Lee Nnọọ Ọtụtụ Ihe Mere M Ga-eji Nwee Ekele!
DỊ KA LOTTIE HALL SI KỌỌ
O MERE mgbe anyị nọ n’ụzọ site na Calcutta, India, na-eje Rangoon, Burma, na 1963. N’oge na-adịghị anya mgbe anyị hapụsịrị Calcutta n’ụgbọ elu, otu n’ime ụmụnna nwoke ndị ahụ hụrụ na mmanụ na-ehipụ na-atasa na nkù ụgbọ elu ahụ. Mgbe a gwara ha banyere ya, ndị na-arụ ọrụ n’ụgbọ elu ahụ kwuru na a gaje ime mfeda mberede. Tupu e mee nke ahụ, ụgbọ elu ahụ aghaghị ibu ụzọ gbapụsịa mmanụ ka o wee kwe omume ifeda. Onye ahụ na-elekọta ndị njem tiri mkpu kwuo, sị, “Ọ bụrụ na ị chọrọ ikpe ekpere, mee nke ahụ ugbu a!” N’ezie, anyị kpere ekpere na ọ bụrụ uche Jehova, ka anyị feda n’udo, anyị fedakwara n’udo. N’ezie, anyị nwere ihe mere anyị ga-eji nwee ekele!
EE, ENWEKWARA m ọtụtụ ihe ndị ọzọ mere m ga-eji nwee ekele. Mgbe m gbaworo 79 afọ, m ka nwere ọ̀tụ̀tụ̀ ụfọdụ nke ahụ ike na ume, nke m na-eji eme ihe n’ije ozi oge nile. Ọzọkwa, tụkwasị ná ngọzi nile ahụ ndị Jehova nile na-enwe, enwewo m ọtụtụ ahụmahụ ndị pụrụ iche. Ná ngụkọta, ọ bụworo m ihe oké ọnụ ahịa ijere Jehova ozi ruo ihe karịrị 60 afọ, n’ihe karịrị ọkara n’oge ahụ, abụwokwa m onye ozi oge nile, ma ọ bụ onye ọsụ ụzọ.
Ihe a nile malitere n’ebe nna m nọ mgbe anyị bi na Carbondale, Illinois. Ọ na-eso ndị òtù okpukpe Disciples of Christ, o nwekwara mmasị n’ịghọ onye ụkọchukwu. Otú ọ dị, ahụmahụ o nwere na kọleji abụọ ebe a na-amụ Bible kụdara mmụọ ya, n’ihi na o nwere echiche nke onwe ya banyere Atọ n’Ime Otu, anwụghị anwụ nke mkpụrụ obi, na ahụhụ ebighị ebi.
N’ikpeazụ, afọ juru ya site n’eziokwu Bible otu onye colporteur bụ Onye Mmụta Bible wetaara ya na 1924, mgbe m dị nanị afọ 12. Obi tọrọ nna m ụtọ ịhụ na e nwere ndị ọzọ na-eche echiche n’ụzọ ahụ ya onwe ya si eche, na Atọ n’Ime Otu, ọkụ ala mmụọ, na anwụghị anwụ nke mkpụrụ obi mmadụ bụcha ozizi ụgha. N’oge na-adịghị anya, ezinụlọ anyị na-eso Ndị Mmụta Bible ahụ, dị ka a na-akpọ Ndịàmà Jehova n’oge ahụ, na-ezukọ mgbe nile. Ịmụta eziokwu banyere Jehova na Okwu ya bụ n’ezie ihe m nwere ekele n’ihi ya.
Otú ọ dị, tupu ogologo oge ana-agafe, ọdachi mere. Nwoke ahụ nke wetaara nna m eziokwu ndị a ghọrọ ma onye na-adịghị eme ihe n’eziokwu ma onye na-ebi ndụ rụrụ arụ. O mere ka nna m sụọ ngọngọ, ma mụ na nne m emeghị otú ahụ. N’ịbụ onye dị 15 afọ ugbu a, abụ m nke kasị mee okenye n’ime ụmụ isii, mụ na nne m rapagidesikwara ike n’eziokwu ahụ.
N’oge ọkọchị nke 1927, a mara ọkwa na a gaje inwe mgbakọ ukwu nke Ndị Mmụta Bible na Toronto, Canada. Nna m kwuru na ya enweghị ego ya ga-eji jee, ma Nne m bụ nwanyị nke na-ekpebisi ike ime ihe. Ọ malitere ire ụmụ irighiri ihe dị iche iche a na-eji eme ihe n’ụlọ, mgbe ọ na-erule oge mgbakọ ahụ, ọ kpakọtawokwa dollar asatọ. Mụ na ya ji ego ahụ malite ịrịọ ndị moto ka ha bupụtụ anyị n’ụzọ na-eje Toronto, nke dị 1,600 kilomita site n’ebe ahụ. O were ụbọchị ise na ịgba moto 37 ugbo tupu anyị eruo, na-erute n’ebe ahụ n’ụbọchị bu ụbọchị mgbakọ ahụ ụzọ. N’ihi na ego anyị nwere dị nta, anyị rịọrọ, natakwa ebe anyị ga-ehi ụra n’akwụghị ụgwọ. Mgbe Nwanna A. H. Macmillan nụrụ banyere njem anyị, o deturu ya maka ibipụta ya n’akwụkwọ akụkọ nke mgbakọ ahụ n’okpuru isiokwu bụ: “Ịrị Elu Ọ Bụla n’Ego Ụgbọ Okporo Ígwè Adịghị Enye Ndị Mmụta Bible Ndị A Nsogbu.”
Nne m nọgidere jiri kaadị ozi dị iche iche na-eme ka Nna m mata ihe na-aganụ. Nke a mere na nwa mgbe nta tupu oge agabiga, o kpebiri ịbịa, wee jiri moto bịarute nnọọ nwa mgbe nta tupu okwu ihu ọha amalite n’ụbọchị ikpeazụ nke mgbakọ ahụ. Ugbu a, ọ dịghịkwa mkpa na anyị ga na-arịọ ndị mmadụ ka ha bupụtụ anyị mgbe anyị na-ala. Lee nnọọ aha mgbakọ ọ bụ! Lee nnọọ ka m si nwee ekele na anyị nwere ike ije ya, leekwa ka m si nwee obi ekele na o nyeere nna m aka inwetaghachi nguzozi ime mmụọ ya!
Ruo ọtụtụ afọ, ọ bụrụ na a jụọ m ihe bụ okpukpe m, ana m aza, “IBSA” bụ́ mkpụrụ akwụkwọ ndị nọchiri anya International Bible Students Association (Ndị Mmụta Bible nke Mba Nile). Ma anaghị m enwe obi ụtọ maka aha ahụ. Ya mere, enwere m ekele mgbe anyị nakweere aha ọhụrụ ahụ bụ Ndịàmà Jehova ná mgbakọ 1931 ahụ e mere na Columbus, Ohio.
Ọnụnọ M n’Ụlọ Akwụkwọ
Ụfọdụ n’ime ọtụtụ ngọzi ndị meworo ka ndụ m baa ụba bụ ndị ahụ metụtara egwú otiti. Enwere m mmasị dị ukwuu n’egwú otiti, amụkwara m otú e si akpọ ngwá egwú piano mgbe m bụ nwata. Ruo ọtụtụ afọ, enwere m ihe ùgwù nke ịkpọ piano mgbe a na-abụ abụ n’ọgbakọ. Tupu Watch Tower Society amalite imepụta rekọd nke abụ Alaeze, otu nwanna onye ozi ala ọzọ nke na-eje ozi na Papua New Guinea rịọrọ m otu mgbe ka m kpọnye abụ anyị ole na ole na tepu ka ndị Papua nwee ike ịmụta otú e si abụ ha. Nke ahụ bụ ihe nyere m nnọọ obi ụtọ ime.
Otú ọ dị, ngwá egwú nke kasị na-amasị m bụ clarinet. Ọ na-amasị m ịkpọ ya n’òtù egwu mahadum. Onye prọfesọ mahadum ahụ nwere mmasị nke ukwuu n’ụzọ m si akpọ ngwá egwú ahụ na o kwuru ka m bịakwa soro òtù egwú ndị ikom. N’oge ndị ahụ, ọ dịghị nwanyị sotụworo òtù egwu ndị ikom, ya mere, mgbe ndị òtù egwú ahụ nụrụ ihe onye prọfesọ ahụ na-akwado ime, ha mere atụmatụ ịchịsa ngwá egwú n’iwe. Ha gbanwere echiche ha mgbe a gwara ha na ọ bụrụ na ha achịsa ngwá egwú n’iwe, na a ga-achụ ha. E mebikwara omenala ọzọ mgbe a chọrọ ka m soro ndị òtù egwú ahụ zọgharịa ije ná njegharị nke na-ewe ogologo ụbọchị dum. Akwụkwọ akụkọ kwuru na ọ bụ ihe oké mkpali, jirikwa mkpụrụ akwụkwọ gbara okpotokpo dee ya, sị: “Nwa Agbọghọ Onye Oti Egwú n’Etiti Ìgwè Ndị Ikom.”
E mesịrị gbaa m ajụjụ ọnụ maka iwe m n’ọrụ dị ka onye prọfesọ nke na-akụzi iti egwú. Otú ọ dị, mgbe m chere echiche banyere ihe iseokwu ndị pụrụ ibilite ma ọ bụrụ na m na-akụzi egwú otiti, dị ka ịgwa m ka m kụzie ma ọ bụ kpọọ egwu okpukpe na nke e ji eto mba, ekpebiri m ịgbaso ihe ọzọ, e wee kenye m ịkụzi akụkọ ihe mere eme nke ụwa. Ma mgbanwe ahụ akwụsịghị m, mgbe ọtụtụ afọ gasịrị, ịkpọ clarinet m n’òtù egwu ndị e nwere ná mgbakọ dị iche iche n’ọtụtụ mba mgbe m na-eje mgbakọ mba nile dị iche iche nke Ndịàmà Jehova.
Mgbe oge ụfọdụ gasịrị aghọrọ m onye nkụzi nke akụkọ ihe mere eme nke ụwa n’otu nnukwute kọleji dị ná mpụga mpụga nke obodo Detroit, n’ọnọdụ ahụ, onye isi ụlọ akwụkwọ gwakwara m otu mgbe ka m họpụta otu n’ime ụfọdụ akwụkwọ ọgụgụ ọhụrụ a ga-eji na-eme ihe. Mgbe m nọkwa na-atụle akwụkwọ ndị a, ahụtara m eziokwu ahụ nke bụ na ọ bụ ezie na akwụkwọ nke anyị ji na-eme ihe ugbu a kpọtụrụ aha Jehova ugbo asatọ, ndị nke ọhụrụ ahụ enyeghị chi ndị Hibru ahụ aha, ọ bụ ezie na ha kpọrọ aha chi dị iche iche nke mba ndị na-efe arụsị, ndị dị ka Ra, Molek, Zeus, na Jupita. Mgbe otu onye na-ere akwụkwọ bịara, ajụrụ m ya ihe mere na a kpọtụghị Jehova aha n’akwụkwọ ya, o wee sị: “Ee e, anyị agaghị etinye aha ahụ n’ihe odide anyị n’ihi Ndịàmà Jehova.” Ya mere agwara m ya, sị: “Ọ dị mma! Ya bụrụ otú ahụ, agaghị m ahọpụta akwụkwọ unu ka e jiri ya na-eme ihe.” O jiri iwe fọba akwụkwọ ahụ n’ime akpa ya wee pụọ n’ike.
Mgbe e mesịrị, agwara m onye isi ụlọ akwụkwọ ahụ na ọ dịghị anyị mkpa n’ezie inweta akwụkwọ ọhụrụ, nyekwa ya ọtụtụ ezi ihe kpatara nke ahụ. O kwenyeere m. Mmadụ nile nwere obi ụtọ mgbe nanị ọnwa ole na ole gasịrị e wee kpebie iwepụ akụkọ ihe mere eme nke ụwa n’ihe a na-akụzi na kọleji ahụ. E ji ihe ọmụmụ ọhụrụ a na-akpọ social studies dochie anya ya n’usoro 14 ụlọ akwụkwọ ahụ dum. A sị na ụlọ akwụkwọ ahụ zụrụ akwụkwọ ọgụgụ ndị ọhụrụ, lee nnọọ mfu nke a gaara akpataworị!
Enwere m ọtụtụ ahụmahụ na-enye ọṅụ mgbe m na-akụzi ihe n’ụlọ akwụkwọ, bụrụkwa onye ji inye ọzụzụ na ahụhụ kpọrọ ihe nke ukwuu. Nke a rụpụtara ọtụtụ ọbụbụenyi ndị na-adịru ogologo ndụ nile. Enwekwara m ọtụtụ ohere ịgba àmà mberede. Ma n’ikpeazụ, oge na ọnọdụ dubara m n’ije ozi oge nile.
Mgbakọ Mba Nile Dị Iche Iche
Mgbe m kụzisịrị ihe n’ụlọ akwụkwọ ruo 20 afọ, anya malitere inye m nsogbu. Ọzọkwa, ọ dịrị ndị mụrụ m mkpa ka mụ na ha nọrọ, ya mere, nna m gwara m ka m lọta, na-ekwu na e nwere ọrụ nkụzi ka mkpa a ga-arụ, na Jehova ga-ahụkwa na agụụ agụgbughị m. Akwụsịrị m ọrụ nkụzi na 1955, otu n’ime ngọzi ndị m nwekwara mgbe nke a gasịrị gụnyere ije usoro mgbakọ “Alaeze Nke Na-enwe Mmeri” ndị ahụ e mere na Europe. Lee nnọọ ka m si nwee ekele ịnọnyere ụmụnna anyị na Europe, ndị ọtụtụ n’ime ha taworo ahụhụ dị ukwuu n’oge agha ụwa nke abụọ! Ọ bụ nnọọ ngọzi pụrụ iche iso na 107,000 mmadụ ndị ahụ jupụtara na Zeppelinwiese, ma ọ bụ Zeppelin Meadow, nke dị na Nuremberg, ebe Hitler meburu atụmatụ ịnọ mee njegharị mmeri ya mgbe a lụsịrị Agha Ụwa nke Abụọ.
Nke ahụ bụ nanị nke mbụ n’ime ọtụtụ njem ụwa dum ndị m nweworo ihe ùgwù ịga. Na 1963, mụ na nne m so na 583 ndị ahụ na-eje mgbakọ, ndị gara gburugburu ụwa maka Mgbakọ “Ozi Ọma Ebighị Ebi” ahụ. Njem ahụ buuru anyị site na New York garuo Europe, mesịa ruo Esia na agwaetiti dị iche iche nke osimiri Pacific tupu o mechie na Pasadena, California. Ọ bụ mgbe anyị nọ na njem ahụ ka anyị nwere ahụmahụ ahụ na-atụ egwu nke a kọrọ ná mmalite. Mgbe nke ahụ gasịrị, njem dị iche iche kpọjere anyị ná mgbakọ ndị e mere na South America, Ebe Ndịda Pacific, na Africa. N’eziokwu, njem ndị a mere ka ndụ m dịwanye ụtọ, inwe ike ịkpọ egwú n’òtù egwú mgbakọ dị iche iche bụkwa ihe ntụkwasị nye onye nwere mmasị dị ukwuu n’iti egwú.
Ịbanye Ọrụ Ọsụ Ụzọ
Na 1955, mgbe m si Europe lọghachi, esonyeere m nne m n’ọrụ ọsụ ụzọ ruo otu afọ, mgbe ahụ Society gwara m ka m jee rụọ ọrụ n’otu ọgbakọ dị nta nke dị na Apalachicola n’ebe ọdịda anyanwụ Florida. Ruo afọ asaa, mụ na otu nwanna nwanyị ọzọ nyere aka n’ọrụ dị n’ebe ahụ, n’oge na-adịghịkwa anya ọgbakọ ahụ nwere ike iwu Ụlọ Nzukọ Alaeze iji wee nagide mmụba a na-enwe. A nọgidere na-enwe ọganihu, tupu ogologo oge, e guzobekwara ọgbakọ ọzọ na Port Saint Joe. Etinyere m 11 afọ n’iso ọgbakọ atọ dị n’ebe ọdịda anyanwụ Florida rụkọọ ọrụ.
N’otu mgbe, onye nlekọta sekit gwara m ka m chọta ebe a ga-anọ mee mgbakọ sekit. Enwere m ike ịnata ụlọ ahụ a na-akwanyere ùgwù nke ukwuu, bụ́ Centennial Building nke dị na Port Saint Joe n’ọnụ ego nanị $10. Ma ọ dịkwa anyị mkpa inweta kafiteria, anyị wee chee echiche iji otu ụlọ akwụkwọ mee ihe. Otú ọ dị, ahụtara m na nke a amasịghị onye nlekọta ụlọ akwụkwọ, o wee kwuo ka m jee hụ òtù bọọdụ na-elekota ụlọ akwụkwọ dị iche iche. Onye isi obodo ahụ bịakwara nzukọ ahụ, ebe ọ chọrọ ka anyị jiri kafiteria ahụ mee ihe. Mgbe ọ jụrụ ajụjụ ka a gwa ya ihe mere na anyị agaghị eji ya eme ihe, onye isi òtù bọọdụ ụlọ akwụkwọ ahụ kwuru na e metụbeghị ya mbụ, bụ́ òtù okpukpe iji ụlọ akwụkwọ ahụ mee ihe. Onye isi obodo ahụ chigharịkwutere m maka azịza. Eji m mpempe akwụkwọ dị iche iche na-egosi na anyị ejiwo ụlọ akwụkwọ dị iche iche mee ihe maka nzukọ anyị n’obodo ndị ọzọ, ezokwara m aka n’Ọrụ Ndị Ozi 19:9, nke kwuru na Pọl onyeozi kwuru okwu n’ụlọ akwụkwọ. Nke ahụ kpebiri okwu ahụ. Òtù bọọdụ ahụ kwenyeere onye isi obodo ahụ ikwe ka anyị jiri kafiteria ahụ mee ihe—n’ọnụ ego $36.
Mgbe m dị afọ 13, bụ́ afọ m mere baptism, ekpere m ekpere, sị: “O Chineke, kwee nnọọ ka m kpọbata otu onye n’eziokwu.” A na-aza ekpere ahụ ugbu a ọtụtụ okpukpu ka m nọ na-enweta ngọzi nke inyere ọtụtụ ndị aka iwere ọnọdụ ha n’akụkụ nke Jehova na Alaeze ya. Otú ọ dị, ọtụtụ ugbo, ka onye m na-eduziri ọmụmụ Bible na-achọ iru ime nraranye na baptism, a na-ekenye m ọrụ n’ọgbakọ ọzọ. Ma n’agbanyeghị nke ahụ, enwere m ihe ùgwù ịkụ mkpụrụ na ịkwọsa ya mmiri, ọtụtụ n’ime ndị mmụta ndị a aghọwokwa ndị enyi na-adịru ogologo ndụ nile. Ikere òkè n’ọrụ dị otú ahụ nke na-amịpụta mkpụrụ nyere ọtụtụ ihe ndị mere m ga-eji nwee ekele.
Ụzọ Mgbasa Ozi Dị Iche Iche Enye Aka
Ọ bụ ezie na n’ọtụtụ ebe, ndị mgbasa ozi akọwo akụkọ na-adịghị mma ọtụtụ mgbe banyere ọrụ Ndịàmà Jehova, enwere m obi ụtọ ikwu na ndị mgbasa ozi dị n’ógbè De Land, Florida—bụ́ ebe m na-eje ozi ugbu a—enyeworo m aka ịgba àmà. Dị ka ihe atụ, mgbe anyị nọ n’otu n’ime njem mgbakọ ụwa dum ndị ahụ, mụ na nne m na-ezitere akwụkwọ akụkọ ndị obodo ahụ ogologo ihe odide dị iche iche, a na-ebipụtakwa ndị a ngwa ngwa, tinyere foto dị iche iche. E dere akụkọ ahụ dị ka ihe ndekọ njem, ma anyị na-ahụ nnọọ na anyị jiri ha mee ihe ịgba àmà banyere aha Jehova na Alaeze ya.
Otú ahụ ka ọ dịwokwara n’ihe banyere ịgba àmà okporo ámá m. Enwere m otu akụkụ okporo ụzọ ebe m nwere oche mpịachi abụọ, ana m anọdu n’otu, jirikwa nke ọzọ kpọsa akwụkwọ anyị. N’otu oge, otu akụkọ were ọkara peji na otu foto pụtara n’akwụkwọ akụkọ obodo ahụ n’okpuru isiokwu bụ “Lottie nke Deland Na-aga n’Ihu n’Ọrụ Ndị Mụrụ Ya dị ka Ndịàmà.” N’oge na-adịghị anya gara aga, na 1987, otu akwụkwọ akụkọ ọzọ bu otu isiokwu were ọkara peji na otu nnukwute foto e sepụtara n’àgwà dị mma n’okpuru isiokwu bụ: “Lottie Hall Nwere Akụkụ Okporo Ụzọ Nke Ya E Doro Iche maka Kraịst.” N’afọ na-eso ya, akwụkwọ akụkọ ọzọ bipụtara otu foto m na peji nke ihu ya, ya na okwu ndị dị ka, “Ọ na-anọ ebe ahụ mgbe nile” na “N’ịnọdụ n’oche mpịachi ya, onye nkụzi ụlọ akwụkwọ ahụ laworo ezumike nká na-eji akụkụ okporo ụzọ nke ya na-arụ ọrụ ozi ala ọzọ nke Ndịàmà Jehova.” Ọzọkwa, ugbo anọ, ụlọ ọrụ TV dị n’ebe ahụ egosiwo foto ndị metụtara ọrụ ịgba àmà m. Anọgidere m na-ekere òkè n’ọ̀tụ̀tụ̀ a kpaara ókè n’akụkụ nile nke ozi Alaeze ahụ: ọrụ nkwusa site n’ụlọ ruo n’ụlọ, nletaghachi, na ọmụmụ Bible ebe obibi. Otú ọ dị, n’ihi ime agadi na ahụ esighị ike, ana m etinyezi oge dị ukwuu ugbu a n’ọrụ okporo ámá.
N’ileghachi anya azụ, aghaghị m ikwu na n’ezie enwere m ọtụtụ ihe mere m ga-eji nwee ekele. Tụkwasị ná ngọzi ndị ahụ ndị Jehova nile na-enwekọ ọnụ, dị ka onye nkụzi ụlọ akwụkwọ, enwewo m ihe ùgwù nke inwe mmetụta n’ahụ ọtụtụ ndị na-eto eto; enwewo m ihe ùgwù nke ije ọtụtụ mgbakọ gburugburu ụwa; ejewo m ozi ọsụ ụzọ nke mịpụtara mkpụrụ hie nne; enwetawokwa m ngọzi n’ihe banyere egwú otiti. Ọzọkwa, enwekwara m ike ịgba àmà site n’usoro mgbasa ozi. N’eziokwu, apụrụ m iso Devid onye ọbụ abụ kwuo, sị: “M ga-eji abụ too aha Chineke, m ga-ejikwa ekele mee ka ọ dị ukwuu.”—Abụ Ọma 69:30.