Ndị Nkwusa Alaeze Na-akọ
“Atụrụ Na-anụkwa Olu Ya”
◻ JISỌS sịrị: “Atụrụ na-anụkwa olu [onye ọzụzụ atụrụ ahụ]: ọ na-akpọkwa atụrụ nke aka ya n’aha, na-edupụkwa ha.” (Jọn 10:3) O kwukwara, sị: “Amakwara m atụrụ nke m, atụrụ nke m makwara m.” (Jọn 10:14) Ndị yiri atụrụ na-ege ntị n’olu Jisọs ka o si na Bible na-agwa ha okwu. Rịba ama ụzọ mmadụ abụọ ndị nwere obi eziokwu n’Itali si gbasoo ụzọ nke a.
O Mesịrị Gee Ntị
◻ Alberto dere, sị: “Adị m afọ 16 mgbe m malitere ise wii wii, na-aṅụkwa ọgwụ LSD, mgbe m rukwara afọ 18, agara m n’ihu ịṅụ ọgwụ heroin. Iji wee na-enweta ọgwụ ndị ahụ, emere m ihe ọ bụla a pụrụ icheta n’echiche. Ezuru m ohi, erere m ọgwụ ọjọọ, egwuru m wayo, eresịrị m ihe nile m nwere. Apụghị m nnọọ ịkwụsị. Ịga ezumike ná mba ọzọ, ogologo oge m nọrọ n’ime obodo, ma ọ bụ itinye aka na ndọrọ ndọro ọchịchị nke òtù ndị na-eme ihe ike ndị kpebisiri ike ibuso ikpe na-ezighị ezi agha—ọ dịghị nke ọ bụla n’ime ihe ndị a nyere aka. Anwalere m alụmdi na nwunye, ma mgbe nwa oge gasịrị, alaghachiri m n’ebe m malitere. Ọbụna mmụta anyị mụtara nwa ọhụrụ bụ nwanyị emeghị ka m kwụsị ịṅụ ọgwụ ọjọọ. N’eziokwu, ọnọdụ jọwanyere njọ, ebe ọ bụ na ọ dị m mkpa ugbu a inweta ego karị. Mgbe ahụ, nwunye m hapụrụ m, n’ime afọ abụọ nke ibi nanị m, ahụkwara m nwa m nwanyị nanị ugbo abụọ. Anọ m na-agbara ndị na-ere ọgwụ ọjọọ ọsọ, bụ́ ndị m ji ụgwọ, ọtụtụ mgbe, ajọ mmetụta ihe mgbu nke aṅụbeghị ọgwụ ruo ogologo oge jidere m.
“Mgbe ahụ, echetara m otu akwụkwọ Ndịàmà Jehova nyere m n’afọ ole na ole tupu mgbe ahụ. M ka nwere ya, m wee malite ịgụ ya na Bible. Esi m otú a mata ezi Chineke ahụ, bụ́ Jehova, ekpekukwara m ya ekpere maka enyemaka. Ka m ji nwayọọ nwayọọ na-etinye ihe ndị m na-amụta n’omume, ihe mgbu nke ajọ mmetụta aṅụghị ọgwụ ruo oge ụfọdụ malitere ibelata. Achọtara m ọrụ, sitekwa n’enyemaka Jehova, ejikọtaghachiri m ezinụlọ m. Ejere m n’Ụlọ Nzukọ Alaeze, n’ebe ahụkwa, achọpụtara m na Ndịàmà Jehova bụ ndị nwere eziokwu ahụ. N’ịbụ ndị dịghachiworo n’otu, mụ na nwunye m sooro Ndịàmà ahụ mụọ Bible, mesịakwa mee baptism. Ugbu a, lee nnọọ ihe ọṅụ ọ bụụrụ anyị iso ndị ọzọ na-ekerịta olileanya anyị dị ka ndị ọsụ ụzọ oge nile!”
A Zara Ekpere nke Nwanyị Ji Okpukpe Kpọrọ Ihe
◻ Otu nwanyị kọrọ, sị: “Na 1958, ana m ekeresi òkè ike n’ọrụ dị na chọọchị, karịsịa n’ịga njem ofufe n’Ebe Nsọ nke Madonna nke Ịhụnanya Chineke na Rom. Mgbe oge na aga, mụ na otu onye kadinal nke bụ onye vicar nke Rom, ghọrọ ezi enyi, mụ na Pope Paul nke Isii na John Paul nke Abụọ nwekwara ọtụtụ mkparịta ụka nke nanị mụ na ha. Mgbe 25 afọ nke ịhazi njem ofufe dị iche iche gasịrị, enwetara m akara diploma nke nkwanye ùgwù. Otú ọ dị, ka oge na-aga, okwukwe m dị ka onye na-ekpesi Katọlik ike malitere ịma jijiji. Ahụtara m izu ohi, igwu wayo, imenyere ndị ikwu, na azụmahịa dị mgbagwoju anya. Amalitere m iji anya dị iche na-ahụ chọọchị ahụ mgbe m hụtara na ọtụtụ mgbe, a na-elefuru iwu Chineke anya. Ihe ndị dị otú ahụ nyere m nsogbu, arịọkwara m Chineke ka o nyere m aka n’ihi na okwukwe m na-adakpọ. Akwara m ákwá ọtụtụ ugbo.
“E mesịa, n’afọ anọ gara aga, nwa m nwoke wetaara m Ụlọ Nche na Teta! ole na ole ndị ọ nataworo n’aka Ndịàmà Jehova. Magazin ndị ahụ kpaliri mmasị m nke ukwuu nke na agwara m ya ka ọ natakwuoro m. N’oge na-adịghị anya mgbe nke ahụ gasịrị, achọtara m otu Ụlọ Nzukọ Alaeze nke Ndịàmà Jehova, hapụkwa otu obere akwụkwọ ozi n’ọnụ ụzọ ya na-arịọ ka otu n’ime ha bịa leta m. Ndịàmà ahụ bịara mgbe hour anọ gasịrị. Amalitere m ọmụmụ Bible, nweekwa ọganihu ruo n’ókè nke ime baptism. Ugbu a, eji m n’aka na achọtawo m ihe ahụ m nọworo na-achọ mgbe nile—eziokwu ahụ!”
Mmadụ ndị a gere ntị n’olu Onye Ọzụzụ Atụrụ Ọma ahụ, bụ́ Jisọs Kraịst, ‘eziokwu ahụ mekwara ka ha pụọ n’ohu.’—Jọn 8:32.
[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 14]
Garo Nalbandian