Ozi Ọma Luk Dere
3 N’afọ nke iri na ise n’ọchịchị Taịbiriọs Siza, oge Pọntiọs Paịlet bụ gọvanọ Judia, Herọd*+ abụrụ onye na-achị Galili, Filip nwanne ya ana-achị Ituria na Trakọnaịtis, Laịsenias ana-achịkwa Abilini, 2 mgbe Anas bụ otu n’ime ndị isi nchụàjà, Kayafas+ abụrụ nnukwu onye nchụàjà, okwu Chineke ruru Jọn+ nwa Zekaraya ntị n’ala ịkpa.+
3 O wee na-aga n’obodo niile dị gburugburu Osimiri Jọdan, na-ekwusara ndị mmadụ na ha kwesịrị ime baptizim iji gosi na ha echegharịala ka e wee gbaghara ha mmehie ha,+ 4 dị ka e dere n’akwụkwọ Aịzaya onye amụma, sị: “E nwere onye na-eti mkpu n’ala ịkpa, sị: ‘Kwadebenụ ụzọ Jehova!* Meenụ ka okporo ụzọ ya kwụrụ ọtọ.+ 5 A ga-ekpochi ndagwurugwu niile, meekwa ka ugwu ukwu niile na ugwu nta niile dị larịị. Ụzọ ndị gbagọrọ agbagọ ga-akwụrụ ọtọ, ụzọ ndị na-adịghị larịị adịkwa larịị. 6 Mmadụ* niile ga-ahụkwa otú Chineke ga-esi zọpụta ndị mmadụ.’”+
7 Ọ malitere ịgwa ìgwè mmadụ na-abịa ka o mee ha baptizim, sị: “Unu ụmụ ajụala, ònye gwara unu ka unu gbanahụ iwe Chineke na-abịanụ?+ 8 Burunụ ụzọ mịa mkpụrụ gosiri na unu echegharịala. Unu agwakwala onwe unu, sị, ‘Ebreham bụ nna anyị.’ N’ihi na ana m asị unu na Chineke nwere ike isi na nkume ndị a mee ka Ebreham nweta ụmụ. 9 N’eziokwu, e dowelarị anyụike na mgbọrọgwụ osisi. N’ihi ya, a ga-egbutu osisi ọ bụla na-anaghị amị ezigbo mkpụrụ, tụbakwa ya n’ọkụ.”+
10 Ìgwè mmadụ ahụ jụrụ ya, sị: “Gịnịzi ka anyị kwesịrị ime?” 11 Ya asị ha: “Onye nwere uwe abụọ, ya chịrị otu chịnye onye na-enweghị. Onye nwere ihe ọ na-eri, ya meekwa otu ihe ahụ.”+ 12 Ndị ọnaụtụ bịakwara ka o mee ha baptizim.+ Ha sịrị ya: “Onye Ozizi, gịnị ka anyị kwesịrị ime?” 13 Ya asị ha: “Unu anala ihe ọ bụla karịrị ego a na-akwụ n’ụtụ isi.”+ 14 Ndị agha jụkwara ya, sị: “Gịnị ka anyị kwesịrị ime?” Ya asịkwa ha: “Unu anarala onye ọ bụla ihe n’ike ma ọ bụ bo onye ọ bụla ebubo ụgha,+ kama ka ihe a na-enye unu* ju unu afọ.”
15 Ebe ọ bụ na ndị Juu nọ na-atụ anya Kraịst, ha niile nọ na-eche n’obi ha banyere Jọn, sị: “Ọ̀ ga-abụ na ọ bụ ya bụ Kraịst?”+ 16 Jọn gwara ha niile, sị: “Mụnwa ji mmiri na-eme unu baptizim. Ma onye ka m ike na-abịa, onye m na-erughị eru ịtọpụ eriri akpụkpọ ụkwụ ya.+ Ọ ga-eji mmụọ nsọ na ọkụ mee unu baptizim.+ 17 O ji shọvel o ji afụcha ihe n’aka iji dowe ebe ọ na-azọcha ọka ezigbo ọcha. Ọ ga-ekpokọtakwa ọka wit n’ụlọ ọ na-akwasa ihe, ma ọ ga-eji ọkụ a na-enweghị ike imenyụ emenyụ gbaa mkpo ya ọkụ.”
18 Ọ gwakwara ha ọtụtụ ihe ndị ọzọ gbara ha ume, na-ezikwa ha ozi ọma. 19 Ma Jọn gwara Herọd onye na-achị Galili gbasara ihe ọjọọ niile ọ na-eme, gwakwa ya na ọ dịghị mma na ọ kpọọrọ Herodias nwunye nwanne ya. 20 N’ihi ya, Herọd mekwuru ihe ọjọọ ọzọ: Ọ kpọchiri Jọn n’ụlọ mkpọrọ.+
21 Ma mgbe Jọn nọ na-eme ndị ahụ niile baptizim, o mekwara Jizọs baptizim.+ Ka Jizọs nọ na-ekpe ekpere, eluigwe meghere,+ 22 mmụọ nsọ wee bịa n’ụdị nduru bekwasị ya. Otu olu sikwa n’eluigwe kwuo, sị: “Ị bụ Ọkpara m, onye m hụrụ n’anya. Ihe gị masịrị m.”+
23 Jizọs+ dị ihe dị ka afọ iri atọ+ mgbe o bidoro ozi ya. Dị ka ndị mmadụ chere, ọ bụ
nwa Josef,+
nwa Hilaị,
24 nwa Matat,
nwa Livaị,
nwa Melkaị,
nwa Janaị,
nwa Josef,
25 nwa Matatayas,
nwa Emọs,
nwa Nehọm,
nwa Eslaị,
nwa Nagaị,
26 nwa Meyat,
nwa Matatayas,
nwa Semein,
nwa Josek,
nwa Joda,
27 nwa Joanan,
nwa Risa,
nwa Zerubabel,+
nwa Shieltiel,+
nwa Niraị,
28 nwa Melkaị,
nwa Adaị,
nwa Kosam,
nwa Elmedam,
nwa Ea,
29 nwa Jizọs,
nwa Eliiza,
nwa Jorim,
nwa Matat,
nwa Livaị,
30 nwa Simiọn,
nwa Judas,
nwa Josef,
nwa Jonam,
nwa Elayakim,
31 nwa Milia,
nwa Mena,
nwa Matata,
nwa Netan,+
nwa Devid,+
nwa Obed,+
nwa Boaz,+
nwa Salmọn,+
nwa Nashọn,+
33 nwa Aminadab,
nwa Anaị,
nwa Hezrọn,
nwa Pirez,+
nwa Juda,+
nwa Aịzik,+
nwa Ebreham,+
nwa Tira,+
nwa Nehọ,+
nwa Riu,+
nwa Pileg,+
nwa Iba,+
nwa Shila,+
36 nwa Kaịnan,
nwa Apakshad,+
nwa Shem,+
nwa Noa,+
nwa Lemek,+
nwa Ịnọk,
nwa Jered,+
nwa Mahalelel,+
nwa Kaịnan,+
nwa Set,+
nwa Adam,+
nwa Chineke.