Ịghọta Ihe Di n’Akụkọ
Ndị Na-edina Ụdị Onwe Ha—Ha Hà Òtu n’Ihu Chineke?
Na steti Queensland nke dị n’Australia, mmekọrịta nke ndịna ụdị onwe—ọbụna nke e mere na nzuzo n’etiti ndị nwere nkwekọrịta n’etiti onwe ha—bụ ihe megidere iwu. N’oge na-adịghị anya gara aga, otu nnukwute òtù chọọchị dị na steti ahụ pụtara imegide iwu ndị dị otú ahụ n’ụzọ siri ike; ha chọrọ ka a kwụsị ile idina ụdị onwe anya dị ka imempụ.
Dị ka akwụkwọ akụkọ bụ The Courier-Mail si kwuo, ndị mejupụtara òtù Joint Church Social Justice Group bu ndị Anglican, Roman Katọlik, Lutheran, Baptist, na chọọchị dị iche iche nke ndị Njikọ na nke ndị Quaker (Òtù Ndị Enyi). N’ikwu na iwu ndị e nwere enwe megide ndị na-edina ụdị onwe ha dabeere n’amaghị ihe na ịkpọasị, òtù ahụ kwuru, sị: “Nkwado anyị na-enye ọnọdụ nke a dabeere ná nkwenye ahụ nke bụ na mmadụ nile hà nhata n’ihu Chineke, ha kwesịkwara ịha nhata n’ihu iwu. Anyị kweere na onye na-edina ụdị onwe ya adịghị elu ma ọ bụ dị ala karịa onye na-enwe ụdị mmekọahụ nkịtị.”
Ọ bụ ezie na a mụrụ mmadụ nile dị ka ndị hà nhata, olee ụzọ Chineke si ele idina ụdị onwe anya? N’ime Bible, a katọrọ omume nile nke idina ụdị onwe dị ka ihe megidere usoro okike, dịkwa ka ihe kwesịrị ịnata nkatọ nke Chineke, na-eduje n’ọnwụ. Nke a bụ eziokwu, ọ bụghị nanị n’lsrael oge ochie, kama, ọ dịkwa otú ahụ n’oge ndị Kraịst. (Levitikọs 18:22; Ndị Rom 1:26, 27) Amamikpe ahụ doro anya, ọ dịghịkwa mkpa ịkọwa ya akọwa: “Ndị na-akwa iko, . . . ma ọ bụ ndị ikom na-eme dị ka ndị inyom, ma ọ bụ ndị ikom na-emerụ onwe ha n’ahụ ndị ikom, . . . ha agaghị eketa alaeze Chineke.”—1 Ndị Kọrint 6:9, 10.
Kama ịnọ na-eme mkpọtụ ka a kwụsị ile idina ụdị onwe anya dị ka imempụ, ezi ndị Kraịst na-agba ndị ahụ bụ ohu nye àgwà nke a na-adịghị asọpụrụ Chineke ume ka ha kwụsị ma nwere onwe ha pụọ na ya site n’ichigharịkwute Okwu Chineke nke eziokwu.
Ihe Ize Ndụ Dị n,Ọbara Na-aga n,Ihu
Otu nnyocha e mere n’oge na-adịghị anya gara aga kpughere na òtù American Red Cross emehiewo ihe ọtụtụ narị ugbo n’ihe banyere iji ọbara e metọrọ emetọ mee ihe. Ọ bụ òtù American Red Cross na-eweta ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ọkara nke ihe dị n’agbata 12 na 15 nde akpa ọbara a na-eji eme ihe kwa afọ na United States. Mgbe ọ bụla a chọpụtara na akpa ọbara ọ bụla ndị a chọrọ iji mee ihe bụ nke e metọworo, a na-akọrọ ndị ụlọ ọrụ FDA (Food and Drug Administration), bụ́ ngalaba ọrụ nke gọọmenti etiti. Otụ́ ọ dị, akwụkwọ akụkọ The New York Times kọrọ na otu onye ọrụ nnyocha na-arụrụ gọọmenti etiti ọrụ kwuru na ọtụtụ mgbe, òtù Red Cross adịghị eme nke a. Ọ sịrị na nnyocha e mere n’ihe ndekọ ha gosiri 380 ugbo, mgbe a na-akọrọghị gọọmenti banyere ojiji e jiri ọbara e metọrọ emetọ mee ihe n’ụzọ na-adịghị mma. Ọzọkwa, n’ime 228 ndapụta nke ọrịa AIDS ndị ọ pụrụ ịbụworị mmịnye ọbara kpatara ha, onye ọrụ nnyocha ahụ chọpụtara na ọ bụ nanị 4 ka òtù Red Cross kọọrọ ụlọ ọrụ FDA.
Ọ bụ ezie na ọtụtụ ndị ka na-ele ya anya dị ka ihe na-azọpụta ndụ, ọbara a mịnyere amịnye na-akpata ọnwụ nke ọtụtụ puku mmadụ kwa afọ. Ma, ndị na-efe Chineke ezi ofufe, n’irubere iwu ya nile ndị metụtara ọbara isi, bụkwa ndị a na-echebe n’otu mgbe ahụ pụọ n’ihe ize ndụ ndị metụtara mmịnye ọbara. Chineke nyere iwu, sị: “Gị erila ọbara ya; wụpụ ya n’ala dị ka mmiri . . . ka ihe wee gaara gị na ụmụ gị ndị na-eso gị nke ọma, n’ihi na ọ bụ ihe ziri ezi ka ị na-eme.”—Deuterọnọmi 12:23-25, New International Version.
Echiche Popu n’Ihe Banyere Ije Ozi Agha
N’afọ gara aga, popu nwere nzukọ nke ya na ihe karịrị 7,000 ndị agha nọ n’ìgwè ndị agha Rom nke Cecchignola. N’oge ahụ, ndị ọfịsa anọ bụ ụmụ okoro, bụ́ ndị na-anọchite anya ìgwè ndị agha ahụ, jụrụ popu ahụ ma ije ozi agha ò kwekọrọ n’akọ na uche onye Kraịst. N’ikwu kpọmkwem otú o si mee, dị ka akwụkwọ akụkọ Vatican City ahụ bụ L’osservatore Romano si kwuo, ha jụrụ, sị: “Mmadụ ọ̀ pụrụ ịbụ onye Kraịst kwesịrị ntụkwasị obi, bụrụkwa onye agha kwesịrị ntụkwasị obi n’otu mgbe ahụ?” Ná nzaghachi, popu sịrị: “E nweghị ihe isi ike ọ bụla bụ isi ma ọ bụ ekweghị omume n’ime ka ọrụ dịịrị onye Kraịst na ije ozi agha kwekọọ. Ọ bụrụ na anyị elee nke abụọ ahụ anya n’ụzọ ziri ezi, a pụrụ ịhụ ya dị ka ihe mara mma, kwesị ekwesị, bụrụkwa ezi ihe.”
Otú ọ dị, echiche dị otú ahụ ò kwekọrọ ná nnọpụiche nke ndị Kraịst oge gboo nọgidere na ya? N’akwụkwọ ya bụ An Historian’s Approach to Religion, Arnold Toynbee hotara ihe banyere Maximilianus, bụ onye e gburu n’ihi okwukwe ya n’ime narị afọ nke atọ, onye kwuru mgbe ụlọ ikpe ndị Rom yiri ya egwu ọnwụ maka ịjụ ịbụ onye e weere n’ọrụ agha, sị: “M gaghị eje ozi. Unu pụrụ ibepụ m isi, ma m gaghị ejere ndị ọchịchị nke Uwa Nke A ozi; m ga-ejere nanị Chineke m ozi.” N’ihi gịnị ka o ji jụ ije ozi agha ọbụna mgbe ọ na-eche ọnwụ e ji n’aka ihu? N’ihi na o lere ezi ndị na-eso ụzọ Jisọs anya dị ka ndị ‘na-abụghị akụkụ nke ụwa’ dị ka Jisọs na-abụghị akụkụ nke ụwa. Karịsịa, o lere obubuagha nke onye Kraịst anya dị ka nke ime mmụọ, n’ụzọ kwekọrọ n’okwu Pọl onyeozi: “Anyị adịghị ebu agha dị ka [ihe anyị bụ n’anụ ahụ, Nw]: n’ihi na ihe agha nke ibụ agha anyi abụghị nke anụ ahụ.”—Jọn 17:16; 2 Ndị Kọrint 10:3, 4.