Ndị Ikpe
2 Mmụọ ozi Jehova+ wee si na Gilgal+ gbagoo Bokim wee sị: “M kpọpụtara unu n’Ijipt ma kpọbata unu n’ala m ṅụụrụ nna nna unu hà iyi na m ga-enye ha.+ M sịkwara, ‘Agaghị m emebi ọgbụgba ndụ mụ na unu.+ 2 Unu na ndị bi n’ala a agbala ndụ.+ Kwatuonụ ebe ịchụàjà ha.’+ Ma unu egeghị ntị n’olu m.+ Gịnị mere unu ji mee ihe a? 3 Ọ bụ ya mere m ji kwuokwa, sị, ‘Agaghị m achụpụ ha n’ebe unu nọ.+ Ha ga-abụrụ unu ọnyà,+ ha ga-aratakwa unu ka unu fewe chi ha.’”+
4 Mgbe mmụọ ozi Jehova gwara ndị Izrel niile ihe ndị a, ha malitere ibesi ákwá ike. 5 Ha wee kpọọ ebe ahụ Bokim,* chụọkwara Jehova àjà n’ebe ahụ.
6 Mgbe Joshụa gwara ndị Izrel lawa, onye nke ọ bụla gawara n’ala o ketara ka o weghara ya.+ 7 Ha nọ na-efe Jehova n’oge niile Joshụa nọ ndụ nakwa n’oge niile ndị okenye ndị dịrị ndụ mgbe Joshụa nwụchara nọ ndụ, bụ́ ndị hụrụ ọrụ niile dị ebube Jehova rụụrụ Izrel.+ 8 Joshụa nwa Nọn, bụ́ ohu Jehova, wee nwụọ mgbe ọ dị otu narị afọ na iri (110).+ 9 Ha wee lie ya n’ala o ketara nke dị na Timnat-hires,+ n’ala Ifrem bụ́ ugwu ugwu, n’ebe ugwu nke Ugwu Geash.+ 10 Ọgbọ ahụ niile nwụkwara otú ndị nna nna ha nwụrụ. Ọgbọ ọzọ wee nọchie ha, bụ́ ndị na-amaghị Jehova ma ọ bụ ihe o meere Izrel.
11 Ndị Izrel wee mee ihe dị njọ n’anya Jehova, na-efekwa Bel.+ 12 Ha wee hapụ Jehova bụ́ Chineke ndị nna nna ha, onye kpọpụtara ha n’Ijipt.+ Ha fewere chi dị iche iche, bụ́ chi nke ndị gbara ha gburugburu.+ Ha kpọọrọ ha isiala ma kpasuo Jehova iwe.+ 13 Ha hapụrụ Jehova ma malite ife Bel na Ashtọret.+ 14 Jehova wee wesa Izrel ezigbo iwe. O nyefere ha n’aka ndị na-akwakọrọ ihe, ha wee na-akwakọrọ ihe ha.+ O nyefere ha n’aka* ndị iro ha gbara ha gburugburu,+ ha enweghịkwa ike iguzo n’ihu ndị iro ha.+ 15 Ebe ọ bụla ha gara, Jehova* na-emegide ha, na-eme ka ọdachi dakwasị ha,+ otú Jehova kwuru nakwa otú Jehova ṅụụrụ ha n’iyi.+ Ha wee na-atagbu onwe ha n’ahụhụ.+ 16 N’ihi ya, Jehova na-enye ha ndị ikpe ga-azọpụta ha n’aka ndị na-akwakọrọ ihe ha.+
17 Ma ha ekweghịdị ege ndị ikpe ahụ ntị, kama ha kpara àgwà ka ndị akwụna hapụ Chineke gaa na-efe chi dị iche iche, na-akpọkwara ha isiala. N’egbughị oge, ha hapụrụ ibi ndụ otú ndị nna nna ha si bie ndụ, bụ́ ndị rubeere iwu Jehova isi.+ Ha emeghị ka ha. 18 Mgbe ọ bụla Jehova nyere ha onyeikpe,+ Jehova na-anọnyere onyeikpe ahụ ma zọpụta ha n’aka ndị iro ha n’oge niile onyeikpe ahụ nọ ndụ; n’ihi na ọ na-ewute Jehova+ na ndị na-emegide ha na ndị na-echi ha ọnụ n’ala na-eme ka ha na-asụ ude.+
19 Ma mgbe onyeikpe ahụ nwụrụ, ha na-ebidokwa kpawa àgwà ọjọọ karịa ndị nna nna ha, na-efe chi dị iche iche ma na-akpọrọ ha isiala.+ Ha akwụsịghị omume ha na isi ike ha. 20 N’ikpeazụ, Jehova wesara Izrel ezigbo iwe+ ma sị: “Ebe ọ bụ na mba a emebiela ọgbụgba ndụ m+ nke m nyere ndị nna nna ha iwu ka ha debe, ha enupụkwarala m isi,+ 21 agaghị m achụpụ mba ọ bụla n’ime mba ndị Joshụa hapụrụ mgbe ọ nwụrụ.+ 22 M ga-eji ya ele ma ndị Izrel hà ga na-eje ije n’ụzọ Jehova+ otú ndị nna nna ha mere.” 23 N’ihi ya, Jehova hapụrụ mba ndị a ka ha nọrọ. Ọ chụpụghị ha ngwa ngwa, o nyefeghịkwa ha n’aka Joshụa.