Jun
Sọnde, Jun 1
Ọtụtụ nsogbu ga-abịara anyị tupu anyị abanye n’Alaeze Chineke. —Ọrụ 14:22.
Jehova gọziri Ndị Kraịst oge mbụ maka otú ha si mee mgbanwe n’ihi otú ihe si gbanwee. Ọtụtụ mgbe, a kpagburu ha. Mgbe ụfọdụ, o nwere ike ịbụ mgbe ha na-atụghị anya ya. Chegodị ihe mere Banabas na Pọl onyeozi mgbe ha nọ na-ekwusa ozi ọma na Listra. Ná mmalite, ndị obodo ahụ nabatara ha ma gee ha ntị. Ma, ndị mmegide mechara “mee ka ìgwè mmadụ ahụ megidewe Pọl.” Ụfọdụ n’ime ndị ahụ tụdịrị Pọl okwute, hapụ ya chee na ọ nwụọla. (Ọrụ 14:19) Ma, Pọl na Banabas gara ebe ọzọ kwusawa ozi ọma. Olee uru ọ bara? Ha mere “ka ọtụtụ ndị bụrụ ndị na-eso ụzọ Jizọs.” Okwu ha na omume ha gbakwara ụmụnna ha ume. (Ọrụ 14:21, 22) Ọtụtụ ndị ritere uru n’ihi na Pọl na Banabas adaghị mbà mgbe e bidoro megidewe ha na mberede. Ọ bụrụ na anyị adaghị mbà n’ọrụ Jehova nyere anyị ka anyị rụọ, Jehova ga-agọzi anyị. w23.04 16 ¶13-14
Mọnde, Jun 2
Jehova, biko, gee ntị n’ekpere m. Ṅaakwa ntị n’arịrịọ m na-arịọ ka i nyere m aka. M na-akpọku gị n’oge m na-ata ahụhụ, n’ihi na ị ga-aza m.—Ọma 86:6, 7.
Ndị iro gbara Eze Devid gburugburu ná ndụ ya niile. Ọ rịọkwara Jehova ọtụtụ ugboro ka o nyere ya aka. Obi siri Devid ike na Jehova nụrụ ekpere ya ma za ya. Obi kwesịkwara isi gị ike otú ahụ. Baịbụl na-eme ka obi sie anyị ike na Jehova na-enye anyị amamihe na ike anyị ga-eji die nsogbu ndị na-abịara anyị. O nwere ike iji ụmụnna anyị ma ọ bụ ndị na-anaghị efe ya ugbu a si n’ụzọ ụfọdụ nyere anyị aka. O nwere ike ọ bụghị mgbe niile ka Jehova ga-aza ekpere anyị otú anyị tụrụ anya ya. Mana, anyị ma na ọ ga-aza ya. Ọ ga-enye anyị ihe dị anyị mkpa nakwa n’oge ọ dị anyị mkpa. N’ihi ya, akwụsịla ikpe ekpere. Nwee okwukwe na Jehova ga-aza ekpere gị. Ka obi siekwa gị ike na ọ ga na-elekọta gị ugbu a, nakwa na n’ụwa ọhụrụ ya, ọ ga-ewere “ihe na-agụ ihe ọ bụla dị ndụ nyejuo ya afọ.”—Ọma 145:16. w23.05 8 ¶4; 13 ¶17-18
Tuzdee, Jun 3
Gịnị ka m ga-eji kwụọ Jehova ụgwọ maka ihe ọma niile o meere m? —Ọma 116:12.
Ọ dị mma ka i lekwasị anya n’uru ime ihe i kpebiri ime n’ofufe Jehova ga-abara gị. Olee uru ndị ị ga-elekwasị anya na ha? Ọ bụrụ na i kpebiri ịna-emekwu nke ọma n’ịgụ Baịbụl na ikpe ekpere, chee otú ọ ga-esi mee ka gị na Jehova dịkwuo ná mma. (Ọma 145:18, 19) Ọ bụrụkwanụ na e nwere otu àgwà Ndị Kraịst ị chọrọ ịna-akpa, lekwasị anya n’otú ọ ga-esi eme ka gị na ndị ọzọ na-adịkwu ná mma. (Kọl. 3:14) Gbalịa depụta ihe niile mere i ji chọọ ime ihe i kpebiri ime. Ị nọtụ, gị eleruo ha anya. Ka gị na ndị ga-eme ka ọ na-agụsi gị agụụ ike ime ihe i kpebiri ime na-anọkọkwa. (Ilu 13:20) Nke bụ́ eziokwu bụ na e nwere mgbe ụfọdụ ọ na-anaghị agụ anyị agụụ ime ihe anyị kpebiri ime. Ọ̀ pụtara na anyị agaghị emeli ya? Mba. Anyị nwere ike ịgbasi mbọ ike ime ihe anyị kpebiri ime ọ bụrụgodị na ọ naghị agụ anyị agụụ ime ya. Ọ bụ eziokwu na ọ gaghị adịrị anyị mfe, ma obi ga-adị anyị ụtọ ma ọ bụrụ na anyị emee ihe ahụ anyị kpebiri ime. w23.05 27-28 ¶5-8
Wenezdee, Jun 4
Mkpụrụ ọ bụla mmadụ na-agha ka ọ ga-aghọrọ.—Gal. 6:7.
Anyị cheta na anyị ga-eji isi anyị buru ihe anyị kpebitara, o nwere ike ime ka anyị kwupụta mmehie anyị, mezie ihe anyị mejọrọ, ma ghara imeghachi ihe ahụ ọzọ. Ime otú ahụ nwere ike inyere anyị aka ịnọsi ike n’ọsọ ndụ a. Ọ bụrụ na ị gaghị emezili ihe si n’ihe i kpebiri pụta, were ihe otú i si hụ ya. Ejila oge gị na ike gị na-agbalị igosi na ihe i mere dị mma ma ọ bụ tawa ndị ọzọ ụta. Kama ime otú ahụ, kweta ebe i mejọrọ ma gbalịsie ike ime ihe ga-akacha baara gị uru ugbu a. Ọ bụrụ na ihe i mejọrọ mere ka obi na-ama gị ikpe, wetuo obi kpee ekpere ka Jehova nyere gị aka. Kweta ihe i mejọrọ ma rịọ ya ka ọ gbaghara gị. (Ọma 25:11; 51:3, 4) Rịọ ndị i mejọrọ ka ha gbaghara gị. Ọ bụrụkwa na ọ dị mkpa, gakwuru ndị okenye ka ha nyere gị aka. (Jems 5:14, 15) Si n’ihe ndị i mejọrọ mụta ihe, gbalịakwa ka ị ghara ime ha ọzọ. I mee otú ahụ, ka obi sie gị ike na Jehova ga-emere gị ebere ma na-akwado gị.—Ọma 103:8-13. w23.08 28-29 ¶8-9
Tọzdee, Jun 5
Jehoash nọ na-eme ihe ziri ezi n’anya Jehova n’oge niile Jehoyada onye nchụàjà bụ onye ndụmọdụ ya. —2 Eze 12:2.
Jehoyada nyeere Eze Jehoash aka ịbụ ezigbo mmadụ. Ihe a mere ka eze ahụ ka na-eto eto chọọ ime ihe dị Jehova mma. Ma, mgbe Jehoyada nwụrụ, Jehoash gewere ndị isi na-anaghị efe Jehova ntị. (2 Ihe 24:4, 17, 18) Ihe a gbawara Jehova obi, ya ‘ana-ezigara ha ndị amụma iji mee ka ha lọghachikwute ya. Ma ha egeghị ha ntị.’ Ha egeghịdị nwa Jehoyada bụ́ Zekaraya ntị. Zekaraya bụ onye amụma Jehova na onye nchụàjà, bụrụkwa nwa nwanne nna Jehoash. N’eziokwu, Jehoash nyere iwu ka e gbuo Zekaraya. (2 Ihe 22:11; 24:19-22) Jehoash kwụsịrị ịtụ egwu Chineke. Jehova ebula ụzọ kwuo, sị: “M gaghị akwanyere ndị na-eleda m anya ùgwù.” (1 Sam. 2:30) Ndị agha Siria dị obere mechara merie “imirikitiimi ndị agha” Jehoash, ‘merụọkwa ya ezigbote ahụ́.’ (2 Ihe 24:24, 25) Ndị na-ejere Jehoash ozi gburu ya n’ihi na o gburu Zekaraya. w23.06 18-19 ¶16-17
Fraịdee, Jun 6
Unu nọbu n’ọchịchịrị, ma unu nọzi n’ìhè.—Efe. 5:8.
Pọl onyeozi nọrọ ogologo oge n’Efesọs na-ezi ndị mmadụ ozi ọma ma na-akụziri ha ihe. (Ọrụ 19:1, 8-10; 20:20, 21) Ọ hụrụ ụmụnna ya n’anya nke ukwuu, chọọkwa inyere ha aka ka ha ghara ịkwụsị ife Jehova. Ndị Efesọs Pọl degaara akwụkwọ ozi nọbu na-ekpe okpukpe ụgha ma kwerekwa n’omenala ndị gbasara mgbaasị. E ji ịkwa iko ndị jọgburu onwe ha na ime ihe ọjọọ n’asọghị anya mara ndị bi n’Efesọs oge ochie. Ihe ha na-eme ma n’ebe a na-eme ihe nkiri ma n’ememme okpukpe ha na-abụkarị gbasara omume rụrụ arụ. (Efe. 5:3) Mmehie ọtụtụ n’ime ndị bi ebe ahụ “anaghịzi ewute” ha. (Efe. 4:17-19) Tupu ndị Efesọs amata ihe Jehova kpọrọ ihe ọma na ihe ọjọọ, akọnuche ha anaghị ama ha ikpe ma ha mee ihe na-adịghị mma. Ọ bụ ya mere Pọl ji kwuo na “uche ha gbara ọchịchịrị, ha enweghịkwa olileanya ịdị ndụ Chineke ga-eme ka anyị dịrị.” Ma, ụfọdụ ndị Efesọs ahụ mechara pụta n’ọchịchịrị. w24.03 20 ¶2, 4; 21 ¶5-6
Satọdee, Jun 7
Ndị nwere olileanya na Jehova ga-enyere ha aka ga-enwetaghachi ike. . . . Ike agaghị agwụ ha. —Aịza. 40:31.
Ọ dị mkpa ka Gidiọn rụsie ọrụ ike ebe ọ bụ onyeikpe. Mgbe ha lụsoro ndị Midian ọgụ n’etiti abalị, ndị Midian agbaa ọsọ, Gidiọn chụụrụ ha si na Ndagwurugwu Jezril ruo n’Osimiri Jọdan. (Ikpe 7:22) Gidiọn ọ̀ kwụsịrị na Jọdan? Mba. Ọ bụ eziokwu na ike gwụrụ ya na narị mmadụ atọ ya na ha so, ha gafere Jọdan, chụrụkwa ndị Midian na-aga. Ha mechara chụkwute ha ma merie ha. (Ikpe 8:4-12) Gidiọn tụkwasịrị Jehova obi na ọ ga-enye ya ike. Jehova nyekwara ya ike. (Ikpe 6:14, 34) E nwere otu oge Gidiọn na ụmụ nwoke ya na ha so ji ụkwụ na-achụ ndị eze Midian abụọ. Ọ ga-abụ na ndị eze abụọ ahụ nọ na-agba kamel. (Ikpe 8:12, 21) N’agbanyeghị nke ahụ, Jehova nyeere ndị Izrel ahụ aka, ha emerie. Ndị okenye nwekwara ike ịtụkwasị Jehova obi n’ihi na Jehova anaghị “ada mbà, ike anaghịkwa agwụ ya.” Ọ ga-enye ha ike mgbe ọ dị ha mkpa.—Aịza. 40:28, 29. w23.06 6 ¶14, 16
Sọnde, Jun 8
[Jehova agaghị] ahapụ unu, ọ gaghịkwa agbakụta unu azụ. —Diut. 31:6.
Obi nwere ike isi anyị ike n’agbanyeghị ụdị nsogbu bịaara anyị. N’ihi ya, tụkwasị Jehova obi. Legodị otú ihe si gaziere Berak n’ihi na ọ tụkwasịrị nduzi Jehova obi. Ọ bụ eziokwu na n’Izrel niile, e nweghị ebe a hụrụ ọta ma ọ bụ ube, Jehova gwara ya ka ọ gaa lụso Sisera bụ́ ọchịagha ndị Kenan na ndị agha ya ji ezigbo ngwá agha ọgụ. (Ikpe 5:8) Debora bụ́ onye amụma nwaanyị gwara Berak ka ọ gaa n’ebe ala dị larịị gaa lụso Sisera na ụgbọ ịnyịnya ya dị narị itoolu (900) ọgụ. N’agbanyeghị na Berak ma na ọ ga-esiri ndị Izrel ike imeri ndị agha ahụ n’ebe ahụ dị larịị, o rubere isi. Ka ndị agha ahụ na-agbada n’Ugwu Tebọ, Jehova mere ka nnukwu mmiri malite izo. Ụgbọ ịnyịnya Sisera tọrọ n’apịtị. Jehova mekwara ka Berak merie ha. (Ikpe 4:1-7, 10, 13-16) Jehova ga-emekwa ka anyị merie ma ọ bụrụ na anyị atụkwasị ya obi, na-eme ihe ọ bụla nzukọ ya gwara anyị mee. w23.07 19 ¶17-18
Mọnde, Jun 9
Ọ bụ onye tachiri obi ruo ọgwụgwụ ka a ga-azọpụta.—Mat. 24:13.
Anyị kwesịrị inwe ndidi ma anyị chọọ ka a zọpụta anyị. Anyị kwesịrị ime ka ndị fere Jehova n’oge ochie, nwee ndidi ma chere ka Chineke mezuo nkwa ndị o kwere anyị. (Hib. 6:11, 12) Baịbụl ji anyị tụnyere onye ọrụ ugbo. (Jems 5:7, 8) Onye ọrụ ugbo na-agbasi mbọ ike ịkụ mkpụrụ nakwa ịgba ya mmiri. Ma, ọ maghị kpọmkwem mgbe ihe ọ kụrụ ga-eto. N’ihi ya, onye ọrụ ugbo na-enwe ndidi na-echere, obi na-esikwa ya ike na ọ ga-emecha ghọrọ mkpụrụ ọ kụrụ. Anyịnwa kwesịkwara ịna-agbasi mbọ ike ịna-eso ụzọ Jizọs n’agbanyeghị na anyị ‘amaghị ụbọchị Onyenwe anyị ga-abịa.’ (Mat. 24:42) Anyị na-enwe ndidi na-echere, obi esiekwa anyị ike na mgbe oge ruru, Jehova ga-emezu nkwa niile o kwere. Ọ bụrụ na anyị anaghị enwe ndidi, ike nwere ike ịgwụ anyị, anyị ejiri nwayọọ nwayọọ na-ahapụ Jehova. Anyị nwekwara ike ịchụwa ihe ndị ga-eme ka obi na-adị anyị ụtọ ugbu a. Ma, ọ bụrụ na anyị ana-enwe ndidi, anyị nwere ike ịtachi obi ruo ọgwụgwụ, a zọpụta anyị.—Maị. 7:7. w23.08 22 ¶7
Tuzdee, Jun 10
E ji ígwè na ụrọ kpụọ mkpịsị ụkwụ ya.—Dan. 2:42.
Anyị leruo amụma dị na Daniel 2:41-43 na amụma ndị ọzọ dị n’akwụkwọ Daniel na akwụkwọ Mkpughe anya, anyị ga-aghọta na ụkwụ ahụ nọchiri anya ọchịchị Briten na Amerịka bụ́ ọchịchị kacha akpa ike n’ụwa taa. Daniel kwuru na “alaeze ahụ ga-esitụ ike n’ebe ụfọdụ, ma ọ gaghị esi ike n’ebe ụfọdụ.” Gịnị mere na ọ gaghị esi ike n’ebe ụfọdụ? Ọ bụ n’ihi na ndị nkịtị, bụ́ ndị ụrọ ahụ na-esighị ike nọchiri anya ha, na-eme ka ọ ghara ịna-akpa ike ka ígwè. Anyị ga-amụta ọtụtụ eziokwu dị mkpa n’otú Daniel si kọwaa ihe ahụ a kpụrụ akpụ Nebukadneza rọrọ ná nrọ. Nke mbụ, ọchịchị Briten na Amerịka esila n’ụzọ ụfọdụ gosi na ha dị ike. Dị ka ihe atụ, ha so ná mba ndị meriri n’Agha Ụwa nke Mbụ na n’Agha Ụwa nke Abụọ. Ma, ọchịchị a esighịzi ike otú o siburu. Ọ ga-adịkwa otú ahụ na-aga n’ihi na ụmụ amaala obodo ndị ahụ na-alụso ibe ha nakwa ọchịchị ahụ ọgụ. Nke abụọ, ọchịchị abụọ a gbakọrọ aka ọnụ ga-abụ ọchịchị ikpeazụ ga-achị ụwa tupu Alaeze Chineke abịa bibie ọchịchị ụmụ mmadụ niile. w23.08 10-11 ¶12-13
Wenezdee, Jun 11
N’oge m na-ata ahụhụ, m kpọrọ Jehova ka o nyere m aka, m nọ na-ebesara Chineke m ákwá ka o nyere m aka. Ọ nọ n’ụlọ nsọ ya nụ olu m.—Ọma 18:6.
Mgbe ụfọdụ, ike na-agwụ Devid n’ihi nsogbu na ọnwụnwa ndị na-abịara ya. (Ọma 18:4, 5) N’agbanyeghị ya, otú Jehova si hụ ya n’anya ma na-elekọta ya mere ka o nweta ume. Jehova du enyi ya a ike gwụrụ gaa “n’ebe ahịhịa ndụ juru” nakwa “n’ebe a na-ezu ike nke dị n’akụkụ mmiri.” Ihe a mere ka Devid nwetaghachi ike, meekwa ka o jiri ọṅụ fere Jehova na-aga. (Ọma 18:28-32; 23:2) Taakwa, “ọ bụ ịhụnanya Jehova mere na anyị anwụchabeghị” mgbe ọnwụnwa na ihe isi ike na-abịara anyị. (Ákwá 3:22; Kọl. 1:11) E nwere ọtụtụ mgbe a chọrọ igbu Devid. O nwekwara ọtụtụ ndị iro siri ike. Ma, otú Jehova si hụ ya n’anya mere ka obi ruo ya ala, obi esiekwa ya ike na aka agaghị akpara ya. Devid chọpụtara na Jehova nọnyeere ya n’ọnọdụ ọ bụla ọ nọ na ya. Ihe a mekwara ka obi sie ya ike. Ọ bụ ya mere o ji bụọ abụ, sị: “[Jehova] napụtara m n’ihe niile na-emenye m ụjọ.” (Ọma 34:4) Ọ bụ eziokwu na e nwere oge ndị ezigbo ụjọ ji Devid, ma ọ kwụsịrị ịtụ ụjọ n’ihi na ọ ma na Jehova hụrụ ya n’anya. w24.01 30 ¶15-17
Tọzdee, Jun 12
Ọ bụrụ na ndị mmehie agbawa mbọ ka ha rata gị, ekwela.—Ilu 1:10.
Mụta ihe n’ihe ndị na-adịghị mma Jehoash mere. Mgbe Jehoyada bụ́ nnukwu onye nchụàjà nwụchara, Jehoash metara ndị na-abụghị ndị ezigbo mmadụ enyi. (2 Ihe 24:17, 18) Ọ malitere ige ntị na ndụmọdụ ndị isi ndị Juda bụ́ ndị na-ahụghị Jehova n’anya nyere ya. Ọ ga-abụ na i kwetara na ọ gaara akara Jehoash mma ma ọ bụrụ na o zeere ndị ahụ n’ihi na ha na-eme ihe na-adịghị mma. Kama ime otú ahụ, o gere ndụmọdụ ọjọọ ha nyere ya ntị. Nke bụ́ eziokwu bụ na mgbe Zekaraya nwa nwanne nna Jehoash chọrọ ịgbazi ya, Jehoash nyedịrị iwu, e gbuo ya. (2 Ihe 24:20, 21; Mat. 23:35) Ihe ahụ o mere jọgburu onwe ya, bụrụkwa ịda iberiibe. Jehoash malitere ime nke ọma mgbe ọ dị obere. Ma, o mechara kwụsị ife Jehova, ghọọkwa ogbu mmadụ. N’ikpeazụ, ndị na-ejere ya ozi gburu ya. (2 Ihe 24:22-25) Ihe gaara akara ya mma ma ọ bụrụ na ọ kwụsịghị ige Jehova na ndị hụrụ Jehova n’anya ntị. w23.09 9 ¶6
Fraịdee, Jun 13
Kwụsị ịtụ egwu.—Luk 5:10.
Jizọs ghọtara na Pita nwere ike ịnọsi ike n’ofufe Jehova. N’ihi ya, Jizọs weturu obi gwa Pita ka ọ “kwụsị ịtụ egwu.” Otú Jizọs si gosi Pita na ọ tụkwasịrị ya obi gbanwere ndụ Pita. Pita na nwanne ya nwoke bụ́ Andru mechara hapụ ọrụ igbu azụ̀ ha na-arụ ma jiri oge ha niile na-eso ụzọ Mezaya. Ihe a ha kpebiri ime mere ka Chineke gọzie ha ngọzi na-enweghị atụ. (Mak 1:16-18) E nwere ọtụtụ ihe magburu onwe ha Pita hụrụ mgbe ọ na-eso ụzọ Jizọs. Ọ hụrụ ka Jizọs gwọrọ ndị ọrịa, chụpụ ndị mmụọ ọjọọ, kpọlitedị ndị nwụrụ anwụ. (Mat. 8:14-17; Mak 5:37, 41, 42) Pita hụkwara ọhụụ otú Jizọs ga-esi adị ebube n’Alaeze ya n’ọdịnihu. Ihe a Pita hụrụ bụ ihe ọ na-agaghị echefu echefu. (Mak 9:1-8; 2 Pita 1:16-18) N’eziokwu, Pita agaraghị ahụ ihe ndị ahụ ma ọ bụrụ na ọ bụghị onye na-eso ụzọ Jizọs. O doro anya na obi tọgburu ya atọgbu na o kweghị ka otú na-adịghị mma o si ele onwe ya anya mee ka ihe ndị a kwaa ya. w23.09 21 ¶4-5
Satọdee, Jun 14
Jizọs sịrị ya: “Mba, ọ bụghị ugboro asaa, kama, ugboro iri asaa na asaa.”—Mat. 18:22.
N’akwụkwọ ozi mbụ Pita onyeozi dere, o kwuru na ‘iji obi anyị niile hụ ibe anyị n’anya’ ga-eme ka anyị gbaghara ihe ọjọọ niile ha mere anyị, ọ bụghị ụfọdụ n’ime ha. (1 Pita 4:8) O nwere ike ịbụ na Pita chetara ihe Jizọs kụziiri ya ọtụtụ afọ tupu mgbe ahụ gbasara ịgbaghara mmadụ. Ọ ga-abụ na Pita chere na ya bụ ezigbo mmadụ mgbe o kwuru na ọ ga-agbaghara nwanna ya ruo “ugboro asaa.” Ma, Jizọs kụziiri ya, kụziekwara anyị ka anyị na-agbaghara ruo “ugboro iri asaa na asaa,” nke pụtara ka anyị ghara ịkwụsị ịgbaghara. (Mat. 18:21) Ọ bụrụ na ọ na-esiri gị ike ime ihe a, adala mbà. A na-enwe mgbe ọ na-esiri ndị ohu Jehova niile na-ezughị okè ike ịgbaghara ndị mejọrọ ha. Ihe dị mkpa ugbu a bụ ka i mee ike gị niile ịgbaghara nwanna gị ma mee ka gị na ya dịrị n’udo. w23.09 29 ¶12
Sọnde, Jun 15
M [kpọrọ] Jehova, ya aza m. —Jona 2:2.
Mgbe Jona nọ n’afọ azụ̀, obi siri ya ike na Jehova ga-anụ ekpere ya nakwa na ọ ga-enyere ya aka. Jehova mechara mee ka azụ̀ ahụ gbọpụta Jona n’elu ala. Ọ dịzi njikere ịnabata ọrụ Jehova nyere ya ma rụọ ya. (Jona 2:10–3:4) Ọ̀ na-esiri gị ike ikpe ekpere kọọrọ Jehova otú obi dị gị ma nsogbu bịara gị, ka ike ọ̀ na-agwụ gị ịmụ ihe? Cheta na Jehova ma nnọọ otú ọ dị gị. N’ihi ya, ọ bụrụgodị na ọ bụ obere ihe ka i kwuru n’ekpere, obi kwesịrị isi gị ike na Jehova ga-enye gị ihe dị gị mkpa. (Efe. 3:20) Ọ bụrụ na ọ na-esiri gị ike ịgụ ihe ma ọ bụ ịmụ ihe n’ihi na ị na-arịa ọrịa, ike na-agwụ gị, ma ọ bụkwanụ na ị na-echegbu onwe gị, i nwere ike ige Baịbụl ma ọ bụ akwụkwọ ndị anyị ji amụ Baịbụl nke a na-egere egere. Ihe ọzọ nwere ike ịbara gị uru bụ ige abụ Alaeze anyị ma ọ bụ ile vidio dị na jw.org. Jehova ga-eme ka ị dị ike ma ọ bụrụ na i kpee ekpere ma na-achọ azịza ekpere gị ahụ na Baịbụl nakwa n’ihe ndị ọzọ ọ na-enye anyị. w23.10 13 ¶6; 14 ¶9
Mọnde, Jun 16
Mmụọ nsọ si otú a mee ka o doo anya na e mebeghị ka a mata ụzọ e si abanye n’ebe nsọ mgbe ụlọikwuu nke mbụ ka dị.—Hib. 9:8.
Otú e si rụọ ime ụlọikwuu ahụ na otú e si rụọ ụlọ nsọ ndị e mechara rụọ na Jeruselem yiri. N’ime ha, e nwere nkebi abụọ, ya bụ, “Ebe Nsọ” na “Ebe Kacha Nsọ.” Ihe kewara ha abụọ bụ ákwà mgbochi a kpara akpa. (Hib. 9:2-5; Ọpụ. 26:31-33) N’ime Ebe Nsọ ahụ, e nwere ihe e ji ọlaedo rụọ e ji adọsa ọkụ, ebe ịchụàjà a ga na-amụ insens na ya, na tebụl a na-edosa achịcha a na-enye Jehova. Ọ bụ naanị “ndị nchụàjà e tere mmanụ” na-abanye n’Ebe Nsọ ịrụ ọrụ ha dị nsọ. (Ọnụ Ọgụ. 3:3, 7, 10) Ihe dị n’Ebe Kacha Nsọ bụ igbe ọgbụgba ndụ e ji ọlaedo mee, nke na-egosi na Jehova nọ ebe ahụ. (Ọpụ. 25:21, 22) Ọ bụ naanị nnukwu onye nchụàjà na-agafe ákwà mgbochi ahụ banye n’ime Ebe Kacha Nsọ otu ugboro n’afọ n’Ụbọchị Mkpuchi Mmehie. (Lev. 16:2, 17) Ọ na-eji ọbara anụmanụ abanye n’Ebe Kacha Nsọ ka o kpuchie mmehie nke ya na nke ndị Izrel niile. Jehova mechara mee ka a ghọta ihe ihe ndị a dị n’ụlọikwuu ahụ nọchiri anya ha.—Hib. 9:6, 7. w23.10 27 ¶12
Tuzdee, Jun 17
Ka unu na-ahụ ibe unu n’anya. —Jọn 15:17.
Na Baịbụl, e nyere anyị iwu ugboro ugboro ka anyị ‘hụ ibe anyị n’anya.’ (Jọn 15:12, 17; Rom 13:8; 1 Tesa. 4:9; 1 Pita 1:22; 1 Jọn 4:11) Ma, ọ bụ obi anyị ka anyị na-eji ahụ mmadụ n’anya. Ndị mmadụ anaghịkwa ahụ ihe dị n’obi anyị. N’ihi ya, olee otú anyị ga-esi eme ka ndị ọzọ mata na anyị hụrụ ha n’anya? Ọ bụ n’okwu ọnụ anyị na n’omume anyị. E nwere ọtụtụ ụzọ anyị nwere ike isi gosi ụmụnna anyị na anyị hụrụ ha n’anya. Ụfọdụ n’ime ha bụ: “Na-agwanụ ibe unu eziokwu.” (Zek. 8:16) “Unu na ibe unu na-adị n’udo.” (Mak 9:50) “Na-ebunụ ụzọ asọpụrụ ndị ọzọ.” (Rom 12:10) “Na-anabatanụ ibe unu.” (Rom 15:7) ‘Na-agbagharanụ ibe unu.’ (Kọl. 3:13) “Na-eburịtanụ ibu arọ ibe unu.” (Gal. 6:2) ‘Na-akasinụ ibe unu obi.’ (1 Tesa. 4:18) “Na-emenụ ka ibe unu dị ike.” (1 Tesa. 5:11) “Na-ekpekwaranụ ibe unu ekpere.”—Jems 5:16. w23.11 9 ¶7-8
Wenezdee, Jun 18
Na-aṅụrịnụ ọṅụ n’ihi olileanya unu nwere.—Rom 12:12.
Kwa ụbọchị, e nwere ihe ndị anyị na-ekpebi mere o ji dị mkpa ka anyị nwee okwukwe siri ike. Dị ka ihe atụ, anyị na-ekpebi ihe ndị gbasara ndị anyị na ha ga na-akpa, ihe anyị ji atụrụ ndụ, agụmakwụkwọ, alụmdi na nwunye, ụmụ, nakwa ọrụ. Anyị kwesịrị ịjụ onwe anyị, sị: ‘Ihe m kpebiri ime ọ̀ na-egosi na m kwetasiri ike na ụwa ochie a agaghị adịte aka, nakwa na n’oge na-adịghị anya, ụwa ọhụrụ Chineke ga-abịa nọchie ya? Ka ihe m na-ekpebi ọ̀ na-egosi na m na-ebi ndụ ka ndị kweere na mmadụ nwụọ, na nke ya agaala kpamkpam?’ (Mat. 6:19, 20; Luk 12:16-21) Ihe ga-eme ka anyị mee mkpebi kacha mma bụ ma ọ bụrụ na okwukwe anyị esie ezigbo ike na ụwa ọhụrụ dị nso. Anyị kwesịrị inwe okwukwe siri ezigbo ike iji die nsogbu ndị na-abịara anyị. E nwere ike ịna-akpagbu anyị ma ọ bụ anyị ana-arịa ọrịa na-ekweghị ala ala, ma ọ bụkwanụ anyị enwee nsogbu ndị ọzọ nwere ike ime ka anyị daa mbà. Na mbụ, o nwere ike ịdị anyị ka ànyị ga-edili nsogbu ahụ. Mana, ọ bụrụ na nsogbu ahụ anọtee aka, otú ahụ ọtụtụ nsogbu na-eme, anyị kwesịrị inwe okwukwe siri ike ka anyị nwee ike idi ya, jirikwa ọṅụ na-efe Jehova.—1 Pita 1:6, 7. w23.04 27 ¶4-5
Tọzdee, Jun 19
Na-ekpenụ ekpere mgbe niile. —1 Tesa. 5:17.
Jehova na-atụ anya ka anyị mee ihe dabara n’ekpere anyị. Dị ka ihe atụ, nwanna nwere ike ịgwa Jehova ka o mee ka onye ọ na-arụrụ ọrụ nye ya oge ọ ga-eji aga mgbakọ ukwu. Olee otú Jehova nwere ike isi aza ekpere ya? O nwere ike ime ka nwanna ahụ nwee obi ike ọ ga-eji gakwuru onye ọ na-arụrụ ọrụ. Ma, ọ bụ nwanna ahụ ka ọ dị n’aka ịgakwuru onye ọ na-arụrụ ọrụ ma gwa ya ihe ọ chọrọ ka e meere ya. O nwere ike ịrịọ onye ọ na-arụrụ ọrụ ọtụtụ ugboro. O nwedịrị ike ikwu ka onye ọrụ ibe ya rụchitere ya, e mechaa, ya arụọ nke onye ahụ, ma ọ bụkwanụ kwuo ka a ghara ịkwụ ya ụgwọ n’oge ahụ ọ na-agaghị anọ ya. Jehova chọrọ ka anyị na-ekpe ekpere ọtụtụ ugboro gbasara ihe ndị dị anyị mkpa. Ihe Jizọs kwuru gosiri na ọ bụghị ihe niile anyị kpere n’ekpere ka a ga-emere anyị ozugbo. (Luk 11:9) N’ihi ya, adala mbà. Na-ekpesi ekpere ike, na-ekpekwa ya ọtụtụ ugboro. (Luk 18:1-7) Ọ bụrụ na anyị emee otú ahụ, anyị na-egosi Jehova na ihe ahụ anyị rịọrọ ya dị anyị ezigbo mkpa. Ọ na-egosikwa na anyị nwere okwukwe na Jehova ga-enyeliri anyị aka. w23.11 22 ¶10-11
Fraịdee, Jun 20
Olileanya a anaghị emenye anyị ihere.—Rom 5:5.
Jehova kwere enyi ya Ebreham nkwa na ọ ga-amụta nwa a ga-esi n’aka ya gọzie mba niile dị n’ụwa. (Jen. 15:5; 22:18) Ebe ọ bụ na Ebreham nwere okwukwe siri ike na Chineke, obi siri ya ezigbo ike na nkwa Chineke kwere ya ga-emezu. N’agbanyeghị ya, mgbe Ebreham dị otu narị (100) afọ, nwunye ya adịrị iri afọ itoolu, ha amụtabeghị nwa ọ bụla. (Jen. 21:1-7) Ma, Baịbụl kwuru na Ebreham “nwere okwukwe na ya ga-abụ nna ọtụtụ mba otú e kwuru ya.” (Rom 4:18) Ị manụ na ihe Ebreham nwere olileanya ya mechara mezuo. Ọ mụtara Aịzik, bụ́ nwa nwoke ọ na-atụ anya ya kemgbe. Gịnị mere obi ji sie Ebreham ike na Jehova ga-emezu nkwa ya? Ebreham ma Jehova nke ọma. Ọ bụ ya mere ‘obi ji sie ya ezigbo ike na Chineke ga-eme ihe o kwere ná nkwa.’ (Rom 4:21) Ihe Ebreham masịrị Jehova, ya akpọọ ya onye ezi omume n’ihi na o nwere okwukwe.—Jems 2:23. w23.12 8 ¶1-2
Satọdee, Jun 21
Onye kwesịrị ntụkwasị obi n’ihe kacha nta kwesịkwara ntụkwasị obi n’oké ihe. Onye bụ́ onye ajọ omume n’ihe kacha nta bụkwa onye ajọ omume n’oké ihe.—Luk 16:10.
Nwa okorobịa a ga-atụkwasịli obi na-arụsi ọrụ ọ bụla e nyere ya ike. Chegodị banyere otú na-enweghị atụ Jizọs si mee ya. O nweghị mgbe o leghaara ọrụ ya anya ma ọ bụ jiri ya gwuo egwu. Kama ime otú ahụ, ọ rụrụ ọrụ niile Jehova nyere ya, ma mgbe o siiri ya ike ime otú ahụ. Ọ hụrụ ndị mmadụ n’anya, nke ka nke, ndị na-eso ụzọ ya, jirikwa obi ya niile were ndụ ya chụọ àjà maka ha. (Jọn 13:1) Na-eme ka Jizọs. Otú ị ga-esi na-eme ya bụ ịna-agbasi mbọ ike ịrụ ọrụ ọ bụla e nyere gị. Ọ bụrụ na ị maghị otú ị ga-esi arụ ya, dịrị umeala n’obi ma rịọ ụmụnna tozuru etozu ka ha nyere gị aka. Arụkwala ọrụ e nyere gị naanị iji mezuo iwu. (Rom 12:11) Kama ime otú ahụ, e nye gị ọrụ, rụruo ya n’isi. Na-eme ya ‘dị ka ị̀ na-emere ya Jehova, ọ bụghị mmadụ.’ (Kọl. 3:23) Nke bụ́ eziokwu bụ na ebe ọ bụ na i zughị okè, i kwesịrị ịma ebe ike gị ruru. I mejọọkwa ihe, kweta na i mejọrọ.—Ilu 11:2. w23.12 26 ¶8
Sọnde, Jun 22
A ga-agọzi onye tụkwasịrị Jehova obi.—Jere. 17:7.
Obi na-atọ anyị ụtọ ma anyị mee baptizim ma ghọọ ndị ezinụlọ Jehova. Ọ bụ ezigbo ihe ọma meere ndị ha na Jehova dị ná mma. Anyị kwetakwara ihe ọbụ abụ bụ́ Devid kwuru. Ọ sịrị: “Onye ị họọrọ ma kpọta nso ka o biri n’ogige ụlọ gị na-enwe obi ụtọ.” (Ọma 65:4) Ọ bụghị onye ọ bụla Jehova hụrụ ka ọ na-akpọbata n’ezinụlọ ya. Ọ na-ahọrọ ndị gosiri na ha chọrọ ka ha na ya dịrị n’ezigbo mma. (Jems 4:8) I nyefee Jehova onwe gị ma mee baptizim, obi kwesịrị isi gị ike na i mechaa baptizim, Jehova ‘ga-awụsa gị ngọzi ruo mgbe ihe ọ bụla na-agaghị akọ gị.’ (Mal. 3:10; Jere. 17:8) Ime baptizim bụ otú i si amalite iji ndụ gị ejere Jehova ozi. Ị ga-achọ ime ike gị niile imezu nkwa i kwere Jehova mgbe i nyefere ya onwe gị ọ bụrụgodị na ọnwụnwa ma ọ bụ nsogbu abịara gị. (Ekli. 5:4, 5) Ebe ị bụ onye na-eso ụzọ Jizọs, ị ga na-esosi Jizọs ike ma na-agbasi mbọ ike idebe iwu ya.—Mat. 28:19, 20; 1 Pita 2:21. w24.03 8 ¶1-3
Mọnde, Jun 23
Nwoke [ga-ahapụ] nne ya na nna ya ma rapara n’ahụ́ nwunye ya. —Jen. 2:24.
Olee ihe gị na di gị ma ọ bụ nwunye gị ga-eme ma ọ bụrụ na ọ naghị atọ unu ụtọ ịnọkọ ọnụ? Chegodị gbasara ọkụ. A kwanye ọkụ, ọ naghị enwusi ike ozugbo ahụ. A ga-eji nwayọọ nwayọọ na-etinye ya nkụ ndị bukwuru ibu ka o nwee ike ịna-enwu. Otú ahụkwa ka ọ dị di na nwunye. Otú unu nwere ike isi ebido bụ iwepụta obere oge unu ga-eji na-anọkọ kwa ụbọchị. Hụnụ na ihe unu ga-eme bụ ihe na-atọ unu ụtọ. (Jems 3:18) Unu bido nwayọọ nwayọọ, o nwere ike ime ka onye nke ọ bụla bidokwa ịhụ ibe ya n’anya. Di na nwunye kwesịrị ịna-akwanyere ibe ha ùgwù. Nkwanye ùgwù dị ka ikuku nke na-eme ka ọkụ na-enwusi ike. Ọ bụrụ na ikuku adịghị, ọkụ ga-anyụ ozugbo. Ọ bụrụkwa na di na nwunye anaghị akwanyere ibe ha ùgwù, ha ga-achọpụta na ịhụnanya ha nwere ike ịjụ oyi n’egbughị oge. Ma, ọ bụrụ na di na nwunye agbaa mbọ na-akwanyere ibe ha ùgwù, ọ ga-eme ka ha na-ahụkwu ibe ha n’anya. Ma, cheta na ihe dị mkpa abụghị gịnwa iche na ị na-akwanyere di gị ma ọ bụ nwunye gị ùgwù, kama, ọ bụ ma yanwa ọ̀ ghọtara na ị na-akwanyere ya ùgwù. w23.05 22 ¶9; 24 ¶14-15
Tuzdee, Jun 24
Mgbe m nọ na-echegbu onwe m, ị kasiri m obi ma mee ka ahụ́ ruo m ala.—Ọma 94:19.
Na Baịbụl, e nwere ndị ohu Jehova kwuru banyere oge ndị obi na-adịghị ha mma, ụjọ ana-atụkwa ha n’ihi ndị iro ha ma ọ bụ nsogbu ndị ọzọ. (Ọma 18:4; 55:1, 5) Taakwa, e nwere ike ịna-emegide anyị n’ụlọ akwụkwọ, n’ụlọ ọrụ, n’ezinụlọ anyị, ma ọ bụkwanụ ndị ọchịchị ana-akpagbu anyị. Anyị nwekwara ike ịtụ ụjọ na anyị ga-anwụ n’ihi ọrịa na-arịa anyị. O nwere ike ịdị anyị ka e nweghị onye ga-enyeliri anyị aka otú ahụ ọ na-adị ụmụaka. Olee otú Jehova si enyere anyị aka n’ụdị oge ndị a? Ọ na-akasi anyị obi, na-emekwa ka ahụ́ ruo anyị ala. N’ihi ya, na-ekpe ekpere mgbe niile. Na-agụkwa Okwu Chineke. (Ọma 77:1, 12-14) Ọ bụrụ na nsogbu abịara gị, ihe mbụ ga-abata gị n’obi nwere ike ịbụ ikpe ekpere kọọrọ Nna gị nke eluigwe ihe na-echegbu gị. Gwa Jehova ihe na-atụ gị ụjọ na ihe na-echegbu gị. Na-agụ Akwụkwọ Nsọ ma gee Chineke ntị. Ị ga-ahụ otú ọ ga-esi kasie gị obi.—Ọma 119:28. w24.01 24-25 ¶14-16
Wenezdee, Jun 25
Ọ bụ Chineke na-enye unu ume . . . Ọ na-eme ka unu nwee mmasị ime ihe, na-enyekwa unu ike unu ji eme ya.—Fil. 2:13.
Ihe ga-enyere mmadụ aka ime ihe ndị o kpebiri ime n’ofufe Jehova bụ ma ọ na-agụsi ya agụụ ike ime ha. Onye ọ na-agụsi agụụ ike ime ihe o kpebiri na-agba ezigbo mbọ ka o nwee ike ime ihe ahụ. Ọ bụrụ na ọ na-agụsi anyị agụụ ike ime ihe anyị kpebiri ime n’ofufe Jehova, anyị nwere ike ime ya. N’ihi ya, gịnị ka ị ga-eme ka ihe i kpebiri ime na-agụsikwu gị agụụ ike? Kpee ekpere ka Jehova mee ka ọ gụsikwuo gị agụụ ike. Jehova nwere ike iji mmụọ nsọ ya nyere gị aka ka ọ na-agụsi gị agụụ ike ime ihe i kpebiri ime n’ofufe ya. Mgbe ụfọdụ, anyị na-ekpebi ihe anyị chọrọ ime n’ofufe Jehova n’ihi na anyị ma na ọ bụ ihe anyị kwesịrị ime. Ime otú ahụ adịghị njọ. Ma, o nwere ike ịbụ na ọ naghị agụ anyị agụụ ime ya. Chebara ihe Jehova meere gị echiche. (Ọma 143:5) Pọl onyeozi chebaara amara Jehova meere ya echiche. O mekwara ka ọ rụsiere Jehova ọrụ ike. (1 Kọr. 15:9, 10; 1 Tim. 1:12-14) Ọ bụrụkwa na ị na-echebara ihe ndị Jehova meere gị echiche, ọ ga-eme ka ị chọọ ime ihe i kpebiri ime n’ofufe ya.—Ọma 116:12. w23.05 27 ¶3-5
Tọzdee, Jun 26
Toonụ aha Jehova.—Ọma 113:1.
Anyị na-eme ka obi Nna anyị nke eluigwe ṅụrịa ma anyị na-eto aha ya. (Ọma 119:108) Ma, ihe a ọ̀ pụtara na Chineke pụrụ ime ihe niile dị ka ụmụ mmadụ na-ezughị okè, ndị na-achọ ka e towe ha n’ihi na ha chọrọ ihe ga-agba ha ume? Mba. Ọ bụrụ na anyị ana-eto Nna anyị nke eluigwe, anyị na-enye aka egosi na ihe ọzọ Setan kwuru gbasara onye ọ bụla n’ime anyị bụ ụgha. Setan kwuru na o nweghị mmadụ ga-eji obi ya niile gbachitere aha Chineke. O kwuru na e nweghị mmadụ ọ bụla ga na-erubere Chineke isi ma ọnwụnwa bịara ya, na mmadụ ga-akwụsị ife Chineke ma onye ahụ chee na ime otú ahụ ga-abara ya uru. (Job 1:9-11; 2:4) Ma, Job, bụ́ nwoke kwesịrị ntụkwasị obi, gosiri na ihe ahụ Setan kwuru bụ ụgha. Oleekwanụ gbasara gị? Onye ọ bụla n’ime anyị nwere ike ịgbachitere Nna anyị nke eluigwe ma mee ya obi ụtọ. Otú anyị ga-esi eme ya bụ iji obi anyị niile na-efe ya. (Ilu 27:11) Ọ bụ ezigbo ihe ọma meere anyị ime otú ahụ. w24.02 8-9 ¶3-5
Fraịdee, Jun 27
Tụkwasịnụ ndị amụma ya obi, ka ihe wee gaziere unu.—2 Ihe 20:20.
Mgbe Mosis na Joshụa nwụchara, Jehova họpụtara ndị ikpe ka ha na-eduzi ndị ya. Mgbe e mechakwara, n’oge ndị eze, Jehova họpụtara ndị amụma ga na-eduzi ndị ya. Ndị eze rubeere Jehova isi gere ndị amụma ntị. Dị ka ihe atụ, Eze Devid wedara onwe ya ala ma nabata aka ná ntị Netan dọrọ ya. (2 Sam. 12:7, 13; 1 Ihe 17:3, 4) Eze Jehoshafat kwere ka onye amụma bụ́ Jahazayel duzie ya ma gbaa ndị Juda ume ka ha tụkwasị “ndị amụma [Chineke] obi.” (2 Ihe 20:14, 15) N’oge Eze Hezekaya nọ ná nsogbu, ọ gwara Aịzaya onye amụma ka o nyere ya aka. (Aịza. 37:1-6) Mgbe ọ bụla ndị eze sooro nduzi Jehova, Jehova na-agọzi ha, chebekwa ndị ya. (2 Ihe 20:29, 30; 32:22) O doro anya na Jehova ji ndị amụma ya na-eduzi ndị ya. w24.02 21 ¶8
Satọdee, Jun 28
Ka a ghara inwe ihe ọ bụla ga-ejikọ unu na ha.—Efe. 5:7.
Setan chọrọ ka anyị na ndị ga-eme ka o siere anyị ike idebe iwu Jehova na-akpa. Anyị kwesịrị icheta na ndị anyị na ha na-akpa abụghị naanị ndị anyị na ha na-anọ ihu na ihu. Ndị anyị na ha na-ekwurịta okwu n’ebe a na-ezirịta ozi n’Ịntanet sokwa na ha. Anyị kwesịrị ịgbasi mbọ ike zere ihe ndị ụwa na-eche, nke bụ́ na o nweghị ihe omume rụrụ arụ mere. Anyị ma na ọ dị njọ. (Efe. 4:19, 20) Anyị kwesịrị ịjụ onwe anyị, sị: ‘M̀ na-akpachara anya ka mụ na ndị ọrụ ibe m, ụmụ akwụkwọ ibe m, ma ọ bụkwanụ ndị ọzọ na-anaghị erubere iwu Jehova isi ghara ịna-akpa? M̀ na-akata obi na-eme ihe Jehova chọrọ ọ bụrụgodị na ụfọdụ ndị na-akatọ m maka ya?’ Dị ka e kwuru na 2 Timoti 2:20-22, o nwekwara ike ịdị mkpa ka anyị kpachara anya mgbe anyị na-ahọrọ ndị anyị na ha ga na-akpachi anya n’ọgbakọ. Anyị kwesịrị iburu n’uche na ọ bụghị ha niile ga-enyere anyị aka ịnọsi ike n’ofufe Jehova. w24.03 22-23 ¶11-12
Sọnde, Jun 29
Ihe gbasara onye ọzọ na-emetụ Jehova n’obi.—Jems 5:11.
È nwetụla mgbe ị gbalịrị iche otú Jehova dị? Ọ bụ eziokwu na anyị anaghị ahụ Jehova anya, Baịbụl si ụzọ dị iche iche kọwaa ya. A kpọrọ Jehova “anyanwụ” na “ọta” nakwa “ọkụ na-erechapụ ihe.” (Ọma 84:11; Hib. 12:29) N’ọhụụ Ezikiel hụrụ, o kwuru na Jehova dị ka nkume safaya, ọla na-egbu maramara, na eke na egwurugwu na-enwu gbaa. (Ezik. 1:26-28) Ebe ọ bụ na anyị anaghị ahụ Jehova anya, o nwere ike isiri anyị ike ikweta na ọ hụrụ anyị n’anya. Ụfọdụ ndị nwere ike iche na Jehova agaghị ahụli ha n’anya n’ihi ihe ndị mere ná ndụ ha n’oge gara aga. Jehova na-aghọta otú ihe ndị a na-adị anyị nakwa otú ha si akpa anyị aka. Iji nyere anyị aka, ọ kọwaara anyị àgwà ya ndị magburu onwe ha na Baịbụl. Otu okwu kacha daba adaba iji kọwaa Jehova bụ ịhụnanya. (1 Jọn 4:8) Chineke bụ ịhụnanya. Ọ bụ ịhụnanya na-eme ka ọ na-eme ihe niile ọ na-eme. Ịhụnanya Jehova siri ezigbo ike nke na ndị ọ na-ahụ n’anya abụghị naanị ndị hụrụ ya n’anya.—Mat. 5:44, 45. w24.01 26 ¶1-3
Mọnde, Jun 30
O si n’ogidi ígwé ojii gwa ha okwu.—Ọma 99:7.
Jehova họpụtara Mosis ka o duru ndị Izrel pụọ n’Ijipt. O nyekwara ha ogidi ígwé ojii n’ehihie na ogidi ọkụ n’abalị ha na-ahụ anya. (Ọpụ. 13:21) Mosis sooro ogidi ahụ, ya eduru ya na ndị Izrel gawa n’Oké Osimiri Uhie. Ma ndị Ijipt nọ na-achụ ndị Izrel. N’ihi ya, ụjọ tụrụ ndị Izrel n’ihi na ha chere na ndị Ijipt ga-egbu ha. Mana, ihe a Mosis mere abụghị imehie ihe. Jehova ma ụma si n’aka Mosis duru ndị ya gaa n’ebe ahụ. (Ọpụ. 14:2) Jehova napụtaziri ndị ya n’ụzọ dị ịtụnanya. (Ọpụ. 14:26-28) Mgbe ihe a mechara, Mosis ka tụkwasịkwara Jehova obi na o ji ogidi ígwé ojii na-edu ndị Chineke n’ọzara ruo afọ iri anọ. (Ọpụ. 33:7, 9, 10) Jehova si n’ogidi ahụ gwa Mosis okwu, ya agwazie ndị Izrel ihe Jehova kwuru. Ndị Izrel ji anya ha na-ahụ na Jehova ji Mosis na-eduzi ha. w24.02 21 ¶4-5