Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w90 4/15 p. 3-4
  • Nrọ Nke Udo Ụwa—Olileanya Nke Nwere Ntụpọ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Nrọ Nke Udo Ụwa—Olileanya Nke Nwere Ntụpọ
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ònye Pụrụ Iweta Udo Na-adịgide Adịgide?
    Teta!—1996
  • Agha Nuklia—Olee Ndị Na-eyi Egwu Ya?
    Teta!—2004
  • Iyi Egwu Nuklia E Wepụ Ya Kpam Kpam!
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
  • Iyi Egwu Nuklia Akwụsịbeghị Ma Ọlị
    Teta!—1999
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
w90 4/15 p. 3-4

Nrọ Nke Udo Ụwa—Olileanya Nke Nwere Ntụpọ

OLILEANYA e nwere maka inweta udo ụwa na-arị elu nke ukwuu. N’ihe o dere n’akwụkwọ akụkọ The Toronto Star, Carol Goar dere, sị: “A na-enwe nkwekọrịta udo n’ebe dị iche iche site n’Afghanistan ruo Angola. Mburịta agha n’ógbè dị iche iche ndị yiri ihe a na-apụghị itinye aka na ha n’ọnwa ole na ole gara aga amalitela igosi ihe àmà nke mbelata. Òtù Mba Ndị Dị n’Otu (United Nations) na-emekwa mgbanwegharị nke na-enye obi ike.” Goar sịrị na nke a akpatawo “ntiwapụ olileanya zuru ụwa ọnụ.” N’otu aka ahụ, otu isiakụkọ dị n’akwukwọ akụkọ USA Today kwupụtakwara, sị: “Udo na-etiwapụ n’ụwa nile.”

Otu nke kasị kwesị ịrịba ama n’oge na-adịghị anya gara aga bụ ihe ahụ akwụkwọ UN Chronicle kọwara dị ka “nkwekọrịta nke nọgidere na-aga n’ihu n’etiti mba Soviet Union na United States.” Nchịpụ usuu ndị agha, ihe ịtụnanya ndị na-eme n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Europe, okwu a na-ekwu banyere ibelata ọnụ ọgụgụ ndị agha na ngwá agha—ihe ndị a nile na-emenụ akpaliwo olileanya nke na ọ pụrụ ịbụ na mba dike ndị ahụ amalitewo ịkwụsịlata ịsọ m̀pì mkpụpụta ngwá agha ahụ. N’ime ụwa ebe a kọrọ na ego a na-emefu n’ihe banyere agha na-anapụ usoro akụ na ụba ihe karịrị 850 puku nde dollar kwa afọ, nke a bụ olileanya dị mma n’ezie.

Ma, ruo n’ókè ha aṅaa ka o yiri ka nrọ nke udo ụwa ọ̀ ga-emezu? Ọbụna ndị kasị nwee olileanya, ndị na-ahụ ihe na-emenụ na-ekwenye na e nwere oké ọdịiche dị n’etiti ibelata ngwá agha na ikpochapụ ngwá agha kpam kpam. Ịchịsa ngwá agha nuklia ga-achọ ntụkwasịrịta obi n’ókè a na-enwetụbeghị ya mbụ. Ma ọ bụ ihe dị mwute na a marawo mba dike ndị ahụ eri ogologo oge gara aga dị ka ndị na-atụkwasịrịtaghị onwe ha obi. Dị ka e buru ya n’amụma n’ime Bible, nke a abụwo ọgbọ ebe ndị mmadụ gosiworo onwe ha ịbụ “ndị na-adịghị agba ndụ [“ndị na-emebi nkwekọrịta,” King James Version].”—2 Timoti 3:3.

E wezụgakwa nke a, ọ bụghị mmadụ nile kweere n’ezie na mkpochapụ nke ngwá agha nuklia ga-eweta udo. Ọbụna ma a sị na a pụrụ ịrụgide mba nile ịchịfusị ngwá agha nuklia ndị ha kwakọbaworo, ngwá agha nkịtị ka pụkwara igbunyụ mmadụ anya. Agha Ụwa nke Mbụ na nke Abụọ bụ ihe àmà dị egwu banyere eziokwu nke a. Ọzọkwa, nkà na ụzụ nke dị mkpa iji mepụtaghachi ngwá agha nuklia ka ga-adị—dịrị njikere, na-echerekwa ihe àmà mbụ nke ọgba aghara ndọrọ ndọrọ ọchịchị. Ọbụna ụfọdụ ndị, dị ka onyeọkà mmụta ndọrọ ndọrọ ọchịchị bụ Richard Ned Lebow, na-arụ ụka, sị: “Eleghị anya, inwe ngwá agha nuklia ole na ole na-eme ka ụmụ mmadụ kpachara anya.”

Ma, ruo ókè ngwá agha nuklia nọgidere na-adị, olileanya dị egwu nke mkpochapụ n’agha nuklia ga-eme ka udo ọ bụla a sị na e nwetawo bụrụ ihe ọchị; otú ahụkwa ka ọ dị n’ihe banyere ndịgide nke nsogbu ndị na-emetụtaghị ibu agha, ndị na-eme ka ọtụtụ nde mmadụ ghara inwe udo ná ndụ ha na-adị kwa ụbọchị. Onye odeakwụkwọ ukwu òtù Mba Ndị Dị n’Otu (UN) bụ Javier Pérez de Cuéllar kwuru okwu banyere “ọnọdụ nke ọtụtụ nde ụmụ amaala ibe anyị ndị na-enweghị ebe obibi ma ọ bụ ndị bi n’ebe na-adịghị mma ma ọlị. Nsogbu ahụ nọgidere na-adịwanye njọ.” Akwụkwọ akụkọ UN Chronicle gara n’ihu ịkọ na emepeghị anya n’ụzọ akụ na ụba na-eweta mmekpa ahụ nye “ụzọ abụọ n’ụzọ atọ nke ihe a kpọrọ mmadụ, mgbe ụfọdụ na-eweta ọnọdụ ịda ogbenye na ụkọ ihe nke a na-apụghị ịmata ọdịiche dị n’etiti ya na ịta ahụhụ nke agha na-eweta.” Gịnịkwanụ banyere ọnọdụ nke ndị ahụ na-agba ọsọ ndụ n’ụwa dum, ndị a na-eche na ọnụ ọgụgụ ha ruru nde mmadụ iri na abụọ? Ibelata ngwá agha ma ọ bụ ọbụna ịchịsa ngwá agha kpam kpam ọ̀ ga-eweta udo ná ndụ ha?

O doro nnọọ anya na nrọ nke mmadụ banyere inweta udo ụwa bụ olileanya nke nwere ntụpọ—elepụghị anya n’ọdịnihu dị anya, eleghị anya n’ụzọ gbasapụrụ agbasapụ, nke a kpaara ókè. È nwere olileanya ka mma maka udo? N’ezie, e nwere. Ná mbipụta magazin bu nke a ụzọ, anyị hụrụ na Bible na-enye olileanya e ji n’aka maka inweta udo.a N’oge na-adịghị anya, Jisọs Kraịst, dị ka Eze nke Alaeze Chineke, ga-eweta udo nke karịrị ihe ọ bụla mmadụ tụworo anya ya. Ma gịnị ka udo nke a ga-apụta n’ezie nye ihe a kpọrọ mmadụ? Isiokwu na-esonụ ga-atụle nke a.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

a Lee “Ònye Ga-eduru Ihe A Kpọrọ Mmadụ Gaa n’Inweta Udo?” ná mbipụta anyị nke April 1, 1990.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya