Ndị Ọzụzụ Atụrụ na Ụmụ Atụrụ n’Ime Ọchịchị Chineke
“Jehova bụ onye ikpe anyị, Jehova bụ onye na-enye anyị iwu, Jehova bụ Eze anyị; Ya onwe ya ga-azọpụta anyị.”—AỊSAỊA 33:22.
1. Olee otú a pụrụ isi kwuo na ndị Kraịst narị afọ mbụ na ndị Kraịst nke taa bụ ndị ọchịchị Chineke?
ỌCHỊCHỊ Chineke pụtara ịchịisi site n’aka Chineke. O metụtara ịnabata ịbụ isi Jehova na ịgbaso nduzi na ntụziaka ya ná mkpebi ndị ukwu na ndị nta anyị na-eme ná ndụ. Ọgbakọ narị afọ mbụ ahụ bụ ezi ọchịchị Chineke. Ndị Kraịst na mgbe ahụ pụrụ iji obi eziokwu sị: “Jehova bụ onye ikpe anyị, Jehova bụ onye na-enye anyị iwu, Jehova bụ Eze anyị.” (Aịsaịa 33:22) N’inwe ihe ahụ fọdụrụ e tere mmanụ dị ka akụkụ ya bụ isi, nzukọ Jehova Chineke taa bụkwa n’otu aka ahụ nke ọchịchị Chineke n’ezie.
N’ụzọ Dịgasị Aṅaa Ka Anyị Bụ nke Ọchịchị Chineke Taa?
2. Olee otu ụzọ nke Ndịàmà Jehova si edo onwe ha n’okpuru ịchịisi Jehova?
2 Olee otú anyị pụrụ isi kwuo na nzukọ elu ala nke Jehova bụ nke ọchịchị Chineke? N’ihi na ndị òtù ya na-edo onwe ha n’ezie n’okpuru ịchịisi Jehova. Ha na-agbasokwa idu ndú nke Jisọs Kraịst, bụ́ onye Jehova meworo ka ọ rịgoro n’ocheeze dị ka Eze. Dị ka ihe atụ, n’oge ọgwụgwụ, e mere ka iwu nke a sitere kpọmkwem n’ọnụ Onye Ọchịchị Ukwu ahụ ruo Jisọs ntị: “Tinye mmà iwe ihe ubi Gị, weekwa ihe ubi: n’ihi na oge hour iwe ihe ubi abịaruwo; n’ihi na ihe a ga-ewe n’ubi nke ụwa achabigawo ókè.” (Mkpughe 14:15) Jisọs rubere isi ma na-amalite iwe ihe ubi nke ụwa. Ndị Kraịst na-akwado Eze ha n’oké ọrụ nke a site n’iji ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ozi ọma ma na-eme ndị na-eso ụzọ. (Matiu 28:19; Mak 13:10; Ọrụ 1:8) N’ime otú ahụ, ha bụkwa ndị ha na Jehova, bụ́ Onye Ọchịchị Ukwu ahụ, na-arụkọ ọrụ.—1 Ndị Kọrint 3:9.
3. Olee otú ndị Kraịst si edo onwe ha n’okpuru ochịchị Chineke n’okwu ndị metụtara ụkpụrụ omume?
3 N’omume kwa, ndị Kraịst na-edo onwe ha n’okpuru ịchịisi Chineke. Jisọs sịrị: “Onye na-eme ihe bụ eziokwu na-abịakwute Ìhè ahụ, ka e wee mee ka ọrụ ya pụta ìhè, na a rụworo ha na Chineke.” (Jọn 3:21) Taa, e nwere nrụrịta ụka na-adịghị agwụ agwụ banyere ihe bụ ezi ụkpụrụ omume, ma nrụrịta ụka dị otú a enweghị ọnọdụ n’etiti ndị Kraịst. Ha na-ele ihe Jehova sịrị na ọ rụrụ arụ anya dị ka ihe rụrụ arụ, ha na-ezerekwa ya dị ka ọ̀ bụ ajọ ọrịa na-efe efe! Ha na-elekọtakwa ezinụlọ ha anya, na-erubere ndị mụrụ ha isi, ma nọgide na-edo onwe ha n’okpuru ndị na-achị isi. (Ndị Efesọs 5:3-5, 22-33; 6:1-4; 1 Timoti 5:8; Taịtọs 3:1) N’ụzọ dị otú a, ha na-eme ihe n’ụzọ ọchịchị Chineke, n’ikwekọ n’ụzọ nke Chineke.
4. Olee àgwà ọjọọ Adam na Iv na Sọl gosipụtara, oleekwa otú ndị Kraịst si egosi àgwà dị iche?
4 Adam na Iv tụfuru Paradaịs n’ihi na ha chọrọ ime mkpebi nke onwe ha banyere ihe bụ ihe ọma na ihe ọjọọ. Jisọs achọghị ime otú ahụ ma ọlị. Ọ sịrị: “Etughị m ihe Mụ onwe m na-achọ, kama ihe Onye zitere m na-achọ.” Ndị Kraịst na-etu otu ihe ahụ. (Jọn 5:30; Luk 22:42; Ndị Rom 12:2; Ndị Hibru 10:7) Sọl, bụ́ eze mbụ nke Israel, rubeere Jehova isi n’ezie—kama ọ bụ n’ụzọ a kpaara ókè. N’ihi nke a, a jụrụ ya. Samuel gwara ya, sị: “Ige ntị dị mma karịa ịchụ àjà, ịṅa ntị dị mma karịa àbụ̀bà ebule.” (1 Samuel 15:22) Ọ̀ bụ ụzọ nke ọchịchị Chineke ịgbaso uche Jehova ruo n’ókè ụfọdụ, eleghị anya site n’ijechi ozi ọma ma ọ bụ nzukọ anya, ma daa n’ihe ndị metụtara ụkpụrụ omume ma ọ bụ n’ụzọ ọzọ? N’ezie ọ bụghị! Anyị na-agbalịsi ike ‘ime ihe Chineke na-achọ site ná mkpụrụ obi anyị.’ (Ndị Efesọs 6:6; 1 Pita 4:1, 2) N’adịghị ka Sọl, anyị na-edo onwe anyị kpam kpam n’okpuru ịchịisi Chineke.
Ọchịchị Chineke nke Oge A
5, 6. Olee otú Jehova si emeso ihe a kpọrọ mmadụ taa, gịnịkwa ka ịkwado ndokwa nke a na-arụpụta?
5 N’oge gara aga, Jehova chịrị achị ma kpughee ihe ndị bụ eziokwu site ná ndị mmadụ, dị ka ndị amụma, ndị eze, na ndị ozi. Taa, ọ dịghịzi otú ahụ; e nweghị ndị amụma ma ọ bụ ndị ozi e guzobere n’ike mmụọ nsọ. Kama nke ahụ, Jisọs sịrị na n’oge ọnụnọ ya dị ka eze, na ya ga-achọpụta otu ìgwè ndị na-eso ụzọ nke kwesịrị ntụkwasị obi, bụ́ “ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche,” ọ ga-emekwa ya onye isi nke ihe nile o nwere. (Matiu 24:45-47; Aịsaịa 43:10) Na 1919 a matara ohu ahụ dị ka ihe fọdụrụ ná ndị Kraịst e tere mmanụ. Kemgbe ahụ, n’ịbụ nke Òtù Na-achị Isi nke Ndịàmà Jehova na-anọchite anya ya, ọ bụrụwo isi nke ọchịchị Chineke n’ụwa. Gburugburu ụwa, Kọmitii Alaka dị iche iche, ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị, na ndị okenye ogbakọ na-anọchite anya Òtù Na-achị Isi.
6 Ịkwado nzukọ ọchịchị Chineke ahụ bụ akụkụ dị mkpa nke ido onwe onye n’okpuru ọchịchị Chineke. Nkwado dị otú ahụ na-eme ka e nwee ịdị n’otu na ịga n’usoro gburugburu ụwa n’ime “òtù ndị bụ ụmụnna.” (1 Pita 2:17) Mgbe ọ dị otú a, nke a na-atọ Jehova ụtọ, onye na-abụghị “Chineke nke aghara, kama Ọ bụ Chineke nke udo.”—1 Ndị Kọrint 14:33.
Ndị Okenye Nọ n’Okpuru Ọchịchị Chineke
7. N’ihi gịnị ka a pụrụ iji kwuo na a na-ahọpụta ndị okenye ndị Kraịst n’ụzọ ọchịchị Chineke?
7 Ndị okenye nile a họpụtara ahọpụta, n’agbanyeghị ihe bụ ọnọdụ ịbụ isi ha, na-eru ihe ndị ahụ a chọrọ nke e depụtara na Bible maka ọkwá ọrụ nke onye nlekọta, ma ọ bụ okenye. (1 Timoti 3:1-7; Taịtọs 1:5-9) Gaakwa n’ihu, okwu Pọl nye ndị okenye nke Efesọs metụtakwara ndị okenye nile: “Na-ezenụ onwe unu na ìgwè atụrụ nta nile, nke Mmụọ Nsọ mere unu ndị na-elekọta ya anya n’etiti ya, ka unu na-azụ nzukọ Chineke dị ka atụrụ.” (Ọrụ 20:28) Ee, e ji mmụọ nsọ, nke sitere n’aka Jehova Chineke, ahọpụta ndị okenye. (Jọn 14:26) Nhọpụta ha bụ n’ụzọ nke ọchịchị Chineke. Gaakwa n’ihu, ha na-azụ ìgwè atụrụ Chineke. Ìgwè atụrụ ahụ bụ nke Jehova, ọ bụghị nke ndị okenye. Ọ bụ nke ọchịchị Chineke.
8. Gịnị bụ ibu ọrụ ndị dịịrị ndị okenye taa n’ozuzu ha?
8 N’akwụkwọ ozi o degaara ndị Efesọs, Pọl onyeozi depụtara ihe bụ ibu ọrụ ndị okenye n’ozuzu ya, na-asị: “Ya onwe ya nyekwara ụfọdụ ka ha bụrụ ndị ozi; nyekwa ụfọdụ ka ha bụrụ ndị amụma; nyekwa ụfọdụ ka ha bụrụ ndị na-ezisa ozi ọma; nyekwa ụfọdụ ka ha bụrụ ndị na-azụ atụrụ Chineke na ndị ozizi; ime ka ndị nsọ zuo okè ịrụ ọrụ nke ije ozi, iwuli ahụ nke Kraịst elu dị ka ụlọ.” (Ndị Efesọs 4:11, 12) Ndị ozi na ndị amụma kwụsịrị ịdị mgbe ịbụ nwa ọhụrụ nke “ahụ nke Kraịst” gasịrị. (Tụlee 1 Ndị Kọrint 13:8.) Ma ndị okenye ka jikwa ọrụ n’aka nke ukwuu n’izisa ozi ọma, ịzụ atụrụ, na izi ihe.—2 Timoti 4:2; Taịtọs 1:9.
9. Olee otú ndị okenye kwesịrị isi kwadebe onwe ha iji nọchite anya ihe bụ uche Chineke n’ọgbakọ?
9 Ebe ọchịchị Chineke bụ ịchịisi nke Chineke, ndị okenye dị irè maara ihe bụ uche Chineke nke ọma. E nyere Joshua iwu ịgụ Iwu ahụ kwa ụbọchị. Ọ dịkwa ndị okenye mkpa ịmụ na ịgakwuru Akwụkwọ Nsọ mgbe nile na ịmara nke ọma akwụkwọ e ji amụ Bible ndị ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi bipụtara. (2 Timoti 3:14, 15) Nke a gụnyere magazin Ụlọ Nche na Teta! na mbipụta ndị ọzọ na-egosi otú ụkpụrụ Bible si metụta ọnọdụ ụfọdụ kpọmkwem.a Otú ọ dị, ọ bụ ezie na ọ dị mkpa ka onye okenye mara ma na-agbaso nduzi ndị e bipụtara n’akwụwọ ọgụgụ nke Watch Tower Society, o kwesịkwara ịmara nke ọma ụkpụrụ Akwụkwọ Nsọ ndị bụ ntọala ha. Mgbe ahụ ọ ga-anọ n’ọnọdụ nke iji nghọta na obi ebere tinye nduzi ndị dị n’Akwụkwọ Nsọ n’ọrụ.—Tụlee Maịka 6:8.
Iji Mmụọ Ndị Kraịst Na-eje Ozi
10. Olee àgwà ọjọọ ndị okenye kwesịrị ịnọ na nche megide, n’ụzọ dịkwa aṅaa?
10 N’ihe dị ka afọ 55 O.A., Pọl onyeozi degaara ọgbakọ dị na Kọrint akwụkwọ ozi mbụ ya. Otu n’ime nsogbu ndị ọ hụrụ maka ha metụtara ndị ikom ụfọdụ chọrọ ịbụ ndị a ma ama n’ọgbakọ. Pọl dere, sị: “Ọbụna ugbu a unu erijuwo afọ, ọbụna ugbu a unu ghọrọ ọgaranya, unu bụrụ eze mgbe anyị onwe anyị na-anọghị ya: ee, ọ ga-adị m nnọọ mma, ma a sị na unu bụrụ eze n’ezie, ka anyị onwe anyị wee sookwa unu bụrụ eze.” (1 Ndị Kọrint 4:8) Na narị afọ mbụ O.A., ndị Kraịst nile nwere olileanya nke isoro Jisọs chịa achị dị ka ndị eze na ndị nchụàjà n’eluigwe. (Mkpughe 20:4, 6) Otú ọ dị, n’ụzọ ihe àmà dị na ya, ụfọdụ ndị na Kọrint chefuru na n’elu ụwa e nweghị ndị eze ọ bụla nọ n’ọchịchị Chineke nke ndị Kraịst. Kama ime dị ka ndị eze ụwa nke a, ndị ọzụzụ atụrụ bụ ndị Kraịst na-azụlite ịdị umeala n’obi, bụ́ àgwà nke na-atọ Jehova ụtọ.—Abụ Ọma 138:6; Luk 22:25-27.
11. (a) Olee ihe nlereanya ndị pụtara ìhè nke ịdị umeala n’obi? (b) Echiche dị aṅaa banyere onwe ha ka ndị okenye na ndị Kraịst nile ndị ọzọ kwesịrị inwe?
11 Ịdị umeala n’obi ọ̀ bụ adịghị ike? Ọ dịghị ma ọlị! A kọwara Jehova n’onwe ya dị ka onye dị umeala n’obi. (Abụ Ọma 18:35) Ndị eze Israel duuru ndị agha gaa n’ibu agha ma chịa mba ahụ n’okpuru Jehova. Ma, ọ dị mkpa na onye ọ bụla leziri anya “ka obi ya wee ghara ịdị elu karịa ụmụnne ya.” (Deuterọnọmi 17:20) Jisọs ahụ e mere ka o si n’ọnwụ bilie bụ Eze n’eluigwe. Otú ọ dị, mgbe ọ nọ n’ụwa, ọ sara ụkwụ ndị na-eso ụzọ ya. Lee aha ịdị umeala n’obi ọ bụ! N’igosikwa na ọ chọrọ ka ndị ozi ya dị umeala n’obi n’otu aka ahụ, ọ sịrị: “Ọ bụrụ na Mụ onwe m, bụ́ Onyenwe unu na Onye ozizi unu, sara ụkwụ unu, unu onwe unu na-ejikwa ụgwọ ịsarịta ụkwụ ibe unu.” (Jọn 13:14; Ndị Filipaị 2:5-8) Ebube na otuto nile kwesịrị ịgara Jehova, ọ bụghị mmadụ ọ bụla. (Mkpughe 4:11) Ma hà bụ ndị okenye ma ha abụghị, ndị Kraịst nile kwesịrị iche echiche banyere onwe ha n’ụzọ kwekọrọ n’okwu Jisọs: “Anyị bụ ohu ndị na-abaghị n’ihe; anyị emewo ihe anyị ji ụgwọ ime.” (Luk 17:10) Echiche ọ bụla ọzọ ekwekọghị n’ọchịchị Chineke.
12. N’ihi gịnị ka ịhụnanya ji bụrụ àgwà dị mkpa ka ndị okenye bụ ndị Kraịst zụlite?
12 Tụkwasị n’ịdị umeala n’obi, ndị okenye bụ ndị Kraịst na-azụlite ịhụnanya. Jọn onyeozi gosiri ịdị mkpa nke ịhụnanya mgbe ọ sịrị: “Onye na-adịghị ahụ n’anya amaghị Chineke; n’ihi na Chineke bụ ịhụnanya.” (1 Jọn 4:8) Ndị na-adịghị ahụ n’anya adịghị ekwekọ n’ọchịchị Chineke. Ha amaghị Jehova. Banyere Ọkpara Chineke, Bible na-asị: “Ebe [Jisọs] hụrụ ndị nke aka Ya nọ n’ụwa n’anya, Ọ hụrụ ha n’anya ruo ọgwụgwụ ihe.” (Jọn 13:1) Mgbe ọ na-agwa ndị ikom 11 ga-abụ akụkụ nke òtù na-achị isi n’ọgbakọ ndị Kraịst okwu, Jisọs sịrị: “Nke a bụ ihe M nyere n’iwu, ka unu hụrịta ibe unu n’anya, dị ka M hụrụ unu n’anya.” (Jọn 15:12) Ịhụnanya bụ akara e ji amata ezi Iso Ụzọ Kraịst. Ọ na-adọta ndị obi ha tiwara etiwa, ndị na-eru újú, na ndị a dọtara n’agha n’ụzọ ime mmụọ bụ́ ndị na-achọ nnwere onwe. (Aịsaịa 61:1, 2; Jọn 13:35) Ndị okenye aghaghị ịbụ ihe nlereanya n’igosi ya.
13. Ọ bụ ezie na nsogbu ndị e nwere n’oge a pụrụ isi ike, olee otú onye okenye pụrụ isi nwee mmetụta dị mma n’ọnọdụ nile?
13 Taa, a na-agwa ndị okenye mgbe mgbe ka ha nye aka n’ịhụ maka nsogbu ndị siri ike. Ihe isi ike alụmdi na nwunye pụrụ ịgbami mkpọrọgwụ ma dịgidesie ike. Ndị na-eto eto nwere nsogbu ndị pụrụ isiri ndị toruworo ogo mmadụ ike ịghọta. Nsogbu mmetụta uche na-esikarị ike ịghọta. Onye okenye nke ụdị ihe ndị a chere ihu pụrụ ịbụ onye na-amaghị kpọmkwem ihe ọ ga-eme. Ma ọ pụrụ inwe obi ike na ọ bụrụ na ya ejiri ekpere dabere n’amamihe Jehova, ọ bụrụ na o nyochaa Bible na ihe ọmụma ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi bipụtara, ọ bụrụkwa na o jiri ịdị umeala n’obi na ịhụnanya na-emeso atụrụ ahụ ihe, ọ ga-enwe mmetụta dị mma ọbụna n’ọnọdụ kasị sie ike.
14, 15. Olee okwu ụfọdụ ndị na-egosi na Jehova ejiriwo ọtụtụ ezi ndị okenye gọzie ndị ya?
14 Jehova ejiriwo ‘onyinye dị iche iche e nyere ná mmadụ’ gọzie nzukọ ya n’ụba. (Ndị Efesọs 4:8) Site n’oge ruo n’oge, Watch Tower Society na-anata akwụkwọ ozi na-akpali ọṅụ bụ́ ndị na-agba àmà banyere ịhụnanya ndị okenye dị umeala n’obi na-egosi, bụ́ ndị ji obi ebere na-azụ atụrụ Chineke. Dị ka ihe atụ, otu okenye n’ọgbakọ dere, sị: “Apụghị m icheta nleta onye nlekọta sekit nke metụtara m nke ukwuu karị ma ọ bụ nke a ka na-ekwu okwu banyere ya n’ọgbakọ. Onye nlekọta sekit ahụ nyeere m aka ịhụ ịdị mkpa nke inwe ezi uche mgbe a na-emeso ụmụnna ihe, na-emesi okwu ike n’ebe ịja mma dị.”
15 Otu nwanna nwanyị nke jere n’ụlọ ọgwụ dị n’ebe dị anya ịnara ọgwụ dere, sị: “Lee ka o si bụrụ ihe na-emesi obi ike inwe ike izute onye okenye n’abalị mbụ ahụ jupụtara n’oké nchegbu n’ụlọ ọgwụ nke dị anya nke ukwuu site n’ụlọ! Ya na ụmụnna ndị ọzọ nọnyeere m ruo ogologo oge dị ukwuu. Ọbụna ndị ụwa bụ́ ndị ghọtara ụdị ihe na-arịa m chere na m garaghị enwe ike ịlanarị ma e wezụga nkasi obi, nlekọta, na ekpere nke ụmụnna ndị ahụ na-ahụ n’anya ma rara onwe ha nile nye.” Otu nwanna nwanyị ọzọ dere, sị: “Adị m ndụ taa n’ihi na òtù ndị okenye ji ndidi duzie m n’oge m na-ebu agha megide oké ịda mbà n’obi. . . . Otu nwanna nwoke na nwunye ya amaghị ihe ha ga-agwa m. . . . Ma ihe metụtara m karịsịa bụ na ọ bụ ezie na ha aghọtachaghị ihe na-eme m, ha ji ịhụnanya gosi mmasị n’ebe m nọ.”
16. Olee agbamume Pita nyere ndị okenye?
16 Ee, ọtụtụ ndị okenye na-etinye agbamume ahụ Pita onyeozi nyere n’ọrụ: “Na-azụnụ ìgwè atụrụ nta Chineke nke dị n’etiti unu, na-elekọta ha anya, ọ bụghị n’ihi na mkpa na-akpa unu, kama site n’ọchịchọ obi, dị ka Chineke chọrọ; ọ bụghịkwa n’ihi uru na-eweta ihere, kama n’ihi na unu dị ọkụ n’obi; ọ bụghịkwa dị ka a ga-asị na unu na-eme ndị bụ ihe nketa dị ka ùnu bụ ndị nwe ha, kama na-eme onwe unu ihe atụ ìgwè atụrụ nta ahụ ga-eṅomi.” (1 Pita 5:1-3) Lee ihe ngọzi ndị okenye ndị a na-ekwekọ n’ọchịchị Chineke bụ!
Atụrụ nke Nọ n’Okpuru Ọchịchị Chineke
17. Kpọọ àgwà ụfọdụ nke ndị ndị nile nọ n’ọgbakọ kwesịrị ịzụlite.
17 Otú ọ dị, ọ bụghị nanị ndị okenye mejupụtara ọchịchị Chineke. Ọ bụrụ na ndị ọzụzụ atụrụ ahụ aghaghị ịbụ ndị na-ekwekọ n’ọchịchị Chineke, otú ahụkwa ka atụrụ ahụ na-aghaghị ịbụ. N’ụzọ ndị dị aṅaa? Ee, otu ụkpụrụ ndị ahụ na-eduzi ndị ọzụzụ atụrụ aghaghị iduzi atụrụ ahụ. Ndị Kraịst nile, ọ bụghị nanị ndị okenye, aghaghị ịdị umeala n’obi iji nweta ngọzi Jehova. (Jemes 4:6) Mmadụ nile aghaghị ịzụlite ịhụnanya n’ihi na ọ bụrụ na ọ dịghị, àjà ndị anyị na-achụrụ Jehova adịghị atọ ya ụtọ. (1 Ndị Kọrint 13:1-3) Anyị nile kwa, ọ bụghị nanị ndị okenye, kwesịrị ‘ijupụta ná mmazu nke ihe Jehova na-achọ n’ime amamihe na nghọta nile nke Mmụọ Nsọ.’—Ndị Kọlọsi 1:9.
18. (a) N’ihi gịnị ka inwe ihe ọmụma na-emighị emi nke eziokwu na-ejighị zuo ezu? (b) Olee otú a pụrụ isi mee ka anyị nile jupụta n’ezi ihe ọmụma?
18 Ma ndị na-eto eto ma ndị meworo okenye na-eche mkpebi ndị siri ike ihu mgbe nile ka ha na-agbalị ịnọgide na-ekwesị ntụkwasị obi n’agbanyeghị ibi n’ụwa Setan. Ihe ndị na-ewu ewu n’ụwa n’ihe banyere uwe, egwú, ihe nkiri, na akwụkwọ ọgụgụ na-ama ọnọdụ ime mmụọ nke ụfọdụ ndị aka. Ihe ọmụma na-emighị emi nke eziokwu ahụ ezughị ezu iji nyere anyị aka ịnọgide n’ezi nguzo anyị. Iji jiri n’aka na anyị nọgidere na-ekwesị ntụkwasị obi, anyị kwesịrị ijupụta n’ezi ihe ọmụma. Nghọta na amamihe nke nanị Okwu Chineke pụrụ inye dị anyị mkpa. (Ilu 2:1-5) Nke a pụtara ịzụlite ezi àgwà nke ịmụ ihe, ịtụgharị uche n’ihe anyị na-amụ, na itinye ya n’omume. (Abụ Ọma 1:1-3; Mkpughe 1:3) Pọl na-edegara ndị Kraịst nile akwụkwọ, ọ bụghị nanị ndị okenye, mgbe ọ sịrị: “Nri siri ike bụ nke ndị tozuru okè, ndị a nwaworo nghọta ha n’ihi omume ha na-eme mgbe dum ịtụle ihe ọma na ihe ọjọọ.”—Ndị Hibru 5:14.
Ndị Ọzụzụ Atụrụ na Atụrụ Na-arụkọ Ọrụ n’Otu
19, 20. Olee agbamume ndị e nyere mmadụ nile ịkwado ndị okenye, n’ihi gịnịkwa?
19 N’ikpeazụ, e kwesịrị ikwu na ndị na-akwado ndị okenye na-egosi n’ezie mmụọ nke ikwekọ n’ọchịchị Chineke. Pọl degaara Timoti akwụkwọ, sị: “Ka a gụọ ndị okenye ná ndị kwesịrị nsọpụrụ okpukpu abụọ, bụ́ ndị na-achị isi nke ọma, ma nke kachasịnụ ndị na-adọgbu onwe ha n’ọrụ n’ime okwu Chineke na ozizi.” (1 Timoti 5:17; 1 Pita 5:5, 6) Ọrụ onye okenye bụ ihe ùgwù magburu onwe ya, ma ihe ka ọtụtụ ná ndị okenye bụ ndị nwere ezinụlọ, ndị na-aga ọrụ ego ha kwa ụbọchị ma nwee nwunye na ụmụ ha ga-elekọta. Ọ bụ ezie na ha nwere obi ụtọ ije ozi, ọrụ ha na-adị mfe ma na-eweta ụgwọ ọrụ karị mgbe ọgbakọ na-enye nkwado, ọ bụghị ime nkọcha ma na-ana ihe gabiga ókè.—Ndị Hibru 13:17.
20 Pọl onyeozi sịrị: “Na-echetanụ ndị isi unu, bụ́ mmadụ ndị gwara unu okwu Chineke; na-ekirikwanụ ọpụpụ nke ibi obi ha, na-eṅomikwanụ okwukwe ha.” (Ndị Hibru 13:7) Ee e, Pọl adịghị agba ụmụnna ahụ ume ka ha na-eso ụzọ ndị okenye. (1 Ndị Kọrint 1:12) Iso ụzọ mmadụ ekwekọghị n’ọchịchị Chineke. Ma ọ bụ ihe amamihe dị na ya n’ezie iṅomi okwukwe a nwapụtaworo anwapụta nke onye okenye na-ekwekọ n’ọchịchị Chineke bụ́ onye na-arụsi ọrụ ike n’izisa ozi ọma, onye na-abịachi nzukọ anya, onye jikwa ịdị umeala n’obi na ịhụnanya na-emeso ọgbakọ.
Ihe Akaebe nke Okwukwe
21. Olee otú ndị Kraịst si egosipụta okwukwe siri ike dị ka nke Mosis?
21 N’eziokwu, ịdị adị nke nzukọ ọchịchị Chineke n’oge a kasị rụọ arụ n’akụkọ ihe mere eme mmadụ bụ ihe akaebe nye ike nke Onye Ọchịchị Ukwu ahụ. (Aịsaịa 2:2-5) Ọ bụkwa ihe akaebe nye okwukwe nke ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ nde mmadụ ise bụ́ ndị ikom, ndị inyom, na ụmụntakịrị bụ́ ndị Kraịst, bụ́ ndị ha na nsogbu ndị a na-ezute kwa ụbọchị na-agba mgba, ma ha adịghị echefu na Jehova bụ Onye Ọchịchị ha. Dị nnọọ ka Mosis kwesịrị ntụkwasị obi “nọgidesiri ike, dị ka ọ na-ahụ Onye ahụ Nke a na-apụghị ịhụ Ya anya,” otú ahụ ka ndị Kraịst nke taa nwere okwukwe siri ike yiri nke ahụ. (Ndị Hibru 11:27) Ha nwere ihe ùgwù nke ibi n’okpuru ọchịchị Chineke, ha na-ekelekwa Jehova kwa ụbọchị maka ya. (Abụ Ọma 100:4, 5) Ka ha na-ahụ ikike nzọpụta nke Jehova, ha nwere obi ụtọ ikwupụta, sị: “Jehova bụ onye ikpe anyị, Jehova bụ onye na-enye anyị iwu, Jehova bụ Eze anyị; Ya onwe ya ga-azọpụta anyị.”—Aịsaịa 33:22.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Otu n’ime mbipụta ndị dị otú ahụ bụ akwụkwọ “Na-elezinụ Onwe Unu na Ìgwè Atụrụ ahụ Nile Anya,” nke nwere nduzi Akwụkwọ Nsọ ma bụrụ nke a na-enye ndị nlekọta, ma ọ bụ ndị okenye ọgbakọ a họpụtara ahọpụta.
Gịnị Ka Bible Na-egosi?
◻ N’ụzọ dị aṅaa ka ndị Kraịst si edo onwe ha n’okpuru ọchịchị Chineke?
◻ Olee otú e si hazie ọchịchị Chineke n’oge a?
◻ N’ụzọ ndị dị aṅaa ka ndị okenye ga-akwadebe onwe ha imezu ibu ọrụ ndị ha nwere?
◻ Olee àgwà ndị Kraịst ọ dị mkpa ka ndị okenye zụlite ma gosipụta?
◻ N’ọchịchị Chineke, mmekọrịta dị aṅaa kwesịrị ịdị n’etiti ụmụ atụrụ na ndị ọzụzụ atụrụ?
[Foto dị na peeji nke 16]
Adam na Iv tụfuru Paradaịs n’ihi na ha chọrọ ime mkpebi nke aka ha banyere ihe bụ ihe ọma na ihe ọjọọ
[Foto dị na peeji nke 18]
Ọ bụrụ na onye okenye ejiri umeala n’obi na ịhụnanya mesoo atụrụ ahụ, ọ ga-abụ onye na-enwe mmetụta dị mma mgbe nile