Akwụkwọ Ozi Mbụ E Degaara Ndị Kọrịnt
4 Anyị chọrọ ka ndị mmadụ were anyị ka ndị na-ejere Kraịst ozi* na ndị na-elekọta ihe nzuzo dị nsọ gbasara Chineke.+ 2 Ma, onye na-elekọta ụlọ kwesịrị ịna-arụ ọrụ ya nke ọma. 3 Ọ bụrụ na unu, ma ọ bụ ndị ụlọikpe, ga-ekpe m ikpe, o nweghị ihe m ji ya kpọrọ. Anaghịdị m ekpe onwe m ikpe. 4 N’ihi na o nweghị ihe ọjọọ ọ bụla m ma m mere. Ma, anaghị m ekwu na m bụ onye ezi omume. Kama, ọ bụ naanị Jehova* na-ekpebi ma ihe m na-eme ọ̀ bụ ihe ọma ka ọ̀ bụ ihe ọjọọ.+ 5 N’ihi ya, unu ekpela onye ọ bụla ikpe+ tupu oge a kara aka eruo, kama, cherenụ ruo mgbe Onyenwe anyị bịara. Ọ bụ ya ga-eme ka ihe ndị e zoro n’ọchịchịrị pụta ìhè, meekwa ka a mata ihe onye ọ bụla bu n’obi. Mgbe ahụkwa ka Chineke ga-aja onye ọ bụla mma otú kwesịịrị onye ahụ.+
6 Ụmụnna m, n’ihe ndị a niile m kwuru, unu kwesịrị iṅomi mụ na Apọlọs+ maka ọdịmma unu, ka unu wee mụta ihe a: “Na-emenụ naanị ihe e dere ede,” ka unu ghara ịdị mpako,+ gharakwa ịna-eche na otu onye ka ibe ya mma. 7 Gịnị ka i nwere mere ị ga-eji chewe na ị ka onye ọzọ mma? Ọ́ bụghị Chineke nyere gị ihe niile i nwere?+ Ọ bụrụ na o nyere gị ihe niile, gịnị mere i ji na-anya isi ka à ga-asị na i ji ike gị nweta ha?
8 Afọ ò jula unu eju ugbu a? Ùnu abaala ọgaranya? Ùnu bụzi ndị eze+ hapụ anyị? Ọ dị m ka ya bụrụ na unu bụzi ndị eze, ka anyị wee soro unu bụrụ ndị eze.+ 9 N’ihi na ọ dị m ka Chineke emeela ka anyị bụ́ ndịozi bụrụ ndị ikpeazụ batara n’ámá egwuregwu ka mmadụ niile kiriwe anyị, maka na a mara anyị ikpe ọnwụ.+ Ụwa niile na ndị mmụọ ozi na ụmụ mmadụ na-ekirikwa anyị.+ 10 E weere na anyị bụ ndị nzuzu+ maka na anyị na-eso ụzọ Kraịst, ma unu chere na unu ma ihe maka na unu na-eso ụzọ Kraịst. Anyị esighị ike, ma unu siri ike. A na-asọpụrụ unu, ma a naghị asọpụrụ anyị. 11 Ruo ugbu a, anyị na-anọ agụụ,+ akpịrị na-akpọkwa anyị nkụ.+ Anyị na-eyi ákwà na-adịghị mma n’anya,* a na-akụkwa anyị ihe.*+ E nweghị ebe anyị bi, 12 anyị jikwa aka anyị na-arụsi ọrụ ike.+ Mgbe ndị mmadụ na-akparị anyị, anyị na-agọzi ha.+ Mgbe ha na-akpagbu anyị, anyị na-enwe ndidi, na-atachikwa obi.+ 13 Mgbe ndị mmadụ na-ekwutọ anyị, anyị na-emeda obi agwa ha okwu.*+ Ruokwa ugbu a, ndị ụwa na-ewere anyị ka ihe e kpofuru ekpofu, nakwa ka ndị a jụrụ ajụ.
14 Ihe mere m ji na-ede ihe ndị a abụghị iji menye unu ihere, kama ọ bụ iji dụọ unu ọdụ maka na unu bụ ụmụ m m hụrụ n’anya. 15 Ọ bụrụgodị na unu nwere puku ndị nkụzi iri (10,000) na-akụziri unu otú unu ga na-esi eso ụzọ Kraịst, unu enweghị ọtụtụ nna. Ma, aghọọla m nna unu maka na m ziri unu ozi ọma+ gbasara Kraịst Jizọs. 16 N’ihi ya, gbalịanụ na-eme ka m.+ 17 M na-ezitere unu Timoti n’ihi na ọ bụ nwa m m hụrụ n’anya, o jikwa obi ya niile na-ejere Onyenwe anyị ozi. Ọ ga-echetara unu otú m si ejere Kraịst Jizọs ozi,+ dị ka m si na-akụziri ọgbakọ niile.
18 Ụfọdụ n’ime unu na-ebuli onwe ha elu maka na ha chere na m gaghị abịa ịhụ unu. 19 Ma, ọ bụrụ uche Jehova,* m ga-abịa ịhụ unu n’oge na-adịghị anya. M chọrọ ịhụ ndị ahụ na-ebuli onwe ha elu, ma ọ bụghị ka m nụ ihe ha na-ekwu, kama ka m mara ma ọ̀ bụ ike Chineke na-edu ha. 20 N’ihi na ihe e ji ama na Alaeze Chineke na-achị anyị bụ ịkpa àgwà na-egosi na ike Chineke na-edu anyị, ọ bụghị ihe anyị kwuru n’ọnụ. 21 Ùnu chọrọ ka m jiri ụtarị bịa hụ unu,+ ka ùnu chọrọ ka m jiri ịhụnanya na obi umeala?