Usoro Ihe Omume Maka Nzukọ Ije Ozi
Izu Na-amalite August 13
Abụ nke 30
10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Ịma Ọkwa ndị a họtara n’Ozi Alaeze Anyị. Gbaa mmadụ nile ume ikiri vidio bụ́ The New World Society in Action iji kwadebe maka ntụle ya ná Nzukọ Ije Ozi n’izu nke August 27.
17 min: “Ị̀ Chọrọ Imekwu Ihe?”a Gbakwụnye aro ndị a tụrụ banyere imekwu ihe iji gbaara ndị nọ n’ókèala unu àmà. Kwuo okwu n’ụzọ dị mkpirikpi banyere ihe dị n’Ụlọ Nche nke June 15, 1997, peeji nke 26-29.
18 min: “Nyerenụ Ụmụ Unu Aka Ịhazi na Iji Oge Ezumike Eme Ihe n’Ụzọ Amamihe.”b Ọ bụ onye okenye ga-eme ya.
Abụ nke 221 na ekpere mmechi.
Izu Na-amalite August 20
Abụ nke 33
8 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Akụkọ ndekọ ego.
15 min: “Unu Bụ ‘Ihe Nkiri’!”c Kwuo ihe ụfọdụ mere n’ógbè unu bụ́ mgbe ndị mmadụ kwuru okwu ndị dị mma banyere ọrụ ma ọ bụ àgwà Ndịàmà Jehova.—Lee Ụlọ Nche nke March 15, 1998, peeji nke 10, na nke January 15, 1999, peeji nke 32.
22 min: “Ezi Àgwà—Ihe E ji Mara Ndị Na-asọpụrụ Chineke.” Onye okenye ekwuo okwu ga-ewe minit 5 na paragraf nke 1-5. E mesịa ya esoro okenye ọzọ na otu ohu na-eje ozi tụlee ihe fọdụrụ n’isiokwu ahụ n’elu ikpo okwu. Ha ekwuo ụzọ isi kwụsị àgwà ụfọdụ a na-akpa n’echebaraghị ndị ọzọ echiche bụ́ ndị pụrụ ịdọpụ uche n’ebe nzukọ anyị dị ma belata uru ndị anyị na-erite. Ha emee ka ọ pụta ìhè otú mkpakọrịta anyị si bụrụ nke na-agba ume n’ezie mgbe anyị ji ịhụnanya na-echebara ọdịmma ndị ọzọ echiche.—Fil. 2:4.
Abụ nke 72 na ekpere mmechi.
Izu Na-amalite August 27
Abụ nke 40
10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Chetara ndị nkwusa ka ha nye akụkọ ozi ubi ha maka August. Kọọ ná mkpirikpi otu aro ma ọ bụ abụọ banyere ụzọ a pụrụ isi nyefee akwụkwọ Ịdị n’Otu n’Ofufe n’ozi na September.
15 min: “Debe Ntụrụndụ n’Ọnọdụ Ya Kwesịrị Ekwesị.” Onye nduzi ọmụmụ akwụkwọ esoro di na nwunye nwee mkparịta ụka mgbe a gbasara ọmụmụ ihe. Ya ejiri obiọma kwuo na n’oge na-adịbeghị anya ya ahụbeghị ha n’ozi ubi ma ọ bụ ná nzukọ ndị a na-enwe ná ngwụsị izu. Di na nwunye ahụ akọwaa na ịga agbamakwụkwọ na ihe omume ọha na eze ndị ọzọ emewo ka ha ghara inwe ohere. Onye okenye ahụ atụleghachi isi ihe ndị dị n’isiokwu ahụ, na-enyere di na nwunye ahụ aka ịhụ na e kwesịrị ibute ihe ime mmụọ ụzọ mgbe nile. Ha ekwupụta obi ekele ha nwere maka ezi ihe ndị e chetaara ha. Ha ekweta na ha ga-ebute ihe ndị ka mkpa ụzọ n’ọdịnihu.—Lee Ụlọ Nche nke October 1, 2000, peeji nke 19-20.
20 min: “Ntụleghachi Dabeere n’Akụkọ Ihe Mere Eme nke Vidio Bụ́ The New World Society in Action.” Okwu a ga-eso ndị na-ege ntị tụlee. N’October anyị ga-atụle vidio bụ́ United by Divine Teaching. N’ọnọdụ ya, tụlee “Nzukọ Jehova Dị Anyị Mkpa.” Okwu onye okenye ga-ekwu bụ́ nke dabeere n’Ụlọ Nche nke January 1, 2000, peeji nke 30, 31.
Abụ nke 74 na ekpere mmechi.
Izu Na-amalite September 3
Abụ nke 80
8 min: Ịma ọkwa ọgbakọ.
17 min: “Ruo n’Ókè Hà Aṅaa Ka Mkpakọrịta Ndị Kraịst Dị Mkpa?”d Gbakwụnye ihe ndị e kwuru n’okpuru isiokwu nta bụ́ “Site n’Ọgbakọ” bụ́ nke dị n’Ụlọ Nche nke January 15, 1996, peeji nke 22.
20 min: Ịzaghachi Ihe Ndị Pụrụ Igbochi Nkwurịta Okwu. Ntụle na ihe ngosi. Mgbe ndị mmadụ kwuru okwu ma ọ bụ jụọ ajụjụ ndị anyị na-atụghị anya ha n’ozi, anyị kwesịrị ịgbalị ịza ha kama ịgbanwe isiokwu ahụ ma ọ bụ ịkwụsị nkwurịta okwu ahụ. Akwụkwọ Ụzọ Isi Malite Nkwurịta Okwu Bible ga-enyere anyị aka mgbe nile n’ihe banyere nke a. Kwuo ihe ụfọdụ a na-ekwukarị, meekwa ka ndị nkwusa mee ihe ngosi nke ụzọ isi zaghachi na-eji ihe ndị e kwuru n’akwụkwọ Ụzọ Isi Malite Nkwurịta Okwu Bible. Gbaa mmadụ nile ume iji akụkụ a nke akwụkwọ Ụzọ Isi Malite Nkwurịta Okwu Bible na-eme ihe mgbe ọnọdụ ha na-atụghị anya ya bilitere n’ozi.
Abụ nke 121 na ekpere mmechi.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
a Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.
b Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.
c Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.
d Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.