Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • es19 p. 37-46
  • Eprel

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Eprel
  • Inyocha Akwụkwọ Nsọ Kwa Ụbọchị—2019
  • Isiokwu Nta
  • Mọnde, Eprel 1
  • Tuzdee, Eprel 2
  • Wenezdee, Eprel 3
  • Tọzdee, Eprel 4
  • Fraịdee, Eprel 5
  • Satọdee, Eprel 6
  • Sọnde, Eprel 7
  • Mọnde, Eprel 8
  • Tuzdee, Eprel 9
  • Wenezdee, Eprel 10
  • Tọzdee, Eprel 11
  • Fraịdee, Eprel 12
  • Satọdee, Eprel 13
  • Sọnde, Eprel 14
  • Mọnde, Eprel 15
  • Tuzdee, Eprel 16
  • Wenezdee, Eprel 17
  • Tọzdee, Eprel 18
  • Ụbọchị Ncheta Ọnwụ Jizọs
    Mgbe Anyanwụ Dachara
    Fraịdee, Eprel 19
  • Satọdee, Eprel 20
  • Sọnde, Eprel 21
  • Mọnde, Eprel 22
  • Tuzdee, Eprel 23
  • Wenezdee, Eprel 24
  • Tọzdee, Eprel 25
  • Fraịdee, Eprel 26
  • Satọdee, Eprel 27
  • Sọnde, Eprel 28
  • Mọnde, Eprel 29
  • Tuzdee, Eprel 30
Inyocha Akwụkwọ Nsọ Kwa Ụbọchị—2019
es19 p. 37-46

Eprel

Mọnde, Eprel 1

O nyere onyinye n’ụdị mmadụ.—Efe. 4:8.

Olee otú anyị ga-esi rite uru n’ọrụ ndị okenye na-arụ? Otu ụzọ bụ iṅomi okwukwe na àgwà ọma ha. Ụzọ ọzọ bụ ige ntị na ndụmọdụ ha si n’Akwụkwọ Nsọ na-enye anyị. (Hib. 13:7, 17) Cheta na ndị okenye hụrụ anyị n’anya ma na-achọ ka anyị na Jehova dịrị ná mma. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na ha achọpụta na anyị anaghịzi abịachi ọmụmụ ihe anya, ma ọ bụkwanụ na ịnụ ọkụ n’obi anyị ajụwala oyi, ha ga-eme ihe ozugbo ka ha nyere anyị aka. Ha ga-ege anyị ntị ma gbalịa gbaa anyị ezigbo ume. Ha ga-ejikwa Akwụkwọ Nsọ nye anyị ndụmọdụ. Ị̀ na-ele aka a ha na-enyere anyị anya ka ihe na-egosi na Jehova hụrụ gị n’anya? Cheta na o nwere ike ọ gaghị adịchara ndị okenye mfe ịbịakwute anyị nye anyị ndụmọdụ. Ma, olee ihe i nwere ike ime ka ihe dịrị ndị okenye nọ n’ọgbakọ unu mfe? Ọ bụ ịdị umeala n’obi, ịna-ekele ha maka ihe ha na-eme, nakwa ime ka ọ dịrị ndị ọzọ mfe ịgwa gị okwu. Were aka ha na-enyere gị ka ihe na-egosi na Chineke hụrụ gị n’anya. Nke a ga-abara gị uru, meekwa ka ha jirikwuo obi ụtọ na-arụ ọrụ ha. w18.03 31 ¶15-16

Tuzdee, Eprel 2

Mara ihe, nwa m, wee mee ka obi m ṅụrịa, ka m wee zaa onye na-akwa m emo okwu.—Ilu 27:11.

Nwatakịrị nke ọ bụla dị iche n’ibe ya. Ụfọdụ na-aghọta eziokwu, na-eme ezigbo mkpebi, ma chọọ ka e mee ha baptizim mgbe ahụ ha ka na-eto eto. Ndị ọzọ nwere ike ha agaghị adị njikere ime baptizim ruo mgbe ha tolitere. Ndị nne na nna ma ihe anaghị amanye ụmụ ha ka ha mee baptizim. Kama, ha na-enyere nwa ha nke ọ bụla aka ịna-eme nke ọma n’ọgbakọ otú ike kwere ya. Obi ga-atọ ndị nne na nna ụtọ ma nwa ha kpaa àgwà otú a ihe mmụta dịịrị ụbọchị taa na-ekwu. Ma, ha ekwesịghị ichefu na ihe bụ mkpa ha bụ ime ka ụmụ ha ghọọ ndị na-eso ụzọ Jizọs. N’ihi ya, ha kwesịrị ịjụ onwe ha ajụjụ a, ‘Nwa m ọ̀ mụtala ọtụtụ ihe na Baịbụl nke ga-eme ka o nyefee Chineke onwe ya, e meekwa ya baptizim?’ w18.03 9 ¶6

Wenezdee, Eprel 3

Ọ bụrụ na ọ ṅụọ iyi nke pụrụ iwetara ya nsogbu, ọ dịghị agbanwe ya.—Ọma 15:4.

Ọ bụrụ na anyị ekweta ịga na nke onye kpọrọ anyị ka anyị bịa na nke ya, anyị ekwesịghị ịkagbu ya n’ihi ihe na-enweghị isi na ọdụ. O nwere ike ịbụ na onye kpọrọ anyị akwadebechaala ihe ọ chọrọ iji ele anyị ọbịa, mbọ niile ọ gbara nwere ike ifu ọhịa ma anyị sị na anyị agaghị abịazi. (Mat. 5:37) Ụfọdụ akagbuola òkù a kpọrọ ha n’ihi na ha chọrọ ịga nke ha chere ka ya mma. I mee otú ahụ, ò gosiri na ị hụrụ onye ahụ n’anya ma na-akwanyere ya ùgwù? Kama, anyị kwesịrị ịga ma gosi na obi dị anyị ụtọ maka ihe ọ bụla ọ ga-enye anyị. (Luk 10:7) E nwee ihe ga-eme ka anyị ghara ịga, anyị kwesịrị ịgwa onye ahụ ozugbo iji gosi na anyị hụrụ ya n’anya ma na-eche banyere ya. Anyị kwesịkwara ịkwanyere omenala obodo anyị bi na ya ùgwù. N’obodo ụfọdụ, e nwee oriri, a na-anabata ndị a na-akpọghị akpọ. N’ebe ọzọ, ha na-achọ ka a kpọọ mmadụ akpọọ tupu ya abịa. E nwere ebe a na-achọ ka ndị mmadụ meda obi gwa ndị kpọrọ ha na ha agaghị abịa na nke mbụ ma ọ bụ nke abụọ a kpọrọ ha, ma nwee ebe a na-ewere ya ka mkparị ma onye ahụ jụ ịbịa na nke mbụ a kpọrọ ya. Ka anyị gbalịa hụ na obi tọrọ onye kpọrọ anyị bịa na nke ya ụtọ. w18.03 18 ¶20-21

Tọzdee, Eprel 4

Ka anyị jisie ike ruo ntozu okè.—Hib. 6:1.

Cheta na ịma Baịbụl nke ọma abụghị naanị ihe ga-eme ka mmadụ jiri ofufe Chineke kpọrọ ihe. (1 Eze 4:29, 30; 11:4-6) Ma, e wezụga ịma Baịbụl nke ọma, olee ihe ọzọ anyị kwesịrị ime? Anyị kwesịrị ịna-eme ka okwukwe anyị sie ezigbo ike. (Kọl. 2:6, 7) Otu ihe dị mkpa anyị ga-eme bụ ịmụ akwụkwọ “Nọrọnụ n’Ịhụnanya Chineke.” Ịmụcha akwụkwọ a ga-enyere gị aka ịmata otú ị ga-esi na-eme ihe Baịbụl kwuru ná ndụ gị. Ọ bụrụ na ị mụchaala akwụkwọ a, ì nwere ike ịmụ akwụkwọ anyị ndị ọzọ ga-enyere gị aka ime ka okwukwe gị sikwuo ike? (Kọl. 1:23) Ị̀ na-echebara ihe ndị ị na-agụ echiche ma na-arịọ Jehova ka o nyere gị aka ịmata otú ị ga-esi eme ha eme? Cheta na mgbe anyị na-agụ Baịbụl ma na-echebara ihe ndị anyị gụrụ echiche, mkpa anyị kwesịrị ịbụ ka anyị jiri obi anyị niile na-eme uche Chineke. (Ọma 40:8; 119:97) Anyị na-amụtakwa otú anyị ga-esi agbara ihe ọ bụla nwere ike ime ka okwukwe anyị ghara isi ike, ọsọ.—Taị. 2:11, 12. w18.02 24-25 ¶7-9

Fraịdee, Eprel 5

[Noa] wee ghọọ onye nketa nke ezi omume ahụ nke dị dị ka okwukwe si dị.—Hib. 11:7.

Ka anyị nwee ike inwe okwukwe ka Noa, anyị ga na-amụchi Okwu Chineke anya, kwe ka ihe ndị anyị na-amụta ruo anyị n’obi, jiri ya na-emezi ndụ anyị, jirikwa ya na-eme mkpebi ndị dị mma. (1 Pita 1:13-15) Okwukwe na amamihe Chineke ga-emezi ka Setan ghara iji aghụghọ ya nwata anyị, meekwa ka anyị ghara ịkpawa àgwà ka ndị ụwa. (2 Kọr. 2:11) Ime ihe ike na omume rụrụ arụ na-atọ ọtụtụ ndị ụtọ, ha na-emekwa ihe na-agụ anụ ahụ́ ha agụụ. (1 Jọn 2:15, 16) Ihe ọjọọ ndị a juru n’ụwa nwedịrị ike ime ka ndị okwukwe ha na-esighị ike leghara ihe ndị na-egosi na ụbọchị Chineke dị nso, anya. Cheta na mgbe Jizọs ji oge anyị a tụnyere oge Noa, o kwughị gbasara ime ihe ike na omume rụrụ arụ ndị mmadụ na-eme, kama, o kwuru gbasara ihe ndị nwere ike ịdọpụ mmadụ uche n’ofufe Chineke. (Mat. 24:36-39) Jụọ onwe gị, sị: ‘Ihe ndị m na-eme, hà na-egosi na m ma Jehova nke ọma? Okwukwe m ọ̀ na-eme ka m na-akpa àgwà otú Chineke chọrọ ma na-akọrọ ya ndị ọzọ?’ Ihe ndị ị zara ga-enyere gị aka ịmata ma ì ‘so ezi Chineke na-eje ije’ ka Noa.—Jen. 6:9. w18.02 9-10 ¶8-10

Satọdee, Eprel 6

Zere ndị dị otú a.—2 Tim. 3:5.

Ma anyị agaghị ezereli ndị na-akpa àgwà ọjọọ kpamkpam. Anyị na ha nwere ike ịna-arụkọ ọrụ, na-agakọ akwụkwọ ma ọ bụ biri n’otu ebe. Ma anyị ekwesịghị ịna-eche echiche ma ọ bụ na-eme ihe ka ha. Ihe ga-enyere anyị aka bụ ịna-amụchi Baịbụl anya nakwa anyị na ndị hụrụ Jehova n’anya ịna-akpachi anya. Anyị kwesịrị ịgbalị ka anyị na-enyere ndị ọzọ aka ka ha bịa fewe Jehova. Na-achọ ohere ị ga-eji ezi ozi ọma, na-arịọkwa Jehova ka o nyere gị aka ikwu ihe kwesịrị ekwesị nakwa n’oge kwesịrị ekwesị. Anyị kwesịrị ime ka ndị mmadụ mara na anyị bụ Ndịàmà Jehova. Anyị mee ya, àgwà ọma anyị ga-eme ka ha too Chineke, ọ bụghị anyị. Jehova akụzierela anyị ka anyị “jụ asọpụrụghị Chineke na ọchịchọ nke ụwa, ka anyị na-ebikwa ndụ n’uche zuru okè na ezi omume na nsọpụrụ Chineke n’ime usoro ihe dị ugbu a.” (Taịtọs 2:11-14) Ọ bụrụ na anyị ana-eme ka Jehova, ndị ọzọ ga-ahụ ya. Ha nwedịrị ike ikwu, sị: “Anyị ga-eso unu, n’ihi na anyị anụwo na Chineke nọnyeere unu.”—Zek. 8:23. w18.01 31 ¶17-18

Sọnde, Eprel 7

Ndị mmadụ ga-abụ ndị hụrụ naanị onwe ha n’anya.—2 Tim. 3:2.

Ọ̀ dị njọ anyị ịhụ onwe anyị n’anya? Mba. Anyị kwesịrị ịhụ onwe anyị n’anya. Jehova kere anyị ka anyị hụ onwe anyị n’anya. Jizọs kwuru, sị: “Hụ onye agbata obi gị n’anya dị ka onwe gị.” (Mak 12:31) Ọ bụrụ na anyị ahụghị onwe anyị n’anya, anyị agaghị ahụ ndị agbata obi anyị n’anya. Baịbụl gwakwara anyị, sị: “Ndị bụ́ di kwesịrị ịdị na-ahụ nwunye ha n’anya dị ka ahụ́ nke ha. Onye hụrụ nwunye ya n’anya hụrụ onwe ya n’anya, n’ihi na ọ dịghị onye kpọtụworo anụ ahụ́ ya asị; kama ọ na-azụ ya, na-elekọtakwa ya.” (Efe. 5:28, 29) N’ihi ya, anyị kwesịrị ịhụ onwe anyị n’anya. Ịhụnanya e kwuru okwu ya na 2 Timoti 3:2 adịghị mma. Ọ bụ mmadụ ịchọ ihe ga-abara naanị onwe ya uru. Ndị hụrụ onwe ha n’anya gabiga ókè na-eche gbasara onwe ha karịa otú ha kwesịrị iche. (Rom 12:3) Ihe bụ́ mkpa ha bụ onwe ha. Ha achọchaghị ịma gbasara ndị ọzọ. Ọ bụrụ na ha mejọọ ihe, ha na-ata ndị ọzọ ụta, kama ikweta na ha mejọrọ ihe. Ụdị ndị ahụ anaghị enwe ezigbo obi ụtọ. w18.01 23 ¶4-5

Mọnde, Eprel 8

Gosikwanụ na unu bụ ndị nwere ekele.—Kọl. 3:15.

Mgbe anyị na-amụ Baịbụl, anyị na-ege Jehova ntị. Mgbe anyị na-ekpekwa ekpere, anyị na-agwa ya okwu. Onye Kraịst ekwesịghị iwere ekpere ka ihe ọ na-eme iji mezuo iwu ma ọ bụ ihe ọ ga na-eme ka ihe na-agaziri ya. Kama, ọ bụ otú anyị si agwa Onye kere anyị okwu. Jehova chọrọ ịnụ olu anyị. (Fil. 4:6) Mgbe ị na-echegbu onwe gị n’ihi otu ihe ma ọ bụ ihe ọzọ, Baịbụl kwuru ka ị “tụkwasị Jehova ibu arọ gị.” (Ọma 55:22) Ì kwetara n’ihe a Baịbụl kwuru? Ọtụtụ nde ụmụnna ga-agwa gị na ihe a Baịbụl kwuru enyerela ha aka. O nwekwara ike inyere gị aka. Ma, anyị ekwesịghị ikpe ekpere naanị mgbe anyị chọrọ ka Jehova nyere anyị aka. Mgbe ụfọdụ, anyị nwere ike na-echegbu onwe anyị banyere nsogbu anyị nke na anyị agaghị echeta ihe ọma niile Jehova meerela anyị. N’ihi ya, gbalịa mee ihe a. N’ụbọchị ọ bụla, chee ma ọ̀ dịkarịa ala ihe atọ Jehova meerela gị, ma kelee ya maka ihe ndị ahụ. w17.12 25-26 ¶10-11

Tuzdee, Eprel 9

Ọ bụ malite n’oge ị bụ nwa ọhụrụ ka ị maara ihe odide ndị ahụ dị nsọ, bụ́ ndị nwere ike ime ka ị mara ihe iji nweta nzọpụta.—2 Tim. 3:15.

Ọtụtụ puku ndị anyị na-amụrụ Baịbụl na-enyefe Jehova onwe ha, e meekwa ha baptizim. Ọtụtụ n’ime ha bụ ndị na-eto eto a mụrụ n’ọgbakọ ma ha kpebiri iji ndụ ha na-eme ihe bara uru. (Ọma 1:1-3) Ọ bụrụ na ị bụ nne ma ọ bụ nna bụ́ Onye Kraịst, o doro anya na ị na-atụsi anya ụbọchị a ga-eme nwa gị baptizim, ike. (Tụlee 3 Jọn 4.) Ebe ị bụ nne ma ọ bụ nna bụ́ Onye Kraịst, ị chọrọ ka nwa gị mara ihe odide ndị ahụ dị nsọ. Taa, ha bụ Akwụkwọ Nsọ Hibru na Akwụkwọ Nsọ Grik. Obere ụmụaka nwere ike ịmụta banyere ndị a kọrọ akụkọ ha na Baịbụl nakwa akụkọ ndị a kọrọ na Baịbụl. Nzukọ Jehova ewepụtarala anyị ọtụtụ ihe ndị nne na nna nwere ike iji na-akụziri ụmụ ha ihe. Nwa gị kwesịrị ịma ihe Baịbụl na-ekwu ka ya na Jehova nwee ike ịdị n’ezigbo mma. w17.12 18 ¶1; 19 ¶4

Wenezdee, Eprel 10

Di bụ isi nke nwunye ya.—Efe. 5:23.

Ọ bụrụ na ị bụ nwunye, ọ̀ na-adị gị ka di gị na-anaghị efe Jehova anaghị eleta gị anya nke ọma? I nwere ike iwe iwe, gị na ya arụwa ụka, ma nke a ò nwere ike ime ka ihe ka mma? Ọ bụrụgodị na ị gbalịa mee ka okwu bie n’ọnụ gị, ị̀ ga-eme ka ọ bata n’ọgbakọ? O nwere ike ọ gaghị eme. Ma, ọ bụrụ na ị sọpụrụ di gị n’ihi na ọ bụ ya bụ onyeisi ezinụlọ, ị ga-eme ka udo dị n’ezinụlọ, meekwa ka i too Jehova. O nwedịrị ike ime ka di gị bata n’ọgbakọ, unu abụọ enwetakwa ihe ahụ a na-agbata n’ọsọ. (1 Pita 3:1, 2) Ọ bụrụkwanụ na ị bụ di, ọ̀ na-adị gị ka nwunye gị na-anaghị efe Jehova anaghị akwanyere gị ùgwù? Ọ bụrụ na ị na-abara ya mba iji gosi na ị bụ onyeisi, nke a ọ̀ ga-eme ka ọ kwanyewara gị ùgwù? Mbanụ. Chineke chọrọ ka ị bụrụ ezigbo di na-eṅomi Jizọs. Jizọs, bụ́ onyeisi ọgbakọ Ndị Kraịst hụrụ ha n’anya ma na-enwere ha ndidi. (Luk 9:46-48) Ọ bụrụ na di ana-eme ka Jizọs, ka oge na-aga, nwunye ya nwere ike ịbata n’ọgbakọ. w17.11 28-29 ¶13-14

Tọzdee, Eprel 11

Onye rụrụ ihe niile bụ Chineke.—Hib. 3:4.

Ndị na-eche echiche ka ndị ụwa anaghị eji ihe Jehova kwuru kpọrọ ihe. Ọ bụrụ na anyị akpachaghị anya, o nwere ike ịkpa okwukwe anyị aka ọjọọ. Taa, anyị na-ahụ otú ndị ụwa si eche echiche. Anyị na-ahụ ya na tiivi, n’Ịntanet, n’ebe anyị na-arụ ọrụ, ma ọ bụ n’ụlọ akwụkwọ. N’ọtụtụ obodo, ọtụtụ ndị na-ekwu na ha ekweghị na Chineke. Ha na-ele onwe ha anya na o nweghị ihe gbasara ha na chọọchị. O nwere ike ịbụ na ha anaghị eche echiche ma Chineke ọ̀ dị. O nwekwara ike ịbụ na ha na-eche na ha nweere onwe ha ime ihe ọ bụla masịrị ha. (Ọma 10:4) E nwekwara ndị nwere ike ịna-eche na ndị ọzọ ga-ewere ha ka ndị ma ihe ma ha kwuo, sị: “Enwere m ike inwe àgwà ọma ọ bụrụgodị na ekweghị m na Chineke.” Ọ̀ dị mma ikwere na e nweghị Onye kere ihe niile? Mmadụ nwere ike ịnọ ná mgbagwoju anya ma ọ chọọ isi n’aka ndị sayensị mata ma è nwere Onye kere ihe niile n’ihi ọtụtụ ihe ndị sayensị na-akụzi. Ma, nke bụ́ eziokwu bụ na azịza ya dị mfe. Ọ bụrụ na ụlọ nwere onye rụrụ ya, ihe ndị dị ndụ karịrị ụlọ, nwekwara onye kere ha. w17.11 20-21 ¶2-4

Fraịdee, Eprel 12

E wee malite ide akwụkwọ ncheta n’ihu ya maka ndị na-atụ egwu Jehova nakwa maka ndị na-echebara aha ya echiche.—Mal. 3:16.

Ọ dị mma ka anyị chebara ihe mere anyị ji kwesị ịga Ncheta Ọnwụ Jizọs echiche. Cheta na ọmụmụ ihe anyị na-aga bụ otu ụzọ anyị si efe Chineke. Ncheta Ọnwụ Jizọs bụ ọmụmụ ihe kacha mkpa n’afọ. O doro anya na Jehova na Jizọs na-ahụ onye ọ bụla na-agba mbọ aga ya. Anyị chọrọ ka ha mara na anyị ga-agbalịsi ike ịga ya, ọ gwụkwala ma ò nwere ihe karịrị anyị ike ga-egbochi anyị ịga ya. Ọ bụrụ na anyị egosi na anyị ji ọmụmụ ihe anyị kpọrọ ihe, ọ ga-abụ ihe ọzọ Jehova ga-eji maka ya hapụ aha anyị ‘n’akwụkwọ ncheta,’ ya bụ, “n’akwụkwọ nke ndụ.” Akwụkwọ a bu aha ndị niile Jehova chọrọ inye ndụ ebighị ebi. (Mkpu. 20:15) Ncheta Ọnwụ Jizọs ruwe, anyị nwere ike iwepụta oge na-ekpesi ekpere ike, ma na-echebara otú adịm ná mma anyị na Jehova siruru n’ike echiche.—2 Kọr. 13:5. w18.01 13 ¶4-5

Satọdee, Eprel 13

Ọ ga-agbagakwa n’otu n’ime obodo ndị a.—Jọsh. 20:4.

Onye gburu mmadụ n’amaghị ama gbabahaala n’obodo mgbaba, o nweghịzi ihe ga-eme ya. Jehova kwuru banyere obodo ndị ahụ, sị: ‘Ha ga-abụkwara unu ebe mgbaba.’ (Jọsh. 20:2, 3) Jehova achọghị ka e kpee onye gburu mmadụ n’amaghị ama ikpe ọzọ maka ihe ahụ o mere. A gaghịkwa ekwe nwanne onye ahụ e gburu egbu ka ọ bata n’obodo mgbaba gbuo onye ahụ. Ụjọ ekwesịghị ịna-atụ onye ahụ gbabara n’obodo mgbaba. Jehova ga-echebe ya n’obodo ahụ. Ma, ọ nọghị na mkpọrọ. O nwere ike ịrụ ọrụ, nyere ndị ọzọ aka, na-efekwa Jehova, obi eruo ya ala. O doro anya na ọ ga na-enwe obi ụtọ, ndụ ya enweekwa isi. Obi ka na-ama ụfọdụ ndị ohu Jehova mere mmehie dị oké njọ ikpe n’agbanyeghị na ha echegharịala. Ụfọdụ na-eche na Jehova emekataghị chefuo ihe ahụ ha mere. Ọ bụrụ na ọ dị gị otú ahụ, ka obi sie gị ike na Jehova gbaghara gị, ọ gbagharala gị kpamkpam. N’ihi ya, obi ekwesịghị ịna-ama gị ikpe. w17.11 9 ¶6; 11 ¶13-14

Sọnde, Eprel 14

Lee ka o si dị mma, bụrụkwa ihe na-enye obi ụtọ . . . [ibikọta] ọnụ n’ịdị n’otu.—Ọma 133:1.

Otu ụzọ anyị ga-esi eme ka anyị na-adị n’otu bụ iche echiche gbasara ihe achịcha na mmanya ahụ e ji eme Ncheta Ọnwụ Jizọs pụtara. Tupu ụbọchị ahụ, ma karịchaa n’abalị ahụ a ga-eme ya, anyị kwesịrị ichesi echiche ike gbasara ihe achịcha ahụ na-ekoghị eko na ihe mmanya ahụ na-acha ọbara ọbara nọchiri anya ha. (1 Kọr. 11:23-25) Achịcha ahụ nọchiri anya ahụ́ Jizọs zuru okè nke o ji chụọ àjà, mmanya ahụ anọchiekwanụ anya ọbara ya ọ wụsara. Cheta na àjà Kraịst ji ndụ ya chụọ nwere ihe abụọ ọ na-egosi. Ọ na-egosi na Jehova hụrụ anyị n’anya nye anyị Ọkpara ya ka ọ nwụọ n’ihi anyị, na-egosikwa na Jizọs hụrụ anyị n’anya ma jiri obi ya niile nwụọ n’ihi anyị. Ichebara otú a ha si hụ anyị n’anya echiche kwesịrị ime ka anyị hụkwa ha n’anya. Otú a anyị si hụ Jehova n’anya ga-eme ka anyị na ụmụnna anyị dịrịkwuo ná mma, dịrịkwuokwa n’otu. w18.01 14 ¶11

Ọgụgụ Baịbụl maka Ncheta Ọnwụ Jizọs: (Ihe ndị mere mgbe anyanwụ dachara: Naịsan 9) Matiu 26:6-13

Mọnde, Eprel 15

Ọ bụ site n’ihe a ka e mere ka ịhụnanya Chineke pụta ìhè n’ebe anyị nọ, n’ihi na Chineke zitere Ọkpara ọ mụrụ naanị ya n’ụwa ka anyị nwee ike inweta ndụ site n’aka ya.—1 Jọn 4:9.

Jehova hụrụ ụmụ mmadụ n’anya nke ukwuu ma jiri ha kpọrọ ihe. O ji Ọkpara ya chụọ àjà ka anyị nwee ike ịdị ndụ ebighị ebi. (Jọn 3:16) Ma Jehova emezughị nkwa ya, Ekwensu ga-ahụ ihe ọ ga-akụdo aka kpọọ ya onye ụgha, kwuokwa na otú o si achị adịghị mma n’ihi na ọ na-eme ka ihe ọma ghara iru ndị ọ na-achị aka. Ọ ga-akwado emo ndị iro Jehova na-akwa ya. Ha na-asị: “Olee ebe nkwa a nke ọnụnọ ya dị? Leenụ, site n’ụbọchị nna nna anyị hà dara n’ụra ọnwụ, ihe niile ka dị kpọmkwem otú ha dị site ná mmalite okike.” (2 Pita 3:3, 4) N’ihi ya, Jehova ga-ahụrịrị na ịzọpụta ndị na-erubere ya isi ga-eso n’otú ọ ga-esi eme ka o doo anya na ọ bụ ya kwesịrị ịchị. (Aịza. 55:10, 11) Ihe ọzọ bụ na ihe e ji mara ọchịchị Jehova bụ ịhụnanya. N’ihi ya, obi kwesịrị isi anyị ike na ọ ga-ahụ ndị ji obi ha niile na-efe ya n’anya ma jiri ha kpọrọ ihe mgbe niile.—Ọpụ. 34:6. w17.06 23 ¶7

Ọgụgụ Baịbụl maka Ncheta Ọnwụ Jizọs: (Ihe ndị mere n’ehihie: Naịsan 9) Matiu 21:1-11, 14-17

Tuzdee, Eprel 16

[Chineke] hụrụ anyị n’anya wee zite Ọkpara ya ka ọ bụrụ àjà ime udo maka mmehie anyị.—1 Jọn 4:10.

Ozugbo Jehova kwere nkwa na Ọkpara ya ga-abịa gbapụta ụmụ Adam na Iv, otú ahụ Jenesis 3:15 kwuru, o weere ya na ọ gbapụtala ha. Mgbe ihe dị ka puku afọ anọ gachara, Jehova nyere ụmụ mmadụ Ọkpara ọ mụrụ naanị ya ka o jiri ndụ ya chụọ àjà. (Jọn 3:16) Obi dị anyị ezigbo ụtọ maka otú a Jehova si hụ anyị n’anya. Chineke kere anyị n’onyinyo ya. N’ihi ya, anyị nwere ike ịhụli ụmụ mmadụ n’anya otú ọ hụrụ ha. Ebel gosiri na ọ hụrụ Chineke n’anya mgbe o ji ihe kacha mma o nwere chụọrọ ya àjà. (Jen. 4:3, 4) Noa gosikwara na ọ hụrụ mmadụ ibe ya n’anya. Otú o si gosi ya bụ na o ji ọtụtụ afọ zie ndị mmadụ ozi Chineke ziri ya zie ha n’agbanyeghị na ha egeghị ya ntị. (2 Pita 2:5) Ebreham hụrụ Chineke n’anya karịa ihe ọ bụla n’ihi na o ji obi ya niile kweta iji nwa ya Aịzik chụọrọ Chineke àjà. (Jems 2:21) N’agbanyeghị nsogbu ndị na-abịara anyị, anyị kwesịkwara ịhụ ndị ọzọ n’anya otú ahụ ndị fere Chineke n’oge ochie mere. w17.10 7-8 ¶3-4

Ọgụgụ Baịbụl maka Ncheta Ọnwụ Jizọs: (Ihe ndị mere n’ehihie: Naịsan 10) Matiu 21:18, 19; 21:12, 13; Jọn 12:20-50

Wenezdee, Eprel 17

Nnukwu onye nchụàjà anyị nwere abụghị onye na-apụghị imere anyị ebere n’adịghị ike anyị, kama ọ bụ onye a nwalere n’ụzọ niile dị ka anyị onwe anyị, ma o nweghị mmehie.—Hib. 4:15.

Ihe Jizọs na-emere anyị dị ka Onyeisi Nchụàjà na-emesi anyị obi ike na a ga-agbaghara anyị mmehie anyị, nakwa na a ga-emere anyị ebere, “nwetakwa obiọma na-erughịrị mmadụ n’oge kwesịrị ekwesị mgbe enyemaka dị anyị mkpa.” (Hib. 4:16) N’ihi ya, nwee okwukwe n’àjà ahụ Jizọs ji ndụ ya chụọ. Nwee okwukwe na ọ baara gịnwa uru. (Gal. 2:20, 21) Nweekwa okwukwe na Jehova na-agbaghara gị mmehie gị n’ihi ihe mgbapụta ahụ. Nwee okwukwe na o mere ka i nwee olileanya ịdị ndụ ebighị ebi. Àjà Jizọs ji ndụ ya chụọ bụ onyinye Jehova nyere gị. Ozugbo ọ gbaghaara anyị, anyị ekwesịghị ịna-atụ ụjọ na ọ ga-echetakwa ya ọzọ ma ọ bụ taa anyị ahụhụ maka ya. (Ọma 103:8-12) N’eziokwu, obi kwesịrị isi anyị ezigbo ike na Jehova na-agbaghara anyị mmehie. w17.11 11-12 ¶14-17

Ọgụgụ Baịbụl maka Ncheta Ọnwụ Jizọs: (Ihe ndị mere n’ehihie: Naịsan 11) Matiu 21:33-41; 22:15-22; 23:1-12; 24:1-3

Tọzdee, Eprel 18

M na-arịọ arịrịọ, . . . banyere ndị nwere okwukwe n’ebe m nọ site n’okwu ha; ka ha niile wee bụrụ otu, dị ka gị onwe gị, Nna, na mụ onwe m dị n’otu.—Jọn 17:20, 21.

N’abalị ahụ Jizọs malitere Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị, o kpere ekpere ka ndị na-eso ụzọ ya niile dịrị n’otu otú ahụ ya na Nna ya dị n’otu. O doro anya na Jehova zara ekpere a Ọkpara ya ọ hụrụ n’anya kpere. Ncheta Ọnwụ Jizọs bụ ọmụmụ ihe Ndịàmà Jehova nke kacha egosi na ha dị n’otu n’eziokwu. N’ebe ụfọdụ, ọ na-esi ike ịhụ ndị si n’agbụrụ dị iche iche ka ha zukọtara maka ife Chineke. Ha zukọtakwanụ, ndị ọzọ na-ele ya anya ka ihe na-ekwesịghị ekwesị. Ma Jehova na Jizọs na-ele ya anya ka ihe kwesịrị ekwesị. Otú anyị si adị n’otu n’oge Ncheta Ọnwụ Jizọs na-atọ ha ezigbo ụtọ. Ebe anyị bụ ndị ohu Jehova, ọ naghị eju anyị anya na anyị na ụmụnna anyị dị n’otu. Nke bụ́ eziokwu bụ na Jehova kwuru na ọ ga-adị otú ahụ.—Ezik. 37:15-17; Zek. 8:23. w18.01 14 ¶7-9

Ọgụgụ Baịbụl maka Ncheta Ọnwụ Jizọs: (Ihe ndị mere n’ehihie: Naịsan 12) Matiu 26:1-5, 14-16; Luk 22:1-6

Ụbọchị Ncheta Ọnwụ Jizọs
Mgbe Anyanwụ Dachara
Fraịdee, Eprel 19

Nkume ndị na-ewu ụlọ jụrụ ajụ aghọwo isi nkuku.—Ọma 118:22.

“Ndị na-ewu ụlọ,” ya bụ, ndị ndú ndị Juu jụrụ Mesaya. Ọ bụghị naanị na ha jụrụ ya ma ọ bụ ghara ikwere na ọ bụ Kraịst. Kama, ọtụtụ ndị Juu jụrụ ya nke na ha kwuru ka e gbuo ya. (Luk 23:18-23) N’eziokwu, ha so ná ndị mere ka e gbuo Jizọs. Ọ bụrụ na a jụrụ Jizọs ma gbuo ya, olee otú ọ ga-esi ghọọ “isi nkuku”? Ọ bụ naanị ma à kpọlitere ya n’ọnwụ. Pita onyeozi kwuru banyere ‘Jizọs Kraịst onye Nazaret, onye ha kpọgidere n’osisi, onye Chineke mere ka o si ná ndị nwụrụ anwụ bilie.’ (Ọrụ 3:15; 4:5-11; 1 Pita 2:5-7) Ozugbo a kpọlitere ya, ọ ga-abụ naanị aha ya ka ‘e nyere ụmụ mmadụ, nke a ga-eji zọpụta ha.’—Ọrụ 4:12; Efe. 1:20. w17.12 9-10 ¶6-9

Ọgụgụ Baịbụl Maka Ncheta Ọnwụ Jizọs: (Ihe ndị mere n’ehihie: Naịsan 13) Matiu 26:17-19; Luk 22:7-13 (Ihe ndị mere mgbe anyanwụ dachara: Naịsan 14) Matiu 26:20-56

Satọdee, Eprel 20

Na-ekwusa ọnwụ Onyenwe anyị, ruo mgbe ọ ga-abịarute.—1 Kọr. 11:26.

Jizọs kwuru banyere oké mkpagbu, bụ́ nke ji ọsọ na-abịa, sị: ‘Ha ga-ahụ Nwa nke mmadụ ka ọ na-abịa n’ígwé ojii nke eluigwe n’ike na ebube dị ukwuu. [Jizọs] ga-ejikwa ụda oké opi zipụ ndị mmụọ ozi ya, ha ga-achịkọta ndị ọ họọrọ.’ (Mat. 24:29-31) Jizọs ‘ga-achịkọta ndị ọ họọrọ’ mgbe ọ ga-akpọrọ Ndị Kraịst niile e tere mmanụ ka nọ n’ụwa gaa eluigwe. Nke a ga-eme mgbe agba nke mbụ nke oké mkpagbu ahụ gachara, tupu a lụọ agha Amagedọn. N’agha a, Jizọs na otu narị puku na puku iri anọ na puku anọ ga-alụso ndị eze niile nọ n’ụwa agha ma merie ha. (Mkpu. 17:12-14) Ncheta Ọnwụ Jizọs anyị ga-eme tupu Jizọs ‘abịa’ chịkọta ndị e tere mmanụ gaa eluigwe ga-abụ nke ikpeazụ. w18.01 16 ¶15

Ọgụgụ Baịbụl maka Ncheta Ọnwụ Jizọs: (Ihe ndị mere n’ehihie: Naịsan 14) Matiu 27:1, 2, 27-37

Sọnde, Eprel 21

Jizọs a ka Chineke kpọlitere n’ọnwụ.—Ọrụ 2:32.

N’eluigwe, Jizọs na-adị ndụ “ruo mgbe niile ebighị ebi.” (Mkpu. 1:5, 18; Rom 6:9; Kọl. 1:18; 1 Pita 3:18) O kwere ndịozi ya nkwa na ha ga-eso ya chịa n’eluigwe. (Luk 22:28-30) Pọl kwuru, sị: “E siwo ná ndị nwụrụ anwụ kpọlite Kraịst, bụ́ mkpụrụ mbụ nke ndị dara n’ụra ọnwụ.” O kwukwara na e nwere ndị ọzọ a ga-akpọlite n’ọnwụ ịga eluigwe. Ọ sịrị: “Onye ọ bụla n’ọnọdụ nke ya: Kraịst mkpụrụ mbụ, e mesịakwa, ndị nke Kraịst n’oge ọnụnọ ya.” (1 Kọr. 15:20, 23) “Ọnụnọ” Kraịst malitere kemgbe afọ 1914. Mgbe a ga-ebibi ụwa ọjọọ a dịkwa ezigbo nso. w17.12 10 ¶11; 11 ¶14-16

Ọgụgụ Baịbụl maka Ncheta Ọnwụ Jizọs: (Ihe ndị mere n’ehihie: Naịsan 15) Matiu 27:62-66 (Ihe ndị mere mgbe anyanwụ dachara: Naịsan 16) Matiu 28:2-4

Mọnde, Eprel 22

Ọ bụ mụ onwe m bụ Onye na-akasi unu obi.—Aịza. 51:12.

E nweekwala ndị nwụnahụrụ Nna anyị nke eluigwe, bụ́ Onye obi ebere. Ụfọdụ n’ime ha bụ Ebreham, Aịzik, Jekọb, Mozis, na Eze Devid. (Ọnụ Ọgụ. 12:6-8; Mat. 22:31, 32; Ọrụ 13:22) Baịbụl mesiri anyị obi ike na Jehova na-atụsi anya ike mgbe ọ ga-akpọlite ha n’ọnwụ. (Job 14:14, 15) Obi ga-adị ha ụtọ, ahụ́ agbasiekwa ha ike. Chetakwa na Ọkpara Chineke hụrụ n’anya nwụrụ ọnwụ ike. Baịbụl kwuru na ‘ihe ya masịrị Chineke karịsịa.’ (Ilu 8:22, 30) Otú ihe ahụ si gbawaa Chineke obi abụghị ihe e ji ọnụ ekwu. (Jọn 5:20; 10:17) Obi kwesịrị isi anyị ezigbo ike na Jehova ga-enyere anyị aka. N’ihi ya, anyị kwesịrị ikpe ekpere kọọrọ ya otú obi si gbawaa anyị. Obi ga-adị anyị mma ma anyị cheta na Jehova ghọtara otú ihe si ewute anyị ma na-akasi anyị obi.—2 Kọr. 1:3, 4. w17.07 13 ¶3-5

Ọgụgụ Baịbụl maka Ncheta Ọnwụ Jizọs: (Ihe ndị mere n’ehihie: Naịsan 16) Matiu 28:1, 5-15

Tuzdee, Eprel 23

Chineke abụghị onye ajọ omume ichefu ọrụ unu na ịhụnanya unu gosiri maka aha ya.—Hib. 6:10.

Taa, ọtụtụ nde mmadụ ji obi ha niile na-enye Jehova ihe “dị oké ọnụ ahịa” ha nwere. Ụfọdụ n’ime ha bụ oge ha, ike ha, na ihe ndị ha nwere iji kwado ụlọ nsọ ihe atụ nke Jehova. (Ilu 3:9) Jehova agaghị echefu ọrụ anyị rụụrụ ya na otú anyị si hụ ya n’anya. Ihe niile anyị rụrụla ná nzukọ Jehova n’oge ikpeazụ a na-egosi n’eziokwu na Jehova na-agọzi anyị nakwa na Jizọs na-edu anyị. Anyị nọ ná nzukọ Jehova nke ga-adị ruo mgbe ebighị ebi. Ejila nzukọ Jehova a egwu egwu. ‘Na-ege ntị n’olu Jehova bụ́ Chineke gị.’ (Zek. 6:15) I mee otú ahụ, Eze anyị na Nnukwu Onye Nchụàjà anyị ga-echebe gị. Na-eme ihe niile i nwere ike ime iji na-akwado ofufe Chineke. Ọ bụrụ na i mee otú ahụ, obi kwesịrị isi gị ike na Jehova nke ụsụụ ndị agha ga-echebe gị n’oge ole na ole ndị fọrọnụ tupu ya ebibie ụwa ọjọọ a, chebekwa gị ruo mgbe ebighị ebi. w17.10 30 ¶18-19

Wenezdee, Eprel 24

Jirinụ akụ̀ ajọ omume metara onwe unu ndị enyi, ka ọ ga-abụ, mgbe akụ̀ dị otú ahụ na-adịkwaghị, ha ewee nabata unu n’ebe obibi ebighị ebi.—Luk 16:9.

N’oge na-adịghị anya, ụwa Setan ga-akụ afọ n’ala, ma ndọrọ ndọrọ ọchịchị ya, ma okpukpe ya, ma achụmnta ego ya. Ezikiel na Zefanaya buru amụma na e nweghịzi uru ọlaọcha na ọlaedo ndị mmadụ na-achụ ka à na-anwụ anwụ ga-aba. (Ezik. 7:19; Zef. 1:18) Olee otú obi ga-adị anyị ma anyị kaa nká, chọpụta na ịchụ “akụ̀ ajọ omume” emeela ka anyị ghara inweta ezigbo akụ̀ Chineke chọrọ inye anyị? O nwere ike ịdị anyị ka ebe mmadụ ji oge ya niile kpaa ego, mechaa chọpụta na ego ahụ niile bụ kanta. (Ilu 18:11) O doro anya na akụ̀ nke ụwa a ga-ala n’iyi. N’ihi ya, ekwela ka ihe ọ bụla mee ka ị ghara iji ya ‘metara onwe gị ndị enyi’ n’eluigwe. Ihe ọ bụla anyị mere iji kwado ihe gbasara Alaeze Chineke ga-eme ka anyị bụrụ ọgaranya n’ebe Chineke nọ. w17.07 11 ¶16

Tọzdee, Eprel 25

Ghọọnụ ndị na-eṅomi Chineke, dị ka ụmụ a hụrụ n’anya, na-ejekwanụ ije n’ịhụnanya, dị nnọọ ka Kraịst hụkwara unu n’anya ma nyefee onwe ya maka unu.—Efe. 5:1, 2.

Ụfọdụ ụmụnna ndị mere mmehie dị oké njọ na-ekpuchi mmehie ha ka ha ghara imechu onwe ha na ndị ọzọ ihu. (Ilu 28:13) Ma, ime otú ahụ gosiri na ha ahụghị ndị ọzọ n’anya n’ihi na o nwere ike ịkpatara onwe ha na ndị ọzọ nsogbu. O nwekwara ike ime ka Jehova wepụ mmụọ nsọ ya n’ọgbakọ, meekwa ka udo ghara ịdị. (Efe. 4:30) Ezigbo ịhụnanya na-eme ka Ndị Kraịst mere mmehie dị oké njọ gaa kọọrọ ndị okenye ka ha nyere ha aka. (Jems 5:14, 15) Ịhụnanya bụ àgwà kachanụ. (1 Kọr. 13:13) Ọ bụ àgwà e ji amata na anyị bụ ndị na-eso ụzọ Jizọs, nakwa na anyị na-eṅomi Jehova, onye ịhụnanya si n’aka ya. Pọl kwuru, sị: ‘Ọ bụrụ na enweghị m ịhụnanya, ọ dịghị ihe m bụ.’ (1 Kọr. 13:2) Ka onye ọ bụla n’ime anyị na-ahụ ndị ọzọ n’anya, ọ bụghị naanị “n’ire,” kama “n’omume nakwa n’eziokwu.”—1 Jọn 3:18. w17.10 11 ¶17-18

Fraịdee, Eprel 26

Anyị aghaghị irubere Chineke isi dị ka onye na-achị achị karịa mmadụ.—Ọrụ 5:29.

Chegodị gbasara ụdị obi ike Josef nwere mgbe nwunye Pọtịfa nwara ya ọnwụnwa ka ya na ya kwaa iko. Ọ ga-abụrịrị na ọ ma na ọ ga-ata ahụhụ ma ọ jụ. N’agbanyeghị nke ahụ, o mere ihe gosiri na o nwere obi ike ma jụ ka ha kwaa iko. (Jen. 39:10, 12) Rehab bụkwa onye ọzọ nwere obi ike. Mgbe ndị nledo bụ́ ndị Izrel bịara n’ụlọ ya dị na Jeriko, ọ tụkwasịrị Jehova obi, ma jiri obi ike zoo ụmụ nwoke abụọ ahụ ma nyere ha aka, ha agbapụ n’enweghị ihe mere ha. (Jọsh. 2:4, 5, 9, 12-16) Mgbe ndị Sadusii gbalịrị ka ha kwụsị ndịozi Jizọs kwesịrị ntụkwasị obi ịkụzi banyere Jizọs, bụ́ ndị hụrụ ihe Jizọs mere nke gosiri na o nwere obi ike, ha akwụsịghị ịkụzi banyere Jizọs. (Ọrụ 5:17, 18, 27-29) Josef, Rehab, Jizọs, na ndịozi kpebisiri ike ime ihe ziri ezi. Obi ike ha nwere abụghị n’ihi na ha tụkwasịrị onwe ha obi, kama ọ bụ n’ihi na ha tụkwasịrị Jehova obi. E nwere mgbe ụfọdụ anyị kwesịrị inwe obi ike. N’oge ndị ahụ, anyị kwesịrị ịtụkwasị Jehova obi, kama ịtụkwasị onwe anyị obi.—2 Tim. 1:7. w17.09 29 ¶6-9

Satọdee, Eprel 27

Yipụnụ mmadụ ochie ahụ na omume ya.—Kọl. 3:9.

Iyipụ mmadụ ochie ahụ abụghị ihe anyị ga-emeli n’ike anyị. Ndị merela otú ahụ gbalịsiri ike ịkwụsị àgwà ọjọọ ha. Ihe nyeere ha aka imeri bụ mmụọ nsọ na ike Okwu Chineke na-akpa. (Luk 11:13; Hib. 4:12) Anyị chọọ irite uru n’ike Baịbụl na-akpa, anyị kwesịrị ịna-agụ ya kwa ụbọchị, chebara ihe anyị na-agụ echiche, na-ekpekwa ekpere mgbe niile ka Jehova nye anyị amamihe na ike anyị ga-eji na-eme ihe anyị na-amụta. (Jọsh. 1:8; Ọma 119:97; 1 Tesa. 5:17) Anyị ga-eritekwa uru ma anyị na-akwado ihe a ga-amụ n’ọmụmụ ihe, na-agakwa ọmụmụ ihe. (Hib. 10:24, 25) Anyị kwesịkwara iji ọtụtụ ihe nzukọ Jehova na-ewepụtara anyị ugbu a kpọrọ ihe. (Luk 12:42) Ọ bụ eziokwu na Ndị Kraịst kwesịrị iyipụ mmadụ ochie ahụ, ma, ọ bụghị naanị ihe a chọrọ ha n’aka ka ha na Chineke nwee ike ịdị ná mma. Anyị kwesịkwara iyiri mmadụ ọhụrụ ahụ.—Kọl. 3:10. w17.08 21 ¶16-17

Sọnde, Eprel 28

Ma mụ onwe m, n’obiọma gị ka m tụkwasịrị obi; ka obi m ṅụrịa ọṅụ n’ihi nzọpụta gị.—Ọma 13:5.

E megburu Eze Devid ọtụtụ ugboro. N’agbanyeghị na Jehova tere ya mmanụ ka ọ bụrụ eze ga-achị Izrel mgbe ọ ka bụ nwata, o cheere ihe dị ka afọ iri na ise tupu e mee ya eze n’obodo ya. (2 Sam. 2:3, 4) N’oge ahụ ọ nọ na-eche, e nwere mgbe Eze Sọl nọ na-achụgharị ya, na-achọ igbu ya. Ọ bụ ya mere Devid ji na-agba ọsọ ndụ. Mgbe ụfọdụ, ya agbaga n’obodo ọzọ, mgbe ụfọdụkwa ya agbaga n’ọgba ndị dị n’ọzara. Mgbe e mechara gbuo Sọl n’agha, Devid cheere ọzọ ruo ihe dị ka afọ asaa tupu e mee ya eze mba Izrel (2 Sam. 5:4, 5) Gịnị mere Devid ji dị njikere iji ndidi chere? Obi siri ya ike na Jehova hụrụ ya n’anya, nakwa na ọ gaghị ahapụ ya. O ji obi ụtọ na-atụsi anya ike mgbe Jehova ga-anapụta ya. O chekwara otú Jehova sirila gọzie ya n’oge gara aga. (Ọma 13:6) N’eziokwu, Devid ma na oge ahụ o ji chere ga-aba uru. w17.08 6 ¶14-15

Mọnde, Eprel 29

Chineke adịghị ele mmadụ anya n’ihu.—Ọrụ 10:34.

Asụsụ na-agbanwe ka oge na-aga. Ihe okwu ụfọdụ pụtara n’otu oge nwere ike ịpụta ihe ọzọ n’oge ọzọ. Otú ahụ ka ọ dịkwa n’asụsụ Hibru na Grik, bụ́ asụsụ e ji dee ọtụtụ Baịbụl. Asụsụ Hibru na Grik a na-asụ ugbu a dị iche ná ndị a sụrụ n’oge e dere Baịbụl. Ọtụtụ ndị anaghị aghọta Baịbụl ndị ahụ e ji asụsụ Hibru na Grik oge ochie dee. N’ihi ya, e kwesịrị inwe Baịbụl ndị a sụgharịrị n’asụsụ ha ga-aghọta. Ụfọdụ ndị chere na ha mụọ asụsụ Hibru na Grik oge ochie, na ha ga-aghọtakwu Baịbụl. Ma, o nwere ike ọ gaghị enyere ha aka otú ha chere. Obi dị anyị ụtọ na a sụgharịala Baịbụl n’ihe karịrị puku asụsụ atọ na narị abụọ, ma ndị nke zuru ezu ma ndị nke na-ezughị ezu. O doro anya na Jehova chọrọ ka Baịbụl baara ndị si ná “mba niile na ebo niile na asụsụ niile,” uru. (Mkpu. 14:6) Nke a kwesịrị ime ka anyị bịarukwuo Chineke anyị nso, bụ́ onye hụrụ anyị n’anya na onye na-anaghị ele mmadụ anya n’ihu. w17.09 19 ¶4

Tuzdee, Eprel 30

Onye ọ bụla nke na-adịghị ekwu ọtụtụ okwu maara ihe, mmụọ nke onye nwere nghọta na-adị jụụ.—Ilu 17:27.

A chụọ ndị ikwu gị n’ọgbakọ, i kwesịrị ijide onwe gị ka gị na ha ghara ịna-emekọ ihe mgbe ọ na-adịghị mkpa. Ma ọ ga-adịrị gị mfe ime ya ma i cheta na ime otú ahụ na-egosi na ị na-eṅomi Jehova, nakwa na ị na-eme ihe ọ sị gị mee. Anyị nwere ike ịmụta ihe n’ihe Eze Devid mere. Mgbe Sọl na Shimiaị kpasuru ya iwe, o weghị iwe ma ọ bụ jiri ike o nwere mesie ha ike. (1 Sam. 26:9-11; 2 Sam. 16:5-10) Ma, ọ bụghị mgbe niile ka Devid jidere onwe ya. Otú anyị si mara bụ mmehie ya na Bat-shiba mere na ihe o mere mgbe Nebal onye anyaukwu kpasuru ya iwe. (1 Sam. 25:10-13; 2 Sam. 11:2-4) Ma, anyị nwere ike ịmụta ezigbo ihe n’ihe a Devid mere. Nke mbụ bụ na ndị okenye kwesịrị ịna-ejide onwe ha ka ha ghara iji ike ha na-eme ihe na-ekwesịghị ekwesị. Nke abụọ abụrụ na anyị ekwesịghị ịtụkwasị onwe anyị obi, na-eche na e nweghị mgbe ọnwụnwa ga-abịara anyị.—1 Kọr. 10:12. w17.09 5-6 ¶12-13

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya