Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w90 10/1 p. 30-31
  • Ị̀ Na-agbaso Ntụziaka?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ị̀ Na-agbaso Ntụziaka?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • N’ime Ezinụlọ
  • N’ime Ọgbakọ
  • Ihe Ọṅụ Ndị Ọ Na-arụpụta
  • Ị̀ Dị Njikere Ịlanahụ?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2006
  • Ụzọ Isi Mee Ka Ndụ Ezinụlọ Gị Na-enye Obi Ụtọ
    Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?
  • Mozis Mere Ihe Niile E Nyere Ya n’Iwu
    Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2020
  • Ezinụlọ Unu Ga-enweli Obi Ụtọ
    Gịnị Ka Baịbụl Na-akụziri Anyị?
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
w90 10/1 p. 30-31

Ị̀ Na-agbaso Ntụziaka?

ONYE bụ nna nke na-ahụ n’anya ga- enye ụmụ ya ntụziaka ka ha wee nwee ihe ịga nke ọma ná ndụ, nweekwa obi ụtọ mgbe ha ghọrọ ndị toro eto. Ụmụntakịrị ndị hụrụ ndị mụrụ ha n’anya, na-asọpụrụkwa ha, ga-anara ntụziaka dị otú ahụ n’ihi na ha maara na ọ bụ maka ọdịmma nke ha. N’ụzọ dị otú ahụ, Nna anyị nke eluigwe nke na-ahụ n’anya, bụ́ Jehova, na-enye ndị ohu ya nduzi nke na-ewetara ha inwe ihe ịga nke ọma na ọṅụ ná ndụ ha. Ya mere, ọ dị mkpa ka anyị na-agbaso ntụziaka ndị Chineke na-enye anyị site n’Okwu ya, bụ́ Bible, nakwa site ná nzukọ elu ala ya.

N’ime Ezinụlọ

E nwere akụkụ dị iche iche a na-enye anyị ntụziaka banyere ha. Otu bụ n’ime ezinụlọ. Ndokwa alụmdi na nwunye na nke ezinụlọ sitere n’ebe Chineke nọ. Bible na-asị na Chineke jikọrọ mmadụ abụọ mbụ ahụ n’alụmdi na nwunye wee gwa ha ka ha nwee ụmụ. (Jenesis 1:27, 28; 2:22-24) Onye Okike ahụ enyewo onye ọ bụla nọ n’ezinụlọ ntụziaka banyere ihe bụ ọrụ ha n’otu n’otu. Dị ka ihe atụ, onye bụ di na nna bụ isi ezinụlọ, nke pụtara na o nwere ibu ọrụ nke inye ntụziaka, nri, uwe, ebe obibi, nchebe, na ọzụzụ. Ọ na-emekwa mkpebi ndị dị mkpa n’ezinụlọ. Dị ka onye bụ di, o kwesịrị igosi nchebara echiche maka nwunye ya, na-akwanyekwara ya ùgwù dị ka onye na-esighị ike karị. (Ndị Efesọs 5: 22, 23; 1 Timoti 5:8; 1 Pita 3:7) Nwunye kwesịrị ido onwe ya n’okpuru di ya, gosi ya nsọpụrụ dị omimi, bụrụkwa onye na-enyere ya aka na onye kwesịịrị ya. Akwụkwọ nsọ na-egosipụta na ụmụntakịrị aghaghị ịdị na-erubere ndị mụrụ ha isi.—Tụlee Jenesis 2:18; Ndị Efesọs 6:1-3; 1 Pita 3:1, 2.

Gịnị na-eme ma ọ bụrụ na e lefuru ntụziaka ndị a anya? Enweghị nkwekọrịta na esemokwu na-ebilite mgbe ndị bụ di na-adịghị echebara nwunye ha echiche, mgbe ndị bụ nwunye na-adịghị egosikwa ndị bụ di ha nsọpụrụ kwesịrị ekwesị dị ka ndị bụ isi. N’eziokwu, ihe ndị dị otú ahụ akpatawo ntisasị nke ọtụtụ alụmdi na nwunye. Erubeghị isi na àgwà nnupụisi nke ụmụntakịrị akpataworo ọtụtụ ndị mụrụ ụmụ oké iru újú. Ọtụtụ mgbe, ụta na-adịrị ndị mụrụ ụmụ n’ihi azụliteghị ụmụ ha dị ka ọzụzụ kwesịrị ekwesị si dị, wee si otú a na-akpasu ha iwe.—Ndị Efesọs 6:4.

Ọ bụ ezie na ndị ọrụ ọha na eze, ndị ọkà mmụta akparamagwa mmadụ, na ndị ọzọ atụwo ọtụtụ aro banyere ụzọ a ga-esi lebara nsogbu ezinụlọ dị iche iche anya, ọ dịghị ndụmọdụ dị irè karịa ntụziaka ndị Onye ahụ Kere ezinụlọ nyere na Bible. ịgbaso ndị a na-eweta ezi obi ụtọ na afọ ojuju.—Abụ Ọma 19: 7-9.

N’ime Ọgbakọ

Anyị kwesịrị ịgbaso ntụziaka ndị Onye isi nke ọgbakọ ndị Kraịst, bụ́ Jisọs Kraịst, na-enye site n’aka “ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche,” bụ́ ụzọ nzukọ Chineke họpụtaworo nke dị n’elu ala ebe a. (Matiu 24:45-47; Ndị Efesọs 5:23) Ka e wee nwee udo na ịdị n’otu n’ime ọgbakọ, ndị nile nọ na ya aghaghị ime ihe n’ụzọ kwekọrọ ná nduzi e nyeworo. Dị ka ihe atụ, ọ dị mkpa ka ndị na-ebute ụzọ n’izi ọgbakọ ahụ ihe na n’inyere ndị ọzọ aka gbasosie ntụzi nile ha na-anata site ná nzukọ Jehova ike. Nke a ga-enye aka n’ịdị irè nke ọrụ ha. Ntụziaka ndị ahụ pụrụ ịbụ n’ihe banyere ụzọ a ga-esi kere òkè n’ọrụ nkwusa ahụ, ụzọ a ga-esi lebara nsogbu ndị dị n’ọgbakọ anya, ụzọ a ga-esi nye ndụmọdụ na agbamume, ụzọ a ga-esi kasie ndị nọ ná mkpa obi, na ihe ndị ọzọ. E nwekwara nduzi ndị metụtara ụzọ a ga-esi kwadebe nzukọ ndị na-ezi ihe, ndị na-ewulikwa elu maka ndị nile so ọgbakọ ndị Kraịst na-emekọ ihe.—Ọrụ 20:20; Ndị Rom 12:6-8; Ndị Galetia 6:1; 1 Ndị Tesalọnaịka 3:1-3.

Karịsịa, ndị okenye ọgbakọ, ma ọ bụ ndị nlekọta, kwesịrị isetịpụ ezi ihe nlereanya n’ihe banyere nke a. Òtù Na-achị Isi na-ezipụ ntụziaka ndị okenye ahụ kwesịrị iji ikwesị ntụkwasị obi na nlezianya gbasozuo. Ha kwesịrị ime ka ntụziaka ndị ahụ kwekọọ n’ọnọdụ ndị e nwere n’ógbè ha. Anyị aghaghị iburu n’uche na onye na-eduzi ọgbakọ ndị Kraịst bụ Jisọs Kraịst. Ọ na-amata n’ụzọ zuru okè ihe bụ mkpa nke ọgbakọ nile dị gburugburu ụwa, ọ na-enyekwa agbamume na enyemaka dị mkpa. Ya mere, ndị okenye ekwesịghị ịla azụ n’itinye nduzi ọ bụla ha natara site n’aka nzukọ ọchịchị Chineke n’ọrụ. Nke a ga-anọ dị ka ezi ihe nlereanya nye mmadụ nile nọ n’ọgbakọ ọ bụla, ọ ga-enyerekwa ha aka idị n’otu n’etiti onwe ha na n’etiti ha na òtù ụmụnna ndị Kraịst nile nọ gburugburu ụwa.—Ọrụ 15:1-31; Ndị Hibru 13:7; Mkpughe 5:6.

Ihe Ọṅụ Ndị Ọ Na-arụpụta

Mgbe onye na-ewu ụlo na-ewu nnukwute ụlọ, ọ na-eji nlezianya gbasoo atụmatụ nile nke ndị na-ese atụmatụ ụlọ ka ihe ọ na-ewu wee nọọ ogologo oge. N’oge ime ihe ike ahụ nke dịrị tupu Iju Mmiri ahụ, e nyere Noa ọrụ nke iwu ụgbọ. A gwara ya otú ọ ga-esi wuo ya nakwa mmadụ na anụmanụ ndị ọ ga-ewebata n’ime ya maka nlanarị gabiga Iju Mmiri ahụ nke na-abịanụ. Gịnị bụ mmeghachi omume Noa? Bible na-asị: “Noa wee mee ya; dị ka iwu nile si dị nke Chineke nyere ya, otú a ka o mere.” Ọ bụ nanị Noa na ndị ahụ ya na ha nọ n’ime ụgbọ ahụ lanarịrị Iju Mmiri ahụ. (Jenesis 6:5, 13-22; 7:23) Taa, anyị na-ebi n’ime oge nke yiri nnọọ oge Noa, n’ihi nke a kwa, Chineke gaje ikpochapụ ndị nile na-emebi iwu. Bible na-agwa anyị ihe ndị anyị na-aghaghị ime ma ọ bụrụ na anyị chọrọ iso ná ndị ga-alanarị.—Matiu 24:37-39; 2 Pita 3:5-7, 11.

Ya mere, ka anyị jiri obi ekele nara ma tinye n’ọrụ, ntụziaka nile Jehova na-enye site n’Okwu ya e dere ede nakwa site ná nzukọ ya nke elu ala. Ime nke a ga-ewetara anyị ihe ịga nke ọma na ọṅụ, ọ ga-azọpụtakwa ndụ anyị.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya