Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • es21 p. 47-57
  • Mee

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Mee
  • Inyocha Akwụkwọ Nsọ Kwa Ụbọchị—2021
  • Isiokwu Nta
  • Satọdee, Mee 1
  • Sọnde, Mee 2
  • Mọnde, Mee 3
  • Tuzdee, Mee 4
  • Wenezdee, Mee 5
  • Tọzdee, Mee 6
  • Fraịdee, Mee 7
  • Satọdee, Mee 8
  • Sọnde, Mee 9
  • Mọnde, Mee 10
  • Tuzdee, Mee 11
  • Wenezdee, Mee 12
  • Tọzdee, Mee 13
  • Fraịdee, Mee 14
  • Satọdee, Mee 15
  • Sọnde, Mee 16
  • Mọnde, Mee 17
  • Tuzdee, Mee 18
  • Wenezdee, Mee 19
  • Tọzdee, Mee 20
  • Fraịdee, Mee 21
  • Satọdee, Mee 22
  • Sọnde, Mee 23
  • Mọnde, Mee 24
  • Tuzdee, Mee 25
  • Wenezdee, Mee 26
  • Tọzdee, Mee 27
  • Fraịdee, Mee 28
  • Satọdee, Mee 29
  • Sọnde, Mee 30
  • Mọnde, Mee 31
Inyocha Akwụkwọ Nsọ Kwa Ụbọchị—2021
es21 p. 47-57

Mee

Satọdee, Mee 1

Gwa anyị ihe anyị ga-eme nwa ahụ a ga-amụ.—Ikpe 13:8.

Olee ihe ndị nne na nna nwere ike ime iji nyere ụmụ ha aka ịhụ Jehova n’anya? Rịọ Jehova ka o nyere gị aka otú Manoa mere. Na-emekwa ihe ị na-akụziri ha. Ihe ị na-agwa ụmụ gị ga-abara ha uru. Ma ihe nwere ike ịkacha baara ha uru bụ ihe ị na-eme. O doro anya na Josef na Meri mere ihe ha chọrọ ka Jizọs na ụmụ ha ndị ọzọ na-eme. Josef rụsiri ọrụ ike iji na-elekọta ezinụlọ ya. O mekwara ka ihe gbasara ofufe Chineke na-atọ ha ụtọ. (Diut. 4:9, 10) Ọ na-akpọ ezinụlọ ya aga Jeruselem kwa afọ maka Ememme Ngabiga. (Luk 2:41, 42) Ụfọdụ ndị nna n’oge ahụ nwere ike ịna-eche na ịkpọrọ ezinụlọ ha gaa ụdị ihe ahụ siri ezigbo ike, na-egbu oge, na-efukwa ezigbo ego. Ma, Josef ji ihe gbasara ofufe Chineke kpọrọ ihe. Ọ kụzikwaara ụmụ ya ime otú ahụ. Ihe ọzọ bụ na Meri ma Akwụkwọ Nsọ nke ọma. O doro anya na o si n’ihe ọ na-ekwu na ihe ọ na-eme kụziere ụmụ ya iji Okwu Chineke kpọrọ ihe. w19.12 24-25 ¶9-12

Sọnde, Mee 2

Abụ m anụ ahụ́, onye e rere ịnọ n’okpuru mmehie. —Rom 7:14.

Otú Jehova si meso Adam mgbe o nupụụrụ ya isi gosiri na ọ hụrụ anyị n’anya. Isi Adam nupụụrụ Nna ya nke eluigwe mere ka ya na ụmụ ndị ọ ga-amụta gharazie iso n’ezinụlọ Jehova. (Rom 5:12) Ma, Jehova mere ihe iji nyere ụmụ Adam aka. Jehova tara Adam ahụhụ ihe o metara. Ma o kwere nkwa inyere ụmụ ọ ga-amụta aka. O kwuru ozugbo na ndị rubeere ya isi ga-emecha sorokwa n’ezinụlọ ya. (Jen. 3:15; Rom 8:20, 21) Jehova haziri ihe ga-eme ka o kwe omume. O mere ka Jizọs, bụ́ Ọkpara ya ọ hụrụ n’anya, jiri ndụ ya chụọ àjà. Ihe ahụ o mere gosiri na ọ hụrụ anyị n’anya nke ukwuu. (Jọn 3:16) O nweghị Nna a ga-eji tụnyere ya. Ọ na-anụ ekpere anyị, na-egboro anyị mkpa anyị, na-enyekwara anyị aka ịna-eme uche ya. Ọ na-akụziri anyị ihe ma na-akwado anyị. Ọ ga-emekwara anyị ihe ndị magburu onwe ha n’ọdịnihu. Obi dị anyị ezigbo ụtọ ịmata na Nna anyị nke eluigwe hụrụ anyị n’anya ma na-elekọta anyị. w20.02 6 ¶16-17; 7 ¶20

Mọnde, Mee 3

Mgbe m nwere ọtụtụ nchegbu n’ime obi m, nkasi obi gị malitere ime ka ahụ́ ruo mkpụrụ obi m ala. —Ọma 94:19.

È nwetụla mgbe i chegburu onwe gị? O nwere ike ịbụ n’ihi ihe ndị ọzọ kwuru ma ọ bụ ihe ha mere, ma ọ bụkwanụ ya abụrụ ihe gịnwa kwuru ma ọ bụ mee. Dị ka ihe atụ, o nwere ike ịbụ na i mere mmehie ma na-eche na Jehova emekataghị gbaghara gị. I nwekwara ike ịna-eche na i nweghịzi okwukwe nakwa na ị bụ onye ọjọọ ebe ọ bụ na ihe ahụ mere ka ị na-echegbu onwe gị. Ka anyị kwuo gbasara ndị ụfọdụ a kọrọ akụkọ ha na Baịbụl. Hana, nne Samuel onye amụma, bụ nwaanyị nwere ezigbo okwukwe. N’agbanyeghị ya, o chegburu onwe ya mgbe otu onye ezinụlọ ha kpasoro ya àgwà ọjọọ. (1 Sam. 1:7) Pọl onyeozi nwere ezigbo okwukwe, ma o ‘chegburu onwe ya maka ọgbakọ niile.’ (2 Kọr. 11:28) Eze Devid nwere okwukwe siri ike n’ebe Jehova nọ, nke mere ka Jehova hụ ya n’anya nke ukwuu. (Ọrụ 13:22) Ma Devid mere mmehie dị oké njọ, nke mere ka o chegbuo onwe ya. (Ọma 38:4) Jehova kasiri onye nke ọ bụla n’ime ha obi ma mee ka obi ruo ya ala. w20.02 20 ¶1-2

Tuzdee, Mee 4

Ọ bụrụ na onye ọ bụla chọrọ iso m n’azụ, ya jụ onwe ya.—Mat. 16:24.

Otú ị ga-esi nyefee Chineke onwe gị bụ iji obi gị niile kpee ekpere, gwa ya na ị ga-eji ndụ gị na-efe ya ruo mgbe ebighị ebi. I nyefee Chineke onwe gị, ị ‘ga-ajụ onwe gị.’ Ị bụzi nke Jehova, nke bụ́kwanụ ezigbo ihe ọma. (Rom 14:8) Ihe ị na-agwa Jehova bụ na malite ugbu a gawa, ihe ga-akacha gị mkpa bụ ife ya, ọ bụghị ime ihe ga-adị gị mma. Inyefe Chineke onwe gị pụtara na i kwere ya nkwa ị na-agaghị eji gwuo egwu. Jehova anaghị amanye anyị ikwe ya ụdị nkwa ahụ. Ma, anyị kwehaala ya nkwa, ọ na-atụ anya ka anyị mezuo ya. (Ọma 116:12, 14) Ọ bụ naanị gị na Jehova ma mgbe i nyefere ya onwe gị. Ma, a na-eme baptizim n’ihu ọtụtụ ndị. Ọ na-abụkarị ná mgbakọ. I mee baptizim, ị na-egosi ndị ọzọ na i nyefeela Jehova onwe gị. N’ihi ya, baptizim i mere na-egosi ndị ọzọ na i ji obi gị niile, mkpụrụ obi gị niile, uche gị niile, na ike gị niile hụ Jehova n’anya nakwa na i kpebiela ife ya ruo mgbe ebighị ebi.—Mak 12:30. w20.03 9 ¶4-5

Wenezdee, Mee 5

Unu ekwela ka onye ọ bụla rafuo unu.—2 Tesa. 2:3.

Setan na-eme ka ndị mmadụ chefuo Jehova. Mgbe ndịozi Jizọs nwụchara, ụfọdụ ndị sịrị na ha bụ Ndị Kraịst malitere izi ozizi ụgha. (Ọrụ 20:29, 30) Ndị a si n’ezi ofufe dapụ malitere ime ka ndị mmadụ chefuo onye naanị ya bụ ezi Chineke. Dị ka ihe atụ, ha kwụsịrị ide aha Chineke na Baịbụl ha ma jiri okwu ndị dị ka “Onyenwe anyị” dochie ya. Otú a ha si were “Onyenwe anyị” dochie aha Chineke mere ka o siere onye na-agụ Baịbụl ike ịmata na Jehova dị iche ná ndị ọzọ a kpọrọ “onyenwe anyị” na Baịbụl. (1 Kọr. 8:5) Ha na-akpọ Jehova na Jizọs “Onyenwe anyị,” ya emee ka o sie ike ịmata na Jehova na Ọkpara ya abụghị otu onye. (Jọn 17:3) Ihe a ha mere mere ka ndị mmadụ kụziwe Atọ n’Ime Otu, bụ́kwanụ ihe Baịbụl na-akụzịghị. Ihe a emeela ka ọtụtụ ndị kwere na anyị agaghị amatali onye Chineke bụ. Ihe a bụ ụgha chara acha.—Ọrụ 17:27. w19.06 5 ¶11

Tọzdee, Mee 6

Jezuo ozi gị.—2 Tim. 4:5.

Otu ụzọ anyị si ejezukwu ozi anyị bụ ime ka otú anyị si ezi ozi ọma na-aka mma. (Ilu 1:5; 1 Tim. 4:13, 15) Ọ bụ ezigbo ihe ùgwù na Jehova kwere ka anyị na ya “na-arụkọ ọrụ.” (1 Kọr. 3:9) Ọ bụrụ na ị “chọpụta ihe ndị ka mkpa” ma lekwasị anya n’ozi gị, ị ga-eji “ọṅụ jeere Jehova ozi.” (Fil. 1:10; Ọma 100:2) Ebe ị bụ onyeozi Chineke, obi kwesịrị isi gị ike na ọ ga-enye gị ike ị ga-eji ejezu ozi gị n’agbanyeghị nsogbu nwere ike ịbịara gị. (2 Kọr. 4:1, 7; 6:4) Ma ọnọdụ gị ò kwere gị jiri oge buru ibu na-eje ozi ọma ma ọ bụ na o kweghị gị, ị “ga-enwe aṅụrị” ma ọ bụrụ na i jiri obi gị niile na-eje ozi gị. (Gal. 6:4) Ọ bụrụ na i jezuo ozi gị, o gosiri na ị hụrụ Jehova na ndị mmadụ ibe gị n’anya. Ọ bụrụ na i mee otú ahụ, “ị ga-azọpụta onwe gị, zọpụtakwa ndị na-ege gị ntị.”—1 Tim. 4:16. w19.04 6 ¶15; 7 ¶17

Fraịdee, Mee 7

Setan . . . na-eduhie elu ụwa dum mmadụ bi.—Mkpu. 12:9.

Otu ụzọ gbara ọkpụrụkpụ Setan na ndị mmụọ ọjọọ na-esi eduhie ndị mmadụ bụ mgbaasị. Ndị na-eme mgbaasị na-ekwu na ha ma ihe ụmụ mmadụ na-enweghị ike ịma ma ọ bụ na-eme ihe ndị mmadụ na-enweghị ike ime. Dị ka ihe atụ, ụfọdụ n’ime ha na-ekwu na ha nwere ike iji ịgba afa ma ọ bụ ịgụ kpakpando mata ihe ga-eme n’ọdịnihu. Ndị ọzọ nwere ike ime ka o yie ka hà na-agwa ndị nwụrụ anwụ okwu. Ụfọdụ na-ata amusu ma ọ bụ na-eme majik. Ha nwekwara ike ịgbalị ka ha kụọ mmadụ ọgwụ. Mgbe a gbara ndị mmadụ si ná mba iri na asatọ na Latịn Amerịka nakwa na Karịbian ajụjụ ọnụ iji chọpụta ma hà kweere na majik, ịta amusu ma ọ bụ ịgba afa, ihe dị ka otu onye n’ime mmadụ atọ ọ bụla kwuru na ha kweere na ha. Ọ fọrọ obere ka ọ bụrụkwa ọnụ ọgụgụ a kweere na mmadụ na ndị mmụọ nwere ike imekọ ihe. A gbakwara ndị si ná mba iri na asatọ n’Afrịka ajụjụ ọnụ. Ihe karịrị ọkara n’ime ha kwuru na ha kweere na e nwere amusu. N’agbanyeghị ebe anyị bi, anyị kwesịrị ịkpachara anya ka anyị ghara itinye aka na mgbaasị. w19.04 20-21 ¶3-4

Satọdee, Mee 8

Ka e wee ghara inwe onye ọ bụla nke na-akwa iko [n’etiti unu].—Hib. 12:16.

Jehova Chineke kpọrọ ụdị mmebi iwu niile asị. (Ọma 5:4-6) Ọ kpọrọ imetọ ụmụaka asị nke ukwuu n’ihi na ọ bụ mmehie jọgburu onwe ya. Ebe anyị bụ Ndịàmà Jehova, anyị weere imetọ ụmụaka ka ihe arụ, anyị anaghịkwa agbachi nkiti ma nwanna mee ya. (Rom 12:9) Imetọ ụmụaka n’ụdị ya ọ bụla, megidere “iwu nke Kraịst.” (Gal. 6:2) Ihe niile Jizọs si n’okwu ya nakwa n’ihe ndị o mere kụzie, dabeere n’ịhụnanya, ha na-emekwa ka a na-ekpe ikpe ziri ezi. Ebe ezigbo Ndị Kraịst na-edebe iwu a, ha na-emeso ụmụaka ihe n’ụzọ na-eme ka ahụ́ ruo ha ala, ha amarakwa na a hụrụ ha n’anya n’eziokwu. Ma, mmadụ imetọ ụmụaka na-egosi na onye ahụ na-eche naanị banyere onwe ya, bụrụkwa omume jọgburu onwe ya. Ọ na-eme ka ahụ́ ghara iru nwatakịrị ala, meekwa ka ọ na-eche na a hụghị ya n’anya. Ọ dị mwute ikwu na e nweekwala ụmụnna omume ọjọọ a kpara aka ọjọọ. Gịnị mere o ji dị otú a? Ọ bụ n’ihi na “ndị ajọ mmadụ na ndị nduhie” na-adịkwu ọtụtụ, ụfọdụ n’ime ha nwekwara ike ịchọ ịbata n’ọgbakọ. (2 Tim. 3:13) Ihe ọzọ bụ na ụfọdụ ndị sịrị na ha bụ ụmụnna emetọọla ụmụaka iji mee ihe na-agụ anụ ahụ́ ha agụụ. w19.05 8 ¶1-3

Sọnde, Mee 9

Ekpere nke onye ezi omume na-ekpesi ike dị ike nke ukwuu mgbe ọ na-akpa ike.—Jems 5:16.

Onye dara mbà n’obi nwere ike ịna-eche na Jehova agaghị anụ ekpere ya. Anyị gaa ịkasi onye ahụ obi, anyị nwere ike ikpere ya ekpere. Anyị na ya kpewe ekpere, anyị kwesịrị ịkpọ aha ya n’ekpere ahụ. Anyị nwere ike ịgwa Jehova na anyị na ụmụnna anyị hụrụ nwanna a n’anya. Anyị nwekwara ike ịrịọ Jehova ka ọ kasie nwa ya a ọ hụrụ n’anya obi ma mee ka obi ruo ya ala. Ụdị ekpere a na-akasi onye ike ụwa gwụrụ obi. Chee echiche nke ọma tupu gị agwa ya okwu. Okwu e kwuru n’echeghị echiche nwere ike ịgbawa mmadụ obi. Ma, okwu ọma na-agwọ ọrịa. (Ilu 12:18) N’ihi ya, rịọ Jehova ka o nyere gị aka ịhọrọ okwu ndị ga-akasi ya obi ma mee ka ahụ́ ruo ya ala. Cheta na o nweghị okwu ọ bụla ga-akpa ike karịa okwu Jehova e dere na Baịbụl. (Hib. 4:12) Mgbe anyị na-akasi ndị mmadụ obi, anyị na-echetara ha na Jehova hụrụ ha n’anya. Anyị kwesịkwara icheta na Jehova bụ Chineke na-ekpe ikpe ziri ezi. Ọ ma banyere onye ọ bụla e metọrọ, ọ bụrụgodị na e nweghị onye ọzọ manụ. Jehova na-ahụ ihe niile. Ọ ga-enyerịrị ndị niile na-eme ihe ọjọọ na-ekweghị echegharị ntaramahụhụ.—Ọnụ Ọgụ. 14:18. w19.05 18 ¶18; 19 ¶19, 21

Mọnde, Mee 10

Nọrọnụ na nche: ma eleghị anya, a pụrụ inwe onye ga-eburu unu dị ka anụ oriri ya site na nkà ihe ọmụma na aghụghọ efu, dị ka ọdịnala mmadụ si dị.— Kọl. 2:8.

Setan chọrọ ka anyị kwụsị ife Jehova. Ka o nwee ike ime ihe a o bu n’obi, ọ na-agbalị ime ka anyị gbanwee otú anyị si eche echiche, si otú ahụ mee ka anyị na-eche echiche ka ya. Ọ na-agbalịkwa iji ihe na-agụ anyị agụụ anwa anyị iji mee ka anyị na-eso ya. (Kọl. 2:4) Setan ò nwere ike iduhie anyị? Ee, o nwere ike. Anyị kwesịrị icheta na ọ bụghị ndị na-anaghị efe Chineke ka Pọl degaara ihe ahụ e kwuru ná Ndị Kọlọsi 2:8. Ọ bụ Ndị Kraịst e ji mmụọ nsọ tee mmanụ ka o degaara ya. (Kọl. 1:2, 5) Ọ bụrụ na Ndị Kraịst oge ahụ akpacharaghị anya, Ekwensu nwere ike iduhie ha. O nwekwara ike iduhie anyị taa karịadị, ma ọ bụrụ na anyị akpacharaghị anya. (1 Kọr. 10:12) N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na a chụdala Ekwensu n’ụwa a, ọ na-agbalịsikwa ike ka o duhie ndị na-efe Chineke. (Mkpu. 12:9, 12, 17) Ihe ọzọ bụ na anyị bi n’oge ndị ajọ mmadụ na ndị nduhie “na-ajọwanye njọ.”—2 Tim. 3:1, 13. w19.06 2 ¶1-2

Tuzdee, Mee 11

O zuwo! Ugbu a, Jehova, wepụ mkpụrụ obi m.—1 Eze 19:4.

Ụjọ jidere Ịlaịja mgbe Eze Nwaanyị Jezibel kwuru na ọ ga-egbu ya. N’ihi ya, ọ gbagara Bia-shiba. Ike ụwa gwụchara ya nke na ọ rịọrọ Jehova ka o mee ka ọ nwụọ. Gịnị mere o ji dị ya otú ahụ? Ịlaịja ezughị okè, ọ bụkwa “nwoke nwere ụdị mmetụta anyị na-enwe.” (Jems 5:17) O nwere ike ịbụ na o chegburu onwe ya nke ukwuu, ezigbo ike agwụkwa ya. Ọ ga-abụkwa na o chere na mbọ ọ na-agba ime ka ndị mmadụ fewe Jehova furu ọhịa, na ndị Izrel agbanwebeghị, nakwa na ọ bụ naanị ya na-efe Jehova. (1 Eze 18:3, 4, 13; 19:10, 14) Ma Jehova ghọtara otú obi dị Ịlaịja ọ baraghị ya mba maka ikwu otú obi dị ya. Kama, o nyeere ya aka inwetaghachi ume. (1 Eze 19:5-7) Jehova mechara jiri obiọma gosi Ịlaịja ike ya dị ebube, si otú ahụ gbazie echiche ya. Jehova gwaziri ya na ọ ka nwere puku mmadụ asaa n’Izrel na-ekwebeghị ife Bel. (1 Eze 19:11-18) Jehova ji ihe ndị a o mere gosi Ịlaịja na ọ hụrụ ya n’anya. w19.06 15-16 ¶5-6

Wenezdee, Mee 12

Na-edonụ onwe unu n’okpuru ndị okenye. . . . Werenụ ịdị nwayọọ n’obi kee onwe unu n’otú unu si emeso ibe unu, n’ihi na Chineke na-emegide ndị mpako.—1 Pita 5:5.

Na-erubere nzukọ Jehova isi. Ọ bụrụ na anyị ana-eme ihe niile ụmụnna ndị anyị tụkwasịrị obi na-edu ndú n’ọgbakọ gwara anyị, anyị ga-ezere nsogbu. Dị ka ihe atụ, n’otu mba a machiri ọrụ anyị, ụmụnna na-edu ndú gwara ndị nkwusa ka ha ghara inye ndị mmadụ akwụkwọ n’ozi ọma. Ma, otu nwanna bụ́ ọsụ ụzọ jụrụ ime ihe ha kwuru ma nye ndị mmadụ akwụkwọ. Gịnị mechara mee? O teghị aka ya na ụmụnna ndị ọzọ zichara ndị ebe ahụ ozi ọma, ndị uwe ojii abịa gbawa ha ajụjụ. Ọ ga-abụ na ndị na-arụrụ ndị ọchịchị ọrụ nọ na-eso ha n’azụ ma na-anakọtakwa ndị mmadụ akwụkwọ niile ụmụnna ndị ahụ nyere ha. Olee ihe ihe a merenụ na-akụziri anyị? Anyị kwesịrị ịna-erube isi ọ bụrụgodị na ihe a gwara anyị mee adịchaghị anyị mma. Jehova ga na-agọzi anyị ma ọ bụrụ na anyị ana-erubere ndị ọ họpụtara ka ha na-edu ndú n’etiti anyị isi.—Hib. 13:7, 17. w19.07 12 ¶17

Tọzdee, Mee 13

A ga-akpagbukwa ndị niile na-achọ ibi ndụ n’ụzọ kwekọrọ ná nsọpụrụ Chineke ná mmekọrịta nke ha na Kraịst Jizọs. —2 Tim. 3:12.

N’abalị bọtara ụbọchị e gburu Onyenwe anyị Jizọs, o kwuru na ndị mmadụ ga-akpọ onye ọ bụla na-eso ụzọ ya asị. (Jọn 17:14) Kemgbe ahụ, ndị na-anaghị efe Chineke anọgidela na-akpagbu Ndịàmà Jehova. Ka ọgwụgwụ nke usoro ihe a na-erukwu nso, anyị na-atụ anya na ndị iro ga na-akpagbukwu anyị. (Mat. 24:9) Olee ihe anyị kwesịrị ime ugbu a iji jikere maka mkpagbu? Ọ dịghị mkpa ka anyị nọrọ na-eche gbasara ihe ọjọọ niile nwere ike ime anyị mgbe ahụ. Anyị mee otú ahụ, o nwere ike ime ka ezigbo ụjọ jide anyị, anyị echegbuwekwa onwe anyị. O nwedịrị ike ime ka anyị kwụsị ife Jehova tupu a kpagbuwe anyị. (Ilu 12:25; 17:22) Ụjọ bụ ngwá agha jọgburu onwe ya “onye mmegide” anyị “bụ́ Ekwensu” ji alụso anyị ọgụ. (1 Pita 5:8, 9) Ọ dị ezigbo mkpa ka anyị na Jehova dịrịkwuo ná mma nakwa ka anyị mee ya ugbu a. w19.07 2 ¶1-3

Fraịdee, Mee 14

Ya mere, gaanụ mee ndị mba niile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ m.—Mat. 28:19.

Ọ ga-abụ na ndịozi Jizọs ji ezigbo obi ụtọ zukọọ n’akụkụ otu ugwu dị na Galili. Mgbe a kpọlitechara Jizọs n’ọnwụ, ọ gwara ndịozi ya ka ha zukọọ ebe ahụ. (Mat. 28:16) Ọ ga-abụ n’oge ahụ ka “ọ pụtara n’ihu ihe karịrị narị ụmụnna ise n’otu mgbe.” (1 Kọr. 15: 6) Gịnị mere Jizọs ji gwa ndị na-eso ụzọ ya ka ha zukọọ ebe a? Ọ bụ ka o nye ha ọrụ ga-eme ha obi ụtọ. Ọ sịrị ha: “Ya mere, gaanụ mee ndị mba niile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ m.” (Mat. 28:18-20) Ndị na-eso ụzọ Jizọs nọ mgbe Jizọs kwuru ihe a mechara soro n’ọgbakọ Ndị Kraịst e nwere n’oge ahụ. Ọrụ bụ́ isi ha na-arụ n’oge ahụ bụ ime ka ndị mmadụ bụrụ ndị na-eso ụzọ Kraịst. Taa, e nwere ọtụtụ ọgbakọ ndị Kraịst n’ebe dị iche iche n’ụwa. Ọrụ bụ́ isi ha na-arụkwa taa bụ ime ka ndị mmadụ bụrụ ndị na-eso ụzọ Jizọs. w19.07 14 ¶1-2

Satọdee, Mee 15

Ụwa na-adịru ọbụna mgbe ebighị ebi.—Ekli. 1:4.

Otu onye nlekọta sekit na Nọọwee kwuru na ndị na-anaghị achọ ikwu gbasara Chineke na-enwe mmasị ikwu gbasara ihe ndị na-eme n’ụwa. Ihe ọ na-eme bụ ya kelechaa mmadụ, ya asị ya: “Olee ndị i chere ga-eme ka ihe dị mma n’ọdịnihu? Ọ̀ bụ ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị, ndị ọkà mmụta sayensị, ka ọ̀ bụkwanụ onye ọzọ?” O gechaa onye ahụ ntị nke ọma, ya agụọrọ ya ma ọ bụ gwa ya ebe Baịbụl kwuru na ihe ga-adị mma n’ọdịnihu. Ọ na-amasị ụfọdụ ndị ịnụ na Baịbụl kwuru na ụwa ga-adịru mgbe ebighị ebi, nakwa na ndị ezi omume ga-ebi na ya ruo mgbe ebighị ebi. (Ọma 37:29) Anyị kwesịrị isi n’ụzọ dị iche iche na-ezi ndị mmadụ ozi ọma. N’ihi gịnị? N’ihi na ihe na-amasị otu onye nwere ike ghara ịmasị ibe ya. Ụfọdụ ndị na-enwe mmasị ikwu banyere Chineke ma ọ bụ Baịbụl, ndị ọzọ ana-enwe mmasị ikwu banyere ihe ndị ọzọ. Nke ọ bụla ọ bụ, anyị kwesịrị iji ohere ọ bụla zie ụdị mmadụ ọ bụla ozi ọma. (Rom 1:14-16) Jehova na-eme ka eziokwu anyị kụnyere n’obi ndị chọrọ ime ihe dị mma too.—1 Kọr. 3:6, 7. w19.07 22-23 ¶10-11

Sọnde, Mee 16

Ọ bụrụ otú a ka Chineke si hụ anyị n’anya, anyị onwe anyị ji ụgwọ ịhụrịta ibe anyị n’anya.—1 Jọn 4:11.

Otú Chineke si hụ anyị n’anya ga-eme ka anyị hụ ụmụnna anyị n’anya. (1 Jọn 4: 20, 21) Anyị nwere ike ịna-eche na ọ ga-adịrị anyị mfe ịhụ ụmụnna anyị n’anya. A sị ka e kwuwe, anyị na-efe Chineke ma na-agbalị ime ka ya. Anyị na-eṅomikwa Jizọs bụ́ onye hụrụ anyị n’anya nke na ọ nwụrụ maka anyị. Ma mgbe ụfọdụ, o nwere ike isiri anyị ike ịhụ ụmụnna anyị n’anya. Pọl onyeozi na ụmụnna nwaanyị abụọ aha ha bụ Yuodia na Sintiki “gbakọrọ mbọ ọnụ” n’ozi ọma. Ma, o nwere ike ịbụ na ha kwere ka nghọtahie ha nwere mee ka ha see okwu. N’akwụkwọ ozi Pọl degaara ọgbakọ Yuodia na Sintiki hà, ọ kpọrọ ha aha, gwa ha ka ha “nwee otu obi.” (Fil. 4:2, 3) Ọ chọpụtara na ọ dị mma ịdụ ndị niile nọ n’ọgbakọ ahụ ọdụ. Ọ sịrị ha: “Na-emenụ ihe niile n’atamughị ntamu, n’arụghịkwa ụka.”—Fil. 2:14. w19.08 9 ¶6-7

Mọnde, Mee 17

Na-eburịtanụ ibu arọ nke ibe unu.—Gal. 6:2.

Obi dị anyị ụtọ na ọtụtụ ọgbakọ na ọtụtụ ụmụnna na-eme ike ha niile inyere ndị ozi oge niile aka ịnọsi ike n’ozi ha. Otú ha si eme ya bụ ịna-agba ha ume ka ha ghara ịkwụsị ozi ha, ịna-achọtụrụ ha ego ma ọ bụ ihe ndị ọzọ, ma ọ bụkwanụ inyere ha aka na-elekọta ndị ezinụlọ ha nọ n’ụlọ. E nwee ndị ozi oge niile ozi ha na-eje gbanwere, ha agafeta n’ọgbakọ unu, echela na ọ pụtara na ha anaghị arụ ọrụ ha nke ọma ma ọ bụ na e ji ya dọọ ha aka ná ntị. Kama, nyere ha aka ka ahụ́ ruo ha ala n’ebe a ha gafetara. Jiri obi gị niile nabata ha. Na-ajakwa ha mma maka ọrụ ha rụrụla, ọ bụrụgodị na ọrịa ekweghịzi ha mee ihe ha na-emebu. Gbalịa mata ha nke ọma. Mụta ihe n’ihe ndị ha ma eme, n’ọzụzụ ndị e nyere ha, nakwa n’ihe ndị ha hụrụ ná ndụ. Ná mmalite, o nwere ike ịdị mkpa ka i nyere ụmụnna ndị a aka ịchọta ụlọ, ọrụ, inyere ha aka n’ihe gbasara ịgba ụgbọala, na ihe ndị ọzọ dị ha mkpa. w19.08 23-24 ¶12-13

Tuzdee, Mee 18

M [ga-edo] . . . onwe m nsọ n’ebe ị nọ, n’ihu ha, gị Gọg. —Ezik. 38:16.

Ihe Gọg ga-atụkwasị obi bụ ‘ogwe aka ya bụ́ anụ ahụ́,’ ya bụ, ìgwè ndị agha ya. (2 Ihe 32:8) Ma, anyịnwa ga-atụkwasị Jehova Chineke anyị obi. Mba dị iche iche lechaa anyị, ha ga-eche na anyị dị iberiibe. A sị ka e kwuwe, Babịlọn Ukwu ahụ na-akpabu ike, ma chi ndị ọ nọ na-efe azọpụtalighị ya n’aka “anụ ọhịa ahụ” na “mpi iri” ya. (Mkpu. 17:16) N’ihi ya, Gọg ga-eche na ọ ga-adịrị ya mfe imeri anyị. Ọ ga-abịa ịlụso ndị Jehova ọgụ “dị ka ígwé ojii” si ekpuchi ala. Ma, ọ gaghị adị anya Gọg amata na ọnyà amala ya. Gọg ga-amata na ọ bụ Jehova ka ọ bịara ịlụso ọgụ otú ahụ Fero matara n’Oké Osimiri Uhie. (Ọpụ. 14:1-4; Ezik. 38:3, 4, 18, 21-23) Kraịst na ndị agha ya nke eluigwe ga-echebe ndị Chineke ma laa Gọg na ndị agha ya n’iyi. (Mkpu. 19:11, 14, 15) Gịnị ga-eme Setan, bụ́ onyeisi ndị iro Chineke, onye ji ụgha ya mee ka mba dị iche iche lụso ndị Chineke ọgụ n’Amagedọn? Jizọs ga-atụba ya na ndị mmụọ ọjọọ ya n’abis, kpọchie ha n’ebe ahụ ruo otu puku afọ.—Mkpu. 20:1-3. w19.09 11-12 ¶14-15

Wenezdee, Mee 19

Na-atụ anya ya; n’ihi na ọ ga-emezurịrị.—Hab. 2:3.

Anyị na-atụkarị anya ka ihe ọma ndị Jehova kwere anyị ná nkwa mezuo. Ma, ọ bụrụ na ọ dị anyị ka ihe anyị na-atụ anya ya ọ̀ na-egbu oge, o nwere ike ime ka ike gwụwa anyị. O nwedịrị ike ime ka anyị daa mbà. (Ilu 13:12) Ọ bụ ihe mere ụfọdụ ụmụnna anyị n’ihe dị ka n’afọ 1914. Ọtụtụ Ndị Kraịst e tere mmanụ tụrụ anya ịga eluigwe n’afọ ahụ. Mgbe nke ahụ na-emeghị, gịnị ka ndị ji obi ha niile na-efe Jehova mere gbasara ya? Ha akwụsịghị ịgba ọsọ ndụ n’ihi na ihe ka ha mkpa bụ iji obi ha niile na-eme uche Chineke, ọ bụghị ịga eluigwe. Ha kpebisiri ike iji ntachi obi na-agba ọsọ ndụ ahụ. O doro anya na ị na-atụsi anya ike ka Jehova mee ka a kwụsị ịkọcha aha ya, mee ka o doo anya na ọ bụ ọchịchị ya kacha mma, mezuokwa nkwa niile o kwere. Ka obi sie gị ike na ihe ndị a ga-emezu mgbe oge Jehova ruru. Tupu mgbe ahụ, ka anyị niile na-agbalịsi ike n’ozi Chineke ma ghara ikwe ka ihe anyị na-atụ anya ya na-emebeghị mee ka anyị dawa mbà. w19.08 4-5 ¶9-10

Tọzdee, Mee 20

M dị nwayọọ, dịkwa umeala n’obi.—Mat. 11:29.

Jụọ onwe gị, sị: ‘Ndị ọzọ hà ma m ka onye dị nwayọọ na onye dị umeala n’obi? M̀ na-arụ ọrụ ndị e weere ka ọrụ dị ala iji nyere ndị ọzọ aka? M̀ na-emere ndị ọzọ obiọma?’ Jizọs mere ka ahụ́ ruo ndị ya na ha na-arụkọ ọrụ ala. Ịzụ ha na-emekwa ya obi ụtọ. (Luk 10:1, 19-21) O mere ka ọ dịrị ndị na-eso ụzọ ya mfe ịjụ ya ajụjụ. Ọ chọkwara ịnụ ihe ha chere. (Mat. 16:13-16) Ndị na-eso ụzọ ya nọ na-eme nke ọma otú ahụ ihe a kụrụ akụ na-ama pokopoko ma a na-elekọta ya nke ọma. Ha mụtara ihe Jizọs kụziiri ha ma jiri ya na-eme ihe dị mma. È nwere ndị ị na-elekọta? Ọ bụrụ na e nwere, jụọ onwe gị, sị: ‘Olee otú m si emeso ndị mụ na ha na-arụkọ ọrụ ma ọ bụ ndị ezinụlọ m? M̀ na-eme ka udo dị? M̀ na-eme ka ọ dịrị ha mfe ịjụ m ajụjụ? M̀ na-ege ha ntị ma ha kwuwe uche ha?’ Ndị Farisii anaghị achọ ka ndị mmadụ jụọ ha ajụjụ. Ha na-atakwa onye ọ bụla kwuru ihe dị iche n’ihe ha chere ahụhụ. Anyị ekwesịghị ịna-eme ka ha.—Mak 3:1-6; Jọn 9:29-34. w19.09 20 ¶1; 23 ¶9-11

Fraịdee, Mee 21

Mgbe ọ bụla ha na-asị: “Udo na obi iru ala!” mgbe ahụ ka mbibi mberede ga-abịakwasị ha n’otu ntabi anya.—1 Tesa. 5:3.

Mgbe ụfọdụ, ndị ọchịchị ụwa na-ekwu ụdị ihe ahụ ma ha kwuwe otú mba dị iche iche ga-esi dịkwuo ná mma. Ma, “udo na obi iru ala” ahụ Baịbụl kwuru na a ga-ama ọkwa ya ga-adị iche. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na, a maa ọkwa ahụ, ndị mmadụ nwere ike iche na ndị ọchịchị ụwa emeela ka udo dị n’ụwa, meekwa ka obi ruo onye ọ bụla ala. Ma nke bụ́ eziokwu bụ na “mbibi mberede” ga-abịakwasị ha n’oge “oké mkpagbu” ahụ. (Mat. 24:21) Anyị amaghị ihe ga-eme ka ha maa ọkwa ahụ ma ọ bụ otú ha ga-esi ama ya. Anyị amaghịkwa ma hà ga-ama ya naanị otu ugboro, ka hà ga-ama ya ugboro ugboro. Nke ọ bụla ọ bụ, ihe anyị ma bụ na anyị ekwesịghị ikwe ka ndị ọchịchị ụwa mee ka anyị chee na ha ga-emeli ka ezigbo udo dị n’ụwa. Kama, ọkwa ahụ ga-egosi na “ụbọchị Jehova” agawala ibido.—1 Tesa. 5:2. w19.10 8-9 ¶3-4

Satọdee, Mee 22

N’oge ahụ, ndị gị ga-alanahụ.—Dan. 12:1.

Ọ bụ agha Amagedọn ga-apịachi ọgwụgwụ ụwa ochie a. Ma, anyị ekwesịghị ịtụ egwu. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na ọ bụ Chineke ga-alụ agha ahụ. (Ilu 1:33; Ezik. 38:18-20; Zek. 14:3) Jehova ga-agwa Jizọs mgbe ọ ga-edu ndị agha ya bido agha ahụ. Ndị ga-eso ya bụ ndị e tere mmanụ a kpọlitere n’ọnwụ na ìgwè ndị mmụọ ozi. Ha ga-agbakọ aka lụso Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya na ndị òtù ha nọ n’ụwa agha. (Mkpu. 6:2; 17:14) Jehova kwere anyị nkwa, sị: “Ngwá ọgụ ọ bụla a ga-akpụ iji lụso gị ọgụ agaghị aga nke ọma.” (Aịza. 54:17) “Oké ìgwè mmadụ” ndị ji obi ha niile na-efe Jehova ‘ga-esi n’oké mkpagbu ahụ pụta’ ná ndụ. Ha ga na-ejekwara ya ozi dị nsọ. (Mkpu. 7:9, 13-17) Ihe Baịbụl kwuru gbasara ọdịnihu na-eme ka obi sie anyị ezigbo ike. Anyị ma na “Jehova na-echebe ndị kwesịrị ntụkwasị obi.” (Ọma 31:23) Obi ga-adị ndị niile hụrụ Jehova n’anya ma na-eto ya ụtọ ịhụ mgbe ọ ga-eme ka a kwụsị ịta aha nsọ ya ụta.—Ezik. 38:23. w19.10 18-19 ¶17-18

Sọnde, Mee 23

Ezi enyi nwere ịhụnanya mgbe niile.—Ilu 17:17.

Ka anyị na-eru ná ngwụcha “oge ikpeazụ” a, nsogbu ndị tara akpụ nwere ike ịbịara anyị. (2 Tim. 3:1) Dị ka ihe atụ, mgbe e mechara ntụliaka n’otu obodo dị n’ebe ndịda Afrịka, ọgba aghara na tigbuo zọgbuo bidoro. Ruo ihe karịrị ọnwa isii, ụmụnna anyị enweghị ike ịgagharị agagharị n’ihi ọgụ a na-alụ n’ebe niile. Olee ihe nyeere ha aka idi nsogbu ahụ? Ụfọdụ gbagara n’ụlọ ụmụnna ha ndị bi n’ebe ọgụ ahụ na-erubeghị. Otu nwanna kwuru, sị: “Mgbe ihe a mere, obi tọrọ m ụtọ na m nwere ndị enyi gbara m gburugburu. Anyị gbara ibe anyị ume.” Mgbe “oké mkpagbu ahụ” ga-amalite, obi ga-adị anyị ụtọ na anyị nwere ezigbo ndị enyi hụrụ anyị n’anya. (Mkpu. 7:14) N’ihi ya, anyị kwesịrị ime ka anyị na ụmụnna anyị na-adịkwu ná mma ugbu a. (1 Pita 4:7, 8) N’ihi gịnị? N’ihi na ndị iro anyị ga na-agbalị ịgwa anyị ihe na-abụghị eziokwu gbasara ụmụnna anyị iji kewaa anyị. Ha ga na-agbalị ime ka anyị na ụmụnna anyị sewe okwu. Ma, mbọ ha ga-akụ afọ n’ala. Ha agaghị emeli ka anyị kwụsị ịhụ ụmụnna anyị n’anya. w19.11 2 ¶1-2; 7 ¶19

Mọnde, Mee 24

Unu [ga-enwe] ike imenyụ akụ́ ụta niile na-ere ọkụ nke ajọ onye ahụ.—Efe. 6:16.

Setan bụ́ “nna ụgha” na-eji ndị na-ejere ya ozi agbasa ụgha gbasara Jehova na ụmụnna anyị. (Jọn 8:44) Dị ka ihe atụ, ndị si n’ezi ofufe dapụ na-ekwu ihe na-abụghị eziokwu gbasara nzukọ Jehova n’Ịntanet na televishọn nakwa n’ebe ndị ọzọ a na-agbasa ozi. Ụgha ndị ahụ so ‘n’akụ́ ụta niile na-ere ọkụ’ nke Ekwensu. Gịnị ka anyị kwesịrị ime ma mmadụ gwawa anyị gbasara ụgha ndị ahụ? Anyị ekwesịghị ige ya ntị. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na anyị tụkwasịrị Jehova na ụmụnna anyị obi. Nke bụ́ eziokwu bụ na anyị na ndị si n’ezi ofufe dapụ ekwesịghị ikwurịta ihe ọ bụla. Anyị ekwesịghịkwa ikwe ka ihe ọ bụla ma ọ bụ onye ọ bụla mee ka anyị na onye ọ bụla rụwa ụka, ọ bụrụgodị na naanị ihe anyị chọrọ bụ ịmata ihe ha chere. Anyị ekwesịghị ikwe ka ihe ọ bụla ma ọ bụ onye ọ bụla kpaa okwukwe anyị aka ọjọọ. Ị̀ gbalịsiela ike jụ ige ntị n’ihe ndị si n’ezi ofufe dapụ na-ekwu nakwa ịrụwa ụka gbasara ụgha ha na-agbasa? Ihe i mere dị mma. Ma, anyị kwesịrị ịkpachara anya n’ihi na Setan nwere ngwá ọgụ ndị ọzọ o ji na-alụso anyị ọgụ. w19.11 15 ¶8; 16 ¶11

Tuzdee, Mee 25

Jehova na-enyocha mmụọ. —Ilu 16:2.

Ị chọọ ikpebi ihe ị ga-eme, chee ihe mere i ji chọọ ime ihe ahụ. Jehova chọrọ ka anyị na-ekwu eziokwu n’ihe niile anyị na-eme. N’ihi ya, anyị kpebiwe ihe anyị ga-eme, anyị kwesịkwara ịgwa ma onwe anyị ma ndị ọzọ eziokwu gbasara ihe mere anyị ji chọọ ime ihe ahụ. Ọ bụrụ na anyị ekwuchaghị eziokwu, o nwere ike isiri anyị ike ime ihe ahụ anyị kpebiri. Dị ka ihe atụ, nwanna bụ́ onye na-eto eto nwere ike ikpebi ịbụ ọsụ ụzọ oge niile. Ma, ka oge na-aga, ya esiere ya ike ịrụzu awa ya. Ozi ọma agaghịzi na-atọ ya ụtọ. O nwere ike ịbụ na o chere na ihe mere o ji malite ịsụ ụzọ bụ na ọ chọrọ ime ihe dị Jehova mma. Ma, ọ̀ ga-abụ na ihe mere o ji malite ịsụ ụzọ bụ na ọ chọrọ ime ihe dị nne na nna ya ma ọ bụ onye ọzọ mma? Chegodị banyere onye a na-amụrụ Baịbụl kpebiri ịkwụsị ịṅụ sịga. Ná mbido, ọ gbalịrị kwụsị ya ruo otu izu ma ọ bụ abụọ, ma mechaa ṅụọkwa ya ọzọ. O mechaziri kwụsị ya kpamkpam. Ihe nyeere ya aka ịkwụsị ya bụ na ọ hụrụ Jehova n’anya ma chọọ ime ihe dị ya mma.—Kọl. 1:10; 3:23. w19.11 27 ¶9; 29 ¶10

Wenezdee, Mee 26

Na-akpanụ àgwà n’ụzọ kwesịrị ozi ọma banyere Kraịst.—Fil. 1:27.

Obi siri Pọl onyeozi ike na ọ ga-agbaru ọsọ ndụ ahụ n’isi, nwetakwa ihe ọ chọrọ inweta. Ebe o so ná ndị e tere mmanụ, o nwere olileanya inweta “ihe a na-agbata n’ọsọ, bụ́ òkù a kpọrọ ịga eluigwe.” Ma, ọ chọpụtara na o kwesịrị ijisi ike na-agba ọsọ ahụ ma ọ bụrụ na ọ ga-enweta ihe ahụ ọ chọrọ inweta. (Fil. 3:14) Pọl meere ndị Filipaị ihe atụ dabara adaba iji nyere ha aka ilekwasị anya n’ihe ha chọrọ inweta. Pọl chetaara ndị Filipaị na ha ga-emecha gaa eluigwe. (Fil. 3:20) Olee ihe mere ha ji kwesị icheta ya? N’oge ahụ, ndị mmadụ chọsiri ike ịbụ ụmụ amaala Rom n’ihi na ọ ga-abara ha ọtụtụ uru. Ma, ndị e tere mmanụ bụ ụmụ amaala nke ọchịchị karịrị nke ndị Rom. Uru ha ga-erite na ya enweghịkwa atụ. E nweghị ihe ịbụ nwa amaala Rom bụ ma e jiri ya tụnyere ịbụ nwa amaala Alaeze Chineke. Taa, Ndị Kraịst e tere mmanụ na-egosi anyị otú e si agbasi mbọ ike ka ha na-agbalịsi ike inweta ndụ ebighị ebi n’eluigwe. w19.08 6 ¶14-15

Tọzdee, Mee 27

Ọ bụrụ na Ọkpara ahụ emee ka unu nwere onwe unu, unu ga-enwere onwe unu n’ezie.—Jọn 8:36.

O doro anya na nnwere onwe a karịrị nke Jubili mere ka ndị Izrel nwee n’oge ochie. (Lev. 25:8-12) Dị ka ihe atụ, onye nweere onwe ya n’afọ Jubili nwere ike imecha gbawakwa ohu. Ọ ga-emechakwa nwụọ. N’ụbọchị Pentikọst afọ 33, Jehova ji mmụọ nsọ tee ndịozi Jizọs na ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị ndị ọzọ kwesịrị ntụkwasị obi mmanụ. O mere ka ha bụrụ ụmụ ya ka o nwee ike ịkpọlite ha n’ọnwụ n’ọdịnihu, ka ha soro Jizọs chịa n’eluigwe. (Rom 8:2, 15-17) Ha bụ ndị mbụ Jizọs mere ka ha nwere onwe ha otú ahụ o kwuru n’ụlọ nzukọ dị na Nazaret. (Luk 4:16-19, 21) Ha nweere onwe ha n’ụgha niile ndị ndú okpukpe ndị Juu na-akụzi na omenala ha ndị na-esighị n’Okwu Chineke. Chineke wekwaara ha ka ndị nweerela onwe ha ná mmehie, nke bụ́ ihe na-akpata ọnwụ. Nnwere onwe ahụ Jehova haziri nke malitere mgbe e tere ndị na-eso ụzọ Jizọs mmanụ n’afọ 33 ga-akwụsị ma Jizọs chịchaa otu puku afọ. w19.12 11 ¶11-12

Fraịdee, Mee 28

Mkpakọrịta ọjọọ na-emebi àgwà ọma.—1 Kọr. 15:33.

Ndị nne na nna, nyerenụ ụmụ unu aka ka ha meta ezigbo ndị enyi. Nne na nna kwesịrị ịma ndị ha na ụmụ ha na-akpa na ihe ha na-eme. Ihe ọ pụtara bụ na ndị nne na nna kwesịrị ịma ndị ha na ụmụ ha na-ezirịta ozi n’Ịntanet nakwa n’ekwentị. Ụmụaka nwere ike malite iche echiche ma ọ bụ ịkpa àgwà ka ndị enyi ha. Ọtụtụ ndị nne na nna na-agbalị ka ụmụ ha na ndị na-eme nke ọma n’ọgbakọ na-anọrị. Dị ka ihe atụ, otu nwanna aha ya bụ N’Déni na Bomine nwunye ya, bụ́ ndị Kot Devụa, na-akpọkarị ndị nlekọta sekit ka ha nọrọ n’ụlọ ha. N’Déni kwuru, sị: “Ime otú ahụ baara nwa anyị nwoke ezigbo uru. Ọ malitere ịsụ ụzọ. Ọ bụzi onye na-arụchitere onye nlekọta sekit ọrụ.” Ọ ga-aka mma ka nne na nna malite n’oge zụwa ụmụ ha. (Ilu 22:6) Chegodị gbasara Timoti. Yunis nne Timoti na Lọịs nne nne ya malitere ‘n’oge ọ bụ nwa ọhụrụ’ zụwa ya.—2 Tim. 1:5; 3:15. w19.12 25 ¶14; 26 ¶16-17

Satọdee, Mee 29

E nwere enyi nke na-arapara n’ahụ́ karịa nwanne.—Ilu 18:24.

Bụrụ enyi kwesịrị ntụkwasị obi. Dị ka ihe atụ, ihe anyị na-eme abụghị naanị ikwe ụmụnna anyị ihe siiri ike nkwa na anyị ga-enyere ha aka, kama anyị na-enyere ha aka. (Mat. 5:37; Luk 16:10) Ọ bụrụ na ndị nwere nsogbu amara na anyị ga-enyere ha aka, ọ ga-akasi ha ezigbo obi. Otu nwanna nwaanyị kwuru ihe kpatara ya. Ọ sịrị: “Ị gaghị echegbuwe onwe gị ma onye sịrị na ya ga-enyere gị aka ọ̀ ga-emekwa ihe o kwuru mgbe o kwesịrị ime ya.” Ọ bụrụ na nsogbu abịara mmadụ, obi ga-adịtụ ya mma ma ọ kọọrọ ya enyi ọ tụkwasịrị obi. Ma, ị chọọ ịbụ ezigbo enyi ndị ọzọ ga-atụkwasịli obi, ị ga-amụta ịna-enwe ndidi. Mgbe di otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Zhanna hapụrụ ya kwaga ebe ọzọ, o nwetatụrụ onwe ya mgbe ọ kọọrọ ezigbo ndị enyi ya otú obi dị ya. O kwuru, sị: “Ha gere m ntị nke ọma n’agbanyeghị na ọ dị ka m̀ nọ na-ekwughachi otu ihe ọtụtụ ugboro.” Ị ga-abụkwa ezigbo enyi ma ọ bụrụ na ị na-ege ndị mmadụ ntị nke ọma. w20.01 10-11 ¶9-11

Sọnde, Mee 30

Ọ ga-ejupụtakwa na mmụọ nsọ malite n’afọ nne ya. —Luk 1:15.

Na Baịbụl, e nwere ọtụtụ ndị kwesịrị ntụkwasị obi Jehova nyere mmụọ nsọ ya, ma ha enweghị olileanya ibi n’eluigwe. Mmụọ nsọ duziri Devid. (1 Sam. 16:13) Mmụọ nsọ nyeere ya aka ịghọta ihe ndị gbara ọkpụrụkpụ banyere Jehova nakwa iso dee Baịbụl. (Mak 12:36) N’agbanyeghị ihe ndị ahụ, Pita onyeozi kwuru na “Devid arịgoghị n’eluigwe.” (Ọrụ 2:34) Jọn Onye Na-eme Baptizim ‘jupụtara na mmụọ nsọ.’ (Luk 1:13-16) Jizọs kwuru na e nwebeghị onye ka Jọn ukwuu, ma o kwuru na Jọn esoghị ná ndị ga-achị n’Alaeze eluigwe. (Mat. 11:10, 11) Jehova nyere ndị a ike mmụọ nsọ ime ihe ndị dị ịtụnanya, ma o jighị ya họrọ ha ịga eluigwe. Ọ̀ pụtara na ha ekwesịghị ntụkwasị obi ka ndị ahụ ọ họọrọ ịga chịa n’eluigwe? Mba. Ọ pụtara na Jehova ga-akpọlite ha n’ọnwụ ka ha biri na Paradaịs ga-adị n’ụwa.—Jọn 5:28, 29; Ọrụ 24:15. w20.01 25 ¶15

Mọnde, Mee 31

Anyị onwe anyị nwere ịhụnanya, n’ihi na o bu ụzọ hụ anyị n’anya.—1 Jọn 4:19.

Jehova kpọrọ anyị ka anyị soro ná ndị na-efe ya. Ndị anyị na ha so na-efe Chineke bụ ndị nyefere ya onwe ha ma nwee okwukwe n’àjà Ọkpara ya ji ndụ ya chụọ. Anyị niile dị ka ezinụlọ nwere obi ụtọ. Anyị na-ebi ndụ bara uru ugbu a. Obi dịkwa anyị ụtọ na anyị na-atụ anya ịdị ndụ ebighị ebi n’eluigwe ma ọ bụ na Paradaịs ga-adị n’ụwa. Ihe mere Jehova ji mee ka anyị soro ná ndị na-efe ya bụ na ọ hụrụ anyị n’anya nke ukwuu. Ma, ime otú ahụ furu ya nnukwu ihe. (Jọn 3:16) O “ji ihe dị oké ọnụ ahịa zụta” anyị. (1 Kọr. 6:20) Jehova ji àjà ahụ Jizọs chụrụ mee ka anyị na ya dị ná mma. Obi dị anyị ụtọ na anyị nwere ike ịkpọ Onye kachanụ ma n’eluigwe ma n’ụwa Nna anyị. O nweghị nna a ga-eji tụnyere Jehova. Anyị nwere ike ịjụ ajụjụ otu onye so dee Baịbụl jụrụ. Ọ sịrị: “Gịnị ka m ga-eji kwụọ Jehova ụgwọ uru niile ọ na-eme ka m rite?” (Ọma 116:12) Azịza ya bụ na anyị agaghị akwụli Jehova ụgwọ ihe o meere anyị. Ma, ịhụnanya ya mere ka anyị hụ ya n’anya. w20.02 8 ¶1-3

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya