Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • es20 p. 88-98
  • Septemba

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Septemba
  • Inyocha Akwụkwọ Nsọ Kwa Ụbọchị—2020
  • Isiokwu Nta
  • Tuzdee, Septemba 1
  • Wenezdee, Septemba 2
  • Tọzdee, Septemba 3
  • Fraịdee, Septemba 4
  • Satọdee, Septemba 5
  • Sọnde, Septemba 6
  • Mọnde, Septemba 7
  • Tuzdee, Septemba 8
  • Wenezdee, Septemba 9
  • Tọzdee, Septemba 10
  • Fraịdee, Septemba 11
  • Satọdee, Septemba 12
  • Sọnde, Septemba 13
  • Mọnde, Septemba 14
  • Tuzdee, Septemba 15
  • Wenezdee, Septemba 16
  • Tọzdee, Septemba 17
  • Fraịdee, Septemba 18
  • Satọdee, Septemba 19
  • Sọnde, Septemba 20
  • Mọnde, Septemba 21
  • Tuzdee, Septemba 22
  • Wenezdee, Septemba 23
  • Tọzdee, Septemba 24
  • Fraịdee, Septemba 25
  • Satọdee, Septemba 26
  • Sọnde, Septemba 27
  • Mọnde, Septemba 28
  • Tuzdee, Septemba 29
  • Wenezdee, Septemba 30
Inyocha Akwụkwọ Nsọ Kwa Ụbọchị—2020
es20 p. 88-98

Septemba

Tuzdee, Septemba 1

Ọ bụ ezie na unu ahụghị ya, unu hụrụ ya n’anya.​—1 Pita 1:8.

Jizọs gosiri na ihe banyere Mata na Meri metụrụ ya n’obi. “Anya mmiri gbara Jizọs” mgbe ọ hụrụ ka ha na-akwa ákwá n’ihi ọnwụ nwanne ha nwoke bụ́ Lazarọs. (Jọn 11:​32-35) Ihe mere o ji bee ákwá abụghị naanị n’ihi na ya na enyi ya Lazarọs agaghịzi anọ. A sị ka e kwuwe, Jizọs ma na ya na-aga ịkpọlite ya n’ọnwụ. Kama, o bere ákwá n’ihi na ọ ghọtara otú obi si na-agbawa ezigbo ndị enyi ya n’ihi ọnwụ nwanne ha nwoke. Ọ ga-abara anyị ezigbo uru ma anyị mụọ gbasara otú ihe gbasara ndị ọzọ si metụ Jizọs n’obi. Nke bụ́ eziokwu bụ na anyị ezughị okè ka Jizọs. Anyị hụrụ ya n’anya n’ihi na ọ na-enwere ndị mmadụ ọmịiko. Obi dị anyị ụtọ ịmata na Jizọs na-achị ugbu a ka Eze nke Alaeze Chineke. N’oge na-adịghị anya, ọ ga-eme ka ahụhụ niile kwụsị. Ebe ọ bụ na Jizọs adịtụla ndụ ka mmadụ, ọ bụ ya ga-akacha eme ka ụmụ mmadụ nwere onwe ha n’ahụhụ ọchịchị Setan kpataara ha. N’eziokwu, obi dị anyị ụtọ na anyị nwere Onye Ọchịchị nwere ike “imere anyị ebere n’adịghị ike anyị.”​—Hib. 2:​17, 18; 4:​15, 16. w19.03 17 ¶12-13

Wenezdee, Septemba 2

Ọ dịghị onye pụrụ ịbịakwute m ma ọ bụrụ na Nna m, bụ́ onye zitere m, adọtaghị ya.​—Jọn 6:44.

Anyị nwere ike inyere ndị mmadụ aka ịmụta gbasara Chineke, ma ọ bụghị anyị na-arụ ihe kacha mkpa n’ọrụ a. (1 Kọr. 3:​6, 7) Ọ bụ Jehova na-adọta ndị mmadụ n’ebe ọ nọ. Ihe ga-eme ka mmadụ nabata ozi ọma anyị ma ọ bụ jụ ya bụ otú obi ya dị. (Mat. 13:​4-8) Cheta na n’agbanyeghị na Jizọs bụ Onye Ozizi kachanụ dịtụrụla ndụ n’ụwa, ọtụtụ ndị egeghị ya ntị. N’ihi ya, ike ekwesịghị ịgwụ anyị ma ọ bụrụ na ọtụtụ ndị anyị chọrọ izi ozi ọma egeghị anyị ntị. Ndị mmadụ ga-ege anyị ntị ma anyị gosi ha na ihe banyere ha na-emetụ anyị n’obi mgbe anyị nọ n’ozi ọma. Ọ ga-eme ka ozi anyị na-atọkwu anyị ụtọ. Anyị ga-achọpụta na a na-enweta obi ụtọ ka ukwuu n’inye ihe. Ọ ga-emekwa ka ọ dịrịkwuo ndị “nwere ezi obi maka inweta ndụ ebighị ebi” mfe ịnụ ozi ọma. (Ọrụ 13:48) N’ihi ya, “ọ bụrụhaala na anyị nwere oge dị mma maka ya, ka anyị na-eme ihe ọma n’ebe mmadụ niile nọ.” (Gal. 6:10) Anyị mee otú ahụ, anyị ga-enwe obi ụtọ na anyị mere ka e too Nna anyị nke eluigwe.​—Mat. 5:16. w19.03 25 ¶18-19

Tọzdee, Septemba 3

M ga-anọ n’ime ọgbakọ too gị.​—Ọma 22:22.

Eze Devid kwuru, sị: “Jehova dị ukwuu, kwesịkwa nnọọ ka e too ya.” (Ọma 145:3) Ọ hụrụ Jehova n’anya, ya emee ka o too Chineke “n’ime ọgbakọ.” (1 Ihe 29:​10-13; Ọma 40:5) Taa, otu ụzọ anyị si eto Jehova bụ ịza ajụjụ n’ọmụmụ ihe. Obi na-atọ anyị ụtọ ma anyị nụ azịza dị iche iche ụmụnna anyị na-aza n’ọmụmụ ihe. Obi na-atọkwa anyị ụtọ ma anyị nụ ka ụmụaka ji obi ha niile na-aza ajụjụ dị nkenke. Ọ na-agba anyị ume ma anyị nụ otú nwanna si jiri obi ụtọ na-ekwu banyere eziokwu ọ mụtara. Obi na-atọ anyị ụtọ ịhụ ụmụnna anyị ndị ‘gbasiri mgba ike’ ịza ajụjụ, n’agbanyeghị ihere ma ọ bụ na ha ka na-amụ asụsụ anyị amụ. (1 Tesa. 2:2) Olee otú anyị ga-esi egosi na obi dị anyị ụtọ maka mbọ ha na-agba? A gbasaa ọmụmụ ihe, anyị nwere ike ikele ha maka azịza na-agba ume ha zara. Otú ọzọ anyị ga-esi egosi na obi dị anyị ụtọ bụ anyịnwa ịna-aza ajụjụ. Nke a ga-egosi na anyị na-agba ụmụnna anyị ume, ọ bụghị naanị hanwa ịgba anyị ume.​—Rom 1:​11, 12. w19.01 8 ¶1-2; 9 ¶6

Fraịdee, Septemba 4

Gosikwanụ na unu bụ ndị nwere ekele.​—Kọl. 3:15.

E nwere ụmụ nwoke iri nọ n’ọnọdụ ọjọọ. Ha bụ ndị ekpenta, ha enweghịkwa olileanya na ha ga-agbake. Ma otu ụbọchị, ha nọ ebe dị anya hụ Jizọs, bụ́ Onye Ozizi Ukwu. Ha nụrụ na Jizọs na-agwọ ụdị ọrịa dị iche iche. N’ihi ya, ha tiri mkpu, sị: “Jizọs, Onye Ozizi, meere anyị ebere!” Jizọs gwọrọ ha niile. O doro anya na obi tọrọ ha niile ụtọ maka ihe o meere ha. Ma, ọ bụ naanị otu n’ime ha, bụ́ onye Sameria, bịara kelee Jizọs iji gosi na obi dị ya ụtọ. Nwoke ahụ ji “oké olu” nye Chineke otuto. (Luk 17:​12-19) Anyị kwesịkwara ịna-ekele ndị meere anyị ihe ọma otú ahụ onye Sameria ahụ mere. Jehova mere ihe anyị kwesịkwara ime ma a bịa n’ikele ndị meere anyị ihe ọma. Otu ụzọ o si eme ya bụ ịgọzi ndị na-erubere ya isi. (2 Sam. 22:21; Ọma 13:6; Mat. 10:​40, 41) Baịbụl gbakwara anyị ume ka anyị bụrụ “ndị na-eṅomi Chineke, dị ka ụmụ a hụrụ n’anya.” (Efe. 5:1) N’ihi ya, ihe kacha mkpa mere anyị ji kwesị ikele ndị meere anyị ihe ọma bụ na anyị chọrọ iṅomi Jehova. w19.02 14 ¶1-2; 15 ¶4

Satọdee, Septemba 5

M gaghị akwụsị iguzosi ike n’ezi ihe!​—Job 27:5.

Otu nwata nwaanyị nọ na klas medara obi gwa onye nkụzi ha na ya agaghị eso eme otu ememme na-adịghị Chineke mma. Otu nwa okorobịa ihere na-eme nọ na-ekwusa ozi ọma ụlọ n’ụlọ chọpụtara na nwa klas ha bi n’ụlọ ọzọ ọ na-aga izi ozi ọma. Nwa klas ya a akwabuola Ndịàmà Jehova emo. Otu nwoke na-arụsi ọrụ ike ka o gbooro ndị ezinụlọ ya mkpa ha. Onye ọ na-arụrụ ọrụ gwara ya na ya chọrọ ka ọ rụrụọ aka ma ọ bụ mee ihe iwu na-akwadoghị. Ọ bụ eziokwu na o nwere ike ịchụ ya n’ọrụ ma ọ jụ ime ya, ma nwoke ahụ gwara ya na ya ga-akwụwa aka ya ọtọ ma mee ihe iwu kwuru, n’ihi na Chineke chọrọ ka ndị na-efe ya na-eme otú ahụ. (Rom 13:​1-4; Hib. 13:18) Olee àgwà mmadụ atọ ahụ nwere? Ọ ga-abụ na ị chọpụtara na ha nwere àgwà ndị dị ka obi ike, ime ihe n’eziokwu nakwa ọtụtụ àgwà ndị ọzọ. Ma e nwere ihe dị ezigbo mkpa ha mere. Ha kwesịrị ntụkwasị obi. Onye ọ bụla n’ime ha rubeere Jehova isi. Ha jụrụ imebi iwu Jehova. Ihe mere ha ji jụ ime ihe ndị ahụ bụ na ha na-ekwesị ntụkwasị obi. Obi ga-atọ Jehova ụtọ n’ihi otú onye nke ọ bụla n’ime ha si kwesị ntụkwasị obi. Anyị chọkwara ime ka obi na-atọ Nna anyị nke eluigwe ụtọ. w19.02 2 ¶1-2

Sọnde, Septemba 6

Iwu ahụ nwere onyinyo nke ihe ọma ndị gaje ịbịa.​—Hib. 10:1.

Ndị Iwu ahụ na-echebe karịchaa bụ ndị na-enweghị ike ichebe onwe ha, dị ka ụmụ na-enweghị nne na nna, ụmụ nwaanyị di ha nwụrụ, na ndị mbịarambịa. A gwara ndị ikpe Izrel, sị: “Agbagọla ikpe nke onye mbịarambịa ma ọ bụ nke nwa na-enweghị nna, achịrịla uwe nwaanyị di ya nwụrụ dị ka ihe ibé.” (Diut. 24:17) Ihe gbasara ndị na-enweghị ka ọ hà ha n’obodo metụrụ Jehova n’obi. Ọ takwara ndị megburu ha ahụhụ. (Ọpụ. 22:​22-24) Jehova chọrọ ka ndị o nyere ọrụ ilekọta ndị ya na-ahụ ndị ha na-elekọta n’anya. Ọ kpọrọ idina nwaanyị n’ike, mmadụ na onye ikwu ya inwe mmekọahụ, na idina ụmụaka asị. Ọ chọkwara ka e chebe mmadụ niile, nke ka nke, ndị ọ na-enweghị ka ọ hà ha. Onye kpakwara àgwà ọjọọ ndị a na-aza Jehova ajụjụ. (Lev. 18:​6-30) O doo anyị anya na Jehova na-emeso anyị ihe otú dị mma, anyị ga-ahụkwu ya n’anya. Anyị hụ Chineke n’anya ma jiri iwu ya kpọrọ ihe, ọ ga-eme ka anyị hụ ndị ọzọ n’anya, na-emesokwa ha ihe otú dị mma. w19.02 24-25 ¶22-26

Mọnde, Septemba 7

Jụ asọpụrụghị Chineke na ọchịchọ nke ụwa.​—Taị. 2:12.

Ka anyị tụlee otu ihe atụ nke gosiri otú anyị nwere ike isi echebe onwe anyị ka anyị ghara ịna-eche echiche ka Setan. Jehova akụzierela anyị na e kwesịghị “ịkpọtụdị ịkwa iko na ụdị adịghị ọcha ọ bụla ma ọ bụ anyaukwu aha n’etiti [anyị].” (Efe. 5:3) Ma olee ihe anyị ga-eme ma ndị ọgbọ anyị anyị na ha na-arụkọ ọrụ ma ọ bụ ụmụ akwụkwọ ibe anyị malite ikwu gbasara ịkwa iko? Akọnuche anyị nwere ike ịdọ anyị aka ná ntị banyere ya. (Rom 2:15) Ma ànyị ga-egenụ ya ntị? E nwere ike ịnwa anyị ka anyị na-ege ndị ọgbọ anyị ntị ma ọ bụ na-ele foto ndị ha nwere ike igosi anyị. Ma anyị kwesịrị izere nsogbu ahụ. Otú anyị ga-esi zere ya bụ ịgbanwe ihe anyị na ha na-ekwu ma ọ bụ anyị esi ebe ahụ pụọ. Anyị kwesịrị ịkata obi ka anyị nwee ike imeri nsogbu ndị ọgbọ anyị na-enye anyị iche ihe ọjọọ ma ọ bụ ime ihe ọjọọ ka ha. Obi kwesịrị isi anyị ike na Jehova na-ahụ mbọ anyị na-agba, ọ ga-enyekwa anyị ike na amamihe anyị ga-eji gbaara echiche Setan ọsọ.​—2 Ihe 16:9; Aịza. 40:29; Jems 1:5. w19.01 17-18 ¶12-13

Tuzdee, Septemba 8

Mụ onwe m tụgharịrị lee ọrụ niile aka m rụrụ . . . , ma, lee! ihe niile bụ ihe efu, . . . ọ dịghịkwa ihe ọ bụla bara uru.​—Ekli. 2:11.

Sọlọmọn bụ́ eze dị ike ma baa ezigbo ọgaranya mere nchọpụta. Ọ sịrị: ‘Ka m nwalee ịṅụrị ọṅụ, hụkwa ihe ọma ga-esi na ya pụta.’ (Ekli. 2:​1-10) Ọ rụrụ ọtụtụ ụlọ, rụọ ogige ọma dị iche iche, meekwa ihe ọ bụla masịrị ya. N’ikpeazụ, ihe ndị ahụ niile ò mere ka Sọlọmọn nwee obi ụtọ ná ndụ ya? Sọlọmọn ji ọnụ ya zaa ajụjụ a n’ihe mmụta dịịrị ụbọchị taa. Ị̀ mụtara ihe n’ihe a Sọlọmọn chọpụtara? Jehova achọghị ka i mee ihe ndị ị ga-emecha kwaara mmakwaara. Ma, nke bụ́ eziokwu bụ na  bụ okwukwe ga-eme ka anyị na-erubere Chineke isi ma mee ka ime uche Chineke bụrụ ihe mbụ ná ndụ anyị. Okwukwe a bara ezigbo uru, ị gaghị akwakwa mmakwaara ma i nwee ya. N’eziokwu, Jehova emekataghị chefuo “ịhụnanya unu gosiri maka aha ya.” (Hib. 6:10) N’ihi ya, gbalịsie ike mee ka okwukwe gị sie ezigbo ike. I mee otú ahụ, ị ga-ahụ na Nna gị nke eluigwe chọrọ ka ihe gaziere gị.​—Ọma 32:8. w18.12 22 ¶14-15

Wenezdee, Septemba 9

Chineke mere ka anyị mata ịhụnanya ya, n’ihi na, mgbe anyị ka bụ ndị mmehie, Kraịst nwụrụ n’ihi anyị.​—Rom 5:8.

Onye ji ife Chineke kpọrọ ihe na-enwe okwukwe na Chineke, na-elekwa ihe anya otú Chineke si ele ya. Ọ na-achọkarị ka Chineke na-eduzi ya n’ihe ọ bụla ọ na-eme, na-ekpebisikwa ike irubere ya isi. (1 Kọr. 2:​12, 13) Devid bụ otu onye mere otú ahụ. Ọ bụrụ abụ, sị: “Jehova bụ òkè e kenyere m nakwa iko e nyere m.” (Ọma 16:5) Ihe so ‘n’òkè’ ahụ bụ adịm ná mma ya na Chineke ya, bụ́ onye ọ gbabara n’ime ya. (Ọma 16:1) Olee uru ọ baara ya? Devid sịrị: “Ihe niile dị ebube n’ime m na-enwe aṅụrị.” O nweghị ihe na-eme ya obi ụtọ ka adịm ná mma ya na Chineke. (Ọma 16:​9, 11) Ndị hụrụ ntụrụndụ na ịchụ akụnụba n’anya anaghị enwe ụdị ọṅụ ahụ Devid nwere. (1 Tim. 6:​9, 10) Ihe ga-eme ka ị na-enwe ezigbo obi ụtọ bụ inwe okwukwe n’ebe Jehova nọ na ife ya ofufe. Olee otú ị ga-esi mee ka okwukwe gị sikwuo ike? Gị na Jehova ga na-anọrị, ya bụ, ị ga na-agụ Okwu ya, na-ele ihe ndị o kere eke, na-eche gbasara àgwà ya dị iche iche, dị ka, ịhụnanya o nwere n’ebe ị nọ.​—Rom 1:20. w18.12 25 ¶7-8

Tọzdee, Septemba 10

Ka alụmdi na nwunye bụrụ ihe kwesịrị nsọpụrụ n’etiti mmadụ niile.​—Hib. 13:4.

Ihe Pọl na-ekwu abụghị ihe niile gbasara alụmdi na nwunye. Kama, ọ na-agwa Ndị Kraịst ka ha na-akwanyere alụmdi na nwunye ùgwù, ya bụ, ile ya anya ka ihe dị oké ọnụ ahịa. Ọ̀ bụ otú ahụ ka i si ele alụmdi na nwunye anya, nke ka nke, alụmdi na nwunye gị, ma ọ bụrụ na ị lụọla di ma ọ bụ nwaanyị? Ọ bụrụ na i weere alụmdi na nwunye ka ihe dị oké ọnụ ahịa, ị na-agbaso ezigbo ihe nlereanya. Jizọs weere alụmdi na nwunye ka ihe dị oké ọnụ ahịa. Mgbe ndị Farisii jụrụ ya banyere ịgba alụkwaghịm, o kwuru ihe Chineke kwuru banyere alụmdi na nwunye mbụ ọ malitere, sị: “N’ihi ya, nwoke ga-ahapụ nna ya na nne ya, ha abụọ ga-abụkwa otu anụ ahụ́.” Jizọs kwukwara, sị: “Ihe Chineke kekọtara, mmadụ ọ bụla atọsala ya.” (Mak 10:​2-12; Jen. 2:24.) Jizọs kwetara na ọ bụ Chineke malitere alụmdi na nwunye, kwuokwa na di na nwunye ekwesịghị ịtọsa. Chineke agwaghị Adam na Iv na ha nwere ike ịgba alụkwaghịm. Jehova chọrọ ka nwoke na-alụ naanị otu nwaanyị otú ahụ o nyere Adam otu nwaanyị n’ogige Iden. “Ha abụọ” ga-abụ di na nwunye ruo mgbe ebighị ebi. w18.12 10-11 ¶2-4

Fraịdee, Septemba 11

Gbanweenụ site n’ime ka uche unu dị ọhụrụ.​—Rom 12:2.

Mgbe anyị mụtara eziokwu Baịbụl ọhụrụ, anyị matara na ọ dị ezigbo mkpa ịna-edebe iwu ndị bụ́ isi Chineke nyere anyị. Ma ka oge na-aga, anyị mụtara ihe ndị ọzọ gbasara Chineke, dị ka, ihe ndị na-amasị ya na ihe ndị na-anaghị amasị ya, nakwa otú o si ele ihe anya. Ihe ndị ahụ anyị mụtara na-emezi ka anyị na-eche echiche ka Chineke, na-emekwa ihe ndị na-amasị ya. Ọ bụ eziokwu na ịmụta ịna-eche echiche ka Jehova na-atọ anyị ụtọ, ma ọ dịghị mfe ime ya n’ihi na ezughị okè na-akpa anyị aka ọjọọ. Dị ka ihe atụ, o nwere ike isitụrụ anyị ike ịghọta ihe bụ́ echiche Chineke banyere izere omume rụrụ arụ, ịhụ akụnụba n’anya, ikwusa ozi ọma, izere ọbara, na ihe ndị ọzọ. Olee ihe ga-enyere anyị aka? Olee otú anyị ga-esi na-emekwu ka echiche anyị na echiche Chineke bụrụ otu? Ọ bụ ịna-amụ Okwu Chineke ka ọ bamie anyị n’obi, na-atụgharị uche na ya, na-emekwa ka echiche anyị na nke Chineke bụrụ otu. w18.11 23-24 ¶2-4

Satọdee, Septemba 12

Ruo ole mgbe ka m ga na-eti mkpu enyemaka, ma ị dịghị anụ ya?​—Hab. 1:2.

Habakọk biri ndụ n’oge ihe siri ezigbote ike. Obi adịtụdịghị ya mma maka ndị ọjọọ na ndị na-eme ihe ike gbara ya gburugburu. Olee mgbe ihe ọjọọ ndị a ga-ebi? Gịnị mere Jehova ji na-egbu oge ịkwụsị nsogbu ndị a? Ebe Habakọk lekwasịrị anya bụ naanị ná mmegbu na arụrụala ndị obodo ya ji mere aka ọrụ. Ọ dị ya ka nke ya ọ̀ gwụla. N’oge a ihe siri ike, Habakọk kpọkuru Jehova ka ọ bịa dozie nsogbu a. O nwere ike ịbụ na ọ dịwala Habakọk ka Jehova achọghị ịma banyere ihe na-emenụ. Ọ dị ya ka Chineke agaghị eme ihe ngwa ngwa. Ò nwetụla mgbe ọ dị gị otú a ọ dị nwoke a fere Chineke n’oge ochie? Ọ̀ pụtara na Habakọk atụkwasịghịzi Jehova obi? Ọ̀ kwụsịrị inwe obi ike na Jehova ga-emezu nkwa ndị o kwere? Mba. Otu ihe gosiri na ọ ka tụkwasịrị Jehova obi bụ na ọ kọsaara Jehova nsogbu ya kama ịkọsara ya mmadụ ibe ya. Nke bụ́ eziokwu bụ na obi nọ na-ajọ ya njọ n’ihi na ọ maghị ihe mere Chineke ji na-egbu oge ime ihe, nakwa ihe mere o ji hapụ ya ka ọ na-ahụsi anya. w18.11 14 ¶4-5

Sọnde, Septemba 13

Kwụsịnụ ịkpakọbara onwe unu akụ̀ n’ụwa.​—Mat. 6:19.

Mgbe Jizọs kpọrọ Pita na Andru, bụ́ ndị na-akụ azụ̀ ka ha bụrụ “ndị na-akụta mmadụ,” ha “hapụrụ ụgbụ ha.” (Mat. 4:​18-20) Ma, ọtụtụ ndị na-amụta eziokwu taa agaghị ahapụ ọrụ ha. Ha ga-akpa afọ ezinụlọ ha otú Akwụkwọ Nsọ kwuru. (1 Tim. 5:8) Ndị na-amụta eziokwu kwesịrị ịna-agbanwe otú ha si ele akụnụba anya, gbanweekwa ihe ndị ha chere kacha mkpa ná ndụ ha. Ka anyị tụlee banyere otu nwata nwaanyị aha ya bụ Maria. Ịkụ gọlf riri ya isi, ọ chọkwara iji ya mere aka ọrụ ma na-enweta nnukwu ego na ya. Maria mechara malite ịmụ Baịbụl. Obi dịkwa ya ụtọ maka ihe ndị ọ gbanwere ná ndụ ya n’ihi eziokwu ọ na-amụ. Marịa ghọtara na ọ ga-esiri ya ike ịna-eme ihe ndị gbasara ofufe Chineke, na-achụkwa ego. (Mat. 6:24) Ọ hapụrụ gọlf ọ chọrọ iji mere aka ọrụ. Ọ bụ ọsụ ụzọ ugbu a. O kwuru na ya na-enwe “ezigbo obi ụtọ ma na-eji ndụ ya eme ihe bara uru.” w18.11 5 ¶9-10

Mọnde, Septemba 14

Onye a ọ́ bụghị ọkwá nkà ahụ, nwa Meri?​—Mak 6:3.

Mgbe Jizọs gbara afọ iri atọ, ọ hapụrụ ọrụ ọkwá nkà ya, n’ihi na ọ ma na izi ndị mmadụ ozi ọma bụ ọrụ kacha mkpa. O kwuru na ikwusa ozi ọma Alaeze Chineke bụ otu n’ime ihe mere Chineke ji zite ya n’ụwa. (Mat. 20:28; Luk 3:23; 4:43) Jizọs mere ka ikwusa ozi ọma bụrụ ihe kacha mkpa ná ndụ ya. Ọ chọkwara ka ndị ọzọ soro ya na-eme otú ahụ. (Mat. 9:​35-38) O nwere ike ịbụ na anyị abụghị ndị ọkwá nkà, ma o doro anya na anyị na-ekwusa ozi ọma. Ọrụ ahụ dị ezigbo mkpa nke na Chineke sokwa na-arụ ya. A kpọrọ anyị “ndị ha na Chineke na-arụkọ ọrụ.” (1 Kọr. 3:9; 2 Kọr. 6:4) Anyị ma na “okwu [Jehova] dum bụ eziokwu.” (Ọma 119:​159, 160) Ọ bụ ya mere anyị ga-eji hụ na anyị “na-ejizi okwu nke eziokwu ahụ ejizi” n’ozi anyị. (2 Tim. 2:15) N’ihi ya, anyị kwesịrị ịna-agba mbọ na-eme ka otú anyị si eji Baịbụl akụzi ihe na-akakwu mma, n’ihi na Baịbụl bụ ngwá ọrụ bụ́ isi anyị ji na-akụziri ndị mmadụ eziokwu gbasara Jehova, Jizọs nakwa Alaeze Chineke. w18.10 11 ¶1-2

Tuzdee, Septemba 15

[Na-enyerenụ] ndị na-adịghị ike aka, [burukwanụ] okwu Onyenwe anyị Jizọs n’uche.​—Ọrụ 20:35.

Mgbe di na-eme ka onyeisi ya bụ́ Jizọs Kraịst, ọ ga-adịkwuru nwunye ya mfe ịkwanyere ya “ùgwù nke ukwuu.” (Efe. 5:​22-25, 33) Ọ bụrụ na ọ na-akwanyere di ya ùgwù, ọ ga na-aghọta otú obi dị di ya. Ọ bụrụ na nne na nna ana-egosi ibe ha obiọma ma na-akwanyere ibe ha ùgwù, ụmụ ha ga na-eṅomi ha. Ha kwesịkwara ịna-akụziri ụmụ ha ka ha na-echebara ndị ọzọ echiche ma na-egosi ha obiọma. Dị ka ihe atụ, ha nwere ike ịkụziri ụmụ ha ka ha ghara ịna-agbagharị n’Ụlọ Nzukọ Alaeze. Ha na ụmụ ha gaa ebe a na-akụ ngaji n’ezé ma kwụrụ n’ahịrị ikuru nri, ha nwekwara ike ịgwa ụmụ ha ka ha chere ka ndị agadi kuru tupu ha ekuru. Nwatakịrị meere anyị ihe ọma, o nwere ike ịbụ na o mepeere anyị ụzọ, anyị kwesịrị ịja ya mma. Ime otú ahụ ga-eme ka obi na-atọ ya ụtọ, meekwa ka ọ mụta na “a na-enweta obi ụtọ ka ukwuu n’inye ihe karịa ka a na-enweta n’ịnara ihe.” w18.09 29 ¶5-6

Wenezdee, Septemba 16

Onye Ndú unu bụ otu onye, ya bụ, Kraịst.​—Mat. 23:10.

Ntụziaka Jizọs Kraịst, bụ́ Eze na-achị achị ugbu a, na-enye anyị ga-abara anyị uru ma ugbu a ma n’ọdịnihu. N’ihi ya, ka obi na-atọ anyị ụtọ n’ihi uru ndị anyị riterela ná mgbanwe ndị e mere ná nzukọ Jehova n’oge na-adịbeghị anya. Mgbe unu na-enwe ofufe ezinụlọ, unu nwere ike ikwurịta uru ndị unu riterela ná mgbanwe ndị e mere n’ọmụmụ ihe anyị na-enwe kwa izu ma ọ bụkwanụ n’ozi ọma. Ọ bụrụ na anyị aghọta ihe mere nzukọ Jehova ji enye anyị ntụziaka na uru ndị ha na-abara anyị, anyị nwere ike jiri ọṅụ na-eme ihe ndị ahụ. Dị ka ihe atụ, obi na-atọ anyị ụtọ ugbu a na anyị na-ebelata otú anyị si ebi akwụkwọ, ya emee ka anyị belata ego ndị a na-emefu. Ihe ọgbara ọhụrụ na-enyekwara anyị aka ịgbasa ozi ọma Alaeze n’ebe niile n’ụwa. Ka anyị na-eji vidio na akwụkwọ anyị ndị dị n’ekwentị, tablet ma ọ bụ ngwá elektrọniks ndị ọzọ na-eme ihe. Anyị mee otú ahụ, ọ ga-egosi na anyị na-akwado Kraịst, bụ́ onye chọrọ ka anyị jiri ego ndị a na-enweta ná nzukọ Jehova na-eme ihe bara uru. Ọ bụrụ na anyị ejiri obi anyị na-eme ihe Kraịst gwara anyị, anyị na-eme ka okwukwe ụmụnna anyị na-esikwu ike, na-emekwa ka anyị dịrị n’otu. w18.10 25-26 ¶17-19

Tọzdee, Septemba 17

Ebe anyị nwere ịhụnanya dị ukwuu n’ebe unu nọ, ọ masịrị anyị ọ bụghị naanị izi unu ozi ọma Chineke, kamakwa inye unu mkpụrụ obi anyị.​—1 Tesa. 2:8.

Ọ bụrụ na anyị a na-emere onye dara mbà n’obi ebere ka Chineke, o nwere ike ịbụ na Chineke ji anyị zaa onye ahụ ekpere ya. (2 Kọr. 1:​3-6) Ma, atụla anya na ụmụnna gị ga-emetacha ihe niile. Na-ele ha anya otú kwesịrị ekwesị. Ọ bụrụ na ị na-atụ anya na ha ga-emetacha ihe niile, obi nwere ike ịna-agbawa gị. (Ekli. 7:​21, 22) Cheta na Jehova anaghị atụ anya ka anyị metachaa ihe niile. Ọ bụrụ na anyị ana-eṅomi ya, anyị ga-adị njikere idi ihe ọjọọ ụmụnna anyị nwere ike ime anyị n’ihi ezughị okè. (Efe. 4:​2, 32) Kama ime ka ha chewe na ha anaghị eme ihe ha kwesịrị ime, gbalịa na-aja ha mma n’ihe ndị ha na-eme. Ime otú ahụ ga-agba ha ume. Anyị jiri obi anyị niile na-aja ndị ọzọ mma, o nwere ike ịna-agba ha ume, meekwa ka ha ‘na-enwe aṅụrị’ n’ozi ha na-ejere Chineke. Ọ ka mma ka anyị na-aja ha mma kama iji ha na-atụnyere ndị ọzọ n’ihi na o nwere ike ime ka ha daa mbà n’obi.​—Gal. 6:4. w18.09 16 ¶16-17

Fraịdee, Septemba 18

Ihe oriri m bụ ka m mee uche onye zitere m, ka m rụchaa ọrụ ya.​—Jọn 4:34.

Jizọs weere ime uche Chineke ka nri. Otú ahụ iri ezigbo nri si eme ka obi na-atọ anyị ụtọ, na-emekwa ka ahụ́ na-agbasi anyị ike, ka ime uche Chineke si eme ka okwukwe anyị na-esikwu ike. Ime ihe ndị anyị na-amụta n’Okwu Chineke na-egosi na anyị nwere amamihe. (Ọma 107:43) Inwe amamihe ga-abara anyị ezigbo uru. Baịbụl kwuru, sị: “Ọ dịghịkwa ihe ọ bụla ọzọ na-atọ gị ụtọ nke pụrụ ịha ka ya. . . . Ọ bụụrụ ndị na-ejide ya aka osisi nke ndụ, ndị na-ejidesikwa ya aka ike ka a ga-akpọ ndị obi ụtọ.” (Ilu 3:​13-18) Jizọs kwuru, sị: “Ọ bụrụ na unu maara ihe ndị a, unu ga-enwe obi ụtọ ma ọ bụrụ na unu ana-eme ha.” (Jọn 13:17) Ndị na-eso ụzọ Jizọs ga-anọgide na-enwe obi ụtọ ma ọ bụrụ na ha ana-eme ihe ọ gwara ha. Ime ihe Jizọs kụziiri ha na ihe ndị o mere abụghị naanị ihe ha ga-eme otu ugboro. Ha ga na-eme ha mgbe niile. w18.09 4 ¶4-5

Satọdee, Septemba 19

Chineke wee kee mmadụ n’onyinyo ya.​—Jen. 1:27.

Ihe Chineke gwara Adam na Iv kwesịrị ime ka ha na-eche gbasara ndị ọzọ n’agbanyeghị na ọ bụ naanị ha nọ n’ogige Iden. Jehova gọziri ha ma gwa ha ka ha baa ụba, jupụta ụwa ma meekwa ka ọ dịrị n’okpuru ha. (Jen. 1:28) Otú ahụ Onye kere anyị chọrọ ka ụmụ mmadụ na-enwe obi ụtọ ka Adam na Iv kwesịkwara ịchọ ka ụmụ ha ga-amụta na-enwe obi ụtọ. Jehova chọrọ ka ha mee ka ụwa niile ghọọ Paradaịs ka ọ baara ụmụ ha niile uru. Ọrụ a abụghị obere ọrụ. Ọ chọrọ ka ụmụ Adam niile gbakọta aka mee ka ụwa ghọọ Paradaịs. Ụmụ mmadụ zuru okè na Jehova kwesịrị ịrụkọ ọrụ ka ha nwee ike ime ka ụwa ghọọ Paradaịs ma mezuo nzube ya. Ha ga-esi otú a banye n’izu ike ya. (Hib. 4:11) Chegodị otú obi gaara esi na-atọ ha ụtọ mgbe ha na-arụ ọrụ a. Jehova gaara agọzi ha mmaji kwuru mmaji maka ime ihe ga-abara ndị ọzọ uru. w18.08 18 ¶2; 19-20 ¶8-9

Sọnde, Septemba 20

O wee kwutọọ ohu gị n’ihu onyenwe m eze.​—2 Sam. 19:27.

Gịnị ka ị ga-eme ma mmadụ kọsaa ihe na-abụghị eziokwu banyere gị? Ụdị ihe a mere Jizọs na Jọn Onye Na-eme Baptizim. (Mat. 11:​18, 19) Gịnị ka Jizọs mere mgbe ndị mmadụ kwuru ihe na-abụghị eziokwu banyere ya? O jighị oge ya na ike ya niile zọwa isi ya. Kama, ọ gwara ndị mmadụ ka ha jiri anya ha hụ nke bụ́ eziokwu. Ọ chọrọ ka uche ha dịrị n’ihe ndị ọ na-eme na n’ihe ndị ọ na-akụzi. Jizọs sịrị: “A na-egosi na amamihe ziri ezi site n’ọrụ ya.” (Mat. 11:19) Anyị nwere ike ịmụta ihe n’ihe Jizọs mere. Mgbe ụfọdụ, ndị mmadụ nwere ike ikwu okwu ọjọọ gbasara anyị. Anyị nwere ike chọọ ime ihe ka ndị mmadụ ghara ịna-ele anyị anya ọjọọ. Ma, e nwere ihe anyị nwere ike ime. Ọ bụrụ na mmadụ ghagidere anyị ụgha, anyị nwere ike ịna-akpa àgwà ga-eme ka ndị mmadụ ghara ikwere n’ụgha ahụ. Ihe anyị mụtara n’aka Jizọs gosiri na ọ bụrụ na anyị ana-akpa àgwà ka ezigbo Ndị Kraịst, ndị mmadụ ga-amara na ebubo ndị mmadụ na-ebo anyị na ihe ndị na-abụchaghị eziokwu a na-ekwu gbasara anyị bụ ụgha. w18.08 6 ¶11-13

Mọnde, Septemba 21

Ọ bụ Jehova bụ́ Chineke gị ka ị ga-atụ egwu. Ọ bụ ya ka ị ga-ejere ozi, n’ahụ́ ya ka ị ga-araparakwa.​—Diut. 10:20.

E nwere ihe dị mkpa jikọrọ ihe Baịbụl kwuru banyere nnupụisi Ken, Sọlọmọn, na ndị Izrel mgbe ha nọ n’Ugwu Saịnaị. Ha niile nwere ohere ‘ichegharị na ichigharị.’ (Ọrụ 3:19) O doro anya na mmadụ mee mmehie, Jehova anaghị ajụ ya ozugbo. Ọ gbaghaara Erọn ihe ahụ o mere. Taa, Jehova nwere ike iji ụmụnna anyị, ndị a kọrọ akụkọ ha na Baịbụl, na akwụkwọ anyị dọọ anyị aka ná ntị. Ọ bụrụ na anyị emee ihe Jehova gwara anyị, obi na-esi anyị ike na ọ ga-emere anyị ebere. E nwere ihe mere Jehova ji emere anyị ebere. (2 Kọr. 6:1) Ọ na-enye anyị ohere ‘ịjụ asọpụrụghị Chineke na ọchịchọ nke ụwa.’ (Taị. 2:​11-14) Ka anyị na-ebi “n’ime usoro ihe dị ugbu a,” ọnwụnwa ndị ga-eme ka a mata ma ànyị na-efe naanị Jehova ga-abịara anyị. Ka anyị kpebisie ike ịdịnyere Jehova. w18.07 21 ¶20-21

Tuzdee, Septemba 22

Jehova maara ndị bụ́ ndị ya.​—2 Tim. 2:19.

Olee otú anyị ga-esi mee ka mkpebi anyị mere ka Jehova mara anyị sikwuo ike, kama ịchọ ka ụwa mara anyị? Ka anyị nwee ike ime otú ahụ, anyị kwesịrị icheta ihe abụọ dị mkpa. Nke mbụ, Jehova ma mgbe niile ndị ji obi ha niile na-efe ya. (Hib. 6:10; 11:6) O ji onye ọ bụla bụ́ ohu ya kpọrọ ihe, ma were ileghara ndị na-efe ya anya ka “ajọ omume.” Ọ “maara ụzọ ndị ezi omume,” marakwa otú ọ ga-esi anapụta ha ná nsogbu. (Ọma 1:6; 2 Pita 2:9) Nke abụọ, Jehova nwere ike ịgọzi anyị otú anyị na-atụghị anya ya. Jehova agaghị agọzi ndị na-eme ihe ọma naanị ka ndị mmadụ hụ ha. Maka gịnị? N’ihi na a kwụọla ha ụgwọ ọrụ. (Mat. 6:​1-5) Ma, Jizọs kwuru na Nna ya “nke na-ahụ ihe na nzuzo,” na-ahụ ndị a na-enyeghị otuto n’ihi ihe ọma ha mere. Ọ na-ahụ ihe ọma ndị ahụ ha na-eme, ma na-agọzi ha otú kwesịrị ekwesị. w18.07 9 ¶8, 10

Wenezdee, Septemba 23

Kwụsị ịkpọ ihe Chineke mere ka ha dị ọcha ihe rụrụ arụ.​—Ọrụ 10:15.

Pita aghọtaghị ihe olu ahụ na-achọ ịgwa ya. Ozugbo ahụ, ndị ozi Kọnịliọs wụchara. Mgbe mmụọ nsọ mechara ka Pita mata ihe ọ ga-eme, o sooro ha gawa n’ụlọ Kọnịliọs. Ọ bụrụ na Pita lere mmadụ anya n’ihu kpebie ihe ọ ga-eme, ọ garaghị aga n’ụlọ Kọnịliọs. Ndị Juu anaghị aba n’ụlọ ndị Jentaịl. Gịnịkwanụ mere Pita ji gaa n’ụlọ Kọnịliọs n’agbanyeghị na ọ kpọrọ ndị Jentaịl asị? Ọ bụ ọhụụ ahụ ọ hụrụ nakwa otú mmụọ nsọ si duzie ya mere o ji gbanwee echiche ya. Mgbe Pita gechara Kọnịliọs ntị, o kwuru, sị: “N’ezie, ana m aghọta na Chineke adịghị ele mmadụ anya n’ihu, kama ná mba ọ bụla, onye na-atụ egwu ya ma na-eme ezi omume bụ onye ọ na-anabata nke ọma.” (Ọrụ 10:​34, 35) Ihe ọhụrụ a Pita mụtara tọrọ ya ezigbo ụtọ. Ọ ga-agbasakwa Ndị Kraịst niile. w18.08 9 ¶3-4

Tọzdee, Septemba 24

Kpọọnụ ihe ọjọọ asị.​—Emọs 5:15.

Anyị kwesịrị ịgbara ihe Chineke kpọrọ asị ọsọ. Ma, e nwere ihe ndị ọzọ Baịbụl na-enyeghị anyị iwu banyere ha. Olee otú anyị ga-esi amata ihe Chineke chọrọ ka anyị mee? Ọ bụrụ na anyị ekwe ka Baịbụl zụọ akọnuche anyị, anyị ga-eme mkpebi dị mma. Ebe Jehova hụrụ anyị n’anya, o nyere anyị ụkpụrụ ndị ga na-eduzi akọnuche anyị. O kwuru, sị: “Mụ onwe m, Jehova, bụ Chineke gị, Onye na-akụziri gị otú ị ga-esi baara onwe gị uru, Onye na-eme ka i jee ije n’ụzọ i kwesịrị iso.” (Aịza. 48:​17, 18) Ọ bụrụ na anyị echebakwuoro ụkpụrụ ndị dị na Baịbụl echiche ma kwe ka o ruo anyị n’obi, anyị ga na-eduzi akọnuche anyị nke ọma. Nke a ga-enyekwara anyị aka ime mkpebi dị mma. Ụkpụrụ bụ eziokwu dị mkpa na-eduzi otú anyị si eche echiche, na-enyekwara anyị aka ime mkpebi dị mma. Ịghọta ụkpụrụ Jehova na-enyere anyị aka ịmata otú o si eche echiche, nakwa ihe mere o ji nye anyị iwu ụfọdụ. w18.06 17 ¶5; 18 ¶8-10

Fraịdee, Septemba 25

Iwu ọ̀ kwadoro ịkwụ Siza ụtụ isi ka ọ̀ bụ na ọ kwadoghị ya?​—Mat. 22:17.

Ndị òtù Herọd, bụ́ ndị kwulitere okwu a, chere na ọ bụrụ na Jizọs ekwuo na ha ekwesịghị ịkwụ ụtụ isi, ha ga-ekwu na ọ na-agba ọchịchị ndị Rom mgba okpuru. Ọ bụrụkwanụ na ọ sị na ha kwesịrị ịkwụ ụtụ isi, ndị mmadụ ga-akwụsị iso ya. A bịa n’ihe gbasara ịkwụ ụtụ isi, Jizọs hụrụ na ọ nọpụrụ iche. Jizọs ma na ọtụtụ ndị ọnaụtụ na-arụrụ aka. Ma, o lekwasịghị anya na ya. Kama, o lekwasịrị anya n’ihe kacha mkpa, ya bụ, n’Alaeze Chineke, bụ́ ihe ga-egboro ndị mmadụ mkpa ha. Jizọs si otú a gosi ndị niile na-eso ụzọ ya ihe ha kwesịrị ịna-eme. Ha ekwesịghị itinyewe ọnụ n’okwu gbasara ndọrọ ndọrọ ọchịchị, ọ bụrụgodị na otu ndị na-ekwu ihe dị mma, ndị nke ọzọ a na-ekwu ihe na-adịghị mma. Ndị Kraịst na-ebu ụzọ achọ Alaeze Chineke nakwa ezi omume ya. Ha anaghị akatọ ihe ụfọdụ na-adịghị mma ndị ọchịchị na-eme. (Mat. 6:33) Ọtụtụ Ndịàmà Jehova akwụsịla ile ndị ọchịchị anya ọjọọ ha na-elebu ha. w18.06 6 ¶9-11

Satọdee, Septemba 26

Ụmụ ndị ikom nke ezi Chineke malitere ịhụ ụmụ ndị inyom nke mmadụ, na ha mara mma.​—Jen. 6:2.

O nwere ike ịbụ na ihe Setan ji nwaa ndị mmụọ ozi ahụ abụghị naanị inwe mmekọahụ, kama ọ ga-abụkwa na o kwere ha nkwa na ha ga-achị ụmụ mmadụ. Ọ ga-abụ na ihe o bu n’obi bụ ime ka nkwa Chineke kwere banyere ọbịbịa nke ‘mkpụrụ nke nwaanyị ahụ’ kụọ afọ n’ala. (Jen. 3:15) Ihe ọ bụla ọ sọrọ ya bụrụ, Jehova ji Iju Mmiri ahụ kụghasịa nkata ahụ niile Setan na ndị mmụọ ọjọọ ahụ kpara. N’ihi ya, echekwala na Setan enweghị ike iji mmekọahụ na mpako rata gị. Ndị mmụọ ozi ahụ sonyeere Setan fere Chineke ruo ọtụtụ afọ. N’agbanyeghị nke ahụ, ọtụtụ ndị mmụọ ozi kwere ka ọchịchọ ọjọọ gbaa mgbọrọgwụ n’obi ha ma too. O nwekwara ike ịbụ na anyịnwa efeela Chineke ruo ọtụtụ afọ. Ma, n’agbanyeghị na anyị nọ n’ọgbakọ Chineke dị ọcha, ihe ọjọọ nwere ike gbaa mgbọrọgwụ n’obi anyị. (1 Kọr. 10:12) N’ihi ya, ọ dị mkpa ka anyị na-enyocha obi anyị, ghara ịna-eche ihe rụrụ arụ, gharakwa ịchọ ịdị mpako.​—Gal. 5:26; Kọl. 3:5. w18.05 25 ¶11-12

Sọnde, Septemba 27

M nwere oké iru uju na ihe mgbu na-adịghị akwụsị akwụsị n’ime obi m.​—Rom 9:2.

O wutere Pọl na ndị Juu jụrụ ozi ọma Alaeze o ziri ha. Ma nke ahụ emeghị ka ọ kwụsị izi ha ozi ọma. Lee ihe o mechara kwuo banyere otú obi dị ya gbasara ndị Juu ahụ n’akwụkwọ ozi o degaara Ndị Kraịst nọ na Rom. Ọ sịrị: “Ezi ọchịchọ obi m na arịrịọ m na-arịọsi Chineke ike maka ha bụ, n’ezie, ka a zọpụta ha. N’ihi na ana m agbara ha akaebe na ha na-anụ ọkụ n’obi n’ijere Chineke ozi; ma ọ bụghị dị ka ezi ihe ọmụma si dị.” (Rom 10:​1, 2) Pọl kwuru na ihe mere o ji kwusaara ndị Juu ozi ọma bụ n’ihi ‘ezi ọchịchọ obi ya.’ Ọ chọrọ ka a zọpụta ụfọdụ n’ime ha. (Rom 11:​13, 14) Ọ rịọrọ Chineke ka o nyere onye Juu ọ bụla aka ịnabata ozi ọma Alaeze ahụ. Pọl kwukwara, sị: “Ha na-anụ ọkụ n’obi n’ijere Chineke ozi.” Pọl hụrụ ebe ha na-eme nke ọma, marakwa na ha nwere ike bịa fewe Jehova. Ọ ma na ndị Juu ahụ na-anụ ọkụ n’obi nwere ike mechaa ghọọ ndị na-eso ụzọ Jizọs na anụ ọkụ n’obi ka yanwa. w18.05 13 ¶4; 15-16 ¶13-14

Mọnde, Septemba 28

[Kwuo] okwu dị mma maka iwuli elu dị ka ọ pụrụ ịdị mkpa, ka o wee mee ka ndị na-anụ ya nweta ihe dị mma.​—Efe. 4:29.

Anya kwesịrị ịna-eru anyị ala ka anyị mata mgbe ụmụnna anyị nwere mkpa. Pọl gwara Ndị Kraịst bụ́ ndị Hibru, sị: “Na-agbatịnụ aka kụdara akụda na ikpere na-adịghị ike, na-emerenụ ụkwụ unu ụzọ kwụ ọtọ, ka e wee ghara ikwokapụ ihe dara ngwọrọ ná nkwonkwo ya, kama ka e wee gwọọ ya.” (Hib. 12:​12, 13) Anyị niile, ma ndị na-eto eto, nwere ike iji okwu ọnụ anyị gbarịta ibe anyị ume. Pọl kwuru, sị: “Ya mere, ọ bụrụ na e nwere agbamume ọ bụla n’ime Kraịst, ọ bụrụ na e nwere ngụgụ obi ọ bụla nke ịhụnanya, ọ bụrụ na e nwere mmụọ ọ bụla nke ichebara ibe unu echiche, ọ bụrụ na e nwere obi ọmịiko na obi ebere ọ bụla, meenụ ka ọṅụ m zuo ezu site n’inwe otu obi nakwa inwe otu ịhụnanya, bụrụ ndị e jikọrọ ná mkpụrụ obi, na-eburu otu echiche ahụ n’uche, ghara ime ihe ọ bụla n’ihi esemokwu ma ọ bụ n’ihi ịbụ ndị onwe ha na-ebu isi, kama n’ịdị nwayọọ n’obi na-ewere na ndị ọzọ ka unu, na-elekwasị anya, ọ bụghị naanị n’ọdịmma onwe unu, kamakwa n’ọdịmma nke ndị ọzọ.”​—Fil. 2:​1-4. w18.04 22 ¶10; 23 ¶12

Tuzdee, Septemba 29

Na-ebinụ ndụ dị ka ndị nweere onwe ha, ma ka nnwere onwe unu . . . dị ka [nke] ndị ohu Chineke.​—1 Pita 2:16.

Isi ihe mere Jehova ji si n’aka Jizọs mee ka anyị nwere onwe anyị n’iwu nke mmehie na ọnwụ bụ ka anyị jiri ndụ anyị niile na-ejere ya ozi. Otú kacha mma anyị ga-esi jiri nnwere onwe anyị na-eme ihe ndị bara uru bụ iji oge anyị na ike anyị na-ejere Jehova ozi. Ime otú ahụ ga-eme ka anyị ghara ikwe ka ịchụ ihe nke ụwa na ihe ndị na-agụ anyị agụụ bụrụ ihe ndị kacha anyị mkpa ná ndụ. (Gal. 5:16) Ka anyị tụlee banyere Noa na ezinụlọ ya. Ha biri n’ụwa tigbuo zọgbuo na omume rụrụ arụ juru na ya. Ma, ha ekweghị ka ihe ndị na-agụ ndị mmadụ agụụ na ihe ndị ha na-achụ megharịa ha anya. Olee ihe nyeere ha aka? Ha ji oge ha na-arụ ọrụ Chineke nyere ha. Ha wuru ụgbọ, chekwaa nri ha na ụmụ anụmanụ ga-eri n’ụgbọ ahụ, ma dọọ ndị mmadụ aka ná ntị. Baịbụl kwuru, sị: “Noa wee mee dị ka ihe niile Chineke nyere ya n’iwu si dị. O mere nnọọ otú ahụ.” (Jen. 6:22) Olee uru ihe ndị ahụ ha mere baara ha? A zọpụtara Noa na ndị ezinụlọ ya mgbe Chineke bibiri ndị ajọ omume n’oge ahụ.​—Hib. 11:7. w18.04 10 ¶8; 11 ¶11-12

Wenezdee, Septemba 30

M ga-enye gị ikike a niile na ebube ha, n’ihi na e nyefewo ha n’aka m, ọ bụkwa onye ọ bụla m chọrọ ka m na-enye ya. ​—Luk 4:6.

Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya na-ejikwa okpukpe ụgha na achụmnta ego ụwa “na-eduhie elu ụwa dum mmadụ bi.” (Mkpu. 12:9) Setan na-eji okpukpe ụgha na-agwa ndị mmadụ ihe na-abụghị eziokwu banyere Jehova. O yiri ka Ekwensu ò fooro ntụtụ taa na ya ga-eme ka ọtụtụ mmadụ chefuo aha Chineke. (Jere. 23:​26, 27) Ọ bụ ya mere ụfọdụ ndị ji na-efe ndị mmụọ ọjọọ na-eche na ọ bụ Chineke ka ha na-efe. (1 Kọr. 10:20; 2 Kọr. 11:​13-15) Setan na-ejikwa achụmnta ego ụwa na-eduhie ndị mmadụ. Dị ka ihe atụ, ihe a na-akụzi n’ụwa taa bụ na ihe ga-eme ka mmadụ nwee obi ụtọ bụ ịchụ ego na inweta ọtụtụ ihe. (Ilu 18:11) Ndị kwetara n’ụgha ahụ na-eji ndụ ha niile na-agbara “Akụnụba” ohu kama ife Chineke. (Mat. 6:24) N’ikpeazụ, otú ha si hụ akụnụba n’anya ga-eme ka ha gharazie ịhụ Chineke n’anya.​—Mat. 13:22; 1 Jọn 2:​15, 16. w18.05 23 ¶6-7

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya