Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • es21 p. 58-67
  • Jun

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Jun
  • Inyocha Akwụkwọ Nsọ Kwa Ụbọchị—2021
  • Isiokwu Nta
  • Tuzdee, Jun 1
  • Wenezdee, Jun 2
  • Tọzdee, Jun 3
  • Fraịdee, Jun 4
  • Satọdee, Jun 5
  • Sọnde, Jun 6
  • Mọnde, Jun 7
  • Tuzdee, Jun 8
  • Wenezdee, Jun 9
  • Tọzdee, Jun 10
  • Fraịdee, Jun 11
  • Satọdee, Jun 12
  • Sọnde, Jun 13
  • Mọnde, Jun 14
  • Tuzdee, Jun 15
  • Wenezdee, Jun 16
  • Tọzdee, Jun 17
  • Fraịdee, Jun 18
  • Satọdee, Jun 19
  • Sọnde, Jun 20
  • Mọnde, Jun 21
  • Tuzdee, Jun 22
  • Wenezdee, Jun 23
  • Tọzdee, Jun 24
  • Fraịdee, Jun 25
  • Satọdee, Jun 26
  • Sọnde, Jun 27
  • Mọnde, Jun 28
  • Tuzdee, Jun 29
  • Wenezdee, Jun 30
Inyocha Akwụkwọ Nsọ Kwa Ụbọchị—2021
es21 p. 58-67

Jun

Tuzdee, Jun 1

Nwunye di ya kpasukwara ya iwe nke ukwuu iji mee ka obi ghara iru ya ala.—1 Sam. 1:6.

E nwere nsogbu ndị tara akpụ bịaara Hana, nne Samuel onye amụma. Ọ mụtaghị nwa ruo ọtụtụ afọ. (1 Sam. 1:2) N’Izrel, a na-ewere nwaanyị na-amụtaghị nwa ka onye a bụrụ ọnụ. O mere ka ezigbo ihere na-eme Hana. (Jen. 30:1, 2) Nke kadị njọ bụ na di Hana nwere nwunye ọzọ aha ya bụ Penina. Ọ mụtara ụmụ. Penina na-akpasukwa Hana iwe nke ukwuu banyere ya. Ihe ahụ nọ na-ewe Hana ezigbo iwe. Ụdị iwe na-ewe ya mere ka “ọ na-akwa ákwá ma ghara iri nri.” “Ọ na-ewutekwa ya” ná mkpụrụ obi. (1 Sam. 1:7, 10) Gịnị nyeere Hana aka? Hana kpere ekpere ma kọọrọ Jehova otú ọ dị ya n’obi. Mgbe o kpechara ekpere, ọ kọwaara Ilaị Nnukwu Onye Nchụàjà ihe ya na ya na-alụ. Ilaị gwara ya, sị: “Laa n’udo, ka Chineke Izrel meekwara gị ihe ị rịọrọ ya.” Gịnị meziri? Hana lawara “ma riwe ihe, ihu ya agbarụghịkwa agbarụ ọzọ.” (1 Sam. 1:17, 18) Ekpere mere ka obi ruo Hana ala. w20.02 21 ¶4-5

Wenezdee, Jun 2

Ka okwu unu dịrị n’amara mgbe niile, ka ọ bụrụ ihe e ji nnu mee ka ọ dị ụtọ, ka unu wee mara otú unu kwesịrị isi azaghachi onye ọ bụla.—Kọl. 4:6.

N’oge na-adịghị anya, Jehova ga-ebibi ụwa ochie a. Ọ bụ naanị ndị “nwere ezi obi maka inweta ndụ ebighị ebi” ka a ga-azọpụta. (Ọrụ 13:48) N’ihi ya, anyị chọkwara ka ndị ezinụlọ anyị bịa soro anyị fewe Jehova. Jehova, bụ́ Nna hụrụ anyị n’anya, ‘achọghị ka e bibie onye ọ bụla, kama ọ chọrọ ka mmadụ niile chegharịa.’ (2 Pita 3:9) Anyị kwesịrị iburu n’obi na e nwere ụzọ dị mma na ụzọ na-adịghị mma e si ezi ozi ọma. Dị ka ihe atụ, anyị nwere ike iji olu ọma zie onye anyị na-amaghị ozi ọma. Ma, anyị ziwezie onye ezinụlọ anyị ozi ọma, anyị ejiri ọnụ ọjọọ na-agwa ya okwu. Anyị cheta oge mbụ anyị gbalịrị izi ndị ezinụlọ anyị ozi ọma, ọtụtụ n’ime anyị nwere ike ịkwa mmakwaara n’otú anyị si dowe ọnụ zie ha ya. Anyị kwesịrị ịna-echeta ndụmọdụ a Pọl onyeozi nyere n’ihe mmụta dịịrị ụbọchị taa mgbe ọ bụla anyị na-ezi onye ezinụlọ anyị ozi ọma. Ma ọ́ bụghị ya, anyị nwere ike ime ihe ga-eme ka ọ ghara ige anyị ntị. w19.08 14-15 ¶3-5

Tọzdee, Jun 3

Kraịst [hapụụrụ] unu ihe nlereanya ka unu wee sochie nzọụkwụ ya anya.—1 Pita 2:21.

Gịnị ka i mere mgbe ị mụtara eziokwu ndị a gbasara Ọkpara Chineke? Jizọs bụ onye nke abụọ kachanụ n’eluigwe na ụwa. Ọ bụ Onye Mgbapụta anyị. O ji obi ya niile kweta ịnwụ maka anyị. Ọ bụrụ na omume anyị egosi na anyị nwere okwukwe n’àjà ahụ ọ chụrụ, Chineke ga-agbaghara anyị mmehie anyị, anyị na ya adịrị ná mma, anyị enwetakwa ndụ ebighị ebi. (Jọn 3:16) Jizọs bụ Nnukwu Onye Nchụàjà. Ọ chọrọ inyere anyị aka ka anyị rite uru n’àjà ahụ ọ chụrụ nakwa ka anyị na Chineke dịrị n’ezigbo mma. (Hib. 4:15; 7:24, 25) Ebe ọ bụ Eze nke Alaeze Chineke, ọ bụ ya ka Chineke ga-esi n’aka ya mee ka e doo aha ya nsọ, mee ka ihe ọjọọ kwụsị, meekwa ka ndị mmadụ nweta ngọzi ebighị ebi na Paradaịs na-abịanụ. (Mat. 6:9, 10; Mkpu. 11:15) Ọ bụ Jizọs ka anyị kwesịrị ịna-eso nzọụkwụ ya. O ji ndụ ya niile mee uche Chineke, sikwa otú ahụ gosi anyị ihe anyị kwesịrị ime. (Jọn 4:34) I kweta ihe Baịbụl na-akụzi gbasara Jizọs, ị ga-ahụ Ọkpara Chineke n’anya. Ịhụnanya ahụ ga-eme ka ị chọọ iji ndụ gị na-eme uche Chineke otú ahụ Jizọs mere. w20.03 10 ¶12-13

Fraịdee, Jun 4

Na-ekpenụ ekpere n’akwụsịghị akwụsị.—1 Tesa. 5:17.

Jizọs kpere ekpere ọtụtụ ugboro n’abalị ikpeazụ ọ dịrị ndụ n’ụwa. Mgbe o gosiri ndị na-eso ụzọ ya otú ha ga-esi na-echeta ọnwụ ya, o kpere ekpere maka achịcha na mmanya ndị ahụ. (1 Kọr. 11:23-25) Tupu ya apụọ n’ebe ya na ndị na-eso ụzọ ya nọ mee Ememme Ngabiga, ya na ha kpere ekpere. (Jọn 17:1-26) Mgbe ya na ndị na-eso ụzọ ya rutere Getsemeni n’abalị ahụ, o kpere ekpere ọtụtụ ugboro. (Mat. 26:36-39, 42, 44) Okwu ikpeazụ Jizọs kwuru tupu ya anwụọ bụkwa ekpere. (Luk 23:46) Jizọs kpere ekpere banyere ihe niile mere n’abalị ikpeazụ ọ dịrị ndụ n’ụwa. Otu ihe mere Jizọs ji die nsogbu ndị bịaara ya bụ na o kpere ekpere ọtụtụ ugboro ka Nna ya nyere ya aka idi nsogbu ya. Ndịozi ya anọgideghị na-ekpe ekpere n’abalị ahụ. O mere ka ha ghara inwe obi ike mgbe ọnwụnwa bịaara ha. (Mat. 26:40, 41, 43, 45, 56) Nsogbu bịara anyị, anyị ga-ekwesị ntụkwasị obi ma anyị ṅomie Jizọs ma “na-ekpe ekpere mgbe niile.” w19.04 9 ¶4-5

Satọdee, Jun 5

Abụ m Jehova; adịghị m agbanwe agbanwe.—Mal. 3:6.

Jehova kpọrọ mgbaasị asị. Ọ gwara ndị Izrel, sị: “A gaghị ahụ n’etiti unu onye ọ bụla nke na-esure nwa ya nwoke ma ọ bụ nwa ya nwaanyị n’ọkụ, onye ọ bụla nke na-agba afa, onye na-eme anwansi ma ọ bụ onye ọ bụla nke na-achọ ihe mgbaàmà ọdịnihu ma ọ bụ dibịa anwansi, ma ọ bụ onye na-akọ ndị ọzọ ọgwụ ma ọ bụ onye ọ bụla nke na-ajụ onye na-agba afa ase ma ọ bụ onye ọrụ ya bụ ịkọ ọdịnihu ma ọ bụ onye ọ bụla nke na-ajụ ndị nwụrụ anwụ ase. N’ihi na onye ọ bụla nke na-eme ihe ndị a bụ ihe arụ n’anya Jehova.” (Diut. 18:10-12) Ndị Kraịst anaghị edebe Iwu ahụ Jehova si n’aka Mozis nye ndị Izrel. Ma, anyị ma na otú o si ele mgbaasị anya agbanwebeghị. Jehova dọrọ anyị aka ná ntị gbasara ime mgbaasị n’ihi na ọ ma na Setan na-eji ya etinye ndị mmadụ ná nsogbu. Setan na-eji mgbaasị eme ka ndị mmadụ kwere n’ụgha ọ na-agha. Otu n’ime ụgha ya bụ na mmadụ nwụọ, na ọ na-aga dịrị ndụ ebe ọzọ. (Ekli. 9:5) Setan na-ejikwa mgbaasị eme ka ụjọ na-atụ ndị mmadụ, jirikwa ya na-eme ka ha ghara ife Jehova. Ihe o bu n’obi eme ya bụ ka ndị na-eme mgbaasị tụkwasị ndị mmụọ ọjọọ obi kama ịtụkwasị Jehova obi. w19.04 21 ¶5-6

Sọnde, Jun 6

Ọ bụrụ na ị na-eme ihe ọjọọ, tụọ egwu.—Rom 13:4.

Imetọ ụmụaka bụ mmehie jọgburu onwe ya. Onye metọrọ nwatakịrị mere ya oké ihe ọjọọ. Ọ bụ eziokwu na nwatakịrị ahụ tụkwasịrị ya obi, ọ kpachaara anya mee ka obi gbawaa nwa ahụ, mee ka ahụ́ ghara ịna-eru nwa ahụ ala, manye nwa ahụ ime ihe ọ na-ekwesịghị ime. E kwesịrị ichebe ụmụaka ka a ghara ịrụsa ha arụrụala a. E kwesịkwara ịkasi ndị e metọrọ obi ma nyere ha aka. (1 Tesa. 5:14) Mgbe onye nọ n’ọgbakọ metọrọ nwatakịrị, ọ na-emebi aha ọgbakọ. (Mat. 5:16; 1 Pita 2:12) Anyị anaghị ekwe ka ndị mere mmehie dị oké njọ ma na-emebi aha ọgbakọ nọgide n’ọgbakọ ma ọ bụrụ na ha jụrụ ichegharị. Ọ bụrụ na onye nọ n’ọgbakọ adaa iwu ndị ọchịchị, dị ka imetọ nwatakịrị, ọ na-emehie ndị ọchịchị. (Tụlee Ọrụ Ndịozi 25:8.) E nyeghị ndị okenye ikike ịta ndị dara iwu ndị ọchịchị ahụhụ. Ma ha anaghị egbochi ndị ọchịchị ịta onye metọrọ nwatakịrị ahụhụ. w19.05 9 ¶4-7

Mọnde, Jun 7

Amamihe nke ụwa a bụ ihe nzuzu n’ebe Chineke nọ.—1 Kọr. 3:19.

Anyị nwere ihe ga-enyere anyị aka idi nsogbu ọ bụla nwere ike ịbịara anyị n’ihi na Jehova bụ Onye Ozizi Ukwu anyị. (Aịza. 30:20, 21) Okwu ya bụ́ Baịbụl na-agwa anyị ihe niile dị anyị mkpa iji “ruo eru n’ụzọ zuru ezu” nakwa iji bụrụ ndị “a kwadebere n’ụzọ zuru ezu ịrụ ezi ọrụ niile.” (2 Tim. 3:17) Ọ bụrụ na anyị ana-eme ihe Baịbụl na-akụziri anyị, anyị na-ama ihe karịa ndị na-akwado “amamihe nke ụwa a.” (Ọma 119:97-100) Ọ dị mwute na ọ na-agụkarị anụ ahụ́ anyị agụụ ime ihe ụwa na-akụzi. N’ihi ya, o nwere ike ịna-esiri anyị ike ịghara ịna-eche echiche na ịna-akpa àgwà ka ndị ụwa. Ọ bụ ya mere Baịbụl ji gwa anyị, sị: “Nọrọnụ na nche: ma eleghị anya, a pụrụ inwe onye ga-eburu unu dị ka anụ oriri ya site na nkà ihe ọmụma na aghụghọ efu, dị ka ọdịnala mmadụ si dị.” (Kọl. 2:8) Baịbụl kwukwara na n’oge ikpeazụ a, ndị mmadụ ga-abụ ndị “hụrụ ihe ụtọ n’anya” nke ukwuu. (2 Tim. 3:4) Otu ihe gosiri na amamihe nke ụwa bụ nzuzu bụ otú ọrịa ndị a na-ebute ná mmekọahụ, dị ka ọrịa o biri n’ájá ọcha, si ju ebe niile.—2 Pita 2:19. w19.05 21 ¶1-2; 22 ¶4-5

Tuzdee, Jun 8

Guzosie ike megide atụmatụ aghụghọ nke Ekwensu.—Efe. 6:11.

Setan ghọgburu ndị Izrel ha ekweta na ka ihe ha kụrụ nwee ike ime nke ọma, ha ga na-eme ka mba ndị na-ekpere arụsị gbara ha gburugburu. Mba ndị ahụ kweere na e nwere ụfọdụ ihe ha ga na-emere chi ha ka o nwee ike ime ka mmiri na-ezo. Ndị na-enweghị okwukwe na Jehova kweere na ha ga-eme ka mba ndị ahụ ka ọkọchị ghara ịkọ ruo ogologo oge. N’ihi ya, ha mere ihe ndị mba ahụ na-eme iji fee Bel. Setan jikwa agụụ mmekọahụ rụrụ arụ nwaa ha. Mba ndị ahụ na-efe chi ụgha na-eme omume rụrụ arụ ndị na-asọ oyi iji fee chi ha. Ihe ụfọdụ ha na-eme n’ofufe a rụrụ arụ bụ inwe ma ụmụ nwaanyị ma ụmụ nwoke na-agba akwụna n’ụlọ arụsị. Ha kwere ka ụmụ nwoke na-edina ụmụ nwoke, ụmụ nwaanyị ana-edinakwa ụmụ nwaanyị, kwerekwa ka a na-eme omume rụrụ arụ ndị ọzọ. Ha wedịịrị ihe ndị ahụ ka ihe dị mma. (Diut. 23:17, 18; 1 Eze 14:24) Ha kweere na ihe ndị ahụ ha na-eme na-eme ka chi ha mee ka ala ha na-eme nri nke ọma. Omume rụrụ arụ ndị na-efe chi ụgha na-eme iji fee chi ha masịrị ọtụtụ ndị Izrel, ya emee ka ha soro ha fewe chi ha. w19.06 2 ¶3; 4 ¶7-8

Wenezdee, Jun 9

Chineke abụghị onye ajọ omume ichefu ọrụ unu na ịhụnanya unu gosiri maka aha ya.—Hib. 6:10.

E nwere ọtụtụ ndị na-ejebu ozi na Betel ma ọ bụ n’ebe ndị ọzọ ozi ha gbanwere. O nwere ike isiri ụmụnna ndị ahụ ike ịhapụ ozi ha na-eje nke na-atọ ha ezigbo ụtọ. Ọ bụrụ na ị bụ otu n’ime ha, olee ihe ga-enyere gị aka ịna-enwe obi ụtọ n’agbanyeghị na ozi gị gbanwere? Nọrọ Jehova nso site n’ịgụ Baịbụl kwa ụbọchị ma na-echebara ihe ị gụrụ echiche. Akwụsịkwala ịna-eme ike gị niile n’ozi ọma n’ọgbakọ ọhụrụ gị. Jehova na-echeta ndị ji obi ha niile na-ejere ya ozi, ọ bụrụgodị na ha agaghịzi emeli ihe ha na-emebu. Ebila ndụ okomoko. Ekwela ka nchegbu nke ụwa Ekwensu a mee ka ị kwụsị ịna-efe Chineke. (Mat. 13:22) Ekwela ka ụwa a, ndị enyi gị ma ọ bụ ndị ikwu gị ndị chọrọ ka ihe gaziere gị mee ka i chewe na ịchụ akụnụba ọnwụ ọnwụ ga-eme ka ndụ gị ka mma n’ụwa ochie a. (1 Jọn 2:15-17) Tụkwasị Jehova obi. O kwere nkwa na ọ ga-enyere gị aka ka okwukwe gị sie ike, mee ka ahụ́ ruo gị ala, nyekwa gị ihe ọ bụla dị gị mkpa “n’oge kwesịrị ekwesị.”—Hib. 4:16; 13:5, 6. w19.08 20 ¶4; 21-22 ¶7-8

Tọzdee, Jun 10

Tụkwasị Jehova ibu arọ gị, ya onwe ya ga-akwadokwa gị. —Ọma 55:22.

Ò nwere ihe na-eme ka ị na-echegbu onwe gị ugbu a? Obi dị anyị ụtọ ịmara na Jehova na-aghọta ihe ndị na-enye anyị nsogbu n’obi. Ọ ma ihe ndị anyị ga-emeli na ihe ndị anyị na-agaghị emeli. Ọ madị ihe anyị na-eche n’echiche na otú obi na-adị anyị. (Ọma 103:14; 139:3, 4) Ọ bụrụ na anyị atụkwasị Jehova obi, ọ ga-enyere anyị aka idi nsogbu ndị na-eme ka anyị na-echegbu onwe anyị. Oké nchekasị nwere ike ime ka i chewe na ọnọdụ gị agaghị agbanwe agbanwe, meekwa ka ị daa mbà n’obi. Ụdị ihe ahụ mee gị, cheta na Jehova ga-enyere gị aka ịkwụsị ichegbu onwe gị. Olee otú ọ ga-esi enyere gị aka? Ọ chọrọ ka ị gwa ya nsogbu gị na otú obi dị gị. Ọ ga-anụkwa ákwá ị na-ebe maka enyemaka. (Ọma 5:3; 1 Pita 5:7) Na-arịọ Jehova n’ekpere mgbe mgbe maka nsogbu gị. Ọ ga-eji Baịbụl na nzukọ ya nyere gị aka. Ihe ndị e dere na Baịbụl nwere ike ịkasị gị obi, meekwa ka i nwee olileanya. Ụmụnna gị ga-agbakwa gị ume.—Rom 15:4; Hib. 10:24, 25. w19.06 16 ¶7-8

Fraịdee, Jun 11

Mba niile ga-akpọkwa unu asị n’ihi aha m.—Mat. 24:9.

Mgbe a na-akpagbu gị, kpegara Jehova ekpere, “wụpụ ihe dị gị n’obi dị ka mmiri” ma gwa Nna gị hụrụ gị n’anya ihe niile bụ́ ụjọ gị na ihe niile na-echegbu gị. (Ákwá 2:19) Ọ bụrụ na i si otú a na-ekpe ekpere, ị ga na-abịarukwu Jehova nso. (Rom 8:38, 39) Obi sie gị ike na ihe ndị Jehova kwere nkwa imere anyị n’Alaeze ya ga-emezu. (Ọnụ Ọgụ. 23:19) Ọ bụrụ na obi esighị gị ike na nkwa ndị a ga-emezu, ọ ga-adịrị Ekwensu na ndị ọrụ ya mfe imenye gị ụjọ. (Ilu 24:10; Hib. 2:15) Gbalịa wepụta oge mee nchọnchọ ka ị chọpụta nkwa ndị Chineke kwere ga-emezu n’Alaeze ahụ nakwa ihe mere obi kwesịrị iji sie gị ike na ha ga-emezu. Olee uru ọ ga-abara gị? Chebara ihe mere otu nwanna aha ya bụ Stanley Jones echiche. A tụrụ ya mkpọrọ afọ asaa n’ihi ihe o kweere. Gịnị nyeere ya aka ịtachi obi? O kwuru, sị: “Okwukwe m siri ike n’ihi na amaara m gbasara Alaeze Chineke na ihe ndị ọ ga-emezu. Obi sikwara m ike na ha ga-eme. Ọ bụ ya mere na o nweghị ihe ọ bụla ga-emeli ka m hapụ Jehova.” Ọ bụrụ na obi esie gị ike na Jehova ga-emezu nkwa ya, ị gaghị ekwe ka ụjọ mee ka ị kwụsị ife ya.—Ilu 3:25, 26. w19.07 2 ¶1; 3 ¶6-7

Satọdee, Jun 12

N’obodo ukwu ma ọ bụ n’obodo nta ọ bụla unu banyere, chọpụtanụ onye kwesịrị ekwesị n’ime ya, nọrọkwanụ n’ebe ahụ ruo mgbe unu ga-apụ.—Mat. 10:11.

Gịnị mere ime ndị na-eso ụzọ ji dị ezigbo mkpa? N’ihi na ọ bụ naanị ndị na-eso ụzọ Jizọs ga-abụli enyi Chineke. Ihe ọzọkwa bụ na ndị na-eso ụzọ Jizọs na-ebi ndụ ka mma ugbu a, nweekwa olileanya ịdị ndụ ebighị ebi n’ọdịnihu. (Jọn 14:6; 17:3) O doro anya na ọrụ a Jizọs nyere anyị dị ezigbo mkpa, ma anyị agaghị arụli ya n’ike anyị. Pọl onyeozi kwuru banyere ya na ndịozi ibe ya, sị: “Anyị bụ ndị ha na Chineke na-arụkọ ọrụ.” (1 Kọr. 3: 9) Obi dị anyị ụtọ na Jehova na Jizọs kwere ka anyị na ha na-arụkọ ọrụ. Ihe ọzọkwa bụ na ọrụ ime ndị na-eso ụzọ na-eme anyị obi ụtọ. Ihe mbụ anyị ga-eme ma anyị chọọ ime ndị na-eso ụzọ bụ ‘ịchọpụta’ ndị chọrọ ịmụta banyere Jehova. Ọ bụrụ na anyị ana-ekwusara mmadụ niile anyị hụrụ ozi ọma, anyị na-egosi na anyị bụ Ndịàmà Jehova. Ọ bụrụkwa na anyị ana-ekwusa ozi ọma Jizọs nyere anyị iwu ka anyị kwusaa, anyị na-egosi na anyị bụ ezigbo Ndị Kraịst. w19.07 15 ¶3-5

Sọnde, Jun 13

Amamihe bụ ihe nchebe, dịkwa ka ego bụ ihe nchebe; ma ihe ihe ọmụma ji ka mma bụ na amamihe na-echebe ndị nwe ya ndụ.—Ekli. 7:12.

Ihe na-ebu ụzọ amasị ọtụtụ ndị bụ ihe ndị Baịbụl kwuru ga-abara ha uru. Na Niu Yọk, e nwere otu nwanna nwaanyị na-aga ezi ndị na-asụ asụsụ Chaịniiz ozi ọma. O kwuru, sị: “M na-agbalị igosi ndị mmadụ na m nwere mmasị n’ebe ha nọ, na-egekwa ha ntị. M chọpụta na ha si mba ọzọ bịa ọhụrụ, m na-ajụ ha, sị: ‘Olee otú ihe si kwụrụ? Ùnu achọtala ọrụ? Ndị ebe a hà na-elekọtakwa unu nke ọma?’” Mgbe ụfọdụ, ime otú a na-enyere ya aka ịmalite ịgwa mmadụ ihe Baịbụl kwuru. Mgbe ọ dabara adaba, nwanna nwaanyị ahụ na-ajụkwa onye ahụ, sị: “Olee ihe i chere kacha mkpa anyị ga-eme ka anyị na ndị ọzọ nwee ike ịna-adị ná mma? Ka m gositụ gị otu ilu dị na Baịbụl. Ọ sịrị: ‘Mmalite esemokwu dị ka mmadụ imeghere mmiri ụzọ; ya mere, tupu esemokwu amalite, si n’ebe ahụ pụọ.’ Ì chere na ndụmọdụ a ga-enyere anyị aka ka anyị na ndị ọzọ na-adị ná mma?” (Ilu 17:14) Ụdị mkparịta ụka a ga-enyere anyị aka ịmata ndị ga-achọ ka anyị bịaghachi. w19.07 23 ¶13

Mọnde, Jun 14

Olee otú ọ ga-adịrị otu onye nke ọ bụ naanị ya, bụ́ onye dara mgbe a na-enweghị onye ọzọ ga-ekulite ya?—Ekli. 4:10.

Ihe kacha ndị kwagara ebe ha ga-eje ozi mkpa abụghị imetere ha ebere, kama, ọ bụ ịghọta otú ihe si dịrị ha ma nyere ha aka. O nwere ike ịbụ na ha na ọrịa na-alụ ma ọ bụ na e nwere onye ezinụlọ ha ahụ́ na-adịghị ma ọ bụkwanụ na ha na-eru uju onye nwụnahụrụ ha. Ọ bụrụgodị na ha ekwupụtaghị ya, o nwere ike ịna-ewute ha na ha hapụrụ ụmụnna ndị ha na ha dị ná mma n’ebe ha jeburu ozi. N’eziokwu, ọ na-ewe ezigbo oge tupu ụdị echiche ahụ apụchaa mmadụ n’obi. Obi ga na-adị ha ụtọ n’ebe a ha gafetara ma ọ bụrụ na ị na-akwado ha, na-emekwa ihe ga na-agba ha ume. Otu nwanna nwaanyị nke jere ozi ọtụtụ afọ ná mba ọzọ kwuru, sị: “N’ebe m na-ejebu ozi, m na-amụrụ ndị mmadụ Baịbụl kwa ụbọchị. Ma, mgbe m bịara ebe a, o siiri m ike ịhụ onye m ga-agụrụ amaokwu Baịbụl ma ọ bụ onye m ga-egosi vidio n’ozi ọma. Ma, ndị nkwusa nọ n’ọgbakọ anyị gwara m ka m soro ha gaa nletaghachi ha, sorokwa ha mụọrọ ndị mmadụ Baịbụl. O mere ka obi sie m ike na ebe a ga-emecha tọwa m ụtọ. M mụtara otú e si ebido izi mmadụ ozi ọma n’ebe ọhụrụ a. Ihe ndị a nyeere m aka inwewekwa obi ụtọ.” w19.08 22 ¶10; 24 ¶13-14

Tuzdee, Jun 15

Ana m agba Yuodia na Sintiki ume ka ha nwee otu obi n’ime Onyenwe anyị.—Fil. 4:2.

Ihe mere Yuodia na Sintiki nwekwara ike ime anyị. O nwere ike isiri anyị ezigbo ike ịhụ ụmụnna anyị n’anya ma ọ bụrụ na anyị na-elekwasịkarị anya n’ihe ha na-emejọ. Anyị niile na-emehie kwa ụbọchị. Ọ bụrụ na anyị ana-eche gbasara ihe ụmụnna anyị na-emetaghị, ọ ga-esikwuru anyị ike ịhụ ha n’anya. Dị ka ihe atụ, nwanna chefuo inyere anyị aka mgbe anyị na-azacha Ụlọ Nzukọ Alaeze, o nwere ike iwe anyị iwe. Ọ bụrụ na anyị echewezie gbasara ihe ọjọọ ndị ọzọ o mere, iwe anyị ga-akakwu njọ. Anyị agaghịzi ahụ ya n’anya otú anyị kwesịrị. Ụdị ihe ahụ mee, ọ ga-adị mma ka i cheta na Jehova na-ahụ ezughị okè anyị na ezughị okè ụmụnna anyị. Ma, n’agbanyeghị na anyị ezughị okè, ọ ka hụrụ anyị na ụmụnna anyị n’anya. N’ihi ya, anyị kwesịrị ịna-elekwasị anya n’ebe ụmụnna anyị na-eme nke ọma, hụkwa ha n’anya otú Jehova si hụ ha n’anya. Anyị gbalịsie ike na-ahụ ụmụnna anyị n’anya, ọ ga-eme ka anyị na ha dịkwuo n’otu.—Fil. 2:1, 2. w19.08 9-10 ¶7-8

Wenezdee, Jun 16

Jehova . . . na-ahụ onye dị umeala n’obi.—Ọma 138:6.

Jehova hụrụ ndị dị umeala n’obi n’anya. Ọ bụ naanị ndị dị umeala n’obi n’eziokwu ka ha na ya ga-abụli enyi. “Ma ọ na-anọ onye na-ebuli onwe ya elu n’ebe dị anya.” Anyị niile chọrọ ime ihe dị Jehova mma, chọọkwa ka anyị na ya dịrị ná mma. N’ihi ya, anyị kwesịrị ịmụta ịdị umeala n’obi. Ịdị umeala n’obi bụ adịghị nganga ma ọ bụ mpako. Ihe Baịbụl kwuru gosiri na onye dị umeala n’obi ghọtara na o nweghị ebe o ruru ma e jiri ya tụnyere Jehova. Ọ ma na e nwere ihe ndị ọzọ ji ka ya mma. (Fil. 2:3, 4) E nwere ndị ị ga-ahụ, gị echee na ha dị umeala n’obi. Ha nwere ike ịbụ ndị ihere. O nwekwara ike ịbụ na omenala ha na otú e si zụọ ha mere ka ha na-akwanyere ndị ọzọ ùgwù. Ma, n’ime obi ha, o nwere ike ịbụ mpako juru na ya. Ha na-emecha gosi ihe dị ha n’obi.—Luk 6:45. w19.09 2 ¶1, 3-4

Tọzdee, Jun 17

Ọ na-abọ ọbọ n’ahụ́ . . . ndị na-adịghị erube isi n’ozi ọma banyere Onyenwe anyị Jizọs. —2 Tesa. 1:8.

“Ozi ọma banyere Onyenwe anyị Jizọs” bụ eziokwu niile Jizọs kụziri. Anyị na-erube isi n’ozi ọma ahụ ma ọ bụrụ na anyị na-eme ihe dị na ya. Otú anyị si eme ya bụ ibu ụzọ na-achọ Alaeze Chineke, irube isi n’iwu Chineke na ikwusa ozi ọma Alaeze Chineke. (Mat. 6:33; 24:14) Otú ọzọ anyị si eme ya bụ ịna-akwado ụmụnna Jizọs e tere mmanụ n’ọrụ dị mkpa ha na-arụ. (Mat. 25:31-40) N’oge na-adịghị anya, ndị ohu Chineke e tere mmanụ ga-emere ndị so ‘n’atụrụ ọzọ’ ihe ọma maka aka niile ha nyeere ha. (Jọn 10:16) Olee otú ha ga-esi mee ya? Tupu Amagedọn amalite, a ga-akpọlite ndị niile so n’otu narị puku na iri puku anọ na puku anọ n’ọnwụ, ha agaa eluigwe, bụrụ ndị mmụọ na-anaghị anwụ anwụ. Ha ga-esozi n’ìgwè ndị agha ga-esi n’eluigwe bịa kụọ Gọg pịapịa ma chebe “oké ìgwè mmadụ” ndị yiri atụrụ. (Mkpu. 2:26, 27; 7:9, 10) N’eziokwu, obi ga-adị oké ìgwè mmadụ ahụ ezigbo ụtọ na ha kwadoro ndị ohu Chineke e tere mmanụ mgbe ha ka nọ n’ụwa. w19.09 12-13 ¶16-18

Fraịdee, Jun 18

Mkpụrụ obi unu ga-enweta ume.—Mat. 11:29.

Gịnị mere anyị ji enweta ume ma anyị rụọ ọrụ ahụ Jizọs nyere anyị? Ọ bụ n’ihi na anyị nwere ndị nlekọta kacha mma. Jehova, bụ́ Onye Nlekọta anyị kachanụ, abụghị nna ukwu obi fere azụ, nke na-anaghị ekele ndị meere ya ihe. O ji ọrụ anyị na-arụrụ ya kpọrọ ihe. (Hib. 6:10) Ọ na-enyekwa anyị ike anyị ga-eji rụọ ọrụ o nyere anyị. (2 Kọr. 4:7; Gal. 6:5) Jizọs, bụ́ Eze anyị, gosiri anyị otú anyị ga-esi na-emeso ndị ọzọ. (Jọn 13:15) Ndị okenye na-agbalịkwa ime ka Jizọs, bụ́ “nnukwu onye ọzụzụ atụrụ ahụ.” (Hib. 13:20; 1 Pita 5:2) Ha na-agbasi mbọ ike ịdị obiọma, ịna-enwe obi ike, na ịna-agba anyị ume ka ha na-akụziri anyị ihe ma na-echebe anyị. Anyị nwekwara ndị enyi kacha mma. E nweghị ndị nwere ụdị ndị enyi hụrụ ha n’anya na ụdị ọrụ na-eme obi ụtọ anyị nwere. Chegodị ihe a: Ndị anyị na ha na-arụkọ ọrụ bụ ụmụnna anyị, bụ́ ndị nwere àgwà kacha mma na ndị na-anaghị eche na ha ka ndị ọzọ mma. Ha na-ewere na ndị ọzọ ka ha mma. Ha anaghị ewere anyị naanị ka ndị ha na ha na-arụkọ ọrụ, kamakwa ka ndị enyi. Otú ha si hụ anyị n’anya mere ka ha dịrị njikere ịnwụ maka anyị. w19.09 20 ¶1; 23 ¶12-14

Satọdee, Jun 19

Unu onwe unu . . . anọghị n’ọchịchịrị, nke mere ụbọchị ahụ ga-eji bịakwasị unu na mberede dị ka chi ọbụbọ si abịakwasị ndị ohi.—1 Tesa. 5:4.

Mgbe Pọl onyeozi na-agba ụmụnna ya ume, o kwuru gbasara “ụbọchị Jehova.” (1 Tesa. 5:1-6) N’amaokwu Baịbụl ahụ, ọ pụtara na oge ahụ ga-amalite mgbe a ga-alụso “Babịlọn Ukwu ahụ” ọgụ, ya bụ, okpukpe ụgha niile dị n’ụwa, jirikwa Amagedọn pịachie ya. (Mkpu. 16:14, 16; 17:5) Pọl gwakwara anyị ihe anyị kwesịrị ime iji jikere maka “ụbọchị Jehova.” Anyị ekwesịghị “ịnọ na-ehi ụra dị ka ndị ọzọ na-ehi.” Anyị kwesịrị ‘ịmụrụ anya’ ma na-eche nche ka anyị ghara itinye aka n’agha ma ọ bụ na ndọrọ ndọrọ ọchịchị nke ụwa a. Anyị tinye aka n’ụdị ihe ahụ, anyị nwere ike ịbụzi “nke ụwa.” (Jọn 15:19) Anyị ma na ọ bụ naanị Alaeze Chineke ga-eme ka udo dị n’ụwa a. Anyị kwesịkwara inyere ndị ọzọ aka ka ha mata ihe Baịbụl kwuru ga-eme n’ụwa a. Ozugbo oké mkpagbu ahụ bidoro, ndị mmadụ agaghịzi abịali fewe Jehova, n’ihi na oge agaala. Ọ bụ ya mere o ji dị ezigbo mkpa ka anyị kwusaa ozi ọma ugbu a. w19.10 8 ¶3; 9 ¶5-6

Sọnde, Jun 20

Were akwụkwọ mpịakọta dee ihe niile m gwara gị . . . na m ga-eme Izrel na Juda.—Jere. 36:2.

Mgbe oge ruru ka a mata ihe e dere n’akwụkwọ mpịakọta ahụ, Jeremaya tụkwasịrị Barọk obi na ọ ga-agwa ndị mmadụ ihe e dere na ya. (Jere. 36:5, 6) Barọk katara obi mee ihe a n’agbanyeghị na o nwere ike ịta isi ya. Chegodị otú obi si tọọ Jeremaya ụtọ mgbe ọ hụrụ ka Barọk banyere n’ogige ụlọ nsọ ahụ mee ihe ahụ ọ gwara ya. (Jere. 36:8-10) Ndị isi Juda nụrụ ihe Barọk mere ma nye ya iwu ka ọ gụpụtara ha ihe e dere n’akwụkwọ mpịakọta ahụ. (Jere. 36:14, 15) Ndị isi ahụ kpebiri ịgwa Eze Jehoyakim ihe Jeremaya kwuru. Mgbe a gụụrụ Eze Jehoyakim ihe Jeremaya dere, ụdị iwe were ya mere ka ọ gbaa akwụkwọ mpịakọta e ji dee ya ọkụ, nyekwa iwu ka a nwụchie Jeremaya na Barọk. Ma, Jeremaya nyere Barọk akwụkwọ mpịakọta ọzọ. Ka ọ na-agwa Barọk ihe Jehova kwuru, Barọk dere “ihe niile . . . dị n’akwụkwọ ahụ Jehoyakim eze Juda gbara ọkụ.”—Jere. 36:26-28, 32. w19.11 3-4 ¶4-6

Mọnde, Jun 21

Chineke na-arụ ọrụ n’ime unu . . . ka unu wee na-enwe ọchịchọ ma na-eme ihe.—Fil. 2:13.

Jehova nwere ike ịbụ ihe ọ bụla ọ dị mkpa ka ọ bụrụ iji mezuo ihe ọ chọrọ. Dị ka ihe atụ, o nweela mgbe Jehova bụ Onye Ozizi, Onye Nkasi Obi, Onye Na-ezisa Ozi Ọma, na ọtụtụ ihe ndị ọzọ. (Aịza. 48:17; 2 Kọr. 7:6; Gal. 3:8) Ma, ọtụtụ mgbe, ọ na-eji ndị mmadụ emezu ihe ọ chọrọ. (Mat. 24:14; 28:19, 20; 2 Kọr. 1:3, 4) Jehova nwekwara ike inye onye ọ bụla n’ime anyị amamihe na ike ọ ga-eji bụrụ ihe ọ bụla dị mkpa iji mezuo uche ya. Ihe a niile so n’ihe ụfọdụ ndị ọkà mmụta kwuru na aha Jehova nwere ike ịpụta. Anyị niile chọrọ ịbara Jehova uru. Ma o nwere ike ịna-eme ụfọdụ ndị obi abụọ ma Jehova ò ji ha na-arụ ọrụ. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na ọ na-adị ha ka afọ ole ha dị, otú ihe si dịrị ha, ma ọ bụ enweghị nkà ọ̀ na-eme ka ha ghara ime ihe niile ha chọrọ ime n’ozi Jehova. E nwekwara ndị na-eche na ha na-eme ihe niile ha kwesịrị ime n’ozi Jehova. N’ihi ya, o nweghị ihe ọzọ ha kwesịrị ime. w19.10 20 ¶1-2

Tuzdee, Jun 22

Ịhụ ego n’anya bụ mgbọrọgwụ nke ụdị ihe ọjọọ niile.—1 Tim. 6:10.

Ịhụ akụnụba n’anya nwere ike imegharị anyị anya, meekwa ka anyị leghara okwukwe anyị anya. Pọl onyeozi kwuru, sị: “Onye ọ bụla nke na-eje ozi dị ka onye agha adịghị etinye aka n’ọrụ ego a na-arụ ná ndụ, ka ihe ya wee masị onye debara aha ya dị ka onye agha.” (2 Tim. 2:4) N’eziokwu, a naghị ekwe ka ndị agha ndị Rom rụwa ọrụ ọzọ. Anyị dị ka ezigbo ndị agha. Anyị agaghị ekwe ka ihe ọ bụla megharịa anyị anya, obi anyị apụzie n’ihe bụ́ mkpa anyị, ya bụ, ime ihe ga-adị Ndị Ọchịagha anyị bụ́ Jehova na Jizọs mma. Anyị weere ya ka ihe dị mkpa karịa ihe ọ bụla anyị ga-enweta n’ụwa Ekwensu a. Anyị ga-agbalịsi ike ka anyị nwee oge na ume anyị ga-eji na-ejere Jehova ozi, na-emekwa ka ọta anyị na ihe ndị ọzọ so n’ekike agha Chineke nyere anyị dịrị otú ha kwesịrị. Anyị kwesịrị ịsa anya na mmiri. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na Pọl dọrọ anyị aka ná ntị na a ‘ga-eduhie ndị kpebisiri ike ịba ọgaranya,’ ha ‘adapụkwa n’okwukwe.’—1 Tim. 6:9, 10. w19.11 17 ¶12, 14-15

Wenezdee, Jun 23

Mgbe ahụ ka mbibi mberede ga-abịakwasị ha n’otu ntabi anya.—1 Tesa. 5:3.

A ga-ama ọkwa na e nweela “udo na obi iru ala” tupu “ụbọchị Jehova” abịa. (1 Tesa. 5:1-6) “Ụbọchị Jehova” e kwuru okwu ya ná 1 Ndị Tesalonaịka 5:2 bụ “oké mkpagbu ahụ.” (Mkpu. 7:14) Olee otú anyị ga-esi mara na oké mkpagbu ahụ achọwala ibido? Ọ bụ ọkwa Baịbụl kwuru na a ga-ama na e nweela “udo na obi iru ala.” Ọkwa ahụ ndị ọchịchị ụwa ga-ama ga-egosi na oké mkpagbu ahụ agawala ibido. Ndị ndú okpukpe hà ga-eso kwuo ya? Ha nwere ike. Ma, ihe ahụ ga-abụ ụgha ọzọ si n’aka ndị mmụọ ọjọọ. Ma, ụgha a ga-ajọgbu onwe ya n’ihi na ọ ga-eme ka ndị mmadụ chee na e nweela ezigbo udo tupu oké mkpagbu a na-ahụtụbeghị ụdị ya amalite. Nke bụ́ eziokwu bụ na “mbibi mberede ga-abịakwasị ha n’otu ntabi anya” otú ahụ ime si eme nwaanyị dị ime na mberede. Gịnị ga-eme ndị ji obi ha niile na-efe Jehova? Otú ụbọchị Jehova si bịa n’otu ntabi anya nwere ike iju ha anya, ma ha ga-adị njikere maka ya. w19.09 9 ¶7-8

Tọzdee, Jun 24

E nwere oge a kara aka maka ihe ọ bụla, . . . oge ịchọ ihe na oge iwere na ihe efuola.—Ekli. 3:1, 6.

Ị chọọ ikpebi ihe ị ga-eme, kapịa ya ọnụ. Ọ bụrụ na ị kapịa ihe ị chọrọ ime ọnụ, ọ ga-enyere gị aka imecha ihe ị malitere. Dị ka ihe atụ, o nwere ike ịbụ na i kpebiri ịna-agụ Baịbụl kwa ụbọchị. Ma, ọ bụrụ na i nweghị usoro ị ga-esi na-agụ ya, o nwere ike ị gaghị emezu ya. Ndị okenye ọgbakọ nwere ike ikpebi ịna-agakwuru ndị ọgbakọ ha nleta ọzụzụ atụrụ. Ma, ka oge na-aga, ya abụrụ na ha emebeghị ihe ahụ ha kpebiri ime. Ha chọọ ime ihe ha kpebiri, ha nwere ike ibu ụzọ jụọ onwe ha, sị: “Ànyị achọpụtala ụmụnna ndị nleta ọzụzụ atụrụ ga-akacha baara uru? Ànyị ekpebiela mgbe anyị ga-aga leta ha?” Kpebiekwa ihe ị ga-emeli. E nweghị onye ọ bụla n’ime anyị nwere oge, ike, ma ọ bụ ihe ndị ọzọ ọ ga-eji mee ihe niile ọ ga-achọ ime. N’ihi ya, kpebie ihe ị ga-emeli. Mgbe ụfọdụ, o nwere ike ịdị mkpa ka ị gbanwee ihe i kpebiri ime ma ị chọpụta na ị gaghị emeli ya. w19.11 29 ¶11-12

Fraịdee, Jun 25

Ndị a bụ ndị si n’oké mkpagbu ahụ pụta, ha asawokwa uwe mwụda ha, meekwa ka ọ na-acha ọcha n’ime ọbara Nwa Atụrụ ahụ. —Mkpu. 7:14.

E buru amụma gbasara otú ụwa ga-adị mgbe ahụ n’Aịzaya 65:21-23. Anyị agaghị na-anọ nkịtị mgbe ahụ. Kama, Baịbụl kwuru ihe gosiri na ndị Chineke ga na-arụ ọrụ ga-abara ha uru, na-emekwa ha obi ụtọ. Jizọs chịchaa otu puku afọ, obi siri anyị ike na a ga-eme “ka ihe e kere eke nwere onwe ya pụọ n’ịbụ ohu nke ire ure ma nweta nnwere onwe dị ebube nke ụmụ Chineke.” (Rom 8:21) Otú ahụ Jehova haziri ka ndị Izrel nwee oge ịrụ ọrụ na oge izu ike ka ọ ga-emekwara ndị ya n’otu puku afọ ahụ Jizọs ga-achị. O doro anya na a ga-enwe oge anyị ga-eji na-efe Chineke. Ife Chineke na-eme ka anyị na-enwe obi ụtọ taa. Otú ahụ ka ọ ga-adịkwa n’ụwa ọhụrụ. Ndị ji obi ha niile na-efe Chineke ga na-enwe obi ụtọ n’otu puku afọ ahụ Jizọs ga-achị n’ihi na anyị niile ga na-arụ ọrụ ga-eme anyị obi ụtọ, na-efekwa Chineke. w19.12 12 ¶15; 13 ¶17-18

Satọdee, Jun 26

Okwu ndị a . . . ga-adị n’obi gị; kụnye ha n’ime ụmụ gị. —Diut. 6:6, 7.

Okwu Hibru e si sụgharịta “kụnye” pụtara “ịkụziri mmadụ ihe ugboro ugboro ka ọ baa ya n’obi.” Ihe ga-enyere ndị nne na nna aka ime otú ahụ bụ ịna-ewepụta oge ka ha na ụmụ ha ndị obere na-anọ. Ike nwere ike ịna-agwụ ndị nne na nna ma ha na-agwa ụmụ ha otu ihe ugboro ugboro. Ma, ndị nne na nna ga-agbalị were ya ka ohere ha ga-eji nyere ụmụ ha aka ka ha ghọta ihe Baịbụl kwuru ma na-eme ya. N’ihi ya, mata ụmụ gị nke ọma. Abụ Ọma 127 ji ụmụaka tụnyere akụ́. (Ọma 127:4) Akụ́ na-adị n’ụdị n’ụdị. Ha anaghịkwa aha. Otú ahụ ka ụmụaka dị. Nwa nke ọ bụla dị iche. N’ihi ya, ndị nne na nna kwesịrị ikpebi otú ha ga-esi zụọ nke ọ bụla n’ime ụmụ ha. N’Izrel nke oge a, otu nwanna na nwunye ya kwuru ihe nyeere ha aka ịzụ ụmụ abụọ ha mụtara, ha ana-efe Jehova. Ha kwuru, sị: “Anyị na-amụrụ ha Baịbụl iche iche.” Nke bụ́ eziokwu bụ na onyeisi ezinụlọ ọ bụla ga-ekpebi ma isi otú ahụ amụrụ ụmụ ha ihe ọ̀ dị mkpa ma ọ bụ kwe omume. w19.12 26-27 ¶18-20

Sọnde, Jun 27

Ihe niile unu chọrọ ka ndị mmadụ na-emere unu, unu onwe unu aghaghị imere ha otú ahụ.—Mat. 7:12.

Nsogbu bịara anyị, obi na-adị anyị ụtọ ma ndị ọzọ nyere anyị aka. Otu nwanna aha ya bụ Ryan papa ya nwụrụ n’ihe mberede sịrị: “Mmadụ ruwe uju, e nwere ọtụtụ ihe onye ahụ na-emebu mgbe niile ga-adịzi ya ka ọ gaghị emeli ha. Ihe ọ bụla e meere onye ahụ ga-abara ya ezigbo uru, ọ bụrụgodị obere ihe.” Echefukwala na obere ihe ọ bụla i mere iji nyere ndị mmadụ aka nwere ike ịgba ha ezigbo ume. Mak bụ Onye Kraịst na-arụsi ọrụ ike. N’agbanyeghị ya, o wepụtara oge ya mee ihe ndị gbara Pọl onyeozi ume, nke mere Pọl ji jiri obi ya niile kpọọ ya ka ọ bịa nyere ya aka. Otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Angela, onye e gburu nne nne ya, nwere obi ụtọ maka otú ụmụnna si kasie ya obi mgbe ahụ. Ọ sịrị: “Ọ bụrụ na ndị enyi gị ejiri obi ha chọọ inyere gị aka, ha na-adị njikere ige ntị. Ha anaghịkwa egbu oge inyere gị aka.” Anyị nwere ike ịjụ onwe anyị, sị: ‘Àma m ka onye na-adị njikere inyere ụmụnna m aka?’ w20.01 11-12 ¶14-16

Mọnde, Jun 28

Onye ọ bụla nke na-ata achịcha ahụ ma na-aṅụ iko nke Onyenwe anyị n’erughị eru ga-abụ onye ikpe mara.—1 Kọr. 11:27.

Olee otú onye e tere mmanụ nwere ike isi taa achịcha e ji eme Ncheta Ọnwụ Jizọs “n’erughị eru”? Ọ bụ ịta achịcha ahụ na ịṅụ mmanya ahụ ma na-enupụrụ iwu Jehova isi. (Hib. 6:4-6; 10:26-29) Ndị e tere mmanụ na-echeta na ha kwesịrị ịna-erubere Jehova isi ma ọ bụrụ na ha chọrọ ‘inweta ihe a na-agbata n’ọsọ, bụ́ òkù a kpọrọ ha ịga eluigwe, nke Chineke kpọrọ site n’aka Kraịst Jizọs.’ (Fil. 3:13-16) Mmụọ nsọ Jehova na-enyere ndị ohu ya aka ịdị umeala n’obi, ọ bụghị ịdị mpako. (Efe. 4:1-3; Kọl. 3:10, 12) N’ihi ya, ndị e tere mmanụ anaghị eche na ha ka ndị ọzọ mma. Ha ma na ịbụ ndị e tere mmanụ apụtaghị na Jehova na-enye ha mmụọ nsọ karịrị nke ọ na-enye ndị ohu ya ndị ọzọ. Ha anaghị eche na ha na-aghọta eziokwu Baịbụl karịa onye ọ bụla ọzọ. Ha agaghịkwa agwa onye ọzọ na Chineke eteela ya mmanụ nakwa na o kwesịrị ịtawa achịcha na ịṅụ mmanya e ji eme Ncheta Ọnwụ Jizọs. Kama ime otú ahụ, ha na-adị umeala n’obi, marakwa na ọ bụ naanị Jehova na-ahọrọ ndị ga-aga eluigwe. w20.01 27-28 ¶4-5

Tuzdee, Jun 29

Bịaruonụ Chineke nso, ọ ga-abịarukwa unu nso.—Jems 4:8.

Jehova chọrọ ka anyị na ya dịrị ná mma, chọọkwa ka anyị na-agwa ya okwu. Ọ gwara anyị ka anyị ‘nọgidesie ike n’ekpere.’ Ọ na-egekwa ntị n’ekpere anyị mgbe niile. (Rom 12:12) O nweghị mgbe ọ na-agaghị enwe ohere ma ọ bụ mgbe ike na-agaghị adị ya ige anyị ntị. Otú anyị si ege ya ntị bụ ịgụ Okwu ya bụ́ Baịbụl, ya na akwụkwọ ndị na-enyere anyị aka ịghọta ya. Otú ọzọ anyị si eme ya bụ ige ntị n’ọmụmụ ihe. Anyị na Jehova ga-adị ná mma ma anyị na ya na-ekwurịta okwu mgbe niile. Jehova chọrọ ka anyị na-agwa ya otú ọ dị anyị n’obi ma anyị kpewe ekpere. (Ọma 62:8) Anyị kwesịrị ịjụ onwe anyị, sị: ‘Ekpere m ọ̀ na-ada ka ihe e bu n’isi a na-agụ ka egwú, ka ọ̀ na-ada ka ihe si mmadụ n’obi?’ O doro anya na ị hụrụ Jehova n’anya, chọọkwa ka gị na ya dịrị n’ezigbo mma. Ihe ga-enyere gị aka bụ ịna-agwa ya okwu mgbe niile. Gwa ya ihe ị na-agaghị achọ ịgwa ndị ọzọ. Gwa ya ihe ndị na-eme gị obi ụtọ na ihe ndị na-echegbu gị. Obi sie gị ike na i nwere ike ịgakwuru ya ka o nyere gị aka. w20.02 9 ¶4-5

Wenezdee, Jun 30

Na-azụnụ ìgwè atụrụ Chineke nke unu na-elekọta.—1 Pita 5:2.

Jehova nyere ndị okenye ọrụ dị ezigbo mkpa, ya bụ, ịzụ ìgwè atụrụ ya. Ndị okenye nwere ike ịmụta ọtụtụ ihe ma ha mụọ gbasara otú Nehemaya si meso ndị Jehova. Ebe Nehemaya bụ gọvanọ na-achị Juda, o nwere ikike ime ọtụtụ ihe. (Nehe. 1:11; 2:7, 8; 5:14) Chegodị nsogbu ụfọdụ Nehemaya chọpụtara. Ọ matara na ndị Juu emerụọla ụlọ nsọ nakwa na ha anaghịzi enye ndị Livaị onyinye Iwu Mozis kwuru ka a na-enye ha. Ndị Juu anaghịzi edebe iwu Ụbọchị Izu Ike. Ụfọdụ n’ime ha lụkwara ụmụ nwaanyị mba ọzọ. Gọvanọ Nehemaya kwesịrị ime ihe gbasara nsogbu ndị ahụ. (Nehe. 13:4-30) Nehemaya ejighị ikike ya manyewe ha ime ihe ọ chọrọ ka ha mee. Kama, o kpesiri ekpere ike, rịọ Jehova ka o duzie ya. Ọ kụzikwaara ha Iwu Jehova. (Nehe. 1:4-10; 13:1-3) Nehemaya wetukwara onwe ya ala soro ha na-arụ ọrụ. O sodị ha rụzie mgbidi Jeruselem.—Nehe. 4:15. w19.09 16 ¶9-10

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya