Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • es25 p. 67-77
  • Julaị

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Julaị
  • Inyocha Akwụkwọ Nsọ Kwa Ụbọchị—2025
  • Isiokwu Nta
  • Tuzdee, Julaị 1
  • Wenezdee, Julaị 2
  • Tọzdee, Julaị 3
  • Fraịdee, Julaị 4
  • Satọdee, Julaị 5
  • Sọnde, Julaị 6
  • Mọnde, Julaị 7
  • Tuzdee, Julaị 8
  • Wenezdee, Julaị 9
  • Tọzdee, Julaị 10
  • Fraịdee, Julaị 11
  • Satọdee, Julaị 12
  • Sọnde, Julaị 13
  • Mọnde, Julaị 14
  • Tuzdee, Julaị 15
  • Wenezdee, Julaị 16
  • Tọzdee, Julaị 17
  • Fraịdee, Julaị 18
  • Satọdee, Julaị 19
  • Sọnde, Julaị 20
  • Mọnde, Julaị 21
  • Tuzdee, Julaị 22
  • Wenezdee, Julaị 23
  • Tọzdee, Julaị 24
  • Fraịdee, Julaị 25
  • Satọdee, Julaị 26
  • Sọnde, Julaị 27
  • Mọnde, Julaị 28
  • Tuzdee, Julaị 29
  • Wenezdee, Julaị 30
  • Tọzdee, Julaị 31
Inyocha Akwụkwọ Nsọ Kwa Ụbọchị—2025
es25 p. 67-77

Julaị

Tuzdee, Julaị 1

Ọ gazuru ala ahụ na-eme ihe ọma ma na-agwọ ndị [mmadụ ọrịa]. ​—Ọrụ 10:38.

Ihe niile Jizọs kwuru na ihe niile o mere, ma ọrụ ebube ndị ọ rụrụ, gosiri na ọ na-eche echiche ka Nna ya, obi ana-adịkwa ya otú ọ na-adị Nna ya. (Jọn 14:9) Olee ihe anyị ga-amụta n’ọrụ ebube ndị Jizọs rụrụ? Jizọs na Nna ya hụrụ anyị n’anya nke ukwuu. Mgbe Jizọs nọ n’ụwa, otú o si gosi na ọ hụrụ ndị mmadụ n’anya nke ukwuu bụ ịrụ ọrụ ebube nyere ndị na-ata ahụhụ aka. N’otu oge, ụmụ nwoke abụọ kpuru ìsì rịọrọ ya ka o nyere ha aka. (Mat. 20:30-34) Ị̀ chọpụtara na “Jizọs meteere ha ebere,” gwọọkwa ha? Okwu Grik a sụgharịrị “meteere ha ebere” ebe a na-egosi na o nweere ha ezigbo ọmịiko. Ụdị ọmịiko a Jizọs nweere ha gosiri na ọ hụrụ ha n’anya. Ọ bụkwa ụdị ọmịiko a mere Jizọs ji nye ndị agụụ na-agụ nri, gwọọkwa onye ekpenta. (Mat. 15:32; Mak 1:41) Obi kwesịrị isi anyị ike na Jehova bụ́ Chineke “obi ebere” na Ọkpara ya hụrụ anyị n’anya nke ukwuu. Ahụhụ anyị na-ata na-ewutekwa ha. (Luk 1:78; 1 Pita 5:7) Ọ na-agụsi ha agụụ ike ime ka ahụhụ niile na-emekpa ndị mmadụ ahụ́ kwụsị. w23.04 3 ¶4-5

Wenezdee, Julaị 2

Unu ndị hụrụ Jehova n’anya, kpọọnụ ihe ọjọọ asị. Ọ na-eche ndị na-erubere ya isi nche. Ọ na-anapụta ha n’aka ndị ajọ omume.​—Ọma 97:10.

Anyị ga-agbasi mbọ ike ka anyị ghara ịna-agụ ma ọ bụ na-ege echiche na-ezighị ezi juru n’ụwa Setan. Anyị kwesịrị ịna-agụ Baịbụl, na-amụkwa ya ka o mee ka echiche dị mma na-eju anyị n’obi. Ịga ọmụmụ ihe na ozi ọma ga-echebe obi anyị. Jehova kwekwara nkwa na ọ gaghị ekwe ka ọnwụnwa karịrị anyị bịara anyị. (1 Kọr. 10:12, 13) Anyị niile kwesịrị ịna-ekpekwu ekpere karịa otú anyị na-ekpebu ka anyị nwee ike jiri obi anyị niile na-efe Jehova n’oge ikpeazụ a tara ezigbo akpụ. Jehova chọrọ ka anyị ‘na-agwa ya ihe niile dị anyị n’obi’ ma anyị kpewe ekpere. (Ọma 62:8) Na-eto Jehova ma na-ekele ya maka ihe niile ọ na-eme. Na-arịọ ya ka o nyere gị aka inwe obi ike n’ozi ọma. Na-arịọ ya ka o nyere gị aka idi nsogbu ọ bụla bịaara gị na imeri ọnwụnwa ọ bụla nwere ike ịbịara gị. Ekwela ka ihe ọ bụla ma ọ bụ onye ọ bụla kwụsị gị iwepụta oge na-ekpe ekpere mgbe niile. w23.05 7 ¶17-18

Tọzdee, Julaị 3

Ka anyị na-echebakwara ibe anyị echiche . . . , na-agbarịta ibe anyị ume.​—Hib. 10:24, 25.

Olee ihe mere anyị ji aga ọmụmụ ihe? Ihe kacha mkpa mere anyị ji aga ọmụmụ ihe bụ ka anyị too Jehova. (Ọma 26:12; 111:1) Ihe ọzọ mekwara anyị ji aga ọmụmụ ihe bụ ka anyị gbaa ibe anyi ume n’oge a ihe siri ike. (1 Tesa. 5:11) Ọ bụrụ na anyị ewelie aka ma zaa ajụjụ n’ọmụmụ ihe, anyị na-eme ụzọ ihe abụọ ndị a mere anyị ji aga ọmụmụ ihe. Ma, e nwere ihe ndị nwere ike ime ka ọ na-esiri anyị ike ịza ajụjụ. Ụjọ nwere ike ịtụ anyị ịza ajụjụ, ma ọ bụkwanụ ya abụrụ na anyị chọrọ ịza ajụjụ ma a naghị akpọ anyị ka anyị zaa ajụjụ ugboro ole anyị chọrọ. Gịnị ga-enyere anyị aka n’ihe abụọ ndị a? Pọl onyeozi kwuru na ihe kwesịrị ịka anyị mkpa bụ ‘ịgbarịta ibe anyị ume.’ Ọ bụrụ na anyị achọpụta na obere ihe anyị kwuru n’ọmụmụ ihe nwere ike ịgba ndị ọzọ ume, ọ na-eme ka obi na-atọ anyị ụtọ ịza ajụjụ. Ọ bụrụkwanụ na a naghị akpọ anyị otú anyị chọrọ, obi ga-adị anyị ụtọ na ụmụnna ndị ọzọ nọ n’ọgbakọ zara ajụjụ.​—1 Pita 3:8. w23.04 20 ¶1-3

Fraịdee, Julaị 4

Lawa Jeruselem, . . . rụghachi ụlọ Jehova.​—Ezra 1:3.

E nwere ọkwa eze mara. Ọ sịrị na ndị Juu niile a dọọrọ n’agha laa Babịlọn kemgbe ihe dị ka afọ iri asaa nweziri ike ịlaghachi ala ha bụ́ Izrel. (Ezra 1:2-4) Ọ bụ naanị Jehova ga-emeli ka ihe a kwe omume. Ndị Babịlọn anaghị ahapụ ndị ha dọọrọ n’agha. (Aịza. 14:4, 17) Ma, e meriela Babịlọn. Eze ọhụrụ agwala ndị Juu na ha nweziri ike ịla. Onye Juu ọ bụla, karịchaa onyeisi ezinụlọ, nwere ihe ọ ga-ekpebi. Ọ ga-ekpebi ma ọ̀ ga-ahapụ Babịlọn ma ọ̀ ga-anọrọwa ebe ahụ. Ikpebi ụdị ihe ahụ adịghị mfe. O nwere ike ịbụ na nká mere ka o siere ọtụtụ ndị ike ime njem ahụ dị anya. Ebe ọ bụkwanụ na a mụrụ ọtụtụ n’ime ndị Juu ahụ na Babịlọn, ọ bụ naanị ebe ahụ ka ha birila. Ha anaghị ele Izrel anya ka obodo ha. Ọ bụ naanị ka obodo ndị nna nna ha. Ọ ga-abụkwa na ụfọdụ ndị Juu abaala ọgaranya na Babịlọn. N’ihi ya, o nwere ike isiri ha ike ịhapụ ụlọ ọma ha na ihe ndị ha ji akpata ego, kwalaa obodo ha na-amaghị. w23.05 14 ¶1-2

Satọdee, Julaị 5

Dịrịnụ njikere.​—Mat. 24:44.

Okwu Chineke gbara anyị ume ka anyị na-amụtakwu ịtachi obi, inwe obi ebere, na ịhụ ndị ọzọ n’anya. Luk 21:19 sịrị: “Ọ bụrụ na unu atachie obi ruo ọgwụgwụ, unu ga-enweta ndụ.” Ndị Kọlọsi 3:12 sịrị: ‘Yirinụ obi ebere ka uwe.’ E kwukwara ná 1 Ndị Tesalonaịka 4:9, 10, sị: “Chineke na-akụziri unu ka unu na-ahụ ibe unu n’anya. . . . Ma anyị na-agba unu ume, ụmụnna anyị, ka unu na-ahụkwu ibe unu n’anya karịa otú unu na-eme.” Ọ bụ ndị na-eso ụzọ Jizọs ka a gwara ihe e kwuru n’amaokwu ndị a niile. Ha na-atachi obi, na-enwere ndị ọzọ obi ebere, hụkwa ndị ọzọ n’anya. Ma, ha kwesịrị ịmụta otú ha ga-esi na-akpakwu àgwà ndị a. Anyị kwesịkwara ime otú ahụ. Ihe ga-enyere gị aka bụ ileba anya n’otú Ndị Kraịst n’oge ndịozi si kpaa àgwà ndị a. Ị ga-ahụzi otú ị ga-esi na-akpa àgwà ka ha iji gosi na ị dị njikere maka oké mkpagbu. Ọ bụrụzie na oké mkpagbu amalite, ọ ga-abụrịrị na ị mụtala otú ị ga-esi na-atachi obi. Ị ga-ekpebisikwukwa ike ịna-atachi obi. w23.07 2 ¶4; 3 ¶8

Sọnde, Julaị 6

Okporo ụzọ ga-adị ebe ahụ. Ọ bụ . . . Ụzọ Dị Nsọ.​—Aịza. 35:8.

Ma ànyị bụ ndị e tere mmanụ ma ànyị so n’atụrụ ọzọ, anyị kwesịrị ịna-aga ije ‘n’Ụzọ Dị Nsọ’ n’ihi na ọ ga-enyere anyị aka ịna-efe Jehova ugbu a nakwa n’ọdịnihu, mgbe Alaeze Chineke ga-eme ka ọtụtụ ihe ọma mee n’ụwa a. (Jọn 10:16) Kemgbe afọ 1919, ọtụtụ nde ụmụ nwoke, ụmụ nwaanyị, na ụmụaka ahapụla Babịlọn Ukwu, ya bụ, okpukpe ụgha niile e nwere n’ụwa, malitekwa ịna-aga ije n’ụzọ ahụ. Mgbe ndị Juu hapụrụ Babịlọn, Jehova hụrụ na e wepụrụ ihe ọ bụla nwere ike ịnọchiri ha ụzọ. (Aịza. 57:14) Gịnịkwanụ ka e mere “Ụzọ Dị Nsọ” n’oge anyị a? Ọtụtụ narị afọ tupu afọ 1919, Jehova ji ụmụ nwoke ndị na-atụ egwu ya mepeere ndị mmadụ ụzọ isi na Babịlọn Ukwu pụta. (I nwere ike ịtụle Aịzaya 40:3.) Ha mere ihe ndị dị mkpa ga-eme ka o kwe ndị nwere ezi obi omume ịhapụ okpukpe ụgha ma soro ndị Jehova na-efe ya. w23.05 15-16 ¶8-9

Mọnde, Julaị 7

Jirinụ ọṅụ na-efe Jehova. Tirinụ mkpu ọṅụ bịa n’ihu ya.​—Ọma 100:2.

Jehova chọrọ ka anyị jiri obi ụtọ na-efe ya nakwa ka ofufe anyị na-efe ya si anyị n’obi. (2 Kọr. 9:7) N’ihi ya, ànyị kwesịrị ịgba mbọ na-eme ihe anyị kpebiri ime n’ofufe Jehova ọ bụrụgodị na ọ naghị agụ anyị agụụ ime ya? Legodị ihe Pọl onyeozi mere. Ọ sịrị: “M na-ejidesi onwe m ike, na-eme ka ahụ́ m bụrụ ohu m.” (1 Kọr. 9:25-27) Pọl gbasiri mbọ ike mee ihe Jehova chọrọ ka o mee ma mgbe ọ na-anaghị agụ ya agụụ. Ihe ahụ Pọl mere ọ̀ masịrị Jehova? Eheenụ. Jehova gọzikwara ya maka mbọ ọ gbara. (2 Tim. 4:7, 8) Obi na-adịkwa Jehova ụtọ ịhụ ka anyị na-agbasi mbọ ike ime ihe anyị kpebiri ime ma mgbe ọ na-anaghị agụ anyị agụụ ime ya. Obi na-adị ya ụtọ maka ihe anyị na-eme ọ bụrụgodị na ihe ahụ anaghị atọ anyị ụtọ. Ọ ma na ihe mere anyị ji eme ya bụ na anyị hụrụ ya n’anya. Jehova ga-agọzi anyị maka mbọ anyị gbara otú ahụ ọ gọziri Pọl. (Ọma 126:5) Ọ bụrụkwa na anyị ahụ otú Jehova si agọzi anyị, o nwere ike ime ka ọ na-agụ anyị agụụ ime ihe ahụ. w23.05 29 ¶9-10

Tuzdee, Julaị 8

Ụbọchị Jehova ga-abịa.​—1 Tesa. 5:2.

Pọl onyeozi ji ndị a ga-ebibi n’ụbọchị Jehova tụnyere ndị na-ehi ụra. Ha amaghị ihe na-eme gburugburu ha. Ha amaghịkwa na oge agaala. N’ihi ya, ha amaghị mgbe ihe ndị dị mkpa ji mee, ka ọ fọdụzie ịma ihe ha ga-eme. Ọtụtụ ndị taa dị ka ndị na-ehi ụra. (Rom 11:8) Ha ekwetaghị ihe ndị na-egosi na anyị bi “n’oge ikpeazụ” nakwa na oké mkpagbu ga-abịa n’oge na-adịghị anya. (2 Pita 3:3, 4) Ma, anyị ma na ka ụbọchị ọ bụla na-aga ka ọ na-adịkwu mkpa ka anyị mụrụ anya. (1 Tesa. 5:6) N’ihi ya, ọ dị mkpa ka isi jụọ anyị oyi, uche akpakọọkwa anyị ọnụ. Maka gịnị? Ọ bụ n’ihi na ọ ga-eme ka anyị ghara itinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị ma ọ bụ n’esemokwu ụwa a. Ndị mmadụ nwere ike ịna-enyekwu anyị nsogbu ka anyị tinye aka n’ihe ndị a ka ụbọchị Jehova na-erukwu nso. N’agbanyeghị ya, anyị ekwesịghị ichegbu onwe anyị maka ihe anyị ga-eme. Mmụọ nsọ Chineke nwere ike inyere anyị aka ka uche kpakọọ anyị ọnụ nakwa ka anyị kpebie ihe dị mma.​—Luk 12:11, 12. w23.06 9-10 ¶6-7

Wenezdee, Julaị 9

Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova, biko, cheta m, . . . nye m ike.​—Ikpe 16:28.

Gịnị na-agbata gị n’obi ma ị nụ aha ahụ bụ́ Samsịn? O nwere ike ịbụ na ị na-echeta nwoke siri ezigbo ike. Ọ bụ eziokwu. Mana, e nwere mgbe Samsịn kpebiri ihe na-adịghị mma, ya akpatara ya nnukwu nsogbu. Ma, Jehova lekwasịrị anya n’ihe ọma niile Samsịn mere. Ọ bụkwa ihe o mere ka e dee na Baịbụl ka o nwee ike baara anyị uru. Jehova ji Samsịn mee ọtụtụ ihe dị ịtụnanya iji nyere ndị ya bụ́ ndị Izrel aka. Mgbe ọtụtụ narị afọ gara Samsịn nwụchara, Jehova ji mmụọ nsọ mee ka Pọl onyeozi dee aha Samsịn mgbe ọ na-ede ndị nwere ezigbo okwukwe. (Hib. 11:32-34) Ihe Samsịn mere nwere ike ịgba anyị ume. Ọ tụkwasịrị Jehova obi, ma mgbe ihe siiri ya ike. Anyị nwere ike ịmụta ihe n’aka Samsịn nakwa otú ihe o mere nwere ike isi gbaa anyị ume. w23.09 2 ¶1-2

Tọzdee, Julaị 10

Mee ka [Chineke] mara ihe unu na-arịọ.​—Fil. 4:6.

Ihe nwere ike inyere anyị aka ịna-atachikwu obi bụ ịna-ekpe ekpere mgbe niile, jirikwa obi anyị niile na-akọrọ Jehova ihe ndị na-echegbu anyị. (1 Tesa. 5:17) O nwere ike ịbụ na o nwebeghị nnukwu nsogbu bịaara gị ugbu a, ma ị̀ na-arịọ Jehova ka o nyere gị aka ịma ihe ị ga-eme mgbe ọ bụla iwe ji gị ma ọ bụ mgbe ị na-amaghị ihe ị ga-eme eme? Ọ bụrụ na ị na-arịọ Jehova ka o nyere gị aka n’obere nsogbu ndị na-abịara gị kwa ụbọchị, ọ ga-adịrị gị mfe ịgwa ya ka o nyere gị aka ma nnukwu nsogbu bịara gị n’ọdịnihu. Obi ga-esizi gị ike na ọ ma mgbe ọ ga-enyere gị aka nakwa otú ọ ga-esi enyere gị aka. (Ọma 27:1, 3) Ọ bụrụ na anyị ana-atachi obi ná nsogbu ndị na-abịara anyị taa, o nwere ike ịdịrị anyị mfe ịtachi obi n’oge oké mkpagbu. (Rom 5:3) Gịnị mere anyị nwere ike iji kwuo otú ahụ? Ọtụtụ ụmụnna achọpụtala na ọ bụrụ na ha edie otu nsogbu bịaara ha, ọ na-enyere ha aka idi nsogbu ọzọ ga-abịa. Ịtachi obi na-eme ka ha nwekwuo okwukwe, obi esiekwa ha ike na Jehova dị njikere inyere ha aka nakwa na ọ chọrọ inyere ha aka. Okwukwe ahụ na-enyere ha aka idi nsogbu ọzọ ga-abịara ha.​—Jems 1:2-4. w23.07 3 ¶7-8

Fraịdee, Julaị 11

M ga-emekwara gị ihe a ị rịọrọ. ​—Jen. 19:21.

Jehova dị umeala n’obi ma na-eme ebere. Ọ bụ ya mere o ji ele ihe anya otú kwesịrị ekwesị. Dị ka ihe atụ, Jehova gosiri na ọ dị umeala n’obi mgbe ọ chọrọ ibibi ndị ọjọọ bi na Sọdọm. O si n’ọnụ ndị mmụọ ozi ya gwa Lọt, bụ́ onye ezi omume, ka ọ gbaga n’ebe bụ́ ugwu ugwu. Ụjọ nọ na-atụ Lọt ịgbaga ebe ahụ. N’ihi ya, ọ rịọrọ Jehova ka ọ hapụ ya na ndị ezinụlọ ya ka ha gbaga na Zoa, bụ́ obere obodo Jehova chọkwara ibibi. A sị na Jehova chọrọ, ọ gaara agwa Lọt na ọ ga-emerịrị ihe o kwuru n’ewepụghị ya ihe ọ bụla. Kama ime otú ahụ, o mere ihe Lọt rịọrọ ya, ọ bụ eziokwu na ọ ga-eme ka ọ ghara ibibi obodo Zoa. (Jen. 19:18-22) Mgbe ọtụtụ narị afọ gara, Jehova meteere ndị bi na Ninive ebere. O zigara onye amụma ya bụ́ Jona ka ọ gaa gwa ha na a ga-ebibi obodo ahụ na ndị ọjọọ bi na ya n’oge na-adịghị anya. Ma ndị Ninive chegharịrị, Jehova emeere ha ebere ma hapụ ibibi ha.​—Jona 3:1, 10; 4:10, 11. w23.07 21 ¶5

Satọdee, Julaị 12

Ha gburu [Jehoash] . . . , ma ha elighị ya ebe a na-eli ndị eze.​—2 Ihe 24:25.

Olee ihe anyị ga-amụta n’ihe Jehoash mere? Jehoash dị ka osisi na-agbanyesighị mgbọrọgwụ ike n’ala, nke e ji osisi dụgide ka ọ ghara ịda. Mgbe Jehoyada, bụ́ onye na-akwado Jehoash, nwụrụ, Jehoash egewekwa ndị kwụsịrị ife Jehova ntị, ọ kwụsịrị irubere Jehova isi. Ihe a gosiri na ihe mere anyị ji na-atụ egwu Chineke ekwesịghị ịbụ naanị maka àgwà ọma ndị ezinụlọ anyị na ndị ọzọ nọ n’ọgbakọ na-akpa. Anyị chọọ ka anyị na Jehova na-adị ná mma, anyị kwesịrị ịna-ahụkwu ya n’anya ma na-atụ egwu ya. Ihe ga-enyere anyị aka ime ya bụ ịna-amụchi ihe anya, ịna-atụgharị uche, na ịna-ekpe ekpere. (Jere. 17:7, 8; Kọl 2:6, 7) Jehova anaghị agwa anyị mee ihe karịrị anyị. A chịkọtara ihe Jehova chọrọ n’aka anyị n’Ekliziastis 12:13, ebe sịrị: “Tụọ egwu ezi Chineke, debekwa iwu ya, n’ihi na ọ bụ ihe kacha mkpa mmadụ kwesịrị ime.” Ọ bụrụ na anyị ana-atụ egwu Chineke, anyị ga na-erubere ya isi n’agbanyeghị ihe ọ bụla mere n’ọdịnihu ma kwụsie ike. E nweghị ihe ga-eme ka anyị na Jehova kwụsị ịdị ná mma. w23.06 18-19 ¶17-19

Sọnde, Julaị 13

Ana m eme ihe niile ka ha dị ọhụrụ.​—Mkpu. 21:5.

Ihe nkwa a ji bido bụ: “Chineke, onye nọ ọdụ n’ocheeze ahụ, sịkwara.” (Mkpu. 21:5a) Ihe ndị e kwuru ebe a pụrụ iche n’ihi na ọ bụ otu ugboro n’ime naanị ugboro atọ akwụkwọ Mkpughe kwuru ihe Jehova n’onwe ya kwuru. N’ihi ya, ọ bụghị mmụọ ozi dị ike ma ọ bụ Jizọs mere ka obi sie anyị ike na nkwa a ga-emezu, kama ọ bụ Jehova n’onwe ya. Ihe a gosiri na anyị kwesịrị ịtụkwasị ihe ọzọ o kwuru obi. Maka gịnị? Ọ bụ n’ihi na Jehova ‘enweghị ike ịgha ụgha.’ (Taị. 1:2) Ihe a mere ka obi sie anyị ezigbo ike na ihe e kwuru ná Mkpughe 21:5, 6 ga-emezurịrị. Ihe ọzọ Chineke kwuru bụ: “Ana m eme ihe niile ka ha dị ọhụrụ.” N’eziokwu, Jehova na-ekwu gbasara ihe ndị ga-agbanwe n’ọdịnihu. Ma, obi siri ya ezigbo ike na ihe ndị ahụ ga-emezu nke na mgbe ọ na-ekwu gbasara ha, o kwuru ha ka à ga-asị na ha emewela emewe.​—Aịza. 46:10. w23.11 3-4 ¶7-8

Mọnde, Julaị 14

O wee pụọ n’èzí bee ezigbo ákwá.​—Mat. 26:75.

E nwere ihe ndị Pita na-anaghị emetacha. Legodị ihe atụ ụfọdụ. Mgbe Jizọs kọwara ụdị ahụhụ ọ ga-ata na ụdị ọnwụ ọ ga-anwụ iji mezuo amụma Baịbụl, Pita baara ya mba. (Mak 8:31-33) E nwekwara ọtụtụ oge Pita na ndịozi ndị ọzọ rụrụ ụka gbasara onye kachanụ n’ime ha. (Mak 9:33, 34) N’abalị bọtara ụbọchị e gburu Jizọs, Pita gbupụrụ otu nwoke ntị. (Jọn 18:10) N’otu abalị ahụkwa, Pita tụrụ ụjọ ma gọnahụ enyi ya Jizọs ugboro atọ. (Mak 14:66-72) Ihe a mere ka Pita bee ezigbo ákwá. Jizọs ahapụghị onyeozi ya a obi gbawara. Mgbe a kpọlitechara Jizọs n’ọnwụ, o nyere Pita ohere igosi na ọ hụrụ ya n’anya. Jizọs gwara ya ka o wetuo obi na-azụ atụrụ ya. (Jọn 21:15-17) Pita kwetara. Ọ nọ na Jeruselem n’ụbọchị Pentikọst, sorokwa ná ndị mbụ e ji mmụọ nsọ tee mmanụ. w23.09 22 ¶6-7

Tuzdee, Julaị 15

Na-azụ ụmụ atụrụ m.​—Jọn 21:16.

Pita onyeozi gwara ndị okenye ibe ya, sị: “Na-azụnụ ìgwè atụrụ Chineke.” (1 Pita 5:1-4) Ọ bụrụ na ị bụ okenye, anyị ma na ị hụrụ ụmụnna gị n’anya nakwa na ị chọrọ ịna-elekọta ha. Ma mgbe ụfọdụ, i nwere ike iche na ị gaghị arụli ọrụ ahụ n’ihi na i nweghị ohere ma ọ bụ na ike gwụchara gị. Gịnị ka i nwere ike ime? Kọọrọ Jehova otú ọ dị gị n’obi. Pita dere, sị: “Onye na-ejere ndị ọzọ ozi, ya jiri ike Chineke na-eje ya.” (1 Pita 4:11) Ụfọdụ nsogbu nwere ike ịbịara ụmụnna gị agaghị enwe ngwọta n’ụwa ochie a. Ma cheta na Jizọs Kraịst, bụ́ “onyeisi ndị ọzụzụ atụrụ,” nwere ike inyere ha aka karịa gịnwa. O nwere ike inyere ha aka ma ugbu a ma n’ụwa ọhụrụ. Ihe Jehova chọrọ ka ndị okenye mee bụ ka ha hụ ụmụnna ha n’anya, na-azụ ha, ‘na-akpakwa àgwà ìgwè atụrụ Chineke ga na-eṅomi.’ w23.09 29-30 ¶13-14

Wenezdee, Julaị 16

Jehova ma na ihe ndị ma ihe na-atụgharị n’uche bụ ihe efu. ​—1 Kọr. 3:20.

Anyị kwesịrị izere echiche mmadụ. Ọ bụrụ na anyị ana-ele ihe anya otú ndị mmadụ si ele ya, anyị nwere ike ịna-eleghara Jehova na iwu ya anya. (1 Kọr. 3:19) “Amamihe ụwa a” na-emekarị ka ndị mmadụ na-enupụrụ Jehova isi. Ụfọdụ Ndị Kraịst nọ na Pagamọm na Tayataịra malitere iwere ikpere arụsị na omume rụrụ arụ otú ndị obodo ha si were ya. Jizọs baara ọgbakọ abụọ ahụ ezigbo mba maka otú ha si na-agbachi ndị na-eme omume rụrụ arụ nkịtị. (Mkpu. 2:14, 20) Taa, a na-enye anyị nsogbu ka anyị lewe ihe anya otú na-ekwesịghị ekwesị. Ndị ezinụlọ anyị na ndị enyi anyị nwere ike ịna-agwa anyị na anyị na-eme oké ezi omume ma ọ bụkwanụ na anyị kwesịrị imebi iwu Jehova. Dị ka ihe atụ, ha nwere ike ịna-ekwu na ime omume rụrụ arụ adịghị njọ, nakwa na ihe Baịbụl kwuru gbasara mmekọahụ enweghịzi isi taa. Mgbe ụfọdụ, anyị nwere ike ichewe na Jehova anaghị enye anyị iwu ndị doro anya. Anyị nwere ike chọwa ịna-eme ihe karịrị “ihe e dere ede.”​—1 Kọr. 4:6. w23.07 16 ¶10-11

Tọzdee, Julaị 17

Ezigbo enyi na-egosi mgbe niile na ọ hụrụ enyi ya n’anya. Ọ bụkwa nwanne nke na-enyere enyi ya aka n’oge nsogbu.​—Ilu 17:17.

Ọ dị mkpa ka Meri nne Jizọs nweta ike ọ ga-eji mee uche Jehova. Ọ lụbeghị di, ma a gwara ya na ọ ga-adị ime. Ọ zụtụbeghị nwa, ma a gwara ya na ọ ga-elekọta nwa ga-aghọ Mezaya. Ebe ọ bụ na ya na nwoke ọ bụla enwebeghị mmekọahụ, olee otú ọ ga-esi agwa Josef bụ́ onye chọrọ ịlụ ya na ọ dị ime? (Luk 1:26-33) Olee otú Meri si nweta ike? O kwere ka ndị ọzọ nyere ya aka. Dị ka ihe atụ, ọ gwara Gebriel ka ọ gwakwuo ya ihe ndị ọzọ gbasara ọrụ ahụ e nyere ya. (Luk 1:34) Obere oge nke ahụ mechara, ọ gara “n’ala bụ́ ugwu ugwu,” n’otu obodo dị na Juda gaa leta onye ikwu ya aha ya bụ Elizabet. Elizabet jara Meri mma. Jehova mekwara ka Elizabet kọọrọ Meri otu amụma gbasara nwa ọ ga-amụ. (Luk 1:39-45) Meri kwuru na Jehova “ji aka ya dị ike mee ihe a niile.” (Luk 1:46-51) Jehova si n’aka Gebriel na Elizabet mee ka Meri dị ike. w23.10 14-15 ¶10-12

Fraịdee, Julaị 18

O mekwara ka anyị bụrụ otu alaeze na ndị nchụàjà nke Chineke ya, bụ́ Nna ya.​—Mkpu. 1:6.

E ji mmụọ nsọ tee ụfọdụ n’ime ndị na-eso ụzọ Jizọs mmanụ, nke mere ka adịm ná mma ha na Jehova pụọ iche. Ha dị otu narị puku na puku iri anọ na puku anọ (144,000). Ha na Jizọs ga-abụ ndị nchụàjà n’eluigwe. (Mkpu. 14:1) Ihe Ebe Nsọ dị n’ụlọikwuu ahụ nọchiri anya ya bụ na Chineke mere ka Ndị Kraịst e tere mmanụ bụrụ ụmụ ya mgbe ha ka nọ n’ụwa. (Rom 8:15-17) Ebe Kacha Nsọ n’ụlọikwuu ahụ nọchiri anya eluigwe, ebe Jehova bi. “Ákwà mgbochi” nke kewara Ebe Nsọ na Ebe Kacha Nsọ nọchiri anya ahụ́ mmadụ Jizọs nwere nke gbochiri ya ịbanye n’eluigwe ma bụrụ Nnukwu Onye Nchụàjà Kachanụ nke ụlọ nsọ ihe atụ ahụ. Mgbe Jizọs nwụrụ, jiri ahụ́ ya chụọ àjà maka ụmụ mmadụ, o mepere ụzọ ka Ndị Kraịst niile e tere mmanụ nwee ike ịdị ndụ n’eluigwe. Hanwa ga-ahapụkwa ahụ́ mmadụ ha ka ha nwee ike inweta ụgwọ ọrụ ha n’eluigwe.​—Hib. 10:19, 20; 1 Kọr. 15:50. w23.10 28 ¶13

Satọdee, Julaị 19

Oge ga-agwụnahụ m ma m kọwa banyere Gidiọn.​—Hib. 11:32.

Mgbe ndị Ifrem katọrọ Gidiọn, o weghị iwe. (Ikpe 8:1-3) O jighị iwe saa ha okwu. O gere ha ntị mgbe ha na-ekwu obi ha n’ihi na ọ dị umeala n’obi. O jikwa akọ kwuo okwu otú mere ka obi jụrụ ha. Ndị okenye ma ihe na-emekwa ka Gidiọn. Ha na-ege ntị nke ọma ma a katọwa ha, ha anaghịkwa eji iwe azaghachi. (Jems 3:13) Ihe a ha na-eme na-eme ka udo dịrị n’ọgbakọ. Mgbe ndị mmadụ nọ na-eto Gidiọn maka mmeri e meriri ndị Midian, o mere ka e too Jehova. (Ikpe 8:22, 23) Olee otú ndị okenye nwere ike isi eme ka Gidiọn? Ha na-enye Jehova otuto niile maka ihe ndị ha mere. (1 Kọr. 4:6, 7) Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na a jaa okenye mma maka otú o si akụzi ihe, o nwere ike ikwu na ihe ọ kụziri si n’Okwu Chineke nakwa na nzukọ Jehova na-akụziri anyị niile ihe. Ndị okenye nwere ike ịna-eleru onwe ha anya mgbe ụfọdụ ka ha mara ma otú ha si akụzi ihe ọ̀ na-eme ka e too Jehova, ka ọ̀ na-eme ka e towe ha. w23.06 4 ¶7-8

Sọnde, Julaị 20

Otú m si eche echiche dị iche n’otú unu si eche echiche.​—Aịza. 55:8.

Ọ bụrụ na e mereghị anyị ihe anyị na-ekpe n’ekpere, anyị nwere ike ịjụ onwe anyị sị, ‘Ọ̀ bụ ihe a ka m kwesịrị ikpe n’ekpere?’ Ọtụtụ mgbe, anyị na-eche na anyị ma ihe ga-akacha baara anyị uru. Ma ihe ahụ anyị na-arịọ nwere ike ịbụ ihe na-agaghị abara anyị uru. Ọ bụrụ na anyị na-ekpe ekpere gbasara otu nsogbu anyị nwere, o nwere ike ịbụ na e nwere ụzọ ka mma nsogbu ahụ ga-esi kwụsị karịa nke anyị na-arịọ. Ụfọdụ ihe anyị na-arịọ nwekwara ike ịbụ na ha adabaghị n’uche Jehova. (1 Jọn 5:14) Dị ka ihe atụ, chegodị gbasara nne na nna rịọrọ Jehova ka o nyere nwa ha aka ịnọsi ike n’ọgbakọ. Ihe a yiri ihe ha kwesịrị ịrịọ. Ma, Jehova agaghị amanye onye ọ bụla n’ime anyị ife ya. Ọ chọrọ ka anyị niile, ma ụmụ anyị, jiri aka anyị kpebie ife ya. (Diut. 10:12, 13; 30:19, 20) N’ihi ya, ihe nne na nna ahụ gaara arịọ Jehova bụ ka o nyere ha aka ka ihe ha na-akụziri nwa ha ruo ya n’obi, nke ga-eme ka ọ hụ Jehova n’anya ma bụrụ enyi ya.​—Ilu 22:6; Efe. 6:4. w23.11 21 ¶5; 23 ¶12

Mọnde, Julaị 21

[Na-akasinụ] ibe unu obi. ​—1 Tesa. 4:18.

Olee otú ịkasi ndị mmadụ obi si bụrụ otu ụzọ dị mkpa anyị si egosi na anyị hụrụ ha n’anya? Otu akwụkwọ na-akọwa Baịbụl kwuru na okwu Pọl kwuru a sụgharịrị ‘ịkasi obi’ pụtara “iguzo n’akụkụ mmadụ na-agba ya ume mgbe ọnwụnwa siri ike bịaara ya.” N’ihi ya, ọ bụrụ na anyị akasie nwanna na-ata ahụhụ obi, anyị na-enyere ya aka ka ọ ghara ịda mbà n’ife Jehova. N’oge ọ bụla anyị kasiri nwanna anyị obi, anyị na-egosi ya na anyị hụrụ ya n’anya. (2 Kọr. 7:6, 7, 13) E nwere ike ikwu na inwe ọmịiko na ịkasi mmadụ obi bụ nwanne. Olee otú ọ bụ? Onye na-enwere mmadụ ọmịiko hụ onye na-ata ahụhụ, ọ na-akasi ya obi, gbaakwa mbọ inyere ya aka. N’ihi ya, ihe mbụ anyị na-emere onye na-ata ahụhụ bụ inwere ya ọmịiko, anyị akasizie ya obi. Pọl kọwara na otú Jehova si enwere ndị mmadụ ọmịiko na-eme ka ọ kasie ha obi. Ọ kpọrọ Jehova “Nna na-emetere ndị mmadụ ebere, Chineke nke na-akasi ndị mmadụ obi n’ụdị ọnọdụ niile ha nọ.”​—2 Kọr. 1:3. w23.11 9-10 ¶8-10

Tuzdee, Julaị 22

Ka anyị na-aṅụrị ọṅụ mgbe a na-akpagbu anyị.​—Rom 5:3.

Ndị niile na-eso ụzọ Jizọs kwesịrị ịtụ anya mkpagbu. Ka anyị leba anya n’ihe mere Pọl onyeozi. Ọ gwara Ndị Kraịst nọ na Tesalonaịka, sị: “Mgbe anyị na unu nọ, anyị na-adị agwa unu tupu ya ebido ime na a ga-akpagbu anyị. Unu makwa na ihe anyị kwuru emeela.” (1 Tesa. 3:4) O degakwaara Ndị Kraịst nọ na Kọrịnt akwụkwọ ozi, sị: “Ụmụnna anyị, anyị chọrọ ịgwa unu gbasara ahụhụ anyị tara . . . Anyị ejighịzi ndụ anyị n’aka.” (2 Kọr. 1:8; 11:23-27) Ndị Kraịst taa kwesịkwara ịtụ anya na mkpagbu ga-abịara ha. (2 Tim. 3:12) Kemgbe i nwere okwukwe na Jizọs ma na-eso ụzọ ya, o nwere ike ịbụ na ndị enyi gị na ndị ikwu gị emesiela gị ike. Otú i si kpebisie ike na ị ga na-akwụwa aka ọtọ n’ihe niile ò meela ka i nwee nsogbu n’ebe ị na-arụ ọrụ? (Hib. 13:18) Ndị ọchịchị hà emegidela gị n’ihi na ị na-akọrọ ndị ọzọ gbasara olileanya i nwere? Ma, n’agbanyeghị ụdị mkpagbu nwere ike ịbịara anyị, Pọl kwuru na anyị kwesịrị ịna-aṅụrị ọṅụ. w23.12 10-11 ¶9-10

Wenezdee, Julaị 23

Unu ebuterela m nsogbu.​—Jen. 34:30.

Ọtụtụ nsogbu bịaara Jekọb. Ụmụ ya abụọ, bụ́ Simiọn na Livaị, mechuru ndị ezinụlọ ha ihu, meekwa ka a kọchaa aha Jehova. Ihe ọzọ bụ na nwunye Jekọb hụrụ n’anya bụ́ Rechel nwụrụ mgbe ọ na-amụ nwa nke abụọ ya. N’ihi oké ụnwụ, Jekọb kwagara Ijipt n’agadi ya. (Jen. 35:16-19; 37:28; 45:9-11, 28) N’agbanyeghị nsogbu a niile, o nweghị mgbe Jekọb kwụsịrị ịtụkwasị Jehova na nkwa ya obi. Jehova gosikwara Jekọb na ihe ya masịrị ya. Dị ka ihe atụ, Jehova gọziri Jekọb mee ka o nwee akụnụba. Ọ ga-abụrịrị na Jekọb kelere Jehova mgbe ọ hụrụ nwa ya Josef o chere na ọ nwụọla kemgbe. Ihe nyeere Jekọb aka idi nsogbu ahụ niile bụ otú ya na Jehova si dịrị n’ezigbo mma. (Jen. 30:43; 32:9, 10; 46:28-30) Ọ bụrụ na anyị emee ka anyị na Jehova dị n’ezigbo mma, anyịnwa ga-enwekwa ike idi nsogbu ọ bụla bịaara anyị anyị na-atụghị anya ya. w23.04 15 ¶6-7

Tọzdee, Julaị 24

Jehova bụ Onye na-azụ m dị ka atụrụ. E nweghị ihe ga-akọ m.​—Ọma 23:1.

N’Abụ Ọma nke 23, Devid kwuru na obi siri ya ike na Jehova hụrụ ya n’anya ma na-elekọta ya. O kwuru na ya na Jehova bụ ezigbo enyi. Ọ kpọrọ Jehova Onye na-azụ ya dị ka atụrụ. Obi ruru Devid ala maka na o kwere ka Jehova na-eduzi ya. Ọ tụkwasịkwara ya obi kpamkpam. Devid ma na Jehova ga-egosi ya na ọ hụrụ ya n’anya ná ndụ ya niile. Olee ihe mere ka obi sie ya ike otú ahụ? Devid ma na e nweghị ihe kọrọ ya n’ihi na Jehova na-enye ya ihe niile dị ya mkpa mgbe niile. Ọ ma na Jehova bụ enyi ya nakwa na ihe ya dị Jehova mma. Ọ bụ ya mere obi ji sie ya ike na n’agbanyeghị ihe ọ bụla ga-eme n’ọdịnihu, Jehova ga na-egboro ya mkpa ya niile. Ebe ọ bụ na obi siri Devid ike na Jehova hụrụ ya n’anya nakwa na ọ ga-elekọta ya, o nyeere ya aka ka ọ ghara ịna-echegbu onwe ya, kama ka ọ na-enwe obi ụtọ, ihe o nwere ana-ejukwa ya afọ.​—Ọma 16:11. w24.01 28-29 ¶12-13

Fraịdee, Julaị 25

M nọnyekwaara unu ụbọchị niile ruo ọgwụgwụ oge a.​—Mat. 28:20.

Kemgbe Agha Ụwa nke Abụọ, ala ajụọla oyi n’ọtụtụ obodo, ụmụnna anyị nwezikwara ike izi ozi ọma n’ọtụtụ obodo n’enweghị ndị na-enye ha nsogbu. N’eziokwu, ọtụtụ ndị amatala Jehova. Ndị ohu Jehova na-ekwusakwa ozi ọma n’ebe niile n’ụwa. Taa, Òtù Na-achị Isi ka na-elekwa Jizọs anya ka ọ na-eduzi ha. Ha chọrọ ka ntụziaka ha ga-enye ụmụnna ha bụrụ otú Jehova na Jizọs si ele ihe anya. Ha na-ejizi ndị nlekọta sekit na ndị okenye ọgbakọ enye ụmụnna ntụziaka ndị ahụ. Ndị okenye e tere mmanụ nọ “n’aka nri” Kraịst. (Mkpu. 2:1) N’eziokwu, ndị okenye ndị a ezughị okè, ha nwekwara ike imejọ ihe. Mosis na Joshụa mejọrọ ihe mgbe ụfọdụ. Otú ahụ ka ọ dịkwa ndịozi. (Ọnụ Ọgụ. 20:12; Josh. 9:14, 15; Rom 3:23) N’agbanyeghị ya, anyị na-achọpụta na Jizọs ji ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi nakwa ndị okenye na-eduzi ndị ya nakwa na ọ gaghị akwụsị ime ya. N’ihi ya, anyị kwesịrị ịtụkwasị ntụziaka Kraịst si n’aka ndị a ọ họpụtara na-enye anyị obi. w24.02 23 ¶13-14

Satọdee, Julaị 26

Na-emenụ ka Chineke, maka na unu bụ ụmụ ya ọ hụrụ n’anya.​—Efe. 5:1.

Taa, ọ bụrụ na ihe anyị na-ekwu gbasara Jehova ana-egosi na obi dị anyị ụtọ maka ihe ndị ọ na-emere anyị nakwa na anyị hụrụ ya n’anya, anyị na-eme ka obi ya ṅụrịa. Anyị nọrọ n’ozi ọma, anyị na-eburu n’obi na ihe kacha mkpa anyị ga-eme bụ ime ka ndị mmadụ bịa fewe Jehova, nyekwara ha aka ka ha were Nna anyị hụrụ anyị n’anya otú anyị si were ya. (Jems 4:8) Obi na-atọ anyị ụtọ igosi ndị mmadụ otú Baịbụl si kọwaa Jehova, mee ka ha mata na ọ hụrụ anyị n’anya, na-ekpe ikpe ziri ezi, nwee amamihe, dị ike, nweekwa ọtụtụ àgwà ọma ndị ọzọ. Otú ọzọ anyị si eto Jehova ma na-eme ihe dị ya mma bụ ịgbasi mbọ ike na-eme ka ya. Anyị mee otú ahụ, anyị na-adị iche n’ụwa a jọgburu onwe ya. Ọtụtụ ndị nwere ike ịchọpụta na anyị dị iche, ha ana-echekwa ihe kpatara ya. (Mat. 5:14-16) Anyị na ha mekọwa ihe, anyị nwere ike ịkọwara ha ihe mere anyị ji eme ihe ndị anyị na-eme. Ihe a nwere ike ime ka ndị nwere ezi obi chọọ ịbịaru Jehova nso. Ọ bụrụ na anyị esi n’ụzọ ndị a na-eto Jehova, anyị na-eme ka obi ya ṅụrịa.​—1 Tim. 2:3, 4. w24.02 10 ¶7

Sọnde, Julaị 27

Na-agba ndị mmadụ ume, na-adọkwa . . . aka ná ntị.​—Taị. 1:9.

Ọ bụrụ na ị chọrọ ịghọ Onye Kraịst tozuru etozu, i kwesịrị ịmụta ihe ndị ga-abara gị uru. Ihe ndị a ga-enyere gị aka ịrụ ọrụ ndị e nyere gị n’ọgbakọ na ọrụ ị ga-eji na-akpa afọ gị ma ọ bụ nke ezinụlọ gị. Ọ ga-emekwa ka gị na ndị ọzọ na-adị ná mma. Dị ka ihe atụ, mụta ịgụ ihe na ide ihe nke ọma. Baịbụl kwuru na onye na-ewepụta oge kwa ụbọchị na-agụ Okwu Chineke ma na-atụgharị uche na ya na-enwe obi ụtọ, ihe ọ na-eme ana-agakwa nke ọma. (Ọma 1:1-3) Ọ bụrụ na ị na-agụ Baịbụl kwa ụbọchị, ị ga-amatakwu otú Jehova si eche echiche, nke ga-enyere gị aka ịna-eche echiche nke ọma ma mata otú ị ga-esi na-eme ihe Baịbụl kwuru. (Ilu 1:3, 4) Ụmụnna anyị na-atụkarị anya isi n’aka ụmụnna nwoke na-akụzi ihe nke ọma na-enweta ntụziaka na ndụmọdụ si na Baịbụl. Ọ bụrụ na ị mụta ịgụ ihe na ide ihe nke ọma, ị ga-enwe ike ịna-akwadebe okwu na azịza bara uru ga-eme ka okwukwe ụmụnna sie ike. Ị ga-enwekwa ike ịna-ede ihe ga-abara gị uru ga-enyere gị aka ime ka okwukwe gị na-esikwu ike, na-agbakwa ndị ọzọ ume. w23.12 26-27 ¶9-11

Mọnde, Julaị 28

Onye unu na ya dị n’otu karịrị onye ya na ụwa dị n’otu.​—1 Jọn 4:4.

Ụjọ bịa gị, tụgharịa uche n’ihe Jehova ga-eme n’ọdịnihu mgbe a ga-ebibi Ekwensu. Otu ihe ngosi e mere ná mgbakọ ukwu e mere n’afọ 2014 gosiri otu nna na-agwa ndị ezinụlọ ya otú e nwere ike isi gụọ 2 Timoti 3:1-5 ma ọ bụrụ na amaokwu ndị ahụ buru amụma otú ihe ga-adị na Paradaịs. Ọ sịrị: “Ma mara nke a, na n’ụwa ọhụrụ, a ga-enwe ezigbo obi ụtọ. N’ihi na ndị mmadụ ga-abụ ndị hụrụ ibe ha n’anya, ndị ji ihe gbasara ofufe Chineke kpọrọ ihe, ndị ma ihe ha ga-emeli, ndị dị umeala n’obi, ndị na-eto Chineke, ndị na-erubere ndị mụrụ ha isi, ndị nwere ekele, ndị na-eguzosi ike n’ihe, ndị hụrụ ndị ezinụlọ ha n’anya nke ukwuu, ndị na-achọ inwe nkwekọrịta, ndị na-ekwu okwu ọma banyere ndị ọzọ mgbe niile, ndị na-ejide onwe ha, ndị dị nwayọọ, ndị hụrụ ezi ihe n’anya, ndị a pụrụ ịtụkwasị obi, ndị na-adịghị agba isi akwara, ndị na-adịghị ebuli onwe ha elu, ndị hụrụ Chineke n’anya kama ịhụ ihe ụtọ n’anya, ndị ji obi ha niile na-asọpụrụ Chineke; gị na ndị dị otú a na-akpachi anya.” Gị na ndị ezinụlọ gị ma ọ bụ ụmụnna gị ùnu na-ekwurịta otú ihe ga-adị n’ụwa ọhụrụ? w24.01 6 ¶13-14

Tuzdee, Julaị 29

Ihe gị masịrị m.​—Luk 3:22.

Obi na-esi anyị ike ma anyị mata na Jehova hụrụ ndị ya n’anya. Baịbụl sịrị: “Jehova hụrụ ndị ya n’anya.” (Ọma 149:4) Ma, mgbe ụfọdụ, ụfọdụ ndị nwere ike ịda mbà, ha ana-eche, sị, ‘Ihe mụnwa ọ̀ masịrị Jehova?’ Ọtụtụ ndị fere Jehova n’oge ochie chere ụdị ihe ahụ mgbe ụfọdụ. (1 Sam. 1:6-10; Job 29:2, 4; Ọma 51:11) Baịbụl mere ka o doo anya na ihe ụmụ mmadụ na-ezughị okè ga-amasịli Jehova. Olee otú ọ bụ? Anyị kwesịrị inwe okwukwe na Jizọs Kraịst ma mee baptizim. (Jọn 3:16) Anyị na-esi otú ahụ egosi ndị mmadụ na anyị echegharịala ná mmehie anyị ma kwe Chineke nkwa ime uche ya. (Ọrụ 2:38; 3:19) Obi na-atọ Jehova ụtọ ma anyị mee ihe ndị a ga-eme ka anyị na ya dịrị ná mma. Ọ bụrụhaala na anyị ana-eme ike anyị niile imezu nkwa anyị kwere Jehova mgbe anyị nyefere ya onwe anyị, ihe anyị na-adị Jehova mma, ọ na-ewerekwa anyị ka ezigbo ndị enyi ya.​—Ọma 25:14. w24.03 26 ¶1-2

Wenezdee, Julaị 30

Anyịnwa enweghị ike ịkwụsị ikwu gbasara ihe anyị ji anya anyị hụ na ihe anyị ji ntị anyị nụ.​—Ọrụ 4:20.

Otú anyị ga-esi na-eme ka ndị na-eso ụzọ Jizọs bụ ịna-ekwusa ozi ọma ọ bụrụgodị na ndị ọchịchị gwara anyị ka anyị kwụsị. Obi kwesịrị isi anyị ike na Jehova ga-enyere anyị aka ijezu ozi anyị. N’ihi ya, rịọ Jehova ka o nye gị obi ike na amamihe, rịọkwa ya ka o nyere gị aka idi nsogbu gị. Nsogbu ndị na-abịara ọtụtụ n’ime anyị bụ ọrịa ma ọ bụ obi ịjọ njọ, ọnwụ onye anyị hụrụ n’anya, nsogbu ezinụlọ, mkpagbu, ma ọ bụ nsogbu ọzọ. Ọrịa na-efe efe na agha na ihe ndị ọzọ emeela ka ọtụtụ n’ime nsogbu ndị a na-akakwu njọ. Gwa Jehova otú obi dị gị maka ihe ndị a. Kọọrọ ya otú ihe si dịrị gị otú ahụ ị ga-esi kọọrọ ya ezigbo enyi gị. Obi sie gị ike na Jehova “ga-enyere gị aka.” (Ọma 37:3, 5) Ịnọgide na-ekpe ekpere ga-enyere anyị aka ‘ịna-atachi obi mgbe a na-akpagbu anyị.’ (Rom 12:12) Jehova ma nsogbu ndị na-abịara ndị na-efe ya. “Ọ na-anụ ákwá ha na-ebe ka o nyere ha aka.”​—Ọma 145:18, 19. w23.05 5-6 ¶12-15

Tọzdee, Julaị 31

Na-achọpụtanụ ihe dị Onyenwe anyị mma.​—Efe. 5:10.

E nwee ihe ndị dị mkpa anyị ga-ekpebi, anyị kwesịrị ịchọpụta “ihe Jehova chọrọ” ma mee ya. (Efe. 5:17) Anyị chọpụta ihe Baịbụl kwuru gbasara ihe anyị chọrọ ime, ọ pụtara na anyị na-agbalị ịmata ihe bụ́ echiche Jehova gbasara ihe ahụ. Ọ bụrụ na anyị emee ihe Baịbụl kwuru, ọ ga-eme ka anyị mee ezigbo mkpebi. Setan bụ “ajọ onye ahụ,” bụrụkwa onye iro anyị. Ọ chọrọ ka anyị jiri oge anyị na-achụ ihe nke ụwa nke ga-eme ka anyị ghara inwe ohere ijere Jehova ozi. (1 Jọn 5:19) Ọ ga-adịrị Onye Kraịst mfe iwere ịchụ akụnụba, ịgụ akwụkwọ, ma ọ bụkwanụ ihe ndị ọzọ ọ chọrọ ime ka ihe dị mkpa karịa ofufe Jehova. O mee otú ahụ, ọ pụtara na ọ na-eche echiche ka ndị ụwa. N’eziokwu, ihe ndị ahụ adịghị njọ. Ma, ha ekwesịghị ịbụ ihe ndị kacha anyị mkpa ná ndụ. w24.03 24 ¶16-17

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya