Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w25 Mee p. 2-7
  • Na-eme Ka Ndị Mmụọ Ozi Na-erubere Chineke Isi

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Na-eme Ka Ndị Mmụọ Ozi Na-erubere Chineke Isi
  • Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2025
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • NDỊ MMỤỌ OZI DỊ UMEALA N’OBI
  • NDỊ MMỤỌ OZI HỤRỤ NDỊ MMADỤ N’ANYA
  • NDỊ MMỤỌ OZI NA-ATACHI OBI
  • NDỊ MMỤỌ OZI NA-ENYE AKA EME KA ỌGBAKỌ DỊ ỌCHA
  • Ndị Mmụọ Ozi Bụ “Ndị Mmụọ Na-ejere Ọha Mmadụ Ozi”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2009
  • Olee Ndị Bụ Ndị Mmụọ Ozi?
    Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
  • Otú Ndị Mmụọ Ozi Pụrụ Isi Nyere Gị Aka
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
  • Ndị Mmụọ Ozi Otú Ha Si Emetụta Ndụ Anyị
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2006
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2025
w25 Mee p. 2-7

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 19

ABỤ NKE 6 Eluigwe Na-akọ Ebube Chineke

Na-eme Ka Ndị Mmụọ Ozi Na-erubere Chineke Isi

“Unu ndị mmụọ ozi Jehova, . . . toonụ ya.”​—ỌMA 103:20.

IHE A GA-AMỤ

Ihe ndị anyị ga-amụta n’aka ndị mmụọ ozi na-erubere Jehova isi.

1-2. (a) Olee otú anyị si dị iche ná ndị mmụọ ozi? (b) Olee ụzọ ndị anyị na ha si yie?

MGBE Jehova kpọbatara gị n’ọgbakọ ya, ọ kpọbatara gị n’ezinụlọ hụrụ ibe ha n’anya. Ndị so na ya bụ ụmụnna ndị si n’ebe dị iche iche nakwa ọtụtụ nde ndị mmụọ ozi. (Dan. 7:9, 10) Ọtụtụ mgbe, anyị chewe banyere ndị mmụọ ozi, anyị nwere ike ịna-echeta ụzọ ndị anyị na ha si dị iche. Dị ka ihe atụ, e kere ndị mmụọ ozi ọtụtụ afọ tupu e kee anyị. (Job 38:4, 7) Ha siri ike karịa anyị. Anyị anaghịkwa ahụ azụ ha anya n’ihe gbasara ịdị nsọ na ime ezi omume n’ihi na anyị ezughị okè.​—Luk 9:26.

2 Ma, n’agbanyeghị ebe ndị a anyị na ha dị iche, e nwere ọtụtụ ụzọ anyị na ha si yie. Dị ka ihe atụ, anyị nwere ike ịkpa àgwà ọma ndị Jehova nwere otú ahụ ndị mmụọ ozi na-akpa. Anyị nwekwara ike ikpebi ihe anyị ga-eme otú ahụ ndị mmụọ ozi na-eme. Dịkwa ka hanwa, anyị nwere aha, nwee àgwà dị iche iche nakwa ọrụ dị iche iche. Anyị kwesịrị ịna-efe Chineke otú ahụ hanwa kwesịkwara ịna-eme.​—1 Pita 1:12.

3. Gịnị ka anyị ga-amụta n’aka ndị mmụọ ozi?

3 Ebe ọ bụ na e nwere ọtụtụ ụzọ anyị na ndị mmụọ ozi si yie, àgwà ọma ha nwere ike ịgba anyị ume, kụziekwara anyị ihe. Nke bụ́ eziokwu bụ na anyị nwere ike ịmụta ọtụtụ ihe dị mkpa n’aka ha. N’isiokwu a, anyị ga-eleba anya n’otú anyị ga-esi si n’aka ndị mmụọ ozi mụta ịdị umeala n’obi, ịhụ ndị mmadụ n’anya, ịtachi obi, na ịgba mbọ ka ọgbakọ dịrị ọcha.

NDỊ MMỤỌ OZI DỊ UMEALA N’OBI

4. (a) Olee otú ndị mmụọ ozi si egosi na ha dị umeala n’obi? (b) Gịnị mere ndị mmụọ ozi ji dị umeala n’obi? (Abụ Ọma 89:7)

4 Ndị mmụọ ozi dị umeala n’obi. Ha na-erubere Jehova isi n’agbanyeghị na ha ahụla ọtụtụ ihe, dịrị ike, marakwa ihe. (Ọma 103:20) Ha rụwa ọrụ Chineke nyere ha, ha anaghị eji ihe ndị ha mere anya isi ma ọ bụ jiri ike ha na-eme ka ndị mmadụ towe ha. Ha na-eji obi ụtọ eme ihe ọ bụla Jehova gwara ha mee, ọ bụrụgodị na ndị mmadụ amaghị aha ha.a (Jen. 32:24, 29; 2 Eze 19:35) Ha anaghị ekwe anara otuto e kwesịrị inye Jehova. Gịnị mere ndị mmụọ ozi ji dị umeala n’obi otú a? Ọ bụ n’ihi na ha hụrụ Jehova n’anya, na-akwanyekwara ya ezigbo ùgwù.​—Gụọ Abụ Ọma 89:7.

5. Olee otú ihe otu mmụọ ozi mere mgbe ọ na-agbazi Jọn onyeozi si gosi na ọ dị umeala n’obi? (Kọwaakwa foto.)

5 Legodị otu ihe gosiri na ndị mmụọ ozi dị umeala n’obi. Ihe dị ka n’afọ 96 Oge Ndị Kraịst, otu mmụọ ozi a na-akpọghị aha gosiri Jọn onyeozi ọhụụ dị ịtụnanya. (Mkpu. 1:1) Gịnị ka Jọn mere mgbe ọ hụrụ ọhụụ ahụ? Ọ gbalịrị ka o fee mmụọ ozi ahụ ofufe. Ma mmụọ ozi ahụ kwụsịrị ya ozugbo ma sị ya: “Kpachara anya! Emela ya! Abụ m naanị ohu otú gị na ụmụnna gị bụkwa . . . Na-efe naanị Chineke.” (Mkpu. 19:10) Ihe ahụ o kwuru gosiri na ọ dị umeala n’obi. Mmụọ ozi ahụ achọghị ka e too ya. Ọ gwara Jọn ozugbo ka ọ na-efe naanị Jehova Chineke. Ma, mmụọ ozi ahụ eledaghị Jọn anya. Ọ bụ eziokwu na o feela Jehova ọtụtụ afọ karịa Jọn, dịrịkwa ike karịa ya, o weturu obi kpọọ Jọn ohu ibe ya. N’agbanyeghị na mmụọ ozi ahụ kwesịrị ịgbazi Jọn, o weturu obi mee ya. Ọ bawaraghị ya mba. Kama, o weturu obi gwa Jọn okwu. Ọ ga-abụ na ọ matara na ezigbo ụjọ ji Jọn.

Ebe otu mmụọ ozi na-akwụsị Jọn onyeozi ka ọ ghara ife ya ofufe.

Otu mmụọ ozi gosiri na ọ dị umeala n’obi mgbe ọ na-agbazi Jọn onyeozi (A ga-akọwa ya na paragraf nke 5)


6. Olee otú anyị nwere ike isi dị umeala n’obi ka ndị mmụọ ozi?

6 Olee otú anyị ga-esi mụta ịdị umeala n’obi ka ndị mmụọ ozi? Dị ka ndị mmụọ ozi, anyị ekwesịghị iji ọrụ anyị na-arụsi ike ná nzukọ Jehova na-etu ọnụ ma ọ bụ na-eme ka ànyị nwere nkà pụrụ iche. (1 Kọr. 4:7) Ihe ọzọ bụ na anyị ekwesịghị ịna-eche na anyị ka ndị ọzọ ma ọ bụrụ na anyị efeela Jehova ọtụtụ afọ karịa ha, ma ọ bụ na e nwere ọrụ anyị na-arụ n’ọgbakọ Jehova hanwa na-anaghị arụ. Nke bụ́ eziokwu bụ na ka anyị na-enwetakwu ọrụ n’ọgbakọ, anyị kwesịrị ịna-elekwu onwe anyị anya ka ndị ka nta. (Luk 9:48) Anyị kwesịkwara ịna-ejere ndị ọzọ ozi ka ndị mmụọ ozi. Anyị ekwesịghị ịna-eme ka ndị ọzọ chee na anyị dị mkpa karịa ha.

7. Olee otú anyị ga-esi gosi na anyị dị umeala n’obi mgbe anyị na-agbazi mmadụ ma ọ bụ na-enye ya ndụmọdụ?

7 Anyị nwekwara ike igosi na anyị dị umeala n’obi mgbe anyị na-agbazi mmadụ ma ọ bụ na-enye ya ndụmọdụ, ma onye ahụ ọ̀ bụ nwa anyị ma ọ̀ bụ nwanna anyị. Mgbe ụfọdụ, anyị kwesịrị inye mmadụ ndụmọdụ siri ike. Ma, dị ka mmụọ ozi ahụ weturu obi gbazie Jọn, anyị ga-enyeli mmadụ ndụmọdụ siri ike n’emeghị ka obi daa ya mbà. Ọ bụrụ na anyị anaghị eche na anyị ka ndị ọzọ, anyị ga-eji Baịbụl nye mmadụ ndụmọdụ otú gosiri na anyị na-akwanyere ya ùgwù, na-enwekwara ya ọmịiko.​—Kọl. 4:6.

NDỊ MMỤỌ OZI HỤRỤ NDỊ MMADỤ N’ANYA

8. (a) Dị ka e kwuru na Luk 15:10, olee otú ndị mmụọ ozi si egosi na ha hụrụ ndị mmadụ n’anya? (b) Olee otú ndị mmụọ ozi si enyere anyị aka n’ozi ọma? (Kọwaakwa foto.)

8 Ihe gbasara ndị mmadụ na-emetụ ndị mmụọ ozi n’obi. Ha hụrụ ndị mmadụ n’anya. Obi na-atọkwa ha ụtọ ma onye mmehie chegharịa, ya bụ, ma onye kwụsịrị ife Jehova lọghachikwute ya ma ọ bụkwanụ ma mmadụ mụta banyere Jehova ma gbanwee bata n’ọgbakọ. (Gụọ Luk 15:10.) Ndị mmụọ ozi na-enyekwara anyị aka mgbe anyị na-ekwusa ozi ọma. (Mkpu. 14:6) Ọ bụ eziokwu na ha anaghị ezi ndị mmadụ ozi ọma, ha nwere ike ime ka onye nkwusa gaa na nke onye chọrọ ịmụta eziokwu banyere Jehova. N’eziokwu, anyị agaghị ekwuli hoo haa na ọ bụ ndị mmụọ ozi mere ka anyị gakwuru otu onye zie ya ozi ọma. A sị ka e kwuwe, Jehova nwere ike iji mmụọ nsọ ya ma ọ bụ si n’ụzọ ndị ọzọ nyere ndị chọrọ ịmụta gbasara ya aka, ma ọ bụ mee ka ndị ohu ya gakwuru ha. (Ọrụ 16:6, 7) Ma, ọ na-eji ndị mmụọ ozi enyere anyị aka mgbe anyị na-ekwusa ozi ọma. N’ihi ya, anyị kwusawa ozi ọma, ka obi sie anyị ike na ndị mmụọ ozi ga-enyere anyị aka.​—Gụọ igbe isiokwu ya bụ “A Zara Ekpere Ha.”b

Ebe otu nwanna na nwunye ya ji ihe a na-akwagharị akwagharị na-aga n’okporo ámá. Ndị mmụọ ozi na-efe n’elu emee ka nke nwaanyị hụ otu nwaanyị obi na-adịghị mma nke nọ n’oche.

Ebe otu nwanna na nwunye ya mechiri ozi ọma n’ebe ndị mmadụ na-anọkarị. Ka ha na-ala, nwanna nwaanyị ahụ hụrụ otu nwaanyị yiri onye ihe na-enye nsogbu n’obi. Ọ chọpụtara na ndị mmụọ ozi nwere ike ime ka anyị gakwuru ndị chọrọ ka a mụwara ha Baịbụl. N’ihi ya, ọ gakwuuru nwaanyị ahụ ma gwa ya ihe ga-akasi ya obi (A ga-akọwa ya na paragraf nke 8)


A Zara Ekpere Ha

O nwere ike ịbụ na Jehova ji ndị mmụọ ozi za ekpere ndị a a kọrọ akụkọ ha ebe a.

  • Mgbe otu nwanna nwaanyị dị afọ iri na abụọ na mama ya ji ekwentị na-ekwusa ozi ọma na Peruu, ọ kpọrọ otu nwaanyị nke na-arịọ Chineke ka o zite onye ga-enyere ya aka. Nwaanyị ahụ ọ kpọrọ kwuru na ọkpụkpọ ahụ nwanna nwaanyị ahụ kpọrọ ya bụ otú Chineke si za ya ekpere. N’ihi ya, ọ malitere ịmụ Baịbụl. Ọ dịghịkwa anya, ya abịawa ọmụmụ ihe.

  • E nwere otu nwaanyị bi na Romenia ya na Ndịàmà Jehova nọ na-amụ Baịbụl, ya emechaa kwụsị. Ka oge na-aga, mgbe ọ na-elekọta onye ọrịa n’Ịtali, ọ chọrọ ibidokwa ịmụ Baịbụl. Ma, e nweghị Onyeàmà Jehova ọ ma n’ebe ahụ. N’ihi ya, ọ rịọrọ Jehova ka o nyere ya aka. Mgbe obere oge gachara, ezinụlọ ọ na-arụrụ ọrụ gwara ya ka ọ gaa zụtara ha ihe. Ha gwakwara ya ka ọ ghara ikwe ka ya na onye nwe ebe ahụ kparịta ụka. Ha sịrị ya: “Ọ bụ Onyeàmà Jehova. Ọ na-agwa ndị bịara ịzụ ya ihe gbasara Baịbụl.” Nwanna ahụ mekwara otu ihe ahụ mgbe nwaanyị ahụ bịara ịzụ ya ihe. Nwaanyị ahụ kwuru na ọ bụ otú Jehova si za ya ekpere. Ọ maliteghachiri ịmụ Baịbụl, mewekwa nke ọma. Àgwà ọma ya masịrị otu n’ime ụmụ ya ndị nwoke, ya amalite ịmụ Baịbụl, bịawakwa ọmụmụ ihe.

  • Otu di na nwunye bụ́ Ndịàmà Jehova kpebiri ire ụgbọala ha. Mgbe otu nwoke na nwunye ya bịara ileru ụgbọala ahụ anya, ụmụnna ahụ ji ohere ahụ kọwaara ha na ihe mere ha ji chọọ ire ụgbọala ahụ bụ na ha chọrọ iselata aka n’otú ha si emefu ego ka ha nwee ike iwepụtakwu oge na-enyere ndị ọzọ aka ịmụta gbasara Baịbụl. Nwoke ahụ bịara ịzụ ụgbọala sịrị: “Ụnyaahụ, m kpere ekpere, sị, ‘Chineke, biko, mee ka m hụ onye ga-enyere m aka. Enweghị m olileanya. M chọkwara ịmata eziokwu banyere gị.’” O kwuru na ụmụnna ahụ ọ hụrụ bụ otú Chineke si za ekpere ya. Ya na nwunye ya na ụmụ ha nwaanyị abụọ malitere ịmụ Baịbụl. Ndị ezinụlọ ahụ niile na-abịa ọmụmụ ihe ugbu a.

9. Olee ụzọ ndị anyị nwere ike isi na-ahụ ndị mmadụ n’anya ka ndị mmụọ ozi?

9 Olee otú anyị nwere ike isi na-ahụ ndị ọzọ n’anya ka ndị mmụọ ozi? Ọ bụrụ na anyị anụ ka a mara ọkwa na a nabatala onye e kewapụrụ n’ọgbakọ, obi kwesịrị ịdị anyị ụtọ otú ahụ ọ na-adị ndị mmụọ ozi. Anyị kwesịrị ịgbalịsi ike nabata nwanna ahụ, gosikwa ya na anyị hụrụ ya n’anya. (Luk 15:4-7; 2 Kọr. 2:6-8) Anyị nwekwara ike ime ka ndị mmụọ ozi ma ọ bụrụ na anyị na-agbasi mbọ ike n’ozi ọma. (Ekli. 11:6) Otú ahụ ndị mmụọ ozi si enyere anyị aka ma anyị kwusawa ozi ọma ka anyị kwesịkwara ịna-enyere ụmụnna anyị aka n’ozi ọma. Dị ka ihe atụ, anyị nwere ike ịhazi ka anyị na onye nkwusa malitere ikwusa ozi ọma ọhụrụ rụọ n’ozi ọma. Anyị nwekwara ike inyere ụmụnna mere agadi ma ọ bụ ndị na-arịa ọrịa aka ka ha nwee ike ịna-ekwusa ozi ọma.

10. Gịnị ka akụkọ Nwanna Nwaanyị Sara na-akụziri anyị?

10 Gịnịkwanụ ka anyị ga-eme ma ọ bụrụ na anyị agaghị emeli ihe niile anyị chọrọ ime n’ozi ọma? Anyị nwere ike ịchọta ụzọ ndị ọzọ anyị na ndị mmụọ ozi ga-esi na-arụkọ ọrụ n’ozi ọma. Legodị ihe otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Sarac n’India mere. Mgbe ọ sụrụla ụzọ ihe dị ka afọ iri abụọ, ezigbo ọrịa bịara ya. Ọ naghịkwa ebili n’àkwà ya. Ihe a gbawara ya obi. Ma, ụmụnna nọ n’ọgbakọ ha na Baịbụl ọ na-agụchi anya nyeere ya aka inwewekwa obi ụtọ. Ọ chọtara ụzọ ọhụrụ o sizi ekwusa ozi ọma. Ebe ọ bụ na o nweghịzi ike ibili n’àkwà ya dee akwụkwọ ozi, ọ bụzi naanị ekwentị ka o ji na-ekwusa ozi ọma. N’ihi ya, ọ kpọrọ ndị nletaghachi ya n’ekwentị, ha agwakwa ya gbasara ndị ọzọ nwere ike ịchọ ịmụ Baịbụl. Gịnịzi mere? N’ime ọnwa ole na ole, Nwanna Nwaanyị Sara malitere ịmụrụ mmadụ iri asaa Baịbụl. Naanị ya agaghị amụchaliri ha niile ihe. N’ihi ya, ọ gwara ụfọdụ ụmụnna ka ha mụwara ụfọdụ n’ime ha ihe. Ọtụtụ n’ime ndị ahụ ha na-amụrụ ihe na-abịazi ọmụmụ ihe. O doro anya na obi na-adị ndị mmụọ ozi ụtọ inyere ụmụnna ndị dị ka Nwanna Nwaanyị Sara aka, ndị na-eme ike ha niile n’ozi ọma.

NDỊ MMỤỌ OZI NA-ATACHI OBI

11. Olee otú ndị mmụọ ozi si gosi na ha na-atachi obi?

11 Ndị mmụọ ozi na-erubere Jehova isi bụ ndị e ji ama atụ n’ịtachi obi. Ha ahụla mmegbu na ihe ọjọọ ruo ọtụtụ puku afọ. Ha hụrụ mgbe Setan na ọtụtụ ndị mmụọ ozi ndị ọzọ sobu ha na-efe Jehova nupụụrụ Jehova isi. (Jen. 3:1; 6:1, 2; Jud 6) Baịbụl kwukwara banyere otu mmụọ ozi nke otu mmụọ ọjọọ dị ike lụsoro ọgụ ruo ọtụtụ ụbọchị. (Dan. 10:13) Ihe ọzọ bụ na kemgbe e kere Adam na Iv, ndị mmụọ ozi nọ na-ahụ ọtụtụ ndị mmadụ Jehova kere na-anaghị efe ya. N’agbanyeghị ihe ndị a niile, ndị mmụọ ozi ndị a ka ji obi ụtọ na ịnụ ọkụ n’obi na-efe Jehova. Ha ma na ọ ga-ewepụ ihe ọjọọ niile ma oge ọ kara aka ruo.

12. Gịnị nwere ike inyere anyị aka ịna-atachi obi?

12 Olee otú anyị nwere ike isi na-atachi obi ka ndị mmụọ ozi? Dị ka ndị mmụọ ozi, anyị nwere ike ịhụ ka a na-emegbu ndị mmadụ ma ọ bụkwanụ a na-emegide anyị. Ma, obi siri anyị ike na Chineke ga-ewepụ ihe ọjọọ niile ma oge ya ruo. N’ihi ya, dị ka ndị mmụọ ozi na-erubere Jehova isi, “ka ike ime ihe dị mma ghara ịgwụ anyị.” (Gal. 6:9) Jehova kwekwara nkwa inyere anyị aka ka anyị tachie obi. (1 Kọr. 10:13) Anyị kwesịrị ịrịọ Jehova ka o nye anyị mmụọ nsọ ya, nke ga-enyere anyị aka ịna-enwe ndidi na ọṅụ. (Gal. 5:22; Kọl. 1:11) Ọ bụrụkwanụ na a na-akpagbu gị? Tụkwasị Jehova obi gị niile. Ụjọ atụkwala gị. Jehova ga na-akwado gị mgbe niile, na-emekwa ka ị dị ike.​—Hib. 13:6.

NDỊ MMỤỌ OZI NA-ENYE AKA EME KA ỌGBAKỌ DỊ ỌCHA

13. Olee ọrụ pụrụ iche Jehova nyere ndị mmụọ ozi n’oge ikpeazụ a? (Matiu 13:47-49)

13 N’oge ikpeazụ a, Jehova nyere ndị mmụọ ozi ọrụ pụrụ iche. (Gụọ Matiu 13:47-49.) Ozi ọma na-amasị ọtụtụ nde mmadụ ndị si ebe dị iche iche. Ụfọdụ n’ime ha na-agbanwe àgwà ndị ha kwesịrị ịgbanwe, ghọọ Ndị Kraịst. Ma, e nwere ndị na-anaghị eme otú ahụ. Jehova nyere ndị mmụọ ozi ọrụ ‘isi n’ebe ndị ezi omume nọ kpọpụta ndị ajọ omume.’ Ihe ọ pụtara bụ na e nyere ha ọrụ inye aka mee ka ọgbakọ dị ọcha. Ọ pụtaghị na onye ọ bụla hapụrụ ọgbakọ enweghị ike ịlọghachite ma ọ bụkwanụ na a gaghị enweli nsogbu n’ọgbakọ. Ma, obi kwesịrị isi anyị ike na ndị mmụọ ozi na-agbasi mbọ ike ka ọgbakọ anyị dị iche iche dịrị ọcha.

14-15. Olee otú anyị nwere ike isi na-eme ka ndị mmụọ ozi n’ime ka ọgbakọ Jehova dịrị ọcha? (Kọwaakwa foto.)

14 Olee otú anyị nwere ike isi na-eme ka ndị mmụọ ozi n’ime ka ọgbakọ dịrị ọcha? Ọ bụ ịna-eme ihe niile anyị nwere ike ime ka ndị nọ n’ọgbakọ na-akpa àgwà ọma, na-efekwa Jehova otú ọ chọrọ. N’ihi ya, anyị kwesịrị ichebe obi anyị. Otú anyị ga-esi mee ya bụ ịna-emeta ndị hụrụ Jehova n’anya enyi nakwa izere ihe ọ bụla nwere ike ime ka anyị na Jehova ghara ịdị ná mma. (Ọma 101:3) Anyị nwekwara ike inyere ụmụnna anyị aka ka ha ghara ịkwụsị ife Jehova. Dị ka ihe atụ, gịnị ka anyị kwesịrị ime ma anyị mata na nwanna emeela mmehie dị oké njọ? Ebe ọ bụ na anyị hụrụ ya n’anya, anyị ga-agwa ya ka ọ gaa gwa ndị okenye. Ma, ọ bụrụ na o kweghị eme otú ahụ, anyị ga-aga gwa ya ndị okenye. Anyị chọrọ ka e nyere nwanna ọ bụla mere mmehie aka ozugbo ka ya na Jehova dịwakwa ná mma.​—Jems 5:14, 15.

15 Ọ dị mwute na a na-ekewapụ ụfọdụ ndị mere mmehie dị oké njọ n’ọgbakọ. Ụdị ihe ahụ mee, anyị ‘na-akwụsị anyị na ha imekọrịta ihe.’d (1 Kọr. 5:9-13) Ọ na-enye aka eme ka ọgbakọ dị ọcha. Ọ bụrụkwa na anyị na ndị e kewapụrụ n’ọgbakọ anaghị akpakọrịta, ọ bụ ihe ọma ka anyị meere ha. Otú ahụ anyị si akwụsị anyị na ha ịkpakọrịta nwere ike ime ka ha mata na ihe ha mere adịghị mma. Ha mee otú ahụ, anyịnwa, Jehova, na ndị mmụọ ozi na-enwe obi ụtọ.​—Luk 15:7.

Foto ndị na-egosi: 1. Ebe ụmụnna nwaanyị abụọ nọ n’oche dị n’ebe a na-elegharị anya, na-aṅụ kọfị. Otu nọ na-ekwu okwu, onye nke ọzọ elefuo anya. 2. Mgbe e mechara, nwanna nwaanyị nke na-ekwu okwu gakwuuru ndị okenye abụọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze na-agwa ha okwu.

Gịnị ka anyị kwesịrị ime ma anyị mata na nwanna emeela mmehie dị oké njọ? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 14)e


16. Olee ụzọ ndị ị ga-esi na-eme ka ndị mmụọ ozi?

16 Jehova meere anyị ihe ọma kwe ka anyị mụta gbasara ndị mmụọ ozi, anyị na ha ana-arụkọkwa ọrụ. Ka anyị gbalịa mụta àgwà ọma ndị ha nwere, ya bụ, ịdị umeala n’obi, ịhụ ndị mmadụ n’anya, ịtachi obi, na ịgba mbọ ka ọgbakọ na-adị ọcha. Ọ bụrụ na anyị ana-erubere Jehova isi ka ndị mmụọ ozi, anyị ga-eso n’ezinụlọ ndị na-efe Jehova ruo mgbe ebighị ebi.

OLEE OTÚ ANYỊ NWERE IKE ISI NA-EME KA NDỊ MMỤỌ OZI . . .

  • n’ịdị umeala n’obi?

  • n’ịhụ ndị mmadụ n’anya?

  • n’ịgba mbọ ka ọgbakọ na-adị ọcha?

ABỤ NKE 123 Ka Anyị Na-erubere Chineke Isi

a E nwere nde kwuru nde ndị mmụọ ozi. Ma, ọ bụ naanị abụọ ka a kpọrọ aha na Baịbụl, ya bụ, Maịkel na Gebriel.​—Dan. 12:1; Luk 1:19.

b I nwere ike ịhụ akụkọ gbasara ndị ndị mmụọ ozi nyeere aka na Watch Tower Publications Index, n’isiokwu bụ́ “Angels,” n’isiokwu nta bụ́ “angelic direction (examples).”

c Aha a kpọrọ ya abụghị ezigbo aha ya.

d Dị ka a kọwara n’Akụkọ Si n’Aka Òtù Na-achị Isi Maka Afọ 2024​—Agba nke Abụọ, ọ bụrụ na onye e kewapụrụ n’ọgbakọ abịa ọmụmụ ihe, onye nkwusa nwere ike iji akọnuche ya e ji Baịbụl zụọ kpebie ma ọ̀ ga-ekele ya ekele dị nkenke ma nabata ya.

e NKỌWA FOTO: Ebe otu nwanna nwaanyị na-agwa enyi ya ka ọ gaa gwa ndị okenye ihe o mere. Ka obere oge gara, enyi ya ahụ ekweghị aga, nwanna nwaanyị ahụ agakwuruzie ndị okenye gwa ha ihe merenụ.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya