Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • es20 p. 98-108
  • Ọktoba

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ọktoba
  • Inyocha Akwụkwọ Nsọ Kwa Ụbọchị—2020
  • Isiokwu Nta
  • Tọzdee, Ọktoba 1
  • Fraịdee, Ọktoba 2
  • Satọdee, Ọktoba 3
  • Sọnde, Ọktoba 4
  • Mọnde, Ọktoba 5
  • Tuzdee, Ọktoba 6
  • Wenezdee, Ọktoba 7
  • Tọzdee, Ọktoba 8
  • Fraịdee, Ọktoba 9
  • Satọdee, Ọktoba 10
  • Sọnde, Ọktoba 11
  • Mọnde, Ọktoba 12
  • Tuzdee, Ọktoba 13
  • Wenezdee, Ọktoba 14
  • Tọzdee, Ọktoba 15
  • Fraịdee, Ọktoba 16
  • Satọdee, Ọktoba 17
  • Sọnde, Ọktoba 18
  • Mọnde, Ọktoba 19
  • Tuzdee, Ọktoba 20
  • Wenezdee, Ọktoba 21
  • Tọzdee, Ọktoba 22
  • Fraịdee, Ọktoba 23
  • Satọdee, Ọktoba 24
  • Sọnde, Ọktoba 25
  • Mọnde, Ọktoba 26
  • Tuzdee, Ọktoba 27
  • Wenezdee, Ọktoba 28
  • Tọzdee, Ọktoba 29
  • Fraịdee, Ọktoba 30
  • Satọdee, Ọktoba 31
Inyocha Akwụkwọ Nsọ Kwa Ụbọchị—2020
es20 p. 98-108

Ọktoba

Tọzdee, Ọktoba 1

Soronụ ndị na-akwa ákwá kwaa ákwá.​—Rom 12:15.

Anyị enweghị ike ịmata ihe dị mmadụ n’obi ka Jehova na Jizọs. N’agbanyeghị nke ahụ, anyị kwesịrị ịgbalị na-aghọta otú obi dị ndị ọzọ na ihe bụ́ mkpa ha. (2 Kọr. 11:29) Anyị ekwesịghị ime ka ndị na-achọ ihe ga-abara naanị onwe ha uru n’ụwa taa. Kama, anyị kwesịrị ịna-agba mbọ “na-elekwasị anya, ọ bụghị naanị n’ọdịmma onwe [anyị], kamakwa n’ọdịmma nke ndị ọzọ.” (Fil. 2:4) Ndị okenye kwesịrị ịkacha egosi na ihe gbasara ndị ọzọ na-emetụ ha n’obi. Ha ma na ha ga-aza Jehova ajụjụ maka atụrụ ya o nyefere ha n’aka. (Hib. 13:17) Ndị okenye kwesịrị inwe ọmịiko ka ha nwee ike inyere ụmụnna ha aka. Olee otú ndị okenye ga-esi gosi na ihe banyere ndị ọzọ na-emetụ ha n’obi? Okenye nke ihe banyere ndị ọzọ na-emetụ n’obi na-ewepụta oge ka ya na ụmụnna ya nọrịa. Ọ na-ajụ ajụjụ, gee ntị nke ọma ma ghara ịnara onye na-agwa ya okwu okwu n’ọnụ. Ọ dị mkpa ka ndị okenye mee ihe a karịchaa ma ọ bụrụ na nwanna chọrọ ịkọrọ ha ihe bụ mkpa ya, ma ya ana-esiri ya ike. (Ilu 20:5) Ọ bụrụ na okenye ewepụta oge ya ka ya na ụmụnna ya nọrịa, ọ ga-eme ka ha tụkwasịkwuo ya obi, mee ka ya na ha bụrụ ezigbo enyi, meekwa ka ha hụkwuo ibe ha n’anya.​—Ọrụ 20:37. w19.03 17 ¶14-17

Fraịdee, Ọktoba 2

Dị ka mkpụrụ osisi apụl ọlaedo nke dị n’ime ihe e ji ọlaọcha tụọ, otú ahụ ka okwu e kwuru n’oge kwesịrị ya dị.​—Ilu 25:11.

Ikele ndị meere anyị ihe ọma dị ka nri na-atọ ezigbo ụtọ. Ọ na-aka atọ anyị ụtọ ma anyị na ndị ọzọ soro rie ya. N’ihi ya, ndị mmadụ kelee anyị maka ihe anyị meere ha, obi na-atọ anyị ụtọ. Anyị keleekwa ndị ọzọ maka ihe ha meere anyị, obi na-atọ ha ụtọ. Onye anyị kelere maka ihe o meere anyị na-aghọta na mbọ ọ gbara inyere anyị aka ma ọ bụ inye anyị ihe dị anyị mkpa, baara anyị ezigbo uru. Ọ ga-emezi ka anyị na ya bụrụ ezigbo enyi. Ikele ndị meere anyị ihe ọma bara ezigbo uru, dị ka e kwuru n’ihe mmụta dịịrị ụbọchị taa. Chegodị otú mkpụrụ osisi apụl ọlaedo nke dị n’ime ihe e ji ọlaọcha tụọ ga-adị. Cheekwa otú a ga-esi eji ya akpọrọ ihe. Olee otú obi ga-adị gị ma e nye gị ụdị onyinye a? Ọ bụ otú ahụ ka ọ dịkwa ikele ndị meere anyị ihe ọma, ha ga-ejikwa ya kpọrọ ihe. Mkpụrụ osisi apụl ọlaedo nwere ike ịnọ ogologo oge. Otú ahụ ka ọ dịkwa ikele onye meere anyị ihe ọma. O nwere ike ịna-echeta ya ma jiri ya kpọrọ ihe ná ndụ ya niile. w19.02 15 ¶5-6

Satọdee, Ọktoba 3

Mmadụ ahụ adịwo ka otu n’ime anyị n’ịma ihe ọma na ihe ọjọọ.​—Jen. 3:22.

Mgbe Adam na Iv riri mkpụrụ si n’osisi ịma ihe ọma na ihe ọjọọ, ha mere ka otú ha si ele Jehova na iwu ya anya doo anya. Ha gosiri na ha ejighị Jehova na iwu ya kpọrọ ihe. Ha họọrọ iji aka ha ekpebiri onwe ha ihe bụ́ ihe ọma na ihe ọjọọ. Ma, chegodị banyere ihe ndị ha tụfuru. Ha na Jehova abụghịzi enyi. Ha tụfuru ohere ha nwere ịdị ndụ ebighị ebi, meekwa ka ụmụ ha bụrụ ndị mmehie ma na-anwụ anwụ. (Rom 5:12) Jiri ihe Adam na Iv mere tụnyere ihe ọnaozi Itiopia ahụ mere mgbe Filip ziri ya ozi ọma. Ihe Jehova na Jizọs meere ọnaozi ahụ tọrọ ya ụtọ nke na o mere baptizim ozugbo. (Ọrụ 8:​34-38) Anyị nyefee Jehova onwe anyị, e mee anyị baptizim otú ahụ e mere ọnaozi ahụ, anyị na-egosi na obi dị anyị ụtọ maka ihe Jehova na Jizọs meere anyị. Anyị na-egosikwa na anyị tụkwasịrị Jehova obi, nakwa na anyị ma na ọ bụ ya kwesịrị ikpebi ihe bụ́ ihe ọma na ihe ọjọọ. w19.03 2 ¶1-2

Sọnde, Ọktoba 4

M gaghị akwụsị iguzosi ike n’ezi ihe!​—Job 27:5.

Olee otú ndị na-efe Chineke si egosi na ha na-ekwesị ntụkwasị obi? Ọ bụ iji obi ha niile hụ Jehova n’anya. Nke a mere ka ha na-eme ihe na-adị ya mma mgbe niile. Na Baịbụl, okwu Hibru a sụgharịrị “iguzosi ike n’ezi ihe” ma ọ bụ ikwesị ntụkwasị obi pụtara ihe zuru ezu ma ọ bụ ihe na-enweghị nkwarụ. Dị ka ihe atụ, anụmanụ ndị a ga-eji chụọrọ Jehova àjà agaghị enwe nkwarụ. (Lev. 22:​21, 22) Chineke achọghị ka ndị ya jiri anụmanụ dara ngwọrọ, nke ntị chiri, ma ọ bụ nke kpuru ìsì chụọrọ ya àjà. Ọ chọghịkwa ka ha jiri nke na-arịa ọrịa chụọrọ ya àjà. Jehova chọrọ ka e jiri anụmanụ na-enweghị nkwarụ na-achụrụ ya àjà. (Mal. 1:​6-9) Ihe ndị a emeela ka anyị ghọta na Jehova ji ihe zuru ezu ma ọ bụ ihe na-enweghị nkwarụ kpọrọ ihe. Anyị chọọ ịzụ ihe, dị ka mkpụrụ osisi, akwụkwọ ma ọ bụ ngwá ọrụ, anyị anaghị achọ ịzụ mkpụrụ osisi na-adịghị mma, akwụkwọ peeji ya na-ezughị ezu ma ọ bụ ngwá ọrụ akụkụ ya ụfọdụ na-ezughị ezu. Anyị chọrọ ịzụ nke dị mma ma ọ bụ nke zuru ezu. Otú ahụ ka ọ dị Jehova ma a bịa n’ihe gbasara ịhụ ya n’anya na irubere ya isi. Ọ chọrọ ka anyị jiri obi anyị niile na-eme otú ahụ. w19.02 3 ¶3

Mọnde, Ọktoba 5

Lee ka m si hụ iwu gị n’anya! Ọ bụ ihe m na-atụgharị n’uche ogologo ụbọchị dum.​—Ọma 119:97.

Ọ bụrụ na anyị chọrọ ichebe obi anyị, ihe anyị ga-eme abụghị naanị igbochi ihe ọjọọ ịbata na ya, kama, anyị ga-emeghe ya ka ihe ọma na-abata anyị n’obi. N’obodo ndị e ji mgbidi gbaa gburugburu n’oge ochie, onye nche ọnụ ụzọ ámá na-emechi ụzọ ka ndị iro ghara ịbata wakpoo obodo ahụ. Ma, n’oge ndị ọzọ, ọ na-emeghe ụzọ ka e nwee ike ibubata nri na ihe ndị ọzọ dị mkpa. Ọ bụrụ na o nweghị mgbe ọ na-emeghe ụzọ ahụ, agụụ ga-anyụ ndị bi n’obodo ahụ ịkpakwụ. Otú ahụ ka ọ dịkwa anyị. Anyị kwesịrị imeghe obi anyị mgbe niile ka anyị nwee ike ịna-eche echiche ka Chineke. Baịbụl kwuru otú Jehova si eche echiche. N’ihi ya, mgbe ọ bụla anyị gụrụ Baịbụl, anyị na-ekwe ka otú Jehova si eche echiche metụta otú anyị si eche echiche, otú obi na-adị anyị, nakwa otú anyị si akpa àgwà. Olee ihe anyị ga-eme ka ịgụ Baịbụl baara anyị uru? Ekpere dị ezigbo mkpa. Ọ ga-enyere anyị aka ‘ịhụ nke ọma ihe dị ebube ndị’ dị n’Okwu ya. (Ọma 119:18) Anyị kwesịkwara ichebara ihe ndị anyị gụrụ echiche. Anyị kpee ekpere, gụọ Baịbụl ma chebara ihe ndị anyị gụrụ echiche, Okwu Chineke ga-abanye “n’ime obi” anyị, meekwa ka anyị na-eche echiche ka Jehova.​—Ilu 4:​20-22. w19.01 18 ¶14-15

Tuzdee, Ọktoba 6

Ka anyị . . . na-achụrụ Chineke àjà otuto mgbe niile.​—Hib. 13:15.

Jehova ma na ike anyị na ọnọdụ anyị dị iche iche, o jikwa ihe ndị anyị na-emere ya kpọrọ ihe. Chegodị banyere ụdị àjà ndị Izrel chụụrụ ya ọ nabatara. Ụfọdụ ndị Izrel ji atụrụ ma ọ bụ ewu chụọrọ ya àjà. Ma onye Izrel dara ogbenye nwere ike iji “nduru abụọ ma ọ bụ ụmụ kpalakwukwu abụọ” chụọrọ ya àjà. Ọ bụrụ na onye Izrel enweghị ike iweta nnụnụ abụọ, ma ya ejiri “otu ụzọ n’ụzọ iri nke otu ihe ọ̀tụ̀tụ̀ efa ntụ ọka e gwere nke ọma” chụọrọ Jehova àjà, ọ na-anabata ya. (Lev. 5:​7, 11) Ntụ ọka adịghị ọnụ, ma Jehova na-anabata àjà ahụ, ọ bụrụhaala na ọ bụ “ntụ ọka e gwere nke ọma.” Chineke anyị dị obiọma na-emekwa otú ahụ taa. Anyị zaa ajụjụ, ọ naghị atụ anya ka okwu na-aga anyị niile were were n’ọnụ ka Apọlọs ma ọ bụ ka anyị mee ka ndị mmadụ kwenye ka Pọl. (Ọrụ 18:24; 26:28) Ihe ọ chọrọ bụ ka anyị jiri obi anyị niile na-aza ajụjụ otú anyị nwere ike. Cheta nwaanyị ahụ di ya nwụrụ nke nyere obere mkpụrụ ego abụọ. Jehova hụrụ ya n’anya n’ihi na o nyere ihe niile o nwere.​—Luk 21:​1-4. w19.01 8-9 ¶3-5

Wenezdee, Ọktoba 7

Mmadụ niile ga-akpọ . . . unu asị n’ihi aha m.​—Mat. 10:22.

Ebe anyị bụ ndị na-eso ụzọ Kraịst, anyị na-atụ anya na ndị mmadụ ga-akpọ anyị asị. Jizọs kwuru na a ga-akpagbu ndị na-eso ụzọ ya mkpagbu kpụ ọkụ n’ọnụ n’oge ikpeazụ a. (Mat. 24:9; Jọn 15:20) Aịzaya gwara anyị na ọ bụghị naanị asị ka ndị iro anyị ga-akpọ anyị. Ha ga-eji ngwá agha dị iche iche alụso anyị ọgụ. Ihe ndị ahụ bụ ime ka ụgha ha na-agha yie eziokwu, ikwu ihe ndị na-abụghị eziokwu banyere anyị, nakwa imekpọ anyị ọnụ. (Mat. 5:11) Jehova agaghị eme ka ndị iro anyị kwụsị iji ngwá agha ndị a alụso anyị ọgụ. (Efe. 6:12; Mkpu. 12:17) Ma anyị ekwesịghị ịtụ ụjọ. Jehova kwuru na “ngwá ọgụ ọ bụla” e ji alụso anyị ọgụ “agaghị aga nke ọma.” (Aịza. 54:17) Otú ahụ mgbidi si echebe anyị ma e nwee oké mmiri ozuzo, ka Jehova si echebe anyị n’aka “ndị aka ike.” (Aịza. 25:​4, 5.) O nweghị nsogbu ndị iro anyị na-enye anyị ga-adịgide. (Aịza. 65:17) Ndị iro Chineke niile “ga-adị ka ihe efu, ha ga-alakwa n’iyi.”​—Aịza. 41:​11, 12. w19.01 6-7 ¶13-16

Tọzdee, Ọktoba 8

Ebe ọ bụla mmụọ Jehova dị, n’ebe ahụ ka nnwere onwe dị.​—2 Kọr. 3:17.

Ndị na-eto eto, Jehova hụrụ nnwere onwe n’anya. O kekwara anyị ka anyị hụ nnwere onwe n’anya. Ọ chọkwara ka i jiri nnwere onwe gị mee ihe bara uru ka o nwee ike ichebe gị. O nwere ike ịbụ na ị ma ụfọdụ ndị na-ele ndị gba ọtọ ma ọ bụ na-akwa iko, na-eme egwuregwu ndị nwere ike ịta isi ha, na-aṅụ ọgwụ ọjọọ, ma ọ bụ na-aṅụbiga mmanya ókè. N’eziokwu, ihe ndị ahụ nwere ike ịna-atọ ha ụtọ naanị nwa oge. Ma, mgbe e mechara ha ga-ata ahụhụ ya. Ha nwere ike bute ọrịa, bụrụ ndị ịṅụ mmanya na ọgwụ ọjọọ riri ahụ́ ma ọ bụdị nwụọ. (Gal. 6:​7, 8) Nke bụ́ eziokwu bụ na ụdị “nnwere onwe” ha a abụghị nke ezigbo ya. (Taịtọs 3:3) Ma, mmadụ ole ka ị maara butere ọrịa n’ihi na ha na-eme ihe Baịbụl kwuru? Nke bụ́ eziokwu bụ na irubere Jehova isi na-eme ka ahụ́ doo mmadụ, na-emekwa ka anyị nwere onwe anyị. (Ọma 19:​7-11) Ihe ọzọ bụ na ọ bụrụ na i jiri nnwere onwe gị na-eme ihe ndị bara uru, ya bụ, na-eme ihe iwu Chineke kwuru, ma Chineke ma ndị mụrụ gị ga-atụkwasị gị obi, ha ga-enyekwukwa gị nnwere onwe.​—Rom 8:21. w18.12 22-23 ¶16-17

Fraịdee, Ọktoba 9

Nwoke [ga-ahapụ] nna ya na nne ya wee rapara n’ahụ́ nwunye ya, ha ga-aghọkwa otu anụ ahụ́.​—Jen. 2:24.

Mmehie Adam mere gbanwere ọtụtụ ihe. Otu n’ime ya bụ ọnwụ, bụ́ nke ga-akpa alụmdi na nwunye aka ọjọọ. Anyị nwere ike ịhụ nke a n’ihe Pọl onyeozi kwuru mgbe ọ na-ekwu na Ndị Kraịst anọghị n’okpuru Iwu Mozis. O kwuru na ọnwụ na-atọsa alụmdi na nwunye, nakwa na di ma ọ bụ nwunye dị ndụ nwere ike imecha lụọ onye ọzọ. (Rom 7:​1-3) Iwu Chineke nyere mba Izrel kwuru ọtụtụ ihe gbasara alụmdi na nwunye. Iwu ahụ nyere ohere nwoke ịlụ karịa otu nwaanyị, bụkwanụ ihe ndị mmadụ na-eme tupu Chineke enye mba Izrel iwu ahụ. Ma iwu ahụ chebekwara ụmụ nwaanyị na ụmụaka ka a ghara imekpọ ha ọnụ. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na onye Izrel alụọ ohu ma mechaa lụọ nwaanyị ọzọ, ọ ga na-enye nwaanyị mbụ ya ahụ nri na uwe ọ na-enyebu ya, ya na ya ga na-enwekwa mmekọahụ. Chineke chọrọ ka ọ na-echebe ya ma na-elekọta ya. (Ọpụ. 21:​9, 10) Anyị anaghị edebe Iwu Mozis taa. Ma, Iwu ahụ na-akụziri anyị na Chineke na-ele alụmdi na nwunye anya ka ihe dị oké ọnụ ahịa. Nke a na-enyere anyị aka ịna-akwanyere alụmdi na nwunye ùgwù. w18.12 10 ¶3; 11 ¶5-6

Satọdee, Ọktoba 10

Unu [agaghị] ekweta, ọ bụrụgodị na a kọọrọ ya unu.​—Hab. 1:5.

Mgbe Habakọk kọsachaara Jehova nsogbu ya niile, o nwere ike na-eche banyere ihe Jehova ga-eme. Jehova bụ Nna nwere ọmịiko na nghọta. N’ihi ya, ọ baraghị Habakọk mba maka ịkọ nsogbu ya. Chineke ma na ọ bụ ọnọdụ ọjọọ ọ nọ na ya kpatara ya. Jehova gwara Habakọk ihe ọ ga-eme ndị Juu na-enupụ isi n’oge na-adịghị anya. O nwere ike ịbụ na Habakọk bụ onye mbụ Jehova gwara na ọ na-aga ibibi ọgbọ ọjọọ ahụ na-eme ihe ike n’oge na-adịghị anya. Jehova mere ka Habakọk mata na ọ ga-eme ihe n’oge na-adịghị anya. Ntaramahụhụ ọ ga-enye ọgbọ ọjọọ ahụ na-eme ihe ike ji ọsọ na-abịa. Jehova gwara Habakọk na ihe ahụ ga-eme “n’ụbọchị unu,” ya bụ, na ọ ga-ekpe ọgbọ ọjọọ ahụ ikpe n’oge Habakọk ka nọ ndụ ma ọ bụkwanụ n’oge ndị ọgbọ ya ka nọ ndụ. Ihe a Jehova zara Habakọk abụtụdịghị ihe ọ tụrụ anya ya. Ọ̀ bụ ihe a ka Jehova ga-eme maka ákwá ọ na-ebere ya ka o mee ihe ozugbo? Ihe Jehova gwara ya gosiri na ahụhụ ga-aka njọ na Juda niile. w18.11 15 ¶7-8

Sọnde, Ọktoba 11

Ọ bụ uche [Chineke] ka a zọpụta ụdị mmadụ niile, ka ha nwetakwa ezi ihe ọmụma nke eziokwu.​—1 Tim. 2:4.

Olee otú i si ewere ụdị mmadụ dị iche iche na-amụtabeghị eziokwu Baịbụl? Ọ bụ eziokwu na Pọl onyeozi gara n’ụlọ nzukọ dị iche iche ikwusara ndị ma ihe ụfọdụ gbasara Chineke ozi ọma, ma ọ bụghị naanị ndị Juu ka ọ gbalịrị ikwusara ozi ọma. Mgbe Pọl na-eje ozi ala ọzọ nke mbụ ya, ya na Banabas gara n’obodo Listra. Ndị Likeonia bi ebe ahụ weere ha ka chi ma kpọwa ha aha chi ha bụ́ Zus na Hemis. Ihe a ò mere ka isi buwe Pọl na Banabas? Hà weere ya na ha enwerela onwe ha ugbu a ná mkpagbu a kpagburu ha n’obodo abụọ ikpeazụ ha gara kwusaa ozi ọma? Hà chere na otú a ndị mmadụ si na-esogharị ha ga-eme ka ọtụtụ ndị gee ntị n’ozi ọma? Mbanụ. Ha were iwe, dọwaa uwe ha ma maba n’etiti ìgwè mmadụ ahụ, na-eti mkpu, sị: “Gịnị mere unu ji eme ihe ndị a? Anyị onwe anyị kwa bụ mmadụ ndị nwere otu ụdị adịghị ike ndị unu nwere.”​—Ọrụ 14:​8-15. w18.09 4-5 ¶8-9

Mọnde, Ọktoba 12

Ọ̀ bụ na unu amaghị na ndị ajọ omume agaghị eketa alaeze Chineke? . . . Ma nke ahụ bụkwa ihe ụfọdụ n’ime unu bụbu. Ma a sachawo unu, . . . a kpọwo unu ndị ezi omume.​—1 Kọr. 6:​9, 11.

Ka anyị nwee ike ịnabata eziokwu ma na-akpa àgwà otú Baịbụl kwuru, anyị ga-adị njikere ịgbanwe otú anyị si eche echiche na otú anyị si akpa àgwà. Pita kwuru banyere mgbanwe ndị a anyị kwesịrị ime, sị: “Dị ka ụmụ na-erube isi, kwụsịnụ ịbụ ndị na-eme omume dị ka ọchịchọ unu nwere n’oge gara aga si dị, mgbe unu na-amaghị ihe . . . bụrụkwanụ ndị dị nsọ n’omume unu niile.” (1 Pita 1:​14, 15) Omume rụrụ arụ juru n’obodo Kọrịnt. Ka ndị bi na ya nwee ike ịzụta eziokwu, ọ pụtara na ha ga-agbanwe ụdị ndụ ha na-ebi. Otú ahụ ka ọ dịkwa ọtụtụ ndị taa. Ha ahapụla àgwà ọjọọ ndị ha na-akpa ka ha nwee ike ịzụta eziokwu. Pita gwakwara Ndị Kraịst n’oge ya, sị: “Oge gafere agafe ezuworo unu ịrụzu ihe ndị mba ọzọ na-achọ, mgbe unu jere ije n’omume rụrụ arụ, n’agụụ ihe ọjọọ, n’ịṅụ oké mmanya, n’oriri oké mkpọtụ, n’ịma aka n’ịṅụ mmanya, na n’ikpere arụsị jọgburu onwe ya.”​—1 Pita 4:3. w18.11 6 ¶13

Tuzdee, Ọktoba 13

Ndị niile nwere ezi obi maka inweta ndụ ebighị ebi wee ghọọ ndị kwere ekwe.​—Ọrụ 13:48.

Olee otú anyị ga-esi ama “ndị niile nwere ezi obi maka inweta ndụ ebighị ebi”? Naanị otú anyị nwere ike isi ama ha bụ izi ha ozi ọma otú ahụ Ndị Kraịst oge mbụ mere. N’ihi ya, anyị kwesịrị ime ihe a Jizọs kwuru. Ọ sịrị: “N’obodo ukwu ma ọ bụ n’obodo nta ọ bụla unu banyere, chọpụtanụ onye kwesịrị ekwesị n’ime ya.” (Mat. 10:11) Anyị anaghị atụ anya ka ndị na-achọghị ịmụta eziokwu, ndị mpako, ma ọ bụ ndị ihe gbasara Chineke na-anaghị amasị gee ntị n’ozi ọma. Anyị na-achọ ndị chọrọ ịmụta eziokwu, ndị dị umeala n’obi, na ndị agụụ eziokwu na-agụ. Anyị nwere ike iji ịchọ ndị mmadụ tụnyere ihe o yiri ka Jizọs mere mgbe ahụ ọ bụ ọkwá nkà. Ọ na-ebu ụzọ chọta ezigbo osisi tupu ya arụọ oche, ibo ụzọ, yok, ma ọ bụ ihe ndị ọzọ. Ọ chọtachaa ezigbo osisi, ya ewerezie ngwá ọrụ ya na nkà ya rụọ ihe ọ chọrọ ịrụ. N’ihi ya, ihe anyị ga-ebu ụzọ eme taa bụ ịchọta ndị chọrọ ịmụta eziokwu, anyị chọtachaa ha, anyị ewerezie ngwá ọrụ na nkà anyị nyere ha aka ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ Jizọs.​—Mat. 28:​19, 20. w18.10 12 ¶3-4

Wenezdee, Ọktoba 14

Filip, n’onwe ya, gbadara obodo Sameria ma maliteikwusara ha Kraịst.​—Ọrụ 8:5.

Filip onye na-ezisa ozi ọma mere ihe anyị kwesịrị ime. O ji ozi ya kpọrọ ihe mgbe ọnọdụ ya gbanwere. A malitere imekpọ ndịozi Jizọs ọnụ na Jeruselem mgbe e gbuchara Stivin. N’oge ahụ, Filip nọ na-arụ ọrụ ọhụrụ e nyere ya. (Ọrụ 6:​1-6) Ma mgbe a chụsasịrị ndị na-eso ụzọ Jizọs, Filip anọghị na-ele ihe na-emenụ n’anya n’anya. Ọ gara ikwusa ozi ọma na Sameria, bụ́ ebe nwere ọtụtụ ebe a na-ekwusabeghị ozi ọma na ya n’oge ahụ. (Mat. 10:5; Ọrụ 8:1) Filip dị njikere ịga ebe ọ bụla mmụọ Chineke ga-agwa ya gaa. N’ihi ya, Jehova mere ka ọ gaa kwusaa ozi ọma n’ebe ndị mmadụ na-anụbeghị ozi ọma. Ọ ga-abụ na obi ruru ndị Sameria ala n’ihi otú o si meso ha ihe n’eleghị mmadụ anya n’ihu, ebe ọ bụkwanụ na ndị Juu na-eleda ndị Sameria anya. Ka a sịkwa ihe mere ìgwè mmadụ ji were “otu obi” na-ege ya ntị. (Ọrụ 8:​6-8) Filip ka ji ozi ya kpọrọ ihe, n’ihi ya, Jehova gọziri ya na ezinụlọ ya nke ukwuu.​—Ọrụ 21:​8, 9. w18.10 30 ¶14-16

Tọzdee, Ọktoba 15

Ka anyị na-echebakwara ibe anyị echiche iji kpalie ịhụnanya na ịrụ ezi ọrụ.​—Hib. 10:24.

Otu ụbọchị mgbe Jizọs nọ n’ógbè ndị dị gburugburu Dikapọlis, ndị mmadụ “kpọtaara ya otu nwoke ntị chiri nke nwekwara nsogbu ikwu okwu.” (Mak 7:​31-35) Kama Jizọs ịnọ n’ihu ọha gwọọ ya, ọ ‘kpọọrọ naanị ya pụọ,’ ma gwọọ ya. N’ihi gịnị? Ebe ọ bụ na ntị chiri nwoke ahụ, ọ ga-abụ na ahụ́ agaghị eru ya ala ịnọ n’ihu ọha, a gwọọ ya. Ọ ga-abụkwa na Jizọs chọpụtara nsogbu nwoke a ma kpọrọ ya gaa ebe ndị mmadụ na-anọghị gwọọ ya. Ọ bụ eziokwu na anyị enweghị ike ịrụ ọrụ ebube, ma anyị kwesịrị ichebara mkpa ụmụnna anyị echiche nakwa otú obi dị ha ma gosi ha obiọma. Jizọs ghọtara otú obi dị nwoke ahụ ntị chiri ma gosi ya obiọma. Anyị kwesịkwara ịna-echebara ndị agadi na ndị nwere nkwarụ echiche. Àgwà kacha mkpa e ji ama ọgbakọ Ndị Kraịst bụ na onye ọ bụla hụrụ ibe ya n’anya, ọ bụghị ịrụpụta ọtụtụ ihe. (Jọn 13:​34, 35) Ịhụnanya a na-eme ka anyị mee ihe niile anyị nwere ike ime iji nyere ụmụnna anyị ndị agadi na ndị nwere nkwarụ aka ịna-aga ọmụmụ ihe na ozi ọma. Anyị na-enyere ha aka, ọ bụrụgodị na ihe ha nwere ike ime ebughị ibu.​—Mat. 13:23. w18.09 29-30 ¶7-8

Fraịdee, Ọktoba 16

Ka onye ọ bụla n’ime anyị na-eme ihe na-amasị onye agbata obi ya n’ihe dị mma maka iwuli ya elu.​—Rom 15:2.

Onye ọ bụla na-efe Jehova dị oké ọnụ ahịa n’anya Jehova na Jizọs, bụ́ onye ji ndụ ya gbapụta anyị. (Gal. 2:20) Anyị hụrụ ụmụnna anyị n’anya nke ukwuu. Anyị kwesịrị ịna-emere ha ebere ma na-egosi ha na anyị hụrụ ha n’anya. Ọ bụrụ na anyị chọrọ ka obi na-eru ha ala, anyị ga “na-achụso ihe na-eweta udo na ihe na-ewuli ibe anyị elu.” (Rom 14:19) Anyị niile na-atụsi anya Paradaịs ike, mgbe a na-agaghịkwa enwe ihe ga-eme ka anyị daa mbà n’obi. Mgbe ahụ, ọrịa, agha, ọnwụ, mkpagbu, esemokwu ezinụlọ na ihe agaghị otú anyị tụrụ anya ya, agaghịzi adị. Jizọs chịchaa otu puku afọ, ndị mmadụ ga-ezu okè. Ndị gafere ule ikpeazụ ga-abụ ụmụ Jehova n’ụwa a, ha ga-enweta “nnwere onwe dị ebube nke ụmụ Chineke.” (Rom 8:21) Ka anyị niile nọgide na-ahụ ụmụnna anyị n’anya ma na-ewuli ha elu. Ka anyị na-enyere ibe anyị aka ịlanahụ ụwa ochie a ma banye n’ime ụwa ọhụrụ Chineke nke magburu onwe ya. w18.09 14 ¶10; 16 ¶18

Satọdee, Ọktoba 17

Lee ka m si hụ iwu gị n’anya! Ọ bụ ihe m na-atụgharị n’uche ogologo ụbọchị dum.​—Ọma 119:97.

Ịmụ Okwu Chineke abụghị ịgụ ihe elu elu na ịkatụ ihe n’ebe azịza dị na paragraf. Anyị mụwa ihe, anyị kwesịrị ịchọpụta ihe ihe anyị na-amụ na-akọrọ anyị gbasara Jehova, àgwà ya, na echiche ya. Anyị ga-achọpụtakwa ihe mere Chineke ji gwa anyị mee otu ihe ma sị anyị emela nke ọzọ. Anyị kwesịkwara iche banyere otú anyị ga-esi jiri ihe ndị anyị mụtara gbanwee ndụ anyị na otú anyị si eche echiche. Ọ bụ eziokwu na o nwere ike anyị agaghị emecha ihe a niile mgbe ọ bụla anyị na-amụ ihe, ma ọ bụrụ na anyị ewepụta ihe dị ka ọkara oge anyị ji amụ ihe tụgharịa uche n’ihe anyị mụrụ, ọ ga-abara anyị ezigbo uru. (1 Tim. 4:15) Ọ bụrụ na anyị ana-atụgharị uche mgbe niile n’Okwu Chineke, anyị ‘ga-achọpụta n’onwe anyị,’ na echiche Jehova zuru okè. Anyị ga-ebido ile ihe anya otú o si ele ya ma na-anabata echiche ya. Uche anyị ‘ga-adị ọhụrụ,’ anyị agbanweekwa otú anyị sibu eche echiche. (Rom 12:2) Nwayọọ nwayọọ, anyị ga-eme ka echiche anyị na nke Jehova bụrụ otu. w18.11 24 ¶5-6

Sọnde, Ọktoba 18

Anyị bụ ndị ha na Chineke na-arụkọ ọrụ.​—1 Kọr. 3:9.

N’oge ndịozi Jizọs, Pọl kwuru na ya na Ndị Kraịst ndị ọzọ bụ “ndị ha na Chineke na-arụkọ ọrụ” n’ihi na ha na-ekwusa ozi ọma ma na-akụziri ndị mmadụ eziokwu. (1 Kọr. 3:6) Taa, anyị nwekwara ike ịbụ “ndị ha na Chineke na-arụkọ ọrụ” ma anyị jiri oge anyị, ihe ndị anyị nwere, na ike anyị na-ekwusa ozi ọma Chineke gwara anyị na-ekwusa. Ihe a bụ ezigbote ihe ùgwù. Mmadụ iji oge ya na ike ya na-ekwusa ozi ọma ma na-eme ka ndị mmadụ ghọọ ndị na-eso ụzọ Jizọs na-eme ka ọ na-enwe ezigbo obi ụtọ. Ihe a ka ọtụtụ ụmụnna ndị mụrụla mmadụ Baịbụl na ndị na-amụrụ mmadụ Baịbụl ugbu a na-ekwu. Obi na-atọ anyị ezigbo ụtọ ma anyị hụ ka ndị anyị na-amụrụ ihe na-aghọta ihe Baịbụl na-akụzi, okwukwe ha esikwuo ike, ha agbanwee otú ha si ebi ndụ ma na-akọrọ ndị ọzọ ihe ndị ha na-amụta. Obi tọkwara Jizọs ezigbo ụtọ mgbe mmadụ iri asaa ahụ o zipụrụ ka ha gaa kwusaa ozi ọma ‘ji ọṅụ lọta,’ n’ihi otú ndị mmadụ si gee ha ntị.​—Luk 10:​17-21. w18.08 20 ¶11-12

Mọnde, Ọktoba 19

Onye tụkwasịrị obi n’obi nke ya dị nzuzu.​—Ilu 28:26.

Ịtụkwasị onwe anyị obi gabiga ókè nwere ike ịghọrọ anyị nsogbu. O nwere ike ime ka anyị chewe na anyị nwere ike ịghọta ihe merenụ a sịgodị na anyị amaghị ihe niile merenụ. Ihe ọzọ mere o nwere ike iji siere anyị ike ma anyị chọọ ịmata otú ihe si mee nwere ike ịbụ mgbe anyị na nwanna anyị na ya nọ n’ọgbakọ nwere nghọtahie. Ọ bụrụ na anyị ana-eche banyere nghọtahie ahụ, ọ ga-eme ka anyị nyowe nwanna ahụ enyowe. O nweziri ike ime ka anyị kwere ihe na-adịghị mma e kwuru gbasara ya. Olee ihe anyị na-amụta n’ihe a? Iburu nwanna anyị iwe n’obi nwere ike ime ka anyị kweta ihe na-abụghị eziokwu e kwuru gbasara ya. (1 Tim. 6:​4, 5) N’ihi ya, anyị kwesịrị ịgba mbọ wepụ iwe na anyaụfụ n’obi anyị. Kama ibuwere ụmụnna anyị iwe n’obi ma ọ bụ nwewere ha anyaụfụ, ka anyị cheta na anyị kwesịrị ịhụ ha n’anya ma jiri obi anyị gbaghara ha.​—Kọl. 3:​12-14. w18.08 6¶15; 7¶18

Tuzdee, Ọktoba 20

Ọ bụ Jehova . . . nwe eluigwe, . . . ụwa na ihe niile dị n’ime ya.​—Diut. 10:14.

Mmadụ niile bụ nke Jehova, n’ihi na ọ bụ ya kere anyị. (Ọma 100:3; Mkpu. 4:11) Ma kemgbe ụwa, Chineke ahọrọla ụfọdụ ndị ka ha bụrụ ndị nke ya n’ụzọ pụrụ iche. Dị ka ihe atụ, Abụ Ọma 135 kwuru na ndị fere Jehova n’Izrel oge ochie bụ “ihe onwunwe ya pụrụ iche.” (Ọma 135:4) Akwụkwọ Hosia kwukwara na ụfọdụ ndị na-abụghị ndị Izrel ga-abụ ndị Jehova. (Hos. 2:23) Ihe a Hosia kwuru mezuru mgbe Jehova malitere ịhọrọ ndị na-abụghị ndị Juu ka ha soro Kraịst chịa n’eluigwe. (Ọrụ 10:45; Rom 9:​23-26) A kpọrọ ndị ahụ e ji mmụọ nsọ tee mmanụ “mba dị nsọ.” Ha bụ “ndị pụrụ iche nke Chineke.” (1 Pita 2:​9, 10) Gịnịkwanụ banyere Ndị Kraịst niile nwere olileanya ịdị ndụ ebighị n’ụwa? Jehova na-akpọkwa ha “ndị m,” nakwa “ndị m họọrọ.”​—Aịza. 65:22. w18.07 22 ¶1-2

Wenezdee, Ọktoba 21

Nweenụ ụdị echiche a n’ime onwe unu bụ́ nke Kraịst Jizọs nwekwara . . . O mere onwe ya ihe efu ma were ọdịdị onye ohu.​—Fil. 2:​5, 7.

Ezigbo Ndị Kraịst na-eṅomi Kraịst, bụ́ onye gosiri anyị otú ụmụ mmadụ nwere ike isi na-emesapụ aka. (Mat. 20:28) Onye ọ bụla n’ime anyị kwesịrị ịjụ onwe ya, sị, ‘M̀ nwere ike ime ka Jizọs karịadị otú m na-eme ugbu a?’ (1 Pita 2:21) Jehova ga-agọzi anyị ma anyị na-eṅomi ya na Ọkpara ya. Otú anyị ga-esi eme ya bụ ịna-enwe mmasị n’ebe ndị ọzọ nọ, nakwa ịchọ otú anyị ga-esi na-enyere ha aka. N’ihe atụ Jizọs mere banyere onye Sameria bụ́ ezi onye agbata obi, o mere ka o doo anya na ndị na-eso ụzọ ya kwesịrị inyere ndị ọzọ aka, ma ndị si agbụrụ ọzọ. (Luk 10:​29-37) Ì chetara ihe mere Jizọs ji nye ihe atụ ahụ? Ọ bụ n’ihi na otu onye Juu jụrụ ya, sị: “Ònye n’ezie bụ onye agbata obi m?” Ihe Jizọs zara ya gosiri na anyị kwesịrị ịna-enyere ndị ọzọ aka otú ahụ onye Sameria ahụ mere ma ọ bụrụ na anyị chọrọ ka Chineke gọzie anyị. w18.08 19 ¶5-6

Tọzdee, Ọktoba 22

[Mmụọ ozi ahụ] sịrị ya: “Ndeewo, onye e meere amara dị ukwuu, Jehova nọnyeere gị.”​—Luk 1:28.

Jehova ọ̀ nọgidere na-agọzi Meri n’ihi otú o si lekọta Ọkpara ya? O mere otú ahụ. Chineke mere ka e dee ihe ndị o mere na ihe ndị o kwuru na Baịbụl. Ọ ga-abụ na Meri enweghị ike iso Jizọs gaa ebe ndị ọ gara afọ atọ na ọkara ahụ o jere ozi n’ụwa. O nwere ike ịbụ n’ihi na di ya anwụọla, ya ebiri na Nazaret. N’ihi ya, ọ hụghị ọtụtụ ihe Jizọs mere ebe ndị ahụ o jere ozi. Ma, ọ nọ mgbe Jizọs nwụrụ. (Jọn 19:26) Meri na ndị na-eso ụzọ Jizọs mechara nọrọ na Jeruselem tupu ha enweta mmụọ nsọ na Pentikọst. (Ọrụ 1:​13, 14) Ọ ga-abụrịrị na e tere ya na ndị ọzọ na-eso ụzọ Jizọs mmanụ. Ọ bụrụ otú ahụ, ọ pụtara na o so ná ndị Chineke họọrọ ka ha na Jizọs biri n’eluigwe ruo mgbe ebighị ebi. Ihe a bụ ụzọ magburu onwe ya Jehova si gọzie ya n’ihi otú o si fee ya. w18.07 9 ¶11; 10 ¶14

Fraịdee, Ọktoba 23

Na-emenụ ihe niile iji nye Chineke otuto.​—1 Kọr. 10:31.

N’oge niile Jizọs jere ozi n’ụwa, ọ kụziiri ndị na-eso ụzọ ya eziokwu ndị dị mkpa ga-enyere ha aka ịmata uru ma ọ bụ ọghọm dị n’ịkpa àgwà ụfọdụ. Dị ka ihe atụ, ọ kụziri na iwe nwere ike ịkpata esemokwu, nakwa na iche echiche rụrụ arụ nwekwara ike ime ka mmadụ kwaa iko. (Mat. 5:​21, 22, 27, 28) Ka anyị nwee ike inwe akọnuche a zụrụ nke ọma, anyị kwesịrị ikwe ka ụkpụrụ ndị dị na Baịbụl na-eduzi anyị ma si otú ahụ mee ka e too Chineke. A bịa n’okwu ụfọdụ, ihe Onye Kraịst ji Baịbụl zụọ akọnuche ya kpebiri ime nwere ike ịdị iche n’ihe Onye Kraịst ọzọ kpebiri. Chegodị banyere ịṅụ mmanya na-aba n’anya. Baịbụl ekwughị na ịṅụ ya dị njọ. Ma, ọ gwara anyị aṅụbigala ya ókè. (Ilu 20:1; 1 Tim. 3:8) Ma, ọ̀ pụtara na ọ bụrụhaala na Onye Kraịst anaghị aṅụbiga mmanya ókè na o nweghị ihe ọzọ ọ ga-echebara echiche mgbe ọ chọrọ ịṅụ mmanya? Mbanụ. Ọ bụrụgodị na akọnuche ya enyeghị ya nsogbu, o kwesịrị ichebara akọnuche nke ndị ọzọ echiche. w18.06 18 ¶10-11

Satọdee, Ọktoba 24

Lezienụ anya maka ihe iko achịcha nke ndị Farisii nakwa maka ihe iko achịcha nke Herọd.​—Mak 8:15.

Jizọs dọsiri ndị na-eso ụzọ ya aka ná ntị ike ka ha ghara inwe ihe jikọrọ ha na ozizi ma ọ bụ “ihe iko achịcha” nke Ndị Farisii, Ndị Sadusii, na ndị òtù Herọd. (Mat. 16:​6, 12) Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya ihe a mgbe obere oge a chọrọ ime ya eze gachara. Ọ bụrụ na ndị okpukpe ana-akwado ndị ọchịchị, o nwere ike ịkpata tigbuo zọgbuo. Jizọs kụziiri ndị na-eso ụzọ ya ka ha ghara itinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị nakwa na tigbuo zọgbuo. Nke a bụ otu ihe mere ndị isi nchụàjà na ndị Farisii ji kpaa nkata igbu ya. Ụjọ na-atụ ha na ndị mmadụ ga-egewe Jizọs ntị ma kwụsị iso ha. Ọ bụrụ na nke a emee, ọ pụtara na ha agaghịzi enwe ọkwá ma n’ọchịchị ma n’okpukpe. Ha kwuru, sị: “Ọ bụrụ na anyị ahapụ ya otú a, ha niile ga-enwe okwukwe n’ebe ọ nọ, ndị Rom ga-abịakwa were ma ụlọ nsọ anyị ma mba anyị.” (Jọn 11:48) N’ihi ya, Keyafas, Nnukwu Onye Nchụàjà, kpara nkata igbu Jizọs.​—Jọn 11:​49-53; 18:14. w18.06 6-7 ¶12-13

Sọnde, Ọktoba 25

Ka ịhụnanya unu ghara ịbụ nke ihu abụọ.​—Rom 12:9.

Ihe Setan na-eji anwa ndị mmadụ bụ anwansi. Taa, ọ na-eji okpukpe ụgha na ihe ndị e ji atụrụ ndụ eme ka ndị mmadụ nwee mmasị n’ebe ndị mmụọ ọjọọ nọ. Ihe ndị a na-egosi na fim, egwuregwu kọmputa nakwa ihe ndị ọzọ e ji atụrụ ndụ na-eme ka ime anwansi yie ihe dị mma. Olee otú anyị ga-esi zere ịdaba n’ọnyà a? Anyị ekwesịghị ịtụ anya ka nzukọ Jehova depụtara anyị ihe niile dị mma e ji atụrụ ndụ na ndị nke na-adịghị mma. Onye ọ bụla n’ime anyị kwesịrị ịzụ akọnuche ya azụ ka anyị nwee ike ime mkpebi dị mma otú Chineke chọrọ. (Hib. 5:14) Ma, anyị ga-eme mkpebi dị mma ma anyị mee ihe Pọl onyeozi kwuru e dere n’elu. Anyị nwere ike ịjụ onwe anyị, sị: ‘Ihe m ji atụrụ ndụ ọ̀ ga-eme ka m yie onye ihu abụọ? Ọ bụrụ na ndị m na-amụrụ Baịbụl ma ọ bụ na-agara nletaghachi ahụ ihe m ji atụrụ ndụ, hà nwere ike ịna-eche na m na-eme ihe m na-akụziri ha?’ Ọ bụrụ na anyị ana-eme ihe ndị anyị na-akụziri ndị mmadụ, ọ ga-esi ike Setan ịrata anyị.​—1 Jọn 3:18. w18.05 25 ¶13

Mọnde, Ọktoba 26

Ezi ọchịchọ obi m na arịrịọ m na-arịọsi Chineke ike maka ha bụ, n’ezie, ka a zọpụta ha.​—Rom 10:1.

Olee otú anyị ga-esi eme ka Pọl? Nke mbụ, anyị ga-agbalịsi ike na-achọ ndị “nwere ezi obi maka inweta ndụ ebighị ebi.” Nke abụọ, anyị ga-arịọ Jehova ka o mee ka ndị chọrọ ịmata gbasara ya gee anyị ntị. (Ọrụ 13:48; 16:14) Nwanna nwaanyị aha ya bụ Silvana, onye sụrụla ụzọ ihe fọrọ obere ka ọ bụrụ afọ iri atọ, kwuru, sị: “Tupu mụ erute n’ụlọ mmadụ izi ya ozi ọma, m na-ebu ụzọ rịọ Jehova ka o mee ka m lee ndị mmadụ anya otú kwesịrị ekwesị.” Anyị na-arịọkwa Jehova ka o jiri ndị mmụọ ozi ya duru anyị gaa na nke ndị nwere mmasị. (Mat. 10:​11-13; Mkpu. 14:6) Otu nwanna aha ya bụ Robert, onye sụrụla ụzọ ihe karịrị afọ iri atọ, kwuru, sị: “Obi na-atọ m ụtọ na mụ na ndị mmụọ ozi, bụ́ ndị ma otú ihe si dịrị onye m na-aga na nke ya na-arụkọ ọrụ.” Nke atọ, anyị ga-agbalị ịhụ ebe ndị mmadụ na-eme nke ọma, buru n’obi na ha nwere ike imecha ghọọ ndị na-eso ụzọ Jizọs. Otu okenye aha ya bụ Carl kwuru, sị: “M na-agbalị ka m hụ obere ihe na-egosi na mmadụ nwere mmasị. O nwere ike bụrụ ọnụ ọchị ya, otú ihu ya dị, ma ọ bụkwanụ ajụjụ bara uru ọ jụrụ.” N’eziokwu, anyị nwere ike iji ntachi obi na-amị mkpụrụ otú ahụ Pọl mere. w18.05 15¶13; 16¶15

Tuzdee, Ọktoba 27

Ka anyị na-echebakwara ibe anyị echiche . . . , na-agbarịta ibe anyị ume, na-emekwa otú ahụ karị, ka unu na-ahụ ụbọchị ahụ ka ọ na- eru nso.​—Hib. 10:​24, 25.

Anyị nụ na ndị anyị nyeere aka n’oge ndị gara aga ka na-efe Jehova, ọ na-agba anyị ume. Otú ahụ ka ọ dịkwa Jọn onyeozi. Ọ sịrị: “Ọ dịghị ihe ọzọ ga-eme ka m nwee obi ekele karịa ihe a, ya bụ, na m ga na-anụ na ụmụ m na-eje ije n’eziokwu ahụ.” (3 Jọn 4) Obi na-atọ ọtụtụ ndị ọsụ ụzọ ụtọ ma ha nụ na ụfọdụ n’ime ndị ha nyeere aka ọtụtụ afọ gara aga ha abata n’ọgbakọ ka na-efe Jehova, ma ọ bụdị na ha na-asụ ụzọ. Ichetara ọsụ ụzọ dara mbà n’obi ihe ndị o mere n’oge gara aga nke mere ya obi ụtọ, nwere ike ịgba ya ume. Ọtụtụ ndị nlekọta sekit kwuru na ha na ndị nwunye ha letachaa ọgbakọ, ụmụnna edetara ha akwụkwọ ozi iji kelee ha, na ọ na-agba ha ume. Otú ahụ ka ọ na-adịkwa ndị okenye, ndị ozi ala ọzọ, ndị ọsụ ụzọ na ndị na-eje ozi na Betel ma a na-ekele ha maka ozi ha na-ejere Jehova. w18.04 23 ¶14-15

Wenezdee, Ọktoba 28

[Eze agaghịkwa] alụ ọtụtụ ndị inyom, ka obi ya wee ghara ịpụ n’ebe m nọ.​—Diut. 17:17.

Sọlọmọn emeghị ihe a Chineke kwuru. O mechara lụọ narị ụmụ nwaanyị asaa, nweekwa narị ndị iko atọ. (1 Eze 11:3) Ọtụtụ ndị nwunye ya abụghị ndị Izrel, ha na-efekwa chi ọzọ. Sọlọmọn mebikwara iwu Chineke mgbe ọ lụrụ ụmụ nwaanyị ala ọzọ. (Diut. 7:​3, 4) Sọlọmọn ji nwayọọ nwayọọ kwụsị ịhụ Jehova n’anya, kwụsịkwa iji iwu ya kpọrọ ihe. O wukwaara chi nwaanyị Ashtọret ebe ịchụàjà, wuokwa ma ọ́ dịghị ihe ọzọ otu ebe ịchụàjà ọzọ maka chi ụgha bụ́ Kimọsh. O sooro ndị nwunye ya fee chi ụgha. Ebe o lechara anya wuoro chi ụgha ndị ahụ ebe ịchụàjà bụ n’ugwu dị n’ihu Jeruselem, bụ́kwanụ ebe o wuuru Jehova ụlọ nsọ. (1 Eze 11:​5-8; 2 Eze 23:13) O nwere ike ịbụ na ọ nọ na-eche na Jehova ga-eleghara ihe ọjọọ a o mere anya ebe ọ bụ na ọ ka na-achụ àjà n’ụlọ nsọ. Ihe a o mere bụ ịghọ onwe ya aghụghọ. Ma Jehova anaghị eleghara ihe ọjọọ anya. w18.07 18-19 ¶7-9

Tọzdee, Ọktoba 29

Burunụ ọta ukwu bụ́ okwukwe, nke unu ga-eji nwee ike imenyụ akụ́ ụta niile na-ere ọkụ nke ajọ onye ahụ.​—Efe. 6:16.

Ụfọdụ n’ime ‘akụ́ ụta na-ere ọkụ’ Setan nwere ike ịgba anyị bụ ụgha ọ na-agha banyere Jehova. Ọ na-ekwu na Jehova anaghị eche gbasara anyị, nakwa na ọ gaghị ahụli anyị n’anya. Otu nwa agbọghọ dị afọ iri na itoolu aha ya bụ Ida nọ na-eche na ya abaghịzi uru. O kwuru, sị: “E nwere mgbe ọ na adị m ka Jehova ọ̀ nọ m n’ebe dị anya, nakwa na ọ chọghị ịbụ enyi m.” Olee ihe o mere mgbe ọ dị ya otú ahụ? Ọ sịrị: “Ọmụmụ ihe mere ka okwukwe m sie ezigbo ike. Ana m aga ọmụmụ ihe, ma anaghị m aza ajụjụ n’ihi na m chere na o nweghị onye ga-achọ ịnụ ihe m ga-ekwu. Ma ugbu a, m na-akwadebe ọmụmụ ihe, ma na-agbalị ịza ajụjụ ugboro abụọ ma ọ bụ atọ.” E nwere ihe dị mkpa anyị na-amụta n’ihe mere Ida. Ọta a na-enye onye agha anaghị agbanwe agbanwe, otú ọ ha ka ọ na-aha. Ma okwukwe anyị adịghị otú ahụ. O nwere ike ịnyụ ka ọkụ ma ọ bụ sikwuo ike. Ọ bụ anyị ka ọ dị n’aka. (Mat. 14:31; 2 Tesa. 1:3) N’ihi ya, ọ dị mkpa ka anyị mee ka okwukwe anyị sikwuo ike. w18.05 29-30 ¶12-14

Fraịdee, Ọktoba 30

Gịnị ka m ga-eme ka e wee zọpụta m?​—Ọrụ 16:30.

Ọ bụ mgbe ala machara jijiji ka onye ahụ na-elekọta ụlọ mkpọrọ gbanwere obi ya ma kwuo ka e nyere ya aka. (Ọrụ 16:​25-34) Taakwa, ụfọdụ ndị na-anaghị egebu anyị ntị nwere ike ịgbanwe obi ha ma kwuo ka e nyere ha aka ma nsogbu tara akpụ bịara ha. O nwere ike ịbụ na a chụọla ụfọdụ ndị n’ọrụ ha rụrụla ọtụtụ afọ, ya emezie ka ha nọrọ ná mgbagwoju anya. Obi nwekwara ike na-ajọ ụfọdụ ndị njọ n’ihi ọrịa ọjọọ a chọpụtara na ha na-arịa, ma ọ bụkwanụ na mmadụ nwụnahụrụ ha. Ha nwere ike ịjụ ajụjụ gbasara ihe mere anyị ji dịrị ndụ, bụ́kwanụ ajụjụ ha na-ajụtụbeghị. Ha nwedịrị ike ịna-ajụ onwe ha, sị, ‘Gịnị ka m ga-eme ka a zọpụta m?’ Anyị hụ ụdị ndị a, ha nwere ike ịchọ ige anyị ntị na nke mbụ ya, n’ozi ọma na-eme ka e nwee olileanya anyị na-ekwusa. N’ihi ya, ọ bụrụ na anyị anọgide na-ekwusa ozi ọma, ndị mmadụ ga-ahụ anyị mgbe ha chọrọ ozi ga-akasi ha obi.​—Aịza. 61:1. w18.05 19-20 ¶10-12

Satọdee, Ọktoba 31

Mmụọ Jehova dị n’ahụ́ m, n’ihi na o tere m mmanụ izi . . . ozi ọma.​—Luk 4:18.

Taa, Setan emeela ka ọtụtụ mmadụ kpuo ìsì. Ha amaghị na ha bụ ohu nke okpukpe ụgha, akụnụba na ndọrọ ndọrọ ọchịchị. (2 Kọr. 4:4) Anyị kwesịrị inyere ndị mmadụ aka ka ha mata Jehova, bụ́ Chineke nke nnwere onwe, ma na-efe ya otú ahụ Jizọs mere. (Mat. 28:​19, 20) Ọrụ a adịghị mfe. N’obodo ụfọdụ, ndị mmadụ achọghị iji ntị anụ ozi ọma, ụfọdụ na-ewedị iwe ma anyị chọọ izi ha ozi ọma. Ma, ajụjụ onye ọ bụla n’ime anyị kwesịrị ịjụ onwe ya bụ, ‘M̀ nwere ike iji nnwere onwe m jekwuoro Jehova ozi?’ Obi dị anyị ụtọ na ọtụtụ ụmụnna anyị achọpụtala na oge agwụla agwụ, ya emee ka ha hapụ ihe ụfọdụ iji nwee ike ịbanye n’ozi oge niile. (1 Kọr. 9:​19, 23) Ụfọdụ so ọgbakọ ha na-eje ozi, ndị ọzọ na-eje ozi n’ebe a chọkwuru ndị na-ekwusa ozi ọma. Ọ bụ ihe magburu onwe ya na ọtụtụ ụmụnna anyị na-eji nnwere onwe ha ejere Jehova ozi otú a.​—Ọma 110:3. w18.04 11-12 ¶13-14

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya