Mee
Mọnde, Mee 1
Chesienụ echiche ike banyere onye ahụ nke diri okwu mmegide.—Hib. 12:3.
Jehova mere ka e dee akwụkwọ Matiu, Mak, Luk, na Jọn iji nyere anyị aka ịmatakwu Ọkpara ya nke ọma. N’akwụkwọ Baịbụl anọ ndị a, a kọrọ gbasara ndụ Jizọs na ozi ya. Akwụkwọ Baịbụl ndị ahụ gwara anyị ihe ndị Jizọs kwuru, ihe ndị o mere, nakwa otú obi dị ya gbasara ihe ụfọdụ. Ha na-enyekwara anyị aka ‘ichesi echiche ike’ banyere ihe ndị Jizọs mere. E dere ihe ndị Jizọs mere anyị kwesịrị ime na ha. N’ihi ya, ọ bụrụ na anyị amụọ akwụkwọ Baịbụl anọ ndị a, anyị ga-amatakwu Jizọs nke ọma. Ọ ga-enyekwara anyị aka ịna-esochi nzọụkwụ ya anya. Ihe ga-eme ka akwụkwọ Matiu, Mak, Luk, na Jọn baara anyị uru abụghị naanị ịgụ ha agụ. Anyị kwesịrị iwepụta oge mụọ ha nke ọma, chebakwara ihe anyị gụtara na ha echiche. (Tụlee Joshụa 1:8.) Were ya na ị nọ ya mgbe ihe ndị ị na-agụ na-eme. Were ya na ị na-ahụ ma na-anụ ihe ndị na-eme ebe ahụ. Werekwa ya na ọ bụ gịnwa ka ihe ndị ahụ na-eme. Ihe ga-enyere gị aka ime ya bụ iji akwụkwọ ndị nzukọ Jehova wepụtara na-eme nchọnchọ. w21.04 4-5 ¶11-13
Tuzdee, Mee 2
Anyị na-ekwusa Kraịst a kpọgidere n’osisi, ọ bụụrụ ndị Juu ihe ịsụ ngọngọ.—1 Kọr. 1:23.
Ọtụtụ narị afọ tupu Jizọs abịa n’ụwa, Jehova esila n’Okwu ya mee ka a mata na a ga-arara Mesaya ahụ nye n’aka ndị iro ya nakwa na ihe a ga-akwụ onye ga-arara ya nye bụ mkpụrụ ego ọlaọcha iri atọ. (Zek. 11:12, 13) E bukwara amụma na onye ga-arara ya nye bụ otu n’ime ndị ya na ha kacha dịrị ná mma. (Ọma 41:9) Zekaraya dekwara, sị: “Gbuo onye ọzụzụ atụrụ, ka ìgwè atụrụ ya wee gbasasịa.” (Zek. 13:7) Amụma ndị a mezurunụ n’isi Jizọs kwesịrị ime ka okwukwe ndị na-efe Chineke sie ike, ọ bụghị ime ka ha sụọ ngọngọ. Ụdị ihe ahụ ọ̀ na-eme taa? Ee. N’oge anyị a, ụfọdụ Ndịàmà Jehova a ma ama apụọla n’ọgbakọ, ghọọ ndị si n’ezi ofufe dapụ, na-agbalịkwa iduhie ndị ọzọ. Ha na-esi n’Ịntanet, redio, tiivi, na akwụkwọ akụkọ na-akọsa akụkọ ọjọọ, akụkọ ndị e tinyere nnu na ose, nakwa ụgha gbasara Ndịàmà Jehova. Ma, ihe a ha na-akọsa anaghị eme ka ndị chọrọ ife Chineke sụọ ngọngọ. Kama nke ahụ, ha ma na Baịbụl ebuola amụma na ụdị ihe ahụ ga-eme.—Mat. 24:24; 2 Pita 2:18-22. w21.05 11 ¶12; 12-13 ¶18-19
Wenezdee, Mee 3
Ụzọ ndị ezi omume yiri ìhè na-enwu mgbe chi bọrọ, nke na-enwusikwu ike ruo mgbe chi bọchara.—Ilu 4:18.
Baịbụl kwuru na ka oge na-aga, ndị Chineke ga na-aghọtakwu eziokwu Baịbụl. (Kọl. 1:9, 10) Jehova na-eme ka e jiri nwayọọ nwayọọ na-aghọtakwu eziokwu ahụ. Anyị kwesịkwara ịdị njikere ichere ruo mgbe anyị ga-aghọta ya nke ọma. Ọ bụrụ na ndị na-edu ndú ná nzukọ Jehova achọpụta na e kwesịrị ịgbanwe otú e si ghọta otu ihe Baịbụl kwuru, ha anaghị egbu oge ime ya. Ọtụtụ chọọchị na-agbanwe ihe ha na-eme iji mee ka obi dị ndị chọọchị ha mma ma ọ bụkwanụ iji mee ka ha na-eme ka ndị ụwa. Ma, ihe na-eme ka Ndịàmà Jehova gbanwee ihe ụfọdụ bụ na ha chọrọ ịbịarukwu Chineke nso, na-efekwa ya otú Jizọs si fee ya. (Jems 4:4) Anyị anaghị agbanwe ihe anyị na-eme n’ihi na ndị mmadụ agbanweela otú ha si ele ihe anya, kama, ọ bụ n’ihi na anyị aghọtakwuola Akwụkwọ Nsọ nke ọma. Anyị hụrụ eziokwu ahụ n’anya.—1 Tesa. 2:3, 4. w21.10 22 ¶12
Tọzdee, Mee 4
Na-akọrọnụ ya ihe niile na-echegbu unu.—1 Pita 5:7.
Gịnị ka i nwere ike ime ma ọ bụrụ na owu na-ama gị? Na-eche gbasara otú Jehova si enyere gị aka. (Ọma 55:22) Ọ ga-enyere gị aka ịmata na ọ bụghị naanị gị nọ. Cheekwa gbasara otú Jehova si nyere ndị ohu ya ndị ọzọ owu na-ama aka. (1 Pita 5:9, 10) E nwere otu nwanna aha ya bụ Hiroshi. Ọ bụ naanị ya bụ Onyeàmà Jehova n’ezinụlọ ha. Ọ sịrị: “Ịmata na onye ọ bụla na-eme ike ya niile iji fee Jehova ga-eme ka obi sie onye naanị ya bụ Onyeàmà Jehova n’ezinụlọ ha ike na ọ nọghị naanị ya.” Na-ekpe ekpere, na-agụ Baịbụl, na-agakwa ọmụmụ ihe. Na-agwa Jehova ihe dị gị n’obi. Ọ dị mkpa ka ị na-agụ Akwụkwọ Nsọ mgbe niile, na-atụgharịkwa uche n’ihe dị iche iche ị gụtara na ya gosiri na Jehova hụrụ gị n’anya. Ụfọdụ ụmụnna na-ebute amaokwu Baịbụl ụfọdụ ndị ga-akasi ha obi n’isi, dị ka Abụ Ọma 27:10 na Aịzaya 41:10. Ndị ọzọ achọpụtala na igere Baịbụl na akwụkwọ anyị ndị a na-egere egere mgbe ha na-akwadebe ọmụmụ ihe enyerela ha aka ka owu ghara ịna-amacha ha. w21.06 9-10 ¶5-8
Fraịdee, Mee 5
Ị gaghị atụ ọdachi ọ bụla na-abịa na mberede ụjọ.—Ilu 3:25.
Mmadụ ọ̀ nwụnahụrụ gị? Wepụta oge gụọ akụkọ Baịbụl ndị kwuru gbasara ndị a kpọlitere n’ọnwụ ka o mee ka obi sie gị ike na Chineke ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ n’ọnwụ. Ọ̀ na-ewute gị na a chụrụ onye ezinụlọ gị n’ọgbakọ? Wepụta oge mụọ ihe ka obi sie gị ike na otú Jehova si adọ anyị aka ná ntị bụ otú kacha mma. N’agbanyeghị nsogbu ọ bụla bịaara gị, were ya ka ohere i nwere iji mee ka okwukwe gị sikwuo ike. Gwa Jehova otú obi dị gị. Anọpụla iche. Kama, soro ụmụnna gị na-akpakọrịta. (Ilu 18:1) Na-eme ihe ndị ga-enyere gị aka ịna-edi nsogbu gị, ọ bụrụgodị na anya mmiri nwere ike ịna-agba gị ma i cheta ihe mere gị. (Ọma 126:5, 6) Na-agachi ọmụmụ ihe na ozi ọma anya, na-amụchikwa Baịbụl anya. Na-eche ihe ọma ndị Jehova ga-emere gị n’ọdịnihu. Ka ị na-ahụ otú Jehova si enyere gị aka, okwukwe i nwere n’ebe ọ nọ ga-esikwu ike. w21.11 23 ¶11; 24 ¶17
Satọdee, Mee 6
Otú ahụ kwa ka ọ na-adịghị Nna m nke bi n’eluigwe mma ka otu n’ime ndị a dị nta laa n’iyi.—Mat. 18:14.
Olee otú ndị na-eso ụzọ Jizọs si dị ka ‘ndị dị nta’? Olee ndị ụwa ji kpọrọ ihe taa? Ọ bụ ndị bara ọgaranya, ndị a ma ama, na ndị dị ike. N’anya ha, ndị na-eso ụzọ Jizọs enweghị ihe ha bụ. Ha bụ ‘ndị dị nta’ ọ na-enweghị ihe e ji ha kpọrọ. (1 Kọr. 1:26-29) Ma, Jehova esighị otú ahụ na-ele ha anya. Gịnị mere Jizọs ji kwuo gbasara “ndị a dị nta”? Ndị na-eso ụzọ ya jụrụ ya, sị: “Ònye n’eziokwu bụ onye kacha ukwuu n’Alaeze eluigwe?” (Mat. 18:1) Ọtụtụ ndị Juu n’oge ahụ weere ịnọ n’ọkwá ukwu na ịbụ onye a ma ama ka ihe dị ezigbo mkpa. Otu ọkà mmụta sịrị: “Ihe kacha ha mkpa ná ndụ bụ ndị ọzọ ịkwanyere ha ùgwù na hanwa ịbụ ndị a ma ama.” Jizọs ma na ndị na-eso ụzọ ya ga-agba ezigbo mbọ ka ha kwụsị iche na ha ka ndị ọzọ otú ahụ ndị Juu na-eme. w21.06 20 ¶2; 21 ¶6, 8; 22 ¶9
Sọnde, Mee 7
Mmanụ na ihe na-esi ísì ọma na-eme ka obi dị mmadụ ụtọ. Ezigbo ndụmọdụ enyi nyere enyi ya na-emekwa ka obi dị enyi ya ụtọ.—Ilu 27:9.
Pọl onyeozi mere ihe ndị okenye kwesịrị ịmụta ihe na ya. Dị ka ihe atụ, Pọl nyere ụmụnna nọ na Tesalonaịka ndụmọdụ mgbe ọ dị ha mkpa. Ma n’akwụkwọ ozi Pọl dere, o bu ụzọ kwuo otú ha si nwee okwukwe, ịhụnanya ha, na ntachi obi ha. O chebaara otú ihe si dịrị ha echiche ma kwuo na ọ ghọtara na ọ dịrịghị ha mfe nakwa na ha na-edi mkpagbu na ahụhụ. (1 Tesa. 1:3; 2 Tesa. 1:4) Ọ gwadịrị ụmụnna ndị ahụ na a na-akọ akụkọ ọma banyere ha. (1 Tesa. 1:8, 9) Ọ ga-abụrịrị na ihe a ọ gwara ha mere ha obi ụtọ. O doro anya na Pọl onyeozi hụrụ ụmụnna ndị nọ na Tesalonaịka n’anya nke ukwuu. Ọ bụ ya mere o ji nwee ike inye ha ndụmọdụ bara uru n’akwụkwọ ozi abụọ o degaara ha.—1 Tesa. 4:1, 3-5, 11; 2 Tesa. 3:11, 12. w22.02 15 ¶6
Mọnde, Mee 8
Ọ ga-ehichapụkwa anya mmiri niile dị ha n’anya. Ọnwụ agaghịzi adị.—Mkpu. 21:4.
Setan na-eme ka ndị isi okpukpe na-ekwu na obi tara Jehova mmiri nakwa na ọ bụ ya kpatara ahụhụ ụmụ mmadụ na-ata. Ụfọdụ n’ime ha na-ekwudị na ọ bụrụ na nwatakịrị anwụọ, ọ bụ Jehova kpọọrọ ya n’ihi na ọ chọkwuru ndị mmụọ ozi n’eluigwe. Ihe a bụ ịkparị Chineke. Ma, anyị ma nke bụ́ eziokwu. Ọ bụrụ na ọrịa jọgburu onwe ya arịawa anyị ma ọ bụ mmadụ anwụnahụ anyị, anyị anaghị ata Chineke ụta maka ya. Kama, obi siri anyị ike na otu ụbọchị, Chineke ga-eme ka ihe dị mma. Anyị na-agwa ndị mmadụ na Jehova hụrụ anyị n’anya, na-emekwa ka Jehova nwee ike ịzaghachi onye ahụ na-akwa ya emo okwu. (Ilu 27:11) Jehova bụ Chineke nwere ọmịiko. Ọ na-ewute ya ịnụ ákwá anyị na-ebe n’ihi ahụhụ anyị na-ata, n’agbanyeghị ma ọ̀ bụ mkpagbu, ọrịa, ma ọ bụkwanụ ezughị okè. (Ọma 22:23, 24) Nsogbu anyị na-ewute Jehova. Ọ chọsikwara ike ịkwụsị ya. Ọ ga-akwụsịkwa ya.—Tụlee Ọpụ. 3:7, 8; Aịza. 63:9. w21.07 9-10 ¶9-10
Tuzdee, Mee 9
I ji ebube na ùgwù chọọ ya mma.—Ọma 8:5.
N’oge na-adịghị anya, ụmụ mmadụ ndị rubeere Chineke isi ga-enweta ihe ọma kacha ihe ọma niile, ya bụ, ohere magburu onwe ya ife Jehova ruo mgbe ebighị ebi. Jizọs ga-ewepụ ihe ọjọọ niile nnupụisi Adam na Iv kpatara. Jehova ga-akpọlite ọtụtụ nde mmadụ n’ọnwụ ma nye ha ohere ịdị ndụ ebighị ebi, ahụ́ agbasiekwa ha ike n’ụwa e mere ka ọ ghọọ paradaịs. (Luk 23:42, 43) Ka a na-eme ka ezinụlọ Chineke dị n’ụwa zuo okè, onye ọ bụla n’ime ha ga-enweta “ebube na ùgwù” ahụ Devid dere banyere ya. Ọ bụrụ na i so “n’oké ìgwè mmadụ,” i nwere olileanya magburu onwe ya. (Mkpu. 7:9) Chineke hụrụ gị n’anya. Ọ chọrọ ka i soro n’ezinụlọ ya. N’ihi ya, mee ihe niile i nwere ike ime iji mee ya obi ụtọ. Ka nkwa Chineke kwere gị dịgide n’obi gị nakwa n’uche gị ụbọchị niile. Jiri ihe ọma Nna anyị nke eluigwe meere gị kpọrọ ihe. Jirikwa olileanya i nwere ito ya ruo mgbe ebighị ebi kpọrọ ihe. w21.08 7 ¶18-19
Wenezdee, Mee 10
Anyị ga-aghọrọ mkpụrụ ya ma ọ bụrụ na ike agwụghị anyị.—Gal. 6:9.
Jeremaya onye amụma kwusara ozi ọma ọtụtụ afọ n’agbanyeghị mmegide nakwa na ọtụtụ ndị egeghị ya ntị. Obi dara ya mbà n’ihi na ndị mmegide na-akwa ya “emo, na-akparịkwa” ya, ya achọwadị ịkwụsị ozi ya. (Jere. 20:8, 9) Ma Jeremaya akwụsịghị ozi ya. Olee ihe nyeere ya aka ịnọgide n’ozi ya ma na-enwe ọṅụ? E nwere ihe abụọ o lekwasịrị anya. Nke mbụ, ozi Jehova ọ na-ezi ndị mmadụ bụ gbasara “ọdịnihu” na “olileanya.” (Jere. 29:11) Nke abụọ, Jehova mere Jeremaya ọnụ na-ekwuru ya. (Jere. 15:16) Anyị na-ezikwa ndị mmadụ ozi ọma ga-eme ka ha nwee olileanya n’ụwa a olileanya na-adịghị, na-azakwa Ndịàmà Jehova. Ọ bụrụ na anyị elekwasị anya n’ihe ndị a nyeere Jeremaya aka, ọ ga-eme ka anyị na-enwe ọṅụ n’ozi anyị n’agbanyeghị ma ndị mmadụ hà gere anyị ntị ma ọ bụ na ha egeghị. N’ihi ya, adala mbà ma ọ bụrụ na ọ na-ewe oge karịa otú i chere tupu onye ị na-amụrụ ihe emewe nke ọma. Ime ndị na-eso ụzọ chọrọ ndidi.—Jems 5:7, 8. w21.10 27 ¶12-13
Tọzdee, Mee 11
Ka anyị tụfuo ibu arọ ọ bụla na mmehie ahụ nke na-ekegidekarị anyị.—Hib. 12:1.
N’agbanyeghị afọ ole anyị ferela Jehova, anyị kwesịrị ịgbalịsi ike na-eme ka okwukwe anyị na-esi ezigbo ike n’ebe ọ nọ. N’ihi gịnị? N’ihi na ọ bụrụ na anyị akpacharaghị anya, okwukwe anyị nwere ike ịnyụ ka ọkụ. Cheta na ihe mere ka anyị nwee okwukwe bụ ihe àmà ndị a na-anaghị ahụ anya. Ọ naghị ara ahụ́ mmadụ ichefu ihe ọ na-anaghị ahụ anya. Ọ bụ ya mere Pọl ji sị na enweghị okwukwe bụ “mmehie ahụ nke na-ekegidekarị anyị.” Olee otú anyị nwere ike isi zere ọnyà a? (2 Tesa. 1:3) Nke mbụ, rịọ Jehova ka o nye gị mmụọ nsọ ya, na-emekwa otú ahụ mgbe niile. N’ihi gịnị? N’ihi na okwukwe so ná mkpụrụ nke mmụọ nsọ. (Gal. 5:22, 23) Okwukwe anyị nwere n’Onye kere ihe niile agaghị esi ike ma ọ bụrụ na mmụọ nsọ enyereghị anyị aka. Ọ bụrụ na anyị anọgide na-arịọ Jehova ka o nye anyị mmụọ nsọ ya, ọ ga-enye anyị ya. (Luk 11:13) Anyị nwedịrị ike ịrịọ ya, sị: “Mee ka anyị nwekwuo okwukwe.” (Luk 17:5) Ihe ọzọ ị ga-eme bụ ịna-amụchi Okwu Chineke anya.—Ọma 1:2, 3. w21.08 18-19 ¶16-18
Fraịdee, Mee 12
Isi awọ́ bụ okpueze mara mma.—Ilu 16:31.
E nwere ọtụtụ uru ndị agadi na-abara ọgbakọ Jehova. Ọ bụ eziokwu na o nwere ike ha enweghịzi ike ha nweburu n’oge gara aga, ha ahụla ọtụtụ ihe ná ndụ. Jehova ka nwere ike iji ha na-arụ ọtụtụ ọrụ. Dị ka ihe atụ, Baịbụl kọrọ gbasara ndị ji obi ha niile fee Jehova ruo mgbe ha mere agadi. Mosis bụ otu n’ime ha. Ọ dị ihe dị ka afọ iri asatọ mgbe ọ ghọrọ onye amụma Jehova na onye ndú Izrel. Daniel ka bụkwa onye amụma Jehova mgbe ọ dị ihe dị ka afọ iri itoolu. O nwekwara ike ịbụ na Jọn onyeozi akarịala afọ iri itoolu mgbe Chineke ji mmụọ ya mee ka o dee akwụkwọ Mkpughe. Ọ bụ naanị ihe ole na ole ka Baịbụl kwuru banyere otu nwoke aha ya bụ Simiọn bụ́ “onye ezi omume na onye na-asọpụrụ Chineke.” Ma, Jehova ma ya, mee ka ọ hụ Jizọs, meekwa ka o buo amụma banyere Jizọs na mama ya.—Luk 2:22, 25-35. w21.09 3-4 ¶5-7
Satọdee, Mee 13
Jehova, adịghị m mpako. . . . Anaghịkwa m achọ oké ihe.—Ọma 131:1.
Ndị nne na nna kwesịrị ịkpachara anya ka ha ghara iji otu nwa ha na-atụnyere nwa ha ọzọ ma ọ bụ na-atụ anya ka nwa ha ahụ mee ihe ọ na-agaghị emeli. Ụdị ihe a nwere ike ime ka nwatakịrị daa mbà. (Efe. 6:4) Otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Sachiko sịrị: “Mama m chọrọ ka m na-enwetacha ihe niile n’ule. Ma nke ahụ ekweghị m omume. N’agbanyeghị na o meela ọtụtụ afọ m gụchara akwụkwọ, mgbe ụfọdụ, m ka na-eche ma ihe ndị m ji ike m niile na-eme ọ̀ na-amasịkwa Jehova.” Eze Devid kwuru na ya anaghị “achọ oké ihe” ma ọ bụ ihe ndị karịrị ya. Otú o si dị umeala n’obi, marakwa ebe ike ya ruru, mere ka ‘o wetuo obi ala nọrọ jụụ.’ (Ọma 131:2) Gịnị ka ndị nne na nna ga-amụta n’ihe a Devid kwuru? Otú ndị nne na nna ga-esi gosi na ha dị umeala n’obi, marakwa ebe ike ha ruru abụghị naanị n’ihe ha na-atụ anya n’aka ibe ha, kama n’ihe ha na-atụ anya n’aka ụmụ ha. Ndị nne na nna ga-enyere ụmụ ha aka ịmata na e ji ha kpọrọ ihe ma ha mata ebe nwa ha na-eme nke ọma na ebe ọ na-anaghị eme nke ọma, jirizie ya nyere ya aka ikpebi ihe ndị ọ ga-emeli. w21.07 21-22 ¶5-6
Sọnde, Mee 14
Onye ọ bụla ga-ebu ibu nke ya.—Gal. 6:5.
Anyị niile kwesịrị icheta na Jehova nyere anyị ikike ịhọrọ ihe anyị chọrọ ime. Nke ahụ pụtara na ọ bụ anyị ga-ekpebiri onwe anyị ma ànyị ga-erubere ya isi ma ọ bụ na anyị agaghị erubere ya isi. E nwere ụfọdụ ndị na-eto eto a zụlitere n’ezinụlọ na-anaghị eme nke ọma n’ofufe Chineke, ma ha emechaa kpebie ife Jehova, na-emekwa nke ọma, nweekwa ndị ọzọ nne na nna ha mere ike ha niile kụziere ha ka ha hụ Jehova n’anya, ma ha emechaa dapụ n’ọgbakọ mgbe ha toro. Ihe nke a pụtara bụ na ọ bụ onye nke ọ bụla n’ime anyị ka ọ dịịrị ikpebi ma ọ̀ ga-efe Jehova. (Josh. 24:15) N’ihi ya, ndị nne na nna ihe a gbawara obi, unu echela na ọ bụ unu ka o si n’aka. Mgbe ụfọdụ, nne ma ọ bụ nna na-esi n’ọgbakọ pụọ ma hapụ ezinụlọ ha. (Ọma 27:10) Ihe a nwere ike ịkacha wute ụmụ ha ma ọ bụrụ na ụmụ ha na-akwanyere ha ezigbo ùgwù ma na-achọkarị iṅomi ha. Ọ bụrụ na ị bụ onye na-eto eto a chụrụ nne ya ma ọ bụ nna ya n’ọgbakọ, mara na ọ na-ewute anyị. Biko, obi sie gị ike na Jehova maara otú ọ dị gị n’obi. Ọ hụrụ gị n’anya. Obi dịkwa ya ụtọ maka otú i si nọsie ike n’ọgbakọ. Chetakwa na ọ bụghị gịnwa mere ka nne gị ma ọ bụ nna gị kpebie ịpụ n’ọgbakọ. w21.09 27 ¶5-7
Mọnde, Mee 15
Ndị Jehova hụrụ n’anya ka ọ na-adọ aka ná ntị.—Hib. 12:6.
E nwere ike iji Onye Kraịst a chụrụ n’ọgbakọ tụnyere atụrụ ahụ́ na-adịghị, nke bu ọrịa nwere ike ife atụrụ ndị ọzọ. Ebe ọ bụ na ya na Jehova adịghịzi ná mma, o yiri onye na-arịa ọrịa. (Jems 5:14) Ụdị ọrịa a nwere ike ife ndị ọzọ otú ahụ ụfọdụ ọrịa nkịtị nwere ike ife ndị ọzọ. N’ihi ya, mgbe ụfọdụ, ọ dị ezigbo mkpa ka a chụpụ onye mere mmehie n’ọgbakọ. Ime otú a na-egosi na Jehova hụrụ atụrụ ya ndị nke ọzọ n’anya. Ihe a nwekwara ike ime ka onye ahụ mere mmehie ghọta na ihe o mere dị ezigbo njọ ma chegharịa. Onye a chụpụrụ n’ọgbakọ nwere ike ịna-abịa ọmụmụ ihe ka ọ na-amụta ihe ndị ga-eme ka okwukwe ya sie ike ọzọ. O nwekwara ike iwere akwụkwọ anyị ndị ọ ga-agụ n’onwe ya, na-elekwa ihe omume tiivi anyị. Ọ bụrụ na ndị okenye achọpụta na ọ na-agbanwe, ha nwere ike ha nọtụ, ha enye ya ndụmọdụ ga-enyere ya aka ka ya na Jehova dịghachi ná mma ka e nwee ike ịnabata ya n’ọgbakọ. w21.10 10 ¶9, 11
Tuzdee, Mee 16
Ọ bụghị onye ọ bụla nke na-asị m, “Onyenwe anyị, Onyenwe anyị,” ga-aba n’Alaeze eluigwe.—Mat. 7:21.
E nwere ụzọ ndị ọzọ otú anyị si efe Chineke taa si yie otú Ndị Kraịst oge mbụ si fee ya. Dị ka ihe atụ, a haziri anyị otú e si hazie ha. Anyị nwere ndị nlekọta sekit, ndị okenye, na ndị ohu na-eje ozi otú ahụ hanwa nwekwara. (Fil. 1:1; Taị. 1:5) Otú ha si were mmekọahụ, alụmdi na nwunye, na ọbara ka anyịnwa sikwa were ya. Otú ha sikwa echebe ọgbakọ ka ndị mmehie na-ekweghị echegharị ghara imebi ya ka anyịnwa sikwa na-eme. (Ọrụ 15:28, 29; 1 Kọr. 5:11-13; 6:9, 10; Hib. 13:4) Baịbụl kwuru hoo haa na e nwere “otu okwukwe” Chineke kwadoro. (Efe. 4:4-6) Obi dị anyị ụtọ na anyị bụ ndị Jehova, bụrụkwa ndị maara eziokwu gbasara ya na nzube ya. Ka anyị nọgidesie ike na-ejidesi eziokwu ahụ ike. w21.10 22-23 ¶15-17
Wenezdee, Mee 17
Nọrọnụ ebe unu kwesịrị ịnọ. Guzoronụ otu ebe ka unu hụ otú Jehova ga-esi zọpụta unu.—2 Ihe 20:17.
Otu nsogbu siri ezigbo ike bịaara Eze Jehoshafat. E nwere mgbe ndị agha buru ezigbo ibu si n’obodo Amọn, Moab, na Sia bụ́ ugwu ugwu bịara iyi ya na ndị ya egwu. (2 Ihe 20:1, 2) Gịnị ka Eze Jehoshafat mere? Ọ rịọrọ Jehova ka o nyere ya aka ka ọ dị ike. Ekpere ahụ Jehoshafat ji obi umeala kpee ná 2 Ihe E Mere 20:5-12 gosiri na ọ tụkwasịrị Nna ya nke eluigwe obi. Jehova si n’ọnụ otu onye Livaị aha ya bụ Jahazayel gwa Jehoshafat ihe ahụ e kwuru n’amaokwu Baịbụl ihe mmụta dịịrị ụbọchị taa si. Jehoshafat mere ihe a gwara ya n’ihi na ọ tụkwasịrị Jehova obi. Mgbe ya na ndị ya gara izute ndị iro ha, kama idowe ndị agha n’ihu, o dowere ndị na-abụ abụ n’ihu. Jehova emechughị ya ihu. O nyeere ya aka ya emerie ndị iro ya.—2 Ihe 20:18-23. w21.11 15-16 ¶6-7
Tọzdee, Mee 18
Ọ bụ ịhụnanya Jehova mere na anyị anwụchabeghị, n’ihi na ebere ya anaghị agwụ agwụ.—Ákwá 3:22.
Ọ bụrụ na ọnwụnwa abịara anyị, obi kwesịrị isi anyị ike na Jehova ga-enyere anyị aka ịnọgide na-erubere ya isi. (2 Kọr. 4:7-9) Obi kwesịrị isi anyị ike na Jehova ga-anọgide na-egosi anyị ịhụnanya ya pụrụ iche n’ihi na dị ka otu ọbụ abụ kwuru: “Anya Jehova dị n’ebe ndị na-atụ egwu ya nọ, bụ́ ndị na-atụ anya ịhụnanya ya pụrụ iche.” (Ọma 33:18-22, ihe e dere n’ala ala peeji ya) Tupu anyị ebido ife Jehova, ọ hụrụ anyị n’anya otú o si hụ mmadụ niile n’anya. Ma, ugbu a anyị malitere ife ya, ọ na-egosi anyị ịhụnanya ya pụrụ iche. Ịhụnanya ahụ na-eme ka Jehova na-echebe anyị. Ọ ga-anọgide na-eme ka anyị nọrọ ya nso, mezuokwa nkwa ndị o kwere anyị. Ọ chọrọ ka anyị bụrụ ndị enyi ya ruo mgbe ebighị ebi. (Ọma 46:1, 2, 7) N’ihi ya, n’agbanyeghị nsogbu ọ bụla nwere ike ịbịara anyị, Jehova ga-enye anyị ike anyị ga-eji nọgide na-erubere ya isi. w21.11 7 ¶17-18
Fraịdee, Mee 19
Na-edirinụ ibe unu ihe, na-agbagharakwanụ ibe unu kpamkpam.—Kọl. 3:13.
Ọtụtụ n’ime anyị na-ahụ ndị na-eburu onye ọrụ ibe ha, nwa akwụkwọ ibe ha, onye ikwu ha, ma ọ bụkwanụ onye ezinụlọ ha iwe n’obi, o nwedịrị ike ịbụ ruo ọtụtụ afọ. Cheta na ụmụnne Josef iri buuru ya ezigbo iwe n’obi nke mere ka ha mee ya ihe ọjọọ. (Jen. 37:2-8, 25-28) Ma, Josef mesoro ha ihe otú dị iche. Mgbe ọ nọ n’ọkwá dị elu, ọ gaara emegwara ha ihe ha mere ya. Ma, o meere ha ebere. O burughị ha iwe n’obi. Kama nke ahụ, o mere ihe e kwuru na Levitikọs 19:18. (Jen. 50:19-21) Ndị Kraịst chọrọ ime ihe dị Chineke mma kwesịrị iṅomi Josef bụ́ onye gbaghaara ụmụnne ya kama imegwara ha ihe ha mere ya. Jizọs gwara anyị ka anyị na-agbaghara ndị mehiere anyị. (Mat. 6:9, 12) Otú ahụkwa ka Pọl onyeozi gbara Ndị Kraịst ume ka ha na-eme. Ọ sịrị ha: “Ndị m hụrụ n’anya, unu abọrọla onwe unu ọbọ.”—Rom 12:19. w21.12 11 ¶13-14
Satọdee, Mee 20
Ọ na-emere ndị na-atụ egwu ya ihe na-agụ ha. Ọ na-anụ ákwá ha na-ebe ka o nyere ha aka, ọ na-anapụtakwa ha.—Ọma 145:19.
N’abalị iri na anọ n’ọnwa Naịsan afọ 33, Jizọs gara n’ogige Getsemeni n’abalị. N’ebe ahụ, ọ kọọrọ Jehova obi ya. (Luk 22:39-44) Ọ bụ n’oge a ihe siiri Jizọs ike ka “o kpesiri ekpere ike, besie ákwá ike ma jiri anya mmiri rịọ . . . arịrịọ.” (Hib. 5:7) Olee ihe Jizọs kpere ekpere maka ya n’abalị bọtara ụbọchị ọ nwụrụ? Ọ rịọrọ Jehova ka o nye ya ike ịnọgide na-erubere ya isi, na-emekwa uche ya. Jehova zara ekpere ahụ o ji obi ya niile kpee, zitekwa mmụọ ozi ka ọ bịa gbaa ya ume. Jizọs ma na ọ dị ezigbo mkpa ka ọ tachie obi ma mee ka e too aha Nna ya. Jehova gere ntị n’ekpere Jizọs ji obi ya niile kpee. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na ihe ka Jizọs mkpa bụ irubere Nna ya isi na ime ka e too aha Nna ya. Ọ bụrụ na ihe ka anyị mkpa bụ ime ihe ndị a, Jehova ga-aza ekpere anyị ma nyere anyị aka.—Ọma 145:18. w22.01 18 ¶15-17
Sọnde, Mee 21
Ya mere, gaanụ mee ndị mba niile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ m. Na-eme ha baptizim . . . Na-ezi ha [ihe].—Mat. 28:19, 20.
Ọtụtụ ndị anaghị ege anyị ntị n’ihi na anyị anaghị etinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị. Ha na-atụ anya ka anyị soro na-eme ntụliaka ọchịchị. Mana, o doro anyị anya na ọ bụrụ na anyị ahọrọ ka mmadụ ibe anyị chịwa anyị, ọ pụtara na anyị na-ajụ Chineke. (1 Sam. 8:4-7) Ụfọdụ ndị nwekwara ike na-eche na anyị kwesịrị ịrụ ụlọ akwụkwọ na ụlọ ọgwụ, na-emekwa ihe ndị ọzọ iji nyere obodo aka. Ha anaghị ege anyị ntị n’ihi na ihe bụ́ mkpa anyị bụ ikwusa ozi ọma, ọ bụghị igboro ụwa mkpa ha ozugbo. Gịnị ka anyị ga-eme ka anyị ghara ịsụ ngọngọ? (Mat. 7:21-23) Ihe bụ́ isi anyị kwesịrị ilekwasị anya bụ ọrụ ahụ Jizọs Kraịst nyere anyị iwu ka anyị rụọ. Anyị ekwesịghị ikwe ka ndọrọ ndọrọ ọchịchị ma ọ bụ ịchọ ka e nyere ndị mmadụ aka dọpụ uche anyị na ya. Anyị hụrụ ndị mmadụ n’anya, chọọkwa ka e nyere ha aka. Ma, anyị ma na ụzọ kacha mma anyị nwere ike isi nyere ndị agbata obi anyị aka bụ ịkụziri ha gbasara Alaeze Chineke nakwa inyere ha aka ka ha na Jehova dịrị ná mma. w21.05 7 ¶19-20
Mọnde, Mee 22
Ma mara na oge ikpeazụ ga-adị oké egwu, taakwa akpụ.—2 Tim. 3:1.
N’agbanyeghị na ọtụtụ n’ime ndị na-achị achị taa na-ekwu na ha na-efe Chineke, ha achọbeghị ịpụ n’ọchịchị. N’ihi ya, otú ahụ ndị ọchịchị mere n’oge Jizọs, ndị ọchịchị nke oge a na-emegide ndị na-eso ụzọ Jizọs si otú ahụ na-emegide onye Jehova tere mmanụ. (Ọrụ 4:25-28) Gịnị ka Jehova nyere ha ohere ime? Abụ Ọma 2:10-12 sịrị: “Ugbu a, unu ndị eze, gosinụ na unu na-aghọta ihe. Unu ndị na-ekpe ikpe n’ụwa, nabatanụ aka ná ntị a na-adọ unu. Na-atụnụ egwu Jehova mgbe unu na-efe ya, na-amakwanụ jijiji mgbe unu na-aṅụrị ọṅụ. Kwanyerenụ ọkpara ya ùgwù, ma ọ́ bụghị ya, Chineke ga-ewe iwe, unu ewee laa n’iyi, N’ihi na o nwere ike iwe iwe ngwa ngwa. Ndị niile na-agbaba n’ime ya na-enwe obi ụtọ.” Jehova hapụrụ ndị a na-emegide ya iji mara ma hà ga-agbanwe. Ha ka nwere ike ịgbanwe obi ha ma nabata Alaeze Jehova. Ma, oge adịghịzi. (Aịza. 61:2) Ọ bụ ugbu a ka ọ kacha dị ọkụ ọkụ ka ndị mmadụ mata Chineke ma kpebie ife ya. w21.09 15-16 ¶8-9
Tuzdee, Mee 23
Ihe oriri na uwe anyị nwere kwesịrị iju anyị afọ.—1 Tim. 6:8.
Pọl na-ekwu na ihe ọ bụla anyị nwere kwesịrị iju anyị afọ. (Fil. 4:12) Ihe kacha mkpa anyị nwere bụ adịm ná mma anyị na Jehova, ọ bụghị ihe ọ bụla anyị nwere. (Hab. 3:17, 18) Legodị ihe Mosis gwara ụmụ Izrel mgbe ha nọchara afọ iri anọ n’ala ịkpa. Ọ sịrị ha: “Jehova bụ́ Chineke unu agọziela unu n’ihe niile unu merela. . . . Jehova bụ́ Chineke unu nọnyeere unu afọ iri anọ a, e nweghịkwa ihe kọrọ unu.” (Diut. 2:7) N’ime afọ iri anọ ahụ, Jehova nyere ụmụ Izrel mana ka ha rie. Uwe ha yi si n’Ijipt pụta akaghị. (Diut. 8:3, 4) Obi ga-adị Jehova ụtọ ma ọ bụrụ na ihe anyị nwere eju anyị afọ. Ọ chọrọ ka obi na-adị anyị ụtọ maka ihe ndị ọ na-enye anyị, n’agbanyeghị otú ọ hà, nakwa ka anyị ghọta na ha bụ onyinye si ya n’aka. w22.01 5 ¶10-11
Wenezdee, Mee 24
Jiri obi gị niile tụkwasị Jehova obi, atụkwasịla amamihe gị obi.—Ilu 3:5.
Ndị bụ́ di, ọ bụ unu ka ilekọta ezinụlọ unu dị n’aka. N’ihi ya, unu kwesịrị ịgbasi mbọ ike chebe ezinụlọ unu ma na-akwado ha. Nsogbu bịara unu, unu nwere ike iche na unu ga-ama ihe unu ga-eme gbasara ya. Ma, unu ekwesịghị ịtụkwasị obi n’ike aka unu, kama, kpeenụ ekpere n’onwe unu maka enyemaka Jehova. Ihe ọzọkwa bụ unu na nwunye unu ikpe ekpere gbasara ya. Unu mụọ Baịbụl na akwụkwọ ndị ọzọ nzukọ a bipụtara iji mata ihe bụ́ uche Jehova ma na-eme ihe unu mụtara. E nwere ike ụfọdụ ndị agaghị akwado mkpebi ndị ahụ unu ji ihe e kwuru na Baịbụl mee. Ha nwekwara ike ịna-asị na ọ bụ inweta ego na ihe ndị e ji ya azụta bụ ihe kacha mma unu ga-emere ezinụlọ unu. Ma chetanụ ihe Eze Jehoshafat mere. (2 Ihe 20:1-30) Ọ tụkwasịrị Jehova obi ma gosi ya n’omume. Jehova agbahapụghị ya. Ọ gaghịkwa agbahapụ unu.—Ọma 37:28; Hib. 13:5. w21.11 15 ¶6; 16 ¶8
Tọzdee, Mee 25
Chineke . . . [anaghị] ekpe ikpe na-ezighị ezi.—Diut. 32:4.
Chineke kere anyị n’oyiyi ya. N’ihi ya, ọ naghị amasị anyị ịhụ ka a na-emegbu mmadụ. (Jen. 1:26) Ma, ebe ọ bụ na anyị ezughị okè, anyị nwere ike ịghọtahie ihe, ọ bụrụgodị na anyị chere na anyị ma ihe niile banyere ya. Dị ka ihe atụ, ọ̀ kwa i chetara otú obi si jọọ Jona njọ mgbe Jehova meere ndị Ninive ebere? (Jona 3:10–4:1) Ma, chegodị uru ihe Jehova mere bara. A zọrọ ndị Ninive dị ihe karịrị otu narị puku na puku iri abụọ (120,000) ndụ n’ihi na ha chegharịrị. Akụkọ a gosiri na ọ bụ Jona ghọtahiere ndị Ninive, ọ bụghị Jehova. Iwu ejighị Jehova ịkọrọ anyị ihe mere o ji mee ihe ọ bụla o mere. N’oge ochie, Jehova kwere ka ụfọdụ ndị ohu ya kwuo otú obi dị ha banyere ihe o kpebiri ime ma ọ bụ ihe ndị o mere. (Jen. 18:25; Jona 4:2, 3) O nwere oge ndị ọ kọwara ihe mere o ji mee ihe o mere. (Jona 4:10, 11) Ma, Jehova ekwesịghị ịnata anyị ikike tupu ya emee ihe ọ chọrọ ime ma ọ bụkwanụ mgbe o mechara.—Aịza. 40:13, 14; 55:9. w22.02 3-4 ¶5-6
Fraịdee, Mee 26
Ka onye kacha ukwuu n’etiti unu dịrị ka onye kacha nta, ka onye na-edu unu bụrụkwa onye na-eje ozi.—Luk 22:26.
Anyị na-ewere onwe anyị ka ndị “kacha nta” ma ọ bụrụ na anyị na-ewere “na ndị ọzọ ka” anyị. (Fil. 2:3) Anyị na-eme otú ahụ, anyị agaghị na-eme ka ndị ọzọ sụọ ngọngọ. Ụmụnna anyị niile nwere otu ihe ma ọ bụ ihe ọzọ ha ji ka anyị mma. Anyị ga-achọpụta nke a ma ọ bụrụ na anyị elekwasị anya n’àgwà ọma ndị ha nwere. Anyị kwesịrị iburu n’obi ihe Pọl kwuru n’akwụkwọ ozi o degaara ndị Kọrịnt. Ọ sịrị: “Gịnị ka i nwere mere ị ga-eji chewe na ị ka onye ọzọ mma? Ọ́ bụghị Chineke nyere gị ihe niile i nwere? Ọ bụrụ na o nyere gị ihe niile, gịnị mere i ji na-anya isi ka à ga-asị na i ji ike gị nweta ha?” (1 Kọr. 4:7) Anyị ekwesịghị ịna-eme ihe ọ bụla ga-eme ka ndị ọzọ were anyị ka ndị dị ezigbo mkpa ma ọ bụkwanụ kwe ka ihe ọ bụla mee ka anyị chewe na anyị ka ndị ọzọ mma. Ọ bụrụ na nwanna nwoke ekwuo okwu nke ọma ma ọ bụkwanụ nwanna nwaanyị enwee nkà n’ịmalite ọmụmụ Baịbụl, ha kwesịrị inye Jehova otuto maka ihe ndị ahụ ha na-eme. w21.06 21-22 ¶9-10
Satọdee, Mee 27
Ghaa mkpụrụ gị . . . , ekwekwala ka aka gị zuo ike.—Ekli. 11:6.
Ọ na-esikwuru ọtụtụ ụmụnna ike inweta ndị mmadụ n’ụlọ. Ụfọdụ ndị nọ n’ebe ha na-ezi ozi ọma bi n’ụlọ ma ọ bụ n’ebe ndị a gbara ogige. E nwekwara ike inwe onye nche na-anaghị ekwe mmadụ banye, ọ gwụkwala ma ya na onye nwe ụlọ ahụ hà yiri agba tupu ya abịa. Ụfọdụ ụmụnna anaghị enweta ndị ha ga-ezi ozi ọma n’ụlọ ma ọ bụkwanụ ya abụrụ na ha na-ezi ozi ọma n’ebe ndị bi ya na-ehighị nne. Ha nwere ike chọrọ naanị otu onye gaa ebe dị anya. O nwekwara ike ha ruo, ọ gaghị anọ ya. Ọ bụrụ na ọ dị otú a n’ebe ị na-ekwusa ozi ọma, i kwesịghị ịda mbà. Gbalịa gaa n’oge dị iche. Anyị ga-enwetakwu ndị mmadụ ma ọ bụrụ na anyị agaa n’oge e nwere ike ịhụ ha n’ụlọ. A sị ka e kwuwe, onye pụrụ apụ ga-alọta. Ọ gaghị atọ ebe ahụ. Ọtụtụ ụmụnna achọpụtala na a na-enweta ndị mmadụ n’ụlọ n’ehihie ma ọ bụ ná mgbede. Ihe ọzọkwa bụ na ndị mmadụ na-aka atụsara ahụ́, dịkwa njikere ha na mmadụ ikwurịta okwu n’oge ahụ. w21.05 15 ¶5, 7
Sọnde, Mee 28
Ọ bụ n’efu ka ha na-efe m ofufe, n’ihi na ozizi ha na-ezi bụ ihe mmadụ nyere n’iwu.—Mak 7:7.
Ụdị ihe ahụ ọ̀ na-eme taa? Ee. Iwe na-ewe ọtụtụ ndị ma ọ bụrụ na Ndịàmà Jehova anaghị eso ha eme omenala ndị na-adabaghị n’ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru, dị ka, ememme ụbọchị ọmụmụ na Krismas. O nwekwara ndị ọzọ ọ na-ewe iwe na Ndịàmà Jehova anaghị eso ha eme ememme ndị e ji eto mba ma ọ bụ omenala ndị Akwụkwọ Nsọ na-akwadoghị a na-eme mgbe a na-eli ozu. Ndị ihe ndị a na-eme ka ha sụọ ngọngọ nwere ike ịna-eche na ha na-efe Chineke otú ọ chọrọ. Ma, ha agaghị eme ihe dị Chineke mma ma ọ bụrụ na ihe na-amasị ha ime bụ omenala ndị o doro anya na ha adabaghị n’ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru. (Mak 7:8, 9) Gịnị ka anyị ga-eme ka anyị ghara ịsụ ngọngọ? Anyị kwesịrị ịhụ iwu Jehova n’anya nke ukwuu. (Ọma 119:97, 113, 163-165) Ọ bụrụ na anyị hụrụ Jehova n’anya, anyị agaghị etinye aka n’omenala ọ bụla ọ na-akwadoghị. Anyị agaghị ekwe ka ihe ọ bụla mee ka anyị ghara ịhụ ya n’anya. w21.05 6 ¶15-16
Mọnde, Mee 29
Nwee uche ziri ezi n’ihe niile, hụjuo anya, rụọ ọrụ onye na-ezisa ozi ọma.—2 Tim. 4:5.
Olee otú anyị ga-esi mee ihe a Pọl kwuru? Anyị kwesịrị ịna-amụ ihe mgbe niile, na-ekpe ekpere mgbe niile, jirikwa ọrụ Jehova nyere anyị kpọrọ ihe ka o mee ka okwukwe anyị sie ike. (2 Tim. 4:4) Ọ bụrụ na anyị enwee okwukwe, ụjọ agaghị atụ anyị ma anyị nụ akụkọ ọjọọ gbasara Ndịàmà Jehova. (Aịza. 28:16) Otú anyị si hụ Jehova, Okwu ya, na ụmụnna anyị n’anya ga-eme ka anyị ghara ịsụ ngọngọ n’ihi ihe ndị si n’ezi ofufe dapụ na-ekwu. N’oge Jizọs, ọtụtụ ndị ekweghị na ya. Ma, e nwekwara ọtụtụ ndị kwere na ya. E nwere, ma ó nweghị ihe ọzọ, otu onye so ná ndị Sanhedrin nakwa “oké ìgwè ndị nchụàjà” kweere n’ihe ọ na-akụzi. (Ọrụ 6:7; Mat. 27:57-60; Mak 15:43) Otú ahụ ka ọ dịkwa taa. Ọtụtụ nde mmadụ asụbeghị ngọngọ. N’ihi gịnị? N’ihi na ha ma eziokwu ndị dị na Baịbụl, jirikwa ha kpọrọ ihe. Okwu Chineke kwuru, sị: “Ndị hụrụ iwu gị n’anya nwere udo dị ukwuu, ọ dịghịkwa ihe na-eme ka ha sụọ ngọngọ.”—Ọma 119:165. w21.05 13 ¶20-21
Tuzdee, Mee 30
A na-eme ka ike m zuo okè n’adịghị ike.—2 Kọr. 12:9.
Pọl onyeozi matara na ihe niile o mere n’ozi Jehova bụ n’ihi ike Jehova nyere ya, ọ bụghị n’ike nke onwe ya. Jehova ji mmụọ nsọ ya nye Pọl ike ijezu ozi ya n’agbanyeghị mmegide, ịtụ mkpọrọ, na nsogbu ndị ọzọ o nwere. Ọ dịkwa mkpa ka Timoti bụ́ onye ya na Pọl so jee ozi tụkwasị Jehova obi iji jee ozi ya. Timoti sooro Pọl gaa ozi ala ọzọ n’ebe ndị dị anya. Pọl zigakwara ya ka ọ gaa gbaa ọgbakọ dị iche iche ume. (1 Kọr. 4:17) O nwere ike ịbụ na Timoti chere na ya erughị eru ime ihe ndị a. O nwere ike ịbụ ya mere Pọl ji dụọ ya ọdụ, sị: “Ekwela ka onye ọ bụla lelịa gị anya n’ihi na ị bụ okorobịa.” (1 Tim. 4:12) N’oge ahụkwa, Timoti nwekwara ogwu n’anụ ahụ́ ya nke bụ́ ‘ọrịa ọ na-arịakarị.’ (1 Tim. 5:23) Ma, Timoti ma na mmụọ nsọ Jehova ga-enye ya ike dị ya mkpa iji kwusaa ozi ọma ma jeere ụmụnna ya ozi.—2 Tim. 1:7. w21.05 21 ¶6-7
Wenezdee, Mee 31
Na-elekọta atụrụ gị nke ọma.—Ilu 27:23.
Ihe e kwuru na Jems 1:19 ga-abara ndị na-enye ndụmọdụ uru. Jems dere, sị: “Onye ọ bụla kwesịrị ịbụ onye na-anụ ihe ngwa ngwa, onye na-anaghị ekwu okwu ngwa ngwa, na onye na-anaghị ewe iwe ngwa ngwa.” Okenye nwere ike iche na ọ ma ihe niile gbasara ihe ọ chọrọ inye nwanna ndụmọdụ banyere ya. Ma, ọ̀ ma ya n’eziokwu? Ilu 18:13 sịrị: “Ọ bụrụ na mmadụ azaa okwu tupu ya anụ ihe merenụ, ọ na-egosi na ọ dị iberiibe, na-emechukwa onwe ya ihu.” Ọ ka mma ịjụ nwanna ahụ ka ọ kọọ ihe merenụ. N’ihi ya, okenye kwesịrị ige ntị tupu ya ekwuwe okwu. Okenye nwere ike ịjụ, sị: “Olee nsogbu gị na ya na-alụ?” “Olee ihe m ga-eme iji nyere gị aka?” Ọ bụrụ na ndị okenye agbaa mbọ na-ege ụmụnna ha ntị nke ọma, ọ ga-aka eme ka ha nyere ha aka ma gbaa ha ume. Inye mmadụ ndụmọdụ ga-eru ya n’obi apụtaghị ịgụrụ ya ebe ụfọdụ na Baịbụl ma ọ bụ ịgwa ya ihe ndị anyị chere na ọ ga-eme. Ụmụnna anyị kwesịrị ịghọta na anyị hụrụ ha n’anya, na anyị na-aghọta ha, nakwa na anyị chọrọ inyere ha aka. w22.02 17 ¶14-15