5 E nwere otu Chineke,+ nweekwa otu onye ogbugbo+ n’etiti Chineke na mmadụ,+ ya bụ, Kraịst Jizọs.+6 O ji ndụ ya chụọ àjà, si otú ahụ nye ihe dabara adaba a ga-eji agbapụta mmadụ niile.*+ Ndị mmadụ ga-ekwukwa gbasara ihe a mgbe oge ya ruru.
24 O buuru mmehie anyị+ n’ahụ́ ya mgbe a kpọgidere ya n’osisi,+ ka anyị wee sepụ aka ná mmehie ma na-eme ihe dị mma. “Ahụ́ e merụrụ ya mekwara ka a gwọọ unu.”+