Jọn Nke Mbụ
5 Onye ọ bụla nke kweere na Jizọs bụ Kraịst bụ nwa Chineke,+ onye ọ bụla nke hụkwara Chineke n’anya hụrụ ụmụ Chineke n’anya. 2 Ọ bụrụ na anyị ahụ Chineke n’anya ma na-eme ihe o nyere n’iwu, anyị ga-eji ya amata na anyị hụrụ ụmụ Chineke n’anya.+ 3 N’ihi na ịhụ Chineke n’anya pụtara ịna-eme ihe ndị o nyere n’iwu,+ ihe ndị o nyere n’iwu esighịkwa oké ike,*+ 4 maka na onye* ọ bụla bụ́ nwa Chineke na-emeri ụwa.+ Ọ bụkwa okwukwe anyị ka anyị ji merie ụwa.+
5 Ònye ga-emerili ụwa?+ Ọ̀ bụ na ọ bụghị onye nwere okwukwe na Jizọs bụ Ọkpara Chineke?+ 6 Ọ bụ onye a bụ onye ji mmiri na ọbara bịa, ya bụ, Jizọs Kraịst. Ọ bụghị naanị mmiri ka o ji,+ kama o ji mmiri na ọbara.+ Mmụọ nsọ na-agbakwa àmà,+ n’ihi na mmụọ nsọ bụ eziokwu ahụ. 7 N’ihi na e nwere ihe atọ na-agba àmà: 8 mmụọ nsọ+ na mmiri+ na ọbara;+ ha atọ na-ekwekọrịtakwa.
9 Anyị na-anabata àmà ndị mmadụ na-agba, ma àmà Chineke na-agba ka nke ha. N’ihi na àmà Chineke na-agba bụ àmà ọ gbara banyere Ọkpara ya. 10 Onye nwere okwukwe n’Ọkpara Chineke ejirila obi ya nabata àmà a gbaara ya. Onye na-enweghị okwukwe na Chineke emeela ya onye ụgha,+ n’ihi na o nweghị okwukwe n’àmà Chineke gbara banyere Ọkpara ya. 11 Ihe a bụ àmà ahụ a gbara, na Chineke nyere anyị ndụ ebighị ebi,+ anyị sikwa n’aka Ọkpara ya enweta ndụ a.+ 12 Onye ya na Ọkpara Chineke dị n’otu* nwere ndụ a. Onye ya na Ọkpara ahụ na-adịghị n’otu* enweghị ndụ a.+
13 M na-edere unu ihe ndị a ka unu wee mara na unu nwere ndụ ebighị ebi,+ unu ndị nwere okwukwe n’aha Ọkpara Chineke.+ 14 Obi ike anyị nwere n’ebe ọ nọ*+ bụ na ihe ọ bụla anyị rịọrọ ya nke dabara n’uche ya, ọ na-anụ olu anyị.+ 15 Ebe ọ bụ na anyị ma na ọ na-anụ ihe ọ bụla anyị na-arịọ ya, anyị ma na anyị ga-enweta ihe anyị na-arịọ, ebe ọ bụ ya ka anyị rịọrọ ihe ndị ahụ.+
16 Ọ bụrụ na onye ọ bụla ahụ nwanna ya ka ọ na-eme mmehie na-anaghị akpata ọnwụ, ọ ga-arịọrọ ya arịrịọ, Chineke ga-enyekwa ya ndụ,+ ya bụ, ndị na-anaghị eme mmehie na-akpata ọnwụ.+ Ma, e nwere mmehie na-akpata ọnwụ. Ọ bụghị mmehie a ka m na-agwa ya ka ọ rịọ arịrịọ maka ya. 17 Ajọ omume niile bụ mmehie,+ ma e nwere mmehie na-anaghị akpata ọnwụ.
18 Anyị ma na onye ọ bụla bụ́ nwa Chineke anaghị anọgide na-eme mmehie, kama onye ahụ bụ́ nwa Chineke* na-eche ya nche, ajọ onye ahụ agaghịkwa ejideli ya.*+ 19 Anyị ma na anyị si na Chineke, ma ụwa niile dị n’aka ajọ onye ahụ.+ 20 Ma anyị ma na Ọkpara Chineke abịala,+ o meekwala ka anyị nwee ikike ịghọta ihe, ka anyị wee mara onye ahụ bụ́ ezigbo onye. Anyị na ezigbo onye ahụ esikwala n’aka Ọkpara ya bụ́ Jizọs Kraịst dị n’otu.+ Ọ bụ onye a bụ ezi Chineke na ndụ ebighị ebi.+ 21 Ụmụntakịrị, kpacharanụ anya ka unu ghara ikpere arụsị.+