Ozi Ọma Jọn Dere
3 E nwere otu nwoke onye Farisii aha ya bụ Nikọdimọs.+ Ọ bụ otu n’ime ndị isi ndị Juu. 2 Ọ bịakwutere Jizọs n’abalị,+ sị ya: “Rabaị,*+ anyị ma na ị bụ onye ozizi Chineke zitere n’ihi na e nweghị onye ga-arụli ọrụ ebube ndị a+ ị na-arụ* ma ọ bụrụ na Chineke anọnyereghị ya.”+ 3 Jizọs gwara ya, sị: “N’eziokwu, ana m asị gị na ọ bụrụ na a mụghị mmadụ ọzọ,*+ ọ gaghị ahụ Alaeze Chineke.”+ 4 Nikọdimọs sịrị ya: “Olee otú a ga-esi mụọ mmadụ mgbe o torola eto? Ọ̀ ga-abanyeli n’afọ nne ya nke ugboro abụọ ka a mụọ ya ọzọ?” 5 Jizọs zara ya, sị: “N’eziokwu, ana m asị gị na ọ bụrụ na e sighị na mmiri+ na mmụọ nsọ+ mụọ mmadụ, ọ gaghị abanye n’Alaeze Chineke. 6 Ihe e si n’anụ ahụ́ mụọ bụ anụ ahụ́, ihe e sikwa ná mmụọ nsọ mụọ bụ mmụọ. 7 Ya ejula gị anya na m sịrị gị: A ga-amụrịrị unu ọzọ. 8 Ifufe na-efega n’ebe ọ chọrọ, ị na-anụkwa ụda ya. Ma ị naghị ama ebe o si abịa na ebe ọ na-aga. Otú a ka ọ dị onye ọ bụla e si ná mmụọ nsọ mụọ.”+
9 Nikọdimọs wee sị ya: “Olee otú ihe ndị a ga-esi eme?” 10 Jizọs zara ya, sị: “Ị bụ onye nkụzi n’Izrel. Gịnị mere na ị maghị ihe ndị a? 11 N’eziokwu, ana m asị gị na ihe anyị ma ka anyị na-ekwu, ihe anyị hụkwara ka anyị na-agba àmà ya. Ma unu anaghị anabata àmà anyị na-agba. 12 Ọ bụrụ na m gwara unu ihe banyere ụwa ma unu ekwetaghị, olee otú unu ga-esi kweta ma m gwa unu ihe banyere eluigwe? 13 E nweghị onye garala eluigwe+ ma e wepụ onye si n’eluigwe gbadata,+ ya bụ, Nwa nke mmadụ. 14 Otú ahụ Mosis weliri agwọ elu n’ala ịkpa+ ka a ga-eweli Nwa nke mmadụ elu,+ 15 ka onye ọ bụla nke kweere na ya wee nwee ndụ ebighị ebi.+
16 “N’ihi na Chineke hụrụ ụwa n’anya nke ukwuu nke na o nyere Ọkpara ọ mụrụ naanị ya,+ ka a ghara ibibi onye ọ bụla nwere okwukwe na ya, kama ka o nwee ndụ ebighị ebi.+ 17 N’ihi na Chineke eziteghị Ọkpara ya n’ụwa ka o kpee ụwa ikpe, kama ka e si n’aka ya zọpụta ụwa.+ 18 A gaghị ekpe onye ọ bụla nwere okwukwe na ya ikpe.+ E kpeela onye ọ bụla na-enweghị okwukwe ikpe maka na o nweghị okwukwe n’aha Ọkpara Chineke mụrụ naanị ya.+ 19 Ihe a ga-eji kpee ụmụ mmadụ ikpe bụ na ìhè ahụ abịala n’ụwa,+ ma ha hụrụ ọchịchịrị n’anya kama ịhụ ìhè ahụ n’anya n’ihi na ọrụ ha dị njọ. 20 N’ihi na onye ọ bụla na-eme ihe ọjọọ kpọrọ ìhè ahụ asị, ọ naghịkwa abịakwute ìhè ahụ ka a ghara ịkatọ ọrụ ya.* 21 Ma onye ọ bụla nke na-eme ezi ihe na-abịakwute ìhè ahụ,+ ka e mee ka ọrụ ọ rụrụ otú Chineke chọrọ pụta ìhè.”
22 Mgbe e mechara, Jizọs na ndị na-eso ụzọ ya banyere n’ime ime obodo ndị dị na Judia. Ya na ha nọtụrụ n’ebe ndị ahụ. O mekwara ndị mmadụ baptizim.*+ 23 Ma Jọn nọkwa na-eme ndị mmadụ baptizim n’Inọn nke dị nso na Selim, n’ihi na e nwere mmiri buru ibu n’ebe ahụ.+ Ndị mmadụ na-abịakwa, a na-eme ha baptizim+ 24 n’ihi na a tụbeghị Jọn mkpọrọ.+
25 Ndị na-eso ụzọ Jọn na otu onye Juu rụrịtara ụka banyere iwu ime ka ihe dị ọcha. 26 N’ihi ya, ha bịakwutere Jọn, sị ya: “Onye Ozizi,* nwoke ahụ gị na ya nọ n’ofe Osimiri Jọdan, onye ị gbara àmà banyere ya,+ na-eme ndị mmadụ baptizim, mmadụ niile na-agakwurukwa ya.” 27 Jọn wee sị: “Mmadụ agaghị enwetali otu mkpụrụ ihe ma ọ bụrụ na e sighị n’eluigwe nye ya onye ahụ. 28 Unu onwe unu ga-agbara m akaebe na m kwuru, sị, ‘Abụghị m Kraịst,+ kama e zitere m ka m buru ya ụzọ bịa.’+ 29 Onye nwe nwaanyị a na-alụ ọhụrụ bụ nwoke na-alụ ya.+ Ma, mgbe enyi nwoke na-alụ nwaanyị ọhụrụ guzo ma nụ olu nwoke na-alụ nwaanyị ọhụrụ, ọ na-enwe ezigbo ọṅụ. N’ihi ya, e meela ka ọṅụ m zuo ezuo. 30 Onye ahụ ga na-amụba amụba, ma m ga na-ebelata ebelata.”
31 Onye ahụ nke si n’elu bịa+ ka ndị ọzọ niile. Onye ahụ nke si n’ụwa si n’ụwa, ọ na-ekwukwa banyere ihe nke ụwa. Onye ahụ nke si n’eluigwe bịa ka ndị ọzọ niile.+ 32 Ọ na-agba àmà ihe ọ hụrụ na ihe ọ nụrụ,+ ma e nweghị onye na-anabata àmà ya.+ 33 Onye ọ bụla nke nabatara àmà ya ekwerela* na Chineke bụ onye eziokwu.+ 34 N’ihi na onye ahụ Chineke zitere na-ekwu ihe Chineke kwuru,+ n’ihi na Chineke na-enye mmụọ nsọ n’ụba.* 35 Nna m hụrụ Ọkpara ya n’anya,+ o nyefeekwala ihe niile n’aka ya.+ 36 Onye nwere okwukwe n’Ọkpara ahụ nwere ndụ ebighị ebi.+ Onye na-enupụrụ Ọkpara ahụ isi agaghị ahụ ndụ,+ kama iwe Chineke na-adịgide n’ahụ́ ya.+