Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w91 3/1 p. 3-5
  • Oké Ihe Iseokwu ahụ Gịnị Ka Ọ Bụ?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Oké Ihe Iseokwu ahụ Gịnị Ka Ọ Bụ?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Oké Ihe Iseokwu ahụ
  • Mmalite nke Eluigwe na Ala
  • Mmalite nke Ndụ
  • Idozi Ihe Iseokwu ahụ
  • Gịnị Ka Baịbụl Kwuru Gbasara Agha Ọgwụrụ Mba?
    Isiokwu Ndị Ọzọ
  • Agha Nuklia—Olee Ndị Na-eyi Egwu Ya?
    Teta!—2004
  • Onye Okike Pụrụ Ime Ka Ndụ Gị Nwee Nzube
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
  • Iyi Egwu Nuklia Akwụsịbeghị Ma Ọlị
    Teta!—1999
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
w91 3/1 p. 3-5

Oké Ihe Iseokwu ahụ Gịnị Ka Ọ Bụ?

GỊNỊ bụ oké ihe iseokwu ahụ na-eche onye ọ bụla n’ime anyị ihu? Ọ̀ bụ ọ̀tụ̀tụ̀ oké osimiri ndị na-arị elu ka ọ̀ bụ ọdịdị ihu igwe na-adịghị mma ndị okpomọkụ ụwa nke na-arịwanye elu na-akpata? Ọ̀ bụ ndakpọ nke ihe nchebe ozone, nke na-eduje n’ịnọ n’ihe ize ndụ site n’ụzarị ọkụ na-emerụ ahụ nke anyanwụ? Ọ̀ bụ oké mmụba nke ọnụ ọgụgụ mmadụ, nke na-eme ka nsogbu ụwa ndị ọzọ dịwanye njọ, ndị dị ka ịda ogbenye na imempụ? Ka ọ̀ bụ ịtụ anya mkpochapụ nke ọtụtụ nde mmadụ n’agha nuklia, nke ndị ọ bụla lanarịrị oké nrechapụ ahụ ga-emesịa nwụọ n’oké ihe mgbu site n’oyi ọtụtụ, agụụ ngụgbu, ma ọ bụ mmetụta ike ụzarị ọkụ?

Mgbe ọ tụlesịrị isiokwu ndị a na ndị ọzọ, na 1989, akwụkwọ akụkọ bụ Scientific American kwubiri, sị: “Ihe ịrụ ụka ọ bụla adịghị ya na eziokwu ahụ nke bụ na ọ pụrụ ikwe omume inwe agha nuklia bụ ihe ize ndụ kasị njọ nye . . . nlanarị.” Ya mere, agha nuklia ọ̀ bụ oké ihe iseokwu ahụ na-eche anyị ihu?

Oké Ihe Iseokwu ahụ

N’ihi mgbanwe ndị e nweworo n’ọnọdụ ndọrọ ndọrọ ọchịchị kemgbe 1989, ọ pụrụ ịbụ na ọ dịchakwaghị ka à ga-enwe agha nuklia. Ọbụna otú ahụ, ebe a ka nwere ngwá agha nuklia, ha ga-anọgide na-abụ ihe iyi egwu nye ihe a kpọrọ mmadụ. Otú ọ dị, ihe e dere n’akwụkwọ ahụ bụ 1990 Britannica Book of the Year na-ezo aka n’otu ihe ọzọ dị oké mkpa. Dị ka akwụkwọ ihe ọmụma nke a na-egosi, ihe karịrị 230 nde mmadụ n’ime ndị bi n’ụwa bụ ndị na-ekweghị na Chineke dị. Ebe ndị ọzọ e si enweta ihe ọmụma na-egosi na ọtụtụ nde ndị ọzọ na-anakwere echiche ndị Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa, bụ́ ndị na-enye mmadụ ohere ikwere na e nweghị Onye Okike dịnụ. Ọzọkwa, ọ bụ ezie na ọtụtụ nde mmadụ kwenyere na e nwere Onye Okike, echiche ha nwere banyere ya dịrịtara iche nke ukwuu. N’ọtụtụ ọnọdụ, omume ha na-ewetakwara Onye ahụ ha na-ekwu na ha na-efe ofufe nkọcha.—2 Pita 2:1, 2.

Ọ bụrụ na Chineke dị adị—ọ dịkwa adị n’ezie—o doro anya na ihe iseokwu bụ isi n’oge a aghaghị imetụta ya. N’ihi gịnị ka o ji kee ihe a kpọrọ mmadụ? Ibu ọrụ dị aṅaa ka anyị nwere n’ebe ọ nọ? Ọ̀ ga-esi aṅaa meghachi omume ná mbibi mmadụ na-ebibi elu ala? Oleekwa ụzọ ọ ga-esi meghachi omume n’ihe ịma aka nke ọjụjụ ọtụtụ ndị jụrụ ikwere na ya ma ọ bụ ido onwe ya n’okpuru nzube ya na-eweta? N’eziokwu, oké ihe iseokwu nke na-eche onye ọ bụla n’ime anyị ihu bụ ma ànyị nakweere ma ọ bụ na anyị jụrụ ịbụ ọkaaka nke Chineke, “onye aha nanị ya bụ JEHOVA.”—Abụ Ọma 83:18, King James Version.

Mmalite nke Eluigwe na Ala

Otú ọ dị, nye ndị ahụ na-ekweghị na Chineke, ibu ọrụ anyị nwere n’ebe ọ nọ adịghị adị ma ọlị. Ma onye ọ bụla nke ji obi eziokwu lee anya na nkà na ịma mma nke dị n’ebe obibi anyị bụ ụwa ga-ekweta na a ghaghị inwe Omenkà dị ukwuu. Ọ bụ eziokwu na mgbe ha na-agbalị ịkọwa ihe ndị dị ebube anyị na-ahụ gburugburu anyị, ndị ọkà mmụta sayensị anaghị ekwute okwu banyere Chineke. Dị ka ihe atụ, ọtụtụ n’ime ha na-asị na mbara eluigwe na ala gbasara ruo ókè ọ dị ugbu a site n’otu ebe dị nta nke ukwuu, nke na-aharughị ka isi pin, na ihe a nile mere “n’onwe ha,” site n’ihe ndapụta efu, n’adịghị mkpa inwe Onye Okike. Otú ọ dị, mgbe ọ kọwasịrị otu nchepụta echiche ọhụrụ banyere ụzọ mbara eluigwe na ala si malite, ọkà mmụta physics bụ Hanbury Brown, kwuru n’akwụkwọ ya bụ The Wisdom of Science, sị: “Nye ihe ka n’ọtụtụ mmadụ, echere m na nke ahụ ga-eyi ihe omume aghụghọ nke majik karịa ịbụ nkọwa doro anya.” Professor Brown kwuru na “mmalite na nzube nke ụwa” bụ “oké ihe omimi” nke mmụta sayensị na-enweghị ike ịkọwa.

Ndị ọkà mmụta sayensị egosipụtawo na e nwere njikọ chiri anya n’etiti ihe ndị dị adị na ikike, na a pụkwara ime ka ihe dị adị ghọọ ikike, meekwa ka ikike ghọọ ihe dị adị. Dị ka a na-ahụ ná ntiwapụ dị iche iche nke ike nuklia, ọ̀tụ̀tụ̀ dị nta nke ihe dị adị na-emepụta ikike dị ukwuu. N’ihi ya, ebee ka e si nweta ikike nke dị n’ime 100,000 nde kpakpando ndị dị n’ụyọkọ kpakpando nke anyị, tinyekwara ihe ahụ karịrị 1,000 nde ụyọkọ kpakpando ndị mejupụtara mbara eluigwe na ala a na-ahụ anya?

Bible na-asị: “Welienụ anya unu elu, hụ: ọ̀ bụ onye kere ihe ndị a? Ọ bụ Onye ahụ nke na-eme ka usuu ha pụta n’ọnụ ọgụgụ: ha nile n’aha ha ka ọ na-akpọ; site n’ịba ụba nke ike ya, na n’ihi na o nwere ume n’ike, ọ dịghị ihe fọdụrụ nke a na-agụghị.” Ònye bụ Onye ahụ? Bible dekọrọ azịza ya: “Mụ onwe m bụ Jehova; nke ahụ bụ aha m: m gaghị enyekwa onye ọzọ nsọpụrụ m.”—Aịsaịa 40:26; 42:5, 8.

Ịkọ nkọ ahụ nke bụ na elu ala na mbara igwe dum malitere site n’ihe ndapụta na-ewepụ nsọpụrụ nke kwesịịrị Onye Okike ahụ, bụ́ Jehova Chineke. (Mkpughe 4:11) Ọ na-ewepụkwa ihe siri ike nke na-akpali mmadụ iji ezi echiche mesoo ụwa ihe. A sị na ụmụ mmadụ maara na ha ga-aza ajụjụ n’ihu Chineke maka ihe ha meworo ihe o kere eke, ma eleghị anya, ha gaara ejiworị nlezianya dị ukwuu karị mee ihe n’ihe banyere ihe ndị dị ka mmetọ ikuku na mmiri, mbibi nke ihe nchebe ozone, na ịrị elu nke okpomọkụ ụwa.

Mmalite nke Ndụ

Tụleekwa ajụjụ ahụ bụ: Olee ụzọ ndụ si malite? A kụziworo ụmụ mmadụ na ndụ malitere n’enweghị ụzọ ọ bụla Chineke si tinye aka na ya. Ma nke a na-emegide otu ụkpụrụ a mawooro nke ọma ná mmụta sayensị. N’otu mgbe gara aga, e chere na ádà na-esi na nsị ehi apụta, na ikpuru na-esite n’anụ rere ure na-apụta, na ụmụ òké na-esikwa n’ájá apụta. Ọbụna n’ime narị afọ gara aga, ndị ọkà mmụta sayensị chere na ụmụ irighiri ihe ndị dị ndụ a na-adịghị eji anya nkịtị ahụ na-esi n’ihe ndị na-adịghị ndụ apụta. Ma Redi, Pasteur, na ndị ọkà mmụta sayensị ndị ọzọ gosipụtara na echiche ndị dị otú a ezighị ezi. Akwụkwọ bụ The World Book Encyclopedia (mbipụta 1990) kwuru, sị: “Mgbe nchọpụta ndị ahụ Pasteur mere gasịrị, ihe ka ọtụtụ ná ndị ọkà mmụta ihe ndị dị ndụ nakweere echiche ahụ nke bụ na ndụ na-esite n’ihe dị ndụ na-apụta.”

Otú ọ dị, ndị ọkà mmụta sayensị na-ekwu na ọnọdụ dị iche n’ogologo oge gara aga. Ha na-asị na ihe ndị mbụ dị ndụ, bụ́ ndị nwere nanị otu mkpụrụ ndụ n’ime ha, dapụtara na mberede site ná ngwakọta nke ihe na-adịghị ndụ, bụ́ nke ha na-akpọ ngwọngwọ oge ochie, nke nwere mmiri ọgwụ ndị dị mkpa maka ndụ. Christian de Duve kwuru n’akwụkwọ ahụ bụ A Guided Tour of the Living Cell, sị, “Ihe ndapụta, nanị ihe ndapụta, mere ihe a nile, site na ngwọngwọ oge ochie ahụ rute ná mmadụ.”

N’ikwu okwu banyere Chineke, Bible na-asị: “N’ebe ị nọ ka isi iyi ndụ dị.” (Abụ Ọma 36:9) Okwu nke a kwekọrọ n’ezie n’ihe ndị a hụworo—na ndụ pụrụ ịbịa nanị site ná ndụ nke dịbu adị. Otú ọ dị, ebe ọ bụ na mmụta sayensị nke bụ isi họọrọ ile otu n’ime onyinye ndị kasị ọnụ ahịa Chineke nyere, bụ́ ndụ, anya dị ka ihe dapụtaara onwe ya, ọtụtụ ndị adịghị enwe echiche ọ bụla nke ịbụ ndị ga-aza ajụjụ n’ihu Chineke banyere otú ha si jiri ndụ ha na-eme ihe. Otú a, ha na-emebi iwu Chineke, na-akpagbu mmadụ ibe ha, na-ezu ihe mmadụ ibe ha n’ohi, na-egbu mmadụ ibe ha, na-etinyekwa ego, oge, na nkà dị ukwuu n’imepụta ajọ ngwá agha ndị na-egbu mmadụ, na-ebibikwa ihe n’ụzọ dị irè nke ukwuu.

Idozi Ihe Iseokwu ahụ

E wezụgakwa ndị na-ekweghị na Chineke dị na ndị na-agbaso echiche ọgbara ọhụrụ, e nwere ọtụtụ ndị ọzọ ndị na-agọpụ ịbụ ọkaaka nke Chineke. Ọnụ ọgụgụ mmadụ dị ukwuu taa na-ekwu na ha kwere na Chineke, ihe karịrị 1,700 nde mmadụ na-akpọkwa onwe ha ndị Kristian. Ruo ọtụtụ narị afọ, chọọchị dị iche iche nke Krisendọm enyewo Chineke otuto n’ihu ọha ná nnọkọ ofufe ha dị iche iche. Ma, olee ebe ihe ka ọtụtụ n’ime 1,700 nde mmadụ ndị a guzo n’okwu metụtara ịbụ ọkaaka nke Chineke?

Ma ndị mmadụ n’otu n’otu ma mba dị iche iche egosipụtawo ụzọ ha na-esighị jiri okwu ahụ kpọrọ ihe site n’ime ihe megidere ihe ndị Chineke nyere n’iwu kpọmkwem. Mba ndị kpọrọ onwe ha nke ndị Kristian anọwo na-eme omume ime ihe ike ndị na-adịghị enye Chineke nsọpụrụ, gụnyere agha abụọ kasị njọ a lụtụworo n’akụkọ ihe mere eme nke mmadụ—ndị ụkọchukwu bụkwa ndị “Kristian” n’akụkụ abụọ ahụ gọzikwara agha ndị ahụ! Site n’omume ihu abụọ dị otú ahụ, n’ụzọ dị ukwuu, ha egosiwo Chineke ịbụ ihe ọ na-abụghị ma ọlị. Dị ka Bible na-asị: “Ha na-ekwupụta na ha matara Chineke; ma ọrụ nile ha ka ha ji gọnarị ya.”—Taịtọs 1:16.

Otú o sina dị, Chineke ‘apụghị ịgọnarị onwe ya.’ (2 Timoti 2:13) Oge aghaghị iru mgbe ọ ga-edozi akụkụ nile nke ihe iseokwu a metụtara ịbụ ọkaaka n’ụzọ kwekọrọ ná nzube ya nke o kwupụtaworo: ‘Ha ga-amara na mụ onwe m bụ Jehova.’ (Ezikiel 38:23) Ma n’ihi gịnị ka o jiworo wee ogologo oge otú a? Olee ụzọ a ga-esi dozie ihe iseokwu nke a kachasị mkpa?

[Ebe e si Nweta Foto dị na peeji nke 2]

Azụ ihe osise dị n’ihu: U.S. Naval Observatory photo

[Ebe e si Nweta Foto dị na peeji nke 3]

Azụ ihe osise: U.S. Naval Observatory photo

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya