23 E nyefere nwoke a n’aka unu otú Chineke zubere nakwa otú o bu ụzọ mara na a ga-eme ya.+ Ebe unu nyefere ya n’aka ndị na-emebi iwu, ọ bụ unu kpọgidere ya n’osisi, gbuokwa ya.+ 24 Ma Chineke tọpụrụ ya n’agbụ ọnwụ kere ya, kpọlitekwa ya n’ọnwụ,+ n’ihi na ọnwụ enweghị ike ijigide ya.+