Eprel
Satọdee, Eprel 1
Chineke hụrụ ụwa n’anya nke ukwuu nke na o nyere Ọkpara ọ mụrụ naanị ya.—Jọn 3:16.
Jizọs gosiri na ọ hụrụ anyị n’anya n’ihi na o kwetara ịnwụ n’ihi anyị. (Jọn 15:13) Anyị enweghị ike ịkwụghachili Jehova na Jizọs ụgwọ ịhụnanya ha gosiri anyị. Ma, anyị nwere ike isi n’ihe ndị anyị na-eme kwa ụbọchị gosi na obi dị anyị ụtọ maka ihe ndị ha meere anyị. (Kọl. 3:15) Ndị e tere mmanụ ji ihe mgbapụta ahụ kpọrọ ihe n’ihi na o mere ka ha nwee olileanya magburu onwe ya. (Mat. 20:28) N’ihi okwukwe ha nwere n’àjà Jizọs chụrụ, Jehova weere ha ka ndị ezi omume, werekwa ha ka ụmụ ya. (Rom 5:1; 8:15-17, 23) Obi dịkwa atụrụ ọzọ ahụ ụtọ maka ihe mgbapụta ahụ. N’ihi okwukwe ha nwere n’àjà Jizọs ji ọbara ya chụọ, ha nwere akọnuche dị ọcha n’ihu Chineke, nweekwa olileanya isi “n’oké mkpagbu ahụ pụta.” (Mkpu. 7:13-15) Otú ndị e tere mmanụ na atụrụ ọzọ ahụ si egosi na obi dị ha ụtọ maka ihe mgbapụta ahụ bụ ịga Ncheta Ọnwụ Jizọs kwa afọ. w22.01 23 ¶14-15
Ọgụgụ Baịbụl maka Ncheta Ọnwụ Jizọs: (Ihe ndị mere n’ehihie: Naịsan 10) Matiu 21:18, 19; 21:12, 13; Jọn 12:20-50
Sọnde, Eprel 2
Kraịst tọhapụrụ anyị.—Gal. 3:13.
Ihe wutere Jizọs bụ ebubo a ga-eji maka ya gbuo ya. E boro ya ebubo na ọ na-ekwulu Chineke, ya bụ, na o nweghị nsọpụrụ ọ bụla maka Chineke ma ọ bụ aha ya. (Mat. 26:64-66) Ihe a wutere Jizọs nke ukwuu nke na ọ chọrọ ka Nna ya mee ka ọ ghara ịnwụ ụdị ọnwụ ihere a. (Mat. 26:38, 39, 42) A kpọgidere Jizọs n’elu osisi ka e nwee ike ịnapụta ndị Juu n’otu ọnụ a bụrụ ha. (Gal. 3:10) Ha kwere Chineke nkwa idebe iwu ya, mana ha emeghị ya. Ihe a meziri ka Chineke bụọ ha ọnụ n’elu mmehie ha ketara n’aka Adam. (Rom 5:12) Iwu Chineke kwuru na ọ bụrụ na mmadụ emee mmehie kwesịrị ọnwụ, a ga-egbu ya. E mechaa, e nweziri ike ịkpọgide ya n’elu osisi. (Diut. 21:22, 23; 27:26) N’elu osisi a kpọgidere Jizọs mere ka o buru ọnụ ahụ a bụrụ ndị Juu ka e nwee ike ịnapụta ha n’ọnụ ahụ a bụrụ ha. Ihe ahụ meziri ka ọnwụ ya baara ha uru n’agbanyeghị ha na anabataghị ya. w21.04 16 ¶5-6
Ọgụgụ Baịbụl maka Ncheta Ọnwụ Jizọs: (Ihe ndị mere n’ehihie: Naịsan 11) Matiu 21:33-41; 22:15-22; 23:1-12; 24:1-3
Mọnde, Eprel 3
M na-atọgbọ mkpụrụ obi m.—Jọn 10:17.
Chegodị ihe mere Jizọs n’ụbọchị ikpeazụ o biri ndụ n’ụwa. Ndị agha Rom kụrụ ya isi aba okpu. (Mat. 26:52-54; Jọn 18:3; 19:1) Ha ji ụtarị merụọ ya ezigbo ahụ́. Ha mechakwara bo ya otu osisi dị ezigbo arọ n’azụ ya ahụ na-agba ọbara. Jizọs buuru osisi ahụ gawa ebe a ga-eji ya kpọgbuo ya. Ma o teghị aka, ndị agha ahụ amanye otu nwoke ka o buru osisi ahụ. (Mat. 27:32) Mgbe Jizọs rutere n’ebe a ga-egbu ya, ndị agha ahụ ji ntu kpọgide aka ya na ụkwụ ya n’osisi ahụ. Otú ahụ́ ya si nyịgide n’ebe ahụ a kpọgidere ya mere ka ntu ahụ merụkwuo ya ahụ́. Ndị enyi ya nọ na-eru uju, mama ya ana-ebe ákwá. Ma, ndị ndú ndị Juu nọ na-akwa ya emo. (Luk 23:32-38; Jọn 19:25) Jizọs tara ahụhụ ruo ọtụtụ awa. Otú ahụ o si nọrọ mere ka o siere ya ike iku ume. Jizọs ma na ya anọgidela na-erubere Chineke isi. O kpere ekpere ikpeazụ tupu ya ekubie ume. O hulataziri isi ya kubie ume. (Mak 15:37; Luk 23:46; Jọn 10:17, 18; 19:30) N’eziokwu, Jizọs ji nwayọọ nwayọọ tara ahụhụ nwụọ ọnwụ ihere. w21.04 16 ¶4
Ọgụgụ Baịbụl maka Ncheta Ọnwụ Jizọs: (Ihe ndị mere n’ehihie: Naịsan 12) Matiu 26:1-5, 14-16; Luk 22:1-6
ỤBỌCHỊ NCHETA ỌNWỤ JIZỌS
Mgbe Anyanwụ Dachara
Tuzdee, Eprel 4
Na-emenụ nke a iji na-echeta m.—Luk 22:19.
Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya iri na otu kwesịrị ntụkwasị obi gbasara ọgbụgba ndụ abụọ, ya bụ, ọgbụgba ndụ ọhụrụ na ọgbụgba ndụ Alaeze. (Luk 22:20, 28-30) Ọgbụgba ndụ abụọ a mere ka ndịozi ahụ na ụfọdụ ndị ọzọ nwee olileanya ịbụ ndị eze na ndị nchụàjà n’eluigwe. (Mkpu. 5:10; 14:1) Ọ bụ naanị ndị fọdụrụ ná ndị e tere mmanụ, ya bụ, ndị so n’ọgbụgba ndụ abụọ a, nwere ike ịta achịcha ma ṅụọ mmanya e ji echeta ọnwụ Jizọs. Jehova enyela ha olileanya pụrụ iche, ya bụ, inwe ahụ́ na-enweghị ike ịnwụ anwụ ma ọ bụ ire ure n’eluigwe, iso Jizọs na ndị ọzọ so n’otu narị puku na puku iri anọ na puku anọ ahụ chịa n’eluigwe, nakwa ịhụ Jehova ihu na ihu. (1 Kọr. 15:51-53; 1 Jọn 3:2) Ndị e tere mmanụ ma na ha kwesịrị iji obi ha niile fee Chineke ruo ọnwụ.—2 Tim. 4:7, 8. w22.01 21 ¶4-5
Ọgụgụ Baịbụl maka Ncheta Ọnwụ Jizọs: (Ihe ndị mere n’ehihie: Naịsan 13) Matiu 26:17-19; Luk 22:7-13 (Ihe ndị mere mgbe anyanwụ dachara: Naịsan 14) Matiu 26:20-56
Wenezdee, Eprel 5
Mụ na gị ga-anọ na Paradaịs.—Luk 23:43.
E nwere ndị omekome abụọ a kpọgidere ha na Jizọs n’elu osisi ịta ahụhụ. (Luk 23:40, 41) Otu n’ime ha sịrị Jizọs: “Cheta m mgbe ị banyere n’alaeze gị.” (Luk 23:42) Jizọs gwara onye omekome ahụ ihe ga-eme ka o nwee olileanya n’ihi na ọ ma na Nna ya bụ onye obi ebere. (Ọma 103:8; Hib. 1:3) Jehova dị njikere ịgbaghara anyị na imere anyị ebere ma ọ bụrụ na anyị egosi na ihe ọjọọ anyị mere wutere anyị ma gosi na anyị nwere okwukwe na ọ ga-agbaghara anyị mmehie anyị n’ihi àjà ahụ Jizọs Kraịst chụrụ. (1 Jọn 1:7) O nwere ụfọdụ ndị ọ na-esiri ike ikweta na Jehova ga-agbaghara ha. Ọ bụrụ na ọ na-adị gị otú ahụ mgbe ụfọdụ, chebaragodị ihe a echiche: Obere oge tupu Jizọs anwụọ, o meere onye omekome ahụ ka malitere inwe okwukwe n’ebe ọ nọ ebere. O doro anya na Jehova ga-emere ndị ohu ya ebere karịa.—Ọma 51:1; 1 Jọn 2:1, 2. w21.04 9 ¶5-6
Ọgụgụ Baịbụl maka Ncheta Ọnwụ Jizọs: (Ihe ndị mere n’ehihie: Naịsan 14) Matiu 27:1, 2, 27-37
Tọzdee, Eprel 6
Jizọs sịrị: E mechawo ya.—Jọn 19:30.
Isi Jizọs rubeere Nna ya ruo ọnwụ mere ka o mezuo ọtụtụ ihe. Nke mbụ, o gosiri na Ekwensu bụ onye ụgha. O gosiri na mmadụ zuru okè nwere ike ikwesị ntụkwasị obi n’agbanyeghị ihe ọ bụla Ekwensu mere ya. Nke abụọ, Jizọs ji ndụ ya chụọ àjà iji gbapụta ụmụ mmadụ. Ndụ ya o ji chụọ àjà mere ka ụmụ mmadụ na-ezughị okè na Chineke dịrị ná mma, meekwa ka ha nwee olileanya ịdị ndụ ebighị ebi. Nke atọ, Jizọs mekwara ka a mata na ọ bụ Nna ya kwesịrị ịchị, meekwa ka a ghara ịna-ata Nna ya ụta. Ka anyị were ya na ụbọchị niile bụ ụbọchị ikpeazụ anyị nwere irubere Jehova isi. Anyị mee otú ahụ, anyị nọrọgodị n’ọnụ ọnwụ, anyị ga-enwe ike ịsị: “Jehova, emeela m ike m niile irubere gị isi, ime ka Setan bụrụ onye ụgha, na ime ka e doo aha gị nsọ ma gosi na ọ bụ naanị gị ruru eru ịchị eluigwe na ụwa.” w21.04 12 ¶13-14
Ọgụgụ Baịbụl maka Ncheta Ọnwụ Jizọs: (Ihe ndị mere n’ehihie: Naịsan 15) Matiu 27:62-66 (Ihe ndị mere mgbe anyanwụ dachara: Naịsan 16) Matiu 28:2-4
Fraịdee, Eprel 7
Onye a bụ Ọkpara m, onye m hụrụ n’anya, onye ihe ya masịrị m; geenụ ya ntị.—Mat. 17:5.
Mgbe e bochara Jizọs ebubo ma ma ya ikpe ọnwụ maka ihe ọ na-emeghị, kwaa ya emo, pịa ya ihe, a kpọgideziri ya n’osisi ịta ahụhụ, kụọ ya ntu n’ụkwụ na n’aka. Ahụ́ na-afụ ya ụfụ ma ọ chọọ iku ume ma ọ bụ chọọ ikwu okwu. Ma, ọ ga-ekwurịrị okwu n’ihi na e nwere ihe dị mkpa ọ chọrọ ikwu. Anyị nwere ike ịmụta ọtụtụ ihe dị mkpa n’ihe ndị ikpeazụ Jizọs kwuru. E chetaara anyị na anyị kwesịrị ịgbaghara ndị ọzọ ma tụkwasị Jehova obi na ọ ga-agbaghara anyịnwa. Anyị nwere ụmụnna ndị nwoke na ndị nwaanyị ndị dị njikere inyere anyị aka. Ọ bụrụ na anyị achọọ enyemaka, anyị kwesịrị ịgwa ha ka ha nyere anyị aka. Anyị ma na Jehova ga-enyere anyị aka idi nsogbu ọ bụla nwere ike ịbịara anyị. Anyị mụtakwara na ọ dị mkpa ka anyị were ụbọchị ọ bụla ka ụbọchị ikpeazụ anyị nwere irubere Jehova isi, obi esiekwa anyị ike na ọ ga-akpọlite anyị ma anyị nwụọ. w21.04 8 ¶1; 13 ¶17-18
Ọgụgụ Baịbụl maka Ncheta Ọnwụ Jizọs: (Ihe ndị mere n’ehihie: Naịsan 16) Matiu 28:1, 5-15
Satọdee, Eprel 8
Iji nweta ndụ ebighị ebi, ọ dị ha mkpa ịmata gị nke ọma, onye naanị ya bụ ezi Chineke, matakwa onye i zitere, bụ́ Jizọs Kraịst.—Jọn 17:3.
Iso nzọụkwụ Jizọs na-eme ka mmadụ nweta ndụ ebighị ebi. Mgbe otu nwa okorobịa jụrụ ihe ọ ga-eme ka o nweta ndụ ebighị ebi, Jizọs sịrị ya: ‘Bịa bụrụ onye na-eso ụzọ m.’ (Mat. 19:16-21) Jizọs gwara ụfọdụ ndị Juu na-ekweghị na ọ bụ Kraịst, sị: “Atụrụ m . . . na-esokwa m. M na-enyekwa ha ndụ ebighị ebi.” (Jọn 10:24-29) Anyị na-egosi na anyị nwere okwukwe na Jizọs ma anyị na-eme ihe ndị ọ kụziri na ihe ndị o mere. Ọ bụrụkwa na anyị ana-eme otú ahụ, anyị nwere ike inweta ndụ ebighị ebi. (Mat. 7:14) Tupu anyị enwee ike isochi nzọụkwụ Jizọs anya, anyị kwesịrị ịmata ya. “Ịmata” Jizọs abụghị ihe a na-eme naanị otu ugboro. Anyị kwesịrị ịna-amatakwu onye ọ bụ, ịna-amụ gbasara àgwà ya, otú o si eche echiche, na ihe ndị ọ kpọrọ ihe ọma na ihe ọjọọ. N’agbanyeghị afọ ole anyị ferela Jehova, anyị kwesịrị ịna-agbasi mbọ ike ịna-amatakwu Jehova na Ọkpara ya bụ́ Jizọs. w21.04 4 ¶9-10
Sọnde, Eprel 9
N’oge gara aga, abụ m onye nkwulu na onye mkpagbu.—1 Tim. 1:13.
Ọ ga-abụrịrị na o nwere mgbe ihe ndị Pọl onyeozi mere n’oge gara aga nyere ya nsogbu n’obi. Ọ dịghị ịtụnanya na Pọl kpọrọ onwe ya “onye mbụ” ná ndị mmehie. (1 Tim. 1:15) Tupu Pọl aghọọ onye na-efe Chineke, o ji ike ya niile si n’otu obodo gaa n’obodo ọzọ na-achụgharị Ndị Kraịst, na-atụ ụfọdụ mkpọrọ, na-akwadokwa ka e gbuo ndị ọzọ. (Ọrụ 26:10, 11) Olee otú i chere ọ ga-adị Pọl ma ọ hụ Onye Kraịst na-eto eto ọ kwadoro ka e gbuo nne na nna ya? Pọl mechara kwaa mmakwaara maka ihe ndị o mere. Mana, ọ ma na ya agaghị agbanweli ihe ndị o mere. Ọ bụ ya mere o ji jiri obi ike kwuo, sị: “Site n’obiọma Chineke nke na-erughịrị mmadụ, abụ m ihe m bụ.” (1 Kọr. 15:3, 10) Olee ihe anyị na-amụta? Kweta na Kraịst nwụrụ n’ihi gị ma mee ka i nwee ohere magburu onwe ya gị na Jehova ịdị n’ezigbo mma. (Ọrụ 3:19) Ihe kacha Chineke mkpa bụ ihe anyị na-eme ugbu a na ihe anyị ga-eme n’ọdịnihu, ọ bụghị ihe anyị mejọrọ n’oge gara aga.—Aịza. 1:18. w21.04 23 ¶11
Mọnde, Eprel 10
Nwaleenụ okwu si n’aka mmụọ, ka unu wee chọpụta ma ò si n’aka Chineke, n’ihi na ọtụtụ ndị amụma ụgha abanyewo n’ime ụwa.—1 Jọn 4:1.
N’agbanyeghị na ọtụtụ ndị Juu n’oge Jizọs atụghị anya na Mesaya ahụ ga-anwụ, lee ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru banyere ya. Ọ sịrị: “Ọ wụpụụrụ ọnwụ mkpụrụ obi ya, a gụnyekwara ya ná ndị na-emebi iwu; ya onwe ya buuru mmehie ọtụtụ ndị, ọ gbachiteere ndị na-emebi iwu.” (Aịza. 53:12) N’ihi ya, e nweghị ihe ọ bụla kwesịrị ime ka ndị Juu ahụ sụọ ngọngọ mgbe ha hụrụ na e gburu Jizọs ka onye mmehie. Ihe ga-enyere anyị aka ka anyị ghara ịsụ ngọngọ bụ ịmata ihe bụ́ eziokwu banyere ihe merenụ. Mgbe Jizọs na-ezi ihe n’elu ugwu, ọ dọrọ ndị na-ege ya ntị aka ná ntị na a ga-enwe ndị ‘ga-aghagide ha ụgha, na-ekwukwa ụdị ihe ọjọọ niile megide ha.’ (Mat. 5:11) Ọ bụ Setan ka ụgha ndị a si n’aka. Ọ na-eme ka ndị iro anyị na-agbasa ihe na-abụghị eziokwu banyere anyị. (Mkpu. 12:9, 10) Anyị kwesịrị ịjụ ụgha ndị a ndị iro anyị na-agha. Anyị ekwesịghị ikwe ka ụgha ndị ahụ mee ka okwukwe anyị ghara isi ike. w21.05 11 ¶14; 12 ¶16
Tuzdee, Eprel 11
Unu atụla egwu. Unu bara uru karịa ọtụtụ nza.—Mat. 10:31.
Nyere onye ị na-amụrụ Baịbụl aka ịtụkwasị Jehova obi. Jizọs mere ka obi sie ndị na-eso ụzọ ya ike n’ihi na ọ hụrụ ha n’anya. (Mat. 10:19, 20, 29, 30) Mee ka onye ị na-amụrụ ihe mata na Jehova ga-enyekwara ya aka. I nwere ike inyere ya aka ka ọ tụkwasị Jehova obi ma ị na-akpọtụ ihe ndị ọ chọrọ ime aha ma gị na ya na-ekpe ekpere. Otu nwanna aha ya bụ Franciszek bi na Poland sịrị: “Onye na-amụrụ m Baịbụl na-etinyekarị ihe ndị m chọrọ ime n’ekpere ya. Mgbe m hụrụ otú Jehova si za ekpere onye na-amụrụ m Baịbụl, m bidoro ikpe ekpere ozugbo. Ahụrụ m otú Jehova si za m ekpere m mgbe m chọrọ ka e nye m ohere n’ebe m nwetara ọrụ ọhụrụ iji na-aga ọmụmụ ihe nakwa iji gaa mgbakọ.” Jehova hụrụ ndị anyị na-amụrụ ihe n’anya nke ukwuu. O ji mbọ Ndị Kraịst na-agba ịkụziri ndị ọzọ gbasara ya kpọrọ ihe, hụkwa ha n’anya maka ya. (Aịza. 52:7) Ọ bụrụ na e nweghị onye ị na-amụrụ Baịbụl ugbu a, i nwekwara ike inyere ndị a na-amụrụ ihe aka ime nke ọma ma mee baptizim ma i soro ndị ọzọ na-aga amụrụ ha ihe. w21.06 7 ¶17-18
Wenezdee, Eprel 12
Iwu Jehova na-atọ ya ụtọ, ọ na-agụkwa iwu ya ma na-atụgharị uche na ya ehihie na abalị.—Ọma 1:2.
Anyị na-egosi na obi dị anyị ụtọ maka Okwu Chineke ma anyị na-agụchi ya anya. Anyị kwesịrị ịhazi oge anyị ga-eji na-agụ Baịbụl, ọ bụghị ịgụ ya mgbe ohere dapụtara. Ọ bụrụ na anyị agbalịa na-agụchi Baịbụl anya, ọ ga-eme ka okwukwe anyị sie ike. Anyị adịghị ka “ndị ma ihe na ndị ọkachamara” nọ n’ụwa a. Ihe mere anyị ji nwee okwukwe bụ ihe àmà ndị e dere n’Okwu Chineke. (Mat. 11:25, 26) Baịbụl kọwaara anyị ihe mere ụwa ji jọọ njọ otú a nakwa ihe Jehova ga-eme maka ya. N’ihi ya, ka anyị kpebisie ike ịna-eme ka okwukwe anyị sie ike nakwa inyere ọtụtụ ndị aka inwe okwukwe n’Onye kere ihe niile. (1 Tim. 2:3, 4) Ka anyị nọgidekwa na-atụ anya oge mmadụ niile nọ n’ụwa ga na-eto Jehova ma na-ekwu ihe e dere ná Mkpughe 4:11. Ọ sịrị: “Jehova Chineke anyị, . . . i ruru eru ka ndị niile too gị . . . n’ihi na ọ bụ gị kere ihe niile.” w21.08 19 ¶18-20
Tọzdee, Eprel 13
Na-ahụnụ ibe unu n’anya ka ụmụnne, na-enwekwaranụ ibe unu ọmịiko.—Rom 12:10.
Ebe ọ bụ na ndị okenye na-elekọta ìgwè atụrụ Chineke, ọ bụ ọrụ ha ịna-enye ndụmọdụ mgbe ọ dị mkpa. Ha kwesịrị ịna-enye ndụmọdụ ga-abara ndị ha nyere ya uru, meekwa ‘ka obi dị ha ụtọ.’ (Ilu 27:9) Ndị okenye hụrụ ụmụnna ha n’anya. Otú ha si egosi ya mgbe ụfọdụ bụ inye nwanna ndụmọdụ ma ha hụ na ọ chọrọ ime ihe na-adịghị mma. (Gal. 6:1) Tupu okenye enye mmadụ ndụmọdụ, ọ ga-adị mkpa ka o buru ụzọ chebara ihe ụfọdụ Pọl onyeozi kwuru banyere ịhụnanya echiche. Pọl kwuru, sị: “Ịhụnanya na-enwe ndidi, dịrịkwa obiọma. . . . Ọ na-edi ihe niile, na-ekwere ihe niile, na-enwe olileanya ihe niile, na-atachi obi n’ihe niile.” (1 Kọr. 13:4, 7) Ọ bụrụ na okenye echebara ihe amaokwu ndị a kwuru echiche, ọ ga-enyere ya aka ijide n’aka na ihe mere o ji na-enye nwanna ya ndụmọdụ bụ n’ihi na ọ hụrụ ya n’anya. Ọ bụrụ na onye e nyere ndụmọdụ achọpụta na okenye ahụ hụrụ ya n’anya, ọ ga-aka enyere ya aka ime ihe a gwara ya. w22.02 14 ¶3; 15 ¶5
Fraịdee, Eprel 14
Ha nupụụrụ ya isi, meekwa ihe wutere mmụọ nsọ ya.—Aịza. 63:10.
Jehova kere ma ndị mmụọ ozi ma ụmụ mmadụ ha ezuo okè, n’enweghịkwa ntụpọ ọ bụla. Ma, otu n’ime ndị mmụọ ozi bụ́ Setan (nke pụtara “onye mmegide”) nupụụrụ ya isi, meekwa ka Adam na Iv bụ́ ndị zuru okè nupụrụ ya isi. Ụfọdụ ndị mmụọ ozi na ụmụ mmadụ ndị ọzọ nupụkwaara ya isi. Ihe a wutere Jehova nke ukwuu. Ma, o diri ihe ndị ahụ. Ọ ga-anọgidekwa na-enwe ndidi ruo mgbe ọ ga-ebibi ndị ahụ na-enupụrụ ya isi. Nke ahụ ga-eme ka ọtụtụ ndị na-erubere ya isi nọ na-edi ihe ọjọọ niile a na-eme n’ụwa ọjọọ Ekwensu a nwee obi ụtọ. Setan boro Job na ndị ọzọ na-efe Jehova ebubo na ihe mere ha ji na-efe ya bụ ihe ọma ndị ọ na-emere ha. (Job 1:8-11; 2:3-5) Ekwensu ka nọkwa na-ebo ndị na-efe Chineke ebubo ahụ ruo taa. (Mkpu. 12:10) Ma, anyị ga-egosi na ebubo ahụ Ekwensu na-ebo anyị abụghị eziokwu ma ọ bụrụ na anyị atachie obi ná nsogbu ndị na-abịara anyị, nakwa ma ọ bụrụ na anyị ana-erubere Jehova isi n’ihi na anyị hụrụ ya n’anya. w21.07 9 ¶7-8
Satọdee, Eprel 15
Kwụsịnụ omume ọjọọ unu nọ n’ihu m eme. Kwụsịnụ ime ihe ọjọọ.—Aịza. 1:16.
Pọl onyeozi ji ihe atụ kụziere anyị na ọ dị ezigbo mkpa ka anyị gbanwee otú anyị si ebi ndụ. O kwuru na anyị kwesịrị ịkpọgide àgwà ochie anyị “n’osisi.” (Rom 6:6) Jizọs kwere ka a kpọgide ya n’elu osisi iji mee ihe dị Jehova mma. Ọ bụrụkwa na anyị chọrọ ime ihe dị Jehova mma, anyị kwesịrị ịkwụsị ime ihe ọ bụla Jehova kpọrọ asị. Ọ bụ naanị mgbe anyị mere ihe ndị a ka anyị ga-enwe ezigbo akọnuche, nweekwa olileanya ịdị ndụ ebighị ebi. (Jọn 17:3; 1 Pita 3:21) Jehova agaghị agbanwe iwu ya iji mee anyị obi ụtọ. Kama, ọ bụ anyịnwa kwesịrị ịgbanwe ụdị mmadụ anyị bụ iji rubere ya isi. (Aịza. 1:17, 18; 55:9) I mechagodị baptizim, ị ka ga-anọgidekwa na-agba mbọ ka ihe ọjọọ ghara ịna-agụ gị agụụ. Rịọ Jehova ka o nyere gị aka. Atụkwasịla onwe gị obi, kama tụkwasị mmụọ nsọ ya obi. (Gal. 5:22; Fil. 4:6) Anyị ga-agbasi mbọ ike ma ọ bụrụ na anyị chọrọ iyipụ àgwà ochie anyị kpamkpam. w22.03 6 ¶15-17
Sọnde, Eprel 16
[Jehova] ga-enyere gị aka.—Ọma 55:22.
Jehova kwere nkwa inye anyị nri, uwe, na ebe obibi ma ọ bụrụ na anyị eburu ụzọ na-achọ Alaeze ya ma na-eme ezi omume. (Mat. 6:33) Ọ bụrụ na anyị eburu nke a n’uche, anyị agaghị na-eche na ego na akụnụba ga-echebe anyị ma mee ka anyị na-enwe obi ụtọ. Anyị ma na naanị ihe ga-eme ka obi ruo anyị ala bụ ime uche Jehova. (Fil. 4:6, 7) Ọ bụrụgodị na anyị nwere ego anyị ga-eji azụ ọtụtụ ihe, anyị kwesịrị iche echiche nke ọma mara ma ànyị nwere ike ma ọ bụ oge anyị ga-eji na-elekọta ihe ndị ahụ. Ihe ka anyị mkpa ọ̀ bụ akụnụba anyị nwere? Cheta na Jehova nyere anyị ọrụ anyị ga na-arụ n’ezinụlọ ya. Ihe ọ pụtara bụ na anyị ekwesịghị ikwe ka ihe ọ bụla megharịa anyị anya. Anyị achọghị ịdị ka nwoke ahụ kwere ka ohere ọma o nwere ijere Jehova ozi nakwa ịbụ onye Chineke weere ka nwa ya kwaa ya n’ihi na ihe ka ya mkpa bụ akụnụba.—Mak 10:17-22. w21.08 6 ¶17
Mọnde, Eprel 17
Jikerekwanụ . . . ịza mmadụ ajụjụ.—1 Pita 3:15.
Ka ị na-amụ Baịbụl, ị ga-amata ụdị onye Jehova bụ nakwa àgwà ndị o nwere. Àgwà ndị a bụ àgwà ndị ahụ ị mụtara mgbe ị na-amụ gbasara ihe ndị e kere eke. Àgwà ndị a ga-eme ka ị mata n’eziokwu na Jehova dị. (Ọpụ. 34:6, 7; Ọma 145:8, 9) Ka ị na-amụtakwu banyere Jehova nke ọma, okwukwe gị ga na-esikwu ike, gị ana-ahụkwu ya n’anya, gị na ya ana-adịkwukwa ná mma. Na-agwa ndị ọzọ ihe ị mụtara banyere Chineke. Ma, gịnị ka ị ga-eme ma ọ bụrụ na onye ị na-ezi ozi ọma ekwuo na o cheghị na Chineke dị, ya abụrụkwa na ị maghị ihe ị ga-aza ya? Gbalịa jiri akwụkwọ anyị chọpụta ihe Baịbụl zara gbasara ajụjụ ahụ. Gị na onye ahụ kwurịta ya. I nwekwara ike ịgwa nwanna ọzọ ka o nyere gị aka. Ma onye ahụ ò kwetara ihe Baịbụl kwuru ma ọ bụ na o kwetaghị, nchọnchọ ndị ahụ i mere ga-abara gị uru, okwukwe gị ga-esikwukwa ike. w21.08 18 ¶14-15
Tuzdee, Eprel 18
Ahapụghị m ịgwa unu ihe niile ga-abara unu uru.—Ọrụ 20:20.
Ọ dịghị mkpa ka anyị hapụ ihe niile na-amasị anyị iji mee Jehova obi ụtọ. (Ekli. 5:19, 20) Ma, ọ bụrụ na anyị ahapụ ijekwuru Jehova ozi n’ihi na anyị achọghị ịhapụ ihe ụfọdụ na-amasị anyị, anyị nwere ike ime ka nwa okorobịa ahụ Jizọs ji mee ihe atụ, bụ́ onye gbasiri mbọ ike ka o nweta ọtụtụ ihe kama ibute ihe gbasara ofufe Jehova ụzọ. (Luk 12:16-21) Ọ bụrụ na nsogbu abịara anyị, anyị na-ekpe ekpere ka Chineke nyere anyị aka, cheekwa echiche nke ọma gbasara ihe anyị chọrọ ime. (Ilu 3:21) Jehova na-esi n’ọtụtụ ụzọ agọzi anyị. Anyị ga-egosi na obi dị anyị ezigbo ụtọ maka ya ma ọ bụrụ na anyị emee ike anyị niile iji too ya. (Hib. 13:15) Anyị nwere ike ime ọtụtụ ihe n’ozi Jehova. Ọ ga-emekwa ka Jehova gọzikwuo anyị. Kwa ụbọchị, ka anyị na-achọ ụzọ ndị anyị ga-esi ‘detụ Jehova ire ma hụ na ọ dị mma.’ (Ọma 34:8) Anyị mee otú ahụ, anyị ga-adị ka Jizọs bụ́ onye sịrị: “Ihe oriri m bụ ka m mee uche onye zitere m, ka m rụchaakwa ọrụ ya.”—Jọn 4:34. w21.08 30-31 ¶16-19
Wenezdee, Eprel 19
Nganga na-ala mmadụ n’iyi, mpako na-emekwa ka mmadụ daa.—Ilu 16:18.
Setan chọrọ ka anyị dịrị mpako. Ọ ma na ọ bụrụ na anyị adịrị mpako, anyị ga-adị ka ya. Anyị agakwaghị adị ndụ ebighị ebi. Ọ bụ ya mere Pọl onyeozi ji dọọ aka ná ntị na mmadụ nwere ike “ịdị mpako, a maa ya otu ikpe ahụ a mara Ekwensu.” (1 Tim. 3:6, 7) Ihe a nwere ike ime onye ọ bụla n’ime anyị, ma ànyị ka batara n’ọgbakọ ọhụrụ ma ọ bụkwanụ na anyị anọọla ọtụtụ afọ n’ọgbakọ. Ndị dị mpako na-achọkarị ihe ga-abara naanị onwe ha uru. Setan chọrọ ka onwe anyị dịrị anyị mkpa karịa Jehova, karịchaa, mgbe anyị nọ ná nsogbu. Dị ka ihe atụ, è botụla gị ebubo ụgha ma ọ bụkwanụ mejọọ gị? Obi ga-atọgbu Setan atọgbu ịhụ ka ị na-ata Jehova ma ọ bụ ụmụnna gị ụta. Ọ chọkwara ka i chee na naanị ihe ga-eme ka obi dị gị mma bụ ime ihe otú ị chọrọ kama iso ntụziaka Jehova nyere anyị n’Okwu ya.—Ekli. 7:16, 20. w21.06 15 ¶4-5
Tọzdee, Eprel 20
Jehova kwukwara, sị, “Dịkwanụ ike, unu niile ndị bi n’ala a, rụọkwanụ ọrụ. N’ihi na m nọnyeere unu.” Ọ bụ ihe Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru.—Hag. 2:4.
Jehova nyere Hagaị onye amụma ọrụ dị ezigbo mkpa. O nwere ike ịbụ na Hagaị so ná ndị si Babịlọn lọta Jeruselem n’afọ 537 Tupu Oge Ndị Kraịst. Obere oge ha ruru Jeruselem, ha malitere ịrụ ụlọ nsọ Jehova. (Ezra 3:8, 10) Ma o teghị aka, otu ihe na-adịchaghị mma emee. Ha dara mbà ma kwụsị ịrụ ụlọ nsọ ahụ n’ihi mmegide. (Ezra 4:4; Hag. 1:1, 2) N’ihi ya, n’afọ 520 Tupu Oge Ndị Kraịst, Jehova gwara Hagaị ka ọ gaa gbaa ndị Izrel ume ka ha nwee ike iji ịnụ ọkụ n’obi rụchaa ụlọ nsọ ahụ. (Ezra 6:14, 15) Jehova chọrọ ka ozi ahụ o ziri Hagaị mee ka ndị Juu nwee okwukwe na ya. Ọ ga-abụrịrị na okwu ahụ bụ́ “Jehova nke ụsụụ ndị agha” mere ka obi sie ha ike. Jehova nwere ọtụtụ ndị agha, bụ́ ndị mmụọ ozi, nọ n’okpuru ya. N’ihi ya, ihe ga-agaziri ndị Juu ma ha tụkwasị ya obi. w21.09 15 ¶4-5
Fraịdee, Eprel 21
Ọ bụrụ na unu hụrụ ibe unu n’anya, mmadụ niile ga-eji ya mata na unu bụ ndị na-eso ụzọ m.—Jọn 13:35.
Taa, Ndịàmà Jehova n’ụwa niile hụrụ ibe ha n’anya, dịrịkwa n’otu. Anyị dị iche ná ndị okpukpe ndị ọzọ n’ihi na anyị dị ka ndị si n’otu ezinụlọ n’agbanyeghị na anyị si ná mba dị iche iche, agbụrụ dị iche iche, nweekwa omenala dị iche iche. Anyị na-ahụ otú anyị si hụ ibe anyị n’anya n’ọmụmụ ihe anyị nakwa ná mgbakọ dị iche iche. Ihe a gosiri n’eziokwu na ọ bụ naanị anyị na-efe Jehova otú ọ chọrọ. (Jọn 13:34) Baịbụl gwara anyị ka anyị ‘jiri obi anyị niile hụ ibe anyị n’anya.’ (1 Pita 4:8) Otu ụzọ anyị si egosi ibe anyị na anyị hụrụ ha n’anya bụ ịgbaghara ha na idiri ha ihe ndị ha mere anyị n’ihi ezughị okè. Anyị na-achọ ụzọ anyị ga-esi na-emesapụrụ ndị anyị na ha nọ n’ọgbakọ aka, ma ndị nke mejọrọ anyị. (Kọl. 3:12-14) Ọ bụ ụdị ịhụnanya a ka e ji amata ezigbo Ndị Kraịst. w21.10 22 ¶13-14
Satọdee, Eprel 22
Onye hụrụ nwa ya n’anya na-adọsi ya aka ná ntị ike.—Ilu 13:24.
Ịchụ mmadụ n’ọgbakọ ò nwere ike inyere onye ahụ na-ekweghị echegharị aka ịgbanwe? Ee, o nwere ike. Ụfọdụ ndị mere mmehie dị oké njọ achọpụtala na otú ahụ ndị okenye si kata obi chụọ ha n’ọgbakọ mere ka ha ghọta onwe ha, meekwa ka ha gbanwee ma lọghachikwute Jehova. (Hib. 12:5, 6) Legodị ihe atụ a. Otu onye na-azụ atụrụ chọpụtara na ahụ́ adịghị otu atụrụ ya. Ọ ma na ọ bụrụ na ọ chọrọ ịgwọ atụrụ ahụ, o kwesịrị ịkpọpụ ya n’ebe atụrụ ndị nke ọzọ nọ. Ma, atụrụ na-achọkarị ịna-anọ ibe ha nso, o nwekwara ike obi agaghị adị ha mma ma a kpọpụ ha iche. Ọ̀ pụtara na obi tara onye ọzụzụ atụrụ ahụ mmiri maka na ọ kpọpụrụ atụrụ ahụ iche? Mba. Ọ ma na ọ hapụ atụrụ ahụ na-arịa ọrịa ka ya ndị nke ọzọ ahụ́ dị nọrọ, o nwere ike ime ka ọrịa ahụ fere ha. Mana, ọ bụrụ na ọ kpọpụ atụrụ ahụ iche, ọ ga-eme ka ọrịa ahụ ghara ife atụrụ ndị nke ọzọ. w21.10 10 ¶9-10
Sọnde, Eprel 23
Meenụ ka ìhè unu na-enwu n’ebe ndị mmadụ nọ, ka ha hụ ọrụ ọma unu wee nye Nna unu nọ n’eluigwe otuto.—Mat. 5:16.
Obi dị anyị ezigbo ụtọ na anyị so n’ezinụlọ Jehova zuru ụwa ọnụ. Anyị chọkwara ka ọtụtụ ndị soro anyị na-efe Jehova. N’ihi ya, anyị kwesịrị ịkpachara anya ka anyị ghara ime ihe ọ bụla ga-ewetara Jehova ma ọ bụ ndị ya aha ọjọọ. Anyị kwesịrị ịgba mbọ na-akpa àgwà otú ga-eme ka ndị mmadụ chọọ ịmụta gbasara Jehova ma fewe ya. Mgbe ụfọdụ, ụfọdụ ndị nwere ike ịkwa anyị emo ma ọ bụdị na-akpagbu anyị n’ihi na anyị na-erubere Nna anyị nke eluigwe isi. Gịnị ka anyị nwere ike ime ma ọ bụrụ na ụjọ ana-atụ anyị ịgwa ndị ọzọ ihe anyị kweere? Obi ga-esi anyị ike na Jehova na Ọkpara ya ga-enyere anyị aka. Jizọs mesiri ndị na-eso ụzọ ya obi ike na ha ekwesịghị ichegbu onwe ha gbasara ihe ha ga-ekwu ma ọ bụ otú ha ga-esi ekwu ya. N’ihi gịnị? Jizọs kwuru, sị: “A ga-agwa unu ihe unu ga-ekwu n’oge ahụ. N’ihi na ọ bụghị ununwa na-ekwu okwu, kama ọ bụ mmụọ nke Nna unu si n’ọnụ unu na-ekwu okwu.”—Mat. 10:19, 20. w21.09 24 ¶17-18
Mọnde, Eprel 24
M ga-asị Jehova: “Ị bụ ebe mgbaba m na ebe m a rụsiri ike.”—Ọma 91:2.
Mosis kwukwara na Jehova bụ ebe mgbaba ya. (Ọma 90:1) Obere oge tupu Mosis anwụọ, o kwukwara ihe ọzọ na-akasi obi. Ọ sịrị: “Chineke bụ ebe mgbaba kemgbe oge ochie. O ji ogwe aka ya na-adịru mgbe ebighị ebi na-akwado gị.” (Diut. 33:27) Gịnị ka okwu ahụ bụ́ “o ji ogwe aka ya na-adịru mgbe ebighị ebi na-akwado gị” na-akọwara anyị gbasara Jehova? Anyị jiri Jehova mere ebe mgbaba anyị, obi na-eru anyị ala. Ma, e nwere oge ndị anyị nwere ike ịda mbà. N’oge ndị ahụ, gịnị ka Jehova ga-emere anyị? (Ọma 136:23) Ọ ga-eji aka ya kuru anyị ma nyere anyị aka ibili. (Ọma 28:9; 94:18) Ịma na anyị nwere ike ịtụkwasị Jehova obi mgbe niile ga-enyere anyị aka ịma ihe ọma abụọ Jehova meere anyị. Nke mbụ, anyị nwere ebe mgbaba siri ezigbo ike n’agbanyeghị ebe anyị bi. Nke abụọ, Nna anyị nke eluigwe hụrụ anyị n’anya ma na-elekọta anyị. w21.11 6 ¶15-16
Tuzdee, Eprel 25
Unu ataala ahụhụ obere oge ugbu a n’ihi ọnwụnwa dị iche iche bịaara unu.—1 Pita 1:6.
Jizọs ma na ikpe na-ezighị ezi juru n’ụwa ga-eme ka a mata ma ndị na-eso ụzọ ya hà nwere okwukwe. Iji nyere ha aka, o meere ha ihe atụ e dere n’akwụkwọ Luk. Jizọs kọọrọ ha gbasara otu nwaanyị di ya nwụrụ na-arịọ otu ọkàikpe na-anaghị atụ egwu Chineke ka o kpeere ya ikpe ziri ezi. Obi siri ya ike na mgbalị ya agaghị efu ọhịa. Mgbe e mechara, ọkàikpe ahụ gere ya ntị. Gịnị ka anyị na-amụta? Jehova anaghị ekpe ikpe na-ezighị ezi. Ọ bụ ya mere Jizọs ji sị: “Ebe ọ bụ na Chineke na-enwere ndị ọ họọrọ ndidi, bụ́ ndị na-etiku ya ehihie na abalị, ọ̀ bụ na ọ gaghị eme ka e kpeere ha ikpe ziri ezi?” (Luk 18:1-8) Jizọs kwukwara sị: “Mgbe Nwa nke mmadụ ga-abịarute, ọ̀ ga-ahụ ndị nwere okwukwe n’ụwa?” Ọ bụrụ na a na-ekpe anyị ikpe na-ezighị ezi, anyị kwesịrị ịna-enwe ndidi ma na-arịọsi Jehova arịrịọ ike iji gosi na anyị nwere okwukwe siri ike ka nwaanyị ahụ di ya nwụrụ. Okwukwe dị otú ahụ ga-eme ka obi sie anyị ike na Jehova ga-enyere anyị aka. Obi kwesịkwara isi anyị ike na ekpere na-akpa ike. w21.11 23 ¶12; 24 ¶14
Wenezdee, Eprel 26
Olee otú nwa okorobịa ga-esi na-ebi ndụ dị mma? Ọ bụ ịkpachara anya na-eme ihe i kwuru.—Ọma 119:9.
Ndị na-eto eto, è nwere mgbe ụfọdụ unu na-eche na iwu Jehova anaghị ekwe unu megharịa ahụ́? Ọ bụ ihe Ekwensu chọrọ ka unu chee. Ọ chọrọ ka unu lekwasị anya n’ihe ndị na-aga ije n’ụzọ ahụ dị obosara na-eme, nakwa otú o si yie ka hà na-ekpori ndụ. Ọ chọrọ ka unu na-eche na unu anaghị ekpori ndụ otú ụmụ akwụkwọ ibe unu ma ọ bụ ndị unu na-ahụ n’Ịntanet si ekpori ndụ. Ekwensu chọrọ ka unu chee na ihe ndị Jehova gwara unu mee anaghị ekwe ka unu kporie ndụ otú unu kwesịrị. Ma, chetanụ na Setan achọghị ka ndị na-aga ije n’ụzọ ahụ dị obosara mara ihe ga-eme ha n’ikpeazụ. (Mat. 7:13, 14) Ma, Jehova agwala anyị ihe ọ ga-emere ndị nọgidere na-eje ije n’ụzọ ahụ na-eduba ná ndụ.—Ọma 37:29; Aịza. 35:5, 6; 65:21-23. w21.12 23 ¶6-7
Tọzdee, Eprel 27
Onye ọ bụla n’ime unu [jiri] obi ya niile [gbaghara] nwanna ya.—Mat. 18:35.
Anyị ma na anyị kwesịrị ịna-agbaghara. Ọ bụ ihe anyị kwesịrị ime. Ma, o nwere ike ịna-esiri anyị ike. Ọ ga-abụ otú ahụ ka ọ dị Pita onyeozi. (Mat. 18:21, 22) Ma, olee ihe ga-enyere anyị aka? Nke mbụ, tụgharịa uche n’otú Jehova si agbaghara anyị. (Mat. 18:32, 33) Anyị erughị eru ka Jehova gbaghara anyị. Ma ọ na-agbaghara anyị. (Ọma 103:8-10) “Anyị kwesịkwara ịna-ahụ ibe anyị n’anya.” Nke ahụ pụtara na ịgbaghara mmadụ abụghị ihe anyị ga-eme ma anyị chọọ. Ọ bụ ihe anyị kwesịrị imere nwanna anyị ọ bụla. (1 Jọn 4:11) Nke abụọ, tụgharịa uche n’ihe na-eme ma ị gbaghara mmadụ. O nwere ike inyere onye ahụ anyị gbaghaara aka, mee ka ọgbakọ dị n’otu, mee ka anyị na Jehova dịrị ná mma, meekwa ka anyị nweta onwe anyị. (2 Kọr. 2:7; Kọl. 3:14) N’ikpeazụ, rịọ Onye ahụ nke gwara anyị ka anyị gbaghara ka o nyere gị aka. Ekwela ka Ekwensu mee ka gị na ụmụnna gị gharazie ịdị n’udo. (Efe. 4:26, 27) Enyemaka Jehova dị anyị mkpa ka anyị ghara ịma n’ọnyà Ekwensu. w21.06 22 ¶11; 23 ¶14
Fraịdee, Eprel 28
Ị ga-abụkwa eze Izrel.—1 Sam. 23:17.
Devid nọ na-agba ọsọ ndụ. Eze Izrel na-akpa ezigbo ike aha ya bụ Sọl chọsiri ike imemila ya. Mgbe Devid chọrọ ihe ọ ga-eri, ọ kwụsịrị n’obodo Nọb, rịọ Ahimalek bụ́ onye nchụàjà ka o nye ya ogbe achịcha ise. (1 Sam. 21:1, 3) Mgbe e mechara, ya na ndị agha ya gara zoo n’ọgba. (1 Sam. 22:1) Olee otú Devid si banye ná nsogbu a? Sọl na-emere Devid ezigbo anyaụfụ n’ihi na ọtụtụ ndị hụrụ ya n’anya nakwa n’ihi na o meriri n’ọtụtụ agha. Sọl makwa na ọ bụ nnupụisi ya mere ka Jehova jụ ya ma họrọ Devid ka ọ bụrụzie eze Izrel Devid ka ọ bụrụzie eze Izrel. (1 Sam. 23:16, 17) Ma, Sọl ka bụ eze Izrel, nweekwa ọtụtụ ndị agha na ọtụtụ ndị na-akwado ya. N’ihi ya, Devid gbara ọsọ ndụ. Sọl ò chere na ya ga-enwe ike ịkwụsịli Jehova ime Devid eze? (Aịza. 55:11) Baịbụl ekwughị otú ahụ. Ma, otu ihe doro anyị anya bụ na ihe ahụ Sọl mere bụ itinye onwe ya n’ezigbo nsogbu. O nweghị mgbe ndị na-alụso Jehova ọgụ na-agaghị akụ afọ n’ala. w22.01 2 ¶1-2
Satọdee, Eprel 29
Nikọdimọs . . . bịakwutere Jizọs n’abalị.—Jọn 3:1, 2.
Jizọs gbasiri mbọ ike n’ozi ọma. O ji ohere ọ bụla kụziere ndị mmadụ ihe iji gosi na ọ hụrụ ha n’anya. (Luk 19:47, 48) Gịnị mere o ji mee otú ahụ? O metaara ha ebere. Mgbe ụfọdụ, ọtụtụ ndị na-achọ ka Jizọs kụziere ha ihe nke na ya “na ndị na-eso ụzọ ya enweghịdị ike iri nri.” (Mak 3:20) O nwekwara mgbe Jizọs ziri otu nwoke ozi ọma n’abalị n’ihi na ọ bụ oge kaara nwoke ahụ mma. Ọtụtụ n’ime ndị mbụ gere Jizọs ntị aghọghị ndị na-eso ụzọ ya. Ma, ọ gbaara ndị niile gere ya ntị àmà nke ọma. Taa, anyị chọrọ ime ka onye ọ bụla nụ ozi ọma ahụ. (Ọrụ 10:42) Ihe ga-enyere anyị aka ime ya bụ ịna-agbanwe otú anyị si ezi ozi ọma. Kama ịna-ezi ndị mmadụ ozi ọma naanị mgbe ọ ga-adabara anyị, anyị kwesịrị ịdị njikere ịga ozi ọma n’oge e nwere ike inweta ndị mmadụ n’ụlọ. Anyị mee otú ahụ, obi ga-adị Jehova ụtọ. w22.01 17 ¶13-14
Sọnde, Eprel 30
Mmadụ nọ na-achị mmadụ ibe ya ọchịchị nchịgbu.—Ekli. 8:9.
Taa, ọ na-esiri ọtụtụ ndị ike ịtụkwasị ndị ọchịchị obi. Ihe kpatara ya bụ na ha ahụla na ọtụtụ mgbe, ndị ọchịchị na-eme iwu ndị na-abara ndị ọnụ na-eru n’okwu na ndị bara ọgaranya uru. O nweghịkwa ihe ha ji ndị ogbenye kpọrọ. Ihe ọzọ bụ na ụfọdụ ndị isi okpukpe na-eme ihe ndị na-adịghị mma, ya emezie ka ụfọdụ ndị ghara ịtụkwasị Chineke obi. N’ihi ya, ọ bụrụ na mmadụ ekweta ka anyị mụwara ya Baịbụl, anyị ga-agba mbọ nyere ya aka ka ọ mụta ịna-atụkwasị Jehova na ndị o ji eduzi nzukọ ya n’ụwa taa obi. Ma, ọ bụghị naanị ndị anyị na-amụrụ Baịbụl kwesịrị ịmụta ịna-atụkwasị Jehova na nzukọ ya obi. Ọ bụrụgodị na anyị anọọla n’ọgbakọ ruo ọtụtụ afọ, anyị kwesịkwara ịna-atụkwasị Jehova obi na otú o si eme ihe kacha mma. Mgbe ụfọdụ, o nwere ihe ndị nwere ike ime ka a mata ma obi ò siri anyị ike na Jehova na-eme ihe dị mma mgbe niile. w22.02 2 ¶1-2