’àgwà ha ndị ọzọ e ji mara Ndị Kraịst. w18.03 17 ¶18-19
Satọdee, Mach 2
[Jehova achọghị] ka e bibie onye ọ bụla.—2 Pita 3:9.
Otu n’ime ihe ndị kacha eme ka o siere ụfọdụ ndị nne na nna ike irubere Jehova isi bụ mgbe a chụrụ nwa ha n’ọgbakọ. Tụlee ihe otu nne mere mgbe a chụrụ nwa ya nwaanyị n’ọgbakọ, ya ahapụ ụlọ. O kwuru, sị: “M chọrọ ihe ndị m ga-akụdo aka n’akwụkwọ anyị ka mụ na nwa m nwaanyị na nwa ya nwaanyị na-anọrị.” O kwukwara, sị: “Ma di m nyeere m aka mee ka m ghọta na ihe banyere nwa anyị dịzi Jehova n’aka, nakwa na anyị kwesịrị irubere Jehova isi.” Mgbe afọ ole na ole gachara, a nabatara nwa ha nwaanyị n’ọgbakọ. Nne ya kwuru, sị: “Ọ na-asọpụrụ anyị nke ukwuu n’ihi na ọ ma na anyị rubeere Chineke isi.” Ọ bụrụ na a chụrụ nwa gị n’ọgbakọ, ị̀ ‘ga-ejiri obi gị dum tụkwasị Jehova obi, ma ghara ịdabere ná nghọta gị’? (Ilu 3:5, 6) N’ihi ya, ndị nne na nna, ka obi sie unu ike na aka ná ntị Jehova na-adọ anyị, nakwa otú o si na-eduzi anyị na-abara anyị uru, ma mgbe irubere ya isi na-esiri unu ike. Nabatanụ aka ná ntị Chineke na-adọ anyị, unu agbakwala ya ụkwụ. w18.03 31 ¶12-13
Sọnde, Mach 3
Gaanụ mee ndị mba niile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ m.—Mat. 28:19.
Baịbụl ekwughị afọ ole mmadụ ga-eru tupu e mee ya baptizim. Okwu Grik e si sụgharịa “ime ndị na-eso ụzọ,” nke dị na Matiu 28:19, pụtara ịkụziri mmadụ ihe, buru n’obi na onye ahụ ga-aghọ nwa akwụkwọ ma ọ bụ onye na-eso ụzọ. Onye na-eso ụzọ Jizọs bụ onye na-amụ ma na-aghọta ihe Jizọs na-akụzi, kpebisiekwa ike ịna-eme ihe ndị ahụ. N’ihi ya, mkpa ndị nne na nna bụ́ Ndị Kraịst kwesịrị ịbụ inyere ụmụ ha aka malite mgbe ha ka dị obere ka ha ghọọ ndị na-eso ụzọ Kraịst. Nke bụ́ eziokwu bụ na e kwesịghị ime ụmụ ọhụrụ baptizim. Ma, Baịbụl kwuru na ụmụaka nwediri ike ịghọta eziokwu Baịbụl, jirikwa ya kpọrọ ihe. Dị ka ihe atụ, Timoti bụ onye na-eso ụzọ Jizọs ji ofufe Chineke kpọrọ ihe malite mgbe ọ na-eto eto. Okwukwe ya siri ezigbo ike. (2 Tim. 1:5; 3:14, 15) Mgbe ọ dị ihe dị ka afọ iri abụọ na otu, e nyere ya ọrụ pụrụ iche n’ọgbakọ.—Ọrụ 16:1-3. w18.03 9 ¶4-5
Mọnde, Mach 4
[Na-eme] ka ike nke na-eduzi uche unu dị ọhụrụ.—Efe. 4:23.
Mgbe anyị malitere ife Chineke, anyị gbanwere ụzọ niile anyị si ebi ndụ. Ma, mgbanwe a akwụsịghị mgbe e mechara anyị baptizim. Ebe ọ bụ na anyị ezughị okè, anyị kwesịrị ịnọgide na-agbanwe otú anyị si ebi ndụ. (Fil. 3:12, 13) Ma ànyị bụ onye na-eto eto ma ànyị bụ dimkpa, anyị kwesịrị ịjụ onwe anyị, sị: ‘M̀ chọpụtala na m jirikwuola ofufe Chineke kpọrọ ihe? Àgwà ndị m na-akpa, hà na-egosi na m na-eṅomi Kraịst? Otú m si akpa àgwà n’ọmụmụ ihe, ọ̀ na-egosi na m ji ofufe Chineke kpọrọ ihe? Olee ihe mkparịta ụka m na-egosi banyere ihe ndị m chọrọ ná ndụ? Gịnị ka otú m si amụ ihe, eji ejiji, na otú m si anabata ndụmọdụ e nyere m na-ekwu banyere m? Olee ihe m na-eme ma ọnwụnwa bịara m? M̀ bụ Onye Kraịst tozuru okè?’ (Efe. 4:13) Ichebara ajụjụ ndị a echiche ga-enyere anyị aka ịma ma ànyị ji ofufe Chineke kpọrọ ihe. w18.02 24 ¶4-5
Tuzdee, Mach 5
Obi ụtọ na-adịrị ndị Chineke ha bụ Jehova.—Ọma 144:15.
Anyị bi n’oge pụrụ nnọọ iche. O nwetụbeghị oge dị ka ya kemgbe ụwa. Baịbụl kwuru na Jehova na-achịkọta “oké ìgwè mmadụ . . . si ná mba niile na ebo niile na ndị niile na asụsụ niile pụta.” Ha bụ “mba dị ike” nke karịrị nde mmadụ asatọ obi dị ụtọ. Ha ‘na-ejekwara Chineke ozi dị nsọ ehihie na abalị.’ (Mkpu. 7:9, 15; Aịza. 60:22) E nwetụbeghị mgbe ọtụtụ mmadụ hụrụ Chineke na ndị agbata obi ha n’anya otú a. Baịbụl kwukwara na n’oge anyị a, a ga-enwe ụdị ịhụnanya e ji amata ndị na-anaghị efe Chineke. Ọ bụ mmadụ ịchọ ihe ga-abara naanị onwe ya uru. Pọl onyeozi kwuru, sị: “N’oge ikpeazụ . . . , ndị mmadụ ga-abụ ndị hụrụ naanị onwe ha n’anya, ndị hụrụ ego n’anya, . . . ndị hụrụ ihe ụtọ n’anya kama ịbụ ndị hụrụ Chineke n’anya.” (2 Tim. 3:1-4) Ụdị ịhụnanya a dị iche n’ịhụnanya a chọrọ ka Ndị Kraịst nwee. Ọ na-eme ka ndị mmadụ na-achọ ihe ga-abara naanị onwe ha uru, ya emee ka ihe na-esiri ndị mmadụ ike. w18.01 22 ¶1-2
Wenezdee, Mach 6
Ndị na-achọ Jehova pụrụ ịghọta ihe niile.—Ilu 28:5.
Ịmata Chineke nke ọma nyeere Noa aka, karịchaa ka ọ ghara ime ihe ọ bụla ga-ewute Jehova. Dị ka ihe atụ, n’ihi na Noa “so ezi Chineke jee ije,” ya na ndị ọjọọ anaghị akpa. Noa ekweghị ka ike ndị mmụọ ọjọọ ahụ nọ n’ụwa n’oge ahụ na-akpa megharịa ya anya otú ha si megharịa ndị na-enweghị okwukwe na Chineke. O nwedịrị ike ịbụ na ndị ahụ fewere ndị mmụọ ọjọọ ahụ. (Jen. 6:1-4, 9) Ihe ọzọkwa bụ na Noa ma na Chineke gwara ụmụ mmadụ ka ha mụọ ụmụ ma jupụta ụwa. (Jen. 1:27, 28) N’ihi ya, mgbe ndị mmụọ ọjọọ ahụ bịara lụrụ ụmụ nwaanyị ma mụta ụmụ, Noa ma na ihe a ha mere jọgburu onwe ya. Ọ bịara dokwuo ya anya mgbe ndị mmụọ ọjọọ ahụ mụtara ụmụ, ụmụ ha agbaa ajọ dimkpa ma karịa ndị ọzọ niile ike. Ka oge na-aga, Chineke gwara Noa na ya ga-eji mmiri bibie ndị ọjọọ niile. Okwukwe Noa nwere na ihe a ga-eme, mere ka ọ rụọ ụgbọ, a zọpụtakwa ya na ezinụlọ ya.—Hib. 11:7. w18.02 9 ¶8
Tọzdee, Mach 7
Site n’obiọma Chineke nke na-erughịrị mmadụ, abụ m ihe m bụ.—1 Kọr. 15:10.
Ọ bụrụ na i mere mmehie dị oké njọ, Jehova dị njikere inyere gị aka ka gị na ya dịghachi ná mma. Ma ọ dị mkpa ka ị nabata aka ọ ga-esi n’ọgbakọ ya nyere gị. (Ilu 24:16; Jems 5:13-15) Egbukwala oge ime ihe i kwesịrị ime n’ihi na ndụ ebighị ebi gị dabeere na ya. Ka e were ya na a gbagharala gị mmehie gị kemgbe, ma obi gị ka na-ama gị ikpe, olee ihe ị ga-eme? E nwere oge ụfọdụ Pọl onyeozi dara mbà n’obi n’ihi mmehie ndị o mere tupu ya aghọọ Onye Kraịst. O kwuru, sị: “Abụ m onye kasị nta n’ime ndịozi, ekwesịghịkwa m ka a kpọọ m onyeozi, n’ihi na akpagburu m ọgbakọ Chineke.” (1 Kọr. 15:9) Jehova nabatara Pọl n’agbanyeghị ihe ndị o mejọrọ n’oge gara aga. Jehova chọkwara ka ọ ghọta na ya agbagharala ya. Ọ bụrụ na i sila n’ala ala obi gị chegharịa ná mmehie ndị i mere n’oge gara aga ma kwupụtara ya Jehova, kọọkwara ya ndị okenye, obi kwesịrị isi gị ike na Jehova agbagharala gị. N’ihi ya, kwere na Jehova agbagharala gị.—Aịza. 55:6, 7. w18.01 11 ¶17-18
Fraịdee, Mach 8
Bịaruonụ Chineke nso, ọ ga-abịarukwa unu nso.—Jems 4:8.
Ka anyị nwee ike ịbụ enyi Jehova, anyị kwesịrị ịna-ege ya ntị ma na-agwa ya okwu. Otú kacha mma anyị nwere ike isi na-ege ya ntị bụ ịna-amụ Baịbụl n’onwe anyị. Nke a pụtara na ị ga na-agụ Okwu Chineke nakwa akwụkwọ ndị anyị ji amụ Baịbụl. Ma ịmụ Baịbụl abụghị naanị iburu ihe ụfọdụ n’isi otú ahụ i nwere ike ime mgbe unu chọrọ ile ule n’ụlọ akwụkwọ. Kama, ọ dị ka ebe ị na-eme njem ka ị chọpụta ihe ọhụrụ banyere Jehova. Nke a ga-enyere gị aka ịbịaru Chineke nso, ya abịaruokwa gị nso. Nzukọ Jehova ewepụtala ọtụtụ ihe nwere ike inyere gị aka ịmụ ihe nke ọma. Dị ka ihe atụ, na jw.org, e nwere ihe ndị ga-enyere gị aka ịghọta ihe Baịbụl na-akụzi. Ọ dị n’ebe e dere “Ihe Ndị Ga-enyere Gị Aka.” Ha ga-enyere gị aka ime ka okwukwe gị sikwuo ike.—Ọma 119:105. w17.12 25 ¶8-9
Satọdee, Mach 9
Ha agaghị emerụ ihe ọ bụla ahụ́, ha agaghịkwa emebi ihe ọ bụla n’ugwu nsọ m dum.—Aịza. 11:9.
Ihe mere ihe a ga-eji ekwe omume bụ “n’ihi na ihe ọmụma Jehova ga-ejupụta ụwa.” Ma ebe ọ bụ na ụmụ anụmanụ anaghị amụ gbasara Jehova, ọ bụ ụmụ mmadụ ka a na-ekwu ga-agbanwe àgwà ha. (Aịza. 11:6, 7) E nwere ọtụtụ ụmụnna anyị na-emebu ihe ike ka anụ ọhịa wolf, ma ugbu a ha na ndị ọzọ na-adị n’udo. I nwere ike ịgụ gbasara ha n’isiokwu bụ́ “Baịbụl Na-agbanwe Ndụ Ndị Mmadụ,” nke na-agba na jw.org. Ọtụtụ n’ime ndị na-efe Chineke na-emebu ihe ike, ma ugbu a, ha ‘eyirila mmadụ ọhụrụ ahụ nke e kere dị ka uche Chineke si dị, n’ezi omume na iguzosi ike n’ihe.’ (Efe. 4:23, 24) Mgbe ndị mmadụ matara Jehova, ha na-aghọta na ha kwesịrị ime ihe o kwuru. Nke a na-enyere ha aka ịgbanwe ihe ndị ha kweere, otú ha si eche echiche, nakwa otú ha si akpa àgwà. Ma, ọ dịghị mfe ime mgbanwe ndị a, ma mmụọ Chineke ga-enyere ndị chọrọ iji obi ha niile na-efe ya, aka. w18.01 31 ¶15-16
Sọnde, Mach 10
Onye ọ bụla [ga-adị ndụ] n’ọnọdụ nke ya.—1 Kọr. 15:23.
Baịbụl kwuru na a ga-akpọlite ndị ahụ ga-aga eluigwe n’ọnwụ, “onye ọ bụla n’ọnọdụ nke ya.” N’ihi ya, obi kwesịkwara isi anyị ike na a ga-ahazi mbilite n’ọnwụ nke ndị ahụ a ga-akpọlite n’ọnwụ n’ụwa ahazi. Nke ahụ nwere ike ime ka anyị jụọ, sị: À ga-akpọlite ndị nwụrụ n’oge na-adịghị anya obere oge Kraịst ga-amalite Ọchịchị Puku Afọ ya, ndị nke ha ma ha anabata ha? À ga-ebu ụzọ kpọlite ndị ohu Chineke n’oge ochie, bụ́ ndị ma nke a na-akọ n’ịhazi ihe, ka ha nye aka hazie ndị Chineke n’ụwa ọhụrụ? Gịnị ga-eme ndị na-efetụbeghị Jehova? Olee mgbe a ga-akpọlite ha n’ọnwụ? Oleekwa ebe ọ ga-abụ? E nwere ọtụtụ ajụjụ anyị nwere ike ịna-ajụ. Ma, anyị ekwesịghị ịna-echegbu onwe anyị maka ihe ndị ahụ ugbu a. Ọ ga-akacha mma ka anyị chere ma hụ ihe Jehova ga-eme. Tupu oge ahụ eruo, anyị kwesịrị ime ka okwukwe anyị sikwuo ike. Jehova si n’aka Jizọs kwe anyị nkwa na ya ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ ọ ga-achọ ịkpọlite n’ọnwụ.—Jọn 5:28, 29; 11:23. w17.12 12 ¶20-21
Mọnde, Mach 11
Unu ndị bụ́ nwunye, na-edonụ onwe unu n’okpuru di unu, dị ka o kwesịrị ekwesị n’ime Onyenwe anyị. Unu ndị bụ́ di, na-ahụnụ nwunye unu n’anya, unu ewesola ha oké iwe. Unu ndị bụ́ ụmụ, na-eruberenụ ndị mụrụ unu isi n’ihe niile.—Kọl. 3:18-20.
O doro anya na ime ihe a Pọl kwuru ka ga na-abara ndị di, nwunye ha, nakwa ụmụ ha, uru. Baịbụl gwara ndị bụ́ di, sị: “Na-ahụnụ nwunye unu n’anya, unu ewesola ha oké iwe.” Di hụrụ nwunye ya n’anya ga na-ege nwunye ya ntị ma na-eme ka obi sie ya ike na o ji ihe o kwuru kpọrọ ihe. (1 Pita 3:7) Ọ bụ eziokwu na ọ bụghị mgbe niile ka ọ ga na-eme ihe nwunye ya gwara ya, ige nwunye ya ntị ga-eme ka o mee mkpebi dị mma. (Ilu 15:22) Di hụrụ nwunye ya n’anya anaghị agwa ya ka ọ sọpụrụ ya, kama, ọ na-eme ihe nwunye ya ga-eji na-asọpụrụ ya. Ọ bụrụ na di ana-ahụ nwunye ya na ụmụ ya n’anya, ha ga-eji obi ụtọ na-efe Jehova, ma nweta ihe ahụ a na-agbata n’ọsọ. w17.11 28 ¶12; 29 ¶15
Tuzdee, Mach 12
Nọrọnụ na nche: ma eleghị anya, a pụrụ inwe onye ga-eburu unu dị ka anụ oriri ya site na nkà ihe ọmụma na aghụghọ efu . . . nke ụwa.—Kọl. 2:8.
Pọl degaara Ndị Kraịst nọ na Kọlọsi akwụkwọ ozi mgbe a tụrụ ya mkpọrọ na Rom n’ihe dị ka afọ 60 ruo afọ 61. Ọ gwara ha ihe mere ha ji kwesị inwe “nghọta ime mmụọ,” ya bụ, ile ihe anya otú Jehova si ele ihe anya. (Kọl. 1:9) Ọ gwakwara ha, sị: “Ana m ekwu nke a ka onye ọ bụla ghara iji arụmụka ire ụtọ duhie unu. Nọrọnụ na nche: ma eleghị anya, a pụrụ inwe onye ga-eburu unu dị ka anụ oriri ya site na nkà ihe ọmụma na aghụghọ efu, dị ka ọdịnala mmadụ si dị, dị ka ihe ndị mbụ nke ụwa si dị, ọ bụghị dị ka Kraịst si dị.” (Kọl. 2:4, 8) Pọl gwaziri ha ihe mere na ụfọdụ ihe ndị mmadụ na-eche abụghị eziokwu, nakwa ihe mere o ji dị ọtụtụ ndị mma. Dị ka ihe atụ, o nwere ike ime ka mmadụ na-eche na ọ ma ihe karịa ndị ọzọ, nakwa na ọ ka ndị ọzọ. Ihe mere Pọl ji degara ha akwụkwọ ozi ahụ bụ iji nyere ụmụnna aka ka ha ghara ịna-eche echiche ka ndị ụwa, nakwa ịgbara omume ọjọọ ọsọ.—Kọl. 2:16, 17, 23. w17.11 20 ¶1
Wenezdee, Mach 13
Ọ bụrụ na aka gị ma ọ bụ ụkwụ gị na-eme ka ị sụọ ngọngọ, gbupụ ya tụfuo.—Mat. 18:8.
Gịnị ka Onye Kraịst nwere ike ịhapụ ka Jehova nwee ike ịna-emere ya ebere? Ọ ga-adị njikere ịhapụ ihe ndị na-atọ ya ụtọ ọ na-eme ma ọ bụrụ na ha ga-eme ka o mee mmehie. (Mat. 18:9) Ọ bụrụ na ndị enyi gị achọọ ka i mee ihe na-adịghị Jehova mma, ị̀ ga-akwụsị gị na ha ịna-akpa? Ọ bụrụ na ọ na-esiri gị ike ịkwụsị ịṅụ oké mmanya, ị̀ ga-akwụsị ịga ebe ụfọdụ nwere ike ime ka ị ṅụọ oké mmanya? Ọ bụrụ na gị na agụụ ịkwa iko na-alụ, ị̀ ga-akwụsị ile fim, ịga ebe ụfọdụ n’Ịntanet, ma ọ bụ ime ihe ụfọdụ nwere ike ime ka ị na-eche ime ihe ọjọọ? Cheta na ihe ọ bụla anyị mere iji rubere Jehova isi, efughị ọhịa. E nweghị ihe na-ewute mmadụ karịa onye ahụ iche na Jehova ajụla ya. E nweghịkwa ihe na-eme mmadụ obi ụtọ karịa mmadụ inwe “obiọma ga-adịru mgbe ebighị ebi.”—Aịza. 54:7, 8. w17.11 11 ¶12
Tọzdee, Mach 14
Nke a bụ ọbụbụ ọnụ nke na-agagharị . . . , n’ihi na onye ọ bụla nke na-ezu ohi . . . anataghị ntaramahụhụ.—Zek. 5:3.
Ị̀ hụrụ na Zekaraya 5:4 kwuru na ‘ọbụbụ ọnụ ga-abanye n’ụlọ onye ohi nakwa na ọ ga-ebiri ebiri n’ime ụlọ ya wee kpochapụ ya’? N’ihi ya, Jehova ga-agba onye ọ bụla sị na ya na-efe ya ma na-eme ihe ọjọọ n’anwụ ma taa ya ahụhụ. Ọ bụrụgodị na onye na-ezu ohi ezochiere ya ndị uwe ojii, ndị were ya n’ọrụ, ndị okenye, ma ọ bụ ndị mụrụ ya, ọ gaghị ezochiliri ya Jehova. Jehova ga-eme ka a mata ụdị ohi ọ bụla mmadụ zuru. (Hib. 4:13) Obi dị anyị ezigbo ụtọ na anyị na ndị na-agbalị na-akwụwa aka ha ọtọ “n’ihe niile” na-akpa. (Hib. 13:18) Ụdị ohi ọ bụla na-ewe Jehova iwe. Obi na-atọ anyị ụtọ na anyị ma onye Jehova bụ, na-erubere ya isi ma na-ebi ndụ otú na-agaghị eme ka ndị mmadụ na-akatọ aha ya. Ime otú ahụ ga-eme ka Jehova ghara ime anyị ihe ọ ga-eme ndị na-anaghị erubere ya isi. w17.10 22 ¶6-7
Fraịdee, Mach 15
Na-agbasi mbọ ike ka unu nọgide n’ịdị n’otu nke mmụọ nsọ, n’ihe nkekọ nke bụ́ udo.—Efe. 4:3.
Anyị na-eme ihe niile anyị nwere ike ime ka anyị na ụmụnna anyị dịrị n’udo ọ bụrụgodị na anyị chere na a ghọtahiere anyị ma ọ bụ mejọọ anyị. (Rom 12:17, 18) Ọ bụrụ na anyị mejọrọ mmadụ, anyị kwesịrị ịrịọ onye ahụ mgbaghara. Ma, o kwesịrị isi anyị n’obi. Di na nwunye kwesịkwara ịna-eme udo. Ha ekwesịghị ịpụta n’ihu ndị mmadụ na-eme ka hà hụrụ ibe ha n’anya, ma ha laa n’ụlọ, ha anaghị atụpụrụ ibe ha ọnụ, ha ana-agwa ibe ha okwu ọjọọ, ma ọ bụ na-alụ ọgụ. Anyị kwesịkwara iji obi anyị niile na-agbaghara ndị ọzọ. Ọ bụrụ na mmadụ emejọọ anyị, anyị kwesịrị ịgbaghara ya ma kwụsị iburu ya iwe n’obi. Ka anyị nwee ike ịna-agbaghara onye ahụ kpamkpam, anyị ekwesịghị ịna-eche ihe ahụ onye ahụ mere anyị ka anyị ghara ‘ịgụkọrọ ya ihe ọjọọ.’ (1 Kọr. 13:4, 5) Ọ bụrụ na anyị eburu ihe ahụ n’obi, ọ ga-eme ka anyị na Jehova na ụmụnna anyị ghara ịna-adị ná mma.—Mat. 6:14, 15. w17.10 10 ¶14-15
Satọdee, Mach 16
Unu ga-amarakwa na ọ bụ Jehova nke ụsụụ ndị agha zitere m ka m bịakwute unu.—Zek. 6:15.
Olee uru ozi Zekaraya baara ndị Juu n’oge ahụ? Jehova ekwela ha nkwa na ọ ga-enyere ha aka ma chebe ha ka ha nwee ike iwucha ụlọ nsọ ahụ. Ihe a ọ gwara ha mere ka obi sie ha ike. Ma, ha ka nwere ike ịna-eche otú mmadụ ole na ole ga-esi rụchaa nnukwu ọrụ ahụ. N’ihi ya, Zekaraya gwara ha ihe ga-eme ka ha kwụsị ịtụ ụjọ na inwe obi abụọ. Chineke kwuru na ọtụtụ ndị ọzọ “ga-abịa soro wuo ụlọ nsọ Jehova,” tinyekwara Heldaị na Tobaịja na Jedeya bịara inyere ha aka. O doro ndị Juu anya na Jehova na-enyere ha aka n’ọrụ ahụ ha na-arụ. Ha ji obi ike maliteghachi iwu ụlọ nsọ ahụ, n’agbanyeghị na eze Peshia nyere iwu ka ha kwụsị ọrụ. Iwu a e nyere ha dị ka ugwu nọchiiri ha ụzọ, ma ọ dịghị anya Jehova ewepụ ya. N’ikpeazụ, e wuchara ụlọ nsọ ahụ n’afọ 515 Tupu Oge Ndị Kraịst. (Ezra 6:22; Zek. 4:6, 7) Ma, ihe ndị ahụ Jehova kwuru kọwara ihe na-eme n’oge a nke karịrị ụlọ nsọ ahụ ndị Juu wuru. w17.10 29 ¶17
Sọnde, Mach 17
Nwee obi ike . . . meekwa ihe.—1 Ihe 28:20.
E nyere Sọlọmọn ọrụ pụrụ iche. Jehova họọrọ ya ka ọ rụọrọ ya ụlọ nsọ na Jeruselem. Ụlọ a bụ otu n’ime ụlọ kachanụ a rụtụrụla. Ụlọ nsọ ahụ “ga-adị ebube nke ukwuu, maakwa mma pụrụ iche n’ala niile.” Ihe kacha mkpa bụ na ụlọ nsọ ahụ ga-abụ “ụlọ Jehova bụ́ ezi Chineke.” Jehova kwuru na Sọlọmọn ga-ahụ maka ihe ndị a ga-arụ. (1 Ihe 22:1, 5, 9-11) Obi siri Devid ike na Chineke ga-akwado Sọlọmọn. Ma, Sọlọmọn “bụ obere nwa, isi akabeghịkwa ya.” Ọ̀ ga-enwe obi ike ọ ga-eji rụọ ụlọ nsọ a? Obere nwa ọ bụ, nakwa isi na-akabeghị ya, ọ̀ ga-eme ka obi ghara isi ya ike ịrụ ụlọ nsọ ahụ? Ka Sọlọmọn nwee ike ịrụ ya, o kwesịrị inwe obi ike ma meekwa ihe. Ọ bụrụ na Sọlọmọn enweghị obi ike, ụjọ nwere ike ime ka ọ ghara ịmalite ịrụ ụlọ nsọ ahụ. Nke a kadị njọ karịa na ọ rụwara ya ma ọ rụchaghị ya. Anyị chọrọ ka Jehova nyere anyị aka inwe obi ike ma rụchaa ọrụ o nyere anyị otú ahụ o meere Sọlọmọn. w17.09 28 ¶1-2; 29 ¶4-5
Mọnde, Mach 18
Okwu Chineke anyị ga-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.—Aịza. 40:8.
Olee otú i chere ndụ gị gaara adị ma à sị na e nweghị Baịbụl? Ị gaaraghị enwe ihe ga na-eduzi gị kwa ụbọchị. Ị gaaraghịkwa amata eziokwu banyere Chineke, ndụ, nakwa ọdịnihu. Ị gaaraghị ama ihe Jehova meere ụmụ mmadụ n’oge gara aga. Obi dị anyị ụtọ na anyị ma ihe ndị a. Jehova enyela anyị Okwu ya, bụ́ Baịbụl. O kwekwara anyị nkwa na ihe Baịbụl kwuru ga-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. Pita onyeozi kwuru ihe e dere n’Aịzaya 40:8. N’agbanyeghị na amaokwu a ekwughị hoo haa banyere Baịbụl, ma ihe e dere na ya gbasara ihe ndị e kwuru na Baịbụl. (1 Pita 1:24, 25) Kemgbe ọtụtụ narị afọ, ndị mmadụ agbaala mbọ ịsụgharị Baịbụl ka o nwee ike iru onye ukwu na onye nta aka, n’agbanyeghị nsogbu kpụ ọkụ n’ọnụ e nyere ha. Ihe mere ha ji gbaa mbọ a bụ n’ihi na ọ bụ uche Chineke ka “a zọpụta ụdị mmadụ niile, ka ha nwetakwa ezi ihe ọmụma nke eziokwu.”—1 Tim. 2:3, 4. w17.09 18 ¶1-2
Tuzdee, Mach 19
Ị bụ nwunye ya. Olee otú m ga-esi mee oké ihe ọjọọ a wee mehie Chineke?—Jen. 39:9.
Ụdị ọnwụnwa ahụ bịaara Josef, abịakwarala ọtụtụ Ndị Kraịst na-eto eto. (Jen. 39:7) Chegodị gbasara otu nwa agbọghọ aha ya bụ Kim. Ọtụtụ ụmụ klas ya na-akwakarị iko. Ha bịa ụlọ akwụkwọ, ha na-akọ otú ha si kwaa iko ná ngwụcha izu. Ma, Kim enweghị nke ọ ga-akọ. O kwuru na ihe a mere ka ọ na-eche mgbe ụfọdụ na “a jụrụ ya ajụ.” O kwukwara na ụmụ klas ya na-ele ya anya ka onye iberiibe n’ihi na e nweghị onye ya na ya na-akpa. Ma, Kim ma na mgbe agụụ ịkwa iko na-aka agụ mmadụ bụ mgbe ọ na-eto eto. (2 Tim. 2:22) Ụmụ akwụkwọ ibe ya na-ajụkarị ya ma ọ̀ ka bụ nwa agbọghọ na-amaghị nwoke. Ọ na-eji oge ahụ ha na-ajụ ya ajụjụ a akọwara ha ihe mere na ya achọghị ịkwa iko. Anyị ji Ndị Kraịst na-eto eto kpebisiri ike na ha agaghị akwa iko eme ọnụ. Jehova jikwa ha eme ọnụ. w17.09 4 ¶8; 5 ¶10
Wenezdee, Mach 20
Ewela iwe naanị iji mee ihe ọjọọ.—Ọma 37:8.
Ndị na-ewe iwe ọkụ na-akparị mmadụ. O doro anya na ụdị àgwà a agaghị eme ka ezinụlọ na-enwe obi ụtọ. O nwere ezigbo ihe mere Baịbụl ji dọọ anyị aka ná ntị ka anyị hapụ iwe, okwu mkparị, na iti mkpu. (Efe. 4:31) Ọ dị mwute na ụdị àgwà ahụ na-akpata ọgụ. Ndị ụwa nwere ike were ya ka o nweghị ihe ọ bụ, ma ọ na-egosi na anyị anaghị asọpụrụ Onye kere anyị. Ọtụtụ agbanweela àgwà ọjọọ ha na-akpabu ma yikwasị mmadụ ọhụrụ ahụ. (Kọl. 3:8-10) Ịgha ụgha sokwa ná mmadụ ochie ahụ. Dị ka ihe atụ, ọtụtụ ndị na-agha ụgha ka ha ghara ịkwụ ụtụ isi ma ọ bụ ghara ịta ahụhụ ihe ha metara. Ma, Jehova bụ “Chineke nke eziokwu.” (Ọma 31:5) N’ihi ya, ọ chọrọ ka “onye ọ bụla” na-efe ya “na-agwa onye agbata obi ya eziokwu,” ghara ịna-agha “ụgha.” (Efe. 4:25; Kọl. 3:9) N’ihi ya, anyị kwesịrị ịna-ekwu eziokwu, a sịgodị na o nwere ike imechu anyị ihu ma ọ bụ siere anyị ike.—Ilu 6:16-19. w17.08 18 ¶3, 5; 20 ¶12-13, 15
Tọzdee, Mach 21
Okwu ya na-agbakwa oké ọsọ.—Ọma 147:15.
N’oge anyị a, Jehova na-eji Okwu ya bụ́ Baịbụl eduzi anyị. “Okwu ya na-agbakwa oké ọsọ,” nke pụtara na ọ na-eduzi anyị n’oge kwesịrị ekwesị. Chegodị uru ị na-erite n’ịgụ Baịbụl, n’ịmụ akwụkwọ ndị “ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche” na-ebipụtara anyị, n’ile Ihe Omume Tiivi anyị, n’ịga na jw.org, nakwa n’aka ndị okenye na ụmụnna ndị ọzọ. (Mat. 24:45) Ọ̀ bụ na ị hụbeghị otú Jehova si eduzi anyị n’oge kwesịrị ekwesị? Ọbụ abụ ahụ ma na Chineke meere ndị ya ihe ọma pụrụ iche. Ọ bụ naanị ha ka Chineke nyere “okwu” ya, “ụkpụrụ ya na mkpebi ikpe ya.” (Ọma 147:19, 20) Taa, otu n’ime ihe ọma Chineke meere anyị bụ na ọ bụ naanị anyị ka ọ kpọkwasịrị aha ya. Anyị ma Jehova. Okwu ya na-eduzikwa anyị. Ọ bụ ya mere anyị na ya ji dị ná mma. Ọ̀ bụ na i kwesịghị ịna-eme otú ahụ onye dere Abụ Ọma nke 147 mere, ya bụ, ‘ịna-eto Jaa,’ na-agwakwa ndị ọzọ ka ha mee otú ahụ? w17.07 20 ¶15-16; 21 ¶18
Fraịdee, Mach 22
Onye ọ bụla nke na-eje ozi dị ka onye agha adịghị etinye aka n’ọrụ ego a na-arụ ná ndụ, ka ihe ya wee masị onye debara aha ya dị ka onye agha.—2 Tim. 2:4.
Ihe karịrị otu nde ndị ozi oge niile ma ndị ọzọ na-eso ụzọ Jizọs taa na-agbalịsi ike ime ihe ahụ Pọl kwuru n’ihe mmụta dịịrị ụbọchị taa. Ha anaghị ekwe ka anyaukwu na ngwá ahịa ndị a na-akpọsa n’ụwa a megharịa ha anya. Ha na-echeta na Baịbụl kwuru, sị: ‘Onye gbaziiri ihe bụ ohu onye gbazinyere ya ihe.’ (Ilu 22:7) Setan chọrọ ka anyị jiri oge anyị niile na ike anyị niile na-agbara achụmnta ego ụwa a ohu. Ụfọdụ ihe ndị anyị na-eme nwere ike ime ka anyị koro ụgwọ ruo ọtụtụ afọ. Ụfọdụ ndị na-agbaziri nnukwu ego rụọ ụlọ, zụọ ụgbọala, gaa mahadum, ma ọ bụdị gbaa akwụkwọ. Anyị na-egosi na anyị nwere ezi amamihe ma anyị hapụ ibi ndụ ndị oké ozu, ghara iji ụgwọ na imefu ego aghara aghara. Anyị ga-enwe ike ịna-ejere Chineke ozi kama ịgbara achụmnta ego ụwa ochie a ohu.—1 Tim. 6:10. w17.07 10 ¶13
Satọdee, Mach 23
M . . . weere iwu niile i nyere banyere ihe niile dị ka nke ziri ezi; Akpọrọ m ụzọ okwu ụgha niile asị.—Ọma 119:128.
Jehova kwesịrị ịchị eluigwe na ụwa. Ọ na-ekpe ikpe ziri ezi. O kwuru, sị: “Mụ onwe m bụ Jehova, Onye na-egosi obiọma, na-ekpekwa ikpe ziri ezi ma na-eme ezi omume n’ụwa; n’ihi na ọ bụ ihe ndị a na-atọ m ụtọ.” (Jere. 9:24) Ọ naghị eji iwu ụmụ mmadụ na-ezughị okè mere ekpebi ihe ziri ezi na ihe na-ezighị ezi. Ọ na-eji uche ya amata ihe dị mma ọ ga-eme, jirikwa ya nye ụmụ mmadụ iwu ha ga na-erubere isi. Baịbụl kwuru na “ezi omume na ikpe ziri ezi bụ ntọala nke ocheeze” ya. N’ihi ya, ka obi sie anyị ike na iwu ya niile, ụkpụrụ ya, na ihe ndị o kpebiri ime ziri ezi. (Ọma 89:14) Setan agaghị emeli ka ikpe ziri ezi dịrị n’ụwa n’agbanyeghị na o kwuru na otú Jehova si achị adịghị mma. w17.06 28 ¶5
Sọnde, Mach 24
Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova, . . . okwu gị [bụ] eziokwu.—2 Sam. 7:28.
Jehova bụ Chineke eziokwu. (Ọma 31:5) Ebe ọ bụ Nna na-emesapụ aka, ọ na-akụziri ndị na-atụ egwu ya eziokwu ndị a. Malite mgbe mbụ anyị nụrụ eziokwu a, anyị amụtala ọtụtụ eziokwu n’Okwu ya bụ́ Baịbụl, n’akwụkwọ ndị a na-ebipụtara anyị, ná mgbakọ nakwa n’ọmụmụ ihe anyị na-aga kwa izu. Ka oge na-aga, anyị enwetala ihe Jizọs kpọrọ “ụlọ akụ̀,” bụ́ ebe anyị na-edokọta eziokwu niile anyị mụtara, ma ndị ọhụrụ ma ndị ochie. (Mat. 13:52) Jehova ga-enyere anyị aka ịna-etinyekwu eziokwu ọhụrụ ndị anyị mụtara “n’ụlọ akụ̀” anyị ma ọ bụrụ na anyị ana-achọ ha ka akụ̀ zoro ezo. (Ilu 2:4-7) Olee otú anyị ga-esi eme ya? Anyị kwesịrị ịna-amụ ihe nke onwe anyị ma na-eme ezigbo nchọnchọ n’Okwu Chineke nakwa n’akwụkwọ anyị. Ọ ga-enyere anyị aka ịmụta eziokwu “ndị dị ọhụrụ,” bụ́ ndị anyị na-amabughị. (Jọsh. 1:8, 9; Ọma 1:2, 3) N’eziokwu, o kwesịrị ịna-agụsi anyị agụụ ike ịmụtakwu eziokwu Baịbụl anyị ga-etinye n’ụlọ akụ̀ anyị. w17.06 12 ¶13-14
Mọnde, Mach 25
Unu ga-akpọku m, bịakwa kpekuo m ekpere, m ga-egekwa unu ntị.—Jere. 29:12.
Otu nwanna na-alụbeghị nwaanyị kọọrọ otu okenye lụrụla nwaanyị ihe na-echegbu ya. Ọ nọ na-eche gbasara 1 Ndị Kọrịnt 7:28, bụ́ ebe kwuru, sị: “Ndị lụrụ [di ma ọ bụ nwunye] ga-enwe mkpagbu n’anụ ahụ́ ha.” Ọ jụrụ okenye ahụ, sị: “Gịnị bụ ‘mkpagbu’ a? Olee otú m ga-esi emeri ya ma m lụọ nwaanyị?” Tupu okenye ahụ azaa ajụjụ ahụ, o bu ụzọ gwa nwanna ahụ ka o chebara ihe ọzọ Pọl onyeozi kwuru echiche. Pọl kwuru na Jehova bụ “Chineke nke nkasi obi, . . . onye na-akasi anyị obi ná mkpagbu anyị niile.” (2 Kọr. 1:3, 4) N’eziokwu, Jehova bụ Nna hụrụ anyị n’anya. Ọ na-akasikwa anyị obi mgbe ọnwụnwa bịaara anyị. O nwere ike ịbụ na e nweela mgbe ụfọdụ Chineke ji Okwu ya nyere gị aka ma duzie gị. Obi kwesịrị isi anyị ike na ọ chọrọ ka ihe gaziere anyị otú ahụ ọ chọkwara ka ọ gaziere ndị fere ya n’oge gara aga.—Jere. 29:11. w17.06 4 ¶1-2
Tuzdee, Mach 26
Jehova na-eche ndị mbịarambịa nche.—Ọma 146:9.
Ọ bụghị naanị uwe na nri ka e kwesịrị inye ụmụnna gbatara ọsọ ndụ. E kwesịrị ime ka obi na-adị ha mma, jirikwa Baịbụl na-agba ha ume. (Mat. 4:4) Ndị okenye nwere ike inyere ha aka ka ha na-enweta akwụkwọ anyị n’asụsụ ha, nyekwara ha aka ịchọta ụmụnna ndị na-asụ asụsụ ha. Ọtụtụ ndị gbara ọsọ ndụ hapụrụ ndị ikwu na ibe ha, ndị obodo ha, na ndị ọgbakọ ha, bụ́ ndị ha na ha dị n’ezigbo mma. Ụmụnna kwesịrị ime ka ha ghọta na Jehova hụrụ ha n’anya ma na-enwere ha ọmịiko. Ma ọ́ bụghị ya, ha nwere ike chọwa ka ndị ikwu ha ma ọ bụ ndị obodo ha na-abụghị Ndịàmà Jehova nyere ha aka. (1 Kọr. 15:33) Anyị mee ka obi ruo ha ala n’ọgbakọ, ọ pụtara na anyị so Jehova “na-eche ndị mbịarambịa nche.” Ndị gbara ọsọ ndụ nwere ike ha agaghị alaghachili n’obodo ha mgbe ndị na-emegide ha ka nọ n’ọchịchị. Ihe ọzọ bụ na obi na-amapụ ọtụtụ n’ime ha n’ihi ihe ndị ha hụrụla. Jụọ onwe gị, sị: ‘Ọ bụrụ na m bụ ha, gịnị ka m ga-achọ ka e meere m?’—Mat. 7:12. w17.05 6 ¶15-16
Wenezdee, Mach 27
Ịhụnanya nke ndị ka n’ọnụ ọgụgụ ga-ajụkwa oyi.—Mat. 24:12.
Anyị daa mbà n’obi, o nwere ike ime ka okwukwe anyị ghara isi ike, ya emezie ka ịhụnanya anyị nwere n’ebe Chineke nọ ghara isi ike. Mgbe ụfọdụ, anyị niile na-enwe nsogbu ndị nwere ike ime ka ike gwụ anyị n’ụwa a Ekwensu na-achị. (1 Jọn 5:19) O nwere ike ịbụ na nká, ọrịa, ma ọ bụ ụkọ ego emeela ka anyị na nsogbu na-alụ ugbu a. Anyị nwekwara ike ịna-eche na e nweghị ihe anyị dị mma ya, ma ọ bụkwanụ ya abụrụ na anyị enwetaghị ihe anyị tụrụ anya ya. Ma, anyị ekwesịghị ikwe ka ihe ndị ahụ mee ka anyị chee na Jehova ahapụla anyị. Kama, anyị kwesịrị ịtụgharị uche n’okwu na-agba ume e kwuru gbasara ịhụnanya Jehova na-anaghị ada ada. E dere ụfọdụ n’ime ha n’akwụkwọ Abụ Ọma 136:23, bụ́ ebe sịrị: “Onye chetara anyị mgbe e wedara anyị ala: n’ihi na obiọma ya [ma ọ bụ ịhụnanya ya na-adịghị ada ada] na-adịru mgbe ebighị ebi.” N’eziokwu, ịhụnanya Jehova nwere n’ebe ndị ohu ya nọ anaghị ada ada. N’ihi ya, obi kwesịrị isi anyị ike na ọ na-anụ “arịrịọ” anyị, na-emekwara anyị ihe anyị rịọrọ ya.—Ọma 116:1; 136:24-26. w17.05 18 ¶8
Tọzdee, Mach 28
Ọ bụrụ na unu adịghị agbaghara ndị mmadụ njehie ha, Nna unu agaghịkwa na-agbaghara unu njehie unu.—Mat. 6:15.
Dị ka e kwuru ná Ndị Galeshia 2:11-14, Pita tụrụ egwu mmadụ. (Ilu 29:25) N’agbanyeghị na ọ ma otú Jehova si ele ndị Jentaịl anya, ọ tụrụ ụjọ ihe ụmụnna bụ́ ndị Juu nọ na Jeruselem ga-eche. Pọl onyeozi nọ n’Antiọk ebe ahụ gwa Pita na ọ bụ onye ihu abụọ. (Ọrụ 15:12; Gal. 2:13) Pita weturu obi nara ndụmọdụ ahụ Pọl nyere ya. Baịbụl ekwughị na a napụrụ Pita ihe ùgwù ndị o nwere n’ọgbakọ. Nke bụ́ eziokwu bụ na Chineke mechara nye ya mmụọ nsọ ide akwụkwọ abụọ dị na Baịbụl. Jizọs bụ́ onyeisi ọgbakọ ka jikwa ya na-arụ ọrụ. (Efe. 1:22) Ọ bụrụ na ndị nọ n’ọgbakọ agbaghara Pita, ọ ga-egosi na ha na-eṅomi Jizọs na Nna ya. Ọ ga-abụrịrị na o nweghị onye kwere ka ihe ahụ mmadụ na-ezughị okè mejọrọ mee ka ọ sụọ ngọngọ. w17.04 27 ¶16-18
Fraịdee, Mach 29
Site n’ime ka obodo Sọdọm na Gọmọra ghọọ ntụ, [Chineke] mara ha ikpe, mee ka ha ghọọrọ ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke n’ọdịnihu ihe atụ.—2 Pita 2:6.
Mgbe Jehova bibiri ebe ndị ahụ niile, ihe o mere abụghị naanị ikpochapụ ihe ọjọọ ndị a na-eme na ha. O mere ka mbibi ahụ “ghọọrọ ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke n’ọdịnihu ihe atụ.” Otú ahụ Jehova si kpochapụ ihe ọjọọ niile a na-eme n’oge ahụ ka ọ ga-ekpochapụkwa àgwà ọjọọ niile taa mgbe ọ ga-ekpe ụwa ochie a ikpe. Gịnị ka a ga-eji dochie àgwà ọjọọ? N’ụwa ọhụrụ, anyị ga na-arụ ọtụtụ ihe ga na-eme anyị obi ụtọ. Chegodị ụdị obi ụtọ anyị ga-eji na-arụ ọrụ ka ụwa ghọọ paradaịs ma ọ bụ na-arụ ụlọ, ma nke anyị ma nke ndị anyị hụrụ n’anya. Chegodị otú ọ ga-adị gị mgbe ị ga na-anabata ọtụtụ nde ndị a kpọlitere n’ọnwụ ma na-akụziri ha ihe Jehova chọrọ ka ha na-eme nakwa ihe ndị o meere ụmụ mmadụ. (Aịza. 65:21, 22; Ọrụ 24:15) E nwere ọtụtụ ihe anyị ga na-arụ ga-eme ka ọṅụ ju anyị obi, meekwa ka a na-eto Jehova. w17.04 12 ¶11-12
Satọdee, Mach 30
Onye ọ bụla pụtaranụ, onye si n’ọnụ ụzọ ụlọ m pụta . . . ga-aghọ nke Jehova.—Ikpe 11:31.
Mgbe Jefta na-ekwe nkwa a, o nwere ike ịbụ na ọ ma na ọ bụ nwa ya nwaanyị ga-esi n’ụlọ ya pụta izute ya. Ma, ọ dịghịrị Jefta na ada ya mfe imezu nkwa ahụ. Ọ ga-efu ha oké ihe. Mgbe Jefta hụrụ ada ya, ọ “dọwara uwe ya,” kwuokwa na obi agbawaala ya. Ada ya ‘kwaara ọnọdụ ya dị ka nwa agbọghọ na-amaghị nwoke ákwá.’ Maka gịnị? Jefta enweghị nwa nwoke. Naanị otu nwa nwaanyị ọ mụtara agaghị alụ di, nke o ji amụtara ya ụmụ ụmụ. O nweghị onye ga-amụta nwa ga-aza aha ya ma ọ bụ keta ihe ya. Ma, ọ bụghị ihe ndị a bụ ihe kacha Jefta na ada ya mkpa. Jefta sịrị: “Mụ onwe m emegheworo Jehova ọnụ m, enweghịkwa m ike ịgbanwe ihe m kwuru.” Ada ya kwukwara, sị: “Mee m ihe si n’ọnụ gị pụta.” (Ikpe 11:35-39) Ha abụọ na-erubere Chineke isi. Ha agaghị echewe otú ha ga-esi ghara imezu nkwa ha kwere Chineke, bụ́ Onye Kasị Elu, n’agbanyeghị ihe ọ ga-efu ha.—Diut. 23:21, 23; Ọma 15:4. w17.04 4 ¶5-6
Sọnde, Mach 31
M ga na-ele anya Jehova.—Maị. 7:7.
E megburu Josef ọtụtụ ugboro. Nke mbụ bụ na ụmụnne ya rere ya ka ọ gaa gbawa ohu mgbe ọ dị ihe dị ka afọ iri na asaa. E mechara bo ya ebubo na ọ chọrọ idina nwunye nna ya ukwu n’ike, nke mere ka a tụọ ya mkpọrọ. (Jen. 39:11-20; Ọma 105:17, 18) Ọ dịzi ka à tara Josef ahụhụ n’ihi ezi omume ya kama ịgọzi ya. Ma, mgbe afọ iri na atọ gachara, ihe niile gbanwere. A kpọpụtara ya n’ụlọ mkpọrọ, mee ya onye na-esote eze Ijipt. (Jen. 41:14, 37-43; Ọrụ 7:9, 10) Mmegbu e megburu Josef ò mere ka ọsụkọsụ na-asụ ya? Ọ̀ dị ya ka Jehova ọ̀ hapụla ya? Mbanụ. Gịnị nyeere Josef aka iji ndidi chere? Ọ bụ ịtụkwasị Jehova obi. Ọ ghọtara otú Jehova si hazie ihe niile. Ihe ọ gwara ụmụnne ya gosiri na ọ bụ eziokwu. Ọ sịrị ha: “Unu onwe unu buuru m ihe ọjọọ n’obi. Chineke bu n’obi ka ọ bụrụ ihe ọma ka o wee mee ihe dị ka ọ dị taa iji chebe ọtụtụ mmadụ ndụ.” (Jen. 50:19, 20) Josef mechara ghọta na ichere Jehova bara ezigbo uru. w17.08 4 ¶6; 6 ¶12-13