Ozi Ọma Jọn Dere
10 “N’eziokwu, ana m asị unu na ọ bụrụ na mmadụ anaghị esi n’ọnụ ụzọ abanye n’ogige atụrụ, kama na-esi ebe ọzọ arịba, ọ bụ onye ohi na onye na-apụnara mmadụ ihe.+ 2 Ma onye na-esi n’ọnụ ụzọ abanye bụ onye na-azụ atụrụ.+ 3 Onye na-eche ọnụ ụzọ nche na-emeghere ya ụzọ,+ atụrụ na-anụkwa olu ya.+ Ọ na-akpọ atụrụ ya aha, na-edurukwa ha apụ. 4 Mgbe ọ kpọpụtara atụrụ niile bụ́ nke ya, ọ na-aga n’ihu ha, ha esoro ya n’ihi na ha ma olu ya. 5 Ha emekataghị soro onye ha na-amaghị, kama ha ga-agbara ya ọsọ n’ihi na ha amaghị olu ya.” 6 Jizọs meere ha ihe atụ a, ma ha aghọtaghị ihe ọ na-agwa ha.
7 Jizọs wee kwuo ọzọ, sị: “N’eziokwu, ana m asị unu na abụ m ọnụ ụzọ atụrụ si agafe.+ 8 Ndị niile bịara ma na-asị na ha bụ m bụ ndị ohi na ndị na-apụnara mmadụ ihe. Ma atụrụ m egeghị ha ntị. 9 Abụ m ọnụ ụzọ. A ga-azọpụta onye ọ bụla na-esi na m abanye. Ọ ga na-abanye ma na-apụ, na-achọtakwa ebe ọ ga-ata nri.+ 10 Onye ohi anaghị abịa ma ọ́ bụghị ka o zuo atụrụ, gbuo ha ma bibie ha.+ Abịara m ka ha nweta ndụ ma nweta ya n’uju. 11 Abụ m ezigbo onye ọzụzụ atụrụ.+ Ezigbo onye ọzụzụ atụrụ na-enye ndụ* ya maka atụrụ ya.+ 12 Onye e goro ọrụ ịzụ atụrụ, onye atụrụ na-abụghịkwa nke ya, na-ahụ anụ ọhịa wolf* ka ọ na-abịa, ya ahapụ atụrụ gbaa ọsọ (anụ ọhịa wolf eburu ha ma chụsasịa ha) 13 n’ihi na ọ bụ onye e goro ọrụ, ihe banyere atụrụ ahụ anaghịkwa emetụ ya n’obi. 14 Abụ m ezigbo onye ọzụzụ atụrụ. Ama m atụrụ m, atụrụ m makwa m,+ 15 otú ahụ Nna m ma m, mụnwa amarakwa Nna m.+ M na-enyekwa ndụ* m n’ihi atụrụ m.+
16 “Enwekwara m atụrụ ọzọ, ndị na-anọghị n’ogige atụrụ a.+ M ga-akpọtakwa ha, ha ga-ege m ntị. Ha ga-aghọ otu ìgwè atụrụ, nweekwa otu onye ọzụzụ atụrụ.+ 17 Nna m hụrụ m n’anya+ maka na m na-enye ndụ* m+ ka m wee nweta ya ọzọ. 18 O nweghị onye na-anapụ m ndụ m, kama ọ bụ m ji aka m enyefe ya. Enwere m ikike inyefe ya, enwekwara m ikike inweta ya ọzọ.+ Ọ bụ Nna m nyere m iwu a.”
19 Ndị Juu kewakwara ọzọ+ n’ihi ihe a o kwuru. 20 Ọtụtụ n’ime ha nọ na-asị: “Mmụọ ọjọọ ji ya, isi adịghịkwa ya mma. Gịnị mere unu ji na-ege ya ntị?” 21 Ndị ọzọ sịrị: “Ihe a abụghị okwu onye mmụọ ọjọọ ji. Mmụọ ọjọọ ọ̀ ga-emegheli anya ndị ìsì?”
22 N’oge ahụ, e mere Ememme Inyefe Chineke Ụlọ na Jeruselem. Ọ bụ oge oyi. 23 Jizọs nọ na-ejegharị n’ụlọ nsọ, n’ebe a na-akpọ varanda Solomọn.+ 24 Ndị Juu wee gbaa ya gburugburu ma bido ịsị ya: “Ị̀ ga-ekowe anyị* obi n’elu ruo ole mgbe? Ọ bụrụ na ị bụ Kraịst, gwa anyị hoo haa.” 25 Jizọs zara ha, sị: “Agwara m unu, ma unu ekweghị. Ọrụ niile m na-arụ n’aha Nna m na-agba àmà banyere m.+ 26 Ma unu ekweghị n’ihi na unu abụghị atụrụ m.+ 27 Atụrụ m na-anụ olu m, amakwa m ha, ha na-esokwa m.+ 28 M na-enye ha ndụ ebighị ebi,+ e nweghịkwa ihe ga-eme ka e bibie ha. E nweghị onye ga-apụnara m ha.+ 29 Ihe Nna m nyere m karịrị ihe niile ọzọ, e nweghịkwa onye nwere ike ịpụnara ha Nna m.+ 30 Mụ na Nna m bụ otu.”*+
31 Ndị Juu tụtụụrụ nkume ọzọ ka ha tụọ ya. 32 Jizọs wee sị ha: “M nọrọla n’ihu unu rụọ ọtụtụ ọrụ ọma si n’aka Nna m. Ole nke n’ime ọrụ ndị ahụ mere unu ji na-achọ ịtụ m nkume?” 33 Ndị Juu zara ya, sị: “Ọ bụghị ọrụ ọma gị mere anyị ji atụ gị nkume, kama ọ bụ maka na ị na-ekwulu Chineke.+ N’ihi na ị na-eme onwe gị chi n’agbanyeghị na ị bụ mmadụ.” 34 Jizọs sịrị ha: “Ọ̀ bụ na e deghị n’Iwu unu,* sị, ‘Asịrị m: “Unu bụ chi”’?*+ 35 Unu makwa na Akwụkwọ Nsọ anaghị agha ụgha. N’ihi ya, ọ bụrụ na Chineke kpọrọ ndị okwu ya mara ikpe ‘chi,’+ 36 ùnu na-asị m, bụ́ onye Nna m doro nsọ ma zite n’ụwa, ‘Ị na-ekwulu Chineke,’ maka na m sịrị, ‘Abụ m Ọkpara Chineke’?+ 37 Ọ bụrụ na anaghị m arụ ọrụ Nna m chọrọ ka m rụọ, unu ekwerela na m. 38 Ma ọ bụrụ na m na-arụ ha, ọ bụrụgodị na unu ekweghị na m, kwerenụ n’ọrụ ndị ahụ,+ ka unu wee mara ma nọgide na-amara na mụ na Nna m dị n’otu, nakwa na Nna m na mụnwa dịkwa n’otu.”+ 39 Ha wee gbalịa ọzọ ka ha jide ya, ma ọ gbanahụrụ ha.
40 Ọ gaghachiri n’ofe nke ọzọ nke Osimiri Jọdan, bụ́ ebe Jọn nọbu na-eme baptizim.+ O wee nọrọ n’ebe ahụ. 41 Ọtụtụ ndị bịakwutere ya, malite ịsị: “N’eziokwu, Jọn arụghị otu mkpụrụ ọrụ ebube,* ma ihe niile Jọn kwuru banyere nwoke a bụcha eziokwu.”+ 42 Ọtụtụ ndị nọ n’ebe ahụ wee nwee okwukwe na Jizọs.