Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • es20 p. 78-88
  • Ọgọst

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ọgọst
  • Inyocha Akwụkwọ Nsọ Kwa Ụbọchị—2020
  • Isiokwu Nta
  • Satọdee, Ọgọst 1
  • Sọnde, Ọgọst 2
  • Mọnde, Ọgọst 3
  • Tuzdee, Ọgọst 4
  • Wenezdee, Ọgọst 5
  • Tọzdee, Ọgọst 6
  • Fraịdee, Ọgọst 7
  • Satọdee, Ọgọst 8
  • Sọnde, Ọgọst 9
  • Mọnde, Ọgọst 10
  • Tuzdee, Ọgọst 11
  • Wenezdee, Ọgọst 12
  • Tọzdee, Ọgọst 13
  • Fraịdee, Ọgọst 14
  • Satọdee, Ọgọst 15
  • Sọnde, Ọgọst 16
  • Mọnde, Ọgọst 17
  • Tuzdee, Ọgọst 18
  • Wenezdee, Ọgọst 19
  • Tọzdee, Ọgọst 20
  • Fraịdee, Ọgọst 21
  • Satọdee, Ọgọst 22
  • Sọnde, Ọgọst 23
  • Mọnde, Ọgọst 24
  • Tuzdee, Ọgọst 25
  • Wenezdee, Ọgọst 26
  • Tọzdee, Ọgọst 27
  • Fraịdee, Ọgọst 28
  • Satọdee, Ọgọst 29
  • Sọnde, Ọgọst 30
  • Mọnde, Ọgọst 31
Inyocha Akwụkwọ Nsọ Kwa Ụbọchị—2020
es20 p. 78-88

Ọgọst

Satọdee, Ọgọst 1

Chineke mere ka anyị mata ịhụnanya ya, n’ihi na, mgbe anyị ka bụ ndị mmehie, Kraịst nwụrụ n’ihi anyị.​—Rom 5:8.

N’ọmụmụ ihe, a na-echetara anyị ihe Jehova na Jizọs meere anyị. Anyị ji obi ụtọ na-agbalị iṅomi Jizọs n’otú anyị si ebi ndụ anyị kwa ụbọchị. (2 Kọr. 5:​14, 15) Ihe ọzọ bụ na anyị si n’ala ala obi anyị na-eto Jehova maka inye anyị ihe mgbapụta ahụ. Otu ụzọ anyị nwere ike isi na-eto ya bụ iji obi anyị niile na-aza ajụjụ n’ọmụmụ ihe anyị. Otú anyị nwere ike isi egosi otú anyị hụruru Jehova na Ọkpara ya n’anya bụ ịdị njikere ịhapụ ihe ọ bụla n’ihi ha. Anyị na-emekarị ya iji na-abịa ọmụmụ ihe. Ọtụtụ ọgbakọ na-enwe ọmụmụ ihe mgbe ụmụnna gbasara ọrụ, bụ́ mgbe ọ ga-abụ na ike gwụchara ha. A na-enwekwa ọmụmụ ihe ná ngwụcha izu mgbe ndị ọzọ na-ezu ike. Jehova ọ̀ ma na anyị na-abịa ọmụmụ ihe ma mgbe ike gwụrụ anyị? À na-ajụkwa ajụ? N’eziokwu, ka anyị na-agbakwu mbọ ịna-abịa ọmụmụ ihe, ka obi na-atọkwu Jehova ụtọ maka otú anyị si na-egosi na anyị hụrụ ya n’anya.​—Mak 12:​41-44. w19.01 29 ¶12-13

Sọnde, Ọgọst 2

Mgbe Onyenwe anyị hụrụ ya, o nwere ọmịiko.​—Luk 7:13.

E nwere mgbe Jizọs nwere ụfọdụ nsogbu ha na ụmụ mmadụ na-alụ. Dị ka ihe atụ, a zụlitere Jizọs n’ezinụlọ dara ogbenye. Ọ mụtakwara otú e si arụ ọrụ ndị siri ike n’aka Josef, bụ́ nna ya n’ụwa. (Mat. 13:55; Mak 6:3) O nwere ike ịbụ na Josef nwụrụ tupu Jizọs amalite ozi ya n’ụwa. N’ihi ya, ọ ga-abụkwa na ọnwụ ya wutere Jizọs otú ahụ o si ewute ndị mmadụ nwụnahụrụ. Jizọs ma ihe ọ na-adị ka ya mmadụ ịnọ n’ezinụlọ nke ndị nọ ya na-anaghị ekpe otu okpukpe. (Jọn 7:5) Ọ ga-abụ na ihe ndị a niile na ihe ndị ọzọ mere ka Jizọs ghọta ihe ha na ndị mmadụ na-alụ na otú obi na-adị ha. Ọrụ ebube ndị Jizọs rụrụ mere ka o doo anya na ihe banyere ndị mmadụ na-emetụ ya n’obi. Jizọs arụghị ọrụ ebube ndị ahụ ka o mezuo iwu. O nweere ndị na-ata ahụhụ “ọmịiko.” (Mat. 20:​29-34; Mak 1:​40-42) Jizọs meteere ha ebere ma chọọ inyere ha aka.​—Mak 7:​32-35; Luk 7:​12-15. w19.03 16 ¶10-11

Mọnde, Ọgọst 3

Na-ediri ibe unu ihe.​—Kọl. 3:13.

N’abalị ikpeazụ Jizọs dịrị ndụ n’ụwa, chegodị otú o si chegbuo onwe ya. Ọ̀ ga-anọgide na-erubere Chineke isi ruo ọnwụ? Ọ bụrụ na o rubereghị Chineke isi, o nweghị onye gaara enwe olileanya ịdị ndụ ebighị ebi. (Rom 5:​18, 19) Nke kachanụ bụ na ihe o mere ga-eme ka e nye Nna ya otuto ma ọ bụ kọchaa ya. (Job 2:4) Mgbe ya na ndịozi ya na-eri nri ikpeazụ, ndịozi ya nọ na-ese ezigbo okwu banyere “onye ọ bụ n’ime ha nke yiri ka ọ bụ ya kasị ukwuu.” O doro anya na Jizọs ewereghị ha iwe. Kama, o medara obi gwa ha okwu. Jizọs ji nwayọọ gwa ha hoo haa ọzọ ụdị àgwà ha kwesịrị inwe. Ọ jaziri ha mma maka otú ha si jiri obi ha niile na-akwado ya. (Luk 22:​24-28; Jọn 13:​1-5, 12-15) Anyị kwesịrị ime ka Jizọs ma dịrị nwayọọ n’obi ma mgbe e nwere ihe na-echegbu anyị. Ọ bụrụ na anyị echeta na anyị niile na-eme ma na-ekwu ihe na-ewe ndị ọzọ iwe, anyị ga-eme ihe a Chineke kwuru. (Ilu 12:18; Jems 3:​2, 5) Na-ajakwa ndị ọzọ mma maka àgwà ọma ha.​—Efe. 4:29. w19.02 11-12 ¶16-17

Tuzdee, Ọgọst 4

Jehova . . . [mere] ka ocheeze ya guzosie ike maka ikpe.​—Ọma 9:7.

Iwu Mozis ahụ mere ka mmadụ ghara ịna-ebokarị mmadụ ibe ya ebubo ụgha. Onye e boro ebubo nwere ike ikwu ka a gwa ya onye boro ya ebubo. (Diut. 19:​16-19; 25:1) Ma tupu a maa ya ikpe, a ga-enwe, ọ dịkarịa ala, ndị akaebe abụọ. (Diut. 17:6; 19:15) Gịnịkwanụ gbasara onye Izrel mere mpụ, ya abụrụ na ọ bụ naanị otu onye hụrụ ya? O kwesịghị iche na ọ gaghị ata ahụhụ ihe ọjọọ ahụ o mere. Jehova hụrụ ya. Jehova bụ onye kachanụ anyị kwesịrị iṅomi ma a bịa n’ikpe ikpe ziri ezi. Ọ naghị eme ihe na-ezighị ezi. Ọ na-agọzi ndị na-erubere ya isi ma na-ata ndị na-emegbu ndị ọzọ ahụhụ. (2 Sam. 22:​21-23; Ezik. 9:​9, 10) Ụfọdụ nwere ike mee ihe ọjọọ, ya eyie ka hà alaferela, ma Jehova ga-ekpe ha ikpe n’oge o kpebiri. (Ilu 28:13) Ọ bụrụ na ha echegharịghị, ha ga-amata n’oge na-adịghị anya na “ọ bụ ihe dị egwu ịdaba n’aka Chineke dị ndụ.”​—Hib. 10:​30, 31. w19.02 23-24 ¶20-21

Wenezdee, Ọgọst 5

E nwetụbeghị onye amụma biliri n’Izrel nke dị ka Mozis, onye Jehova maara ihu na ihu.​—Diut. 34:10.

O doro anya na Mozis lekwasịrị Jehova anya ka o duzie ya. N’eziokwu, “o guzosiri ike dị ka à ga-asị na ọ na-ahụ onye ahụ anya bụ́ Onye a na-apụghị ịhụ anya.” (Hib. 11:​24-27) N’ihe na-erughị ọnwa abụọ ndị Izrel si n’Ijipt pụta, e nwere nnukwu nsogbu dapụtaranụ tupudị ha erute n’Ugwu Saịnaị. Ha malitere ime mkpesa na ha enweghị mmiri ha ga-aṅụ. Ha malitekwara ịtamu ntamu megide Mozis. Ihe bịara ka njọ nke na Mozis besaara Jehova ákwá, sị: “Gịnị ka m ga-eme ndị a? Obere oge ugbu a ha ga-atụ m nkume!” (Ọpụ. 17:4) Jehova gwara Mozis ihe doro anya ọ ga-eme. Ọ gwara ya ka o were mkpara ya kụọ na nkume dị na Horeb ka mmiri gbapụta. Baịbụl kwuru, sị: “Mozis wee mee otú ahụ n’ihu ndị okenye Izrel.” Ndị Izrel ṅụjuru mmiri afọ, ha akwụsị inye Mozis nsogbu.​—Ọpụ. 17:​5, 6. w18.07 13 ¶4-5

Tọzdee, Ọgọst 6

Ịhụnanya na-ewuli elu.​—1 Kọr. 8:1.

Jehova na-eji ọgbakọ Ndị Kraịst eme ka anyị na-adị ike iji gosi na ọ hụrụ anyị n’anya. Ọ bụrụ na anyị ahụ ụmụnna anyị n’anya, anyị na-egosi na anyị hụrụ Jehova n’anya. Anyị na-eme ihe ọ bụla anyị nwere ike ime iji mee ka ụmụnna anyị mara na anyị ji ha kpọrọ ihe, nakwa na Jehova hụrụ ha n’anya. (1 Jọn 4:​19-21) Pọl onyeozi gwara Ndị Kraịst, sị: “Na-akasirịtanụ ibe unu obi ma na-ewulirịtanụ ibe unu elu, dị nnọọ ka unu na-eme.” (1 Tesa. 5:11) N’eziokwu, mmadụ niile nọ n’ọgbakọ ga-emeli ka Jehova na Jizọs ma ọ bụrụ na ha ana-akasi ụmụnna ha obi ma na-eme ka ha dị ike. Ọ bụghị ihe a ga-ahapụrụ naanị ndị okenye. (Rom 15:​1, 2) E nwere ụfọdụ ndị uche na-akpakọghị ọnụ n’ọgbakọ o nwere ike ịdị mkpa ka a kpọga ha ụlọ ọgwụ. (Luk 5:31) Ndị okenye na ụmụnna ndị ọzọ ma na ha abụghị ndị dọkịta na-agwọ ndị uche na-akpakọghị ọnụ. Ma ha niile nwere ọrụ dị mkpa ha kwesịrị ịrụ. Ha ga ‘na-agụgụ mkpụrụ obi dara mbà, na-akwado ndị na-adịghị ike, na-enwe ogologo ntachi obi n’ebe mmadụ niile nọ.’​—1 Tesa. 5:14. w18.09 14 ¶10-11

Fraịdee, Ọgọst 7

Elegharịla anya n’ụjọ, n’ihi na abụ m Chineke gị.​—Aịza. 41:10.

Otú anyị si atụkwasịkwu Jehova obi bụ ịmata ya nke ọma. Ma naanị otú anyị nwere ike isi mata Chineke nke ọma bụ iji nwayọọ na-agụ Baịbụl ma na-echebara ihe ndị anyị gụrụ echiche. Baịbụl kọọrọ anyị otú Jehova si chebe ndị ya n’oge ndị gara aga. Akụkọ ahụ na-eme ka obi sie anyị ike na ọ ga-elekọta anyị ugbu a. Tụlee ezigbo ihe atụ Aịzaya mere o ji kọwaa otú Jehova si echebe anyị. Ọ kpọrọ Jehova onye ọzụzụ atụrụ, kpọkwanụ ndị ohu ya ụmụ atụrụ ya. Aịzaya kwuru banyere Jehova, sị: “Ọ ga-eji ogwe aka ya chịkọta ụmụ atụrụ ya; ọ ga-ekuru ha n’obi ya.” (Aịza. 40:11) Mgbe anyị gụrụ na Jehova ji ogwe aka ya dị ike kuru anyị, ọ̀ bụ na ọ naghị adị anyị ka Jehova na-echebe anyị, obi eruokwa anyị ala? Iji mee ka obi na-eru gị ala n’agbanyeghị nsogbu ndị gị na ha na-alụ, na-echebara okwu a dị n’ihe mmụta dịịrị ụbọchị taa echiche. Ha na-eme ka obi sie anyị ike. Ha ga-emekwa ka ị dị ike ka i nwee ike imeri nsogbu ndị ị ga-enwe n’ọdịnihu. w19.01 7 ¶17-18

Satọdee, Ọgọst 8

Chineke m, ime uche gị na-atọ m ụtọ.​—Ọma 40:8.

Ò nwere ihe ndị ị na-achọ ime n’ozi Jehova ị na-agbalị ka i bido ime ha? O nwere ike ịbụ na ị na-agbalị ịgụ Baịbụl kwa ụbọchị, ma ọ bụ ịmụtakwu otú e si ekwu okwu na otú e si akụzi ihe. Olee otú obi na-adị gị ma ị chọpụta na ị na-emezi nke ọma, ma ọ bụkwanụ ma ndị ọzọ jaa gị mma na ị na-eme nke ọma? O doro anya na obi ga-atọ gị ụtọ maka mgbalị ndị i mere iji nwee ọganihu ndị ahụ. I kwesịrị inwe ezigbo obi ụtọ. N’ihi gịnị? N’ihi na i mere ihe Chineke chọrọ ka i mee, otú ahụ Jizọs mere. (Ilu 27:11) Ọ bụrụ na i tinye uche gị n’ozi Jehova, obi ga-atọ gị ụtọ n’ihi na ị ma na mbọ ị na-agba agaghị efu ọhịa. Pọl onyeozi kwuru, sị: “Guzosienụ ike, bụrụnụ ndị kwụ chịm, ndị nwere ọtụtụ ihe ha na-arụ mgbe niile n’ọrụ Onyenwe anyị, ebe unu maara na ndọgbu unu na-adọgbu onwe unu n’ọrụ abụghị n’efu n’ime Onyenwe anyị.” (1 Kọr. 15:58) Ma, ọ bụrụ na mmadụ etinye uche ya n’ịchụ ego ma ọ bụ n’ịchọ ịbụ onye a ma ama, ọ gaghị enwe obi ụtọ. Ọ bụrụgodị na ihe agaziere ya, e mechaa ọ ga-ahụ na o ji ndụ ya mee ihe na-enweghị isi.​—Luk 9:25. w18.12 22 ¶12-13

Sọnde, Ọgọst 9

Ndị ezi omume ga-enweta ụwa.​—Ọma 37:29.

Devid na-ekwu gbasara mgbe ndị mmadụ bi n’ụwa ga na-eme ihe Chineke kwuru. (2 Pita 3:13) Baịbụl kwuru n’Aịzaya 65:​22, si: “Dị ka osisi si anọ ogologo ndụ, otú ahụ ka ndị m ga-anọ ogologo ndụ.” Nke a na-egosi na ndị mmadụ ga-adị ndụ ọtụtụ puku afọ. Mkpughe 21:​1-4 kwuru na Chineke ga-agọzi ụmụ mmadụ. Otu n’ime ngọzi ndị ahụ ga-abụ na “ọnwụ agaghị adị ọzọ.” Ndị Chineke ga-emezuru nkwa a bụ ndị ga-efe ya n’ụwa ọhụru ya. Adam na Iv tụfuru ohere magburu onwe ya ha nwere ịdị ndụ na Paradaịs ruo mgbe ebighị ebi. Ma ụwa ga-emechakwa bụrụ paradaịs. Chineke ka ga-agọzi ụmụ mmadụ bi n’ụwa a otú ahụ o kwere nkwa ya. O nyere Devid mmụọ nsọ ya ekwuo na ndị dị umeala n’obi na ndị ezi omume ga-enweta ụwa birikwa n’ime ya ruo mgbe ebighị ebi. (Ọma 37:11) Amụma ndị e buru n’Aịzaya na-eme ka anyị na-atụ anya mgbe anyị ga-ekpori ndụ na paradaịs mara ezigbo mma n’ụwa a. (Aịza. 11:​6-9; 35:​5-10; 65:​21-23) Olee mgbe ọ ga-abụ? Ọ ga-abụ mgbe a ga-emezu nkwa ahụ Jizọs kwere onye Juu ahụ bụ́ onye omekome. (Luk 23:43) Ị ga-enweli ike ibi na Paradaịs ahụ. w18.12 7 ¶22-23

Mọnde, Ọgọst 10

Karịa ihe niile ọzọ a ga-eche nche, chebe obi gị.​—Ilu 4:23.

Mmadụ ò nwere ike izetachali echiche niile nke ụwa a? Mba. Ebe anyị ka nọ n’ụwa, anyị agaghị ezetali echiche ya niile. (1 Kọr. 5:​9, 10) Anyị nọrọ n’ozi ọma, anyị na-anụ ihe ndị kweere n’ozizi ụgha na-ekwu. Ọ bụ eziokwu na anyị agaghị ezetachali echiche ụgha ndị a, ma anyị ekwesịghị ịnabata ha ma ọ bụ na-atụgharị ha n’obi anyị. Dị ka Jizọs mere, anyị kwesịrị ịjụ echiche ọ bụla si n’aka Ekwensu. Ma, anyị nwekwara ike ịgbalị zere ihe ọ bụla ga-eme ka anyị hụ ma ọ bụkwanụ nụ ihe ndị si n’echiche ụwa a. Dị ka ihe atụ, anyị kwesịrị ịkpachara anya n’ụdị ndị anyị na-emeta enyi. Baịbụl dọrọ anyị aka ná ntị na ọ bụrụ na anyị na ndị na-anaghị efe Jehova ana-akpachi anya, anyị ga-amụta iche echiche ka ha. (Ilu 13:20; 1 Kọr. 15:​12, 32, 33) Ọ bụrụ na anyị ajụ ntụrụndụ ndị na-akwado ozizi evolushọn, ime mpụ ma ọ bụ mmekọahụ rụrụ arụ, ọ ga-eme ka echiche ndị ahụ “na-emegide ihe ọmụma Chineke” ghara imerụ obi anyị.​—2 Kọr. 10:5. w18.11 21 ¶16-17

Tuzdee, Ọgọst 11

M ga-eje ije n’eziokwu gị.​—Ọma 86:11.

Gịnị ga-enyere anyị aka ịnọgide ná mkpebi anyị mere ịna-eje ije n’eziokwu? Otu ụzọ anyị ga-esi eme ya bụ ịgbalịsi ike na-akụziri ndị mmadụ eziokwu Baịbụl. Ime otú ahụ ga-eme ka anyị jidesie mma agha anyị ike, ya bụ, “okwu Chineke.” (Efe. 6:17) Anyị niile ga-agba mbọ mee ka otú anyị si ezi ihe na-aka mma ma “na-ejizi okwu nke eziokwu ahụ ejizi.” (2 Tim. 2:15) Ka anyị ji Baịbụl na-enyere ndị ọzọ aka ka ha mụta eziokwu ma jụ ozizi ụgha, anyị na-eme ka Okwu Chineke dịgide n’uche nakwa n’obi anyị. Ime otú ahụ ga-eme ka anyị nọgide ná mkpebi anyị mere ịna-eje ije n’eziokwu. Eziokwu bụ onyinye magburu onwe ya Jehova nyere anyị. Ọ bụ eziokwu a mere ka anyị na Nna anyị nke eluigwe dịrị n’ezigbo mma, bụ́ ihe kacha mkpa anyị nwere. Ihe ndị ọ kụziirila anyị kemgbe bụ obere ihe ma e jiri ha tụnyere ihe ndị ọ ka ga-akụziri anyị. O kwere anyị nkwa na ya ga na-akụziri anyị ihe ruo mgbe ebighị ebi. N’ihi ya, jiri eziokwu kpọrọ ezigbo ihe ka pel ọma. Nọgide ‘na-azụta eziokwu, erekwala ya.’​—Ilu 23:23. w18.11 8 ¶2; 12 ¶15-17

Wenezdee, Ọgọst 12

Noa [bụ] onye na-ekwusa ezi omume.​—2 Pita 2:5.

Ọ ga-abụrịrị na ịdọ ndị mmadụ aka ná ntị banyere mbibi a ga-ebibi ndị ọjọọ so n’ozi ọma Noa kwusara tupu Iju Mmiri ahụ. Cheta na Jizọs kwuru, sị: “N’ihi na dị ka ha nọ n’ụbọchị ndị ahụ tupu iju mmiri ahụ, na-eri ihe ma na-aṅụ ihe ọṅụṅụ, ndị ikom ana-alụ nwunye, a na-ekekwa ndị inyom di, ruo ụbọchị Noa banyere n’ụgbọ ahụ; ha amaghịkwa ruo mgbe iju mmiri ahụ bịara wee kpochapụ ha niile, otú ahụ ka ọnụnọ Nwa nke mmadụ ga-adị.” (Mat. 24:​38, 39) N’agbanyeghị na ndị mmadụ egeghị Noa ntị, ọ nọgidere na-adọ ha aka ná ntị otú Chineke gwara ya mee. Taa, anyị na-ekwusara ndị mmadụ ozi ọma Alaeze Chineke ka ha nwee ike ịmata ihe Chineke ga-emere ụmụ mmadụ n’ọdịnihu. Anyị chọsiri ike ka ndị mmadụ nabata ozi ọma ma “dịrị ndụ,” otú ahụ Jehova chọkwara. (Ezik. 18:23) Mgbe anyị na-ekwusa ozi ọma ụlọ n’ụlọ nakwa n’ebe ndị mmadụ na-anọkarị, anyị na-adọkwa ọtụtụ ndị aka ná ntị na Alaeze Chineke ga-abịa bibie ụwa ọjọọ a.​—Ezik. 3:​18, 19; Dan. 2:44; Mkpu. 14:​6, 7. w18.05 19 ¶8-9

Tọzdee, Ọgọst 13

Onye na-ekupụ ikwesị ntụkwasị obi dị ka ume ga-ekwu ihe ziri ezi.​—Ilu 12:17.

Olee ihe i kwesịrị ime ma ndị ọchịchị machibido ọrụ anyị iwu n’ebe i bi, nwụchie gị ma jụọ gị ajụjụ banyere ụmụnna gị? Ì kwesịrị ịgwa ha ihe niile ị ma banyere ha? Gịnị ka Jizọs mere mgbe gọvanọ Rom na-agba ya ajụjụ? E nwere mgbe Jizọs na-ekwughị ihe ọ bụla. O mere ihe a Baịbụl kwuru, nke sịrị na e nwere “oge ịgbachi nkịtị na oge ikwu okwu.” (Ekli. 3:​1, 7; Mat. 27:​11-14) Ọ bụrụ na anyị anọrọ n’ụdị ọnọdụ a, anyị kwesịrị ịdị akọ ka anyị ghara itinye ụmụnna anyị ná nsogbu. (Ilu 10:19; 11:12) Ọ bụrụkwanụ na ị ma na o nwere ezigbo enyi gị ma ọ bụ onye ikwu gị mere mmehie dị oké njọ, olee ihe ị ga-eme? Kwuo “ihe ziri ezi.” I kwesịrị ịgwa ndị okenye eziokwu niile, ọ bụghị izochiri ha ihe ụfọdụ. Ndị okenye kwesịrị ịma ihe niile ka ha nwee ike ikpebi ụzọ kacha mma ha ga-esi nyere nwanna ahụ aka ka ya na Jehova dịghachi ná mma.​—Jems 5:​14, 15. w18.10 10 ¶17-18

Fraịdee, Ọgọst 14

Na-akasirịtanụ ibe unu obi ma na-ewulirịtanụ ibe unu elu.​—1 Tesa. 5:11.

Olee otú anyị nwere ike isi jiri ịhụnanya na-ewuli ndị ọzọ elu? Otu ụzọ anyị nwere ike isi na-eme ya bụ ịna-ege ha ntị nke ọma. (Jems 1:19) Ige nwanna ntị nke ọma na-egosi na ị hụrụ ya n’anya. I nwere ike iji akọ na-ajụ ya ajụjụ ndị na-egosi na ihe banyere ya na-emetụ gị n’obi. Ajụjụ ndị ahụ ga-eme ka ị ghọta otú obi dị ya. Ime otú a ga-eme ka i nweere ya ọmịiko ma gbaa ya ume. Ka otú ihu gị dị gosi na ihe banyere ya na-emetụ gị n’obi. Ọ chọọ ịkọwakwuru gị otú obi dị ya, gee ya ntị nke ọma, gbalịa ka ị ghara ịnara ya okwu n’ọnụ. Ọ bụrụ na i gee ya ntị nke ọma, i nwere ike ịghọta otú obi dị ya. Nke a ga-eme ka ọ tụkwasị gị obi, meekwa ka o gee gị ntị mgbe ị na-agba ya ume. Ọ bụrụ na i gosi na ihe banyere ya na-emetụ gị n’obi, okwu ndị ị ga-agwa ya ga-akasi ya obi. w18.09 14 ¶10; 15 ¶13

Satọdee, Ọgọst 15

Zụta eziokwu.​—Ilu 23:23.

Ọ bụrụ na anyị chọrọ ịzụta eziokwu, anyị ga-ewepụta oge maka ya. Ọ na-ewe oge iji gee ntị n’ozi Alaeze Chineke, ịgụ Baịbụl na akwụkwọ ndị e ji amụ Baịbụl, ịmụ Baịbụl n’onwe anyị, ịkwadebe ihe ndị a ga-amụ n’ọmụmụ ihe, nakwa ịga ọmụmụ ihe. Ka anyị nwee ike ime ihe ndị a, anyị ga-eji oge ndị ahụ anyị gaara eji eme ihe ndị na-adịchaghị anyị mkpa na-eme ha. (Efe. 5:​15, 16) Olee oge ọ na-ewe anyị ịmụta ihe ndị na-ataghị akpụ Baịbụl na-akụzi? Oge o nwere ike iwe otu onye nwere ike ịdị iche n’oge ọ ga-ewe onye ọzọ. Anyị enweghị ike ịmụtacha amamihe Jehova, ụzọ ya, nakwa ihe ndị o kere eke. (Rom 11:33) Ụlọ Nche mbụ e bipụtara kwuru na eziokwu yiri “obere okooko osisi.” O kwukwara, sị: “Afọ ekwesịghị iju gị ma i nweta naanị otu. A sị na otu zuru, a garaghị enwe ndị ọzọ. Na-agba mbọ ka i nwetakwuo.” Anyị dịgodị ndụ ebighị ebi, anyị ka ga na-amụ banyere Jehova. Taa, ihe dị mkpa bụ ka anyị jiri oge anyị na-eme ihe bara uru ka anyị nwee ike ịmụta eziokwu otú anyị nwere ike. w18.11 4 ¶7

Sọnde, Ọgọst 16

Ndị bụ́ di, na-ahụnụ nwunye unu n’anya.​—Efe. 5:25.

Ndị bụ́ di kwesịrị ịna-echebara ndị nwunye ha echiche ma na-aghọta ha. (1 Pita 3:7) Di nke na-aghọta nwunye ya nke ọma ma na ya akaghị nwunye ya mma, ọ bụ eziokwu na e nwere ọtụtụ ụzọ ya na nwunye ya si dịrị iche. (Jen. 2:18) Ọ na-echebara otú obi dị nwunye ya echiche ma na-akwanyere ya ùgwù. Di nke na-eche echiche nke ọma anaghị eleghara otú obi na-adị nwunye ya anya mgbe ya na ụmụ nwaanyị ndị ọzọ na-ekwurịta okwu. Ọ naghị achụ ha ma ọ bụ nwewe mmasị na-adịghị mma n’ebe ha nọ. Ọ naghịkwa enwe ụdị mmasị ahụ ma ọ nọrọ n’Ịntanet. (Job 31:1) N’eziokwu, ọ naghị ahapụ nwunye ya, ọ bụghị naanị n’ihi na ọ hụrụ ya n’anya, kama ọ bụ na ọ hụrụ Jehova n’anya ma kpọọ ihe ọjọọ asị.​—Ọma 19:14; 97:10. w18.09 29 ¶3-4

Mọnde, Ọgọst 17

Onye na-eme onwe ya dị ka onye ka nta n’etiti unu niile bụ onye dị ukwuu.​—Luk 9:48.

Gịnị mere o ji esiri anyị ike ime ihe ndị anyị mụtara n’Okwu Chineke? Otu n’ime ihe kpatara ya bụ na ka anyị nwee ike ime ihe ziri ezi, anyị kwesịrị ịdị umeala n’obi. “N’oge ikpeazụ” a, o siri ike mmadụ ịnọgide na-adị umeala n’obi n’ihi na ọtụtụ ndị bụ “ndị hụrụ naanị onwe ha n’anya, ndị hụrụ ego n’anya, ndị na-anya isi, ndị mpako,” nakwa “ndị na-adịghị ejide onwe ha.” (2 Tim. 3:​1-3) Mgbe ohu Chineke nụrụ ihe ọjọọ ndị mmadụ mere ma ọ bụ otú ha si na-ekpori ndụ, o nwere ike ịkatọ ihe ọjọọ ahụ, ma na-enwere ha anyaụfụ n’ihi otú ihe si na-agara ha. (Ọma 37:1; 73:3) Mmadụ nwedịrị ike ịna-ajụ, sị: ‘Ò nwere uru ọ ga-abara m ma m na-achọ ihe ndị ga-abara ndị ọzọ uru? Ọ bụrụ na m na-eme onwe m “dị ka onye ka nta,” ọ̀ ga-eme ka ndị ọzọ ghara ịna-akwanyere m ùgwù?’ Ọ bụrụ na anyị ana-achọ ihe ga-abara naanị onwe anyị uru otú ụwa si eme, ọ ga-eme ka ọgbakọ ghara ịdị n’otu, meekwa ka o siere ndị mmadụ ike ịmata na anyị bụ Ndị Kraịst. Anyị mụọ banyere ihe ndị ohu Chineke dị umeala n’obi mere ma na-eme ka ha, Jehova ga-agọzi anyị. w18.09 3 ¶1

Tuzdee, Ọgọst 18

A na-enweta obi ụtọ . . . n’inye ihe.​—Ọrụ 20:35.

Ọ bụ eziokwu na e nwere mgbe Jehova nọ naanị ya tupu ya amalite ike ihe, ma ọ naghị eche naanị banyere onwe ya. O mechakwara kee ma ndị mmụọ ozi ma ụmụ mmadụ. Ọ na-atọ Jehova ụtọ imere anyị ihe ọma n’ihi na ọ bụ ‘Chineke onye obi ụtọ.’ (1 Tim. 1:11; Jems 1:17) Ebe ọ bụ na ọ chọkwara ka anyị na-enwe obi ụtọ, ọ na-akụziri anyị ka anyị na-emesapụ aka. (Rom 1:20) Chineke kere mmadụ n’onyinyo ya. (Jen. 1:27) Nke a pụtara na Jehova kere anyị ka anyị na-akpa àgwà ka ya. Ka anyị nwee ike ịna-enwe obi ụtọ, Jehova agọziekwa anyị, anyị kwesịrị ịna-eme ka Jehova. Otú anyị ga-esi eme ya bụ ịna-enwe mmasị n’ebe ndị ọzọ nọ, na ịna-emesapụ aka. (Fil. 2:​3, 4; Jems 1:5) N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na Jehova kere anyị ka anyị na-eme otú ahụ. N’agbanyeghị na anyị ezughị okè, anyị nwere ike ịna-emesapụ aka ka Jehova. Jehova chọrọ ka ụmụ mmadụ na-eṅomi ya. N’ihi ya, obi na-atọ ya ụtọ ma anyị na-emesapụ aka.​—Efe. 5:1. w18.08 18 ¶1-2; 19 ¶4

Wenezdee, Ọgọst 19

Atụrụ m na-ege ntị n’olu m.​—Jọn 10:27.

Ndị Kraịst na-ege Jizọs ntị ma ha na-ege ntị nke ọma n’ihe Jizọs na-ekwu ma na-eme ya eme. Ha anaghị ekwe ka “nchegbu nke ndụ” megharịa ha anya. (Luk 21:34) Kama, ihe ka ha mkpa ná ndụ bụ ime ihe Jizọs nyere ha n’iwu, ma mgbe o siiri ha ike ime otú ahụ. Ụmụnna anyị ka nọgidere na-efe Jehova, ihe ọ sọkwara ya mee. Ihe ọzọ anyị ga-eme iji gosi na anyị na-ege Jizọs ntị bụ ịna-erubere ndị na-edu ndú n’ọgbakọ isi. (Hib. 13:​7, 17) E nweela ọtụtụ ihe a gbanwerela ná nzukọ Jehova n’oge na-adịbeghị anya. Ụfọdụ n’ime ha bụ ihe ọhụrụ ndị anyị ga-eji na-ezi ozi ọma, otú anyị ga-esi na-ezi ozi ọma, otú anyị sizi enwe ọmụmụ ihe etiti izu, na otú anyị si arụ ma na-arụzigharị Ụlọ Nzukọ Alaeze anyị. Ihe ndị a niile bụ maka ọdịmma anyị. Ha na-egosi na nzukọ Jehova hụrụ anyị n’anya, obi dịkwa anyị ụtọ maka ha. Obi siri anyị ike na Jehova ga-agọzi mbọ anyị na-agba ime ihe nzukọ ya gwara anyị mee. w19.03 10-11 ¶11-12

Tọzdee, Ọgọst 20

Ka anyị wee ghara ịbụkwa . . . ndị ifufe ozizi ọ bụla na-ebugharị, site n’aghụghọ nke ụmụ mmadụ.​—Efe. 4:14.

Akụkọ na-abụchaghị eziokwu nwere ike iduhie mmadụ. Anyị nwere ike ịmụta ihe n’ihe mere ụmụ Izrel bi n’ebe ọdịda anyanwụ Osimiri Jọdan n’oge Jọshụa. (Jọsh. 22:​9-34) Ha nụrụ na ụmụ Izrel ndị bi n’ebe ọwụwa anyanwụ arụọla nnukwu ebe ịchụàjà. Ihe ụfọdụ a kọrọ n’akụkọ ahụ bụ eziokwu. Ebe ọ bụ na ụmụ Izrel ndị bi n’ebe ọdịda anyanwụ amachaghị ihe niile merenụ, ha kwuru na ụmụnne ha ndị bi n’ebe ọwụwa anyanwụ enupụrụla Jehova isi. (Jọsh. 22:​9-12) Ma tupu ha emee ihe ọ bụla, ha bu ụzọ zipụ ụfọdụ ndị ka ha gaa sie imi n’ala chọpụta nke bụ́ eziokwu. Gịnị ka ha chọpụtara? Ha rụrụ ebe ịchụàjà n’eziokwu, ma ọ bụghị ka ha nọrọ na ya na-achụ àjà, kama ka ọ bụrụ ihe àmà, ka ụmụ niile ha ga-amụta n’ọdịnihu mara na ha na-efe Jehova. Chegodị otú obi si tọọ ụmụ Izrel ụtọ na ha asụghị ụmụnne ha akwụ n’ihi ihe na-abụchaghị eziokwu ha nụrụ, kama na ha bu ụzọ jụọ ase ka ha mata nke bụ́ eziokwu. w18.08 5 ¶9-10

Fraịdee, Ọgọst 21

Ka onye chere na ya guzosiri ike lezie anya ka ọ ghara ịda.​—1 Kọr. 10:12.

Dị ka Pọl kwuru, ezigbo ndị ohu Chineke nwedịrị ike ime ihe ọjọọ. Ha nwere ike na-eche na ihe ha na-eme dị Jehova mma. Ma mmadụ ịchọ ịbụ enyi Jehova ma ọ bụ ikwu na ya na-erubere ya isi apụtaghị mgbe niile na ihe onye ahụ na-eme dị Jehova mma. (1 Kọr. 10:​1-5) Mgbe Mozis gburu oge isi na Saịnaị gbadata otú ndị Izrel na-atụghị anya ya, ha malitere ichegbu onwe ha. Ọ bụrụ na Jehova ebibighị ụwa ochie a ngwa ngwa otú anyị tụrụ anya ya, anyị nwekwara ike ịna-echegbu onwe anyị. Anyị nwere ike ịna-eche na ọdịnihu ahụ magburu onwe ya Chineke kwere anyị ná nkwa ka dị anya, ma ọ bụdị na ọ gaghị abịa abịa. Nke a nwere ike ime ka anyị mewe ihe anyị chọrọ kama ime ihe Jehova chọrọ. Ọ bụrụ na anyị akpachaghị anya, anyị nwere ike iji nwayọọ nwayọọ hapụ Jehova ma malite ime ihe ndị anyị na-echetụbeghị n’echiche na anyị nwere ike ime. w18.07 21 ¶17-18

Satọdee, Ọgọst 22

M ga-emekwa ihe a i kwuru okwu ya, n’ihi na ihe gị masịrị m, amakwaara m gị n’aha.​—Ọpụ. 33:17.

Jehova ga-agọzi anyị mmaji kwuru mmaji ma ọ mara anyị. Ma, olee ihe anyị ga-eme ka Jehova mara anyị? Ọ bụ ịhụ ya n’anya, nakwa inyefe ya onwe anyị. (1 Kọr. 8:3) Ma, anyị ekwesịghị iji adịm ná mma anyị na Nna anyị nke eluigwe gwuo egwu. Anyị kwesịrị ịna-eme ihe Ndị Kraịst nọ na Galeshia Pọl degaara akwụkwọ ozi mere. Anyị ekwesịghị ịna-agbara ihe “ndị na-adịghị ike na ndị na-enweghị isi” dị n’ụwa ohu, ya na ịchọ ka ụwa na-eto anyị. (Gal. 4:9) Ụmụnna ndị ahụ nọ na Galeshia ma Chineke, Chineke amarakwa ha. Ma, Pọl sịrị na ha “na-agaghachi” n’ihe ndị na-enweghị isi. Ihe Pọl na-ekwu bụ na “ugbu a ha maara Chineke, gịnị mere ha ji laghachi n’ihe ndị na-enweghị isi, ma ọ bụ ihe ndị na-abaghị uru ha hapụrụ?” w18.07 8 ¶5-6

Sọnde, Ọgọst 23

Onye maara ihe ga-ege ntị ma nwetakwuo ntụziaka.​—Ilu 1:5.

Anyị ekwesịghị ibu ụzọ taa ahụhụ n’ihi imebi iwu Chineke tupu anyị amụta ihe. Anyị ga-amụta ihe n’aka ndị mere mmehie n’oge gara aga e dere banyere ha n’Okwu Chineke. N’eziokwu, anyị na-amụta ihe n’aka Chineke mgbe anyị na-agụ banyere ndị a kọrọ akụkọ ha na Baịbụl ma na-echebara ha echiche. Dị ka ihe atụ, chegodị otú obi si gbawaa Eze Devid mgbe ya na Bat-shiba kwara iko ma si otú ahụ nupụrụ Jehova isi. (2 Sam. 12:​7-14) Anyị gụọ akụkọ a ma chebara ya echiche, anyị nwere ike jụọ onwe anyị, sị: ‘Olee otú Eze Devid gaara esi gbaara nsogbu a ọsọ? Ọ bụrụ na ụdị ọnwụnwa a abịara m, m̀ ga-akatali obi gbaara ya ọsọ? M̀ ga-agba ọsọ ka Josef, ka m̀ ga-eme ka Devid?’ (Jen. 39:​11-15) Anyị chebara nsogbu mmehie nwere ike ịkpatara anyị echiche, ọ ga-eme ka anyị kata obi ‘kpọọ ihe ọjọọ asị.’​—Emọs 5:15. w18.06 17 ¶5, 7

Mọnde, Ọgọst 24

Kwụọnụ Siza ihe Siza, ma kwụọnụ Chineke ihe Chineke.​—Mat. 22:21.

Ikpe na-ezighị ezi juru ebe niile na-eme ka ndị mmadụ na-etinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị. N’oge Jizọs, ịkwụ ụtụ isi mere ka ọtụtụ ndị tinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị. Ndị Rom chọrọ ka ndị ha na-achị, ma ndị gere Jizọs ntị na-akwụ ụtụ isi maka ala, ụlọ, na ihe ndị ọzọ. Ndị ọnaụtụ na-arụrụ aka nke mere ka nsogbu ịkwụ ụtụ isi ka njọ. Mgbe ụfọdụ, ha na-akwụ ndị nọ n’ọkwá ukwu ụgwọ ka ha nye ha ikike ịnakọta ụtụ isi. Ha na-esizi n’ego ndị ahụ ha nakọtara enweta nnukwu ego. Zakịọs, onyeisi ndị ọnaụtụ bi na Jeriko bara ọgaranya n’ihi na ọ na-eme ka ndị mmadụ na-akwụ nnukwu ụgwọ. (Luk 19:​2, 8) Ọ ga-abụ na ọtụtụ ndị ọnaụtụ na-emekwa ihe a ọ na-eme. Ndị iro Jizọs gbalịrị ime ka o tinye ọnụ n’ihe gbasara ịkwụ ụtụ isi. Ha jụrụ ya banyere “ụtụ isi,” ya bụ, otu mkpụrụ ego ndị Rom chọrọ ka ndị ha na-achị kwụọ. (Mat. 22:​16-18) Ịkwụ ụtụ isi a na-ewe ndị Juu ezigbo iwe n’ihi na ọ na-echetara ha na ọ bụ ndị Rom na-achị ha. w18.06 5-6 ¶8-10

Tuzdee, Ọgọst 25

Mkpụrụ ọ bụla mmadụ na-agha, ọ bụ ya ka ọ ga-aghọrọkwa.​—Gal. 6:7.

Ịdụnyere Setan úkwù na-akpatakarị nsogbu. (Job 21:​7-17; Gal. 6:8) Olee uru ọ ga-abara anyị ma anyị mata otú Setan siruru n’ike? Ọ na-enyere anyị aka ile ndị ọchịchị anya otú kwesịrị ekwesị, ma mee ka anyị na-ekwusa ozi ọma. Anyị ma na Jehova chọrọ ka anyị na-akwanyere ndị ọchịchị ùgwù. (1 Pita 2:17) Ọ chọkwara ka anyị na-erubere iwu ha isi ọ bụrụhaala na iwu ndị ahụ emegideghị nke ya. (Rom 13:​1-4) Ma, anyị ghọtara na anyị ekwesịghị itinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị. Anyị ekwesịtụdịghị ịdụnyere òtù ndọrọ ndọrọ ọchịchị ma ọ bụ onye ọchịchị ọ bụla úkwù. (Jọn 17:​15, 16; 18:36) Ebe anyị ma na Setan chọrọ ime ka ndị mmadụ ghara ịma aha Jehova ma mee ka a na-ekwujọ ya, anyị na-agbalị ịkụziri ndị mmadụ ihe bụ́ eziokwu banyere Chineke. Obi dị anyị ụtọ na anyị na-aza aha Chineke, na-akpọkwa aha ya. Ịhụ Chineke n’anya na-aba ezigbo uru karịa ego na ihe onwunwe.​—Aịza. 43:10; 1 Tim. 6:​6-10. w18.05 24 ¶8-9

Wenezdee, Ọgọst 26

Nwunye ekwesịghị ịhapụ di ya.​—1 Kọr. 7:10.

Ọ bụrụ na di na nwunye enwee nsogbu, ihe ga-egbo ya ọ̀ bụ ha ịhapụ ibe ha? Baịbụl ekwughị ihe ndị nwere ike ime ka di na nwunye hapụ ibe ha. Pọl kwuru, sị: “Nwaanyị nke nwere di na-ekweghị ekwe, ma nwoke ahụ ekweta ka ya na ya biri, ka ọ ghara ịhapụ di ya.” (1 Kọr. 7:​12, 13) Ihe a Baịbụl kwuru gbasakwara oge anyị a. Ma enweela mgbe ụfọdụ “di na-ekweghị ekwe” mere ihe nwere ike igosi na o ‘kwetaghị ka ya na nwunye ya biri.’ Dị ka ihe atụ, o nwere ike ịbụ na ọ na-akụ nwunye ya isi aba okpu nke na nwunye ya nwedịrị ike chewe na ọ ga-egbu ya otu ụbọchị. O nwekwara ike ịbụ na ọ chọghị ịna-akpa afọ nwunye ya na ụmụ ya, ma ọ bụ na ọ chọghịkwa ka o fee Jehova. N’ihi ya, nwunye bụ́ Onye Kraịst nwere ike kpebie na n’agbanyeghị ihe di ya nwere ike ikwu, na di ya ‘ekwetaghị ka ya na ya biri,’ nakwa na ọ dị mkpa ka ya hapụ ya. Ma, Ndị Kraịst ndị ọzọ nọ n’ụdị ọnọdụ a ekpebiela na ha agaghị ahapụ di ha. Ha ediela ọnọdụ ha ma gbaa mbọ ime ka alụmdi na nwunye ha ka mma. w18.12 13 ¶14, 16; 14 ¶17

Tọzdee, Ọgọst 27

Ndị ahụ . . . bụ ndị . . . [ji] ntachi obi na-amị mkpụrụ.​—Luk 8:15.

N’ihe atụ Jizọs mere gbasara ọgha mkpụrụ na Luk 8:​5-8, 11-15, mkpụrụ ahụ bụ “okwu Chineke,” ma ọ bụ ozi ọma Alaeze Chineke. Ala ahụ nọchiri anya obi mmadụ. Mkpụrụ ahụ nke dara n’ala dị mma bịara nwee mgbọrọgwụ, pulite ma ‘mịa mkpụrụ okpukpu otu narị.’ Otú ahụ osisi wit ahụ e kwuru banyere ya ná mmalite amịghị osisi ọhụrụ, kama mkpụrụ ọhụrụ, otú ahụkwa ka mkpụrụ anyịnwa na-amị abụghị ndị na-eso ụzọ ọhụrụ, kama mkpụrụ ọhụrụ. Olee otú anyị si amị mkpụrụ ọhụrụ? Mgbe ọ bụla anyị gwara mmadụ gbasara Alaeze Chineke, o yiri ka ànyị na-aghasa mkpụrụ ahụ a kụrụ n’obi anyị. (Luk 6:45; 8:1) N’ihi ya, ihe atụ a na-akụziri anyị na ọ bụrụhaala na anyị anọgide na-ekwusa ozi ọma Alaeze Chineke, anyị ji “ntachi obi na-amị mkpụrụ.” w18.05 14 ¶10-11

Fraịdee, Ọgọst 28

Ndị niile m hụrụ n’anya nke ukwuu ka m na-abara mba, na-adọkwa aka ná ntị.​—Mkpu. 3:19.

Ọ bụghị naanị na Pọl dị njikere ịgba ụmụnna ya ume, kama ọ dịkwa njikere ‘ikwe ka e jiri ya mee ihe n’ụzọ zuru ezu,’ maka ha. (2 Kọr. 12:15) Ndị okenye kwesịkwara ime ka Pọl. Ọ bụghị naanị okwu ọnụ ka ha kwesịrị iji na-agba ụmụnna ha ume, kama ha kwesịkwara igosi na ihe banyere ụmụnna ha na-emetụ ha n’obi, si otú ahụ gbaa ha ume. (1 Kọr. 14:3) Mgbe ụfọdụ, ndị okenye kwesịrị inye ụmụnna ha ndụmọdụ iji gbaa ha ume. Ha kwesịrị isi na Baịbụl mụta otú ha ga-esi eme ya. Mgbe a kpọlitere Jizọs n’ọnwụ, o gosiri anyị ụzọ magburu onwe ya anyị kwesịrị isi enye ndụmọdụ mgbe o zigaara ọgbakọ ndị dị n’Eshia Maịnọ ozi. O nwere ndụmọdụ ụfọdụ gbara ọkpụrụkpụ ọ ga-enye ọgbakọ ndị dị n’Efesọs, Pagamọm, na Tayataịra. Ma, tupu ya enye ha ndụmọdụ ndị ahụ, ọ jara ha mma maka ihe ọma niile ha na-eme. (Mkpu. 2:​1-5, 12, 13, 18, 19) Ndị okenye kwesịkwara iṅomi Kraịst ma ha nyewe ndụmọdụ. w18.04 22 ¶8-9

Satọdee, Ọgọst 29

Unu ndị bụ́ nna, . . . na-azụlitenụ [ụmụ unu] n’ọzụzụ na nduzi echiche nke si n’aka Jehova.​—Efe. 6:4.

Ndị nne na nna, o doro anya na unu na-agbasi mbọ ike ime ka ụmụ unu ghara ịrịa ọrịa. Unu na-edebe ụlọ unu ọcha, na-etufu ihe ọ bụla nwere ike ime ka unu na ụmụ unu na-arịa ọrịa. Unu kwesịkwara inyere ụmụ unu aka ka ha ghara ịna-ele fim, ihe ndị a na-egosi na Tiivi, igwu egwuregwu kọmputa, na ịga n’Ịntanet, ndị nwere ike ime ka ha na-eche echiche ka Setan. Jehova enyela unu ọrụ inyere ụmụ unu aka ịbụ enyi ya. (Ilu 1:8) N’ihi ya, atụla ụjọ iji ihe Baịbụl kwuru gwa ụmụ unu ihe ndị ha ga-eme, na ihe ndị ha na-agaghị eme. Gwa ha ihe ndị ha nwere ike ile na ndị ha na-agaghị ele, nyekwara ha aka ka ha ghọta ihe mere i ji kwuo otú ahụ. (Mat. 5:37) Ka ụmụ unu na-etolite, kụziere ha ka ha jiri aka ha chọpụta ihe Jehova kwuru na ọ bụ ihe dị mma na ihe na-adịghị mma. (Hib. 5:14) Cheta na ụmụ unu ga-aka amụta ihe n’ihe ndị unu na-eme.​—Diut. 6:​6, 7; Rom 2:21. w19.01 16 ¶8

Sọnde, Ọgọst 30

Unu ndị agadi nakwa ụmụ okoro. Ka ha too aha Jehova.​—Ọma 148:​12, 13.

Ọ bụrụ na ị bụ Onye Kraịst na-eto eto, ọ̀ bụ na ọ gaghị adị mma ka ị na-enwe mmasị n’ebe ndị agadi nọ? I nwere ike iwetu obi gwa ha ka ha kọọrọ gị ihe ndị merela ná ndụ ha kemgbe ọtụtụ afọ ha na-ejere Jehova ozi. Ihe ha ga-akọrọ gị ga-agba gị ume. Ọ ga-emekwa ka gị na ha na-eme ka ìhè nke eziokwu na-enwukwu. Onye ọ bụla n’ime anyị ga-agbalị na-anabata ndị bịara ọmụmụ ihe n’Ụlọ Nzukọ Alaeze anyị. Ọ bụrụ na a gwara gị duzie nzukọ ozi ubi, gbalịa nyere ndị agadi aka ka ha soro na-aga ozi ọma. Hà nwere ebe ga-adịrị ha mfe ịna-ezi ozi ọma? Mgbe ụfọdụ, i nwere ike ịgwa ụmụnna na-akatabeghị ahụ́ ka ha na ha rụọ ka ha nwee ike inyere ha aka. I nwekwara ike igosi ndị ọrịa na ndị ọnọdụ ha na-anaghị ekwecha gaa ozi ọma na ị hụrụ ha n’anya. N’agbanyeghị afọ ndụ ha ma ọ bụ afọ ole ha nọrọla n’ọgbakọ, otú i si na-enyere ha aka ga-eme ka ha jiri ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ozi ọma.​—Lev. 19:32. w18.06 23-24 ¶10-12

Mọnde, Ọgọst 31

Ka nnwere onwe unu ghara ịbụ ihe unu ga-eji na-ekpuchi ihe ọjọọ, kama nwerenụ onwe unu dị ka ndị ohu Chineke.​—1 Pita 2:16.

Anyị ekwesịghị iwere ihe ọma Chineke mere gbapụta anyị n’ịbụ ohu nke mmehie na ọnwụ, ka ihe na-abaghị uru. N’ihi àjà Jizọs ji ndụ ya chụọ, anyị nwere ike iji akọnuche dị ọcha na-efe Chineke anyị, obi ana-atọkwa anyị ụtọ na anyị na-efe ya. (Ọma 40:8) Ọ bụ eziokwu na anyị kwesịrị igosi na obi dị anyị ụtọ maka nnwere onwe Chineke mere ka anyị nwee, anyị kwesịkwara ịkpachara anya ka anyị ghara iji ya mee ihe na-abaghị uru. Pita onyeozi dọrọ anyị aka ná ntị ka anyị ghara ịkụdo aka ná nnwere onwe a anyị nwere, na-eme ihe na-agụ anụ ahụ́ anyị agụụ. Aka ná ntị a na-echetara anyị ihe mere ndị Izrel mgbe ha nọ n’ala ịkpa. Taa, aka ná ntị a dị anyị ezigbo mkpa karịchaa. Setan na ụwa ya na-ewepụta ọtụtụ ihe ndị nwere ike ịdọrọ anya anyị. Ụfọdụ n’ime ha bụ ejiji, ihe oriri na ihe ọṅụṅụ, ihe ndị e ji atụrụ ndụ, nakwa ọtụtụ ihe ndị ọzọ. Ndị ma nke a na-akọ n’ịkpọsa ngwá ahịa na-eji ndị bụ́ asampete na-akpọsa ngwá ahịa ha iji mee ka anyị zụrụ ihe ndị na-adịghị anyị mkpa. O nwere ike ịdị mfe iji ha megharịa anyị anya, anyị ejirizie nnwere onwe anyị mewe ihe ndị na-abaghị uru. w18.04 10 ¶7-8

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya