Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 8/01 p. 1
  • Unu Bụ “Ihe Nkiri”!

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Unu Bụ “Ihe Nkiri”!
  • Ozi Alaeze Anyi—2001
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ndị Mmụọ Ozi Bụ “Ndị Mmụọ Na-ejere Ọha Mmadụ Ozi”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2009
  • Ndị Mmụọ Ozi Otú Ha Si Emetụta Ndụ Anyị
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2006
  • Na-eme Ka Ndị Mmụọ Ozi Na-erubere Chineke Isi
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2025
  • Otú Ndị Mmụọ Ozi Pụrụ Isi Nyere Gị Aka
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—2001
km 8/01 p. 1

Unu Bụ “Ihe Nkiri”!

1 Pọl onyeozi dere, sị: “E mere anyị ihe nkiri nye ụwa na ndị mmụọ ozi na mmadụ.” (1 Kọr. 4:9) Gịnị ka nke a pụtara, oleekwa otú o kwesịrị isi metụta anyị n’ozi anyị taa?

2 Nye onye Kọrint, okwu bụ́ “ihe nkiri” ma eleghị anya ga-echetara ya ihe omume e ji eweta asọmpi iji mma alụ ọgụ nke ndị Rom ná njedebe, bụ́ ebe a na-akpụpụta ndị a mara ikpe ọnwụ n’ihu ọtụtụ puku ndị nkiri tupu e gbuo ha n’ụzọ obi ọjọọ. N’otu aka ahụ, ọnụ ọgụgụ bara ụba nke ndị nkiri—ma ndị mmadụ ma ndị mmụọ ozi—hụrụ ahụhụ a tara ndị Kraịst nke narị afọ mbụ maka ịgba àmà banyere Alaeze ahụ. (Hib. 10:32, 33) Omume iguzosi ike n’ezi ihe ha nwere mmetụta n’ahụ ọtụtụ ndị na-ekiri ihe na-emenụ, dịkwa ka ntachi obi anyị na-eme n’ọgbọ egwuregwu nke oge a. Olee ndị anyị bụụrụ ihe nkiri?

3 Nye Ụwa na Mmadụ: Mgbe ụfọdụ, usoro mgbasa ozi na-agbasa akụkọ banyere ọrụ ndị Jehova. Ka anyị na-enwe ekele maka akụkọ ọma ndị mere eme ma zie ezie n’ịkọ banyere ọrụ anyị, anyị na-atụkwa anya na ndị na-ekwutọ anyị ga na-agbasa akụkọ ọjọọ site n’oge ruo n’oge. Ka o sina dị, anyị aghaghị ịnọgide na-eme ka a mara anyị dị ka ndị ozi Chineke site “ná nhota ọjọọ na nhota ọma.” (2 Kọr. 6:4, 8) Nye ndị na-ekiri ihe na-emenụ bụ́ ndị nwere obi eziokwu, o doro anya na anyị bụ ezi ndị na-eso ụzọ Jisọs Kraịst.

4 Nye Ndị Mmụọ Ozi: Ndị mmụọ e kere eke na-ahụkwa anyị. Ekwensu na ndị mmụọ ọjọọ ya na-ele anya—kama ha ji “oké ọnụma” na-ele anya, na-achọ ịkwụsị ‘ọrụ ịgba àmà nke Jisọs.’ (Mkpu. 12:9, 12, 17) Ndị mmụọ ozi na-ekwesị ntụkwasị obi nke Chineke na-ele anya ma na-aṅụrị ọṅụ mgbe ọbụna otu onye mmehie chegharịrị. (Luk 15:10) O kwesịrị iwusi anyị ike ịmara na ndị mmụọ ozi na-ele ozi anyị anya dị ka ọrụ kasị ngwa, nke kasị baa uru a na-arụ n’ụwa taa!—Mkpu. 14:6, 7.

5 Mgbe i zutere mmegide ma ọ bụ chee na ozi gị anaghị arụpụta ihe, cheta na ndị nile nọ n’eluigwe na ala na-ele gị anya. Ntachi obi i ji ikwesị ntụkwasị obi na-enwe na-ekpughe ọtụtụ ihe. N’ikpeazụ, ‘mgba ọma gị nke okwukwe’ ga-enyere gị aka ‘ijidesi ndụ ebighị ebi aka ike.’—1 Tim. 6:12.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya