Ilu
1 Ilu dị iche iche Solomọn+ nwa Devid,+ bụ́ eze Izrel,+ tụrụ:
2 E dere ilu ndị a ka mmadụ si na ha mara ihe,+ ka a dọọkwa ya aka ná ntị;
Ka mmadụ si na ha ghọta okwu e ji amamihe kwuo;
3 Ka mmadụ wee nabata aka ná ntị a dọrọ ya+ nke ga-eme ka ọ na-aghọta ihe,
Ka o wee bụrụ onye ezi omume,+ onye na-ele ihe anya otú kwesịrị ekwesị,*+ na onye na-akwụwa aka ọtọ;
4 Ka ndị na-amaghị ihe si na ha mara ihe;+
Ka nwa okorobịa si na ha mụta ihe ma na-eche echiche nke ọma.+
5 Onye ma ihe na-ege ntị ka ọ mụtakwuo ihe.+
Onye na-aghọta ihe na-anabata ezigbo ntụziaka,+
6 Ka o wee ghọta ilu na okwu na-agbagwoju anya,
Okwu ndị ma ihe kwuru nakwa ilu ha tụrụ.+
7 Otú mmadụ si egosi na ya amatawala ihe bụ ịtụ egwu Jehova.+
Ndị nzuzu anaghị eji amamihe na ịdọ aka ná ntị akpọrọ ihe.+
9 Ha dị ka okpu mara mma e ji okooko kpaa nke ị ga-ekpu n’isi,+
Dịrịkwa ka ọmarịcha ihe olu ị ga-anya n’olu.+
10 Nwa m, ọ bụrụ na ndị mmehie agbawa mbọ ka ha rata gị, ekwela.+
11 Ọ bụrụ na ha asị: “Soro anyị.
Ka anyị gaa chechie ndị mmadụ gbuo ha.*
Anyị ga-amakpuru n’ebe zoro ezo, chebiri ndị aka ha dị ọcha.
13 Ka anyị kwakọrọ ihe niile bara ezigbo uru ha nwere.
Anyị ga-eji ihe ndị anyị kwatara kwajuo ụlọ anyị.
14 I kwesịrị ịbịa soro anyị.
Anyị niile ga-eke ihe anyị zutere, ihe otu onye ketara ka ibe ya ga-eketa.”
15 Nwa m, esola ha.
Ha na-eme ngwa ngwa aga egbu mmadụ.*+
17 N’eziokwu, ọ bụ n’efu ka mmadụ na-agbasa ụgbụ ọ ga-eji jide nnụnụ ma ọ bụrụ na nnụnụ ahụ na-ahụ ya.
18 Ọ bụ ya mere ha ji aga ezo ka ha gbuo mmadụ.*
Ha na-amakpuru n’ebe zoro ezo ka ha gbuo ndị ọzọ.
19 Ọ bụ ihe ndị a ka ndị na-aghọ aghụghọ ka ha baa ọgaranya na-eme.
Akụ̀ ha na-enweta ga-ata isi ha.+
20 Ezigbo amamihe+ na-eti mkpu n’okporo ámá.+
Ọ na-etisi mkpu ike n’ámá obodo.+
21 Ọ na-anọ n’isi okporo ụzọ ndị na-ekwo ekwo akpọ òkù.
Ọ na-anọ n’ebe e si abanye n’ọnụ ụzọ ámá obodo, na-asị:+
22 “Unu ndị na-amaghị ihe, olee mgbe unu ga-akwụsị ime iberiibe?
Unu ndị na-akwa ndị mmadụ emo, olee mgbe ịkwa ndị mmadụ emo ga-akwụsị ịtọ unu ụtọ?
Unu ndị nzuzu, olee mgbe unu ga-amụta ihe?+
23 Nabatanụ aka ná ntị m na-adọ unu.+
M ga-enyezi unu amamihe.*
M ga-akụziri unu okwu m.+
24 Ebe ọ bụ na m kpọrọ òkù, ma unu ekweghị aza,
M matịrị aka m, ma e nweghị onye mere ihe ọ bụla,+
25 E nweghị ihe unu ji ndụmọdụ niile m na-enye unu kpọrọ,
Unu anabataghịkwa aka ná ntị m na-adọ unu,
26 M ga-achịkwa unu ọchị mgbe ọdachi ga-adakwasị unu.
M ga-akwa unu emo mgbe ihe unu na-atụ ụjọ ya ga-eme,+
27 Mgbe ihe unu na-atụ ụjọ ya ga-abịa ka oké ifufe,
Mgbe ọdachi ga-adakwasị unu ka oké ifufe mmiri,
Mgbe ahụhụ na nsogbu ga-abịara unu.
28 N’oge ahụ, unu* ga na-akpọ m, ma agaghị m aza.
Unu ga na-achọsi m ike, ma unu agaghị achọta m,+
29 N’ihi na e nweghị ihe unu ji ịmụta ihe kpọrọ,+
Unu achọghịkwa ịtụ egwu Jehova.+
30 Unu anabataghị ndụmọdụ m.
E nweghị ihe unu ji aka ná ntị niile m na-adọ unu kpọrọ.
32 N’ihi na ihe ga-egbu ndị na-amaghị ihe bụ isi ha na-enupụ,
Ndị nzuzu ga-alakwa n’iyi maka na ha anaghị eji ihe akpọrọ ihe.