Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w23 Jun p. 2-7
  • Ndị Okenye, Mụtanụ Ihe n’Aka Gidiọn

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ndị Okenye, Mụtanụ Ihe n’Aka Gidiọn
  • Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2023
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • MGBE O SIIRI GỊ IKE ỊDỊ UMEALA N’OBI MA Ọ BỤ ỊMA EBE IKE GỊ RURU
  • MGBE O SIIRI GỊ IKE IRUBE ISI MA Ọ BỤ INWE OBI IKE
  • MGBE O SIIRI GỊ IKE ỊTACHI OBI
  • “Mma Agha Dịịrị Jehova Dịkwara Gidiọn!”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2005
  • Gidiọn na Narị Ndị Ikom Atọ Ya
    Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible
  • Gidiọn Meriri Ndị Midian
    Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
  • “N’ebe Ndị Maara Ebe Ike Ha Ruru Nọ Ka Amamihe Dị”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2000
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2023
w23 Jun p. 2-7

Isiokwu A na-amụ Amụ nke 25

Ndị Okenye, Mụtanụ Ihe n’Aka Gidiọn

“Oge ga-agwụnahụ m ma m kọwa banyere Gidiọn.” —HIB. 11:32.

ABỤ NKE 124 Hụ Jehova na Ụmụnna Anyị n’Anya

IHE ISIOKWU A NA-EKWUa

1. Dị ka e kwuru na 1 Pita 5:2, olee ọrụ dị ezigbo mkpa ndị okenye na-arụ?

JEHOVA nyere ndị okenye ọgbakọ ọrụ ilekọta atụrụ ya ọ na-anaghị eji egwu egwu. Obi dị ndị okenye ụtọ na Jehova tụkwasịrị ha obi, nye ha ọrụ ijere ụmụnna ha ozi. Ha na-arụsikwa ọrụ ike ịbụ “ndị ọzụzụ atụrụ . . . na-azụ ha nke ọma.” (Jere. 23:4; gụọ 1 Pita 5:2.) Obi dị anyị ezigbo ụtọ na anyị nwere ụdị ụmụ nwoke ndị a n’ọgbakọ anyị dị iche iche.

2. Olee ihe nwere ike isiri ụfọdụ ndị okenye ike?

2 Ọtụtụ nsogbu na-abịara ndị okenye mgbe ha na-arụ ọrụ ha. Otu ihe kpatara ya bụ na ilekọta ọgbakọ abụghị obere ọrụ. Otu okenye bi n’Amerịka aha ya bụ Tony mụtara na ya kwesịrị ịmara ebe ike ya ruru mgbe ọ na-ekpebi ọrụ ndị ọ ga-arụ n’ọgbakọ. Ọ sịrị: “Ná mmalite ọrịa koronavaịrọs, m rụrụ nnukwu ọrụ iji hazie ọmụmụ ihe na ozi ọma. Ma n’agbanyeghị otú m si na-arụsi ọrụ ike, e nwere ọtụtụ ihe m ka ga-arụkwa. Ihe a mechara mee ka m ghara ịna-ewepụta ezigbo oge na-agụ Baịbụl, na-amụ ihe n’onwe m, na-ekpekwa ekpere.” Nsogbu bịaara otu okenye bi na Kosovo aha ya bụ Ilir dị iche. Mgbe ọ nọ n’ebe a na-alụ agha, o siiri ya ike ime ihe nzukọ Jehova gwara ya mee. Ọ sịrị: “O siiri m ike ịkata obi mee ihe alaka ụlọ ọrụ gwara m mgbe ha nyere m ọrụ ịga nyere ụmụnna ndị nọ n’ebe agha ahụ siri ezigbo ike aka. Ụjọ ji m. Ihe ahụ ha gwakwara m mee yiri m ihe na-agaghị ekwe omume.” O siiri otu onye ozi ala ọzọ bi n’Eshia aha ya bụ Tim ike ịrụ ihe niile o kwesịrị ịrụ n’ụbọchị ọ bụla. Ọ sịrị: “Mgbe ụfọdụ, ezigbo ike na-agwụ m ebe m na-elekọta ụmụnna anyị.” Olee ihe nwere ike inyere ndị okenye ụdị ihe ndị a siiri ike aka?

3. Olee otú anyị niile nwere ike isi mụta ihe n’akụkọ onyeikpe bụ́ Gidiọn?

3 Ndị okenye nwere ike ịmụta ihe n’aka onyeikpe bụ́ Gidiọn. (Hib. 6:12; 11:32) Gidiọn chebere ndị Chineke ma zụọ ha ka atụrụ. (Ikpe 2:16; 1 Ihe 17:6) Dịkwa ka Gidiọn, a họpụtara ndị okenye ka ha na-elekọta ndị Chineke n’oge ihe siri ezigbo ike. (Ọrụ 20:28; 2 Tim. 3:1) Anyị nwere ike ịmụta ihe n’otú Gidiọn si dịrị umeala n’obi, mara ebe ike ya ruru ma na-erube isi. N’oge ọ na-arụ ọrụ ya, e nwere nsogbu ndị bịaara ya mere o ji dị mkpa ka ọ na-enwe ndidi. Ma ànyị bụ ndị okenye ma anyị abụghị, anyị nwere ike ịmụta ijikwu ndị okenye anyị akpọrọ ihe. Anyị nwere ike ịna-akwado ụmụnna ndị a na-arụsi ọrụ ike.—Hib. 13:17.

MGBE O SIIRI GỊ IKE ỊDỊ UMEALA N’OBI MA Ọ BỤ ỊMA EBE IKE GỊ RURU

4. Olee otú Gidiọn si gosi na ọ dị umeala n’obi, marakwa ebe ike ya ruru?

4 Gidiọn dị umeala n’obi, marakwa ebe ike ya ruru.b Mgbe mmụọ ozi Jehova gwara Gidiọn na Jehova ahọrọla ya ka ọ napụta ndị Izrel n’aka ndị Midian dị ezigbo ike, ọ zara ya ihe gosiri na ọ dị umeala n’obi. Ọ sịrị: “Ọ bụ ọnụmara anyị kacha nta n’ebo Manase, ọ bụkwa m kacha nta n’ụlọ nna m.” (Ikpe 6:15) O weere onwe ya ka onye na-erughị eru ịrụ ọrụ ahụ. Ma, Jehova ma na ọ ga-arụli ya. Jehova nyekwaara ya aka, ya arụọ nnọọ ọrụ ya ahụ nke ọma.

5. Olee mgbe o nwere ike isiri okenye ike ịdị umeala n’obi na ịma ebe ike ya ruru?

5 Ndị okenye na-eme ike ha niile iji hụ na ha dị umeala n’obi ma mara ebe ike ha ruru n’ihe niile. (Maị. 6:8; Ọrụ 20:18, 19) Ha anaghị eji ihe ndị ha ga-emeli ma ọ bụ ihe ndị ha mere etu ọnụ. Ha anakwanụghị eche na ha abaghị uru maka na e nwere mgbe ha na-emejọ ihe. Ma, o nwere ike isiri okenye ike mgbe ụfọdụ ịdị umeala n’obi ma ọ bụ ịma ebe ike ya ruru. Dị ka ihe atụ, o nwere ike ikweta ịrụ ọtụtụ ọrụ ma mechaa chọpụta na ọ ga-esiri ya ike ịrụcha ha niile. O nwekwara ike isiri ya ike ịdị umeala n’obi ma ọ bụ ịma ebe ike ya ruru ma e nwee ndị na-akatọ ya maka otú o si mee otu ihe ma ọ bụ nwee ndị na-eto ya maka otú o si mee ihe ọzọ. Olee ihe ndị okenye ga-amụta n’aka Gidiọn ga-enyere ha aka ma ụdị ihe ndị a mee?

Ebe otu okenye na-egosi otu nwanna ebe a na-edowe ihe nkwagharị ma e kwusachaa ozi ọma.

Okenye nke ma ebe ike ya ruru ka Gidiọn na-adị njikere ịgwa ndị ọzọ ka ha nyere ya aka, dị ka inye aka hazie maka iji ihe nkwagharị aga ozi ọma (A ga-akọwa ya na paragraf nke 6)

6. Olee ihe ndị okenye nwere ike ịmụta n’aka Gidiọn gbasara mmadụ ịma ebe ike ya ruru? (Kọwaakwa ihe e sere na foto e ji kọwaa paragraf a.)

6 Gwa ndị ọzọ ka ha nyere gị aka. Onye ma ebe ike ya ruru na-amata na e nwere ihe ndị ọ na-agaghị emeli. Mgbe Gidiọn gwara ndị ọzọ ka ha nyere ya aka, o gosiri na ọ ma ebe ike ya ruru. (Ikpe 6:27, 35; 7:24) Ndị okenye ma ihe na-emekwa otu ihe ahụ. Nwanna Tony anyị kwuburu okwu ya sịrị: “N’ihi otú e si zụọ m, m na-anara ọrụ karịrị ọrụ m ga-arụli. N’ihi ya, m kpebiri na anyị ga-amụ gbasara mmadụ ịma ebe ike ya ruru n’ofufe ezinụlọ anyị. M gwara nwunye m ka ọ gwa m ihe o chere. M lekwara vidio dị na jw.org isiokwu ya bụ Zụọ Ndị Ọzọ, Tụkwasị Ha Obi, Nyekwa Ha Ihe Ha Ga-eji Rụọ Ọrụ I Nyere Ha, Otú ahụ Jizọs Mere.” Nwanna Tony malitere ịgwa ndị ọzọ ka ha nyere ya aka na-arụ ọrụ ya. Olee uru ọ baara ya? Ọ sịrị: “A na-arụ ọrụ ndị dị n’ọgbakọ nke ọma. M na-enwekwa oge m na-eji eme ka okwukwe m sikwuo ike.”

7. Olee otú ndị okenye nwere ike isi eme ka Gidiọn ma a katọwa ha? (Jems 3:13)

7 Mmadụ katọọ gị, ewela iwe. Nsogbu ọzọ nwere ike ịbịara ndị okenye bụ mgbe ndị mmadụ katọrọ ha. Akụkọ Gidiọn ga-enyekwara ha aka. O doro anya na Gidiọn ma na e nwere ihe ndị ya na-anaghị emeta. N’ihi ya, mgbe ndị Ifrem katọrọ ya, o weghị iwe. (Ikpe 8:1-3) Gidiọn ejighị iwe saa ha okwu. O gere ha ntị mgbe ha na-ekwu obi ha n’ihi na ọ dị umeala n’obi. O jikwa akọ kwuo okwu otú mere ka obi jụrụ ha. Ndị okenye ma ihe na-emekwa ka Gidiọn. Ha na-ege ntị nke ọma ma a katọwa ha, ha anaghịkwa eji iwe azaghachi. (Gụọ Jems 3:13.) Ihe a ha na-eme na-eme ka udo dịrị n’ọgbakọ.

8. Olee ihe ndị okenye kwesịrị ime ma e towe ha? Nye ihe atụ.

8 Nye Jehova otuto niile. Mgbe ndị mmadụ nọ na-eto Gidiọn maka mmeri e meriri ndị Midian, o mere ka e too Jehova. (Ikpe 8:22, 23) Olee otú ndị okenye nwere ike isi eme ka Gidiọn? Ha na-enye Jehova otuto niile maka ihe ndị ha mere. (1 Kọr. 4:6, 7) Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na a jaa okenye mma maka otú o si akụzi ihe, o nwere ike ikwu na ihe ọ kụziri si n’Okwu Chineke nakwa na nzukọ Jehova na-akụziri anyị niile ihe. Ndị okenye nwere ike ịna-eleru onwe ha anya mgbe ụfọdụ ka ha mara ma otú ha si akụzi ihe ọ̀ na-eme ka e too Jehova, ka ọ̀ na-eme ka e towe ha. Legodị ihe otu okenye aha ya bụ Timothy kwuru. Mgbe a họpụtara ya ọhụrụ ka ọ bụrụ okenye, ikwu okwu ihu ọha na-atọ ya ụtọ. Ọ sịrị: “M na-ejikarị ihe atụ toro ogologo ma na-agbagwoju anya ebido okwu m. Ihe a na-emekwa ka ndị mmadụ na-eto m. Ma ọ dị mwute ikwu na ihe a mere ka ndị mmadụ na-eto m kama ito Jehova ma ọ bụ Okwu ya bụ́ Baịbụl.” Nwanna Timothy mechara chọpụta na o kwesịrị ịgbanwe otú o si akụzi ihe ka ndị mmadụ ghara ịna-eto ya otú na-ekwesịghị ekwesị. (Ilu 27:21) Olee uru ihe a o mere bara? Ọ sịrị: “Ọtụtụ ndị agwala m otú okwu m si nyere ha aka idi nsogbu ha, imeri ọnwụnwa bịaara ha, ma ọ bụ ime ka ha na Jehova dịkwuo ná mma. Obi na-atọ m ụtọ ma m nụ ka ndị mmadụ na-ekwu ụdị ihe ndị a karịa otú o si atọ m n’oge ahụ ndị mmadụ na-eto m ọtụtụ afọ gara aga.”

MGBE O SIIRI GỊ IKE IRUBE ISI MA Ọ BỤ INWE OBI IKE

Ebe Gidiọn na-ele ụmụ nwoke Izrel anya ka ha nọ n’iyi na-aṅụ mmiri. Otu n’ime ha ji aka ya na-akwọrọ mmiri na-aṅụ, ndị nke ọzọ ekpunye ihu ná mmiri ahụ na-aṅụ ya.

Gidiọn rubere isi gwa ụfọdụ ndị agha ya ka ha lawa, họrọ narị ụmụ nwoke atọ ndị gosiri na ha mụ anya (A ga-akọwa ya na paragraf nke 9)

9. Olee ihe nwere ike ime ka o siere Gidiọn ike irubere Jehova isi na inwe obi ike? (Kọwaa ihe e sere na foto e ji kọwaa paragraf a.)

9 Mgbe a họpụtachara Gidiọn ka ọ bụrụ onyeikpe, o kwesịrị ịna-erube isi ma nwee obi ike. E nyere ya ọrụ tara ezigbo akpụ, ya bụ, imebisị ebe nna ya na-achụrụ Bel àjà. (Ikpe 6:25, 26) N’oge ọzọ, mgbe Gidiọn kpọkọtara ndị agha ya, Jehova gwara ya ugboro abụọ ka ọ gwa ọtụtụ n’ime ha ka ha laa. (Ikpe 7:2-7) E mechara gwa ya ka ọ gaa lụso ndị iro ha ọgụ n’ebe ha mara ụlọikwuu n’etiti abalị.—Ikpe 7:9-11.

10. Olee mgbe o nwere ike isiri okenye ike irube isi?

10 Ndị okenye kwesịrị ‘ịna-eji obi ha niile erube isi.’ (Jems 3:17) Ọ bụrụ na okenye na-erube isi, ọ na-adị njikere ime ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru nakwa isoro ntụziaka nzukọ Jehova nyere. Ọ na-esi otú a egosi ndị ọzọ otú e si erube isi. Ma, o nwere mgbe ụfọdụ o nwere ike isiri ya ike irube isi. Dị ka ihe atụ, e nwere ike inye ya ọtụtụ ntụziaka, ma ọ bụkwanụ ntụziaka e nyere ana-agbanwe n’egbughị oge, ya esiekwara ya ike ịna-eme ha. Mgbe ụfọdụ, o nwere ike ịna-eche ma ihe ụfọdụ e kwuru ka e mee hà ga-ekweli omume ma ọ bụkwanụ ma hà bụ ihe e kwesịrị ime. E nwekwara ike inye ya ọrụ nwere ike ime ka e jide ya, tụọ ya mkpọrọ. Olee otú ndị okenye nwere ike isi erube isi ka Gidiọn ma ụdị ihe ndị a mee?

11. Olee ihe nwere ike inyere ndị okenye aka ịna-erube isi?

11 Na-ege ntị nke ọma ma a na-enye gị ntụziaka, na-emekwa ya. Chineke gwara Gidiọn otú ọ ga-esi ebibi ebe ịchụàjà nna ya, ebe ọ ga-arụrụ Jehova ebe ịchụàjà, nakwa anụmanụ ọ ga-eji achụrụ ya àjà. Gidiọn enweweghị obi abụọ ma ò kwesịrị ime ihe ahụ Chineke gwara ya mee. O mere ya. Taa, nzukọ Jehova na-esi n’akwụkwọ ozi, n’ịma ọkwa, nakwa n’ụzọ ndị ọzọ enye ndị okenye ntụziaka gbasara ihe ndị anyị ga-eme ka ihe ghara ime anyị, nakwa ihe ga-enyere anyị aka ịnọ Jehova nso. Anyị hụrụ ndị okenye ndị a n’anya n’ihi na ha na-eji obi ha niile eme ihe nzukọ Jehova kwuru ka ha mee. Ọ na-abakwara ọgbakọ niile uru.—Ọma 119:112.

12. Olee otú ndị okenye nwere ike isi mee ihe e kwuru ná Ndị Hibru 13:17 ma ọ bụrụ na a gbanwee ihe ná nzukọ Jehova?

12 Dịrị njikere ime mgbanwe. Cheta na Jehova gwara Gidiọn ka ọ gwa ihe fọrọ obere ka ọ bụrụ ndị agha ya niile ka ha laa. (Ikpe 7:8) Gidiọn nwere ike ịna-eche, sị: ‘Ihe a Jehova gwara m mee ọ̀ dị mkpa? Ọ̀ ga-ekwe omume?’ N’agbanyeghị ya, Gidiọn rubere isi. Taa, ndị okenye na-eme ka Gidiọn ma ọ bụrụ na ha ana-erube isi mgbe nzukọ Jehova gwara ha ka ha mee ihe dị iche n’ihe ha na-emebu. (Gụọ Ndị Hibru 13:17.) Dị ka ihe atụ, n’afọ 2014, Òtù Na-achị Isi gbanwere otú e si enweta ego e ji arụ Ụlọ Nzukọ Alaeze na Ụlọ Mgbakọ. (2 Kọr. 8:12-14) Ọgbakọ agaghịzi na-akwụghachi ego e ji rụọrọ ha Ụlọ Nzukọ Alaeze. Kama, a ga-eji ego ọgbakọ nọ n’ụwa niile nyere n’onyinye na-arụ ụlọ ndị a na-arụ ná nzukọ Jehova ebe ọ bụla a chọrọ ya ọ bụrụgodị na ọgbakọ ndị dị ebe ahụ agaghị akwụghachili ego e ji rụọ ya. Mgbe Nwanna José nụrụ mgbanwe a e mere, o kwetaghị na ọ ga-enwe isi. Ọ nọ na-eche, sị: ‘Ọ bụrụ na e mee ihe a, a gaghị arụ ma otu mkpụrụ Ụlọ Nzukọ Alaeze. Ihe a abụghị otú e si eme ihe n’ebe a.’ Gịnị nyeere Nwanna José aka iso ntụziaka ahụ? Ọ sịrị: “Ihe e kwuru n’Ilu 3:5, 6 mere ka m cheta na m kwesịrị ịtụkwasị Jehova obi. Ọ baakwarala m ezigbo uru. Ọ bụghị naanị na a na-arụ Ụlọ Nzukọ Alaeze n’ike n’ike ugbu a, kama, anyị amụtala na anyị nwere ike isi n’ụzọ dị iche iche nye onyinye ka ihe otu ndị nwere na ihe ndị ọzọ nwere hara otu.”

Ebe otu nwanna yi efe ọ na-eyighị aga ozi ọma na-ezi mmadụ ozi ọma n’ebe a na-eche ụgbọala. Onye uwe ojii nọ n’azụ ha.

Ọ bụrụgodị na a machie anyị ikwusa ozi ọma, anyị ka nwere ike iji obi ike na-ezi ndị mmadụ ozi ọma (A ga-akọwa ya na paragraf nke 13)

13. (a) Olee ihe obi siri Gidiọn ike na ya? (b) Olee otú ndị okenye nwere ike isi eme ka Gidiọn? (Kọwaakwa ihe e sere na foto e ji kọwaa paragraf a.)

13 Jiri obi ike na-eme uche Jehova. Gidiọn rubeere Jehova isi n’agbanyeghị na ụjọ nọ na-atụ ya ịrụ ọrụ ahụ e nyere ya. Ọrụ ahụ nwekwara ike ịta isi ya. (Ikpe 9:17) Mgbe Jehova mechara ka obi sie Gidiọn ike, ọ bịara doo ya anya na Jehova ga-enyere ya aka ichebe ndị ya. Ndị okenye bi n’ebe a machiri anyị iwu nwere ike ịmụta ihe n’aka Gidiọn. Ha na-eji obi ike ebute ụzọ n’ọmụmụ ihe nakwa n’ozi ọma n’agbanyeghị na o nwere ike ime ka e jide ha, gbaa ha ajụjụ ọnụ, chụọ ha n’ọrụ, ma ọ bụkwanụ kụọ ha isi aba okpu.c N’oge oké mkpagbu, ndị okenye ga-enwe obi ike iji rube isi ná ntụziaka ndị a ga-enye ha n’agbanyeghị nsogbu o nwere ike ịkpatara ha. Ntụziaka e nwere ike inye mgbe ahụ nwere ike ịbụ gbasara izi ozi e ji tụnyere akụ́ mmiri ígwé nakwa ihe anyị ga-eme ma Gọg onye Megọg lụsowe anyị agha.—Ezik. 38:18; Mkpu. 16:21.

MGBE O SIIRI GỊ IKE ỊTACHI OBI

14. Olee ihe mere ka o siere Gidiọn ike ịtachi obi?

14 Ọ dị mkpa ka Gidiọn rụsie ọrụ ike ebe ọ bụ onyeikpe. Mgbe ha lụsoro ndị Midian ọgụ n’etiti abalị, ndị Midian agbaa ọsọ, Gidiọn chụụrụ ha si na Ndagwurugwu Jezril ruo n’Osimiri Jọdan. Ọ ga-abụkwa na ọhịa juru ebe ahụ. (Ikpe 7:22) Gidiọn ọ̀ kwụsịrị na Jọdan? Mba. Ọ bụ eziokwu na ike gwụrụ ya, ya na narị mmadụ atọ ya na ha so gafere Jọdan, chụrụkwa ndị Midian na-aga. Ha mechara chụkwute ha ma merie ha.—Ikpe 8:4-12.

15. Olee mgbe o nwere ike isiri okenye ike ịtachi obi?

15 Mgbe ụfọdụ, ezigbo ike nwere ike ịgwụ okenye ebe ọ na-elekọta ọgbakọ na ezinụlọ ya. N’oge ndị ahụ, olee otú okenye nwere ike isi eme ka Gidiọn?

Ebe otu okenye ji Baịbụl na-akasi di na nwunye obi n’ụlọ ọgwụ. Otu nwa agbọghọ dina n’àkwà dị n’akụkụ ha.

Ndị okenye hụrụ anyị n’anya enyerela ọtụtụ ndị e kwesịrị inyere aka aka (A ga-akọwa ya na paragraf nke 16 na nke 17)

16-17. Gịnị nyeere Gidiọn aka ịtachi obi? Oleekwa ihe obi kwesịrị isi ndị okenye ike na ya? (Aịzaya 40:28-31) (Kọwaakwa ihe e sere na foto e ji kọwaa paragraf a.)

16 Tụkwasị Jehova obi na ọ ga-enye gị ike. Gidiọn tụkwasịrị Jehova obi na ọ ga-enye ya ike. Jehova nyekwara ya ike. (Ikpe 6:14, 34) E nwere otu oge Gidiọn na ụmụ nwoke ya na ha so ji ụkwụ na-achụ ndị eze Midian abụọ. Ọ ga-abụ na ndị eze abụọ ahụ nọ na-agba kamel. (Ikpe 8:12, 21) N’agbanyeghị nke ahụ, Jehova nyeere ndị Izrel ahụ aka, ha emerie. Ndị okenye nwekwara ike ịtụkwasị Jehova obi n’ihi na Jehova anaghị “ada mbà, ike anaghịkwa agwụ ya.” Ọ ga-enye ha ike mgbe ọ dị ha mkpa.—Guọ Aịzaya 40:28-31.

17 Ka anyị leba anya n’akụkọ Nwanna Matthew. O so na Kọmitii Na-ahụ Maka Mmekọrịta Anyị na Ndị Ụlọ Ọgwụ. Gịnị na-enyere ya aka ịtachi obi? Ọ sịrị: “Achọpụtala m na ihe e kwuru ná Ndị Filipaị 4:13 bụ eziokwu. E nwere ọtụtụ oge ezigbo ike gwụrụ m, mụ ekpesie ekpere ike, rịọ Jehova ka o nye m ike m ga-eji na-enyere ụmụnna m aka. N’oge ndị ahụ, Jehova nyere m mmụọ ya, ya emee ka m nwee ike, nyekwara m aka ịtachi obi.” Ndị okenye anyị taa na-emekwa ka Gidiọn. Ha na-arụsi ọrụ ike iji lekọta atụrụ Jehova n’agbanyeghị na ọ bụghị mgbe niile ka ọ na-adịrị ha mfe. Ma, ha kwesịrị ịmara ebe ike ha ruru, ghọtakwa na ọ bụghị ihe niile ha chọrọ ime ka ha ga-emeli. Ha kwesịrị ịtụkwasị Jehova obi na ọ ga-anụ arịrịọ ha na-arịọ ya ka o nye ha ike ma nyere ha aka ịtachi obi.—Ọma 116:1; Fil. 2:13.

18. Olee otú ndị okenye nwere ike isi na-eme ka Gidiọn?

18 E nwere ọtụtụ ihe bara uru ndị okenye ga-amụta n’aka Gidiọn. Ha kwesịrị igosi na ha ma ebe ike ha ruru, dịrịkwa umeala n’obi n’ihe gbasara ọrụ ole ha na-ekweta ịrụ nakwa ihe ha na-eme ma a katọọ ha ma ọ bụ too ha. Ha kwesịkwara ịna-erube isi ma nwee obi ike, karịchaa, ka ọgwụgwụ ụwa ochie a ji ọsọ na-eru nso. Obi kwesịkwara isi ha ike na n’agbanyeghị nsogbu ọ bụla bịaara ha, Jehova ga-enye ha ike. N’eziokwu, obi dị anyị ụtọ na anyị nwere ndị ọzụzụ atụrụ na-arụsi ọrụ ike. Anyị jikwa “ụdị ndị a kpọrọ ihe.”—Fil. 2:29.

OLEE OTÚ NDỊ OKENYE GA-ESI NA-AKPA ÀGWÀ NDỊ A GIDIỌN KPARA?

  • Ịdị umeala n’obi na ịma ebe ike ha ruru

  • Irube isi na inwe obi ike

  • Ịtachi obi

ABỤ NKE 120 Dịrị Umeala n’Obi Ka Jizọs

a Jehova họpụtara Gidiọn ka o duo ndị Izrel ma chebe ha n’oge ihe siiri ha ezigbo ike. Gidiọn ji obi ya niile rụọ ọrụ a ruo ihe dị ka afọ iri anọ. Ma, e nwere ọtụtụ ihe ndị siiri ya ike. Anyị ga-eleba anya n’otú ihe Gidiọn mere ga-esi nyere ndị okenye aka taa mgbe nsogbu bịaara ha.

b Mmadụ ịdị umeala n’obi na mmadụ ịma ebe ike ya ruru yiri. Anyị mara ebe ike anyị ruru, anyị ga na-ele onwe anyị anya otú kwesịrị ekwesị, matakwa na e nwere ihe ndị anyị na-agaghị emeli. Anyị dịrị umeala n’obi, anyị ga na-akwanyere ndị ọzọ ùgwù ma na-ewere ha ka ndị ka anyị. (Fil. 2:3) Onye ma ebe ike ya ruru na-adịkarị umeala n’obi.

c Gụọ isiokwu bụ́ “Nọgide Na-efe Jehova Mgbe A Machiri Ọrụ Anyị.” Ọ gbara n’Ụlọ Nche Julaị 2019, peeji nke 10 na nke 11, paragraf nke 10 ruo na nke 13.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya