Akwụkwọ Ọhụrụ Akpalie Ọṅụ nke Ọtụtụ Nde Mmadụ
OTU akụkụ nke Mgbakọ “Ndị Hụrụ Nnwere Onwe n’Anya” nke malitere n’ọnwa June gara aga bụ okwu bụ́ “Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ.” Ihe bụ isi na ya bụ mwepụta nke akwụkwọ nwere otu isiokwu ahụ. Ihe karịrị nde mmadụ isii n’elu ụwa nile ejewo mgbakọ a ma nụrụ okwu ahụ, nke pụtara n’isiokwu abụọ nke magazin a ndị bu nke a ụzọ n’ụzọ e nwere mgbanwe dị nta na ya.
E bipụtawo ihe karịrị nde 12 nke akwụkwọ ahụ bụ Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ n’ihe dị ka 60 asụsụ dị iche iche. E nwere ya ọbụna n’asụsụ ebe Ọwụwa Anyanwụ Europe ndị bụ Albanian, Croatian, Hungarian, Macedonian, Polish, Russian, Serbian, na Slovenian. Karịsịa ihe karịrị 74,000 ndị bịara mgbakọ asaa nile na Soviet Union nwere ọṅụ ịnata ya n’asụsụ Russian.
Mmalite nke Akwụkwọ Ahụ
Ihe ọmụma dị n’akwụkwọ ahụ apụtawo na mbụ n’usoro n’usoro n’ime 149 mbipụta dị iche iche nke Ụlọ Nche (Bekee), na-amalite ná mbipụta nke April 1, 1985. Ọtụtụ ndị na-agụ ya sịrị na o wutere ha mgbe usoro isiokwu ahụ bịara ná njedebe ná mbipụta nke June 1, 1991. Melissa, nwa dị afọ 12 n’Italy, bere akwá mgbe ọ gụrụ ihe ndekọ nke ikpeazụ n’Ụlọ Nche. “N’abali nke bu mgbakọ anyị ụzọ,” ka o kwuru, “e kpekuru m Jehova n’ekpere na-arịọ ka e nwee akwụkwọ nke na-akọ banyere ndụ Jisọs. Mgbe e wepụtara akwụkwọ ahụ, akụrụ m aka ruo mgbe ike gwụrụ m ikụ aka.”
A haziwo ihe ọmụma ahụ e bipụtara n’usoro n’usoro n’ime Ụlọ Nche ma chịkọta ya n’ime akwụkwọ ọhụrụ dị 448-peji nke nwere 133 isiakwụkwọ ndị nwere ihe osise mara mma ile anya. E mere mgbalị igosipụta okwu ọ bụla Jisọs kwuru na ihe omume ọ bụla e dekọrọ ná ndụ ya n’elu ala, tinyere ilu na ọrụ ebube ya nile. Ruo ókè o kwere mee, a kọrọ ihe nile n’usoro o si mee. Ná ngwụsị isiakwụkwọ nke ọ bụla, e depụtara akụkụ Bible ndị isiakwụkwọ ahụ dabeere na ha.
Mmadụ pụrụ ịdị na-eche, si, ‘Ọ bụrụ otú ahụ, agụwonụ m akwụkwọ ahụ n’ihi na agụrụ m usoro isiokwu ndị ahụ n’Ụlọ Nche.’ Ma ndị na-agụ Ụlọ Nche natara ihe ndekọ nke ndụ Jisọs ná nkebi dị nta ndị e dere n’isiokwu ndị na-apụta kwa izu abụọ ọ bụla n’ime agbata oge karịrị afọ isii. Ọ bụ ezie na isiokwu ndị ahụ e biri n’ụdị usoro isiokwu nwere ihe ọmụma, cheedị echiche banyere mkpali a na-enwe n’ịgụ ihe ndekọ ahụ nile ná mkpirimkpi oge ma nwee nghọta zuru ezu nke nwoke kasị ukwuu nke dịworo ndụ!
Ihe Na-emesi Okwukwe Ike
“A gụsịrị m akwụkwọ ahụ n’izu abụọ,” ka otu nwanyi si Washington, D.C., kọrọ. “Mgbe m na-agụ ya, anya mmiri ga-asọpụtasị m n’anya. M ga-akwụsị ịgụ ya ma kpee ekpere, beekwa akwá. O mere m ka m nwe mmetụta dị ka a ga-asị na m so Jisọs nọrọ n’ebe ahụ, soro ya na-ata ahụhụ. Ọbụna otu izu mgbe m gụsịrị akwụkwọ ahụ, anya mmiri ka pụtakwara m n’anya mgbe m chere echiche banyere ihe m gụworo. Ọbụna na m na-enwe mmetụta nke ịnọ Jehova nso karị n’ihi inye Ọkpara ya.”
“A gụsịrị m akwụkwọ ahụ banyere Jisọs taa,” ka otu nwanyi si Pittsburgh, Pennsylvania, U.S.A., dere. “Ọ dị ebube. Anya mmiri gbara m n’anya mgbe m na-agụ isiakwụkwọ ole na ole ndị ikpeazụ. Ịgụ akwụkwọ ahụ nile n’otu mgbe dị nnọọ mma nke ukwuu. A pụghị m ịkọwa mmetụta m na-enwe banyere ya—nanị na ọ masịrị m nke ukwuu!”
Ihe osise dị mma ile anya ndị dị n’akwụkwọ ahụ so na-akpata mmetụta ọ na-eme ka mmadụ nwee, dị ka otu onye nwere obi ekele nke na-agụ ya kwuru: “Ọ na-eme ka m nwee mmetụta dị ka a ga-asị na m pụrụ nnọọ ịnụ ka ha na-ebe akwá n’ihi nwatakịrị nwụrụ anwụ (isi 47) ma ọ bụ na anyị maara ihe Jisọs na-eche mgbe nwanyị ahụ nwere oruru ọbara (isi 46) metụrụ ya aka ma bụrụ onye a gwọrọ ọrịa ya. Ngosipụta nke ihu ha bụ nnọọ otú ọ na-adị n’ezie nke na ọ na-akpata mwute. . . . Kama ịgụ akwụkwọ ga-abụ ọrụ, akwụkwọ nke a na-eme ya ka ọ bụrụ ihe ntụrụndụ ma ọ bụ ihe obi ụtọ ná mgwụsị nke ọrụ ụbọchị m. Ụzọ na-akpali mmetụta nke e si dee akwụkwọ a adịghị agwa anyị nanị ihe Jisọs mere kama ọ na-enye anyị nghọta dị mkpirimkpi nke ihe o ziri na ụdị mmetụta o nwere.
Ụzọ Dị Iche Iche A Pụrụ Isi Jiri Ya Mee Ihe
Ọtụtụ amalitewo iji akwụkwọ ahụ eme ihe n’ọmụmụ Bible ezinụlọ ha. “Anyị nwere ụmụaka atọ na-eto eto,” ka nne na nna si Silverton, Oregon, U.S.A., dere, “akwụkwọ a dịkwa mma nke ukwuu maka ‘ọmụmụ ihe ezinụlọ anyị kwa abali.’ N’ezie, lee ka o si kwesị ekwesị na anyị ji nlezianya mụọ ihe nile metụtara Eze anyị na-ahụ n’anya, bụ́ Kraịst Jisọs.”
Otu onye nọ n’agbata afọ iri na atọ na iri na itoolu si Japan kọwara, sị: “Nna m anọwo na-agụrụ ya anyị mgbe anyị na-atụsara ahụ ka anyị risịrị nri abalị. Dị ka ezinụlọ, anyị na-agụ ya site ná mmalite, ma ekpebiri m ịdị na-agụ otu isiakwụkwọ otu abali malite n’azụ akwụkwọ ahụ tupu m laba ụra. Otú ọ dị, akwụkwọ ahụ na-adọrọ uche mmadụ nke ukwuu nke na ọ na-abụkarị elekere mbụ n’ụtụtụ tupu m mata ihe oge na-ekwu.”
Ọ na-atụ ọtụtụ n’anya bụ́ ọtụtụ ihe ọmụma ndị e tinyezuru n’ihe ndekọ ahụ. “A mụtara m ọtụtụ ihe m na-amaghị,” ka otu Onyeàmà dere. Otu akwụkwọ ozi sitere California, U.S.A., kwuru, sị: “Mụ na nwunye m anọwo n’eziokwu ruo ihe karịrị 35 afọ, anyị pụkwara ikwu n’obi eziokwu na anyị enwetụbeghị akwụkwọ n’aka anyị nke na-akpali nnọọ akpali dị ka nke a.”
Akwụkwọ ahụ kwesịrị inye aka itipịasị okwu ụgha ahụ bụ na Ndịàmà Jehova ekwenyeghị na Jisọs. Otu onye nwere obi ekele nke na-agụ ya kwuru otú a, sị: “A pụghị m idoru ya ala, n’ihi na ọ bụ ihe kasị egosipụta amaghị ihe nke ndị na-ekwu na ndị Jehova ekwenyeghị na Jisọs Kraịst ma ọ bụ na ha adịghị enye ya nsọpụrụ. Nanị ihe anyị kwesịrị ime ugbu a bụ itinye n’aka ha, azịza nke a nye amaghị ihe ha.”
N’ezie akwụkwọ nke a ga-enwe ọnọdụ dị mkpa n’ozi nke Ndịàmà Jehova. “Enyere m nwanyị mụ na ya na-amụ Bible otu akwụkwọ ahụ,” ka otu Onyeàmà dere, “mmetụta ọ nweworo n’ebe ọ nọ yikwara ọrụ ebube. Ọ nọwo na-amụ ihe eri otu afọ, enwewokwa m nsogbu ime ya ka ọ bịa nzukọ.” Mgbe onye ahụ a na-eduziri ọmụmụ ihe gụsịrị 45 isiakwụkwọ ndị dị n’akwụkwọ ọhụrụ ahụ, Onyeàmà ahụ kọwara, “ọ gwara m na ya ga-abịa nzukọ Sunday n’ihi na oge eruwo maka ya ime mkpebi ya.”
Akụkụ Dị Iche Iche Bara Uru
N’ezie, Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ na-enye nchịkọta okwu nke akwụkwọ Oziọma ndị ahụ. E nyere nkọwa nke ọtụtụ ihe nile Jisọs kwuru ma kụzie, ya mere a pụrụ iji akwụkwọ ahụ mee ihe dị ka ihe bara uru e ji eme nnyocha, n’ihi na ọ na-arapagidesi ike n’ihe ndekọ nke Bible.
Otu akụkụ ya dị mma karịsịa bụ na a kọrọ ihe nile n’usoro nke oge ha ji mee. Nanị ịsapesị peji ya mgbe e bu nke a n’uche pụrụ ịbụ ihe inyeaka n’ịmata mgbe, ụfọdụ ihe omume mere n’oge ije ozi nke Jisọs. Ndị na-agụ akwụkwọ Oziọma ndị ahụ na-ezutekarị ihe ndị yiri ma ha na-emegiderịta ibe ha. Akwụkwọ ọhụrụ ahụ, adọrọghị uche kpọmkwem gaa ná mmegiderịta ndị ahụ, na-eme ka ha kwekọọ n’otú e si dee ya.
Dị ka ndị Kraịst, n’ezie anyị ekwesịghị ileghara anya ọmụmụ ihe e ji nlezianya mee nke ndụ nke Onye Nlereanya anyị kwesịrị ntụkwasị obi, bụ́ Jisọs Kraịst anya. Ya mere, ka anyị tụlee ihe ndekọ nke akwụkwọ Oziọma ndị ahụ n’enyemaka nke akwụkwọ ọhụrụ ahụ bụ́ Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ.