Akwụkwọ Ozi E Degaara Ndị Rom
3 Oleezi ihe onye Juu ji ka ndị ọzọ mma? Ma ọ bụ, olee uru ibi úgwù bara? 2 Ha dị ọtụtụ. Nke mbụ bụ na ọ bụ ha ka e nyefere okwu dị nsọ nke Chineke.+ 3 Gịnịzi ka a ga-ekwu gbasara ụfọdụ ndị Juu na-enweghị okwukwe? Okwukwe ha na-enweghị ọ̀ na-egosi na a gaghịzi atụkwasịli Chineke obi? 4 Mbanụ! Kama ka Chineke bụrụ onye eziokwu,+ ọ bụrụgodị na mmadụ niile bụ ndị ụgha,+ otú e dere ya, sị: “Ka okwu gị wee gosi na ị bụ onye ezi omume, ka i gosikwa na ihe ha na-ebo gị abụghị eziokwu.”+ 5 Ma, ọ bụrụ na ajọ omume ndị anyị na-eme na-eme ka a mata na Chineke bụ onye ezi omume, gịnịzi ka anyị ga-ekwu? Ọ̀ pụtara na Chineke na-ekpe ikpe na-ezighị ezi ma o wesa anyị iwe? (Ana m ekwu otú mmadụ si ekwu.) 6 Mbanụ! Ọ bụrụ na Chineke na-ekpe ikpe na-ezighị ezi, oleezi otú ọ ga-esi kpee ụwa ikpe?+
7 Ma ọ bụrụ na m ghara ụgha, ụgha m emee ka a matakwuo na Chineke na-ekwu eziokwu, e wee nye ya otuto, gịnịzi mere e ji ama m ikpe na m bụ onye mmehie? 8 Gịnị mere na anyị agaghị ekwu ihe ahụ ụfọdụ ndị sịrị na anyị na-ekwu, ya bụ, “Ka anyị mewe ihe ọjọọ ka ihe ọma wee bịa”? Ikpe a mara ndị ahụ ziri ezi.+
9 Ànyị kwesịziri iche na anyị ka ndị ọzọ mma? Mbanụ! N’ihi na anyị ekwuola na ndị Juu na ndị Grik bụcha ndị mmehie,+ 10 otú e dere ya, sị: “E nweghị onye bụ́ onye ezi omume, e nweghịdị otu onye.+ 11 E nweghị onye ọ bụla na-aghọta ihe. E nweghị onye na-achọ Chineke. 12 Mmadụ niile akwụsịla ime ihe dị mma. Ha niile bụzi ndị na-abaghị uru. E nweghị onye dị obiọma, e nweghịdị otu onye.”+ 13 “Ọnụ* ha dị ka ili ghe oghe. Ha ejirila ire ha ghọọ aghụghọ.”+ “Okwu ọjọọ ndị na-esi ha n’ọnụ apụta dị ka elò agwọ.”+ 14 “Ha na-abụ ndị mmadụ ọnụ mgbe niile, na-ekwukwa okwu ọjọọ.”+ 15 “Ha* na-eme ngwa ngwa aga egbu mmadụ.”*+ 16 “Ha na-emebisị ihe ndị mmadụ ma na-echi ha ọnụ n’ala, 17 ha amaghịkwa otú ha na ndị ọzọ ga-esi na-adị n’udo.”+ 18 “Ha anaghị atụ egwu Chineke.”+
19 Anyị ma na ọ bụ ndị e nyere Iwu ahụ* ka a gwara ihe niile dị n’Iwu ahụ,* ka e wee mechie ọnụ niile, ka Chineke wee maa ụwa niile ikpe.+ 20 N’ihi ya, e nweghị onye* a ga-akpọ onye ezi omume n’ihu ya maka na ọ na-eme ihe e kwuru n’iwu,+ n’ihi na ọ bụ iwu na-eme ka anyị mata ihe bụ́ mmehie.+
21 Ma ugbu a, o doola anya na mmadụ ga-abụli onye ezi omume n’anya Chineke ma ọ bụrụ na ọ naghị eme ihe e kwuru n’iwu.+ Ọ bụ ihe Iwu Mosis na Akwụkwọ Ndị Amụma* gbara àmà ya.+ 22 N’eziokwu, ndị niile nwere okwukwe ga-abụli ndị ezi omume n’anya Chineke n’ihi okwukwe ha nwere na Jizọs Kraịst maka na e nweghị ihe dị iche n’otu onye na ibe ya.+ 23 N’ihi na mmadụ niile emehiela, ha anaghịkwa akpa àgwà na-eme ka ebube Chineke pụta ìhè.+ 24 Ọ bụ amara ya,+ bụ́ onyinye o nyere n’efu,+ mere e ji akpọ ha ndị ezi omume n’ihi ihe mgbapụta Kraịst Jizọs kwụrụ ụgwọ ya nke e ji zọpụta ha.+ 25 Chineke wepụtara ya ka ọ bụrụ àjà nke ga-eme ka ya na ụmụ mmadụ dịrị n’udo+ ma ha nwee okwukwe n’ọbara ya.*+ Chineke mere ihe a iji gosi na ya bụ onye ezi omume n’ihi na ntachi obi* ya mere ka ọ na-agbaghara mmehie ndị e mere n’oge gara aga. 26 O ji ya gosi na ya bụ onye ezi omume+ n’oge a, ka o wee bụrụkwa onye ezi omume mgbe ọ na-akpọ onye nwere okwukwe na Jizọs onye ezi omume.+
27 È nweziri ihe mere anyị ga-eji na-anya isi? Mba, e nweghị. Olee iwu nke mere na anyị agaghị anya isi? Ọ̀ bụ nke kwuru ka mmadụ na-eme ihe e dere n’iwu?+ Mbanụ! Kama ọ bụ iwu nke kwuru ka mmadụ nwee okwukwe. 28 N’ihi na anyị ma na a na-akpọ mmadụ onye ezi omume n’ihi okwukwe o nwere, ọ bụghị maka na ọ na-eme ihe e kwuru n’iwu.+ 29 Ka Chineke ọ̀ bụ naanị Chineke ndị Juu?+ Ọ́ bụghịkwa Chineke ndị mba ọzọ?+ N’eziokwu, ọ bụkwa Chineke ndị mba ọzọ.+ 30 Ebe ọ bụ na Chineke bụ otu,+ ọ ga-akpọ ndị e biri úgwù ndị ezi omume+ n’ihi okwukwe ha, kpọọkwa ndị a na-ebighị úgwù ndị ezi omume+ n’ihi okwukwe ha. 31 Ànyị ga-atụfuzi iwu maka na anyị nwere okwukwe? Mbanụ! Kama nke ahụ, anyị na-akwado iwu.+