Ruo n’Ókè Ha Aṅaa Ka Mkpakọrịta Ndị Kraịst Dị Mkpa?
1 “Otu osisi adịghị aghọ oké ọhịa.” Okwu ahụ bụ nanị nkwughachi nke ihe Bible kwuru banyere mkpa bụ́ isi nke ụmụ mmadụ—mkpakọrịta. (Ilu 18:1) Mkpakọrịta ndị Kraịst anyị na-egbo mkpa a. N’ụzọ ndị dị aṅaa bara uru?
2 N’ozi: Otu n’ime uru kasịnụ bụ ụzọ ụmụnna anyị si ewusi anyị ike ma na-akwado anyị n’ozi ahụ a na-eje maka ọha. Jisọs zipụrụ ndị na-eso ụzọ ya “abụọ abụọ” ije mee nkwusa. (Mak 6:7; Luk 10:1) N’ikwekọ n’ụkpụrụ a, mgbe anyị na ndị ọzọ na-arụkọ ọrụ n’ozi ubi, anyị na-ahụ ịbụ eziokwu nke Eklisiastis 4:9, 10. Ka anyị na-ejekọ ozi anyị ọnụ, okwukwe, nrubeisi, na ịhụnanya nke ndị anyị na ha na-arụkọ ọrụ na-enye anyị obi ike ma na-eme ka ịnụ ọkụ n’obi anyị dịghachi ọhụrụ.
3 Maka Enyemaka Onwe Onye: Òtù ụmụnna anyị bụkwa isi iyi nke agbamume na nduzi iji nagide nrụgide ma guzogide ọnwụnwa. Ndị anyị na ha na-akpakọrịta bụ́ ndị Kraịst pụrụ ịdọrọ uche anyị gaa n’akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị kwuru okwu banyere ihe ndị na-echegbu anyị. Ha pụrụ ọbụna ikpe ekpere maka anyị, dịkwa ka anyị na-ekpe maka ha. (2 Kọr. 1:11) N’eziekwa, ezi ihe nlereanya ha na-akpali anyị ịrụ ọrụ ọma ma na-ewusi anyị ike.
4 Ná Nzukọ: A na-anụ ụtọ ngọzi nke mkpakọrịta ndị Kraịst mgbe anyị na-agachi nzukọ ọgbakọ anya. (Hib. 10:24, 25) Usoro ihe omume ahụ na-ejupụta ná ntụziaka ime mmụọ, ọnụnọ anyị na-anọkwa ná nzukọ ndị ahụ na-eme ka anyị na ndị kwere ekwe ibe anyị na-akpachi anya. Nnọkọ ndị a na-enye anyị ohere ịnụ ka ụmụnna anyị ndị nwoke na ndị nwanyị na-ekwupụta okwukwe ha, ma ọ̀ bụ site n’elu ikpo okwu ma ọ bụ site n’etiti ndị na-ege ntị. (Rom 1:12) Ihe nkekọ nke mkpakọrịta anyị na-esikwu ike ka anyị na-enwe mkparịta ụka tupu nakwa mgbe e mechisịrị nzukọ. Oge ndị dị otú ahụ na-enye anyị ohere ịkọ ahụmahụ nke anyị bụ́ ndị na-ewuli okwukwe elu. Ọ na-emetụta ụdị mmadụ anyị bụ n’ụzọ bara uru mgbe anyị na ndị hụrụ Jehova, Okwu ya, ọrụ ya, na ndị ya n’anya na-akpakọrịta n’enweghị ihe mgbochi.—Fil. 2:1, 2.
5 Ndị anyị na ha na-akpakọrịta bụ́ ndị Kraịst dị anyị mkpa. E wezuga ha, ịga ije n’ụzọ ahụ dị mkpagide nke na-eduba ná ndụ ga-esi ike karị. Otú ọ dị, site n’ịhụnanya na agbamume ha, anyị pụrụ ịnọgide na-aga n’ihu iru ụwa ọhụrụ ezi omume nke Jehova.—Mat. 7:14.